Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 3/15 p. 31
  • Gee Ntị n’Okwu Amụma nke Chineke!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gee Ntị n’Okwu Amụma nke Chineke!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Tụkwasị Okwu Amụma ahụ Obi
  • Nọrọ na Nche Megide Ndị Dapụrụ n’Ezi Ofufe
  • Ụbọchị Jehova Na-abịa!
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Jems na Pita
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Pita nke Abụọ
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Kpachara Anya Maka Ndị Ozizi Ụgha!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ka Anyị Jisie Okwukwe Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 3/15 p. 31

Gee Ntị n’Okwu Amụma nke Chineke!

Isi Ihe Ndị Sitere na Pita nke Abụọ

OKWU amụma, ma ọ bụ ozi, nke Jehova yiri oriọna nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ọ dịkwa ezi ndị Kraịst mkpa ige ya ntị nke ọma. Nke ahụ abụghị ihe dị mfe mgbe ndị ozizi ụgha na-anwa ịkwalite ndapụ n’ezi ofufe. Ma a pụrụ ime ya site n’enyemaka Chineke. Anyị aghaghịkwa ịrapagidesi ike n’okwu Chineke ka anyị wee gabiga ụbọchị Jehova nke na-abịa ọsọ ọsọ.

Akwụkwọ ozi nke abụọ nke Pita, nke sitere n’ike mmụọ nsọ, pụrụ inyere anyị aka ige ntị n’okwu amụma nke Chineke. Ma eleghị anya, Pita dere akwụkwọ ozi nke a site na Babilọn n’ihe dị ka afọ 64 O.A. N’ime akwụkwọ ozi ya, ọ kwalitere eziokwu nke Chineke, dọọ ndị kwere ekwe ibe ya aka ná ntị banyere ọbịbịa nke ụbọchị Jehova dị ka onye ohi, nyekwara ndị na-agụ ya aka ịbụ ndị e duuru gaa n’ịgbakụta njehie nke ndị naemebi iwu azụ. Ebe ọ fọrọ nke nta ka ụbọchị Jehova bịakwasị anyị, anyị pụrụ irite uru dị ukwuu site n’okwu Pita ndị sitere n’ike mmụọ nsọ.

Tụkwasị Okwu Amụma ahụ Obi

Dị ka ndị Kraịst, ọ dị mkpa ka anyị mee oké mgbalị iji gosipụta àgwà dị iche iche nke Chineke, anyị aghaghịkwa ige ntị n’okwu amụma ahụ. (1:1-21) Iji wee zere ịbụ ndị na-adịghị arụsi ọrụ ike ma ọ bụ ndị na-adịghị amịpụta mkpụrụ, ọ dị mkpa ka anyị ‘tụkwasị n’okwukwe anyị ịdị mma, ihe ọmụma, imeru ihe n’ókè, ntachi obi, nsọpụrụ Chineke, mmetụta ụmụnna, na ịhụnnaya.’ Mgbe Pita hụrụ ka e nwoghara Jisọs, nụkwa mgbe Chineke kwuru okwu banyere Kraịst n’oge ahụ, e mere ka okwu amụma ahụ guzosie ike karị. (Mak 9:1-8) Ọ dị mkpa ka anyị gee ntị n’okwu ahụ nke sitere n’ike mmụọ Chineke.

