Na-ele Anya Ụbọchị Jehova
“Ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa na mgbe ikpeazụ.”—2 PITA 3:3.
1. Echiche ịdị ngwá dị aṅaa ka otu onye Kraịst n’oge a nwere?
OTU onye ozi oge nile ruo ihe karịrị afọ 66 dere: “Anọgidewo m na-enwe mmetụta nke ịdị ngwa. Mgbe nile, Amagedọn anọgidewo na-abụ, n’echiche m, ihe ga-abịa nwanne echi. (Mkpughe 16:14, 16) Dị ka nna m mere, dịkwa ka nna ya mere tupu ya onwe ya, ebiwo m ndụ m dị ka onyeozi ahụ [Pita] gbara ume, ‘na-ele anya [mbịarute, NW] nke ụbọchị ahụ nke Jehova. Anọgidewo m na-ele ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa anya dị ka ‘ihe dị adị n’ezie, ọ bụ ezie na a hụghị ya anya.’”—2 Pita 3:11, 12; Ndị Hibru 11:1; Aịsaịa 11:6-9; Mkpughe 21:3, 4.
2. Gịnị ka ịdị na-ele anya ụbọchị Jehova pụtara?
2 Okwu Pita bụ́ “na-ele anya” n’ihe banyere ụbọchị Jehova pụtara na anyị agaghị ewepụ ya n’echiche anyị. Anyị ekwesịghị ichefu na ụbọchị ahụ mgbe Jehova ga-ebibi usoro ihe a dị ka ihe a ga-eme tupu e guzobe ụwa ọhụrụ ya e kwere ná nkwa dị nnọọ nso. O kwesịrị ịbụ nnọọ ihe dị adị nye anyị nke na anyị na-ahụ ya nke ọma, dị ka ihe dị kpọmkwem n’ihu anyị. Ọ bụ otú ahụ ka o si dị adị nye ndị amụma Chineke n’oge ochie, ha kwukwara banyere ya mgbe mgbe dị ka ihe dị nso.—Aịsaịa 13:6; Joel 1:15; 2:1; Obadaịa 15; Zefanaịa 1:7, 14.
3. Gịnị ka ihe àmà na-egosi na ọ bụ ya kpalitere ndụmọdụ Pita banyere ụbọchị Jehova?
3 N’ihi gịnị ka Pita ji gbaa anyị ume ile ụbọchị Jehova anya dị ka ọ pụrụ ịbịa, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, “nwanne echi”? N’ihi na ihe àmà na-egosi na ụfọdụ amaliteworị ịkwa echiche nke ọnụnọ Kraịst e kwere ná nkwa emo bụ́ mgbe a ga-enye ndị mere ihe ọjọọ ahụhụ. (2 Pita 3:3, 4) Ya mere n’isi nke 3 nke akwụkwọ ozi nke abụọ ya, nke anyị ga-atụle ugbu a, Pita na-azaghachi nzọrọ nke ndị a na-akwa emo.
Arịrịọ Na-ekpo Ọkụ A Ga-echeta
4. Gịnị ka Pita chọrọ ka anyị cheta?
4 E gosipụtara ịhụnanya Pita maka ụmụnna ya site na ya ịkpọ ha ugboro ugboro n’isiakwụkwọ a “ndị m hụrụ n’anya.” N’iji ikpo ọkụ na-arịọ ha ka ha ghara ichefu ihe e ziworo ha, Pita na-amalite: “Ndị m hụrụ n’anya, . . . m na-akpali uche unu dị ọcha n’ichetara unu; ka unu wee cheta okwu nke ndị amụma dị nsọ buru ụzọ kwuo, chetakwa ihe ahụ Onyenwe anyị, bụ́ Onye nzọpụta anyị, nyere n’iwu site n’ọnụ ndị ozi unu.”—2 Pita 3:1, 2, 8, 14, 17; Jud 17.
5. Gịnị ka ụfọdụ ndị amụma kwuru banyere ụbọchị Jehova?
5 Olee “okwu nke ndị amụma dị nsọ buru ụzọ kwuo” Pita na-agba ndị na-agụ akwụkwọ ya ume icheta? Ee, ndị ahụ bụ banyere ọnụnọ Kraịst n’ike Alaeze na banyere ikpe nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Pita ebuwo ụzọ dọrọ uche gaa n’okwu ndị a. (2 Pita 1:16-19; 2:3-10) Jud na-ezo aka n’ebe Inọk nọ, bụ́ onye amụma mbụ e nwere ihe ndekọ ya nke dọrọ aka ná ntị banyere ikpe Chineke mara ndị na-emebi iwu. (Jud 14, 15) Ndị amụma ndị ọzọ sochiri Inọk, Pita achọghịkwa ka anyị chefuo ihe ha dere.—Aịsaịa 66:15, 16; Zefanaịa 1:15-18; Zekaraịa 14:6-9.
6. Ihe dịgasị aṅaa ndị Kraịst na ndị ozi ya kwuru na-enye anyị ihe ọmụma banyere ụbọchị Jehova?
6 Tụkwasị na nke a, Pita na-agwa ndị na-agụ akwụkwọ ya ka ha cheta “ihe ahụ Onyenwe anyị, bụ́ Onye nzọpụta anyị, nyere n’iwu.” Ihe Jisọs nyere n’iwu gụnyere agbamume a: “[Lezienụ onwe unu anya, NW], ka a ghara . . . [ibogbu] obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà.” “Lezienụ anya, mụrụnụ anya, na-ekpekwanụ ekpere: n’ihi na unu amataghị mgbe oge ahụ bụ.” (Luk 21:34-36; Mak 13:33) Pita gbakwara anyị ume ịṅa ntị n’okwu ndị ozi. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi dere: “Dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke Onyenwe anyị na-abịa. Ya mere otú a, ka anyị ghara ịrahụ ụra, dị ka ndị fọdụrụ, kama ka anyị na-eche nche nweekwa anya udo.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 6.
Ọchịchọ nke Ndị Na-akwa Emo
7, 8. (a) Ụdị ndị dị aṅaa ka ndị na-akwa ozi ịdọ aka ná ntị Chineke emo bụ? (b) Gịnị ka ndị na-akwa emo na-azọrọ?
7 Dị ka e kwuburu, ihe kpatara ndụmọdụ Pita bụ na ụfọdụ amalitewo ịchị ịdọ aka ná ntị dịgasị otú ahụ ọchị, ọbụna dị ka ndị Israel oge mbụ kwara ndị amụma Jehova emo. (2 Ihe Emere 36:16) Pita na-akọwa: “Ebe unu buru ụzọ mara nke a, na ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa na mgbe ikpeazụ, na-aga dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị.” (2 Pita 3:3, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Jud na-asị na ọchịchọ nke ndị a na-akwa emo bụ “nke asọpụrụghị Chineke.” Ọ na-akpọ ha “ndị mkpụrụ obi mmadụ na-achị, ndị na-enweghị Mmụọ Nsọ.”—Jud 17-19.
8 O yiri ka ndị ozizi ụgha Pita kwuru “na-ejeso anụ ahụ n’agụụ ihe e merụrụ emerụ” so ná ndị a na-akwa emo bụ́ ndị na-enweghị mmụọ nsọ. (2 Pita 2:1, 10, 14) Ha na-eji ịkwa emo ajụ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Olee ebe nkwa nke [ọnụnọ, NW] Ya dị? n’ihi na site n’ụbọchị nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide dị ka ha dịworo site ná mmalite nke okike.”—2 Pita 3:4.
9. (a) N’ihi gịnị ka ndị na-akwa emo ji anwa ibelata echiche ịdị ngwa nke jupụtara n’Okwu Chineke? (b) Olee otú ịdị na-ele anya ụbọchị Jehova si bụụrụ anyị ihe nchebe?
9 Gịnị kpatara ịkwa emo a? Gịnị kpatara ịtụ aro na ọnụnọ Kraịst nwere ike ọ gaghị abịa ma ọlị, na Chineke adịbeghị mgbe o tinyere aka n’ihe ụmụ mmadụ na-eme, ọ dịghịkwa mgbe ọ ga-etinye? Ee, site n’ibelata echiche nke ịdị ngwa nke jupụtara n’Okwu Chineke, ndị a na-akwa emo bụ́ ndị mkpụrụ obi mmadụ na-achị na-achọ itinye ndị ọzọ n’enweghị mmasị n’ihe ime mmụọ wee si otú ahụ mee ha ndị dị mfe iji ihe ọchịchọ onwe onye nanị rata. Lee aha agbamume dị ike ọ bụ nye anyị taa ịnọgide na-amụ anya n’ime mmụọ! Ka anyị na-ele anya ụbọchị Jehova ma na-echeta mgbe nile na anya ya dịkwasịrị anyị! Otú a a ga-akwali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi jeere Jehova ozi ma nọgide na-adị ọcha n’omume anyị.—Abụ Ọma 11:4; Aịsaịa 29:15; Ezikiel 8:12; 12:27; Zefanaịa 1:12.
Ịma Ụma ma Na-asọ Oyi
10. Olee otú Pita si nwapụta na ndị ahụ na-akwa emo hiere ụzọ?
10 Ụdị ndị dị otú ahụ na-akwa emo na-eleghara otu eziokwu dị mkpa anya. Ha na-ama ụma eleghara ya anya ma na-anwa ime ka ndị ọzọ chefuo ya. N’ihi gịnị? Ka o wee kara ha mfe ịrafu ha. “N’ihi na nke a mere ha nchefu,” ka Pita na-ede, “n’ihi na ha na-achọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Gịnị bụ eziokwu ahụ? “Na eluigwe dị site na mgbe ochie, ha na ala nke e sitere na mmiri werekwa mmiri mee ka o guzokọọ n’otu, site n’okwu Chineke; nke e sitere n’aka ha mee ka ụwa nke dị n’oge ahụ laa n’iyi, n’ihi na iju mmiri gbara ya.” (2 Pita 3:5, 6) Ee, Jehova wepụsịrị ajọ omume n’ụwa n’oge Iju Mmiri n’ụbọchị Noa, eziokwu nke Jisọs mesiri ike. (Matiu 24:37-39; Luk 17:26, 27; 2 Pita 2:5) Ya mere, n’adịghị ka ihe ndị na-akwa emo na-ekwu, ihe nile agabeghị n’ihu “dị ka ha dịworo site ná mmalite nke okike.”
11. Atụmanya dịgasị aṅaa oge ha na-erubeghị nke ndị Kraịst oge mbụ dugara ụfọdụ ndị n’ịkwa ha emo?
11 Ndị na-akwa emo pụrụ ịkwawo ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi emo n’ihi na ndị a ka nwere atụmanya ndị a na-emezubeghị. Oge na-adịghị anya tupu ọnwụ Jisọs, ndị na-eso ụzọ ya “na-eche na alaeze Chineke gaje ịpụta ìhè ngwa ngwa.” E mesịa, mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ ha jụrụ ma à ga-eguzobe Alaeze ahụ ozugbo. Ọzọ, ihe dị ka afọ iri tupu Pita edee akwụkwọ ozi nke abụọ ya, ụfọdụ na-eme “mkpatụ” n’ihi otu “okwu” ma ọ bụ “akwụkwọ ozi,” nke a sị na o sitere n’aka Pọl onyeozi ma ọ bụ ndị ibe ya, “dị ka a ga-asị na ụbọchị Onyenwe anyị dị ugbu a.” (Luk 19:11; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:2; Ọrụ 1:6) Ma, ọ bụghị na atụmanya ndị a nke ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ nke ụgha, nanị na oge ha erubeghị. Ụbọchị Jehova ga-abịa!
A Pụrụ Ịdabere n’Okwu Chineke
12. Olee otú Okwu Chineke siworo kwesị ndabere n’amụma ya banyere “ụbọchị Jehova”?
12 Dị ka e kwuburu, ndị amụma nọ tupu oge ndị Kraịst dọrọ aka ná ntị ọtụtụ mgbe na ụbọchị ịbọ ọbọ Jehova dị nso. “Ụbọchị Jehova” nke obere bịara na 607 T.O.A. mgbe Jehova bọrọ ọbọ n’isi ndị ya na-eme isi ike. (Zefanaịa 1:14-18) E mesịa, mba ndị ọzọ, gụnyere Babilọn na Ijipt, nwetara ụdị “ụbọchị Jehova” dị otú ahụ. (Aịsaịa 13:6-9; Jeremaịa 46:1-10; Obadaịa 15) E bukwara njedebe nke usoro ihe ndị Juu nke narị afọ mbụ n’amụma, o mekwara mgbe ndị agha Rom tikpọsịrị Judia na 70 O.A. (Luk 19:41-44; 1 Pita 4:7) Ma Pita na-atụ aka ‘n’ụbọchị Jehova’ nke dị n’ihu, nke ga-akarị ọbụna Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ!
13. Ihe atụ mere eme dị aṅaa na-egosipụta iji n’aka nke ọgwụgwụ nke usoro ihe a?
13 Pita na-ewebata nkọwa ya nke mbibi ahụ na-abịanụ, na-asị: “Site n’otu okwu ahụ.” Ọ ka kwupụrụ na “site n’okwu Chineke,” ụwa ahụ dị tupu Iju Mmiri “sitere na mmiri werekwa mmiri mee ka o guzokọọ n’otu.” Ọnọdụ a, nke a kọwara n’akụkọ okike nke Bible, mere ka o kwe omume inwe Iju Mmiri mgbe mmiri zoro ná ntụzi, ma ọ bụ okwu Chineke. Pita na-aga n’ihu: “Eluigwe nke dị ugbu a, ha na ụwa, ka a kpadoworo nye ọkụ site n’otu okwu [Chineke] ahụ, ebe a na-edebe ha nye ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:5-7; Jenesis 1:6-8) Anyị nwere okwu Jehova a pụrụ ịdabere na ya maka ya! Ọ ga-eweta njedebe nye “eluigwe . . . na ụwa”—usoro ihe dị ugbu a—n’iwe dị ọkụ nke oké ụbọchị ya! (Zefanaịa 3:8) Ma ọ̀ bụ ole mgbe?
Ịchọsi Ike Ka Ọgwụgwụ ahụ Bịa
14. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na anyị na-ebi ugbu a na “mgbe ikpeazụ”?
14 Ndị na-eso ụzọ Jisọs chọrọ ịma mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-abịa, ya mere ha jụrụ ya: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” Ihe àmà na-egosi na ha na-ajụ banyere mgbe usoro ihe ndị Juu ga-ejedebe, ma azịza Jisọs lekwasịkarịrị anya na mgbe a ga-ebibi ‘eluigwe na ụwa’ dị ugbu a. Jisọs buru amụma ihe ndị dị ka oké agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, ọrịa, na mpụ. (Matiu 24:3-14, NW; Luk 21:5-36) Eri afọ 1914, anyị ahụwo ka a na-emezu ihe ịrịba ama Jisọs nyere maka “ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a” nakwa ihe ndị Pọl onyeozi kpọtụrụ aha ga-aka “mgbe ikpeazụ” akara. (2 Timoti 3:1-5) N’eziokwu, ihe àmà dị nnọọ ukwu na anyị na-ebi n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe a!
15. Gịnị ka ndị Kraịst chọworo ime n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị Jisọs?
15 Ndịàmà Jehova achọsiwo ike ịmara mgbe ụbọchị Jehova ga-ewere ọnọdụ. N’ịchọsi ihe ike ha, mgbe ụfọdụ ha anwawo ime atụmatụ mgbe ọ pụrụ ịbịa. Ma site n’ime otú ahụ, ha ahapụwo, dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs n’oge mbụ, ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Onyenwe ha nke na anyị “amataghị mgbe oge ahụ bụ.” (Mak 13:32, 33) Ndị na-akwa emo akwawo ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi emo n’ihi atụmanya ha oge ha na-erubeghị. (2 Pita 3:3, 4) Ka o sina dị, ụbọchị Jehova ga-abịa, ka Pita na-emesi ike, dị ka usoro ọgụgụ oge Ya si dị.
Mkpa nke Inwe Echiche Jehova
16. Ndụmọdụ dị aṅaa ka anyị ga-eji amamihe ṅaa ntị?
16 Ọ dị anyị mkpa inwe echiche Jehova banyere oge, dị ka Pita na-echetara anyị ugbu a: “Ma unu ekwela ka otu ihe a mee unu nchefu, ndị m hụrụ n’anya, na otu ụbọchị dị ka [otu puku afọ] n’anya Onyenwe anyị, [otu puku afọ] dịkwa ka otu ụbọchị.” Lee ka o si dị mkpụmkpụ ma e jiri ya tụnyere ogologo ndụ anyị nke afọ 70 ma ọ bụ 80! (2 Pita 3:8; Abụ Ọma 90:4, 10) Ya mere ọ bụrụ na mmezu nke nkwa Chineke eyie ka ọ na-ala azụ, ọ dị anyị mkpa ịnakwere ndụmọdụ onye amụma Chineke: “Ọ bụrụ na [oge ahụ a kara aka] laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Habakuk 2:3.
17. Ọ bụ ezie na mgbe ikpeazụ ahụ adịwo ogologo karịa otú ọtụtụ ndị tụrụ anya, gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka?
17 N’ihi gịnị ka mgbe ikpeazụ nke usoro ihe a jiworo nọtee aka karịa otú ọtụtụ ndị tụrụ anya ya? N’ihi otu ezi ihe, dị ka Pita kọwaziri: “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Jehova na-eburu n’uche ihe ga-akasị dịrị ihe nile a kpọrọ mmadụ mma. Ihe ọ na-eche bụ banyere ndụ ndị mmadụ, dị ka ọ na-ekwu, sị: “Ọnwụ nke onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ ma ọlị; kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ.” (Ezikiel 33:11) Ya mere anyị pụrụ inwe obi ike na ọgwụgwụ ahụ ga-abịa kpọmkwem n’oge ya iji mezuo nzube nke Onye Okike anyị maara ihe nile, nke na-ahụ n’anya!
Gịnị Ga-agabiga?
18, 19. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji kpebisie ike ibibi usoro ihe a? (b) Olee otú Pita si kọwaa ọgwụgwụ usoro ihe a, gịnịkwa n’ezie ka a ga-ebibi?
18 N’ihi na Jehova hụrụ ndị na-ejere ya ozi n’anya n’eziokwu, ọ ga-ekpochapụ ndị nile na-akpatara ha ahụhụ. (Abụ Ọma 37:9-11, 29) N’ịrịba ama, dị ka Pọl meburu, na mbibi a ga-abịa n’oge a na-atụghị anya ya, Pita na-ede, sị: “Ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi; nke ọ bụ n’ime ya ka eluigwe ga-eji oké ụzụ gabiga, ihe nile dị n’eluigwe ga-agbakwa ọkụ wee laa n’iyi, [a ga-ahụkwa, NW] ụwa na ọrụ nile a rụrụ n’ime ya.” (2 Pita 3:10; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:2) Eluigwe na ụwa nkịtị alaghị n’iyi n’Iju Mmiri ahụ, ha agaghị alakwa n’ụbọchị Jehova. Mgbe ahụ, gịnị ‘ga-agabiga,’ ma ọ bụ ka a ga-ebibi?
19 Ọchịchị mmadụ ndị chịworo ihe a kpọrọ mmadụ dị ka “eluigwe” ga-akwụsị, otú ahụkwa ka “ụwa,” ma ọ bụ ọha mmadụ na-adịghị asọpụrụ Chineke, ga-akwụsị. Ikekwe “oké ụzụ” ahụ na-egosi ngabiga dị ngwa nke eluigwe. “Ihe nile” nke mejupụtara ọha mmadụ retọrọ eretọ nke taa “ga-agbakwa ọkụ,” ma ọ bụ laa n’iyi. “A ga-ahụkwa ụwa,” gụnyere “ọrụ nile a rụrụ n’ime ya.” Jehova ga-ekpughesị nnọọ ajọ ọrụ ụmụ mmadụ ka ọ na-eweta usoro dum nke ụwa ná njedebe ya kwesịrị nnọọ ekwesị.
Tụkwasị Uche n’Olileanya Gị
20. Olee otú ihe ọmụma anyị banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu kwesịrị isi metụta ndụ anyị?
20 Ebe oké ihe ndị a na-achọ ime, Pita na-asị na anyị kwesịrị imikpu “n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile, na-ele anya [mbịarute, NW] nke ụbọchị ahụ nke Chineke, na-emekwa ka ọ bịa ngwa ngwa.” A pụghị inwe obi abụọ banyere ya! “Eluigwe ga-ere ọkụ wee laa n’iyi n’ihi ya, ihe nile dị n’eluigwe ga-agbakwa ọkụ wee gbazee.” (2 Pita 3:11, 12) Eziokwu ahụ bụ na oké ihe omume ndị a pụrụ ịmalite ime echi kwesịrị imetụta ihe ọ bụla anyị na-eme ma ọ bụ na-eme atụmatụ ime.
21. Gịnị ga-anọchi eluigwe na ụwa dị ugbu a?
21 Ugbu a Pita na-agwa anyị ihe ga-anọchi usoro ihe ochie, na-asị: “Ma dị ka nkwa Ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13; Aịsaịa 65:17) Aa, lee oké ihe ahụ efe ọ bụ! Kraịst na 144,000 ya na ha ga-eso chịa ga-aghọ ọchịchị “eluigwe ọhụrụ,” ndị lanarịrị ọgwụgwụ ụwa a ga-emejupụtakwa “ụwa ọhụrụ.”—1 Jọn 2:17; Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3.
Nọgide Na-enwe Echiche Ịdị Ngwa na Ịdị Ọcha n’Omume
22. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka izere ntụpọ ma ọ bụ ihe ịta ụta ọ bụla n’ụzọ ime mmụọ? (b) Ihe ize ndụ dị aṅaa ka Pita na-adọ aka ná ntị banyere ya?
22 “N’ihi nke a, ndị m hụrụ n’anya,” ka Pita na-aga n’ihu ikwu, “ebe unu na-ele anya ihe ndị a, na-anụnụ ọkụ n’obi ka e wee hụ unu n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta n’ihu Ya. Na-agụkwanụ ogologo ntachi obi Onyenwe anyị na ọ bụ nzọpụta.” Iji oké atụmanya na-echere ma na-ele ihe ọ bụla yiri ịla azụ nke ụbọchị Jehova anya dị ka ngosipụta nke ntachi obi Chineke ga-enyere anyị aka izere ntụpọ na ihe ịta ụta ọ bụla n’ụzọ ime mmụọ. Ma, e nwere ihe ize ndụ! Pita na-adọ aka ná ntị na n’ihe odide ndị nke “nwanna anyị anyị hụrụ n’anya, bụ́ Pọl, . . . ihe ụfọdụ nke dị ike ịghọta dị n’ime ha, nke ndị a na-ezighị ihe na ndị na-adịghị eguzosi ike na-achịgharị, dị ka ha na-emekwa ihe fọdụrụ nke e deworo n’akwụkwọ nsọ, ịla onwe ha n’iyi.”—2 Pita 3:14-16.
23. Gịnị bụ ndụmọdụ Pita ji mechie?
23 Ihe àmà na-egosi na ndị ozizi ụgha tụgharịrị ihe ndị Pọl dere banyere amara Chineke, na-eji ha emere ihe ngọpụ maka agụụ ịkwa iko. Ikekwe Pita bu nke a n’uche mgbe o dere ndụmọdụ ya o ji sị ka o mesịa: “Ya mere, unu onwe unu, ndị m hụrụ n’anya, ebe unu buru ụzọ mara ihe ndị a, na-echenụ onwe unu nche, ka a ghara iwere njehie nke ndị na-emebi iwu bupụ unu, unu wee si ná nguzosi ike nke aka unu dapụ.” O wee mechie akwụkwọ ozi ya, na-agba ume, sị: “Na-abanụ ụba n’amara na ọmụma nke Onyenwe anyị, bụ́ Onye nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst.”—2 Pita 3:17, 18.
24. Àgwà dị aṅaa kwesịrị ka ndị ozi Jehova nile mụta?
24 Dị ka o doro anya, Pita chọrọ iwusi ụmụnna ya ike. Ọ chọrọ ka mmadụ nile nwee àgwà nke Onyeàmà ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke dị afọ 82 e hotara ná mmalite, kwupụtara: “Ebiwo m ndụ m dị ka onyeozi ahụ [Pita] gbara ume, ‘na-ele anya [mbịarute, NW] nke ụbọchị ahụ nke Jehova. Anọgidewo m na-ele ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa anya dị ka ‘ihe dị adị n’ezie, ọ bụ ezie na a hụghị ya anya.’” Ka anyị nile bie ndụ anyị n’otu ụzọ ahụ.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?
◻ Gịnị ka ịdị “na-ele anya” ụbọchị Jehova pụtara?
◻ Gịnị ka ndị na-akwa emo na-ama ụma eleghara anya, n’ihi gịnịkwa?
◻ N’ihi gịnị ka ndị na-akwa emo jiworo kwaa ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi emo?
◻ Echiche dị aṅaa ka ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-enwe?
[Foto dị na peeji nke 23]
Na-ele anya ụbọchị Jehova . . .
[Foto dị na peeji nke 24]
. . . na ụwa ọhụrụ ga-esochi ya