Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 5/1 p. 25-29
  • Ije Ozi n’Okpuru Aka Ịhụnanya Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ije Ozi n’Okpuru Aka Ịhụnanya Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otu Nrịanrịa Aghọọ Ngọzi
  • Ijisi Ike Lanarị Ọnwụ
  • Ọganihu Ime Mmụọ
  • Njide na Ịtụ Mkpọrọ
  • Ụdị Ule Dị Iche
  • Ịkpachara Anya
  • Inweta Onye Ibe Na-ekwesị Ntụkwasị Obi
  • Ozi Betel
  • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • “Kama Ọlaedo, Achọtara M Diamọnd”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Inye Jehova Ihe Ruuru Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ijere Chineke ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 5/1 p. 25-29

Ije Ozi n’Okpuru Aka Ịhụnanya Jehova

DỊ KA LAMBROS ZOUMBOS SI KỌỌ

Echere m nhọrọ dị mkpa ihu: nara ihe nwanne nna m nke nwoke bụ́ aka ji akụ̀ na-eche m n’ihu iji ghọọ maneja nke ọtụtụ ụlọ na ala ya—si otú ahụ gwọta nsogbu ego nke ezinụlọ m—ka ọ bụ ghọọ onye ozi oge nile nke Jehova Chineke. Ka m kọwaa ihe ndị kpụziri mkpebi nke m mere n’ikpeazụ.

AMỤRỤ m n’obodo Volos, Gris, na 1919. Nna m rere ihe ụmụ nwoke na-eyi eyi, anyị nwekwara ọganihu ihe onwunwe. Ma n’ihi ndakpọ akụ̀ na ụba nke ngwụsị afọ ndị 1920, a manyere nna m ịbanye n’iji ụgwọ, ụlọ ahịa ya funahụkwara ya. O wutere m mgbe ọ bụla m hụrụ enweghị olileanya n’ihu nna m.

Ruo nwa oge ezinụlọ m biri ndụ ogbenye ọnụ ntụ. Kwa ụbọchị m na-ewere otu hour n’oge m ji anọ n’ụlọ akwụkwọ ga kwụrụ n’ahịrị maka ihe oriri a na-eke eke. Ma, n’agbanyeghị ogbenye anyị, anyị biri ndụ ezinụlọ dị jụụ. Ọ bụ ọchịchọ m ịghọ onye dọkịta, ma mgbe m nọ n’etiti afọ ndị iri na ụma aghaghị m ịhapụ ụlọ akwụkwọ ma malite na-arụ ọrụ iji nyere ezinụlọ m aka ịnọgide na-aga n’ihu.

Mgbe ahụ, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ndị Germany na ndị Itali weghaara Gris, e nwekwara ụnwụ dị oké njọ. M na-ahụkarị ndị enyi na ndị m ma ama ka ha na-anwụ n’okporo ámá n’ihi ịkwụ agụụ—ihe jọgburu onwe ya nke m na-agaghị echezọ mgbe ọ bụla! N’otu mgbe, ezinụlọ anyị nọrọ n’erighị bredị, bụ́ nri bụ isi na Gris, ruo 40 ụbọchị. Iji nọgide ndụ, mụ na deede m gara n’obodo nta ndị dị nso ma nata ndị enyi na ndị ikwu poteto.

Otu Nrịanrịa Aghọọ Ngọzi

Ná mmalite 1944, otu ụdị nke ọrịa pleurisy rịasiri m ike. N’ọnwa atọ m nọrọ n’ụlọ ọgwụ, nwa nwanne papa m wetaara m akwụkwọ nta abụọ ma kwuo, sị: “Gụọ ha; eji m n’aka na ha ga-amasị gị.” Akwụkwọ nta ndị ahụ, bụ́ Who Is God? na Protection, bụcha nke Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara. Mgbe m gụchara ha, m sooro ndị ọrịa ibe m kerịta ihe dị n’ime ha.

Mgbe m hapụrụ ụlọ ọgwụ ahụ, m malitere isoro Ọgbakọ Volos nke Ndịàmà Jehova na-amụ ihe. Otú ọ dị, ruo otu ọnwa, dị ka onye ọrịa na-esi n’ụlọ aga ụlọ ọgwụ, apụghị m ịpụ n’èzí, sitekwa na hour isii ruo asatọ kwa ụbọchị, m na-agụ mbipụta ndị ka mee ochie nke Ụlọ Nche, nakwa mbipụta ndị ọzọ nke Watch Tower Society. N’ihi ya, uto ime mmụọ m gara nnọọ ngwa ngwa.

Ijisi Ike Lanarị Ọnwụ

Otu ụbọchị n’etiti afọ 1944, m na-anọdụ ala n’oche ogologo dị n’ogige ntụrụndụ na Volos. Na mberede otu ìgwè ndị agha enyemaka nke kwadoro mweghara nke ndị agha Germany gbara ebe ahụ gburugburu ma jide mmadụ nile nọ ebe ahụ. E duuru anyị nile dị ihe dị ka iri mmadụ abụọ na anọ site n’okporo ámá gaa isi ụlọ ọrụ ndị Gestapo, nke dị n’ụlọ a na-akwaju ụtaba.

Mgbe minit ole na ole gasịrị, m nụrụ ka otu onye na-akpọ aha m na aha onye ahụ mụ na ya nọ na-ekwurịta okwu n’ime ogige ntụrụndụ ahụ. Otu onye Gris bụ́ onye isi ndị agha kpọrọ anyị ma gwa anyị na mgbe otu onye n’ime ndị ikwu m hụrụ ka ndị soja na-akpọpụ anyị, ọ gwara ya na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Onye ọfịsa ahụ bụ́ onye Gris kwuziri na anyị nweere onwe anyị ịlawa, o nyekwara anyị kaadị ọkwá ya iji jiri ya mee ihe ma ọ bụrụ na e jide anyị ọzọ.

N’echi ya anyị nụrụ na ndị Germany egbuola ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ahụ e jidere iji megwara ogbugbu ndị agha nnupụisi Gris gburu ndị agha Germany abụọ. E wezụga ikekwe ịbụ onye a napụtara n’ọnwụ, m mụtara n’oge ahụ uru nke nnọpụiche ndị Kraịst.

N’oge mgbụsị akwụkwọ nke 1944, m gosipụtara nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri. N’oge okpomọkụ na-esonụ, Ndịàmà mere ndokwa maka mụ isoro Ọgbakọ Sklithro dị n’ugwu na-amụ ihe, bụ́ ebe m pụrụ inwetaghachi ahụ ike m n’ụzọ zuru ezu. Agha obodo nke sochiri ọgwụgwụ nke mweghara ndị Germany kpụ ọkụ n’ọnụ mgbe ahụ na Gris. Ọ dabara na obodo nta ebe m na-anọ bụ ebe ndị agha okpuru nile jiri mere isi ọnọdụ. Onye ụkọchukwu ógbè ahụ na nwoke ọzọ kwara obi n’azụ boro m ebubo ịbụ onye nledo nke ndị agha gọọmenti ma mee ka ụlọikpe ndị agha nke ndị agha okpuru ahụ ji aka ha guzobe gbaa m ajụjụ ọnụ.

Onye nọ mgbe ụlọikpe adịgboroja ahụ na-ekpe ikpe bụ onye ndú nke ndị agha okpuru nke ógbè ahụ. Mgbe m kọwasịrị ihe mere m ji nọrọ n’obodo nta ahụ ma gosi na, dị ka onye Kraịst, m nọpụrụ iche kpam kpam n’agha ime obodo ahụ, onye ndú ahụ gwara ndị ọzọ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla emetụ nwoke a aka, ya jiri aka ghọrọ m!”

Ka e mesịrị m lọghachiri n’ebe a mụrụ m bụ́ Volos ọbụna dịkwuo ike n’okwukwe m karịa n’ahụ ike elu ahụ m.

Ọganihu Ime Mmụọ

Ngwa ngwa mgbe nke a gasịrị a họpụtara m ịbụ ohu na-elekọta ihe ndekọ ego n’ọgbakọ n’ógbè ahụ. N’agbanyeghị ihe isi ike nke agha obodo ahụ wetara—tinyere ọtụtụ njide n’ihi ebubo ime ntọghata nke ndị ụkọchukwu kpaliri—ikere òkè n’ozi ndị Kraịst wetaara mụ na ndị ọgbakọ anyị oké ọṅụ.

Mgbe ahụ, ná mmalite 1947, onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova bịara leta anyị. Nke a bụ nke mbụ e nwere ụdị nleta ahụ mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị. N’oge ahụ e kewara ọgbakọ anyị dị na Volos na-eme nke ọma iji nweta abụọ, a họpụtakwara m ịbụ onye isi oche ndị nlekọta nke otu n’ime ọgbakọ ndị ahụ. Òtù ndị agha enyemaka na ndị hụrụ mba n’anya na-emenye ndị mmadụ egwu mgbe ahụ. Ndị ụkọchukwu jiri ọnọdụ ahụ mere ihe dị ha mma. Ha mere ka ndị ọchịchị bịakwasị Ndịàmà Jehova site n’ịgbasa akụkọ ụgha bụ na anyị bụ ndị Kọmụnist ma ọ bụ ndị na-akwado òtù na-achọ mgbanwe.

Njide na Ịtụ Mkpọrọ

Na 1947, e jidere m ihe dị ka ugboro iri ma kpee m ikpe n’ụlọikpe ugboro atọ. N’oge nke ọ bụla a hapụrụ m. N’oge opupu ihe ubi nke 1948, a tụrụ m mkpọrọ ọnwa anọ maka ime ntọghata. Agara m mkpọrọ ahụ n’ụlọ mkpọrọ dị na Volos. Ka ọ dị mgbe ahụ ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa Alaeze nọ n’ọgbakọ anyị mụbara okpukpu abụọ, ọṅụ na obi ụtọ jupụtakwara n’obi ụmụnna.

N’October 1948, ka m so mmadụ isii ndị ọzọ na-edu ndú n’ọgbakọ anyị na-ezukọ, ndị uwe ojii ise wabatara n’ime ụlọ ahụ ma jide anyị ka ha tụdoro anyị égbè. Ha kpọgara anyị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii n’akọwaghị ihe mere ha ji jide anyị, e tikwara anyị ihe ebe ahụ. Otu onye uwe ojii bụbu onye na-akụ ọkpọ kụrụ m ọkpọ n’ihu. Ka e mesịrị a tụkpuru anyị n’ụlọ nga.

Mgbe e mesịrị, ọfịsa na-elekọta ebe ahụ kpọbatara m n’ọfịs ya. Mgbe m meghere ụzọ, ọ tụrụ m karama ink, nke na-atụtaghị m ma gaa daa ná mgbidi kụwaa. O mere nke a iji majaa m. Mgbe ahụ, o nyere m otu mpempe akwụkwọ na mkpịsị akwụkwọ ma nye m iwu, sị: “Detuo aha Ndịàmà Jehova nile nọ na Volos, ma wetara m ihe ndepụta ahụ n’ụtụtụ. Ma ị meghị ya, ị maara ihe na-echere gị!”

Azaghị m ihe ọ bụla, ma mgbe m lọghachiri n’ụlọ nga ahụ, mụ na ụmụnna ndị ọzọ kpegaara Jehova ekpere. M dere nanị aha m n’akwụkwọ ahụ ma chere ka ọ kpọọ m. Ma anụghị mkpọtụ onye ọfịsa ahụ ọzọ. N’oge abalị, ndị agha na-alụso ha agha bịara, o duruwokwa ndị agha ya gaa ịlụso ha agha. N’ime ntakịrị ọgụ sochirinụ, e merụrụ ya ahụ nke ukwuu, a ghaghịkwa ibepụ ya otu ụkwụ. N’ikpeazụ, e kpere anyị ikpe, e bokwara anyị ebubo inwe nzukọ iwu na-akwadoghị. A tụrụ anyị mmadụ asaa mkpọrọ afọ ise.

Ebe m jụrụ ịga Mas Sunday n’ụlọ mkpọrọ, a kpọgara m ebe a kpọchiri nanị m. N’ụbọchị nke atọ, m rịọrọ ka m gwatụ onye isi ụlọ mkpọrọ ahụ okwu. “Iwe ewekwala gị,” ka m gwara ya, “o yiri ka ọ bụ ihe nzuzu inye onye dị njikere ịnọ afọ ise n’ụlọ mkpọrọ maka okwukwe ya ntaramahụhụ.” O chesiri echiche ike banyere nke ahụ, n’ikpeazụ kwa o kwuru, sị: “Site echi gawa n’ihu, ị ga-eso m na-arụ ọrụ n’ebe a n’ọfịs m.”

N’ikpeazụ, m nwetara ọrụ dị ka onye na-enyere dọkịta aka n’ụlọ mkpọrọ. N’ihi ya, amụtara m ọtụtụ ihe banyere nlekọta ahụ ike, ihe ghọworo ihe bara uru nke ukwuu n’afọ ndị dị n’ihu. Mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, enwere m ọtụtụ ohere ime nkwusa, mmadụ atọ zaghachikwara ma ghọọ Ndịàmà Jehova.

Mgbe m nọsịrị n’ụlọ mkpọrọ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ anọ, a tọhapụrụ m n’ikpeazụ ná nnwale na 1952. Ka e mesịrị, m ghaghị ịpụta n’ụlọikpe dị na Kọrint n’ihi okwu nnọpụiche. (Aịsaịa 2:4) E jichiri m n’ebe ahụ ruo nwa mgbe nta n’ụlọ mkpọrọ ndị agha, a malitekwara imesi m ike ọzọ. Ụfọdụ ndị ọfịsa na-agbanwe nnọọ iyi egwu ha, na-asị: “M ga-eji daga ghụpụta mkpụrụ obi gị iberibe iberibe,” ma ọ bụ, “Echela na mkpụrụ mgbọ isii ga-egbu gị ngwa ngwa.”

Ụdị Ule Dị Iche

Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya m lọghachiri ụlọ, na-ejekwa ozi ọzọ n’Ọgbakọ Volos ma na-arụ ọrụ ego nwa oge. Otu ụbọchị, m natara akwụkwọ ozi sitere n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’Atens, na-akpọ m òkù ịbịa nweta ọzụzụ ga-ewe izu abụọ wee malitezie na-eje eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị ka onye nlekọta sekit. N’otu oge ahụ, nwanne nna m nke nwoke, bụ́ onye gba aka nwa ma nwee ọtụtụ ụlọ na ala, gwara m ka m na-elekọta ihe onwunwe ya nile. Ezinụlọ m ka na-ebi ndụ ogbenye, ọrụ a gaara agwọtakwa nsogbu ego ha.

M gara leta nwanne nna m iji kwupụta obi ekele m maka ihe ọ na-enye m, ma m gwara ya na mụ ekpebiworị ịnara ọrụ pụrụ iche n’ozi ndị Kraịst. Mgbe m kwuru nke a o biliri, lee m anya siri ike, ma hapụ ọnụ ụlọ ahụ ngwa ngwa. Ọ bịaghachiri na-eji onyinye ego buru ibu nke pụrụ ịkwado ezinụlọ m ruo ọnwa ụfọdụ. O kwuru, sị: “Were nke a, jiri ya mee ihe ọ bụla masịrị gị.” Ruo taa, apụghị m ịkọwali mmetụta m nwere n’oge ahụ. Ọ dị nnọọ ka m nụrụ olu Jehova ka ọ na-asị m, ‘I mere ezi nhọrọ. Anọnyeere m gị.’

Site ná ngọzi ezinụlọ m, m gawara Atens na December 1953. Ọ bụ ezie na ọ bụ nanị nne m ghọrọ Onyeàmà, ndị òtù ezinụlọ m ndị ọzọ emegideghị ọrụ ndị Kraịst m. Mgbe m gara n’alaka ụlọ ọrụ dị n’Atens, ihe ijuanya ọzọ nọ na-echere m. Nwanne m nwanyị kụụrụ m teligram, na-ekwu na mgbalị were afọ abụọ nke papa m mere iji nweta ego ezumike nká enwewo ihe ịga nke ọma n’ụbọchị ahụ. Gịnị ọzọ ka m chọrọ? Ọ dị m ka m nwere nku, dịrị njikere ifeli elu n’ozi Jehova!

Ịkpachara Anya

N’afọ ndị mbụ m nọrọ n’ọrụ sekit, m ghaghị ilezi anya nke ọma n’ihi na ndị isi okpukpe na ndị ọchịchị na-akpagbu Ndịàmà Jehova nke ukwuu. Iji leta ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst, karịsịa ndị bi n’obodo nta na ime ime obodo dị iche iche, m jiri ụkwụ gaa ije ọtụtụ hour n’abalị. Ụmụnna ahụ, ndị tinyere onwe ha n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e jidere, gbakọrọ ma jiri ndidi chere n’otu ụlọ maka mbịarute m. Lee ezigbo mgbarịta ume nleta ndị ahụ nyere anyị nile!—Ndị Rom 1:11, 12.

Iji mee ka a ghara ịmata m, m gbanwere otú m dị n’ile anya mgbe ụfọdụ. N’otu oge, m jikeere dị ka onye na-azụ atụrụ iji gafere otu ebe ndị uwe ojii nọchiri ụzọ iji ruo ebe ụmụnna gbakọrọ, bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ dịsi mkpa ike. N’oge ọzọ, na 1955, mụ na otu Onyeàmà ibe m mere dị ka anyị bụ ndị na-ere garlic iji zere ịkpali ndị uwe ojii inyo anyị enyo. Ọrụ anyị bụ ijekwuru ụfọdụ ụmụnna ndị Kraịst bụ́ ndị na-adịkwaghị eje ozi n’obodo nta bụ́ Árgos Orestikón.

Anyị kpọsara ngwa ahịa anyị n’ahịa ọha dị n’obodo ahụ. Otú ọ dị, otu nwa okorobịa bụ́ onye uwe ojii na-eche nche ebe ahụ malitere inyo anyị enyo, mgbe ọ bụla ọ gafekwara, ọ na-ele anyị anya iji chọpụta ihe. N’ikpeazụ, ọ gwara m, sị: “Ị dịghị ka onye na-ere garlic.” N’oge ahụ kpọmkwem, ụmụ agbọghọ atọ bịara ma kwupụta mmasị ha ịzụ ụfọdụ garlic. N’ịrụ aka ná ngwá ahịa m, m tiri, sị: “Nwa okorobịa a bụ́ onye uwe ojii na-ata garlic nke ukwuu, leekwa ka o si sie ike ma maa mma!” Ndị inyom ahụ lere onye uwe ojii ahụ anya ma chịa ọchị. Ya onwe ya kwa mụmụrụ ọnụ ọchị wee pụọ.

Mgbe ọ hapụrụ, m jiri ohere ahụ gaa n’ọnụ ụlọ ahịa ebe ụmụnna anyị ime mmụọ na-arụ ọrụ dị ka ndị na-akwa ákwà. M gwara otu n’ime ha ka ọ dụnyere m bọtin nke m dọkapụtara na kotu m. Ka ọ na-eme nke a, m hulatara ma takwụnyere ya, sị: “Esi m n’alaka ụlọ ọrụ bịa ịhụ unu.” Na mbụ ụmụnna ahụ tụrụ ụjọ, ebe ha na-ezutebeghị Ndịàmà ibe ha ruo ọtụtụ afọ. M gbara ha ume ruo ókè m nwere ike ma mee ndokwa isoro ha nọkọọ ma e mesịa n’ebe a na-eli ozu n’obodo ahụ iji kwurịtakwuo okwu. N’ịbụ ihe obi ụtọ, nleta ahụ bụ ihe na-agba ume, ha ghọkwara ndị na-anụ ọkụ n’obi ọzọ n’ozi ndị Kraịst.

Inweta Onye Ibe Na-ekwesị Ntụkwasị Obi

Na 1956, afọ atọ m ka malitesịrị ọrụ njegharị, m zutere Niki, nwa agbọghọ bụ́ onye Kraịst onye hụrụ ọrụ ime nkwusa n’anya nke ukwuu ma nwee ọchịchọ itinye ndụ ya n’ozi oge nile. Anyị malitere ịkpa ma lụọ di na nwunye na June 1957. M nọ na-eche ma Niki ọ̀ ga-enwe ike imezu ihe nile ọrụ njegharị chọrọ n’okpuru ọnọdụ ndị siri ike nke bịakwasịrị Ndịàmà Jehova na Gris mgbe ahụ. Site n’enyemaka Jehova o mere ike ya, si otú a ghọọ nwanyị mbụ sonyeere di ya n’ọrụ sekit na Gris.

Anyị nọgidere na-arụkọ ọrụ njegharị ahụ ruo afọ iri, na-eleta ihe ka ukwuu n’ọgbakọ ndị dị na Gris. Ọtụtụ mgbe anyị na-agbanwe otú anyị dị n’ile anya ma, na-ebu igbe n’aka gaa ọtụtụ hour n’abalị iji ruo otu ọgbakọ. N’agbanyeghị oké mmegide anyị chere ihu ọtụtụ mgbe, anyị nwere obi ụtọ iji anya anyị hụ uto dị ịtụnanya n’ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà.

Ozi Betel

Na January 1967, a kpọrọ mụ na Niki òkù ije ozi na Betel, dị ka a na-akpọ alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova. Ọkpụkpọ òkù ahụ tụrụ anyị abụọ n’anya, ma anyị nakweere ya, na-enwe obi ike na Jehova na-eduzi ihe nile. Ka oge na-aga, anyị bịara ghọta oké ihe ùgwù ọ bụ ije ozi n’ebe bụ isi nke ọrụ ọchịchị Chineke.

Ọnwa atọ ka anyị banyesịrị n’ozi Betel, ndị agha weere ọchịchị, Ndịàmà Jehova aghaghịkwa ịga n’ihu n’ọrụ ha na nzuzo. Anyị malitere izukọ n’ìgwè nta dị iche iche, nwee mgbakọ anyị dị iche iche n’ime ọhịa, jiri akọ mee nkwusa, biekwa ma kesaa akwụkwọ e ji amụ Bible na nzuzo. O sighị ike ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ndị a, ebe ọ bụ na nanị ihe anyị mere bụ ịtụteghachi ụzọ nke ịrụ ọrụ anyị ndị anyị jiworo mee ihe n’afọ ndị gara aga. N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị ahụ, ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà mụbara site n’ihe na-erughị 11,000 na 1967 gaa n’ihe karịrị 17,000 na 1974.

Mgbe anyị nọsịrị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 30 afọ n’ozi Betel, mụ na Niki nọgidere na-enwe ngọzi ime mmụọ anyị nile, n’agbanyeghị ahụ ike na ịkpa ókè nke ịka nká. Ruo ihe karịrị afọ iri, anyị biri n’ogige alaka ụlọ ọrụ ahụ dị na Kartali Street n’Atens. Na 1979 a raara alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ dị na Marousi, mpụga nke Atens nye. Ma kemgbe 1991 anyị anụwo ụtọ nke ihe owuwu alaka ọhụrụ sara mbara nke dị na Eleona, 60 kilomita n’ebe ugwu nke Atens. N’ebe a m na-eje ozi n’ụlọ ọgwụ dị na Betel, ebe ọzụzụ ahụ m natara dị ka onye na-enyere dọkịta ụlọ mkpọrọ aka ghọrọ ihe bara uru nke ukwuu.

N’ihe karịrị iri afọ anọ m nọworo n’ozi oge nile, dị ka Jeremaịa, m bịawo ghọta eziokwu nke nkwa Jehova: “Ha ga-ebusokwa gị agha; ma ha agaghị enwe ike imegide gị: n’ihi na gị ka M nọnyeere, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), ịnapụta gị.” (Jeremaịa 1:19) Ee, mụ na Niki nwetara iko jupụtara ná ngọzi sitere n’aka Jehova. Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe nile n’ịba ụba nke nlekọta ịhụnanya na amara ya na-ekwesịghị anyị.

Agbamume m na-enye ndị na-eto eto ná nzukọ Jehova bụ ka ha chụsoo ozi oge nile. N’ụzọ dị otú a ha pụrụ ịnakwere ọkpụkpọ òkù Jehova ịnwale ma ọ ga-emezu nkwa ya ‘imeghe window nile nke eluigwe, wụsa ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.’ (Malakaị 3:10) Site n’ahụmahụ nke m, m pụrụ imesi unu ndị na-eto eto obi ike na Jehova n’ezie ga-agọzi unu nile ndị si otú a na-atụkwasị ya obi n’ụzọ zuru ezu.

[Foto dị na peeji nke 26]

Lambros Zoumbos na nwunye ya, bụ́ Niki

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya