Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/98 p. 3-4
  • A Chọkwuru—Ọmụmụ Bible

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Chọkwuru—Ọmụmụ Bible
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nweta Obi Ike Ime Nletaghachi
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Nletaghachi Na-eduga n’Ọmụmụ Bible
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Inyocha Ọrụ Dị Ngwa nke Ime Ndị Na-eso Ụzọ Site n’Oge Ruo n’Oge
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Ịkwado Akwado Bụ Ihe Bụ́ Isi Na-eme Ka Nletaghachi Na-arụpụta Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 12/98 p. 3-4

A Chọkwuru—Ọmụmụ Bible

1 Jehova Chineke ji uto nọgidere na-aga n’ihu na-agọzi nzukọ ya nke elu ala. N’ime afọ ije ozi 1997, e mere 375,923 baptism n’ụwa nile—nkezi nke ihe karịrị 1,000 ndị ọhụrụ na-eso ụzọ kwa ụbọchị, ma ọ bụ ihe dị ka 43 kwa awa! N’agbanyeghị ọtụtụ iri afọ nke ihe isi ike ụmụnna anyị pụrụ icheworị ihu n’akụkụ dị iche iche nke ụwa, ọrụ Alaeze ahụ na-aga n’ihu, a na-enwekwa mmụba dị ịrịba ama. Lee ka o si bụrụ ihe na-enye obi ụtọ ịgụ banyere ọganihu ndị a na-enwe n’ịgbasa ozi ọma ahụ!

2 Na Nigeria, n’afọ ije ozi 1997, anyị nwekwara mmụba ná nkezi nke ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ inyeaka, n’awa e tinyere n’ime nkwusa, na n’ọnụ ọgụgụ akwụkwọ nta, broshuọ, na magazin ndị e tinyere. E nwere mmụba n’ọnụ ọgụgụ ndị e mere baptism na ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwetụrụla nke ndị bịara Ememe Ncheta. Olee banyere ọrụ ịga nletaghachi na ọmụmụ Bible? E nwekwara mmụba ná ngụkọta ọnụ ọgụgụ nletaghachi na ịrị elu dị pasent 5 n’ọmụmụ Bible. Ọ bụ ezie na obi dị anyị ụtọ banyere mmụba ndị a, nkezi ọmụmụ Bible nke bụ 0.9 maka afọ ije ozi ahụ na-egosi na ọ bụghị mmadụ nile na-eduzi ọmụmụ Bible kwa ọnwa. Ma, akụkụ ndị a nke ozi dịcha mkpa n’ime ndị na-eso ụzọ. Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ime iji hụ na anyị na-eduzi ọmụmụ Bible n’ụzọ chiri anya?

3 Mee Ka Ọchịchọ Iduzi Ọmụmụ Ihe Sie Ike Karị: Ọ dị anyị onwe anyị mkpa ilekwasị anya n’ịbụ ndị siri ike n’ụzọ ime mmụọ na ndị na-arụsi ọrụ ike. Ezi ụmụazụ Kraịst bụ ndị “obi ha na-anụrụ ọrụ ọma ọkụ.” (Taị. 2:14) Mgbe anyị tụleghachiri ozi anyị, ànyị pụrụ ikwu na anyị na-esochi akwụkwọ nile e tinyere n’ubi n’ụzọ siri ike? Ọ̀ na-adị anyị ọkụ n’obi ikwu ka anyị duziere ndị nile gosiri mmasị ọmụmụ Bible? (Rom 12:11) Ka ọ̀ dị anyị mkpa ịzụlitekwu ọchịchọ ịga nletaghachi na ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi?

4 Ọgụgụ Bible onwe onye, ịgachi nzukọ anya, na ịmụ mbipụta dị iche iche ga-eme ka anyị nọgide na-adị ndụ n’ụzọ ime mmụọ ma bụrụ ndị mmụọ Chineke mere ka ha dị ike. (Efe. 3:16-19) Nke a ga-eme ka okwukwe na ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe Jehova nọ na ịhụnanya anyị nwere maka mmadụ ibe anyị sie ike karị. A ga-akpali anyị ịkụziri onye ọzọ eziokwu ahụ, si otú ahụ mee ka ozi anyị bụrụ ihe na-adọrọ mmasị, nke nwere ihe ịga nke ọma, na nke na-akpali akpali. Ee, anyị kwesịrị ịchọ inwekwu ọmụmụ Bible!

5 Buru Ụzọ Duziere Ezinụlọ Gị Ọmụmụ Ihe: Ndị Kraịst bụ́ ndị nne na nna nwere ụmụaka ha na ha ka bi n’ụlọ kwesịrị ịdị na-enwe nchegbu banyere usoro ihe omume ha banyere ọmụmụ Bible ezinụlọ chiri anya. (Deut. 31:12; Abụ Ọma 148:12, 13; Ilu 22:6) Ọ ga-abụ ihe bara uru ndị nne na nna iso ụmụ ha mụọ broshuọ Na-achọ mgbe ahụzi akwụkwọ Ihe Ọmụma iji kwadebe ha iru eru ịghọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptism na maka nraranye na baptism. N’ezie, a pụrụ ịmụ akwụkwọ ndị ọzọ, na-adabere ná mkpa na afọ ndụ nke nwatakịrị ahụ. Nne ma ọ bụ nna nke na-eduziri nwa ya a na-emebeghị baptism ọmụmụ ihe pụrụ ịgụrụ ọmụmụ ihe, oge, na nletaghachi, dị ka a kọwapụtara n’Igbe Ajụjụ Ozi Alaeze Anyị nke June 1987.

6 Mee Ka Ụzọ I Si Hazie Onwe Gị Ka Mma: N’iburu ọnụ ọgụgụ magazin, broshuọ, na akwụkwọ e tinyere n’uche, ihe ịrụ ụka adịghị ya na a na-agha mkpụrụ dị ukwuu. Mkpụrụ eziokwu ndị a a kụworo pụrụ ime ka e nwee ndị ọhụrụ na-eso ụzọ dị ukwuu. Ma onye ọrụ ugbo ọ̀ ga-enwe afọ ojuju n’ezie ma ọ bụrụ na ọ nọgide na-agha mkpụrụ, mgbe e mesịkwara, ọ dịghị mgbe o wepụtara oge iji wee ihe ubi? Ọ dịghị ma ọlị. N’otu aka ahụ, ọ dị mkpa ije ozi nsochi.

7 Ị̀ na-ewepụta oge mgbe nile ịga nletaghachi? Gaghachi ozugbo n’ebe nile ị chọtara mmasị. Buru n’uche ịmalite ọmụmụ Bible mgbe ị na-aga nletaghachi. Ì nwere ihe ndekọ dị mma n’anya, nke nwere ihe ọmụma kasị ọhụrụ, nke a haziri nke ọma banyere nletaghachi gị? Tinyere aha na adres nke onye nwe ụlọ, jide n’aka idetu ụbọchị mbụ ị gara, akwụkwọ ọ bụla e tinyere, nkọwa dị mkpirikpi nke ihe a tụlere, na otu isi ihe a pụrụ ikwurịta mgbe ọzọ ị ga-aga. Nye ohere n’ihe ndekọ gị maka ihe ọmụma ndị ọzọ a ga-edenye mgbe ọ bụla ị gasịrị nletaghachi.

8 Tụlee Ụzọ Isi Gaa Nletaghachi: Gịnị bụ isi ihe ụfọdụ a ga-eburu n’uche mgbe a na-aga nletaghachi na nke onye nwere mmasị? (1) Bụrụ onye na-akpali akpali, nwee omume enyi, na-anụ ọkụ n’obi, na-eme ka i si eme kwa ụbọchị. (2) Kwurịta isiokwu ma ọ bụ ajụjụ ndị o nwere mmasị na ha. (3) Mee ka nkwurịta okwu ahụ dị mfe ma dabere n’Akwụkwọ Nsọ. (4) Ná nleta nke ọ bụla, gbalịa ịkụziri onye ahụ nwe ụlọ ihe ọ ga-achọpụta na ọ baara ya uru. (5) Mee ka ọ na-atụ anya isiokwu a ga-ekwurịta mgbe ọzọ ị ga-abịa. (6) Anọfela ókè. (7) Ajụla ajụjụ ndị ga-emenye onye nwe ụlọ ihere ma ọ bụ gbagwojuo ya anya. (8) Jiri akọ mee ihe ka ị ghara ịkatọ echiche ndị na-ezighị ezi ma ọ bụ àgwà ọjọọ nke onye nwe ụlọ tupu o nwee nghọta ime mmụọ.—Lee ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke March 1997 maka inwetakwu enyemaka n’ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ime nletaghachi na ịmalite ọmụmụ Bible.

9 Nwalee Ohere Ọ Bụla: N’otu ọgbakọ, e nwetaliri aha na nọmba ụlọ ndị nile bi n’otu ụlọ obibi a na-echesi nche ike na ya. E degaara onye ọ bụla bi n’ụlọ ahụ akwụkwọ ozi, e tinyekwara traktị abụọ n’ime ha. Ná ngwụsị nke akwụkwọ ozi ahụ, e kwuru ka e duziere ha ọmụmụ Bible ebe obibi, e denyekwara nọmba telifon dị n’ógbè ahụ ka onye ahụ natara ya wee nwee ike ịzaghachi. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, otu nwa okorobịa kpọrọ na fon na-arịọ ka e duziere ya ọmụmụ ihe. A gaara ya nletaghachi echi ya, a malitekwaara ya ọmụmụ ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ọ gara Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ná mgbede ahụ, ọ nọgidekwara na-aga nzukọ nile. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ, ọ malitere ịgụ Bible kwa ụbọchị ma nọgide na-enwe ọganihu iji bụrụ onye e mere baptism.

10 Ndị nkwusa nọ n’otu ìgwè mere ndokwa ịgakọ nletaghachi ụfọdụ ọnụ. Mgbe otu nwanna nwanyị gara otu n’ime nletaghachi ya, onye ọ chọgara anọghị n’ụlọ, ma nwanyị ọzọ bịara ịhụ ndị na-akụ aka wee kwuo, sị: “Anọwo m na-eche unu.” Onye ahụ nwe ụlọ anataworị akwụkwọ Ihe Ọmụma tupu mgbe ahụ site n’aka otu enyi ya. Ka ọ na-erule mgbe ụmụnna nwanyị ahụ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ya, ọ gụchaala akwụkwọ ahụ ugboro abụọ ma nwee mmasị dị ukwuu n’ihe ọmụma dị n’ime ya. O kwuru na o jughị ya anya ịhụ ka Ndịàmà ahụ bịara n’ụlọ ya ụbọchị ahụ n’ihi na ya anọwo na-ekpe ekpere ka ha bịa duziere ya ọmụmụ Bible. A maliteere ya ọmụmụ ihe, ọ malitere ịga nzukọ ọgbakọ, o nwekwara ọganihu dị ngwa.

11 Otu nwanna nwanyị, nke e mere baptism ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 25 gara aga, nyere nne ya akwụkwọ Ihe Ọmụma na nso nso a. Nne ya, bụ́ onye na-aga chọọchị, malitere ịgụ akwụkwọ ahụ. Mgbe ọ gụsịrị isiakwụkwọ abụọ, ọ kpọrọ nwa ya nwanyị na fon ma kwuo, n’ụzọ juru nwa ya nwanyị anya, sị: “Achọrọ m ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova!” Nne ya ahụ malitere ịmụ ihe, e mewokwa ya baptism ugbu a.

12 Nwalee Aro Ndị A: Ọ̀ dịtụwo mgbe i ji ụzọ ịkpọ okwu aha kpọmkwem malite ọmụmụ ihe? Ị pụrụ nanị ikwu, sị: “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inwe ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, apụrụ m iji nanị minit ole na ole gosi gị otú e si eme ya. Ọ bụrụ na ọ masị gị, ị pụrụ ịga n’ihu.” Ọtụtụ ndị adịghị egbu oge ịnakwere aro dị otú ahụ, ngwa ngwa ha na-ahụkwa otú e si enwe ọmụmụ Bible.

13 Ná mmalite ọmụmụ ihe ahụ, gosi onye ahụ ị na-amụrụ ihe ụzọ isi kwadebe tupu oge eruo site n’ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a kpọtụrụ uche na ha na ịkanye akara n’okpuru okwu ndị bụ́ isi iji zaa ajụjụ ndị ahụ e biri ebi. Lekwasị anya nanị n’ihe ndị bụ́ isi ihe. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịdị na-eme mgbanwe ná nnọkọ ole na ole ndị mbụ, ọ dị mkpa na a ga na-enwechi ọmụmụ Bible anya. Buru n’uche ụzọ ị ga-esi webata ekpere dị ka akụkụ dị mkpa n’ọmụmụ ihe ahụ na otú ị ga-esi jiri Akwụkwọ Nsọ kwadebe onye ahụ ị na-amụrụ ihe maka mmegide. Gbalịsie ike ime ka ọmụmụ ihe ahụ na-adọrọ adọrọ!

14 N’ezie, ọ bụghị ndị nile a na-amụrụ Bible na-enwe ọganihu ha nhata. Ụfọdụ adịghị eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe dị ka ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ na-amụta ihe ndị a na-akụzi ngwa ngwa dị ka ndị ọzọ. Ndị ọzọ na-ebi ndụ nke na-adịghị enye ha ohere, o nwekwara ike ha agaghị ewepụtali oge a chọrọ iji mụchaa otu isiakwụkwọ kwa izu. Ya mere, n’ọnọdụ ụfọdụ ọ pụrụ ịdị mkpa ịmụ ihe ihe karịrị otu ugboro iji mụsịa isiakwụkwọ ụfọdụ na ọtụtụ ọnwa karị iji mụsịa akwụkwọ ahụ. N’ọnọdụ ụfọdụ anyị pụrụ ibu ụzọ mụọ broshuọ Na-achọ wee gafezie n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Nke a, tinyere ha ịga nzukọ ọgbakọ, ga-enyere onye ọ bụla a na-amụrụ ihe aka ịgbanyesi mkpọrọgwụ ike n’eziokwu.

15 Nke ka nke, kpee ekpere maka ọmụmụ Bible! (1 Jọn 3:22) Otu n’ime ahụmahụ ndị kasị ewetara onye Kraịst ụgwọ ọrụ bụ ịbụ onye Jehova jiri mee ihe inyere mmadụ aka ịghọ onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. (Ọrụ 20:35; 1 Kọr. 3:6-9; 1 Tesa. 2:8) Ugbu a bụ oge inwe ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu n’ọrụ ọmụmụ Bible, na-enwe obi ike zuru ezu banyere ngọzi bara ụba nke Jehova ná mgbalị anyị ịmalite ọtụtụ ọmụmụ ihe karị!

Igbe dị na peeji nke 3]

Ị̀ na-ekpe ekpere iji malite otu ọmụmụ Bible ọhụrụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya