Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 7/1 p. 8-13
  • “Ụlọ Ekpere Mba Nile”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ụlọ Ekpere Mba Nile”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile
  • Ebe Nsọ
  • Ogige Ahụ
  • Ụbọchị Mkpuchi Mmehie
  • Ụlọ Nsọ nke Mbụ na nke Abụọ
  • Chineke Ahapụ Ụlọ Ya nke Elu Ala Ruo Mgbe Ebighị Ebi
  • Jiri Ihe Ọma Meere Gị Ife Jehova n’Ụlọ Nsọ Ihe Atụ Ya Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Oké Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ nke Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “Ihe A Na-achọsi Ike” Na-ejupụta n’Ụlọ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 7/1 p. 8-13

“Ụlọ Ekpere Mba Nile”

“É deghị ya n’akwụkwọ nsọ, sị, A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere mba nile?”—MAK 11:17.

1. Ụdị mmekọrịta dị aṅaa ka Adam na Iv na Chineke nwere na mbụ?

MGBE e kere Adam na Iv, ha na Nna ha nke eluigwe nwere mmekọrịta chiri anya. Jehova Chineke gwara ha okwu ma kọwaa nzube ya dị ebube maka agbụrụ mmadụ. A kpaliri ha ọtụtụ mgbe n’ezie iti mkpu otuto nye Jehova maka ọrụ okike ya nile dị ebube. Ọ bụrụ na nduzi dị Adam na Iv mkpa ka ha na-atụle ọrụ ha dị ka nna na nne ọdịnihu nke ezinụlọ mmadụ, ha pụrụ ịbịakwute Chineke site n’ebe ọ bụla n’ebe obibi ha bụ́ Paradaịs. Ozi nile nke onye nchụàjà n’ime ụlọ nsọ adịghị ha mkpa.—Jenesis 1:28.

2. Mgbanwe dị aṅaa weere ọnọdụ mgbe Adam na Iv mehiere?

2 Ọnọdụ ahụ gbanwere mgbe otu mmụọ ozi nnupụisi rabanyere Iv n’iche na ọnọdụ ya ná ndụ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ jụ ọbụbụeze Jehova, na-ekwu na ọ ‘ga-adị ka Chineke.’ N’ikwekọ na nke ahụ, Iv riri mkpụrụ sitere n’osisi ahụ nke Chineke machibidoro iwu. Setan jiriziiri Iv mee ihe n’ịnwa di ya. N’ụzọ wetara ọdachi, Adam ṅara ntị n’olu nwunye ya na-emehie emehie, na-egosi na o jiri mmekọrịta ya na ya kpọrọ ihe karịa mmekọrịta ya na Chineke. (Jenesis 3:4-7) Ya bụ, Adam na Iv họọrọ Setan dị ka chi ha.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 4:4.

3. Olee ihe ọjọọ ndị si ná nnupụisi Adam na Iv pụta?

3 N’ime otú ahụ, mmadụ abụọ mbụ ahụ tụfuru ọ bụghị nanị mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke ha na Chineke kamakwa olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. (Jenesis 2:16, 17) Anụ ahụ ha na-emehie emehie mesịrị dakpọọ ruo mgbe ha nwụrụ. Ụmụ ha ketara ọnọdụ mmehie a. Bible na-akọwa, sị: “Ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile.”—Ndị Rom 5:12.

4. Olileanya dị aṅaa ka Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie?

4 Ọ dị ihe a chọrọ iji mee ka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie na Onye Okike ha dị nsọ dịghachi ná mma. Mgbe ọ na-ama Adam na Iv ikpe, Chineke nyere ụmụ ha n’ọdịnihu olileanya site n’ikwe nkwa “mkpụrụ” nke ga-azọpụta ihe a kpọrọ mmadụ pụọ n’ihe nile nke nnupụisi Setan kpatara. (Jenesis 3:15) Ka e mesịrị, Chineke kpughere na Mkpụrụ nke ngọzi ahụ ga-abịa site n’Abraham. (Jenesis 22:18) N’iburu nzube ịhụnanya a n’uche, Chineke họọrọ ụmụ Abraham, bụ́ ụmụ Israel, ịghọ mba ya ọ họọrọ.

5. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’ụmụ irighiri ihe nile dị n’ọgbụgba ndụ Iwu Chineke na Israel?

5 Na 1513 T.O.A., ụmụ Israel sooro Chineke banye ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ ma kweta irube isi n’iwu ya nile. Iwu ọgbụgba ndụ ahụ kwesịrị ịmasị ndị nile chọrọ ife Chineke taa n’ụzọ dị ukwuu n’ihi na o zoro aka n’ebe Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa nọ. Pọl sịrị na o nwere “onyinyo nke ezi ihe ahụ nile gaje ịbịa.” (Ndị Hibru 10:1) Mgbe Pọl kwuru okwu a, ọ na-atụle ozi nke ndị nchụàjà Israel n’ụlọikwuu a pụrụ ibugharị ebugharị, ma ọ bụ ụlọ ntu nke ofufe. A kpọrọ ya “ụlọ ukwu Jehova” ma ọ bụ ‘ụlọ Jehova.’ (1 Samuel 1:9, 24) Site n’inyocha ozi dị nsọ e jere n’ụlọ Jehova nke elu ala, anyị pụrụ ịbịa ghọta n’ụzọ zuru ezu karị ndokwa obi ebere ahụ bụ nke ụmụ mmadụ na-eme mmehie taa pụrụ isi na ya ghọọ ndị e mere ka ha na Chineke dịghachi ná mma.

Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile

6. Gịnị dị n’Ebe Nsọ ahụ Kachasị Ebe Nsọ Nile, oleekwa otú e si gosipụta ọnụnọ Chineke n’ebe ahụ?

6 “Onye kachasị ihe nile elu adịghị ebi n’ụlọ e ji aka wuo,” ka Bible na-ekwu. (Ọrụ 7:48) Otú ọ dị, igwe ojii nke dị ná nkebi nke kasị dịrị n’ime bụ́ nke a na-akpọ Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile na-egosipụta ọnụnọ Chineke n’ụlọ ya nke elu ala. (Levitikọs 16:2) Dị ka ihe àmà gosiri, igwe ojii a na-achasi ike, na-enye ìhè n’ime Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile ahụ. Ọ dịkwasịrị n’elu igbe dị nsọ nke a kpọrọ “igbe ihe àmà,” bụ́ nke mbadamba nkume ndị e dekwasịrị ụfọdụ n’ime iwu ahụ nke Chineke nyere Israel n’elu ya. N’elu ihe mkpuchi nke Igbe ahụ e nwere ndị cherub abụọ e ji ọlaedo mee bụ́ ndị gbasapụrụ nku ha, nke sere onyinyo ndị mmụọ e kere eke nwere ọkwá dị elu ná nzukọ eluigwe nke Chineke. Igwe ojii ìhè ọrụ ebube dịkwasịrị n’elu ihe mkpuchi ahụ na n’agbata ndị cherub ahụ. (Ọpụpụ 25:22) Nke a bụ onyinyo nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ebe ọ nọkwasịrị n’elu ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke ndị cherub dị ndụ bu. (1 Ihe Emere 28:18) Ọ bụ ya mere Eze Hezekaịa ji kpee ekpere, sị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Chineke Israel, Onye na-ebi n’etiti cherubim.”—Aịsaịa 37:16.

Ebe Nsọ

7. Olee arịa ndị dị n’Ebe Nsọ ahụ?

7 A kpọrọ nkebi nke abụọ nke ụlọikwuu ahụ Ebe Nsọ. N’ime nkebi nke a, e nwere ihe ndọba oriọna mara mma nke nwere alaka asaa n’akụkụ aka ekpe nke ọnụ ụzọ mbata, table nke ịdọba achịcha ihu Chineke dịkwa n’akụkụ aka nri. Ebe ịchụàjà dị nnọọ n’ihu ebe ahụ bụ́ ebe ísì ụtọ nke ihe nsure ọkụ si arịgo. Ọ dị n’ihu ákwà nkwụba nke kebiri Ebe Nsọ ahụ na Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile.

8. Ọrụ dịgasị aṅaa ka ndị nchụàjà rụrụ oge nile n’Ebe Nsọ ahụ?

8 N’ụtụtụ na n’uhuruchi ọ bụla, onye nchụàjà aghaghị ịbanye n’ụlọikwuu ahụ wee suree ihe nsure ọkụ n’elu ebe ịchụàjà ihe nsure ọkụ. (Ọpụpụ 30:7, 8) N’ụtụtụ, ka ihe nsure ọkụ ahụ na-ere ọkụ, a ghaghị ịgbajupụtaghachi mmanụ ọkụ n’oriọna asaa ahụ dị n’elu ihe ndọba oriọna ọlaedo ahụ. N’uhuruchi a na-amụnye oriọna ndị ahụ ọkụ iji nye ìhè n’Ebe Nsọ ahụ. N’Ụbọchi Izu Ike ọ bụla onye nchụàjà aghaghị itinye ogbe achịcha 12 ndị ọhụrụ n’elu table nke achịcha ihu Chineke.—Levitikọs 24:4-8.

Ogige Ahụ

9. Gịnị bụ nzube nke ite ọsịsa mmiri ahụ, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?

9 Ụlọikwuu ahụ nwekwara ogige, nke e ji ákwà ụlọ ntu gbaa gburugburu. E nwere nnukwute ite ọsịsa mmiri n’ogige a bụ́ ebe ndị nchụàjà na-asa aka ha na ụkwụ ha tupu ha abanye n’Ebe Nsọ ahụ. Ha aghaghịkwa ịsacha aka ha na ụkwụ ha tupu ha achụọ àjà n’elu ebe ịchụàjà ahụ nke dị n’ogige ahụ. (Ọpụpụ 30:18-21) Iwu ịdị ọcha a bụ ihe ncheta siri ike nye ndị ohu Chineke taa na ha aghaghị ịgba mbọ ịdị ọcha n’anụ ahụ, omume, uche, na n’ime mmụọ ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ofufe ha bụrụ nke Chineke nakweere. (2 Ndị Kọrint 7:1) Ka oge na-aga ndị ohu ụlọ nsọ bụ́ ndị na-abụghị ndị Israel na-eweta nkụ maka ọkụ dị n’ebe ịchụàjà na mmiri maka ite ọsịsa mmiri ahụ.—Joshua 9:27.

10. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime onyinye ndị e nyere n’elu ebe ịchụàjà?

10 N’ụtụtụ na n’uhuruchi ọ bụla, a na-esure nwa ebulu e ji chụọ àjà ọkụ n’elu ebe ịchụàjà ya na onyinye ịnata ihu ọma na àjà ihe ọṅụṅụ. (Ọpụpụ 29:38-41) A na-achụ àjà ndị ọzọ n’ụbọchị ndị pụrụ iche. Mgbe ụfọdụ a ghaghị ịchụ àjà n’ihi otu mmehie onwe onye kpọmkwem. (Levitikọs 5:5, 6) N’oge ndị ọzọ onye Israel pụrụ ịchụrụ Chineke àjà udo nke afọ ofufo bụ́ nke ndị nchụàjà na onye chụrụ àjà ahụ na-eri ụfọdụ n’ime ya. Nke a gosiri na ụmụ mmadụ bụ́ ndị mmehie pụrụ iso Chineke dịrị n’udo, soro ya rikọọ nri, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọbụna onye nọ dị ka ọbịa pụrụ ịghọ onye na-efe Jehova ma nwee ihe ùgwù nke inye onyinye afọ ofufo n’ụlọ Ya. Ma iji nye Jehova nsọpụrụ ruuru ya, ndị nchụàjà ahụ pụrụ ịnakwere nanị onyinye ndị kasị mma. Ntụ nke onyinye ịnata ihu ọma ahụ aghaghị ịbụ nke na-agbaghị mkpụrụ, anụmanụ ndị a ga-ejikwa chụọ àjà aghaghị ịbụ ndị na-enweghị nkwarụ ọ bụla.—Levitikọs 2:1; 22:18-20; Malakaị 1:6-8.

11. (a) Gịnị ka e ji ọbara nke anụmanụ ndị e ji chụọ àjà mee, gịnịkwa ka nke a na-ezo aka na ya? (b) Gịnị bụ echiche Chineke banyere ma ọbara ụmụ mmadụ ma nke anụmanụ?

11 E wetara ọbara nke àjà ndị a n’elu ebe ịchụàjà. Nke a jere ozi dị ka ihe na-echetara mba ahụ kwa ụbọchị na ha bụ ndị mmehie nwere mkpa nke onye mgbapụta bụ́ onye ọbara ya a wụsịrị ga-ekpuchi mmehie ha n’ụzọ na-adịgide adịgide ma zọpụta ha n’ọnwụ. (Ndị Rom 7:24, 25; Ndị Galetia 3:24; tụlee Ndị Hibru 10:3.) Ojiji a e ji ọbara mee ihe n’ụzọ dị nsọ chetakwaara ndị Israel na ọbara na-anọchite anya ndụ, na ọ bụkwa Chineke nwe ndụ. Iji ọbara mmadụ mee ihe n’ụzọ ọ bụla ọzọ bụ nke Chineke machibidoworo iwu mgbe nile.—Jenesis 9:4; Levitikọs 17:10-12; Ọrụ 15:28, 29.

Ụbọchị Mkpuchi Mmehie

12, 13. (a) Gịnị bụ Ụbọchị Mkpuchi Mmehie? (b) Tupu onye isi nchụàjà enwee ike iweta ọbara n’Ebe Nsọ ahụ Kachasị Ebe Nsọ Nile, gịnị ka ọ na-aghaghị ime?

12 Otu ugboro n’afọ n’ụbọchị a kpọrọ Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, mba Israel dum, gụnyere ndị nọ dị ka ọbịa bụ́ ndị na-efe Jehova ofufe, aghaghị ịkwụsị ọrụ nile ma buo ọnụ. (Levitikọs 16:29, 30) N’ụbọchị a dị mkpa, a na-asachapụ mba ahụ pụọ ná mmehie n’ụzọ ihe atụ iji soro Chineke nwee mmekọrịta udo ruo otu afọ ọzọ. Ka anyị jiri uche chee banyere ọnọdụ ahụ ma tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị kasị adọrọ mmasị na ya.

13 Onye isi nchụàjà nọ n’ime ogige nke ụlọikwuu ahụ. Ebe ọ sachaworo onwe ya n’ime ite ọsịsa mmiri ahụ, ọ na-egbu oké ehi maka iji chụọ àjà. A na-agbanye ọbara oké ehi ahụ n’otu ọ́kwá; a ga-eji ya mee ihe n’ụzọ pụrụ iche maka iji kpuchie mmehie nke ebo Livaị bụ́ ndị nchụàjà. (Levitikọs 16:4, 6, 11) Ma tupu ọ gaa n’ihu n’ịchụàjà ahụ, ọ dị ihe onye isi nchụàjà ahụ na-aghaghị ime. Ọ na-ewere ihe nsure ọku na-esi ísì ụtọ (ikekwe na-etinye ya n’ime eku) na icheku ọkụ nke si n’ebe ịchụàjà n’ime ihe e ji agụ ọkụ. Ọ na-abanye ugbu a n’Ebe Nsọ ahụ ma gaa n’ebe ákwà nkwụba nke Ebe Nsọ ahụ Kachasị Ebe Nsọ Nile. Ọ na-eji nwayọọ nwayọọ gafere ákwà nkwụba ahụ wee guzo n’ihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe ọ na-adịghị mmadụ ọ bụla ọzọ na-ahụ ya, ọ na-awụkwasị ihe nsure ọkụ n’elu icheku ọkụ ahụ, Ebe Nsọ ahụ Kachasị Ebe Nsọ Nile na-ejupụta n’anwụrụ na-esi ísì ụtọ.—Levitikọs 16:12, 13.

14. N’ihi gịnị ka onye isi nchụàjà ga-eji jiri ọbara nke ụdị anụmanụ abụọ dị iche banye n’Ebe Nsọ ahụ Kachasị Ebe Nsọ Nile?

14 Ugbu a Chineke dị njikere ime ebere na ikwe ka obi ya dajụọ n’ụzọ ihe atụ. N’ihi nke a a kpọrọ ihe mkpuchi nke Igbe ahụ “oche ebere” ma ọ bụ “ebe a na-eme ka obi Chineke jụrụ.” (Ndị Hibru 9:5, nkọwa ala ala peji nke NW) Onye isi nchụàjà ahụ esi n’Ebe Nsọ ahụ Kachasị Ebe Nsọ Nile pụọ, buru ọbara oké ehi ahụ, wee banyeghachi n’Ebe Nsọ ahụ Kachasị Ebe Nsọ Nile. Dị ka e nyere n’Iwu ahụ, ọ na-arụnye mkpịsị aka ya n’ọbara ahụ ma na-efesa ya ugboro asaa n’ihu ihe mkpuchi Igbe ahụ. (Levitikọs 16:14) Ọzọ ọ na-agaghachi n’ogige ahụ ma gbuo otu ewu, nke bụ àjà mmehie “nke dịịrị ndị” ahụ. Ọ na-eweta ụfọdụ n’ime ọbara ewu ahụ n’ime Ebe Nsọ ahụ Kachasị Ebe Nsọ Nile, jirikwa ya mee otu ihe ahụ o ji ọbara oké ehi mee. (Levitikọs 16:15) Ozi ndị ọzọ dị mkpa na-ewerekwa ọnọdụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Dị ka ihe atụ, onye isi nchụàjà aghaghị ibikwasị aka ya n’elu isi ewu nke abụọ wee kwupụta n’elu ya “ajọ omume nile nke ụmụ Israel.” A na-edupụzi ewu a dị ndụ baa n’ọzara iji bupụ mmehie nke mba ahụ n’ụzọ ihe atụ. N’ụzọ dị otú a a na-ekpuchi mmehie “ndị nchụàjà, kpuchikwaara ndị nile nke mkpọkọta a” kwa afọ.—Levitikọs 16:16, 21, 22, 33.

15. (a) Olee otú ụlọ nsọ Solomọn si yie ụlọikwuu ahụ? (b) Gịnị ka akwụkwọ Ndị Hibru na-ekwu banyere ozi dị nsọ e jere ma n’ụlọikwuu ahụ ma n’ụlọ nsọ ahụ?

15 N’ime 486 afọ mbụ nke akụkọ ihe mere eme nke Israel dị ka ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ, ụlọikwuu ahụ a pụrụ ibugharị ebugharị jeere ha ozi dị ka ebe ịnọ fee Chineke ha, bụ́ Jehova. Ka e mesịrị, e nyere Solomọn nke Israel ihe ùgwù nke iwu ihe owuwu na-adịgide adịgide. Ọ bụ ezie na ụlọ nsọ a gaje ibu ibu ma maa mma karị, ụkpụrụ ụlọ ahụ nke sitere n’aka Chineke gbasoro otu ụkpụrụ ahụ e ji wuo ụlọikwuu ahụ. Dị ka ụlọikwuu ahụ, ọ na-eme ihe atụ nke ndokwa ka ukwuu, nke dị irè karị, maka ofufe nke Jehova gaje ‘ịma, ọ bụghị mmadụ.’—Ndị Hibru 8:2, 5; 9:9, 11.

Ụlọ Nsọ nke Mbụ na nke Abụọ

16. (a) Arịrịọ ịhụnanya dị aṅaa ka Solomọn rịọrọ mgbe ọ na-arara ụlọ nsọ ahụ nye? (b) Olee otú Jehova si gosi nnakwere ọ nakweere ekpere Solomọn?

16 Mgbe ọ na-arara ụlọ nsọ ahụ dị ebube nye, Solomọn gụnyere arịrịọ a sitere n’ike mmụọ nsọ, sị: “Banyere onye ala ọzọ, nke ọ bụghị ná ndị Gị, bụ́ Israel, ka o sitere, ma o siwo n’ala dị anya bịa n’ihi aha ukwu Gị . . . , mgbe ha ga-abịa kpee ekpere n’ebe ụlọ a dị: Gị onwe gị sikwa n’eluigwe, site n’ọnọdụ obibi Gị guzosiri ike, nụrụ, mee dị ka ihe nile si dị nke onye ala ọzọ ahụ na-akpọku Gị; ka ndị nile nke ụwa wee mara aha Gị, ịtụ egwu Gị, dị ka ndị Gị, bụ́ Israel, si eme, na ịmara na a kpọkwasịrị aha Gị n’ụlọ a nke M wuworo.” (2 Ihe Emere 6:32, 33) N’ụzọ doro anya, Chineke gosiri nnakwere ọ nakweere ekpere nraranye Solomọn. Irè ọkụ si n’eluigwe daa wee ripịa àjà anụmanụ nile ndị dị n’elu ebe ịchụàjà ahụ, ebube Jehova jupụtakwara ụlọ nsọ ahụ.—2 Ihe Emere 7:1-3.

17. Gịnị mesịrị mee ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru, n’ihi gịnịkwa?

17 N’ụzọ dị mwute, ndị Israel tụfuru egwu ha ziri ezi maka Jehova. Ka oge na-aga, ha merụrụ aha ukwu ya site n’omume nile nke nkwafu ọbara, ikpere arụsị, ịkwa iko, idina onye ikwu, na site n’imegbu ụmụ mgbei, ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, na ndị ala ọzọ. (Ezikiel 22:2, 3, 7, 11, 12, 26, 29) N’ihi ya, n’afọ 607 T.O.A., Chineke mezuru ihe e kpere n’ikpe site n’idute ndị agha Babilọn ịbịa bibie ụlọ nsọ ahụ. A dọọrọ ndị Israel lanarịrịnụ laa n’agha na Babilọn.

18. N’ụlọ nsọ nke abụọ ahụ, olee ihe ùgwù ndị megheere ụfọdụ ndị ikom na-abụghị ndị Israel bụ́ ndị ji obi ha nile kwadoo ofufe Jehova?

18 Mgbe 70 afọ gasịrị ihe fọdụrụ ná ndị chegharịrịnụ laghachiri Jerusalem, e nyekwa ha ihe ùgwù nke iwughachi ụlọ nsọ Jehova. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, e nwere ụkọ nke ndị nchụàjà na ndị Livaị maka ije ozi n’ụlọ nsọ nke abụọ a. N’ihi ya, e nyere ndị Netinim, bụ́ ndị sitere ná ndị ohu ụlọ nsọ ahụ na-abụghị ndị Israel, ihe ùgwù ka ukwuu dị ka ndị ozi nke ụlọ Chineke. Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe ha na ndị nchụàjà na ndị Livaị ghọrọ ndị hà nhata.—Ezra 7:24; 8:17, 20.

19. Nkwa dị aṅaa ka Chineke kwere banyere ụlọ nsọ nke abụọ, oleekwa otú okwu ndị a si mezuo?

19 Na mbụ o yiri ka ụlọ nsọ nke abụọ ahụ enweghị ihe ọ ga-abụ ma e jiri ya tụnyere nke mbụ. (Hagaị 2:3) Ma Jehova kwere nkwa, sị: “M ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube . . . Ebube ikpeazụ nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube mbụ.” (Hagaị 2:7, 9) N’ikwekọ n’okwu ndị a, ụlọ nsọ nke abụọ ahụ nwetara ebube ka ukwuu. O ji 164 afọ nọkarịa, ọtụtụ ndị kwa na-efe ofufe sitere n’ọtụtụ ala karị nubara n’ogige ya nile. (Tụlee Ọrụ 2:5-11.) Ndozigharị ụlọ nsọ nke abụọ ahụ malitere n’oge nke Eze Herọd, e wusawanyekwara ogige ya nile. N’ịbụ nke dị n’elu otu oké nkume nakwa nke ị̀bà ndị mara mma gbara gburugburu, ọ karịrị ụlọ nsọ mbụ nke Solomọn wuru n’ịdị ebube. Ọ gụnyere otu nnukwute ogige dị n’èzí maka ndị mba ọzọ ndị chọrọ ife Jehova. Otu nkume mgbochi kewara Ogige Ndị Jentaịl na ogige ime ndị ahụ bụ́ ndị dịịrị nanị ndị Israel.

20. (a) Olee ọdịiche dị ịrịba ama nke kara ụlọ nsọ nke abụọ ahụ e wughachiri akara? (b) Gịnị gosiri na ndị Juu lere ụlọ nsọ ahụ anya n’ụzọ na-ezighị ezi, gịnịkwa ka Jisọs mere n’imeghachi omume na nke a?

20 Ụlọ nsọ nke abụọ a pụrụ nnọọ iche n’ịbụ nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, nọrọ n’ime ogige ya zie ihe. Ma dịkwa ka ọ dị n’ihe banyere ụlọ nsọ nke mbụ ahụ, ndị Juu n’ozuzu ha enweghị echiche ziri ezi banyere ihe ùgwù ha nke ịbụ ndị nlekọta ụlọ Chineke. Leenụ, ha kwere ọbụna ka ndị ahịa nọrọ n’ime ogige ndị Jentaịl na-azụ ahịa. Ọzọkwa, e kwere ka ndị mmadụ jiri ụlọ nsọ ahụ na-eme ihe dị ka ụzọ ka mkpirikpi isi gafere mgbe ha bu ihe na-aga n’akụkụ ọzọ nke Jerusalem. Ụbọchị anọ tupu ọnwụ ya, Jisọs kpochapụrụ ụdị ihe omume nkịtị dị otú ahụ n’ụlọ nsọ ahụ, ka ọ nọ na-ekwu, sị: “É deghị ya n’akwụkwọ nsọ, sị, A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere mba nile? ma unu onwe unu emewo ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe.”—Mak 11:15-17.

Chineke Ahapụ Ụlọ Ya nke Elu Ala Ruo Mgbe Ebighị Ebi

21. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ụlọ nsọ Jerusalem?

21 N’ihi omume obi ike nke Jisọs n’ịkwado ezi ofufe nke Chineke, ndị ndú okpukpe ndị Juu kpebisiri ike igbu ya. (Mak 11:18) N’ịmata na a ga-egbu ya n’oge na-adịghị anya, Jisọs gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu, sị: “A na-ahapụrụ unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.” (Matiu 23:37, 38) O si otú a gosi na n’oge na-adịghị anya Chineke agakwaghị anabata ụdị ofufe e fere n’ụlọ nsọ nkịtị ahụ dị na Jerusalem. Ọ gakwaghị abụ “ụlọ ekpere mba nile.” Mgbe ndị na-eso ụzọ ya gosiri Jisọs ihe owuwu dị ebube nke ụlọ nsọ ahụ, o kwuru, sị: “Ùnu ahụghị ihe ndị a nile? . . . Agaghị ahapụ otu nkume ma ọlị n’ebe a n’elu nkume ibe ya, nke a na-agaghị akwatu n’ala.”—Matiu 24:1, 2.

22. (a) Olee otú e si mezuo okwu Jisọs banyere ụlọ nsọ ahụ? (b) Kama ịtụkwasị olileanya ha n’obodo dị n’elu ala, gịnị ka ndị Kraịst oge mbụ chọrọ?

22 E mezuru amụma Jisọs 37 afọ n’ihu n’afọ 70 O.A., mgbe ndị agha Rom bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya. Nke a bụ ihe àmà dị ịrịba ama na Chineke ahapụwo n’ezie ụlọ nkịtị ya. Ọ dịghị mgbe Jisọs buru amụma mwughachi nke ụlọ nsọ ọzọ n’ime Jerusalem. Banyere obodo elu ala ahụ, Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru akwụkwọ, sị: “Anyị enweghị obodo n’ebe a nke na-adịgide, kama anyị na-achọ obodo ahụ nke gaje ịbịa.” (Ndị Hibru 13:14) Ndị Kraịst oge mbụ lepụrụ anya n’ihu ịghọ akụkụ nke “Jerusalem nke dị n’eluigwe”—Alaeze Chineke ahụ nke yiri obodo. (Ndị Hibru 12:22) Ya mere, ezi ofufe nke Jehova ehiwekwaghị isi n’ụlọ nsọ nkịtị dị n’elu ala. N’isiokwu anyị ọzọ, anyị ga-atụle ndokwa ahụ ka elu nke Chineke guzobeworo maka ndị nile ọ na-agụ agụụ ife ya ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:21, 24.

Ajụjụ Ntụleghachi

◻ Mmekọrịta dị aṅaa nke ha na Chineke ka Adam na Iv tụfuru?

◻ N’ihi gịnị ka akụkụ dị iche iche nke ụlọikwuu ahụ kwesịrị iji dọrọ mmasị anyị?

◻ Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe ndị a na-eme n’ogige ụlọikwuu ahụ?

◻ Gịnị mere Chineke ji kwe ka e bibie ụlọ nsọ ya?

[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]

Ụlọ Nsọ Herọd Wughachiri

1. Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile

2. Ebe Nsọ

3. Ebe Ịchụàjà nke Àjà Nsure Ọkụ

4. Ite Ọsịsa Mmiri

5. Ogige Ndị Nchụàjà

6. Ogige Ndị Israel

7. Ogige Ụmụ Nwanyị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya