Jehova Abụrụwo Ebe Mgbaba M
DỊ KA PENELOPE MAKRIS SI KỌỌ
Nne m rịọsiri m ike, sị: “Hapụ di gị, ụmụnne gị ndị nwoke ga-achọtara gị onye ka mma.” Gịnị mere nne m na-ahụ n’anya ga-eji chọọ ka m tisaa alụmdi na nwunye m? Olee ihe kpasuworo ya iwe otú a?
AMỤRỤ m na 1897 n’obere ime obodo bụ́ Ambelos, n’àgwàetiti Gris bụ́ Samọs. Ezinụlọ anyị bụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe so na Chọọchị Grik Orthodox. Nna m nwụrụ ntakịrị oge tupu a mụọ m, n’ihi ya mama m, ụmụnne m ndị nwoke atọ, na mụ aghaghị ịrụsi ọrụ ike nanị iji dịrị ndụ n’ime oké ịda ogbenye nke oge ndị ahụ.
Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ na 1914, oge na-adịghịkwa anya ka e mesịrị e nyere ụmụnne m ndị nwoke abụọ tọrọ m iwu idebanye aha n’òtù ndị agha. Ma iji zere ime otú ahụ, ha kwagara America, na-ahapụ mụ na nwanne m nwoke nke ọzọ n’ụlọ anyị na mama anyị. Afọ ole na ole n’ihu, na 1920, alụrụ m Dimitris, bụ́ nwa okorobịa na-akụzi nkụzi n’obodo nta anyị.
Nleta Dị Mkpa
N’oge na-adịghị anya ka m lụsịrị di, nwanne mama m nke nwoke si America bịa ileta anyị. Ọ dabara na o ji otu n’ime mpịakọta nke Studies in the Scriptures, nke Charles Taze Russell dere. Ọ bụ akwụkwọ nke Ndị Mmụta Bible, ndị a maara ugbu a dị ka Ndịàmà Jehova.
Mgbe Dimitris mepere akwụkwọ ahụ, ọ hụrụ otu isiokwu ọ nọworo na-eche banyere ya kemgbe ọ bụ obere nwa, “Gịnị na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ?” N’ụlọ akwụkwọ dị elu ọ jụwo onye ọkà mmụta okpukpe bụ́ onye Grik Orthodox ajụjụ banyere isiokwu a ma o nwetaghị azịza na-eju afọ. Nkọwa doro anya nke ezi uche dị na ya e nyere n’ime akwụkwọ ahụ tọrọ Dimitris ụtọ nke ukwuu nke na ọ gara ozugbo n’ụlọ kọfị dị n’obodo ahụ, bụ́ ebe ndị ikom nọ na Gris na-ezukọtakarị. N’ebe ahụ ọ kọrọ ihe sitere na Bible ndị ọ mụtaworo.
Nguzo Anyị Maka Eziokwu Bible
N’ihe dị ka n’oge a—ná mmalite afọ ndị 1920—Gris nọ n’etiti agha ọzọ. E debara aha Dimitris n’òtù ndị agha, zigakwa ya na Turkey, n’Asia Minor. E merụrụ ya ahụ ma zilata ya ụlọ. Mgbe ọ gbakesịrị, esooro m ya gaa Smụana, Asia Minor (nke bụ́ Izmir, Turkey ugbu a). Mgbe agha ahụ kwụsịrị na mberede na 1922, anyị aghaghị ịgbapụ. N’ezie, anyị jisiri ike jiri ụgbọ epeepe mebiri nke ukwuu gbaga Samọs. Mgbe anyị lọtara n’ụlọ, anyị gburu ikpere n’ala kelee Chineke—Chineke anyị ka maara nanị ihe dị nta banyere ya.
N’oge na-adịghị anya e kenyere Dimitris ọrụ ịkụzi nkụzi n’otu ụlọ akwụkwọ dị na Vathy, isi obodo nke àgwàetiti ahụ. Ọ nọgidere na-agụ akwụkwọ Ndị Mmụta Bible, n’otu abalị mmiri na-ezokwa, abụọ n’ime ha si àgwàetiti bụ́ Kaịos bịara leta anyị. Ha esiwo America lọta ije ozi dị ka ndị colporteur, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile. Ha hiri na nke anyị n’abalị ahụ, ha gwakwara anyị okwu banyere ọtụtụ ihe metụtara nzube nile nke Chineke.
Ka e mesịrị Dimitris gwara m, sị: “Penelope, achọpụtara m na nke a bụ eziokwu ahụ, aghaghịkwa m iso ya. Nke a pụtara na mụ aghaghị ịkwụsị ikwe ukwe na Chọọchị Grik Orthodox, na mụ apụghịkwa m iso ụmụ akwụkwọ na-eje chọọchị.” Ọ bụ ezie na ihe ọmụma anyị nwere banyere Jehova dị ntakịrị, ọchịchọ anyị nwere ijere ya ozi siri ike. Ya mere m zara, sị: “Agaghị m abụrụ gị ihe mgbochi. Gaa nnọọ n’ihu.”
O ji obi abụọ gaa n’ihu: “Ee, ma ọ bụrụ na a mata ihe anyị chọrọ ime, a ga-achụ m n’ọrụ.”
“Echegbula onwe gị,” ka m kwuru, “mmadụ nile hà na-akpatacha ihe ha ji ebi ndụ site n’ọrụ nkụzi? Anyị akatabeghị ahụ, anyị gbasikwara ike, sitekwa n’enyemaka Chineke anyị pụrụ ịchọta ọrụ ọzọ.”
Ihe dị ka n’oge a anyị nụrụ na Onye Mmụta Bible ọzọ—onye bụkwa colporteur—abịawo Samọs. Mgbe anyị nụrụ na ndị uwe ojii ajụwo inye ya ikike ikwu okwu ihu ọha dabeere na Bible, anyị gara chọgharịa ya. Anyị hụrụ ya n’otu ụlọ ahịa ka o so ndị ọkà mmụta okpukpe abụọ nke Grik Orthodox na-akparịta ụka. N’ịbụ ndị e menyere ihere n’ihi enweghị ike iji Bible kwadoo nkweta ha, ndị ọkà mmụta okpukpe ahụ pụrụ n’oge na-adịghị anya. Di m, n’inwe mmasị n’ihe ọmụma nke onye colporteur ahụ nwere, jụrụ, sị: “Olee otú i si eji Bible eme ihe n’ụzọ dị mfe otú a?”
“Anyị na-amụ Bible n’usoro n’usoro,” ka ọ zara. N’imepe akpa ya, o wepụtara akwụkwọ ahụ e ji amụ ihe bụ́ The Harp of God ma gosi anyị otú e si eji akwụkwọ a eme ihe n’ụdị ọmụmụ ihe ahu. Ọ gụsiri anyị agụụ ike ịmụta ihe nke na mụ na di m, na onye colporteur ahụ, na ụmụ nwoke abụọ ọzọ sooro onye nwe ụlọ ahịa ahụ ozugbo gaa n’ụlọ ya. Onye colporteur ahụ nyere onye ọ bụla n’ime anyị otu The Harp of God, anyị malitekwara ịmụ ihe ozugbo. Anyị gara n’ihu n’ọmụmụ ihe anyị bamie n’ime abalị, mgbe ahụkwa ka chi ọbụbọ na-akpụdewe, anyị malitere ịmụ abụ Ndị Mmụta Bible na-abụ.
Malite n’oge ahụ gaa n’ihu, amalitere m ịmụ Bible ọtụtụ hour n’otu ụbọchị. Ndị Mmụta Bible si mba ọzọ nọgidere na-enye anyị ihe ndị e ji amụ Bible. Na January 1926, emere m nrara m nye Chineke n’ekpere, na-ekwe nkwa iji onwe m nile mee uche ya. Ka e mesịrị n’oge okpomọkụ ahụ mụ na di m gosipụtara nraranye anyị site na baptism ime mmiri. Anyị nwere ọchịchọ siri ike ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị anyị na-amụta, ya mere anyị ji traktị bụ́ Message of Hope malite ozi ụlọ n’ụlọ.
Idi Mmegide Siri Ike
Otu ụbọchị otu nwaada kpọrọ m òkù ịbịa ememe okpukpe n’otu ntakịrị chapel nke Grik Orthodox. “Akwụsịwo m ife Chineke ofufe otú ahụ,” ka m kọwara. “Ugbu a ana m efe ya n’ime mmụọ na eziokwu, dị ka Bible na-akụzi.” (Jọn 4:23, 24) Ọ tụrụ ya n’anya, ọ kọsakwara ihe merenụ, na-etinyekwa di m ná nsogbu.
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile malitere imegide anyị. Ọ dịghị ebe anyị pụrụ ịchọta udo—n’ụlọ anyị ma ọ bụ ná nzukọ nke anyị na mmadụ ole na ole nwere mmasị n’àgwàetiti ahụ na-enwe. Ná mkpali nke ndị ụkọchukwu Orthodox, ìgwè mmadụ zukọtara n’ihu ebe anyị na-ezukọ, na-atụ anyị nkume ma na-ekwu okwu mkparị n’olu dara ụda.
Mgbe anyị kesara traktị bụ́ Message of Hope, ụmụaka gbara anyị gburugburu na-eti “Ndị Narị Afọ Iri” na okwu nleda anya ndị ọzọ. Ndị ha na di m na-arụkọ ọrụ malitekwara inye ya nsogbu. Ná ngwụsị 1926 a kpụpụtara ya ikpe ya ikpe, bo ya ebubo ịbụ onye na-erughị eru ịbụ onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ ọha na eze, tụọkwa ya mkpọrọ ụbọchị 15.
Mgbe mama m nụrụ nke a, o nyere m ndụmọdụ ịhapụ di m. “Gee ntị, ezigbo nne m,” ka m zara, “ị maara dịkwa ka mụ onwe m maara otú m si hụ gị n’anya ma na-akwanyere gị ùgwù. Ma apụghị m nnọọ ikwe ka ị nọchiere anyị ụzọ ife ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ofufe.” Ọ lawara n’ime obodo ya n’oké ndakpọ olileanya.
Na 1927 e nwere mgbakọ nke Ndị Mmụta Bible n’Atens, Jehova meghekwaara anyị ụzọ isi jee. Anyị nwere obi ụtọ ma bụrụ ndị e wusiri ike n’ụzọ ime mmụọ site n’iso ọtụtụ ndị kwere ekwe ibe anyị zukọọ. N’ịlaghachi Samọs, anyị kesara traktị 5,000 a kpọrọ A Testimony to the Rulers of the World n’ime obodo nile dị n’àgwàetiti anyị.
N’ihe dị ka n’oge ahụ a chụrụ Dimitris n’ọrụ nkụzi ya, n’ihi ajọ mbunobi e nwekwara megide anyị, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-ekweghị omume ịchọta ọrụ. Ma ebe m pụrụ ịkwa ákwà, Dimitris bụkwa ọkà n’ite ágbá, anyị nwere ike inweta ihe zuru iji gboo mkpa anyị. Na 1928, a tụrụ di m, tinyere ụmụnna nwoke anọ bụ́ ndị Kraịst nọ na Samọs, mkpọrọ ọnwa abụọ n’ihi ikwusa ozi ọma ahụ. Ebe ọ bụ nanị m bụ Onye Mmụta Bible nweere onwe ya, enwere m ike inye ha ihe oriri n’ụlọ mkpọrọ.
Ịlụso Ọrịa Ndị Siri Ike Ọgụ
N’otu oge, adara m ọrịa tubercular spondylitis, ọrịa a na-amaghị mgbe ahụ nke na-adịghị ala ọsọ ọsọ. Enwekwaghị m agụụ iri ihe, oké ahụ ọkụ nọgidekwara na-ama m. Ọgwụgwọ gụnyere ịnya m plasta siri ike site n’olu ruo n’apata ụkwụ. Iji nweta ego, di m rere otu ibe ala ka m wee nwee ike ịnọgide na-anata ọgwụgwọ. N’ahụhụ, ekpegaara m Chineke ekpere kwa ụbọchị maka ume.
Mgbe ha na-eleta m, ndị ikwu m nọgidere na-akpasu mmegide. Mama m kwuru na anyị na-enweta nsogbu a nile n’ihi na anyị agbanwewo okpukpe anyị. N’enweghị ike imegharị ahụ, eji m anya mmiri dee ohiri isi m ka m na-arịọ Nna anyị nke eluigwe ka o nye m ndidi na obi ike iji tachie obi.
N’elu table dị n’akụkụ àkwà m, atụkwasịrị m Bible m na akwụkwọ nta na traktị ụfọdụ maka ndị nleta. Ọ bụ ihe ngọzi na a na-enwe nzukọ nke ntakịrị ọgbakọ anyị n’ụlọ anyị; apụrụ m inweta agbamume ime mmụọ mgbe nile. Anyị aghaghị ire ibe ala ọzọ iji kwụọ ụgwọ ọgwụgwọ m natara site n’aka otu dọkịta n’Atens.
Ntakịrị oge ka e mesịrị, onye nlekọta na-ejegharị ejegharị letara anyị. O wutere ya ịhụ m n’ọnọdụ a nakwa Dimitris n’enweghị ọrụ. N’obiọma o nyeere anyị aka mee ndokwa ije biri na Mytilene n’àgwàetiti Lesbos. Anyị kwagara ebe ahụ na 1934, Dimitris nwekwara ike inweta ọrụ. N’ebe ahụ anyị hụkwara ụmụnna nwoke na nwanyị na-ahụ n’anya ndị lekọtara m n’ọrịa m. Nwayọọ nwayọọ, mgbe afọ ise nke ịnata ọgwụgwọ gasịrị, agbakewo m kpam kpam.
Otú ọ dị, na 1946, ntakịrị oge ka Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, adakwara m oké ọrịa ọzọ, nke ugbu a bụ ọrịa tubercular peritonitis. Anọrọ m ọnwa ise n’àkwà na-enwe oké ahụ ọkụ na oké ahụ mgbu. Ma, dị ka ọ dị na mbụ, ọ dịghị mgbe m kwụsịrị ịgwa ndị na-abịa eleta m okwu banyere Jehova. Ka oge na-aga, enwetaghachiri m ahụ ike m.
Ịsụ Ụzọ n’Agbanyeghị Mmegide
Mmegide siri ike bụ ihe Ndịàmà Jehova nọ na Gris ketara n’afọ ndị ahụ mgbe agha gasịrị. E jidere anyị ọtụtụ ugboro ka anyị na-eje ozi ụlọ n’ụlọ. Di m nọrọ ngụkọta nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ n’ụlọ mkpọrọ. Mgbe anyị malitere ozi, anyị na-emekarị atụmatụ ịbụ ndị e jibọrọ chi n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Ma ọ dịghị mgbe Jehova gbahapụrụ anyị. O nyere anyị mgbe nile obi ike na ume dị mkpa iji tachie obi.
N’afọ ndị 1940, agụrụ m n’ime Informant (nke bụ Ozi Alaeze Anyị ugbu a) banyere ndokwa ịsụ ụzọ oge ezumike. Ekpebiri m ịgbalị ikere òkè n’akụkụ ije ozi a nke chọrọ itinye hour 75 n’ọnwa n’ozi ahụ. N’ihi ya, nletaghachi na ọmụmụ Bible m mụbara—n’otu oge m nọ na-eduzi ọmụmụ ihe 17 kwa izu. Amalitekwara m ụzọ magazin n’ógbè azụmahịa nke Mytilene, bụ́ ebe m na-ewegakarị ihe dị ka mkpụrụ Ụlọ Nche na Teta! 300 n’ụlọ ahịa, ọfịs, na ụlọ akụ̀.
Mgbe otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị letara ọgbakọ anyị na 1964, ọ sịrị: “Nwanna Nwanyị Penelope, ahụrụ m site na Kaadị Ihe Ndekọ Onye Nkwusa gị ihe ọma ndị ị na-enweta n’ozi gị. Gịnị ma i dejupụta akwụkwọ iji sụọ ụzọ oge nile?” M ga-enwe ekele mgbe nile maka agbamume ya; ozi oge nile abụrụwo ọṅụ m ruo ihe karịrị iri afọ atọ.
Ahụmahụ Na-enyeghachị Ụgwọ Ọrụ
Na Mytilene e nwere ógbè ndị mmadụ bijupụtara nke a na-akpọ Langada, bụ́ ebe ndị Gris gbara ọsọ ndụ bi. Anyị zeere ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ebe ahụ n’ihi mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ anyị zuteworo. Otú ọ dị, mgbe di m nọ n’ụlọ mkpọrọ, aghaghị m isi n’ógbè a gafere iji leta ya. Otu ụbọchị mmiri na-ezo, otu nwanyị kpọbatara m n’ụlọ ya ịjụ m ihe mere di m ji nọrọ n’ụlọ mkpọrọ. Akọwara m na ọ bụ maka ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke nakwa na ọ na-ata ahụhụ dị nnọọ ka Kraịst taworo.
Ka oge na-aga, nwanyị ọzọ mere ndokwa ka m kwụsịtụ n’ụlọ ya. Mgbe m rutere achọpụtara m na ọ kpọwo ngụkọta nke ndị inyom 12 òkù. Atụrụ m anya na mmegide pụrụ ịdapụta, ya mere ekpegaara m Chineke ekpere inye m amamihe na obi ike iji chee ihe ọ bụla merenụ ihu. Ndị inyom ahụ nwere ọtụtụ ajụjụ, ụfọdụ welitekwara okwu mmegide, ma enwere m ike inye azịza ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe m biliri ịpụ, nwanyị nwe ụlọ gwara m ka m bịa ọzọ echi ya. N’obi ụtọ, anakweere m ọkpụkpọ òkù ahụ. Mgbe mụ na onye òtù m bịarutere n’echi ya, anyị hụrụ ndị inyom ahụ ka ha nọ anọ na-echere.
Mgbe nke ahụ gasịrị, mkparịta ụka anyị sitere n’Akwụkwọ Nsọ gara n’ihu n’ụzọ chiri anya, a malitekwara ọtụtụ ọmụmụ Bible. Ọtụtụ n’ime ndị inyom ahụ nwere ọganihu n’ezi ihe ọmụma, otú a ka ọ dịkwa ezinụlọ ha. Ìgwè a mesịrị ghọọ ntọala nke ọgbakọ ọhụrụ nke Ndịàmà Jehova na Mytilene.
Jehova Emeworo M Ihe Ọma
N’afọ ndị gafeworonụ, Jehova enyeghachiwo ụgwọ ọrụ ná mgbalị di m na nke m ijere Ya ozi. Ndịàmà ole na ole nọ na Samọs n’afọ ndị 1920 etowo ruo ọgbakọ abụọ na otu ìgwè nke nwere ihe dị ka ndị nkwusa 130. N’àgwàetiti Lesbos kwa, e nwere ọgbakọ anọ na ìgwè ise ndị gụnyere ihe dị ka ndị mkpọsa Alaeze 430. Di m kpọsasiri Alaeze Chineke ike ruo ọnwụ ya na 1977. Lee ihe ùgwù ọ bụ ịhụ ndị anyị nyeere aka ka ha ka nọgidere na-anụ ọkụ n’obi n’ozi ahụ! Leenụ, ha na ụmụ, ụmụ ụmụ, na ụmụ ụmụ ụmụ ha, mejupụtara oké ìgwè mmadụ na-efe Jehova ofufe n’ịdị n’otu!
Ụzọ m nke ije ozi ndị Kraịst, nke gbatịpụrụ ruo ihe karịrị afọ 70 ugbu a, abụghị nke dị mfe ma ọlị. Ma Jehova abụrụwo ebe e wusiri ike na-enweghị atụ. N’ihi ime agadi na ahụ ike na-adalata adalata, anọ m n’àkwà, a kpakwaara nkwusa m pụrụ ime ókè. Ma, dị ka onye ọbụ abụ ahụ mere, apụrụ m ịgwa Jehova, sị: “Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m e wusiri ike; Ị bụ Chineke m, Onye m na-atụkwasị obi.”—Abụ Ọma 91:2.
(Nwanna Nwanyị Makris nwụrụ ka a nọ na-akwadebe isiokwu a. O nwere olileanya eluigwe.)
[Foto dị na peeji nke 26]
Ya na di ya na 1955
[Foto dị na peeji nke 26]
Nwanna Nwanyị Makris gaara agba afọ 100 na January 1997