Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 5/15 p. 27
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Oké Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ nke Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Jiri Ihe Ọma Meere Gị Ife Jehova n’Ụlọ Nsọ Ihe Atụ Ya Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • “Ụlọ Ekpere Mba Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịghọta Ihe Mere O Ji Bụrụ na Mesaịa Ahụ Ga-abịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 5/15 p. 27

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee mgbe e tere “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” mmanụ, dị ka e buru n’amụma na Daniel 9:24, NW?

Daniel 9:24-27 bụ amụma banyere mpụta nke “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú”—Kraịst. N’ihi ya, ite “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” mmanụ bụ́ nke e buru n’amụma, adịghị ezo aka n’ite Ebe Kasị Nsọ nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem mmanụ. Kama nke ahụ, okwu ahụ bụ́ “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” na-ezo aka n’ebe nsọ eluigwe nke Chineke—Ebe Kasị Nsọ nke eluigwe—ná nnukwu ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova.a—Ndị Hibru 8:1-5; 9:2-10, 23.

Olee mgbe ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke malitere ọrụ? Tụlee ihe mere mgbe Jisọs bịara ka e mee ya baptism na 29 O.A. Malite n’oge ahụ gaa n’ihu ná ndụ ya, Jisọs mezuru okwu ndị dị n’Abụ Ọma 40:6-8. Pọl onyeozi mesịrị gosi na Jisọs kpekuru Chineke ekpere, sị: “Àjà na ihe e chere n’ihu Gị, Ị chọghị ha, ma ahụ ka Ị kwadebere nye m.” (Ndị Hibru 10:5) Jisọs maara na Chineke ‘achọghị’ ka a nọgide na-achụ àjà ụmụ anụmanụ n’ụlọ nsọ Jerusalem. Kama nke ahụ, Jehova kwadebeere Jisọs ahụ mmadụ zuru okè ịchụ dị ka àjà. N’igosipụta ọchịchọ ya sitere n’obi, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Lee, abịawo m (n’akwụkwọ mpịakọta ka e deworo ihe banyere m) ime ihe Ị na-achọ, Chineke.” (Ndị Hibru 10:7) Gịnịkwanụ ka Jehova zaghachiri? Oziọma Matiu na-ekwu, sị: “Mgbe e mere Jisọs baptism, ngwa ngwa O si ná mmiri rịgota: ma lee, e meghere eluigwe nye Ya, O wee hụ Mmụọ nke Chineke ka Ọ na-efeda dị ka nduru, na-ebekwasịkwa Ya; ma lee, olu sitere n’eluigwe, sị, Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma.”—Matiu 3:16, 17.

Nnakwere Jehova Chineke nakweere ochiche e chere ahụ Jisọs maka àjà pụtara na e nweela ebe ịchụàjà karịrị ebe ịchụàjà nkịtị ahụ dị n’ụlọ nsọ Jerusalem. Nke a bụ ebe ịchụàjà nke ‘ọchịchọ,’ ma ọ bụ ndokwa Chineke maka ịnakwere ndụ mmadụ Jisọs dị ka àjà. (Ndị Hibru 10:10) Otite e ji mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ pụtara na Chineke emezuola ndokwa nile metụtara ụlọ nsọ ime mmụọ ya.b N’ihi ya, n’oge e mere Jisọs baptism, e tere ebe obibi eluigwe nke Chineke mmanụ, ma ọ bụ doo ya iche, dị ka “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” ná ndokwa nke nnukwu ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka ntụle nke akụkụ dị iche iche nke ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke, lee peeji nke 14-19 nke Ụlọ Nche July 1, 1996.

b E zoro aka na nke a na peeji nke 194-195 nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!

[Foto dị na peeji nke 27]

E tere “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” mmanụ mgbe e mere Jisọs baptism

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya