Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 9/1 p. 13-18
  • Kpachara Anya Maka Ndị Ozizi Ụgha!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpachara Anya Maka Ndị Ozizi Ụgha!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Dị Iche Iche Ozizi Ụgha Na-arụpụta
  • Iwebata Ozizi Ụgha
  • Ihe Atụ Ịdọ Aka ná Ntị
  • Omume Ndị Kwesịrị Ntaramahụhụ
  • “Mgbe Ha Na-eso Unu Rikọọ Ihe”
  • “Ụzọ Belam”
  • Ịra Ụra Ha Jọgburu Onwe Ha
  • Ndị E Chebere Site ná Mmazu
  • Ka Anyị Jisie Okwukwe Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • “Na-agbasi Mgba Ike n’Ihi Okwukwe”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Jiri Ndidi Chere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 9/1 p. 13-18

Kpachara Anya Maka Ndị Ozizi Ụgha!

“Ndị ozizi ụgha ga-adịkwa n’etiti unu.”—2 PITA 2:1.

1. Gịnị ka Jud bubu n’uche ide banyere ya, gịnịkwa mere o ji gbanwee isiokwu ya?

LEE ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ nke ahụ bụ! Ndị ozizi ụgha n’ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ! (Matiu 7:15; Ọrụ 20:29, 30) Onye otu nne ji ya na Jisọs bụ́ Jud maara banyere ihe a na-emenụ. O kwuru na ya chọburu idegara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ “banyere nzọpụta ahụ a zọpụtakọrọ anyị,” ma ọ kọwara, sị: “Ọ dị m mkpa idegara unu akwụkwọ na-arịọ unu ka unu na-agbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ.” N’ihi gịnị ka Jud ji gbanwee isiokwu ya? N’ihi na, ka o kwuru, “mmadụ ụfọdụ gbebara [n’ime ọgbakọ] . . . na-agha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko.”—Jud 3, 4.

2. N’ihi gịnị ka 2 Pita isi nke 2 na Jud ji yie nke ukwuu?

2 O doro anya na Jud dere akwụkwọ ngwa ngwa Pita desịrị akwụkwọ ozi ya nke abụọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jud maara banyere akwụkwọ ozi a. N’ezie, o kwupụtara ọtụtụ echiche yiri nke Pita n’akwụkwọ agbamume nke ya dị ike. Ya mere, ka anyị na-enyocha 2 Pita isi nke 2, anyị ga-arịba ama ụzọ ya na akwụkwọ ozi Jud si yie.

Ihe Dị Iche Iche Ozizi Ụgha Na-arụpụta

3. Gịnị mere n’oge gara aga nke Pita na-ekwu na ọ ga-eme ọzọ?

3 Mgbe Pita gbasịrị ụmụnna ya ume ịṅa ntị n’amụma, ọ sịrị: “Ndị amụma ụgha pụtakwara ìhè n’etiti ndị Israel [oge ochie], dị ka ndị ozizi ụgha ga-adịkwa n’etiti unu.” (2 Pita 1:14–2:1) Ndị Chineke n’oge ochie natara amụma bụ eziokwu, ma ha aghaghịkwa ịgbaso ozizi rụrụ arụ nke ndị amụma ụgha mgba. (Jeremaịa 6:13, 14; 28:1-3, 15) “N’ahụ ndị amụma Jerusalem,” ka Jeremaịa dere, “ka M hụworo ihe jọgburu onwe ya; ha na-akwa iko, na-ejegharịkwa n’okwu ụgha.”—Jeremaịa 23:14.

4. N’ihi gịnị ka ndị ozizi ụgha ji kwesị mbibi?

4 N’ịkọwa ihe ndị ozizi ụgha ga-eme n’ọgbakọ ndị Kraịst, Pita na-asị: “Bụ́ mmadụ ndị ga-ewere nzuzo webata ịrọ òtù dị iche iche nke ịla n’iyi, na-agọnarị ọbụna Onyenwe ha [Jisọs Kraịst] Onye gbaara ha, ndị na-eweta ịla n’iyi dị ngwa tụkwasị onwe ha n’isi.” (2 Pita 2:1; Jud 4) Ihe mwebata nke ịrọ òtù narị afọ mbụ ahụ mesịrị rụpụta bụ Krisendọm dị ka anyị maara ya taa. Pita na-egosi ihe mere ndị ozizi ụgha ji dị nnọọ mma mbibi: “Ọtụtụ mmadụ ga-esokwa ụzọ agụụ ịkwa iko ha; ndị a ga-ekwulu ụzọ nke eziokwu n’ihi ha.”—2 Pita 2:2.

5. Gịnị ka ndị ozizi ụgha na-akpata?

5 Chee banyere nke a! N’ihi mmetụta nke ndị ozizi ụgha, ọtụtụ ndị n’ọgbakọ ga-etinye aka n’agụụ ịkwa iko. Okwu Grik a sụgharịrị “agụụ ịkwa iko” na-egosi enweghị njide onwe onye n’omume, enweghị nchịkwa, omume na-ekwesịghị ekwesị, mmekọahụ na-adịghị ọcha, àgwà asọghị ihere. Pita kwuru na mbụ na ndị Kraịst ‘agbanarịwo mmebi nke dị n’ụwa site n’agụụ ihe ọjọọ.’ (2 Pita 1:4) Ma ụfọdụ gaje ịlaghachi ná mmebi ahụ, ndị ozizi ụgha n’ime ọgbakọ gajekwa ịkpata ya n’ụzọ dị ukwuu! Otú a a gaje ikwulu ụzọ nke eziokwu ahụ. Lee aha ihe mwute ọ bụ! N’ezie, nke a bụ okwu Ndịàmà Jehova nile taa kwesịrị ịṅa ntị nke ọma. Anyị ekwesịghị ichefu mgbe ọ bụla na, na-adabere n’àgwà anyị, anyị pụrụ iwetara Jehova Chineke na ndị ya otuto ma ọ bụ wetara ha nkọcha.—Ilu 27:11; Ndị Rom 2:24.

Iwebata Ozizi Ụgha

6. Gịnị na-akwali ndị ozizi ụgha, oleekwa ụzọ ha si agbalị inweta ihe ha na-achọ?

6 N’ụzọ amamihe, anyị na-arịba ama ụzọ ndị ozizi ụgha si ewebata echiche ha rụrụ arụ. Pita bu ụzọ kwuo na ha na-eme ya nwayọọ, ma ọ bụ n’ụzọ zoro ezo, nke aghụghọ. Ọ na-ekwukwasị: “N’ime anyaukwu ka ha ga-ejikwa okwu nrafu dị iche iche were unu zụọ ahịa.” Ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akwali ndị ozizi ụgha, dị ka e mesiri ike site n’ụzọ The Jerusalem Bible si sụgharịa ya: “Ha ga-eji ịnụ ọkụ n’obi nwaa iji okwu aghụghọ zụrụ unu nye onwe ha.” N’otu aka ahụ, nsụgharị James Moffatt n’ebe a na-asị: “N’agụụ ihe ọjọọ ha ha ga-ewere unu zụọ ahịa site n’arụmụka aghụghọ.” (2 Pita 2:1, 3) Ihe ndị ozizi ụgha na-ekwu n’ọnụ pụrụ iyi ihe ezi uche dị na ya nye onye na-amụghị anya n’ime mmụọ, ma e ji nlezianya hazie okwu ha ‘ịzụrụ’ ndị mmadụ, na-arara ha gaa n’imezu nzube ọchịchọ onwe onye nanị nke ndị nduhie.

7. Nkà ihe ọmụma dị aṅaa wuru ewu na narị afọ mbụ?

7 Ihe ịrụ ụka adịghị ya, echiche ụwa dị mgbe ahụ nwere ike n’ahụ ndị ozizi ụgha nke narị afọ mbụ ahụ. N’ihe dị ka n’oge Pita na-ede ihe, otu nkà ihe ọmụma a na-akpọ Gnosticism na-ewu ewu. Ndị Gnostic kwenyere na ihe nile a na-ahụ anya dị njọ nakwa na ọ bụ nanị ihe metụtara mmụọ dị mma. N’ihi ya, ụfọdụ n’ime ha kwuru na ihe ọ bụla mmadụ ji ahụ nkịtị ya mee adịghị mkpa. Ka oge na-aga, ka ha rụrụ ụka, mmadụ agakwaghị enwe ahụ a. Ya mere, ka ha kwubiri, mmehie anụ ahụ—gụnyere ndị nke mmekọahụ—abụghị oké ihe. O yiri ka echiche ndị dị otú ahụ malitere imetụta ụfọdụ sị na ha nọ n’Iso Ụzọ Kraịst.

8, 9. (a) Echiche dị aṅaa gbagọrọ agbagọ metụtara ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ? (b) Dị ka Jud na-ekwu, gịnị ka ụfọdụ n’ọgbakọ nọ na-eme?

8 Otu ọkà mmụta Bible rịbara ama na “e nwere ndị nọ n’ime Chọọchị bụ́ ndị merụrụ ozizi nke amara,” ma ọ bụ “ebere na-erughịrị mmadụ.” (Ndị Efesọs 1:5-7) Dị ka o kwuru, arụmụka ụfọdụ ndị gara otú a: “Ị̀ na-ekwu na [ebere na-erughịrị mmadụ] nke Chineke dịruru obosara ikpuchi mmehie ọ bụla? . . . Mgbe ahụ ka anyị gaa n’ihu na-eme mmehie, n’ihi na [ebere na-erughịrị mmadụ] nke Chineke pụrụ ihichapụ mmehie ọ bụla. N’ezie, ka anyị na-emekwu mmehie otú ahụ ka [ebere na-erughịrị mmadụ] nke Chineke ga-enwekwu ohere ịrụ ọrụ.” Ị̀ nụtụwo echiche gbagọrọ agbagọ karịa nke ahụ?

9 Pọl onyeozi kwugidere echiche na-ezighị ezi banyere ebere Chineke mgbe ọ jụrụ: “Ànyị ga-anọgide ná mmehie, ka amara wee hie nne?” Ọ jụkwara: “Ọ̀ bụ na anyị ga-emehie, n’ihi na anyị anọghị n’okpuru iwu, kama n’okpuru amara?” Nye ajụjụ nke ọ bụla Pọl zara hoo haa, sị: “Chineke ekwela.” (Ndị Rom 6:1, 2, 15) N’ụzọ doro anya, dị ka Jud na-ekwu, ụfọdụ “na-agha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko.” Otú ọ dị, Pita na-arịba ama na nye ndị dị otú ahụ “ịla n’iyi ha adịghị erokwa ụra.”—Jud 4; 2 Pita 2:3.

Ihe Atụ Ịdọ Aka ná Ntị

10, 11. Ihe atụ ịdọ aka ná ntị atọ dị aṅaa ka Pita nyere?

10 Iji mesie ike na Chineke ga-eme ihe megide ndị ma ụma na-emehie, Pita si n’Akwụkwọ Nsọ nye ihe atụ ịdọ aka ná ntị atọ. Nke mbụ, ọ na-ede, sị: “Chineke emereghị ndị mmụọ ozi ebere mgbe ha mehiere.” Ndị a, ka Jud na-ekwu, ‘edebeghị ịbụisi nke aka ha, kama ha hapụrụ ebe obibi nke aka ha’ n’eluigwe. Ha bịara n’ụwa tupu Iju Mmiri ahụ ma were anụ ahụ ka ha wee soro ụmụ ndị inyom nke mmadụ nwee mmekọahụ. Dị ka ntaramahụhụ maka àgwà ha na-ekwesịghị ekwesị, megidere okike, a tụbara ha n’ime “Tatarọs” (NW), ma ọ bụ dị ka ihe ndekọ Jud na-ekwu, e “debewokwa ha n’agbụ ebighị ebi n’okpuru ọchịchịrị nye ikpe nke oké ụbọchị ahụ.”—2 Pita 2:4; Jud 6; Jenesis 6:1-3.

11 Ọzọ, Pita na-ezo aka ná ndị ụbọchị Noa. (Jenesis 7:17-24) Ọ na-ekwu na n’oge Noa Chineke “[emereghị] ụwa ochie ebere . . . mgbe O mere ka iju mmiri bịakwasị ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” N’ikpeazụ, Pita na-ede na Chineke setịpụrụ “ihe ilereanya nye ndị gaje ịbụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” site n’ime “ka obodo Sọdọm na Gọmọra ghọọ ntụ.” Jud na-agbakwụnye ihe ọmụma nke na ndị ahụ ‘raara onwe ha nye n’ịkwa iko n’ụzọ gabigara ókè wee pụọ soo anụ ahụ dị iche iche.’ (2 Pita 2:5, 6; Jud 7) Ọ bụghị nanị na ndị ikom so ndị inyom nwee mmekọahụ rụrụ arụ kama ha rere ọkụ n’agụụ ha maka anụ ahụ nke ndị ikom ọzọ, ikekwe ọbụna maka anụ ahụ nke anụ ọhịa.—Jenesis 19:4, 5; Levitikọs 18:22-25.

12. Dị ka Pita na-ekwu, olee otú e si enye ụgwọ ọrụ maka àgwà ezi omume?

12 Ma, n’otu mgbe ahụ, Pita na-arịba ama na Jehova bụ onye na-enye ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ya ụgwọ ọrụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-akọ ụzọ Chineke si ‘chee Noa, onye mere ha asatọ, bụ́ onye na-ekwusa ezi omume’ mgbe O wetara Iju Mmiri ahụ. Ọ na-akọkwa banyere mgbapụta Jehova gbapụtara “Lọt, bụ́ onye ezi omume” n’oge nke Sọdọm, na-ekwubi, sị: “Onyenwe anyị matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke, na idebe ndị ajọ omume n’ahụhụ mmehie ruo ụbọchị ikpe.”—2 Pita 2:5, 7-9.

Omume Ndị Kwesịrị Ntaramahụhụ

13. Ole ndị karịsịa ka e debere maka ikpe, ná nrọ dịgasị aṅaa ka o yiri ka ha na-emikpukwa onwe ha?

13 Pita kpọrọ ndị e debere karịsịa maka ikpe Chineke, ya bụ, “ndị na-ejeso anụ ahụ n’agụụ ihe e merụrụ emerụ, ndị na-elelịkwa ịbụ onye nwe mmadụ anya.” Anyị pụrụ nnọọ inwe mmetụta nke iwe ji Pita ka ọ na-ekwu, sị: “Ndị nwere anyaike, ndị nwere isi ike, ha amaghị ahụ jijiji ikwulu ndị nọ n’ebube.” Jud na-ede na “mmadụ ndị a na-emerụkwa anụ ahụ ha n’ịrọ nrọ ha, . . . kwuluokwa ndị nọ n’ebube.” (2 Pita 2:10; Jud 8) Nrọ ha pụrụ ịgụnye echiche efu na-adịghị ọcha banyere mmekọahụ bụ́ ndị na-akwado nchụso nke mmejụ ọchịchọ mmekọahụ rụrụ arụ ha. Ma, n’echiche dị aṅaa ka ha “na-elelịkwa ịbụ onye nwe mmadụ anya” ma ‘na-ekwulu ndị nọ n’ebube’?

14. N’echiche dị aṅaa ka ndị ozizi ụgha ‘na-elelị ịbụ onye nwe mmadụ’ ma ‘na-ekwulu ndị nọ n’ebube’?

14 Ha na-eme otú ahụ ebe ha na-elelị ịbụisi Chineke guzobere. Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-anọchite anya Jehova Chineke dị ebube na Ọkpara ya, n’ihi ya kwa, nwee ebube nke e nyefere ha. N’eziokwu, ha na-ehie ụzọ, dị ka Pita n’onwe ya hiere, ma Akwụkwọ Nsọ na-agba ndị nọ n’ọgbakọ ume ido onwe ha n’okpuru ndị dị otú ahụ nọ n’ebube. (Ndị Hibru 13:17) Emezighị emezi ha abụghị ihe mere a ga-eji na-ekwulu ha. Pita na-ekwu na ndị mmụọ ozi “ekpegideghị [ndị ozizi ụgha] ikpe nkwulu,” ọ bụ ezie na ọ ga-abụ nke kwesịrị nnọọ ekwesị. “Ma ndị a,” ka Pita na-aga n’ihu ikwu, “dị ka anụ na-enweghị uche, ndị bụ anụ efu site n’ọmụmụ ha ịnwụde na imebi, na-ekwulu Chineke n’ihe ha na-amaghị, a ga-emebikwa ndị a ná mmebi ha.”—2 Pita 2:10-13.

“Mgbe Ha Na-eso Unu Rikọọ Ihe”

15. Olee ụzọ ndị ozizi ụgha ji eme ihe, oleekwa ebe ha na-eme ihe ịra ụra ha?

15 Ọ bụ ezie na ndị a rụrụ arụ “na-agụ ya n’ihe ụtọ, bụ́ ibi n’oké oriri na oké ọṅụṅụ n’ehihie” ma bụrụ “ntụpọ na ihe ịta ụta,” ha dịkwa aghụghọ. Ha na-eme ihe na “nzuzo,” na-eji “okwu nrafu” eme ihe, dị ka Pita kwuburu. (2 Pita 2:1, 3, 13) Otú a, ọ pụrụ ịbụ na ha agaghị na-ama mgbalị ndị okenye ịkwalite ụkpụrụ omume Chineke aka n’ụzọ pụtara ìhè ma ọ bụ na-achụso mmejụ ọchịchọ mmekọahụ ha n’ụzọ pụtara ìhè. Kama nke ahụ, Pita na-asị na ha na-emikpu “n’oké oriri na oké ọṅụṅụ n’oriri ịhụnanya ha mgbe ha na-eso unu rikọọ ihe.” Jud na-edekwa, sị: “Ndị a bụ ndị nke bụ nkume zoro ezo n’oriri ịhụnanya unu.” (Jud 12) Ee, dị nnọọ ka nkume ndị pịrị ọnụ n’okpuru mmiri pụrụ ịdụpu ike ụgbọ, na-eme ka mmiri rie ndị ọkwọ ụgbọ mmiri na-anọghị na nche, ndị ozizi ụgha nọ na-emerụ ndị na-anọghị na nche bụ́ ndị ha na-eji ihu abụọ na-eme ka ha hụrụ ha n’anya n’oge ‘oriri ịhụnanya.’

16. (a) Gịnị bụ ‘oriri ịhụnanya,’ n’ọnọdụ dịgasị aṅaa yiri ha ka ndị rụrụ arụ pụkwara ime ihe taa? (b) N’ebe ole ndị nọ ka ndị ozizi ụgha na-atụkwasị uche ha, ya mere gịnị ka ndị dị otú ahụ na-aghaghị ime?

16 O yiri ka ‘oriri ịhụnanya’ ndị a hà bụ oge nnọkọ oriri na ọṅụṅụ mgbe ndị Kraịst narị afọ mbụ na-abịakọ ọnụ ịnụ ụtọ nri na mkpakọrịta. Ndịàmà Jehova taa na-abịakọkwa ọnụ mgbe ụfọdụ, ikekwe n’oriri agbamakwụkwọ, ná mkpapụ ntụrụndụ, ma ọ bụ maka mkpakọrịta n’uhuruchi. Olee otú ndị rụrụ arụ pụrụ isi jiri oge ndị dị otú ahụ rafuo ndị mmadụ? Pita na-ede: “Ha bụ ndị nwere anya nke jupụtara n’ahụ nwanyị na-akwa iko, . . . ha bụkwa ndị na-arafu mkpụrụ obi ndị na-adịghị eguzosi ike.” Ha na-atụkwasị “obi [ha] a nwapụtaworo n’anyaukwu” n’ahụ ndị na-eguzosighị ike n’ime mmụọ bụ ndị na-emebeghị ka eziokwu ahụ bụrụ nke ha n’ụzọ zuru ezu. Ya mere ka ihe mere n’ụbọchị Pita dọọ gị aka ná ntị, nọrọkwa na nche! Guzogide ịkpa nso ọ bụla na-adịghị ọcha, ekwekwala ka ịma mma ma ọ bụ ndọrọ anụ ahụ nke onye na-akpa nso n’ụzọ rụrụ arụ rafuo gị!—2 Pita 2:14.

“Ụzọ Belam”

17. Gịnị bụ “ụzọ Belam,” oleekwa otú o si metụta ndị Israel 24,000?

17 Ụmụ nke “ọbụbụ ọnụ” a amawo eziokwu ahụ ruo oge ụfọdụ. Ha ka pụrụ iyi ka ha na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ. Ma Pita na-asị: “Ha hapụrụ ụzọ guzoziri eguzo, wee jehie, ebe ha sooro ụzọ Belam nwa nke Beoa, onye hụrụ ụgwọ ọrụ nke ajọ omume n’anya.” (2 Pita 2:14, 15) Ụzọ onye amụma Belam bụ ịdụ ọdụ maka ụzọ iji omume rụrụ arụ raa mmadụ ụra iji nwetara onwe ya uru. Ọ gwara Eze Belak nke Moab na Chineke ga-akọcha Israel ma ọ bụrụ na a pụrụ ịraba ndị ahụ n’ịkwa iko. N’ihi ya, ndị inyom Moab rafuru ọtụtụ ndị Chineke, e gbukwara mmadụ 24,000 n’ihi àgwà ha rụrụ arụ.—Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9; 31:15, 16; Mkpughe 2:14.

18. Ruo ókè hà aṅaa ka Belam siri ọnwụ, gịnịkwa ka ihe si na ya pụta na-egosi maka ndị ozizi ụgha?

18 Pita na-arịba ama na e gbochiri Belam mgbe ịnyịnya ibu ya gwara ya okwu, ma Belam “hụrụ ụgwọ ọrụ nke ajọ omume n’anya” nke ukwuu nke na ọbụna mgbe nke ahụ mere, o sighị ‘n’anya adịghị mma’ ya wezụga onwe ya. (2 Pita 2:15, 16) Lee aha ajọ mmadụ ọ bụ! Ahụhụ dịịrị onye ọ bụla dị ka Belam nke na-anwa imerụ ndị Chineke site n’ịnwa ha ime omume rụrụ arụ! Belam nwụrụ n’ihi ajọ omume ya, nlepere anya nke ihe ga-eme ndị nile gbasoro ụzọ ya.—Ọnụ Ọgụgụ 31:8.

Ịra Ụra Ha Jọgburu Onwe Ha

19, 20. (a) Gịnị ka e ji ndị yiri Belam tụnyere, n’ihi gịnịkwa? (b) Ole ndị ka ha na-arafu, n’ihi gịnịkwa? (ch) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ịra ụra ha jọgburu onwe ha, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi chebe onwe anyị na ndị ọzọ n’ebe ha nọ?

19 N’ịkọwa ndị yiri Belam, Pita na-ede: “Ndị a bụ isi iyi [ma ọ bụ, olulu mmiri] nke mmiri na-adịghị, bụrụkwa alụlụụ [ma ọ bụ, urukpuru] nke oké ifufe na-efepụ.” Nye onye njem akpịrị na-akpọ nkụ n’ọzara, olulu mmiri takọrọ atakọ pụrụ ịpụta ọnwụ. Ka a sịkwa ihe mere na ‘e debewo itiri nke ọchịchịrị’ maka ndị yiri ihe ndị dị otú ahụ! “N’ihi na, ebe ha na-ekwu oké okwu na-afụli afụli nke ihe efu,” ka Pita na-aga n’ihu ikwu, “ha weere agụụ ịkwa iko dị iche iche na-arafu ndị ahụ n’ime agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, bụ́ ndị na-agbanarị n’oge ugbu a ndị na-ebi obi ná njehie.” Ha na-arafu ndị na-enweghị ahụmahụ site ‘n’ikwe ha nkwa na ha ga-enwe onwe ha,’ ka Pita na-ekwu, ebe “ha onwe ha bụ ohu nke mmebi.”—2 Pita 2:17-19; Ndị Galetia 5:13.

20 Ịra ụra nke ndị nkụzi rụrụ arụ dị otú ahụ jọgburu onwe ha. Dị ka ihe atụ, ha pụrụ ịsị: ‘Chineke maara na anyị adịghị ike, na-adabakwa n’agụụ mmekọahụ. Ya mere ọ bụrụ na anyị emee ihe anyị na-achọ ma mejụọ ọchịchọ mmekọahụ anyị, Chineke ga-eme ebere. Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, ọ ga-agbaghara anyị dị ka o mere n’oge mbụ anyị batara n’eziokwu ahụ.’ Cheta na Ekwensu jiri ụzọ yitụrụ nke ahụ jekwuru Iv, na-ekwe ya nkwa na ọ pụrụ ime mmehie n’enweghị ihe ga-eme ya. N’ọnọdụ Iv ọ zọọrọ na imehie megide Chineke ga-enye ya mmepeanya na nnwere onwe. (Jenesis 3:4, 5) Ọ bụrụ na anyị ezute ụdị onye rụrụ arụ dị otú ahụ ka o so ọgbakọ na-emekọ ihe, anyị nwere ibu ọrụ nke ichebe onwe anyị nakwa ndị ọzọ site n’ikpe onye ahụ n’aka ndị nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst.—Levitikọs 5:1.

Ndị E Chebere Site ná Mmazu

21-23. (a) Olee ihe ndị na-esite n’etinyeghị mmazu n’ọrụ? (b) Olee nsogbu ọzọ Pita na-atụle bụ́ nke anyị ga-atụlezi?

21 Pita na-emechi akụkụ nke a nke akwụkwọ ozi ya site n’ịkọwa ihe ndị ga-esite n’etinyeghị ihe ọmụma o kwuru na mbụ na ọ dị mkpa maka “ndụ na nsọpụrụ Chineke” n’ọrụ. (2 Pita 1:2, 3, 8) Ọ na-ede, sị: “N’ihi na a sị na, mgbe ha gbanarịworo ihe nile e merụrụ emerụ nke ụwa site ná mmazu nke Onyenwe anyị, bụ́ Onye nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst, e wee tụhịa ha ọzọ n’ime ihe ndị a, meriekwa ha, ọnọdụ ikpeazụ ha abịawo jọkarịa ọnọdụ mbụ njọ.” (2 Pita 2:20, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Lee ihe mwute ọ bụ! Ndị dị otú ahụ n’ụbọchị Pita atụfuwo olileanya dị oké ọnụ ahịa nke ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe maka oge na-agabiga ngwa ngwa nke imejụ ọchịchọ mmekọahụ.

22 Ya mere Pita na-ekwu, sị: “Ọ ga-akaworị mma ma ọ bụrụ na ha aka-amazughị ụzọ ezi omume, karịa ịmazu ya, wee si n’ihe dị nsọ ahụ e nyere n’iwu, nke e nyere ha n’aka idebe, laghachi. Okwu nke . . . ilu ahụ adakwasịwo ha, Ọ bụ nkịta nke chigharịrị ọzọ n’ihe ọ gbọrọ, bụrụkwa nne ezì nke chigharịrị ọzọ n’ịtụrụ n’apịtị mgbe ọ sachasịrị onwe ya.”—2 Pita 2:21, 22; Ilu 26:11.

23 Ihe àmà na-egosi na nsogbu ọzọ nke maliteworo imetụta ndị Kraịst oge mbụ yiri nke na-emetụta ụfọdụ taa. Laa azụ n’oge ahụ, ihe àmà na-egosi na ụfọdụ na-eme mkpesa banyere ihe yiri abịaghị abịa nke ọnụnọ Kraịst e kwere ná nkwa. Ka anyị tụlee ụzọ Pita si tụlee okwu a.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Ihe atụ ịdọ aka ná ntị atọ dị aṅaa ka Pita na-ehota?

◻ Olee otú ndị ozizi ụgha si ‘elelị ịbụ onye nwe mmadụ’?

◻ Gịnị bụ ụzọ Belam, oleekwa otú ndị na-agbaso ya pụrụ isi nwaa ịrafu ndị ọzọ?

◻ Olee ihe ndị na-esite n’etinyeghị mmazu n’ọrụ?

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Belam bụ ihe atụ ịdọ aka ná ntị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya