Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke September 7 ruo December 21, 1998. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe onye gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Na 2 Timoti 1:6, “onyinye amara” na-ezo aka n’ikike ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche nke e nyeworo Timoti site n’ọrụ nke mmụọ nsọ Chineke. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w85 11/1 p. 16 para. 15.]
2. Onye Kraịst tozuru okè ‘na-anwa nghọta ya ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ’ site n’ime ka ọ bụrụ omume ya iji ihe ọmụma ọ bụla o nwetara n’Okwu Chineke eme ihe. (Hib. 5:14) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w85 12/15 p. 9 para. 7.]
3. Eziokwu ahụ bụ́ na Jehova “na-eme ka anyanwụ Ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, Ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume” na-egosi na ná mmeso ya nile n’ebe ezinụlọ mmadụ nọ, Jehova egosipụtawo eleghị mmadụ anya n’ihu mgbe nile. (Mat. 5:45) [w96 11/15 p. 25 para. 7]
4. Jemes onye so dee Bible bụ otu Jemes ahụ kwuchitere ọnụ “ndị ozi na ndị okenye” n’oge e mere mkpebi banyere obibi úgwù. (Ọrụ 15:6, 13; Jes. 1:1) [Lee w91 3/15 p. 23 para. 2.]
5. Pita nọ na Babilọn mgbe o dere akwụkwọ ozi ya nke mbụ n’ihe dị ka 62-64 O.A. (1 Pita 5:13) [w91 3/15 p. 30 para. 2]
6. Okwu ahụ bụ́ “onye nke na-emegide Kraịst na-abịa” nke dị na 1 Jọn 2:18 na-ezo aka n’otu onye. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91 4/15 p. 29 para. 4.]
7. Iwu ahụ dị na 2 Jọn 10 nke na-ekwu ka mmadụ ghara ịkpọbata ụfọdụ ndị n’ụlọ ya ma ọ bụ kelee ha na-ezo aka nanị n’ebe ndị na-akwalite ozizi ụgha nọ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 1/15 p. 30 para. 1-3.]
8. Akwụkwọ Mkpughe dị ná ngwụsị Bible n’ihi na ọ bụ akwụkwọ ikpeazụ Jọn onyeozi dere. [Were w91 5/1 p. 21 para. 2 tụnyere w91 4/15 p. 29 para. 2; p. 30 para. 2.]
9. Mkpughe 13:11-15 na-egosi n’ụzọ ziri ezi otú Ike Ụwa England na America si bụrụ ndị isi n’iguzobe na ịkwado ma Njikọ Mba Nile ma nke nọchiri anya ya, bụ́ Òtù Mba Ndị Dị n’Otu. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 12/15 p. 19 para. 3.]
10. Ebe ọ bụ na Bible nyere ohere ka a na-aṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, ọ ga-abụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị ịhapụ ka omenala na ọdịnala nke ógbè kwuo ókè a ga-aṅụru. (Abụ Ọma 104:15) [w96 12/15 p. 27 para. 5]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Gịnị ka ọ pụtara na onye nlekọta agaghị abụ “onye na-eti mmadụ aka”? (Taịtọs 1:7) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 9/1 p. 27 para. 21.]
12. Kwuo ihe abụọ mere Jehova ji na-eme ka inye ihe bụrụ akụkụ nke ezi ofufe. [w96 11/1 p. 29 para. 3-6; p. 30 para. 3]
13. Gịnị ka Jisọs bu n’obi mgbe ọ sịrị, “Àjà na ihe e chere n’ihu Gị, Ị chọghị ha”? (Hib. 10:5) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 7/1 p. 14 para. 3.]
14. Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi ‘merie ụwa’? (1 Jọn 5:3, 4) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91 4/15 p. 29 para. 7.]
15. Gịnị ka okwu Pita bụ́ “na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ nke Chineke” na-agụnye? (2 Pita 3:12) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w97 9/1 p. 19 para. 2.]
16. Olee okwu ndị bụ́ isi dị na 1 Jọn 2:2 ndị na-enyere anyị aka ịmata ìgwè abụ ga-erite uru site n’ọnwụ ịchụ àjà Jisọs? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 1/15 p. 12 para. 11.]
17. N’ikwekọ ná Mkpughe 1:7, n’ụzọ dị aṅaa ka ndị ahụ mara Jisọs ube ga-esi hụ ya ‘ka ọ na-abịa Ya na igwe ojii’? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w93 5/1 p. 22 para. 7.]
18. Ọ bụ ezie na Jisọs Kraịst jiri afọ atọ na ọkara mee nkwusa n’etiti ụmụ Israel, n’ihi gịnị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ji jụ ya dị ka Mesaịa ahụ? [w96 11/15 p. 29 para. 1, 6; p. 30 para. 3]
19. Ná Mkpughe 13:1, 2, n’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na a kọwara ọchịchị ụwa dị ka “anụ ọhịa”? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 4/1 p. 20 para. 17.]
20. Ole ndị ka “ndị okenye [iri abụọ na anọ]” ahụ e kwuru okwu ha ná Mkpughe 4:4 na-anọchite anya ha, ọ bụkwa gịnị ka “okpueze” na “ocheeze” ha na-echetara anyị? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 7/1 p. 13 para. 17.]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi okwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. E si na _________________________ dee akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara Timoti n’afọ _________________________ O.A., eleghị anya Timoti ka nọkwa n’Efesọs. [w91 1/15 p. 31 para. 1]
22. Iji gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, ọ dị anyị mkpa iwezụga ibu ọ bụla na _________________________ nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe, nke bụ́ _________________________. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w98 1/1 p. 10 para. 15.]
23. Na 2 Pita 1:5-8, Pita onyeozi na-atụ aro inwe _________________________ iji wulite àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ga-egbochi anyị ịbụ _________________________ ma ọ bụ _________________________. [w91 3/15 p. 31 para. 3]
24. Ná Mkpughe 6:1-8, onye na-agba ịnyịnya ahụ na-acha ọkụ ọkụ na-ese onyinyo _________________________; onye na-agba ịnyịnya ojii ahụ na-ese onyinyo _________________________; ọnwụ na-agba ịnyịnya yiri ozu, bụ́ nke na-egosi _________________________ n’ihi ọrịa na-efe efe na ihe ndị ọzọ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 5/15 p. 3 igbe.]
25. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ na _________________________ tupu Kraịst ka ndị Juu malitere ịmụta ozizi nke _________________________ site n’aka ndị Gris. [w96 8/1 p. 6 para. 2-3]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. N’oge a tụrụ Pọl mkpọrọ nke mbụ na Rom, (Ọnisifọrọs; Onesimọs; Ọnan), bụ́ otu ohu gbara ọsọ site n’ụlọ (Filip; Festọs; Faịlimọn), so n’ime ndị gere ntị ná nkwusa o mere. [w91 2/15 p. 23 para. 2-3]
27. A na-akọwa (ịhụnanya; nkwanye ùgwù; ile ọbịa) dị ka “ichebara ndị ọzọ echiche, ịsọpụrụ ha.” [fy p. 30 para. 7]
28. Na Luk 14:28, Jisọs na-ekwu banyere (ibu ụzọ mee atụmatụ; ịghara imefusị ego; izere ibiri ego). [fy p. 40 para. 4]
29. “Ndị nọ n’ebube” a kpọtụrụ uche na Jud 8 na-ezo aka (n’ọkwá Jisọs; n’ọbụbụeze Jehova; ná ndị nwere ebube ụfọdụ nke e nyere ha site n’aka Chineke na Kraịst dị ka ndị okenye e tere mmanụ). [w91 4/15 p. 31 para. 5]
30. Ná Mkpughe 11:11, “ụbọchị atọ na nkera otu ụbọchị” bụ́ mgbe ihe fọdụrụ e tere mmanụ yiri ozu n’anya ndị iro ha, na-ezo aka (n’afọ atọ na ọkara; ná mkpirikpi oge; n’ọnwa atọ na ọkara). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee re p. 167 para. 21.]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
1 Kọr. 6:9-11; Hib. 2:1; Hib. 10:32; Jes. 4:15; 1 Pita 3:4
31. Iji guzogide mmetụta mkpọsa ndị anyị na-enweta n’ụwa a mgbe nile, anyị kwesịrị “ịṅabiga ntị ókè karị” n’Okwu Chineke site n’inwe ezi àgwà ịmụ ihe na inwe usoro ọgụgụ Bible dị mma. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w98 1/1 p. 7 para. 9.]
32. Mgbe ọ bụla anyị na-eme atụmatụ maka ọdịnihu, anyị kwesịrị iji ekpere tụlee otú ha si kwekọọ ná nzube Chineke. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w97 11/15 p. 21 para. 10-11.]
33. “Mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo” nke onye Kraịst bụ́ nwunye na nne adịghị atọ nanị di ya ụtọ kamakwa n’ụzọ ka mkpa ọ na-atọ Chineke ụtọ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 5/15 p. 18 para. 12.]
34. Anyị icheta ihe omume gara aga nke iguzosi ike n’ihe n’agha ime mmụọ pụrụ ije ozi inye anyị obi ike dị mkpa iji gbachaa ọsọ ndụ ahụ. [w96 12/1 p. 29 para. 3]
35. Ndịàmà Jehova adịghị ekwe ka ndị ọ bụla ghọrọ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè na-enweghị nchegharị nọgide n’ọgbakọ ndị Kraịst. [w96 12/15 p. 25 para. 3]