Nọrọ na Nche Megide Ndị Dapụrụ n’Ezi Ofufe

Site n’iji nlezianya na-ege ntị n’okwu amụma Chineke, anyị pụrụ ịnọ na nche megide ndị dapụrụ n’ezi ofufe na ndị ọzọ rụrụ arụ. (2:1-22) Pita dọrọ aka ná ntị na ndị ozizi ụgha ga-amịbata n’ime ọgbakọ. Otú ọ dị, Jehova ga-ama ndị a dapụrụ n’ezi ofufe ikpe, ọbụna dị ka ọ mara ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi ikpe, na ụwa ahụ nke na-adịghị asọpụrụ Chineke nke oge Noa, na obodo nke Sọdọm na Gọmọra. Ndị ozizi ụgha ahụ na-eleda ike ịchịisi Chineke nyere anya, na-adọrọkwa ndị na-esighị ike ka ha sonyere ha ná njehie. Ọ gaara adịworị mma karị nye ndị ahụ dapụrụ n’ezi ofufe ma a sị na ha amataghị “ụzọ ezi omume, karị ịmazu ya, wee si n’ihe dị nsọ ahụ e nyere n’iwu, nke e nyere ha n’aka idebe, laghachi.”

Ụbọchị Jehova Na-abịa!

Dị ka ndị na-ege ntị n’okwu amụma ahụ n’ime mgbe ikpeazụ ndị a, anyị agaghị ekwe ka ndị ọchị, bụ́ ndị na-akwa ozi ahụ banyere ọnụnọ Jisọs emo nwee mmetụta n’ahụ anyị. (3:1-18) Ha na-echefu na Chineke, onye zubeworo ibibi usoro ihe nke a bibiri ụwa nke dịrị tupu Iju Mmiri ahụ. E kwesịghị ile ntachi obi Jehova anya dị ka ịla azụ n’ime ihe, n’ihi na ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ chegharịa. A gaje ibibi usoro ihe nke a n’ime ‘ụbọchị Jehova,’ a ga-ejikwa “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha” wee dochie anya ya. Ya mere, anyị kwesịrị ime ihe nile anyị pụrụ ime iji bụrụ ndị nọ “n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta.” Kama ikwe ka ndị ozizi ụgha duhie anyị, ka anyị nọgide na-eto eto n’ihe ọmụma nke Jisọs Kraịst.

Ka anyị tinye okwu Pita n’obi anyị. Ya adịla mgbe ọ bụla anyị na-anọghị na nche megide ndị ozizi ụgha. Na-adị ndụ, na-amara na ụbọchị Jehova ga-abịa n’isi nso. Na-egekwa ntị mgbe nile n’okwu amụma Chineke.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

Ndị A Tụbara Na Tatarọs: Jehova “alaghị azụ n’inye ndị mmụọ ozi ahụ ahụhụ, bụ́ ndị mehierenụ, kama, site n’ịtụba ha na Tatarọs, o tinyere ha n’olulu nke oké ọchịchịrị ịnọ wee chere ikpe.” (2 Pita 2:4, NW) Nke a abụghị Tatarọs ahụ dị n’akụkọ ifo nke e gosipụtara n’akụkọ Iliad nke Homer dị ka ebe dị n’okpuru ala ebe a tụrụ chi ụgha nta dị iche iche, Cronus na mmụọ Titan ndị ọzọ, mkpọrọ. Tatarọs nke dị na Bible bụ ọnọdụ e wedara n’ala nke yiri ụlọ mkpọrọ, ebe Chineke tụbara ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi n’oge Noa. (Jenesis 6:1-8; 1 Pita 3:19, 20; Jud 6) “Oké ọchịchịrị” na-abịa site n’ịbụ ndị e bipụrụ site n’ìhè ime mmụọ nke Chineke dị ka ndị a chụpụworo site n’ezinụlọ ya. Dị ka ndị nọ na-echere ikpe ọmụma ya, olileanya ha gbara ọchịchịrị. Tatarọs bụ ọnọdụ bu ụzọ tupu ntụba a gaje ịtụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abyss tupu mmalite nke Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst. A ga-ebibi ha mgbe Ọchịchị Puku Afọ Jisọs gasịrị.—Matiu 25:41; Mkpughe 20:1-3, 7-10, 14.

[Foto]

Zeus tụbara chi nta dị iche iche n’ime Tatarọs nke akụkọ ifo

[Ebe E Si Nweta Foto]

National Archaeological Museum, Athens, Greece

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya