Kpachara Anya Maka Ndị Ọchị!
Taa, amụma bara ụba, iji nkà mmụta banyere ọdịnihu akpa ego na-agakwa nke ọma. “Ka afọ 2000 na-abịaru nso,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph nke London na-ekwu, “ihe pụrụ iche, ma na-abụghị ihe a na-atụghị anya ya ma ọlị na-eme. Ọtụtụ puku mmadụ gburugburu ụwa na-ahụ ajọ ọhụụ na nke na-emenyekarị ụjọ banyere ọdịnihu.” Nye ọtụtụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ, oké mmasị a e nwere n’ọdịnihu bụ nanị ntụghachi anya nke mgbanwe ndị a tụburu anya ha bụ́ ndị na-emezughị.
KA ỤGBỌALA ịnyịnya na-adọkpụgharị na-adịwanye ọtụtụ na narị afọ nke 19, otu nwoke buru amụma na nsị ga-ejupụta n’obodo ndị dị na Europe. Otú ọ dị, amụma ya ghọrọ ụgha. N’ihi ya, n’ịdọrọ uche gaa n’ụzọ amụma si akụ afọ n’ala mgbe mgbe, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London sịrị: “Ọdịnihu bụ nnọọ ikpo nsị ịnyịnya.”
Ndị ọzọ na-achị ndị na-ahụ ihe ize ndụ n’ọdịnihu ọchị. Dị ka ihe atụ, otu prọfesọ nke achụmnta ego n’otu mahadum dị na United States mara ndị na-adọ aka ná ntị banyere mmetọ gburugburu ebe obibi aka ka ha tie ebe ma ọnọdụ ahụ ọ ga-aka njọ. Dị ka a kọrọ na magazin bụ́ New Scientist, ọ na-azọrọ na “ọdịdị nke ndụ anyị na-aka mma, ọ ga-anọkwa na-aka mma ruo ebighị ebi.”
N’etiti ọgba aghara nke ime nzọrọ na imegide ihe a na-azọrọ, ọtụtụ kwere na ihe nile ga-adịgide n’enwekebeghị mgbanwe. N’ịchị echiche ọ bụla nke ntinye aka Chineke n’ihe omume mmadụ ọchị, ha na-egosi àgwà yiri nke ndị ọchị na narị afọ mbụ nke O.A.
Ihe Nile Hà Ka Dị Otú Ha Dị?
Akwụkwọ ozi nke abụọ sitere n’ike mmụọ nsọ nke onye Kraịst bụ́ Pita onyeozi, bụ́ nke e dere n’ihe dị ka n’afọ 64 nke O.A., dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa na mgbe ikpeazụ, na-aga dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị.”—2 Pita 3:3.
Ndị ọchị na-achọ ime ka ihe ha na-achị ọchị yie ihe na-atọ ọchị. Onye ọ bụ àgwà ya iji ihe mere ihe ọchị pụrụ ịdị na-adaba n’ọnyà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị n’ihi na onye ọchị na-achọkarị ka ndị na-ege ya ntị nakwere echiche ya. Ikekwe ụfọdụ ndị ọchị ahụ Pita dọrọ aka ná ntị banyere ha dị otú a, “na-aga dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị.” N’ime ka ndị na-agụ akwụkwọ ya mụrụ anya, onyeozi ahụ ji ụdị nke imesi okwu ike mee ihe. Ọ dọrọ aka ná ntị banyere mbịarute nke ‘ndị ọchị na-eji ịchị ọchị ha.’
Ndị ọchị nke narị afọ mbụ ahụ gbaghara ịbụ ezie nke “nkwa nke [ọnụnọ, NW]” Kraist, na-asị: “Olee ebe nkwa nke [ọnụnọ, NW] Ya dị? n’ihi na site n’ụbọchị nna anyị ha dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide dị ka ha dịworo site ná mmalite nke okike.” (2 Pita 3:4) Otú ahụ ka ọ dị n’anya ha. Ma, laa azụ n’afọ 33 O.A., Jisọs ebuworị amụma mbibi maka obodo Jerusalem. “Ụbọchị ga-abịakwasị gị,” ka o kwuru, “mgbe ndị iro gị ga-egwu ékpè na ịga imegide gị, nọgidekwa gị gburugburu, jigidekwa gị n’akụkụ nile, tụdaakwa gị n’ala, na ụmụ gị bi n’ime gị; ha agaghị ahapụkwa n’ime gị otu nkume n’elu nkume ibe ya.” Lee ka ndị jiri ịdọ aka ná ntị ahụ mere ihe ọchị siri hie ụzọ! Na 70 O.A., usuu ndị agha Rom gbara Jerusalem gburugburu ma bibie obodo ahụ, na-egbu ọtụtụ ndị bi n’ime ya. Gịnị mere na ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’obodo ahụ adịghị njikere maka ọdachi a? N’ihi na ha amataghị na Chineke eletawo ha site n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs.—Luk 19:43, 44.
Pita onyeozi na-ezo aka ná ntinye aka nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile n’ọdịnihu. “Ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi,” ka Pita na-adọ aka ná ntị. (2 Pita 3:10) N’oge ahụ Chineke ga-ewepụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’elu ụwa nile ma chebe ndị a gụrụ ná ndị ezi omume. Dị ka magazin a kọwaworo mgbe mgbe, “ọnụnọ” Kraịst Jisọs malitere na 1914. Ma ime ihe ya dị ka Onye Mmezu Ikpe nke Chineke iwepụ ndị ajọ omume ka dị n’ihu. N’ihi ya, ịdọ aka ná ntị onyeozi ahụ ịkpachara anya maka ndị ọchị dabara adaba ugbu a n’ụzọ dị ngwa karị.
O nwere ike i cheworị ogologo oge maka ntinye aka Chineke n’ihe omume mmadụ. Gịnị ga-enyere gị aka ịnọgide jiri ndidi na-echere n’aghọghị onye ndị ọchị nwetara? Biko gụrụ gaa n’ihu.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
‘Ụbọchi ga-abịakwasị gị, mgbe ndị iro gị . . . ga-anọgidekwa gị gburugburu, jigidekwa gị n’akụkụ nile, . . . ha agaghị ahapụkwa n’ime gị otu nkume n’elu nkume ibe ya.’ Nke ahụ abụghị ịdọ aka ná ntị a ga-eji mee ihe ọchị. Usuu ndị agha Rom bibiri Jerusalem, na-egbu ọtụtụ ndị.