Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 25 p. 161-171
  • Ịtụteghachi Ndịàmà Abụọ Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịtụteghachi Ndịàmà Abụọ Ahụ
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụlọ Nsọ Ahụ
  • Ịtụ Ụlọ Nsọ Ahụ
  • Ịzọda Ogige Ahụ
  • Ndịàmà Abụọ Ahụ
  • E Gburu Ndịàmà Abụọ Ahụ
  • A Kpọlitere Ha Ọzọ!
  • Ihe Otiti Ndị Jehova Ga-eti Krisendọm
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Oké Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ nke Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ikpughe Otu Ihe Omimi Dị Nsọ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Obodo Ọma Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 25 p. 161-171

Isi nke 25

Ịtụteghachi Ndịàmà Abụọ Ahụ

1. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ siri ike kpọrọ Jọn òkù ka o mee?

TUPU ahụhụ nke abụọ agabigasịa, mmụọ ozi ahụ siri ike kpọrọ Jọn òkù ikere òkè n’ihe ngosi amụma ọzọ, nke a metụtakwara ụlọ nsọ ahụ. (Mkpughe 9:12; 10:1) Nke a bụ ihe Jọn kọrọ: “E wee nye m amị yiri mkpanaka: otu onye wee sị, Bilie, tụọkwa ụlọ nsọ nke Chineke, na ebe ịchụàjà ya, na ndị na-akpọ isiala n’ime ya.”—Mkpughe 11:1.

Ụlọ Nsọ Ahụ

2. (a) Olee ụlọ nsọ nke ga-adịgide ruo ụbọchị anyị a? (b) Ònye bụ Onyeisi Nchụàjà nke ụlọ nsọ ahụ, oleekwa ebe bụ Ebe Kasị Nsọ?

2 Ụlọ nsọ ahụ a kpọtụrụ aha ebe a apụghị ịbụ ụlọ nsọ efu dị na Jerusalem, ebe ndị Rom bibiri nke ikpeazụ n’afọ 70 O.A. Otú ọ dị, Pọl onyeozi gosiri na ọbụna tupu mbibi ahụ, e nwewo ụlọ nsọ ọzọ nke ga-adịgide ruo n’oge anyị a. Nke ahụ bụ oké ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ nke ụlọ ikwuu ahụ, na e mesịa, ụlọ nsọ ndị ahụ e wuru na Jerusalem, sere onyinyo ya. Ọ bụ “ezi ụlọ ikwuu ahụ, nke [Jehova] mara, ọ bụghị mmadụ,” Onyeisi Nchụàjà ya bụ Jisọs, onye Pọl kọwara dị ka onye nọdụwororịị ala “n’aka nri nke ocheeze Ịdị Ukwuu ahụ dị n’ime eluigwe.” Ebe Kasị Nsọ ya bụ ebe Jehova n’onwe ya nọ n’ime eluigwe.—Ndị Hibru 8:1, 2; 9:11, 24.

3. N’ụlọ ikwuu ahụ, gịnị ka ihe ndị a sere onyinyo ha (a) ákwà mgbochi nke kewara Ebe Kasị Nsọ site n’Ebe Nsọ? (b) àjà anụmanụ ndị ahụ? (ch) ebe ịchụàjà ahụ?

3 Pọl onyeozi kọwara na ákwà mgbochi ụlọ ikwuu ahụ, nke kewara Ebe Kasị Nsọ na Ebe Nsọ ahụ, sere onyinyo anụ ahụ Jisọs. Mgbe Jisọs jiri anụ ahụ ya chụọ àjà, ákwà mgbochi nke a gbawara ibe abụọ, n’echiche nke bụ na anụ ahụ Jisọs abụkwaghị ihe mgbochi nye ya ịbanye n’ebe Jehova nọ n’eluigwe. N’ihe ndabere nke àjà Jisọs, ndị nchụàjà e tere mmanụ nọ n’okpuru ya, ndị nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi ga-emesịakwa banye n’eluigwe. (Matiu 27:50, 51; Ndị Hibru 9:3; 10:19, 20) Pọl rụtụkwara aka na ọtụtụ àjà anụmanụ ndị ahụ a chụrụ n’ụlọ ikwuu ahụ zoro aka n’otu àjà ahụ Jisọs ga-eji anụ ahụ mmadụ ya zuru okè chụọ. Ebe ịchụàjà dị n’ogige ahụ nọchiri anya ndokwa Jehova mere, dị ka nzube ya si dị, ịnara àjà Jisọs n’ọnọdụ “ọtụtụ mmadụ”—nke ndị e tere mmanụ, e mesịakwa, nke atụrụ ọzọ ahụ—ndị ‘na-eche ya ka e wee zọpụta ha.’—Ndị Hibru 9:28; 10:9, 10; Jọn 10:16.

4. Gịnị ka ihe ndị a sere onyinyo ha (a) Ebe Nsọ ahụ? (b) ogige nke dị n’ime ime?

4 N’ịdabere n’ihe ọmụma nke a sitere n’ike mmụọ Chineke, anyị pụrụ ịbịa ná nkwubi okwu bụ na Ebe Nsọ dị n’ụlọ ikwuu ahụ sere onyinyo ọnọdụ ịdị nsọ nke Kraịst buru ụzọ nwee, e mesịakwa ndị e tere mmanụ so n’ime òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze nke 144,000 ahụ mgbe ha ka nọ n’elu ala, tupu ha agabiga “ákwà mgbochi” ahụ. (Ndị Hibru 6:19, 20; 1 Pita 2:9) N’ụzọ dị mma, o sere onyinyo ha ịbụ ndị a nabataworo dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke, ọbụna dị ka Chineke kwupụtara banyere Jisọs ịbụ Ọkpara ya mgbe baptism Jisọs gasịrị n’osimiri Jọdan n’afọ 29 O.A. (Luk 3:22; Ndị Rom 8:15) Gịnịkwanụ banyere ogige ahụ dị n’ime ime, bụ́ nanị akụkụ ụlọ ikwuu ahụ nke ndị Israel na-abụghị ndị nchụàjà pụrụ ịhụ anya, bụkwa ebe a na-anọ achụ àjà ndị ahụ? Nke a sere onyinyo ọnọdụ izu okè nke mmadụ ahụ bụ Jisọs nke mere ka o ruo eru inye ndụ ya maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ nọchikwara anya ọnọdụ ezi omume nke ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ nwere mgbe ha na-eje ozi n’elu ala ebe a, bụ́ nke e nyere ha n’ihe ndabere nke àjà Jisọs.a—Ndị Rom 1:7; 5:1.

Ịtụ Ụlọ Nsọ Ahụ

5. N’amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, gịnị ka ihe ndị a pụtara (a) ọ̀tụ̀tụ̀ nke Jerusalem? (b) ọ̀tụ̀tụ̀ nke ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ?

5 A gwara Jọn ka ọ “tụọkwa ụlọ nsọ nke Chineke, na ebe ịchụàjà ya, na ndị na-akpọ isiala n’ime ya.” Gịnị ka nke a pụtara? N’amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọ̀tụ̀tụ̀ dị otú ahụ na-enye ihe imesi obi ike na a ga-adabere n’ụkpụrụ zuru okè nke Jehova kpee ikpe ziri ezi. N’oge Eze Manase ahụ na-emebi iwu, ọ̀tụ̀tụ̀ a tụrụ Jerusalem n’ụzọ amụma bụ ihe àmà nke ikpe mbibi a na-apụghị ịgbanwe agbanwe megide obodo ahụ. (2 Ndị Eze 21:13; Abụ Akwa 2:8) Otú ọ dị, mgbe e mesịrị, mgbe Jeremaịa hụrụ ka a na-atụ Jerusalem, nke a mesiri eziokwu ahụ ike nke bụ na a gaje iwughachi obodo ahụ. (Jeremaịa 31:39; leekwa Zekaraịa 2:2-8.) N’otu aka ahụkwa, ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ zuru ezu nke ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ bụkwa ihe imesi ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha laa Babilọn obi ike na a gaje iweghachi ezi ofufe ná mba nke aka ha. Ọ bụkwa ihe ncheta na, n’ihi mmehie ha nile, malite n’oge ahụ gaa n’ihu, Israel aghaghị iru eru n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nsọ nke Chineke.—Ezikiel 40:3, 4; 43:10.

6. Gịnị ka ọgwụgwa a gwara Jọn ka ọ tụọ ụlọ nsọ ahụ na ndị nchụàjà na-efe ofufe n’ime ya bụ ihe àmà ya? Kọwaa.

6 N’ihi nke a, mgbe e nyere Jọn iwu ịtụ ụlọ nsọ ahụ na ndị nchụàjà na-akpọ isiala n’ime ya, ọ bụ ihe àmà nke na-egosi na ọ dịghị ihe pụrụ igbochi mmezu nke nzube nile nke Jehova banyere ndokwa ụlọ nsọ ahụ na ndị so ya na-emekọ ihe, na nzube ndị ahụ na-erukwa mmezu ha nso. Ugbu a e debeworo ihe nile n’okpuru ụkwụ mmụọ ozi siri ike nke Jehova, oge eruwo ka “ugwu nke ụlọ Jehova” bụrụ ihe ‘guzosiri ike n’elu ugwu nile.’ (Aịsaịa 2:2-4) A ghaghị ibuli ezi ofufe Jehova elu mgbe ọtụtụ narị afọ nke Krisendọm dapụrụ n’ezi ofufe gasịrị. Ọ bụkwa oge ka a kpọlite ndị ahụ so n’ụmụnna Jisọs ndị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị nwụworonụ, banye ‘n’Ebe Nsọ ahụ Kachasị Ebe Nsọ Nile.’ (Daniel 9:24; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:14-16; Mkpughe 6:11; 14:4) A ghaghịkwa ịtụ ndị ikpeazụ a kara akara n’elu ala n’ime “ndị ohu Chineke anyị” dị ka ụkpụrụ nile nke Chineke si dị, ka ha wee ruo eruo maka ọnọdụ ebighị ebi ha ná ndokwa ụlọ nsọ ahụ dị ka ụmụ Chineke e ji mmụọ nsọ mụta. Òtù Jọn ahụ n’oge a maara nke ọma ihe ụkpụrụ nsọ ndị ahụ bụ, kpebisiekwa ike iru eru na ha.—Mkpughe 7:1-3; Matiu 13:41, 42; Ndị Efesọs 1:13, 14; tụlee Ndị Rom 11:20.

Ịzọda Ogige Ahụ

7. (a) Gịnị mere e ji gwa Jọn ka ọ ghara ịtụ ogige nke ebe ahụ? (b) Olee mgbe a zọdara obodo nsọ ahụ ruo 42 ọnwa? (ch) N’ime 42 ọnwa ahụ, olee ụzọ ndị ndú okpukpe Krisendọm si ghara ịkwado ụkpụrụ ezi omume nile nke Jehova?

7 N’ihi gịnị ka e ji gbochie Jọn ịtụ ogige ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀? Ọ na-akọrọ anyị n’okwu ndị a na-esochi: “Ma [ogige, NW] nke dị n’èzí ụlọ nsọ ahụ, hapụ ya n’èzí, atụkwala ya; n’ihi na e werewo ya nye ndị mba ọzọ: ha ga-azọdakwa obodo nsọ ahụ [iri ọnwa anọ] na abụọ.” (Mkpughe 11:2) Anyị ahụworị na ogige nke dị n’ime ime sere onyinyo ọnọdụ ezi omume n’elu ụwa, nke ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta. Dị ka anyị ga-ahụ, ihe a na-ekwu n’ebe a bụ banyere ọnwa 42 efu malite na December 1914 ruo June 1918, mgbe ndị nile kpọrọ onwe ha ndị Kraịst banyere n’oké ule. Hà ga-anọgide n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Jehova n’afọ agha ndị ahụ? Ihe ka ọtụtụ n’ime ha anọgideghị. N’ozuzu ha, ndị ụkọchukwu Krisendọm dobere ịhụ mba ha n’anya n’ihu irubere iwu Chineke isi. N’akụkụ abụọ nke agha ahụ, bụ́ nke a lụrụ n’ụzọ bụ́ isi n’ime Krisendọm, ndị ụkọchukwu gbara ụmụ okorobịa ume ịbanye n’agha ahụ. E gburu ọtụtụ nde n’ime ha. Ka ọ na-erule mgbe ikpe ahụ ga-amalite n’ụlọ Chineke na 1918, United States abanyewokwa ná mwụfu ọbara ahụ, ndị ụkọchukwu nke Krisendọm nile ewetawokwara onwe ha ikpe ọmụma ọbara nke ka na-eti mkpu maka ịbọ ọ́bọ̀ Chineke. (1 Pita 4:17) Ntụpụ a tụpụrụ ha aghọwo ihe na-adịgide adịgide, nke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe.—Aịsaịa 59:1-3, 7, 8; Jeremaịa 19:3, 4.

8. N’oge Agha Ụwa Mbụ, gịnị ka ọtụtụ Ndị Mmụta Bible ghọtara, ma gịnị ka ha na-aghọtachaghị nke ọma?

8 Ma, gịnị banyere ìgwè nta ahụ nke Ndị Mmụta Bible? À gaje ịtụ ha ozugbo ahụ na 1914 iji lee ókè ha na-araparu n’ụkpụrụ Chineke? Ee e. Dị ka ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Kraịst n’ime Krisendọm, a ghaghịkwa ile ha ule. ‘A hapụwo ha, werekwa ha nye ndị mba ọzọ’ ịbụ ndị e lere ule siri ike, kpagbuokwa. Ọtụtụ n’ime ha ghọtara na ha ekwesịghị ịpụ jee gbuo mmadụ ibe ha, ma ka ọ dị n’oge ahụ, ha aghọtachaghị nnọpụiche ndị Kraịst nke ọma. (Maịka 4:3; Jọn 17:14, 16; 1 Jọn 3:15) N’okpuru nrụgide sitere n’aka ndị mba ọzọ, ụfọdụ n’ime ha kwenyeere ha.

9. Gịnị bụ obodo nsọ ahụ nke ndị mba ọzọ zọdara, oleekwa ndị nọchiri anya obodo nke a n’elu ala?

9 Ma, olee otú o si bụrụ na ndị mba ọzọ ndị a zọdara obodo nsọ ahụ? N’ụzọ doro anya, nke a anaghị ezo aka na Jerusalem nke e bibiri ihe dị ka 25 afọ tupu e dee akwụkwọ Mkpughe. Kama nke ahụ, obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem Ọhụrụ ahụ, nke e mesịrị kọwaa ná Mkpughe, nke ihe nọchiri anya ya n’elu ala ugbu a bụ ndị Kraịst e tere mmanụ fọdụrụ n’ogige dị n’ime ime nke ụlọ nsọ ahụ. Mgbe oge na-aga, ndị a ga-emesịkwa bụrụ akụkụ nke obodo nsọ ahụ. Ya mere, ịzọda ha bụ otu ihe ahụ n’ịzọda obodo ahụ n’onwe ya.—Mkpughe 21:2, 9-21.

Ndịàmà Abụọ Ahụ

10. Gịnị ka ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova ga-eme mgbe a na-azọda ha?

10 Ọbụna mgbe a na-azọda ha, ndị a nwere obi umeala adịghị akwụsị ịbụ ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. N’ihi ya, amụma ahụ gara n’ihu na-ekwu, sị: “M ga-enyekwa ndịàmà m abụọ ike, ha ga-ebukwa amụma [otu puku, narị ụbọchị abụọ na iri isii], e gbokwasịwokwa ha ákwà mkpe. Ndị a bụ osisi olive abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ, ndị na-eguzo n’ihu Onyenwe ụwa.”—Mkpughe 11:3, 4.

11. Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi iyi “ákwà mkpe” wee na-ebu amụma?

11 Ọ dị ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ, ndị kwesịrị ntụkwasị obi mkpa inwe àgwà nke ntachi obi, n’ihi na ha aghaghị iyi “ákwà mkpe” mgbe ha na-ebu amụma. Gịnị ka nke a pụtara? N’oge Bible, ákwà mkpe na-esekarị onyinyo iru újú. Iyi ya na-abụ ihe àmà nke na onye ahụ abụrụwo onye e wedara n’ala n’ihi iru újú ma ọ bụ n’ihi ihe isi ike. (Jenesis 37:34; Job 16:15, 16; Ezikiel 27:31) E jikọtara ákwà mkpe na ozi na-eweta iru újú nke na-ekwu banyere mbibi ma ọ bụ ọnọdụ ọjọọ, ndị ndị amụma Chineke kpọsara. (Aịsaịa 3:8, 24-26; Jeremaịa 48:37; 49:3) Iyi ákwà mkpe pụrụ igosi mmadụ iweda onwe ya n’ala ma ọ bụ inwe nchegharị n’ihi ịdọ aka ná ntị nke Chineke. (Jona 3:5) Ákwà mkpe nke ndịàmà abụọ ahụ yi yiri ka ọ̀ na-egosi ntachi obi ha ji obi umeala nwee n’ịkpọsa ihe Jehova kpere n’ikpe. Ha bụ ndịàmà na-akpọsa ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ ya nke ga-ewetara mba nile iru újú.—Deuterọnọmi 32:41-43.

12. N’ihi gịnị ka o ji yie ka ogologo oge a ga-azọda obodo nsọ ahụ n’ala ọ̀ bụ ogologo oge efu?

12 Òtù Jọn ahụ ga-ekwusa ozi ahụ ruo ogologo oge a kara aka: 1,260 ụbọchị, ma ọ bụ 42 ọnwa, bụ́ otu ogologe oge ahụ a ga-azọda obodo nsọ ahụ n’ala. O yiri ka nke a ọ̀ bụ ogologo oge nkịtị, ebe e kwupụtara ya n’ụzọ abụọ dị iche iche, nke mbụ n’ọnụ ọgụgụ ọnwa, e mesịakwa n’ọnụ ọgụgụ ụbọchị. Ọzọkwa, ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị, e nwere oge a kara aka nke afọ atọ na ọkara mgbe ahụmahụ siri ike nke ndị Chineke kwekọrọ n’ihe omume ndị e buru amụma ha n’ebe a—malite na December 1914, nọgidekwa ruo June 1918. (Mkpughe 1:10) Ha kwusara ozi “ákwà mkpe” banyere ikpe ọmụma Jehova megide Krisendọm na ụwa dum.

13. (a) Gịnị ka eziokwu ahụ bụ na e ji ndịàmà abụọ see onyinyo ndị Kraịst e tere mmanụ pụtara? (b) Amụma dị aṅaa nke Zekaraịa ka ọkpụkpọ Jọn kpọrọ ndịàmà abụọ ahụ “osisi olive abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ” na-echetara anyị?

13 Eziokwu ahụ bụ na e ji ndịàmà abụọ see onyinyo ha na-emesiri anyị ike na ozi ha bụ eziokwu, gbasiekwa mkpọrọgwụ ike. (Tụlee Deuterọnọmi 17:6; Jọn 8:17, 18.) Jọn kpọrọ ha “osisi olive abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ,” na-ekwu na ha “na-eguzo n’ihu Onyenwe ụwa.” Ihe àmà gosiri na nke a na-ezo aka n’amụma Zekaraịa, onye hụrụ ihe ndọba oriọna nwere ngalaba asaa na osisi olive abụọ. E kwuru na osisi olive ndị ahụ sere onyinyo ‘ndị ikom abụọ e tere mmanụ,’ ya bụ, Ọchịagha bụ Zerubabel na Onyeisi Nchụàjà bụ Joshua, “ndị na-eguzo n’akụkụ Onyenwe ụwa nke a nile.”—Zekaraịa 4:1-3, 14.

14. (a) Gịnị ka ọhụụ Zekaraịa pụtara banyere osisi olive abụọ ahụ? na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ? (b) Ahụmahụ dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ ga-enwe n’oge agha ụwa mbụ ahụ?

14 Zekaraịa dịrị ndụ n’oge ọrụ mwughachi, ọhụụ ya nke osisi olive abụọ ahụ pụtakwara na a ga-eji mmụọ Jehova gọzie Zerubabel na Joshua n’ịgba ndị ahụ ume maka ọrụ ahụ. Ọhụụ nke ihe ndọba oriọna chetaara Zekaraịa ka ọ ghara ‘ileda ụbọchị ihe nta anya’ n’ihi na a gaje imezu nzube Jehova—“ọ bụghị site n’usuu ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site ná mmụọ m, ka Jehova nke usuu ndị agha sịrị.” (Zekaraịa 4:6, 10; 8:9) Ìgwè nta nke ndị Kraịst ahụ ndị nọgidere na-ebujere ndị mmadụ ìhè nke eziokwu n’oge agha ụwa mbụ ahụ ka a ga-ejikwa mee ihe n’ọrụ mwughachi. Ha ga-abụkwa isi iyi nke agbamume, n’agbanyeghịkwa na ha dị ole na ole, ha ga-amụta ịdabere n’ike Jehova, ghara ilelị oge ahụ ha ka dị nta n’ọnụ ọgụgụ.

15. (a) Eziokwu ahụ bụ na a kọwara ndị Kraịst dị ka ndịàmà abụọ na-echetakwara anyị gịnị ọzọ? Kọwaa. (b) Ụdị ihe ịrịba ama dịgasị aṅaa ka e nyere ndịàmà abụọ ikike ime?

15 Eziokwu ahụ bụ na a kọwara ha dị ka ndịàmà abụọ na-echetakwara anyị nnwogha ahụ. N’ọhụụ ahụ, ndị ozi atọ nke Jisọs hụrụ ya n’ebube Alaeze, ka ya na Mosis na Elaịja so. Nke a sere onyinyo nnọkwasị Jisọs na-anọkwasị n’elu ocheeze ebube ya na 1914 iji rụzuo ọrụ nke ndị amụma abụọ ahụ sere onyinyo ya. (Matiu 17:1-3) N’ụzọ kwekọrọ na nke a, a na-ahụ ndịàmà abụọ ahụ ugbu a dị ka ndị na-eme ihe ịrịba ama ndị na-echetara anyị banyere Mosis na Elaịja. Dị ka ihe atụ, Jọn kwuru banyere ha, sị: “Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla chọrọ imejọ ha, ọkụ na-esi n’ọnụ ha pụta, na-eripịakwa ndị iro ha; ọ bụrụkwa na onye ọ bụla ga-achọ imejọ ha, a ghaghị igbu ya otú a. Ndị a nwere ike imechi eluigwe, ka mmiri wee ghara izo n’ụbọchị nile nke amụma ha.”—Mkpughe 11:5, 6a.

16. (a) Olee otú ihe ịrịba ama ahụ metụtara ọkụ si echetara anyị oge mgbe a mara ikike Mosis aka n’Israel? (b) Olee otú ndị ndú okpukpe Krisendọm si lelịa Ndị Mmụta Bible anya wee kpalitekwara ha nsogbu n’oge agha ụwa mbụ, oleekwa otú ndị a si meghachi omume?

16 Nke a na-echetara anyị oge mgbe a mara ikike Mosis aka n’Israel. Onye amụma ahụ kwupụtara okwu ikpe ndị yiri ọkụ, Jehova bibikwara ndị nnupụisi ahụ, jiri ọkụ efu sitere n’eluigwe na-eripịa 250 n’ime ha. (Ọnụ Ọgụgụ 16:1-7, 28-35) N’otu aka ahụ, ndị ndú Krisendọm katọrọ Ndị Mmụta Bible, na-ekwu na e nyeghị ndị a ọzụzụ n’ụlọ akwụkwọ ndị ụkọchukwu. Ma, ndịàmà nke Chineke nwere iru eru ka elu dị ka ndị ozi: ndị ahụ nwere obi umeala ndị gere ntị n’ozi ahụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ. (2 Ndị Kọrint 3:2, 3) Na 1917, Ndị Mmụta Bible ahụ bipụtara akwụkwọ bụ The Finished Mystery, bụ́ nkọwa siri ike e nyere banyere akwụkwọ Mkpughe na Ezikiel. Ihe sochiri nke a bụ nkesa nke 10,000,000 traktị nwere peji anọ nke isiokwu ya bụ The Bible Students Monthly, nke isiokwu bụ isi e dere na ya bụ “Ọdịda nke Babilọn—Ihe Mere Krisendọm Aghaghị Ịta Ahụhụ Ugbu A—Ihe Ikpeazụ Ga-esi na Ya Pụta.” N’ime United States, ndị ụkọchukwu ahụ ọnụma jupụtara obi jiri ọgba aghara nke agha ahụ mere ihe ngọpụ ime ka a machibido akwụkwọ ahụ iwu. Ná mba ndị ọzọ, a machibidoro akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ ahụ iwu. Ma otú ọ dị, ndị ohu Chineke nọgidere na-ebusoghachi ha agha site ná mbipụta ndị ọzọ kpụ ọkụ n’ọnụ nke traktị ahụ nwere peji anọ nke isiokwu ya bụ Kingdom News. Ka ụbọchị Onyenwe anyị ahụ nọgidere na-aga n’ihu, akwụkwọ ndị ọzọ gaje ikpughe ọnọdụ ime mmụọ dakpọrọ adakpọ nke Krisendọm.—Tụlee Jeremaịa 5:14.

17. (a) Ihe omume dịgasị aṅaa mere n’oge Elaịja metụtara ụkọ mmiri ozuzo na ọkụ? (b) Olee otú o si bụrụ na ọkụ sitere n’ọnụ ndịàmà abụọ ahụ na-agbọpụta, ụkọ mmiri ozuzo dịkwa aṅaa ka nke a metụtara?

17 Gịnị banyere Elaịja? N’oge ndị eze Israel, onye amụma nke a kpọsara na a ga-enwe ụkọ mmiri ozuzo dị ka ngosipụta nke oké iwe Jehova megide ndị Israel ahụ na-efe Beal. Ọ nọgidere ruo afọ atọ na ọkara. (1 Ndị Eze 17:1; 18:41-45; Luk 4:25; Jemes 5:17) Mgbe oge gasịrị, mgbe Eze Ahazaịa ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi zijere ndị agha ka ha manye Elaịja ịbịa n’obíeze ya, onye amụma ahụ kpọrọ òkù, e wee si n’eluigwe zidata ọkụ iripịa ndị agha ahụ. Ọ bụ nanị mgbe otu onye ọchịagha gosiri nsọpụrụ kwesịrị ekwesị nye ọnọdụ ya dị ka onye amụma ka Elaịja kwenyere isoro ya jee n’ihu eze. (2 Ndị Eze 1:5-16) N’ụzọ dị otú ahụ, n’agbata 1914 na 1918, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ, n’atụghị egwu, dọọrọ uche gaa n’ọnọdụ ala ọkpọ nkụ ime mmụọ dị na Krisendọm, dọọkwa aka ná ntị banyere ikpe kpụ ọkụ n’ọnụ a ga-enwe ‘n’ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova, nke na-abịanụ.’—Malakaị 4:1, 5; Emọs 8:11.

18. (a) Ikike dị aṅaa ka e nyere ndịàmà abụọ ahụ, oleekwa ụzọ nke a si yie nke e nyere Mosis? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ndịàmà abụọ ahụ si kpughee Krisendọm?

18 Jọn gara n’ihu ikwu banyere ndịàmà abụọ ahụ, sị: “Ha nwekwara ike n’ebe mmiri nile dị, ime ka ha gbanwee ọbara, na iwere ihe otiti nile ọ bụla tie ụwa, ka mgbe ha ga-achọ hà.” (Mkpughe 11:6b) Ka e wee rụgide Fero ịtọhapụ ụmụ Israel ka ha laa, Jehova jiri Mosis mee ihe n’iti ndị Ijipt ahụ na-akpagbu ha ihe otiti dị iche iche, gụnyere ịgbanwe mmiri ha ka ọ ghọọ ọbara. Mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, ndị Filistia na-emegide Israel chetara nke ọma ihe ndị Jehova mere megide Ijipt, na-eme ka ha tie mkpu, sị: “Ònye ga-anapụta anyị n’aka Chi [nke a, NW] dị ike nke ukwuu? [Nke a, NW] bụ Chi nke weere ihe otiti nile ọ bụla tigbuo ndị Ijipt n’ọzara.” (1 Samuel 4:8; Abụ Ọma 105:29) Mosis sere onyinyo Jisọs, onye nwere ikike ikwupụta ihe Chineke kpere n’ikpe megide ndị ndú okpukpe nke oge ya. (Matiu 23:13; 28:18; Ọrụ 3:22) Ụmụnna Kraịst, bụ́ ndịàmà abụọ ahụ, nọgidere na-ekpughe ọdịdị na-akpata ọnwụ nke “mmiri nile” nke Krisendọm nọ na-enye ìgwè atụrụ ya n’oge agha ụwa mbụ.

E Gburu Ndịàmà Abụọ Ahụ

19. Dị ka ihe ndekọ Mkpughe si kọọ, gịnị mere mgbe ndịàmà abụọ ahụ rụzuru ọrụ ịgba àmà ha?

19 Ihe otiti nke a siri ike n’ahụ Krisendọm ruo n’ókè nke mere na mgbe ndịàmà abụọ ahụ yisịworo ákwà mkpe buo amụma ruo 42 ọnwa, Krisendọm jiri ikike o nwere n’ụwa mee ihe ‘igbu’ ha. Jọn dere, sị: “Ma mgbe ha gbasịworo àmà ha, anụ ọhịa ahụ nke na-esi n’abyss ahụ rịgopụta ga-ebu agha megide ha, meriekwa ha, gbuokwa ha. Ozu ha ga-adịkwa n’ámá nke obodo ukwu ahụ, bụ́ nke a na-akpọ Sọdọm na Ijipt n’ụzọ ime mmụọ, ebe a kpọgbukwara Onyenwe ha. Mmadụ ndị si n’etiti ndị nile na ebo nile na asụsụ nile na mba nile pụta ga-ekiri ozu ha ụbọchị atọ na nkera otu ụbọchị, ha ekweghịkwa ka a tọgbọ ozu ha n’ili. Ndị bi n’elu ụwa na-aṅụrịkwa ọṅụ n’isi ha, obi na-atọkwa ha ụtọ, ha ga-ezigarịtakwara onwe ha onyinye, n’ihi na ndị amụma abụọ ndị a mekpara ndị bi n’elu ụwa ahụ.”—Mkpughe 11:7-10, NW.

20. Gịnị bụ “anụ ọhịa ahụ nke na-esi n’abyss ahụ rịgopụta”?

20 Nke a bụ nke mbụ n’ime 37 ugbo e zoro aka ná Mkpughe n’ebe anụ ọhịa dị. Mgbe oge ya ruru, anyị ga-atụle anụ ọhịa nke a na ndị ọzọ n’ụzọ zuru ezu karị. Ma ka ọ dị ugbu a, ka anyị kwuo nanị na “anụ ọhịa ahụ nke na-esi n’abyss ahụ rịgopụta” sitere n’aka Setan, bụ́ usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị a na-ahụ anya.b—Tụlee Mkpughe 13:1; Daniel 7:2, 3, 17.

21. (a) Olee ụzọ ndị iro okpukpe nke ndịàmà abụọ ahụ si jiri ọnọdụ agha ahụ mee ihe? (b) Gịnị ka eziokwu ahụ bụ́ na a hapụrụ ozu ndịàmà abụọ ahụ n’elighị ha eli gosiri? (ch) Olee ụzọ e kwesịrị isi lee ogologo oge ahụ dị ụbọchị atọ na ọkara anya? (Lee nkọwa ala ala peji.)

21 Malite na 1914 ruo 1918, mba nile nọ n’agha ụwa mbụ. Mmetụta nke ịhụ mba n’anya rịrị elu nke ukwuu, n’oge opupu ihe ubi nke 1918, ndị okpukpe bụ́ ndị iro nke ndịàmà abụọ ahụ werekwaara ọnọdụ ọgba aghara ahụ mee ihe. Ha duuru usoro iwu nke ndị Ọchịchị gaa n’ịtụ ndị ozi nwere ibu ọrụ n’etiti Ndị Mmụta Bible mkpọrọ n’ihi ebubo ụgha nke ịbụ ndị nledo. Nke a gbagwojuru ndị kwesịrị ntụkwasị obi so ha na-arụ ọrụ anya nke ukwuu. Ọ fọrọ nke nta ka ọrụ metụtara Alaeze ahụ kwụsị kpam kpam. O yiri nnọọ ka à ga-asị na ọrụ nkwusa ahụ anwụwo. N’oge Bible, ọ bụ mweda n’ala jọgburu onwe ya ma ọ bụrụ na e tinyeghị ozu mmadụ n’ime ili. (Abụ Ọma 79:1-3; 1 Ndị Eze 13:21, 22) N’ihi nke a, eziokwu ahụ bụ́ na e lighị ndịàmà abụọ ahụ eli pụtara nkọcha dị ukwuu. N’ihi oké okpomọkụ e nwere na Palestine, ozu a hapụrụ n’akụkụ ụzọ ga-amalite nnọọ isi ísì mgbe ụbọchị atọ na ọkara nkịtị gasịrị.c (Tụlee Jọn 11:39.) Ụzọ dị otú a e si kọruchaa ihe nile ala n’amụma nke a gosiri ihe ihere nke ndịàmà abụọ ahụ na-aghaghị ịnagide. A jụrụ ikwe ka a napụta ndị a kpọtụrụ aha n’elu ebe a n’akaebe ọbụna mgbe e tinyere akwụkwọ maka mkpegharị ikpe ha. E kpughere ha n’ihu ọha ruo ogologo oge nke mere ka ha ghọọ ihe na-esi ísì nye ndị bi ‘n’obodo ukwu ahụ.’ Ma gịnị bụ “obodo ukwu” nke a?

22. (a) Gịnị bụ obodo ukwu ahụ? (b) Olee ụzọ ndị mgbasa akụkọ ọha si sonyere ndị ndú okpukpe n’ịṅụrị ọṅụ mgbe e mechiri ọnụ ndịàmà abụọ ahụ? (Lee igbe.)

22 Jọn na-enye anyị ihe àmà ụfọdụ. O kwuru na n’ebe ahụ ka a kpọgburu Jisọs. Ya mere, anyị na-eche echiche ozugbo banyere Jerusalem. Ma o kwukwara na a kpọrọ obodo ukwu ahụ Sọdọm na Ijipt. Ee, ọ dị otu mgbe a kpọrọ Jerusalem nkịtị Sọdọm n’ihi omume adịghị ọcha ya nile. (Aịsaịa 1:8-10; tụlee Ezikiel 16:49, 53-58.) Ijipt, bụ́ alaeze ụwa nke mbụ, ka a na-ejikwa eme ihe mgbe ụfọdụ iji see onyinyo usoro ihe nke ụwa nke a. (Aịsaịa 19:1, 19; Joel 3:19) N’ihi ya, obodo ukwu nke a sere onyinyo “Jerusalem” e merụrụ emerụ nke na-azọrọ na ya na-efe Chineke ma, bụrụ nke ghọworo ihe na-adịghị ọcha, na-emekwa mmehie, dị ka Sọdọm, bụrụkwa akụkụ nke usoro ihe elu ụwa nke Setan, dị ka Ijipt. O sere onyinyo Krisendọm, bụ́ ihe ya na Jerusalem ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi kwekọrọ n’oge a, bụ́ òtù ahụ nke ndị nọ n’ime ya nwere oké ihe mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ mgbe ha mechiri ọnụ ndịàmà abụọ ahụ na-ekwusa ozi na-enye ha nsogbu.

A Kpọlitere Ha Ọzọ!

23. (a) Gịnị mere ndịàmà abụọ ahụ mgbe ụbọchị atọ na nkera otu ụbọchị gasịrị, mmetụta dị aṅaa ka nke a nwekwara n’ahụ ndị iro ha? (b) Olee mgbe Mkpughe 11:11, 12 na amụma Ezikiel banyere Jehova ikusa ume na ndagwurugwu nke ọkpụkpụ kpọrọ nkụ nwere mmezu ha nke oge a?

23 Ụzọ mgbasa akụkọ ọha sonyeere ndị ụkọchukwu n’ịkọtọ ndị Chineke, otu n’ime akwụkwọ akụkọ ndị ahụ kwuru, sị: “E wetawo akwụkwọ The Finished Mystery ahụ n’ọgwụgwụ ya.” Otú ọ dị, nke a abụghị eziokwu ma ọlị! Ndịàmà abụọ ahụ anọgideghị dị ka ndị nwụrụ anwụ. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe ụbọchị atọ na nkera otu ụbọchị ahụ gasịrị mmụọ nke ndụ nke si na Chineke pụta wee bata n’ime ha, ha wee guzo n’ụkwụ ha; oké egwu wee dakwasị ndị na-ekiri ha. Ha wee nụ oké olu nke si n’eluigwe daa, ka ọ na-asị ha, Rịgotanụ n’ebe a. Ha wee rịgoruo n’eluigwe n’ime igwe ojii ahụ; ndị iro ha kirikwara ha.” (Mkpughe 11:11, 12) Otú a, ha nwere ahụmahụ yiri nke ọkpụkpụ kpọrọ nkụ ndị dị na ndagwurugwu ahụ ebe Ezikiel jere n’ọhụụ. Jehova kusara ọkpụkpụ kpọrọ nkụ ndị a ume, ha wee dịghachi ndụ ọzọ, wee si otú a na-ese onyinyo mmụghachi nke mba Israel mgbe 70 afọ nke ndọta n’agha na Babilọn gasịrị. (Ezikiel 37:1-14) Amụma abụọ ndị a, nke dị n’Ezikiel na nke dị ná Mkpughe, nwere mmezu oge a nke pụtara ìhè n’afọ 1919, mgbe Jehova weghachiri ndịàmà ya “nwụrụ anwụ” ná ndụ.

24. Mgbe ndịàmà abụọ ahụ dịghachiri ndụ, mmetụta dị aṅaa ka nke a nwere n’ahụ ndị okpukpe na-akpagbu ha?

24 Lee nnọọ ihe oké egwu nke a ga-abụrụ ndị ahụ na-akpagbu ha! Ozu nke ndịàmà abụọ ahụ adịghachiwo ndụ ọzọ na mberede. Ọ bụụrụ ndị ndú okpukpe ndị ahụ oké ihe ilu ịnagide, ọ dịkwa otú ahụ karịa kemgbe ndị ozi ndị Kraịst ahụ ha meworo atụmatụ ịtụ mkpọrọ nweere onwe ha ọzọ, e wee mesịa kachapụ ebubo nile e boro ha kpam kpam. Egwu ahụ aghaghị ịdịworịị ukwuu ọbụna karị mgbe Ndị Mmụta Bible ahụ nwere mgbakọ ha na Cedar Point, Ohio, U.S.A., na September 1919. N’ebe a, onyeisi oche Watch Tower Society ahụ a tọhapụrụ ọhụrụ, bụ́ J. F. Rutherford, kpaliri ndị bịara mgbakọ ahụ site n’okwu ya nke isiokwu ya bụ “Ikwupụta Alaeze Ahụ,” nke dabeere ná Mkpughe 15:2 na Aịsaịa 52:7. Ndị nọ n’òtù Jọn ahụ maliteghachikwara ọzọ ‘ibu amụma,’ ma ọ bụ ikwusa n’ihu ọha. Ike ha na-abawanye ụba, ha na-ekpughekwa ihu abụọ nke Krisendọm n’atụghị egwu.

25. (a) Olee mgbe a gwara ndịàmà abụọ ahụ, sị, “Rịgotanụ n’ebe a,” oleekwa otú nke ahụ si mee? (b) Oké mmetụta dị aṅaa dị egwu ka mweghachi nke ndịàmà abụọ ahụ nwere n’obodo ukwu ahụ?

25 Krisendọm gbalịrị ọtụtụ ugbo inweghachi ụdị mmeri ahụ ha nwere na 1918 ọzọ. Ọ malitere iji ọha mmadụ na-emeso ha ihe ike, aghụghọ usoro ikpe ikpe, ịtụ mkpọrọ, ọbụna ogbugbu ihu ọha—ma ọ dịghị nke ọ bụla nwere isi! Mgbe 1919 gasịrị, aka ya apụghị irukwa ọnọdụ ime mmụọ nke ndịàmà abụọ ahụ. N’afọ ahụ, Jehova agwawo ha, sị: “Rịgotanụ n’ebe a,” ha rịgokwara gaa n’ọnọdụ ime mmụọ ka elu ebe ndị iro ha pụrụ nanị ịhụ ha anya, ma ha apụghị ibitụ ha aka. Jọn kọwara oké mmetụta mweghachi ha nwere n’ahụ obodo ukwu ahụ, sị: “N’otu oge hour ahụ oké ala ọma jijiji wee daa, otu ụzọ n’ụzọ iri nke obodo ahụ wee daa ruo ala; e wee gbuo [puku mmadụ asaa] n’ime ala ọma jijiji ahụ, bụ ndị nwere aha: ndị fọdụrụ wee tụọ egwu, ha wee nye Chineke nke eluigwe otuto.” (Mkpughe 11:13) N’ezie, e nwere oké ọgba aghara n’okpukpe. O yiri ka è nwere ala ọma jijiji n’okpuru ndị ndú nke chọọchị ndị bụ isi ka ìgwè nke ndị Kraịst a nke a tụteghachiri malitere ọrụ. Nke a nwere oké mmetụta n’ahụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke obodo ha, nke bụ n’ụzọ ihe atụ 7,000 mmadụ, ruo n’ókè na e kwuru okwu ha dị ka ndị e gburu egbu.

26. Olee ndị ka “otu ụzọ n’ụzọ iri nke obodo ahụ” na ‘puku mmadụ asaa’ ahụ sere onyinyo ha ná Mkpughe 11:13? Kọwaa.

26 Okwu ahụ bụ “otu ụzọ n’ụzọ iri nke obodo ahụ” na-echetara anyị na Aịsaịa buru amụma banyere Jerusalem oge ochie na otu ụzọ n’ụzọ iri ga-alanarị mbibi nke obodo ahụ dị ka mkpụrụ nsọ. (Aịsaịa 6:13) N’otu aka ahụ, ọnụ ọgụgụ ahụ bụ 7,000 na-echetara anyị mgbe ahụ Elaịja chere na ọ bụ nanị ya bụ onye fọdụrụnụ nke kwesịrị ntụkwasị obi n’Israel, Jehova gwara ya na a ka nwere n’ezie 7,000 ndị na-egbughị ikpere n’ala nye Beal. (1 Ndị Eze 19:14, 18) N’ime narị afọ mbụ, Pọl onyeozi kwuru na 7,000 mmadụ ndị a sere onyinyo ihe fọdụrụ ná ndị Juu, ndị nakweere ozi ọma ahụ banyere Kraịst. (Ndị Rom 11:1-5) Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na-enyere anyị aka ịghọta na ‘puku mmadụ asaa’ ahụ na “otu ụzọ n’ụzọ iri nke obodo ahụ” dị ná Mkpughe 11:13 bụ ndị ahụ nakweere ihe ndịàmà abụọ ahụ e weghachiworo na-ekwu wee hapụ obodo ukwu ahụ nke na-eme mmehie. Ha na-anwụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, n’ihe banyere Krisendọm. A na-ewepụ aha ha ná ndekọ nke ndị so n’òtù ha. Dị ka o si ele ihe anya, ha adịghịkwa adị ọzọ.d

27, 28. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ‘ndị fọdụrụnụ si nye Chineke nke eluigwe otuto’? (b) Gịnị ka a manyere ndị ndú okpukpe Krisendọm ịnakwere?

27 Ma n’ụzọ dị aṅaa ka ‘ndị fọdụrụ [na Krisendọm] si nye Chineke nke eluigwe otuto’? O doro anya na ọ bụghị site n’ịhapụ okpukpe ha nke dapụworo n’usoro ezi ofufe wee ghọọ ndị ohu Chineke n’onwe ha. Kama nke ahụ, mgbe a na-atụle okwu ahụ bụ “wee nye Chineke nke eluigwe otuto,” a kọwara ya n’akwụkwọ ahụ bụ Word Studies in the New Testament, nke Vincent dere. N’ebe ahụ e kwuru, sị: “Okwu ahụ egosighị ntọghata, o gosighịkwa nchegharị, o gosighịkwa inye ekele, kama ịmata, nke bụ echiche a na-eji ejikarị okwu ahụ eme ihe n’akwụkwọ nsọ. Tụlee Josh. vii. 19 (Sept.). Jọn ix. 24; Ọrụ xii. 23; Rom iv. 20.” Ọ bụụrụ Krisendọm ihe oké ọnụma ịnakwere na Chineke nke Ndị Mmụta Bible ahụ emewo oké ihe n’iweghachi ha n’ọrụ ndị Kraịst.

28 Ọ pụrụ ịbụ na ndị ndú okpukpe mere nnakwere nke a n’ime uche ha, ma ọ bụ nye nanị onwe ha. Ọ pụtara nnọọ ìhè na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha e nwere ihe ndekọ banyere ya dị ka onye pụtara n’ihu ọha nakwere Chineke nke ndịàmà abụọ ahụ. Ma, amụma Jehova site n’ọnụ Jọn na-enyere anyị aka ịghọta ihe dị n’obi ha, ịmatakwa mmetụta dị egwu nke a nwere n’ahụ ha na 1919. Site n’afọ ahụ gaa n’ihu, ka ‘puku asaa’ ahụ hapụrụ Krisendọm n’agbanyeghị mgbalị ya nile ijigide ìgwè atụrụ ya, a manyere ndị ndú okpukpe ịmata na Chineke nke òtù Jọn ahụ siri ike karịa nke ha. N’afọ ndị sochirinụ, ha ga-amata nke a ọbụna n’ụzọ pụtara ìhè karị, ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị ọzọ ka ga-esite n’ìgwè atụrụ ha pụọ, na-ekwughachi okwu ahụ ndị mmadụ kwuru mgbe Elaịja meriri ndị okpukpe Beal n’Ugwu Kamel, sị: “Jehova, ya onwe ya bụ Chineke; Jehova, ya onwe ya bụ Chineke.”—1 Ndị Eze 18:39.

29. Gịnị ka Jọn kwuru na ọ na-abịa ọsọ ọsọ, ịma jijiji ọzọ dịkwa aṅaa na-eche Krisendọm ihu?

29 Ma, gee ntị! Jọn na-agwa anyị, sị: “Ahụhụ nke abụọ agabigawo: lee, ahụhụ nke atọ na-abịa ọsọ ọsọ.” (Mkpughe 11:14) Ọ bụrụ na ihe meworo ruo ugbu a emewo ka Krisendọm maa jijiji, gịnị ka ọ ga-eme mgbe a mara ọkwa ahụhụ nke atọ ahụ, mgbe mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ya, mgbe a ga-emesịkwa mezuo ihe omimi nke Chineke?—Mkpughe 10:7.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nweta nkọwa zuru ezu banyere oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke a, lee isiokwu bụ́ “Oké Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ nke Jehova” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke July 1, 1996 nakwa “Otu Ezi Ụlọ Nsọ Ebe A Ga-efe Ofufe” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke August 1, 1973.

b “Abyss” (Grik, aʹbys·sos; Hibru, tehohmʹ) na-ezo aka n’ụzọ ihe atụ n’ebe a na-adịghị eme ihe ọ bụla. (Lee Mkpughe 9:2.) Otú ọ dị, n’ụzọ nkịtị, ọ pụrụ izokwa aka n’oké osimiri. A na-asụgharịkarị okwu Hibru ahụ ịbụ “ogbu mmiri.” (Abụ Ọma 71:20; 106:9; Jona 2:5) N’ihi ya, a pụrụ ijikọ “anụ ọhịa ahụ nke na-esi n’abyss ahụ rịgopụta” na ‘anụ ọhịa nke na-esi n’oké osimiri rịgopụta.’—Mkpughe 11:7; 13:1.

c Rịba ama na n’ịtụle ahụmahụ ndị Chineke n’oge a, o yiri ka n’agbanyeghị na ọnwa 42 ndị ahụ nọchiri anya afọ atọ na ọkara nkịtị, ụbọchị atọ na ọkara ahụ anọchighị anya ogologo oge nkịtị nke 84 hour. O yiri ka à kpọtụrụ oge ahụ bụ́ ụbọchị atọ na ọkara aha ugbo abụọ (n’amaokwu 9 na 11) iji mee ka ọ pụta ìhè na ọ ga-abụ nanị oge dị mkpirikpi ma e jiri ya tụnyere oge ịrụ ọrụ ahụ sochiri ya nke dị afọ atọ na ọkara.

d Tụlee ojiji e jiri okwu ndị ahụ bụ ‘nwụrụ anwụ,’ ‘nwụọ,’ na “na-adị ndụ” mee ihe n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Ndị Rom 6:2, 10, 11; 7:4, 6, 9; Ndị Galetia 2:19; Ndị Kọlọsi 2:20; 3:3.

Igbe dị na peeji nke 168]

Ịṅụrị Ọṅụ nke Mkpughe 11:10

N’akwụkwọ ya bụ́ Preachers Present Arms, nke e bipụtara na 1933, Ray H. Abrams zoro aka ná mmegide dị ilu ndị ndú okpukpe megidere akwụkwọ nke Ndị Mmụta Bible bụ́ The Finished Mystery. Ọ tụleghachiri mgbalị nile ndị ndú okpukpe mere ikpochapụ Ndị Mmụta Bible ahụ na “ozizi ha yiri ọrịa na-efe efe.” Nke a dujere n’okwu ikpe ahụ nke mere e ji tụọ J. F. Rutherford na mmadụ asaa ndị ọzọ mkpọrọ ọtụtụ afọ. Dr. Abrams kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na a tụlee eziokwu ahụ nke ọma, ọ na-eduje ná nkwubi okwu ahụ bụ́ na chọọchị na ndị ụkọchukwu ha bụ ndị bụ isi na-akwado mgbalị ahụ e mere ikpochapụ ndị òtù Russell. Na Canada, na February, 1918, ndị ụkọchukwu malitere usoro ime mkpọsa megide ha na akwụkwọ ha nile, karịsịa akwụkwọ The Finished Mystery ahụ. Dị ka akwụkwọ akụkọ ndị Winnipeg bụ́ Tribune si kwuo, . . . a na-eche na mkpagbu nke akwụkwọ ha sitere kpọmkwem ná ‘nkwupụta ọchịchọ ndị ndú okpukpe.’”

Dr. Abrams gara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe ndị editọ nke akwụkwọ akụkọ okpukpe dị iche iche natara ozi banyere mkpọrọ iri afọ abụọ a tụrụ ha, nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ndị a, ma nke ukwu ma nke nta, ṅụrịrị ọṅụ banyere ya. Enwebeghị m ike ịhụta okwu ọ bụla gosiri ọmịiko n’akwụkwọ ọ bụla nke ndị okpukpe bụ́ isi. ‘Ọ dịghị ajụjụ ọ bụla dị ya,’ ka Upton Sinclair kwubiri, na ‘mmegide ahụ . . . sitere n’otu akụkụ, n’eziokwu ahụ bụ́ na ha enwetawo ịkpọasị nke òtù okpukpe “ndị bụ isi.”’ Ihe mgbalị ndị chọọchị jikọrọ aka mee na-enwebeghị ike ime ka o yiri ka ndị ọchịchị emezuworo ha ugbu a.” Mgbe o hotasịrị okwu nkatọ ụfọdụ nke akwụkwọ okpukpe dị iche iche kwuru, onye dere ihe ahụ zoro aka ná nkagbu nke ụlọikpe ukwu bụ́ Court of Appeals kagburu mkpebi ahụ, wee sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla ndị chọọchị nile kwuru banyere mkpebi ikpe nke a.”

[Foto dị na peeji nke 163]

Jọn tụrụ ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ—òtù ndị nchụàjà ahụ e tere mmanụ aghaghị iru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ a chọrọ

[Foto ndị dị na peeji nke 165]

Ọrụ mwughachi ahụ Zerubabel na Joshua rụrụ gosiri na n’ụbọchị Onyenwe anyị, oké mmụba n’etiti Ndịàmà Jehova ga-esochi mmalite ndị dị nta. Ụlọ ọrụ obibi akwụkwọ ndị e gosiri n’elu, bụ́ ndị dị na Brooklyn, New York, abụrụwo nke e wusawanyeworo nke ukwuu iji nye aka igbo mkpa ha

[Foto ndị dị na peeji nke 166]

Ọrụ ibu amụma nke Mosis na Elaịja sere onyinyo ozi ikpe ọmụma kpụ ọkụ n’ọnụ ndị ndịàmà abụọ ahụ kpọsara

[Foto ndị dị na peeji nke 169]

Dị ka ọkpụkpụ ndị ahụ kpọrọ nkụ nke e kwuru banyere ha n’Ezikiel isi nke 37, a tụteghachiri ndịàmà abụọ ahụ maka ọrụ nkwusa nke oge a

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya