“Cheta Ụbọchị Ndị Gaworo Aga”—N’ihi Gịnị?
“CHETA ụbọchị ndị gaworo aga.” Ndụmọdụ a nke Pọl onyeozi nyere, nke e dere n’ihe dị ka 61 O.A., bụ nke e degaara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst nọ na Judia. (Ndị Hibru 10:32, The New English Bible) Gịnị kpaliri okwu a? N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa maka ndị ahụ na-efe Jehova na narị afọ mbụ ịghara ichefu oge gara aga? Ànyị pụrụ irite uru site n’ịṅa ntị n’ihe ncheta yiri nke ahụ taa?
Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị dere Bible adọwo aka ná ntị ugboro ugboro megide ileghara anya ma ọ bụ ịghara itinye uche n’oge gara aga. A ga-eburu oge na ihe ndị mere n’oge mbụ n’uche ma tụlee ha. Ọbụna Jehova sịrị: “Chetanụ ihe mbụ nile site na mgbe ebighị ebi gara aga: n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke, ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị; abụ m Chineke, ọ dịghịkwa otu efu dị ka Mụ onwe m.” (Aịsaịa 46:9) Ka anyị nyochaa ihe atọ dị ike mere a ga-eji aṅa ntị na ndụmọdụ a.
Mkpali na Agbamume
Nke mbụ, ọ pụrụ ịbụ isi iyi dị ukwuu nke mkpali na agbamume. Mgbe Pọl degaara ọgbakọ Hibru akwụkwọ ozi ahụ, ọ nọ na-edegara ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ bụ́ ndị a na-etinye okwukwe ha n’ule kwa ụbọchị n’ihi mmegide sitere n’aka ndị Juu. N’ịmata mkpa ha nwere iwulite ntachi obi, Pọl kwuru, sị: “Na-echetanụ ụbọchị mbụ ahụ, nke ọ bụ n’ime ha, mgbe e nyesịrị unu ìhè, ka unu tachiri obi n’oké ịba mba nke ahụhụ dị iche iche.” (Ndị Hibru 10:32) Ha icheta ihe omume gara aga nke iguzosi ike n’ihe n’agha ime mmụọ ga-eje ozi inye ha obi ike dị mkpa iji gbachaa ọsọ ahụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, Aịsaịa onye amụma dere, sị: “Chetanụ nke a, jisiekwanụ ike.” (Aịsaịa 46:8) Ọ bụ n’iburu mmetụta yiri nke ahụ a chọrọ n’obi ka Jisọs Kraịst ji gwa ọgbakọ dị n’Efesọs, sị: “Ya mere cheta ebe i siworo dapụ [ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ], gị chegharịakwa, rụọkwa ọrụ mbụ.”—Mkpughe 2:4, 5.
Agbamume bụ́ “cheta ụbọchị nile nke mgbe ebighị ebi gara aga, ghọta afọ nke ọtụtụ ọgbọ” bụ isiokwu na-abịaghachi n’okwu nke Mosis gwara Israel, ka ọ gbara mba ahụ ume igosipụta iguzosi ike n’ihe nye Jehova n’atụghị egwu. (Deuterọnọmi 32:7) Rịba okwu ya ama, nke e dekọrọ na Deuterọnọmi 7:18: “Atụla egwu ha [ndị Kenean]: ị ga-echeta nke ọma ihe nke Jehova, bụ́ Chineke gị, mere Fero, meekwa Ijipt nile.” Icheta ọrụ nzọpụta nke Jehova n’isi ndị ya ga-abụ ihe mkpali maka ha ịnọgide na-eji ikwesị ntụkwasị obi na-arapara n’iwu Chineke.—Deuterọnọmi 5:15; 15:15.
N’ụzọ dị mwute, ndị Israel dabara mgbe mgbe ná mmehie nke ichefu ihe. Gịnị ka ọ rụpụtara? “Ha wee chigharịa, wee nwaa Chineke, ọ bụkwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe. Ha echetaghị aka Ya, ụbọchị mgbe Ọ gbapụtara ha n’aka onye mkpagbu.” (Abụ Ọma 78:41, 42) N’ikpeazụ, nchefu ha chefuru iwu Jehova mere ka ha bụrụ ndị ọ jụrụ.—Matiu 21:42, 43.
Ọbụ abụ ahụ setịpụrụ ihe nlereanya mara mma, bụ́ onye dere, sị: “M ga-ehota omume nile nke Ja; n’ihi na m ga-echeta oké ọrụ Gị nile site na mgbe ochie. M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.” (Abụ Ọma 77:11, 12) Ụdị ncheta ahụ e ji ntụgharị uche cheta ozi gara aga nke iguzosi ike n’ihe na omume ịhụnanya nke Jehova ga-enye anyị mkpali, agbamume, na ekele dị mkpa. Ọzọ, ‘icheta ụbọchị mbụ ahụ’ pụrụ iwepụ ike ọgwụgwụ ma kpasuo anyị ime ihe nile anyị pụrụ ime na iji tachie obi n’ikwesị ntụkwasị obi.
Ịmụta Ihe Site n’Ihie Ụzọ Ndị Gara Aga
Nke abụọ, ịghara ichefu ihe pụrụ ịbụ ụzọ isi mụta ihe site ná njehie ndị gara aga na ihe ndị si na ha pụta. N’iburu nke a n’uche, Mosis dụrụ ndị Israel ọdụ, sị: “Cheta, echezọla, ihe nke i ji kpasuo Jehova, bụ́ Chineke gị, iwe n’ọzara: site n’ụbọchị mgbe i si n’ala Ijipt pụta, ruo mgbe unu bịaruru ebe a, ndị na-enupụ isi ka unu bụworo n’ebe Jehova nọ.” (Deuterọnọmi 9:7) Ihe ụdị nnupụisi ahụ rụpụtara n’akụkụ nke ndị Israel bụ, dị ka Mosis mere ka ọ pụta ìhè, na ‘Jehova, bụ́ Chineke ha, mere ka ha jee ije iri afọ anọ n’ọzara.’ N’ihi gịnị ka e ji gbaa ha ume icheta nke a? Ọ bụ iji weda ha ala ma mee ka ọ bụrụ mgbazi olu nke ụzọ nnupụisi ha ka ha wee ‘debekwa ihe Jehova, bụ́ Chineke ha, nyere n’iwu, ka ha wee jee ije n’ụzọ Ya nile, tụọkwa egwu Ya.’ (Deuterọnọmi 8:2-6) Ha na-aga ịmụta ihe n’echiche nke ịghara imeghachi ihe ọjọọ ha mere n’oge gara aga.
Otu onye na-ede ihe kwuru, sị: “Onye dị akọ na-erite uru site n’ahụmahụ onwe ya, onye maara ihe site n’ahụmahụ nke ndị ọzọ.” Ka Mosis gwara ndị Israel ka ha rite uru site n’ịtụle njehie mbụ nke onwe ha, Pọl onyeozi dụrụ ndị ọzọ ọdụ—ọgbakọ Kọrint narị afọ mbụ nakwa, n’ụzọ a gbatịpụrụ agbatịpụ, anyị—ịmụta ihe site n’otu ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme ahụ. O dere, sị: “Ma ihe ndị a na-emerịị ndị ahụ [ndị Israel] n’ụzọ ihe atụ; e wee dee ha n’akwụkwọ nsọ ka ha wee bụrụ ihe ịdụ anyị ọdụ, ndị ọgwụgwụ oge ndị a ruteworo.” (1 Ndị Kọrint 10:11, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Jisọs Kraịst bu n’uche ihe omume Bible ọzọ nke oge ochie na mkpa ọ dị ịmụta ihe na ya mgbe o kwuru, sị: “Chetanụ nwunye Lọt.” (Luk 17:32; Jenesis 19:1-26) Onye England na-ede abụ uri na onye ọkà ihe ọmụma bụ́ Samuel Taylor Coleridge dere, sị: “Ọ bụrụ na ndị mmadụ pụrụ ịmụta ihe n’akụkọ ihe mere eme, lee ihe mmụta ndị ọ pụrụ ịkụziri anyị!”
Obi Umeala na Ekele
Nke atọ, icheta ihe pụrụ ịkpasu n’ime anyị àgwà ndị na-atọ Chineke ụtọ bụ́ obi umeala na ekele. Ka anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ọtụtụ akụkụ nke paradaịs ime mmụọ anyị zuru ụwa nile, ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla na ọ dabeere n’ụfọdụ blọk e ji ewu ihe owuwu. Ndị a gụnyere iguzosi ike n’ihe, ịhụnanya, iji onwe onye achụ àjà, obi ike n’ihu ahụhụ, ntachi obi, ogologo ntachi obi na okwukwe—àgwà ndị ụmụnna anyị nwoke na nwanyị bụ́ ndị Kraịst gosiworo bụ́ ndị meghere ọrụ ahụ n’ala dị iche iche ọtụtụ iri afọ gara aga. N’imechi akụkọ ya n’akụkọ ihe mere eme nke oge a nke ndị Chineke na Mexico, akwụkwọ 1995 Yearbook of Jehovah’s Witnesses kwuru, sị: “Nye ndị ka malitere isonyere Ndịàmà Jehova na nso nso a, ule nke ndị so kere òkè n’imeghe ọrụ ahụ na Mexico chere ihu pụrụ ịbịa dị ka ihe ijuanya. Paradaịs ime mmụọ amarawo ha ahụ bụ́ ebe e nwere ụba nke nri ime mmụọ, n’ebe e nwere ọtụtụ narị puku nke ndị enyi na-atụ egwu Chineke, nakwa n’ebe a na-eje ozi Chineke n’ụzọ a haziri nke ọma.”
Ndị ahụ mepere ụzọ n’oge mbụ rụrụ ọrụ ọtụtụ mgbe nanị ha ma ọ bụ n’ìgwè nta ndị e kewapụrụ ekewapụ. Ha chere owu ọmụma, ụkọ ihe e ji ebi ndụ, na ule ndị ọzọ siri ike nke iguzosi ike n’ezi ihe ihu ka ha nọgidesiri ike n’ịkpọsa ozi Alaeze ahụ. Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime ndị ohu oge mbụ a anwụwo, lee ka o si na-enye obi ụtọ ịmara na Jehova na-echeta ozi ikwesị ntụkwasị obi ha! Pọl onyeozi kwadoro nke a mgbe o dere, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị.” (Ndị Hibru 6:10) Ọ bụrụ na Jehova ejiri obi ekele na-echeta, ọ̀ bụ na anyị agaghị emekwa otú ahụ na mmụọ nke ekele?
Ndị natara eziokwu ahụ ọhụrụ pụrụ inweta nghọta akụkọ ihe mere eme a site ná mbipụta bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom.a Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị nwere ihe ùgwù iso n’ezinụlọ ma ọ bụ ọgbakọ ndị Kraịst nke ndị òtù ya gụnyere ụmụnna nwoke na nwanyị meworo agadi karị ndị nọworo na-eje ozi ruo ogologo oge, a na-agba anyị ume na mmụọ nke Deuterọnọmi 32:7 ka anyị “cheta ụbọchị nile nke mgbe ebighị ebi gara aga, ghọta afọ nke ọtụtụ ọgbọ: jụọ nna gị, ọ ga-egosikwa gị; jụọ ndị okenye gị, ha ga-agwakwa gị.”
Ee, icheta ihe omume mbụ nke nsọpụrụ Chineke pụrụ ịkpasu anyị ịnọgide na-eji ọṅụ na-atachi obi n’ozi ndị Kraịst anyị. Ọzọkwa, akụkọ ihe mere eme nwere ihe ndị dị anyị mkpa ịmụta. Ịtụgharịkwa uche na paradaịs ime mmụọ anyị nke Chineke gọziworo na-akpasu àgwà ndị dị mma nke obi umeala na ekele. N’ezie, “Cheta ụbọchị ndị gaworo aga.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.