Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 9/1 p. 25-28
  • Ijere Chineke ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ijere Chineke ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Itolite na Gris
  • N’ime Agha Obodo
  • Ịchọta Olileanya A Pụrụ Ịdabere na Ya
  • Ịbụ Onye E Jidere ma Tụọ Mkpọrọ
  • Onye E Boro Ebubo Ime Ntọghata
  • Ọnwụ Nwa M Nwoke
  • Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịtụkwasị Jehova Obi
  • Ihe Nketa Bara Ụba
  • Ikpebisi Ike Ịtụkwasị Jehova Obi
  • Ije Ozi n’Okpuru Aka Ịhụnanya Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Inye Jehova Ihe Ruuru Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Mkpagbu Siri Ike Lere Ya Ule
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 9/1 p. 25-28

Ijere Chineke ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ozi

Dị ka Kimon Progakis si kọọ

Ọ bụ uhuruchi jụrụ oké oyi na 1955. Mụ na nwunye m, bụ́ Giannoula malitere inwe nchegbu n’ihi na nwa anyị nwoke dị afọ 18, bụ́ George, alọtaghị site ná ntakịrị ụlọ ahịa ọ na-arụ ọrụ. N’ụzọ a na-atụghị anya ya, otu onye uwe ojii kụrụ aka n’ụzọ anyị. “Moto kụrụ nwa gị nwoke mgbe o ji ịnyịnya ígwè na-alọta ụlọ,” ka o kwuru, “ọ nwụọkwala.” Mgbe ahụ o hulatara ihu ma kwuo n’olu dị ala, sị: “Ha ga-agwa gị na ọ bụ ihe ọghọm, ma n’ezie, e gburu ya egbu.” Ụkọchukwu obodo na ụfọdụ ndị ndú ndị agha agbawo izu wee gbuo ya.

N’AFỌ ndị ahụ, mgbe Gris na-agbake site n’oge nke esemokwu na ihe isi ike, ọ dị ize ndụ ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Amaara m n’onwe m banyere ikike nke Chọọchị Orthodox nke Gris na òtù ndị agha dị iche iche n’ihi na ruo ihe karịrị afọ 15, abụwo m onye òtù ha na-arụsi ọrụ ike. Ka m gwa gị banyere ihe omume ndị dujere n’ọdachi a n’ezinụlọ anyị ihe karịrị 40 afọ gara aga.

Itolite na Gris

Na 1902 a mụnyere m n’ime ezinụlọ bara ọgaranya n’obodo nta dịdebere obodo Chalcis, na Gris. Nna m bụ onye na-arụsi ọrụ ike ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo, ezinụlọ anyị bụkwa ndị òtù Chọọchị Orthodox nke Gris. Aghọrọ m onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-agụ akwụkwọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe n’oge mgbe ihe ka n’ọtụtụ n’ime ndị obodo m bụ iti.

Ịda ogbenye na ikpe na-ezighị ezi nke jupụtara ná mmalite nke narị afọ nke 20 zụlitere n’ime m ọchịchọ maka ụwa nwere ọnọdụ ndị ka mma. M chere na okpukpe kwesịrị inwe ike imeziwanye ọnọdụ dị mwute nke ndị obodo m. N’ihi mmasị m nwere n’okpukpe, ndị gbagotere n’ọkwá n’obodo m tụrụ aro ka m ghọọ onye ụkọchukwu Orthodox nke Gris nke ógbè anyị. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ejewo m leta ọtụtụ ebe obibi ndị mọnk, sorokwa ndị bishọp na ndị isi n’ebe obibi ndị mọnk kwurịta okwu, ọ dịghị m ka m dị njikere ma ọ bụ nwee mmasị ịnakwere ibu ọrụ dị otú ahụ.

N’ime Agha Obodo

Ọtụtụ afọ n’ihu, n’April 1941, Gris bịara dịrị n’okpuru ọchịchị Nazi. Nke a wetara oge nhụsianya nke igbu mmadụ, ụnwụ nri, ụkọ ihe ndị dị mkpa, na nhụjuanya ụmụ mmadụ nke ọnụ na-apụghị ịkọ. Òtù nguzogide siri ike bilitere, esonyekwaara m otu n’ime ìgwè ndị agha okpuru nke lụsoro ndị agha Nazi ahụ na-eme mwakpo ọgụ. N’ihi ya, e sunyere ebe obibi m ọkụ ọtụtụ mgbe, a gbara m égbè, e bibikwara ihe ọkụkụ m. Ná mmalite 1943 mụ na ezinụlọ m enweghị nhọrọ ọzọ na-abụghị ịgbaga n’ugwu ndị elu ha na-adịghị larịị. Anyị nọgidere ebe ahụ ruo ọgwụgwụ nke ọchịchị ndị Germany n’October 1944.

Ọgụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke obodo malitere mgbe ndị Germany hapụsịrị. Òtù ndị agha okpuru nke m sonyeere ghọrọ otu n’ime ndị agha bụ isi n’agha obodo ahụ. Ọ bụ ezie na echiche ndị Kọmunist nke ikpe ziri ezi, ịha nhata, na imekọ ihe ọnụ masịrị m, ihe bụ ezie mesịrị mee m ka m nwee nkụda mmụọ kpam kpam. Ebe ọ bụ na m nwere ọkwá dị elu n’òtù ahụ, ahụrụ m n’onwe m na ikike na-eyi ka ọ na-emerụ ndị mmadụ. N’agbanyeghị ihe ndị yiri ozizi na echiche ndị dị mma, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na ezughị okè na-emebi nzube ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị kasị mma.

Ihe wụrụ m akpata oyi n’ahụ karịsịa bụ na n’akụkụ dị iche iche nke agha obodo ahụ, ndị ụkọchukwu Orthodox na-eburu ngwá agha iji gbuo ndị okpukpe nke ha! M chere n’onwe m, sị, ‘Olee otú ndị ụkọchukwu a pụrụ isi kwuo na ha na-anọchite anya Jisọs Kraịst, bụ́ onye dọrọ aka ná ntị, sị: “Mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha”?’—Matiu 26:52.

N’oge agha obodo ahụ, na 1946, m zoro ná nso obodo Lamia, n’etiti Gris. Uwe m kara nnọọ nká, ya mere m kpebiri ime ka a ghara ịmata m ma gakwuru onye na-akwa ákwà nọ n’obodo ahụ ka ọ kwaara m ndị ọhụrụ. A nọ na-enwe ịrụ ụka kpụ ọkụ n’ọnụ mgbe m bịarutere, n’oge na-adịghịkwa anya m hụrụ onwe m ịbụ onye na-ekwu okwu, ọ bụghị banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, kama banyere ihe m nwere mmasị na ya ochie, bụ́ okpukpe. N’ịhụ echiche m ndị dabeere n’ezi ihe ọmụma, ndị na-ekiri ihe na-emenụ tụrụ aro ka m soro otu ‘prọfesọ nke nkà mmụta okpukpe’ kwurịta okwu. Ozugbo, ha gara ịkpọta ya.

Ịchọta Olileanya A Pụrụ Ịdabere na Ya

Ná nkwurịta okwu nke sochirinụ, “prọfesọ” ahụ jụrụ m ebe ndabere nke nkwenkwe m. “Ndị Nna Dị Nsọ na Nzukọ Ndị Isi Chọọchị,” ka m zaghachiri. Kama ikwugide m, ọ saghere Bible ntakịrị ya gaa na Matiu 23:9, 10, gwakwa m ka m gụọ okwu Jisọs: “Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa: n’ihi na otu Onye bụ Nna unu, Ya bụ Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ndị ndú, n’ihi na otu Onye bụ Onye ndú unu, Ya bụ Kraịst ahụ.”

Nke ahụ bụụrụ m ihe na-emeghe anya! Amatara m na nwoke a na-ekwu eziokwu. Mgbe ọ kọwara onwe ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, agwara m ya ka o nyetụ m ụfọdụ akwụkwọ ka m gụọ. O wetaara m akwụkwọ bụ́ Light, bụ́ nkọwa nke akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe, m weere ya laghachi n’ebe m zoro. Ruo ogologo oge, anụ ọhịa ahụ e zoro aka ná Mkpughe abụworo m ihe omimi, ma ugbu a amụtara m na ndị a nọchitere anya òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị dị na narị afọ nke 20 nke a. M malitere ịghọta na Bible nwere ihe bara uru ọ pụtara maka oge anyị nakwa na m kwesịrị ịmụ ya ma gbanwee ndụ m ka o kwekọọ n’eziokwu ya.

Ịbụ Onye E Jidere ma Tụọ Mkpọrọ

Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, ndị agha wabatara n’ebe m zoro ma jide m. A tụkpunyere m n’ụlọ ngá dị n’ime ala. Ebe m bụworo onye na-emebi iwu a na-achọ achọ ruo oge ụfọdụ, atụrụ m anya ka e gbuo m. N’ebe ahụ, n’ụlọ ngá m, Onyeàmà ahụ gwaworo m okwu na mbụ bịara leta m. Ọ gbara m ume ịtụkwasị Jehova obi m kpam kpam, bụ́ nke m mere. A mara m ikpe ịga biri n’ala ọzọ ruo ọnwa isii n’àgwàetiti Aegean bụ́ Ikaria.

Ngwa ngwa m bịarutere, m kọwara onwe m, ọ bụghị dị ka onye Kọmunist, kama dị ka Onyeàmà Jehova. A chụlagakwara ndị ọzọ mụtaworo eziokwu Bible n’ebe ahụ, ya mere m chọtara ha, anyị mụkọkwara Bible ọnụ mgbe nile. Ha nyeere m aka inwetakwu ihe ọmụma site n’Akwụkwọ Nsọ na nghọta ka mma banyere Chineke anyị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Jehova.

Na 1947, mgbe ikpe a mara m gwụrụ, e nyere m iwu ka m bịa n’ọfịs ọkàikpe ọha. Ọ gwara m na obi tọrọ ya ụtọ n’àgwà m ma kwuo na m pụrụ iji aha ya mee onye a pụrụ ịjụta ase m ma ọ bụrụ na a chụgakwa m ala ọzọ. Mgbe m bịarutere Atens, ebe ezinụlọ m ka kwagagodịrị, m malitere isonyere otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova, n’oge na-adịghịkwa anya e mere m baptism dị ka ihe ngosipụta nke nrara m raara onwe m nye Jehova.

Onye E Boro Ebubo Ime Ntọghata

Ruo ọtụtụ iri afọ, Gris kpagburu Ndịàmà Jehova n’okpuru iwu ndị e mere na 1938 na 1939 na-amachibido ime ntọghata. N’ihi ya, site na 1938 ruo 1992, e nwere njide 19,147 nke Ndịàmà na Gris, ụlọikpe makwara ikpe ndị dị afọ 753 ná ngụkọta, nke a nọzuru 593 n’ime ha. Mụ onwe m, e jidere m ihe karịrị ugboro 40 maka ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke, ná ngụkọtakwa anọrọ m ọnwa 27 n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche.

Otu n’ime njide e jidere m bụ n’ihi akwụkwọ ozi m degaara otu ụkọchukwu Orthodox nke Gris na Chalcis. Na 1955, a gbaworị ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova ume izigara ndị ụkọchukwu nile akwụkwọ nta bụ́ Christendom or Christianity—Which One Is “the Light of the World”? Otu n’ime ndị ụkọchukwu gbagotere n’ọkwá nke m degawooro akwụkwọ gbara m akwụkwọ maka ime ntọghata. N’oge ikpe ahụ, ma ọkàiwu anyị bụ́ Onyeàmà ma ọkàiwu ógbè ahụ kwuru okwu mgbachitere bụ ọkpọka, na-akọwa ibu ọrụ nke ezi ndị Kraịst nwere ikwusa ozi ọma banyere Alaeze Chineke.—Matiu 24:14.

Ọkàikpe bụ onye isi oche nke ụlọikpe ahụ jụrụ archimandrite (onye isi chọọchị ọkwá ya dị ala karịa nke bishọp), sị: “Ị̀ gụrụ akwụkwọ ozi ahụ na akwụkwọ nta ahụ?”

“Ee e,” ka ọ zara n’ike, “adọkasịrị m ha ma chịfuo ha ngwa ngwa m meghere envelopu ahụ!”

“Mgbe ahụ olee otú ị pụrụ isi kwuo na nwoke a tọghatara gị?” ka onye isi oche nke ndị ikpe ahụ jụrụ.

Ọzọ, ọkàiwu anyị hotara ihe atụ nke ndị prọfesọ na ndị ọzọ bụ́ ndị nyere ọ́bá akwụkwọ ọha ntụkọba dị iche iche nke akwụkwọ. “Ị̀ ga-asị na ndị ahụ nwara ịtọghata ndị ọzọ?” ka ọ jụrụ.

N’ụzọ doro anya, ọrụ dị otú ahụ abụghị ime ntọghata. Ekelere m Jehova mgbe m nụrụ mkpebi ikpe ahụ bụ́: “Ikpe amaghị ha.”

Ọnwụ Nwa M Nwoke

A nọgidere na-eyi nwa m nwoke bụ́ George egwu, nke na-esitekarị ná mkpasu nke ndị ụkọchukwu Orthodox. E jidekwara ya ọtụtụ mgbe n’ihi ịnụ ọkụ n’obi ntorobịa ya n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. N’ikpeazụ, ndị mmegide ahụ kpebiri igbu ya na, n’otu oge ahụ, zigara ndị ọzọ fọdụrụ n’ime anyị ozi iyi egwu ịkwụsị ime nkwusa.

Onye uwe ojii ahụ bịara n’ụlọ anyị ịkọ ọnwụ George kwuru na onye ụkọchukwu Orthodox nke Gris obodo ahụ na ụfọdụ ndị ndú ndị agha agbawo izu wee gbuo nwa anyị nwoke. “Ihe ọghọm” ndị dị otú ahụ na-adịkarị n’oge ndị ahụ dị ize ndụ. N’agbanyeghị iru újú nke ọnwụ ya kpatara, e mere nnọọ ka mkpebi anyị ịnọgide na-arụsi ọrụ ike n’ọrụ nkwusa ahụ na ịtụkwasị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu siwanye ike.

Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịtụkwasị Jehova Obi

N’etiti afọ ndị 1960, nwunye m na ụmụ m ga-anọ ọnwa ndị oge okpomọkụ n’obodo nta dị n’ụsọ oké osimiri bụ́ Skala Oropos, ihe dị ka kilomita 50 site n’Atens. N’oge ahụ, o nweghị Ndịàmà bi n’ebe ahụ, ya mere anyị gbaara ndị agbata obi anyị àmà mberede. Ụfọdụ ndị ọrụ ugbo ógbè ahụ meghachiri omume nke ọma. Ebe ọ bụ na ndị ikom na-arụ ọrụ ogologo hour n’ubi ha n’oge ehihie, anyị duziiri ha ọmụmụ Bible n’ime abalị, ọtụtụ n’ime ha ghọkwara Ndịàmà.

N’ịhụ otú Jehova si na-agọzi mgbalị anyị, ruo ihe dị ka afọ 15, anyị gara n’ebe ahụ izu ọ bụla iji duziere ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 30 anyị duziiri ọmụmụ ihe n’ebe ahụ enwewo ọganihu ruo n’ọnọdụ nke ime baptism. Na mbụ, e guzobere otu ìgwè ọmụmụ ihe, e nyekwara m ọrụ iduzi nzukọ ndị ahụ. Ka e mesịrị ìgwè ahụ ghọrọ otu ọgbakọ, taakwa ihe karịrị otu narị Ndịàmà sitere n’ógbè ahụ mejupụtara Ọgbakọ Malakasa. Anyị na-aṅụrị ọṅụ na anọ n’ime ndị anyị nyeere aka na-eje ozi ugbu a dị ka ndị ozi oge nile.

Ihe Nketa Bara Ụba

Nwa oge mgbe m rarasịịrị ndụ m nye Jehova, nwunye m malitere inwe ọganihu ime mmụọ, e mekwara ya baptism. N’oge ihe isi ike nke mkpagbu, okwukwe ya nọgidere sie ike, o guzosikwara ike ma nọsie ike n’iguzosi ike n’ezi ihe ya. Ọ dịghị mgbe o mere mkpesa banyere ọtụtụ ihe isi ike o nwetara n’ihi mkpọrọ a tụrụ m mgbe mgbe.

N’ime ọtụtụ afọ, anyị jikọrọ aka duzie ọtụtụ ọmụmụ Bible, o nyekwaara ọtụtụ aka n’ụzọ dị irè site n’ụzọ dị mfe na n’ụzọ ịnụ ọkụ n’obi o ji eme ihe. Ka ọ dị ugbu a, o nwere ụzọ magazin nke gụnyere ọtụtụ ndị ọ na-ewegara Ụlọ Nche na Teta! mgbe ọ bụla.

N’ụzọ dị ukwuu n’ihi nkwado nke nwunye m na-ahụ n’anya, ụmụ anyị atọ ndị dị ndụ na ezinụlọ ha, bụ́ ndị gụnyere ụmụ ụmụ isii na ụmụ ụmụ ụmụ anọ, na-arụsicha ọrụ ike n’ozi Jehova. Ọ bụ ezie na ọ dịghị mkpa ka ha nagide mkpagbu na mmegide dị ilu nke mụ na nwunye m chere ihu, ha atụkwasịwo Jehova obi kpam kpam, ha nọgidekwara na-eje ije n’ụzọ ya. Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụrụ anyị nile ịbụkwa ndị e jikọghachiri ha na George anyị hụrụ n’anya mgbe ọ lọghachiri ná mbilite n’ọnwụ!

Ikpebisi Ike Ịtụkwasị Jehova Obi

N’afọ ndị a nile, ahụwo m mmụọ Jehova ka ọ na-arụ ọrụ n’ahụ ndị ya. Nzukọ ya nke e ji mmụọ nsọ na-eduzi enyeworo m aka ịhụ na anyị apụghị ịtụkwasị mgbalị ndị mmadụ obi anyị. Nkwa ha nile maka ọdịnihu ka mma abaghị uru, na-abụ n’ezie akataka ụgha.—Abụ Ọma 146:3, 4.

N’agbanyeghị nká m na-aka na nsogbu ahụ ike dị njọ, anya m lekwasịrị n’ịbụ ezie nke olileanya Alaeze ahụ. N’ezie m na-akwa mmakwaara banyere afọ ndị m raara nye okpukpe ụgha na ịgbalị iweta ọnọdụ ndị ka mma site n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. A sị na m ga-ebighachi ndụ m ọzọ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na m ga-ekpebikwa ọzọ ijere Jehova, bụ́ Chineke kwesịrị ntụkwasị obi ozi.

(Kimon Progakis dara n’ụra ọnwụ n’oge na-adịbeghị anya. O nwere olileanya elu ala.)

[Foto dị na peeji nke 26]

Foto nke Kimon na nwụnye ya, bụ́ Giannoula sere ná nso nso a

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya