Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 7/1 p. 14-19
  • Oké Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ nke Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oké Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ nke Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke Eluigwe
  • Akụkụ Ndị Ọzọ nke Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ Chineke
  • Ebe Nsọ Ahụ
  • Ebube Ka Ukwuu nke Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ nke Chineke
  • Jiri Ihe Ọma Meere Gị Ife Jehova n’Ụlọ Nsọ Ihe Atụ Ya Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • “Ụlọ Ekpere Mba Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịghọta Ihe Mere O Ji Bụrụ na Mesaịa Ahụ Ga-abịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 7/1 p. 14-19

Oké Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ nke Jehova

“Anyị nwere onye isi nchụàjà dị otú a, . . . Onye na-efe ofufe n’ebe nsọ ahụ, na n’ezi ụlọikwuu ahụ, nke Onyenwe anyị mara, ọ bụghị mmadụ.”—NDỊ HIBRU 8:1, 2.

1. Olee ndokwa ịhụnanya nke Chineke mere maka ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie?

JEHOVA CHINEKE, n’ihi oké ịhụnanya o nwere maka ihe a kpọrọ mmadụ, nyere otu àjà iji bupụ mmehie nke ụwa. (Jọn 1:29; 3:16) Ọ dị mkpa isite n’eluigwe bufee ndụ nke Ọkpara ya e bu ụzọ mụọ n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ onye Juu nke aha ya bụ Meri. Mmụọ ozi Jehova kọwaara Meri n’ụzọ doro anya na a ga-akpọ nwa ahụ ọ ga-adị ime ya “Ihe dị nsọ . . . Ọkpara Chineke.” (Luk 1:34, 35) A gwara Josef, bụ́ onye kwere Meri nkwa ọlụlụ, banyere ọdịdị ọrụ ebube nke ịtụrụ ime Jisọs, ọ matakwa na onye a “ga-azọpụta ndị nke Ya ná mmehie nile ha.”—Matiu 1:20, 21.

2. Gịnị ka Jisọs mere mgbe ọ dị ihe dị ka 30 afọ, n’ihi gịnịkwa?

2 Ka Jisọs na-etolite, ọ ghaghị ịghọtaworị ụfọdụ n’ime eziokwu ndị a banyere otú e si mụọ ya n’ụzọ ọrụ ebube. Ọ maara na Nna ya nke eluigwe nwere ọrụ nzọpụta ndụ nye ya ịrụ n’elu ala. Ya mere, dị ka nwoke tozuru okè nke dị ihe dị ka 30 afọ, Jisọs bịakwutere onye amụma Chineke, bụ́ Jọn, ka e mee ya baptism n’Osimiri Jọdan.—Mak 1:9; Luk 3:23.

3. (a) Gịnị ka Jisọs bu n’uche n’ikwu, sị, “Àjà na ihe e chere n’ihu Gị, Ị chọghị ha”? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa magburu onwe ya ka Jisọs setịpụrụ maka ndị nile chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?

3 Jisọs nọ na-ekpe ekpere n’oge e mere ya baptism. (Luk 3:21) Dị ka ihe àmà gosiri, malite n’oge a gaa n’ihu ná ndụ ya, o mezuru ihe ndị e kwuru n’Abụ Ọma 40:6-8, dị ka Pọl onyeozi mesịrị gosi: “Àjà na ihe e chere n’ihu Gị, Ị chọghị ha, ma ahụ ka Ị kwadebere nye m.” (Ndị Hibru 10:5) Jisọs si otú a gosi mmata ọ matara na Chineke ‘achọghị’ ka a nọgide na-achụ àjà anụmanụ n’ụlọ nsọ Jerusalem. Kama nke ahụ, ọ ghọtara na Chineke akwadebeworo ya, Jisọs, ahụ mmadụ zuru okè ịchụ dị ka àjà. Nke a ga-eme ka àjà ụmụ anụmanụ ghara ịdịkwa mkpa ọzọ. N’igosi ọchịchọ ya sitere n’obi ido onwe ya n’okpuru uche Chineke, Jisọs gara n’ihu ikpe ekpere, sị: “Lee, abịawo m (n’akwụkwọ mpịakọta ka e deworo ihe banyere m) ime ihe Ị na-achọ, Chineke.” (Ndị Hibru 10:7) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke obi ike na nraranye achọghị ọdịmma onwe onye nke Jisọs setịpụrụ n’ụbọchị ahụ maka ndị nile ga-emesịa ghọọ ndị na-eso ụzọ ya!—Mak 8:34.

4. Olee otú Chineke si gosi nnabata ọ nabatara onyinye Jisọs nyere onwe ya?

4 Chineke ò gosiri nnabata nke ekpere baptism ahụ nke Jisọs? Ka otu n’ime ndị ozi Jisọs ọ họtara nye anyị azịza ya: “Ma mgbe e mere Jisọs baptism, ngwa ngwa O si ná mmiri rịgota: ma lee, e meghere eluigwe nye Ya, O wee hụ Mmụọ nke Chineke ka Ọ na-efeda dị ka nduru, na-ebekwasịkwa Ya; ma lee, olu sitere n’eluigwe, sị, Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma.”—Matiu 3:16, 17; Luk 3:21, 22.

5. Gịnị ka ebe ịchụàjà nke ụlọ nsọ nkịtị ahụ sere onyinyo ya?

5 Nnakwere Chineke nakweere ochiche e chere ahụ Jisọs dị ka àjà pụtara na, n’echiche ime mmụọ, ebe ịchụàjà karịrị nke dị n’ụlọ nsọ Jerusalem apụtawo ìhè. Ebe ịchụàjà nkịtị ahụ a na-achụ ụmụ anụmanụ n’àjà sere onyinyo ebe ịchụàjà ime mmụọ ahụ, nke bụ n’ezie ‘ọchịchọ’ ma ọ bụ ndokwa Chineke maka ịnakwere ndụ mmadụ Jisọs dị ka àjà. (Ndị Hibru 10:10) Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji nwee ike idegara ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, sị: “Anyị nwere ebe ịchụàjà, nke ndị na-ekpe ekpere n’ụlọikwuu Chineke na-enweghị ike iri ihe si n’ime ya pụta.” (Ndị Hibru 13:10) Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ezi ndị Kraịst na-erite uru site n’àjà mkpuchi mmehie nke ka ukwuu, nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nchụàjà bụ́ ndị Juu jụrụ.

6. (a) Gịnị pụtara ìhè n’oge e mere Jisọs baptism? (b) Gịnị ka utu aha ahụ bụ́ Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst, pụtara?

6 Iji mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ pụtara na Chineke ewepụtawo ugbu a ndokwa nile nke ụlọ nsọ ime mmụọ ya, Jisọs na-ejekwa ozi na ya dị ka Onye Isi Nchụàjà. (Ọrụ 10:38; Ndị Hibru 5:5) E nyere Luk onye na-eso ụzọ ike mmụọ nsọ ikwu kpọmkwem afọ mgbe ihe omume a dị mkpa mere dị ka nke bụ́ “n’afọ nke iri na ise n’ọchịchị nke Taịbirịọs Siza.” (Luk 3:1-3) Nke ahụ dabara n’afọ 29 O.A.—kpọmkwem 69 izu nke afọ, ma ọ bụ 483 afọ, malite n’oge Eze Ataksakses nyererị iwu ka e wughachi mgbidi Jerusalem. (Nehemaịa 2:1, 5-8) Dị ka e buru n’amụma, “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú” ga-apụta n’afọ ahụ a kara aka. (Daniel 9:25) Ihe àmà gosiri na ọtụtụ ndị Juu maara nke a. Luk na-akọ na “ndị Juu nọ na-ele anya” mpụta nke Mesaịa ahụ, ma ọ bụ Kraịst, utu aha ndị sitere n’okwu Hibru na Grik pụtara otu ihe ahụ, “onye e tere mmanụ.”—Luk 3:15.

7. (a) Olee mgbe Chineke tere “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” mmanụ, gịnịkwa ka nke a pụtara? (b) Gịnị ọzọkwa mere Jisọs n’oge e mere ya baptism?

7 N’oge e mere Jisọs baptism, e tere ebe obibi eluigwe nke Chineke mmanụ, ma ọ bụ doo ya iche, dị ka “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” ná ndokwa oké ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ. (Daniel 9:24, NW) ‘Ezi ụlọikwuu ahụ, [ma ọ bụ, ụlọ nsọ], nke Onyenwe anyị mara, ọ bụghị mmadụ’ amalitela ịrụ ọrụ. (Ndị Hibru 8:2) Ọzọkwa, site na baptism nke e ji mmiri na mmụọ nsọ mee ya, a mụrụ nwoke ahụ bụ́ Jisọs Kraịst ọzọ dị ka Ọkpara ime mmụọ nke Chineke. (Tụlee Jọn 3:3.) Nke a pụtara na mgbe oge ruru Chineke ga-akpọghachite Ọkpara ya ná ndụ eluigwe, bụ́ ebe ọ ga-eje ozi n’aka nri nke Nna ya dị ka Eze na Onye Isi Nchụàjà “dị ka usoro nke Melkizedek si dị.”—Ndị Hibru 6:20; Abụ Ọma 110:1, 4.

Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke Eluigwe

8. Olee akụkụ ndị ọhụrụ nke ocheeze Chineke werewooro ugbu a?

8 N’ụbọchị e mere Jisọs baptism, ocheeze eluigwe nke Chineke malitere inwe akụkụ ndị ọhụrụ. Ọchịchọ a chọrọ àjà mmadụ zuru okè kpọmkwem iji kpuchie mmehie ụwa na-emesi ọdịiche dị n’ịdị nsọ nke Chineke na ime mmehie nke mmadụ ike. E mekwara ka ebere Chineke pụta ìhè n’ihi na o gosipụtara ugbu a ịdị njikere ya ikwe ka a rịọta ya, ma ọ bụ mee ka obi jụrụ ya. N’ụzọ dị otú a ocheeze Chineke nke dị n’eluigwe aghọọla nke yiri nkebi nke kasị dịrị n’ime nke ụlọ nsọ ahụ, bụ́ ebe onye isi nchụàjà ahụ na-eji ọbara anụmanụ abanye otu ugboro n’afọ iji kpuchie mmehie n’ụzọ ihe atụ.

9. (a) Gịnị ka ákwà mgbochi nke dị n’agbata Ebe Nsọ na Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile sere onyinyo ya? (b) Olee otú Jisọs si gabiga ákwà mgbochi nke ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke?

9 Ákwà mgbochi ahụ nke kebiri Ebe Nsọ ahụ na Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile sere onyinyo anụ ahụ Jisọs. (Ndị Hibru 10:19, 20) Ọ bụ ihe mgbochi nke mere ka Jisọs ghara ịbanye n’ebe Nna ya nọ mgbe ọ bụ mmadụ n’elu ala. (1 Ndị Kọrint 15:50) N’oge Jisọs nwụrụ, “ákwà mgbochi nke ụlọ nsọ Chineke gbawara iberibe abụọ site n’elu ruo ala.” (Matiu 27:51) Nke a gosiri n’ụzọ dị ịrịba ama na e wepụwo ugbu a ihe mgbochi ahụ na-egbochi Jisọs ịbanye n’eluigwe. Ụbọchị atọ ka e mesịrị, Jehova Chineke rụrụ otu ọrụ ebube pụrụ iche. O si n’ọnwụ kpọlite Jisọs, ọ bụghị dị ka mmadụ na-anwụ anwụ nke nwere anụ ahụ na ọbara, kama dị ka mmụọ e kere eke dị ebube onye “na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (Ndị Hibru 7:24) Iri ụbọchị anọ n’ihu, Jisọs rịgooro n’eluigwe wee banye “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile,” “igosi Onwe ya n’ihu Chineke n’ihi anyị.”—Ndị Hibru 9:24.

10. (a) Gịnị mere mgbe Jisọs chesịrị uru nke àjà ya n’ihu Nna ya nke eluigwe? (b) Gịnị ka iji mmụọ nsọ tee mmanụ pụtaara ndị na-eso ụzọ Kraịst?

10 Chineke ọ̀ nakweere uru nke ọbara Jisọs a wụsịrị dị ka ihe mkpuchi mmehie nke ụwa? N’ezie, ọ nakweere ya. Ihe àmà gosiri nke a bịara kpọmkwem 50 ụbọchị mgbe mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, n’ụbọchị ememe bụ́ Pentikọst. A wụkwasịrị 120 ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ́ ndị zukọtara na Jerusalem mmụọ nsọ Chineke. (Ọrụ 2:1, 4, 33) Dị ka Onye Isi Nchụàjà ha, bụ́ Jisọs Kraịst, e tere ha mmanụ ugbu a ije ozi dị ka “òtù ndị nchụàjà dị nsọ, ịchụ àjà [ime mmụọ, NW]” n’okpuru ndokwa nke oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke. (1 Pita 2:5) Ọzọkwa, ndị a e tere mmanụ mejupụtara mba ọhụrụ, “mba dị nsọ” nke Israel ime mmụọ nke Chineke. Site n’oge ahụ gaa n’ihu, amụma ihe ọma nile e buru banyere Israel, dị ka nkwa “ọgbụgba ndụ ọhụrụ” ahụ nke e dekọrọ na Jeremaịa 31:31, gaje imezu n’ahụ ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ “Israel nke Chineke” n’ezie.—1 Pita 2:9; Ndị Galetia 6:16.

Akụkụ Ndị Ọzọ nke Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ Chineke

11, 12. (a) Gịnị ka ogige ndị nchụàjà sere onyinyo ya n’ihe banyere Jisọs, gịnịkwa ka ọ bụ n’ihe banyere ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ? (b) Gịnị ka ite ọsịsa mmiri ahụ sere onyinyo ya, oleekwa ụzọ e si eji ya eme ihe?

11 Ọ bụ ezie na Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile sere onyinyo nke ‘eluigwe onwe ya,’ bụ́ ebe Chineke nọkwasịrị n’ocheeze, akụkụ ndị ọzọ nile nke ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke metụtara ihe ndị dị n’elu ala. (Ndị Hibru 9:24) N’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem, e nwere ogige ndị nchụàjà nke dị n’ime nke nwere ebe ịchụàjà na nnukwute ite ọsịsa mmiri, bụ́ nke ndị nchụàjà na-eji asacha onwe ha tupu ha ana-eje ozi dị nsọ. Gịnị ka ihe ndị a na-ese onyinyo ha ná ndokwa ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke?

12 N’ihe banyere Jisọs Kraịst, ogige ndị nchụàjà ahụ nke dị n’ime sere onyinyo ọnọdụ enweghị mmehie ya dị ka Ọkpara Chineke bụ́ mmadụ zuru okè. Site n’inwe okwukwe n’àjà Jisọs, a gụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst e tere mmanụ ná ndị ezi omume. N’ihi ya, Chineke pụrụ imeso ha n’izi ezi dị ka a ga-asị na ha enweghị mmehie ọ bụla. (Ndị Rom 5:1; 8:1, 33) Ya mere, ogige a na-esekwa onyinyo ọnọdụ ezi omume mmadụ nke a gụụrụ ndị so n’òtù ndị nchụàjà ahụ dị nsọ n’ebe Chineke nọ n’otu n’otu. N’otu mgbe ahụkwa, ndị Kraịst e tere mmanụ ka bụ ndị na-ezughị okè ma nwee ike ime mmehie. Ite ọsịsa mmiri dị n’ogige ahụ na-ese onyinyo Okwu Chineke, nke Onye Isi Nchụàjà ahụ na-eji asacha òtù ndị nchụàjà ahụ dị nsọ n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu. Site n’inyefe onwe ha n’usoro nsacha nke a, ha enwetawo ọdịdị dị ùgwù nke na-asọpụrụ Chineke ma na-adọta ndị nọ n’èzí n’ebe ofufe ya dị ọcha dị.—Ndị Efesọs 5:25, 26; tụlee Malakaị 3:1-3.

Ebe Nsọ Ahụ

13, 14. (a) Gịnị ka Ebe Nsọ nke ụlọ nsọ ahụ na-ese onyinyo ya n’ihe banyere Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ? (b) Gịnị ka ihe ndọba oriọna ahụ e ji ọlaedo mee na-ese onyinyo ya?

13 Nkebi nke mbụ nke ụlọ nsọ ahụ na-ese onyinyo ọnọdụ karịrị nke ogige ahụ. N’ihe banyere mmadụ ahụ zuru okè bụ́ Jisọs Kraịst, ọ na-ese onyinyo ịmụ ya ọzọ dị ka Ọkpara ime mmụọ nke Chineke onye e buru ụzọ kpebie na ọ ga-alaghachi ná ndụ eluigwe. Mgbe a gụsịrị ha ná ndị ezi omume ná ndabere nke okwukwe ha nwere n’ọbara Kraịst a wụsịrị, ndị a na-eso ụzọ e tere mmanụ na-enwekwa ahụmahụ nke ịrụ ọrụ a pụrụ iche nke mmụọ Chineke. (Ndị Rom 8:14-17) Site na “mmiri [ya bụ, baptism ha] na Mmụọ Nsọ,” a ‘na-amụ ha ọzọ’ dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke. N’ụzọ dị otú a, ha nwere olileanya nke ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe dị ka ụmụ Chineke ndị bụ mmụọ, ma ọ bụrụhaala na ha anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ.—Jọn 3:5, 7; Mkpughe 2:10.

14 Ndị na-efe ofufe nọ n’èzí adịghị ahụ ndị nchụàjà na-eje ozi n’Ebe Nsọ nke ụlọ nsọ elu ala ahụ. N’otu aka ahụ, ndị Kraịst e tere mmanụ na-enweta ọnọdụ ime mmụọ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-efe Chineke na-adịghị eso ha enweta ma ọ bụ aghọta n’ụzọ zuru ezu, bụ́ ndị olileanya ha bụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala paradaịs. Ihe ndọba oriọna ahụ e ji ọlaedo mee nke dị n’ụlọikwuu ahụ na-ese onyinyo ọnọdụ inwe nghọta nke ndị Kraịst e tere mmanụ. Ịrụ ọrụ nke mmụọ nsọ Chineke, dị ka mmanụ ọkụ dị n’oriọna ndị ahụ, na-amụkwasị ìhè na Bible. Ndị Kraịst adịghị ezochi nghọta ha na-enweta n’ihi ya. Kama nke ahụ, ha na-erubere Jisọs isi, bụ́ onye kwuru, sị: “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa. . . . Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.”—Matiu 5:14, 16.

15. Gịnị ka achịcha dị n’elu table achịcha ihu Chineke sere onyinyo ya?

15 Iji nọgide n’ọnọdụ inwe nghọta nke a, ndị Kraịst e tere mmanụ aghaghị ịdị na-erichi nri anya site n’ihe achịcha dị n’elu table nke achịcha ihu Chineke na-ese onyinyo ya. Ebe bụ isi ha si enweta nri ime mmụọ bụ Okwu Chineke, bụ́ nke ha na-agbalịsi ike ịgụ na ịtụgharị uche na ya kwa ụbọchị. Jisọs kwekwara nkwa inye ha “ihe e ji azụ ha n’oge ya” site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45) “Ohu” a bụ òtù ndị Kraịst nile e tere mmanụ nọ n’elu ala n’otu oge ọ bụla. Kraịst ejiriwo òtù a e tere mmanụ mee ihe iji bipụta ihe ọmụma banyere mmezu nke amụma dị iche iche nke Bible na inye nduzi bịara n’ezi oge n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị n’oge a. Ya mere, ndị Kraịst e tere mmanụ ji ekele na-eri nri ime mmụọ nile dị otú ahụ. Ma ha ịnọgide na-adị ndụ n’ụzọ ime mmụọ dabeere n’ihe karịrị iweba ihe ọmụma nke Chineke n’uche na n’obi ha. Jisọs kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka M na-eme ihe Onye zitere m na-achọ, ka M rụzuokwa ọrụ Ya.” (Jọn 4:34) N’otu aka ahụ, ndị Kraịst e tere mmanụ na-enweta afọ ojuju site n’ịdị na-etinye onwe ha kwa ụbọchị n’ime uche Chineke nke e kpughere ekpughe.

16. Gịnị ka ozi a na-eje n’ebe ịchụàjà ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ sere onyinyo ya?

16 N’ụtụtụ na n’uhuruchi, onye nchụàjà na-esurere Chineke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ dị n’Ebe Nsọ ahụ. N’otu mgbe ahụkwa, ndị na-efe ofufe na-abụghị ndị nchụàjà ga-ekpegara Chineke ekpere ka ha na-eguzo n’ogige dị n’èzí nke ụlọ nsọ ahụ. (Luk 1:8-10) ‘Ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ,’ ka Bible na-akọwa, “bụ ekpere ndị nsọ.” (Mkpughe 5:8) “Ka e dozie ekpere m dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Gị,” ka Devid onye ọbụ abụ dere. (Abụ Ọma 141:2) Ndị Kraịst e tere mmanụ jikwa ihe ùgwù ha nke ịbịakwute Jehova n’ekpere site na Jisọs Kraịst kpọrọ oké ihe. Ekpere siri ike ndị si n’obi yiri ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Ndị Kraịst e tere mmanụ na-etokwa Chineke n’ụzọ ndị ọzọ, na-eji egbugbere ọnụ ha akụziri ndị ọzọ ihe. Ntachi obi ha n’okpuru ihe isi ike na iguzosi ike n’ezi ihe ha n’okpuru ule na-atọ Chineke ụtọ karịsịa.—1 Pita 2:20, 21.

17. Gịnị ka mmezu nke ihe onyinyo amụma ahụ e nyere site ná mbanye mbụ nke onye isi nchụàjà na-abanye n’ime Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile ahụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie gụnyere?

17 N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, onye isi nchụàjà nke Israel aghaghị ịbanye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile wee suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ime ihe ịgụ ọkụ e ji ọlaedo mee nke icheku ọkụ dị n’ime ya. A ghaghị ime nke a tupu o weta ọbara nke àjà mkpuchi mmehie ahụ. Ná mmezu nke onyinyo amụma a, nwoke ahụ bụ́ Jisọs jigidere iguzosi ike n’ezi ihe zuru ezu nye Jehova Chineke tupu o nye ndụ ya dị ka otu àjà na-adịgide adịgide maka mmehie anyị. N’ụzọ dị otú a o gosiri na mmadụ zuru okè pụrụ ijigide iguzosi ike n’ezi ihe ya nye Chineke n’agbanyeghị nrụgide ọ bụla Setan wetaara ya. (Ilu 27:11) Mgbe e lere ya ule, Jisọs ji ekpere mee ihe ya na ‘ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri, a nụkwara olu Ya n’ihi na Ọ tụrụ egwu Chineke.’ (Ndị Hibru 5:7) N’ụzọ dị otú a o nyere Jehova otuto dị ka Eze o ruuru na nke ezi omume nke eluigwe na ala. Chineke nyere Jisọs ụgwọ ọrụ site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. N’ọkwá a dị elu, Jisọs na-eleba anya n’ihe nke abụọ mere o ji bịa n’ụwa, nke bụ, ime ka ụmụ mmadụ na-eme mmehie bụ́ ndị chegharịrịnụ na Chineke dịghachi ná mma.—Ndị Hibru 4:14-16.

Ebube Ka Ukwuu nke Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ nke Chineke

18. Olee otú Jehova siworo weta ebube pụrụ iche n’ụlọ nsọ ime mmụọ ya?

18 “Ebube ikpeazụ nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube mbụ,” ka Jehova buru n’amụma. (Hagaị 2:9) Site n’ịkpọlite Jisọs n’ọnwụ dị ka Eze na Onye Isi Nchụàjà na-adịghị anwụ anwụ, Jehova wetara ebube pụrụ iche n’ụlọ nsọ ime mmụọ ya. Jisọs nọ ugbu a n’ọnọdụ nke ‘iwetara ndị nile na-aṅa Ya ntị nzọpụta ebighị ebi.’ (Ndị Hibru 5:9) Ndị mbụ gosiri nrubeisi dị otú ahụ bụ 120 ndị ahụ na-eso ụzọ bụ́ ndị natara mmụọ nsọ na Pentikọst na 33 O.A. Akwụkwọ Mkpughe buru amụma na ụmụ Israel ime mmụọ a ga-emesịa dị 144,000 n’ọnụ ọgụgụ. (Mkpughe 7:4) Mgbe ha nwụrụ, ọtụtụ n’ime ha aghaghị ịtọgbọrọ n’amaghị ihe ọ bụla n’ime ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ, na-echere oge ọnụnọ Jisọs n’ike eze. Ngụkọ oge amụma nke dị na Daniel 4:10-17, 20-27 na-atụ aka na 1914 dị ka oge Jisọs ga-eji malite ịchị achị n’etiti ndị iro ya. (Abụ Ọma 110:2) Ruo ọtụtụ iri afọ tupu oge ahụ, ndị Kraịst e tere mmanụ cheresiiri afọ ahụ ike. Agha Ụwa Mbụ na ahụhụ ya na ya yi bụ́ ndị bịakwasịrị ihe a kpọrọ mmadụ nyere ihe àmà na e mere n’ezie ka Jisọs nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze na 1914. (Matiu 24:3, 7, 8) Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, ebe oge ruworo “ka e site n’ụlọ Chineke malite ikpe ikpe,” Jisọs gaje imezu nkwa ahụ o kwere ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ bụ́ ndị daworo n’ụra ọnwụ: “Agaje m ịbịa ọzọ, M ga-anarakwa unu nye Onwe m.”—1 Pita 4:17; Jọn 14:3.

19. Olee otú ihe fọdụrụ na 144,000 ga-esi nwee ike ịbanye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke eluigwe?

19 A kachabeghị ndị so na 144,000 nke òtù ndị nchụàjà ahụ dị nsọ akara ma kpọkọta ha n’ebe obibi ha n’eluigwe. Ihe fọdụrụ n’ime ha ka bi n’ụwa n’ọnọdụ ime mmụọ ahụ nke Ebe Nsọ ahụ sere onyinyo ya, bụrụ ndị e ji “ákwà mgbochi,” ma ọ bụ ihe mgbochi nke anụ ahụ ha kewapụ. Ka ndị a na-anwụ n’ikwesị ntụkwasị obi, a na-akpọlite ha n’ọnwụ n’otu ntabi anya dị ka ndị mmụọ e kere eke na-adịghị anwụ anwụ isonyere ndị so na 144,000 ahụ ndị nọrịị anọ n’eluigwe.—1 Ndị Kọrint 15:51-53.

20. Ọrụ dị aṅaa dị mkpa ka ndị fọdụrụ n’òtù ndị nchụàjà ahụ dị nsọ na-arụ n’oge a, gịnịkwa na-esi na ya apụta?

20 Ebe e nwere nnọọ ọtụtụ ndị nchụàjà so Onye Isi Nchụàjà ahụ na-eje ozi n’eluigwe, ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke enwetawo ebube ka ukwuu. Ka ọ dị ugbu a, ihe fọdụrụ n’òtù ndị nchụàjà ahụ dị nsọ na-arụ ọrụ bara uru n’elu ala. Site n’ime nkwusa ha, Chineke ji nkwupụta okwu nile nke ikpe ya na-eme “ka mba nile mee mkpatụ” dị ka e buru n’amụma na Hagaị 2:7. N’otu mgbe ahụkwa, ọtụtụ nde ndị na-efe ofufe bụ́ ndị a kọwara dị ka “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” na-enubata n’ogige elu ala nke ụlọ nsọ Jehova. Olee otú ndị a si kwekọọ ná ndokwa Chineke maka ife ofufe, ebube dị aṅaa nke ọdịnihu ka anyị pụkwara ịtụ anya ya maka oké ụlọ nsọ ime mmụọ ya? A ga-enyocha ajụjụ ndị a n’isiokwu ọzọ.

Ajụjụ Ntụleghachi

◻ Ihe nlereanya dị aṅaa magburu onwe ya ka Jisọs setịpụrụ na 29 O.A.?

◻ Ndokwa dị aṅaa malitere ịrụ ọrụ na 29 O.A.?

◻ Gịnị ka Ebe Nsọ na Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile sere onyinyo ya?

◻ Olee otú e siworo mee ka oké ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ dị ebube?

[Foto dị na peeji nke 17]

Mgbe e ji mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ na 29 O.A., oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke malitere ịrụ ọrụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya