Ì Ruru Eru Ije Ozi?
“Iru eru anyị sitere na Chineke.”—2 NDỊ KỌRINT 3:5.
1. Ọgbakọ ndị Kraịst enweghị ohere maka ụdị ndị dị aṅaa?
JEHOVA CHINEKE na Jisọs Kraịst bụ ndị ọrụ. Jisọs sịrị: “Nna m na-arụ ọrụ ruo ugbu a, mụ onwe m na-arụkwa ọrụ.” (Jọn 5:17) Chineke adịghị akwado ndị na-ajụ ịrụ ọrụ; nkwado ya anaghị adịkwasịkwa ndị ahụ na-achọ ibu ọrụ ka ha wee nweta ike n’ebe ndị ọzọ nọ. Ọgbakọ ndị Kraịst enweghị ohere ọ bụla maka ndị na-adala azụ ma ọ bụ ndị ji ọchịchọ onwe onye na-achọ inweta ike.—Matiu 20:25-27; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:10.
2. N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa dị ukwuu maka ndị ikom ndị ga-ebu ibu ọrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst ugbu a?
2 Ndịàmà Jehova nwere ‘ọtụtụ ihe ha ga-eme n’ọrụ Onyenwe anyị,’ karịsịa ugbu a, mgbe ọtụtụ mmadụ na-enubata ‘n’ugwu’ nke ezi ofufe ahụ. (1 Ndị Kọrint 15:58; Aịsaịa 2:2-4) E nwere oké mkpa maka ndị ikom ruru eru n’ụzọ ime mmụọ ibu ibu ọrụ dị n’ọgbakọ. N’ịbụ ndị ihe na-akwali ha na-abụghị oké ọchịchọ onwe onye, ndị dị otú ahụ na-ebuli Jehova elu, ọ bụghị onwe ha. (Ilu 8:13) Ha maara na Chineke na-enyere ha aka iru eru maka ọrụ ndị dị n’ọgbakọ, ọbụna dị ka ọ ‘na-eme ka ndị ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ruo eru.’—2 Ndị Kọrint 3:4-6.
3. N’ụzọ bụ isi, gịnị bụ ibu ọrụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi?
3 Taa, dị ka ọ dị n’etiti ndị Kraịst oge gboo, mmụọ nsọ na-ahọpụta ndị ikom, sitekwa ná ndokwa nzukọ Jehova ije ozi dị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. (Ọrụ 20:28; Ndị Filipaị 1:1; Taịtọs 1:5) Ndị okenye na-azụ ìgwè atụrụ nke Chineke n’ụzọ ime mmụọ, na-enye nlekọta nke nchebe. Ndị ohu na-eje ozi na-enyere ha aka, bụ́ ndị ọrụ ha na-emetụtaghị nlekọta ime mmụọ kpọmkwem. (1 Pita 5:2; tụlee Ọrụ 6:1-6.) Dị ka Ọkpara Chineke, onye bịara ije ozi, ndị a họpụtara n’ụzọ dị otú a na-enwe ọchịchọ ijere ndị kwere ekwe ibe ha ozi. (Mak 10:45) Ọ bụrụ na ị bụ nwoke onye Kraịst, ì nwere mmụọ ahụ?
Iru Eru Ndị E Nwekọrọ Ọnụ
4. N’ole ebe karịsịa ka anyị na-achọta ndepụta nke iru eru ndị a chọrọ n’aka ndị ikom e nyere ibu ọrụ ọgbakọ?
4 Karịsịa, Pọl setịpụrụ iru eru a chọrọ n’aka ndị ahụ e ji ntụkwasị obi nye ibu ọrụ nke ọgbakọ na 1 Timoti 3:1-10,12,13 na Taịtọs 1:5-9. Mgbe anyị na-atụle iru eru ndị a, nke ụfọdụ n’ime ha metụtara ma ndị okenye ma ndị ohu na-eje ozi, anyị ekwesịghị ile ha anya dị ka ndị ụwa si ele ha. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ile ha anya dị ka e dekọrọ ha na narị afọ mbụ ahụ, dịkwa ka a pụrụ isi tinye ha n’ọrụ n’etiti ndị Jehova. Iru ihe ndị a a chọrọ apụtaghị na mmadụ aghaghị izu okè, n’ihi na ya bụrụ otú ahụ, ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke pụrụ iru eru. (1 Jọn 1:8) Ma, ya bụrụ na ị bụ nwoke onye Kraịst, ma ì nwere ọrụ n’ọgbakọ ugbu a ma ọ bụ na i nweghị, gịnị mere i nyochaghị iru eru gị nile?
5. Gịnị ka ọ pụtara ịbụ onye a na-adighị akalu?
5 Onye a na-adịghị akalu; inwe àmà dị mma site n’ọnu ndị nọ n’èzí; onye a na-apụghị ibo ebubo. (1 Timoti 3:2, 7, 8, 10; Taịtọs 1:6, 7) Mgbe a họpụtara ha na mgbe ha na-eje ozi, ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye aghaghị ịbụ ndị a na-adịghị akalu, ya bụ, ndị na-enweghị ihe ịta ụta ọ bụla, ndị ọ na-adịghịkwa mkpa ka a tụọ ha mmehie n’anya maka ebubo bu eziokwu nke àgwà ma ọ bụ ozizi ọjọọ. Ebubo ụgha nke “ụmụnna ụgha” ma ọ bụ ndị ọzọ boro adịghị eme ka mmadụ bụrụ onye a na-akalu. Iji mee ka mmadụ gharakwa iru eru ije ozi n’ime ọgbakọ, ebubo ahụ aghaghị ịbụ nke rijuru afọ, a ghaghịkwa ịnwapụta ya n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Akwụkwọ nsọ. (2 Ndị Kọrint 11:26; 1 Timoti 5:19) Onye a họpụtara n’ime ọgbakọ ‘aghaghịkwa inwe àmà dị mma site n’ọnụ ndị nọ n’èzí; ka ọ ghara ịdaba n’ịta ụta, ya na ịma n’ọnyà Ekwensu.’ Ọ bụrụ na ọ dị ajọ mmehie mmadụ mere n’oge gara aga, a pụrụ ịhọpụta ya nanị ma ọ bụrụ na o meriwo nkatọ ọ bụla sitere na ya, meekwara onwe ya aha dị mma.
6. Gịnị ka ịbụ di nke otu nwunye pụtara?
6 Di nke otu nwunye. (1 Timoti 3:2, 12; Taịtọs 1:6) Nke a apụtaghị na ọ bụ nanị ndị ikom lụworo nwunye nwere ike ịbụ ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ lụrụ nwunye, nwoke ahụ aghaghị inwe nanị otu nwunye dị ndụ, kwesịkwa ntụkwasị obi nye ya. (Ndị Hibru 13:4) N’adịghị ka ọtụtụ ndị ikom na-abụghị ndị Kraịst na narị afọ mbụ ahụ, ọ pụghị ịbụ di nke ihe karịrị otu nwanyị.a
7. (a) Ọ̀ bụ afọ ndụ na-eme ka mmadụ ruo eru ịbụ okenye ọgbakọ? (b) Gịnị ka ịchị ezinụlọ nke ọma gụnyere?
7 Onye na-achị ezinụlọ ya nke ọma, na-enwekwa umu ya n’okpuru ya. (1 Timoti 3:4, 5, 12; Taịtọs 1:6) Ụfọdụ ndị pụrụ iche na ndị okenye aghaghị ịdị 30 afọ ma ọ dịkarịa ala, ma Bible esetịpụghị afọ ndụ ọ bụla mmadụ na-aghaghị ịgbaru. Ma, onye ahụ aghaghị ịdị na-akpa àgwà dị ka onye bụ okenye n’ụzọ ime mmụọ. Ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye aghaghị ịbụ na ha etoruwo ogo inwe ụmụ. Ọ bụrụ na o nwere nwunye, mmadụ adịghị eru eru ma ọ bụrụ na ọ na-akpa àgwà nsọpụrụ Chineke n’ebe ọzọ ma bụrụ onye ọchịchị aka ike n’ụlọ. Ọ ghaghị inwetaworị nsọpụrụ n’ihi ilekọta ezinụlọ ya n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, ihe o bu n’uche kwesịkwara ịbụ ka o nwee ihe ịga nke ọma n’ụzọ ime mmụọ n’ebe onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ya nọ. Dị ka ụkpụrụ bụ isi, onye okenye nke nwere ụmụ kwesịrị inwe obere ụmụaka ndị na-akpa àgwà ọma, bụ́ ndị “kwere ekwe.” Ọ pụrụ ịbụ na ha na-enwe ọganihu iru n’ịrara onwe ha nye Chineke ma ọ bụkwanụ na ha emeworị baptism dị ka Ndịàmà Jehova. O yighị ka nwoke nke na-enweghị ike iwulite okwukwe n’ime ụmụ ya ọ̀ ga-enwe ike ime otú ahụ n’ime ndị ọzọ.
8. Tupu nwoke nwere ezinụlọ enwee ike ịbụ onye okenye, gịnị ka ọ na-aghaghị ibu ụzọ mụta ime?
8 Tupu nwoke nke nwere ezinụlọ enwee ike ịbụ okenye nke ga-enwe ike inye nlekọta ime mmụọ n’ime ọgbakọ, ọ ghaghị ịmụta otú ọ ga-esi duzie ezinụlọ nke aka ya. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla amataghị otú ọ ga-achị ezinụlọ nke aka ya, ọ̀ ga-esi aṅaa lee nzukọ Chineke anya nke ọma?” (1 Timoti 3:5) N’eziokwu ọ pụrụ ịbụ na nwunye nke na-ekweghị ekwe na-emegide nwoke ahụ. (Matiu 10:36; Luk 12:52) Ma ọ bụ na otu n’ime ụmụ ya pụrụ ịbụ onye ikpe ajọ mmehie mara, ọ bụ ezie na ndị ọzọ na-eme nke ọma n’ụzọ ime mmụọ. Ma, ọ bụrụ na nwoke ahụ emewo ihe nile a pụrụ ịtụ anya n’aka ya, karịsịa, ọ bụrụkwa na o nwewo ihe ịga nke ọma n’ụzọ ime mmụọ n’ebe ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ya nọ, ọ dịghị mkpa na ọjụjụ otu n’ime ndị nọ n’ezinụlọ ya jụrụ ezi nduzi ya ga-eme ka ọ ghara iru eru ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye ọgbakọ.
9. Nlezianya dị aṅaa ka onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi na-aghaghị iji eme ihe banyere ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya?
9 Onye na-adịghị ese okwu site n’ịṅụbiga mmanya ókè, onye na-adịghị aṅụbiga mmanya ókè. (1 Timoti 3:3, 8; Taịtọs 1:7) Onye ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye ekwesịghị ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè. Ịbụ onye ihe ndị a riri ahụ pụrụ ịrụpụtara mmadụ enwekwaghị ike ịchịkwa echiche na mmetụta ya nile, na-eduje n’ise okwu site n’ịṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụ ịlụ ọgụ. O kwesịrị ịbụ ‘onye na-adịghị aṅụbiga mmanya ókè’ ma ọ bụ bụrụ onye a maara dị ka onye na-aṅụkarị oké mmanya. (Ilu 23:20, 21, 29-35) Lee nnọọ ka ọ ga-esi bụrụ oké ihe ọdachi ma ọ bụrụ na e mebie nleta ọzụzụ atụrụ site n’ịkpa àgwà a na-akparaghị ókè! Ọ bụrụ na nwanna na-aṅụ mmanya ma ọlị, o kwesịghị ime otú ahụ mgbe ọ na-ekere òkè ná nzukọ dị iche iche, ozi ubi, ma ọ bụ ozi ọzọ dị nsọ.—Levitikọs 10:8-11; Ezikiel 44:21.
10. N’ihi gịnị ka ndị na-ahụ ego n’anya na ndị akpịrị uru na-ezighị ezi na-akpọ nkụ na-ejighị ruo eru ịbụ ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi?
10 Ọ gaghị abụ onye na-ahụ ego n’anya ma ọ bu onye akpịrị uru na-ezighị ezi na-akpọ nkụ. (1 Timoti 3:3, 8, NW; Taịtọs 1:7) Ndị hụrụ ego n’anya nọ n’ihe ize ndụ ime mmụọ, “ndị anyaukwu” agaghị eketakwa Alaeze Chineke. Ya mere, ndị dị otú ahụ erughị eru ịbụ ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 1 Timoti 6:9, 10) Okwu Grik bụ isi nke a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “na-ezighị ezi” pụtara “nke na-eweta ihere,” nke ahụ a sụgharịkwara ịbụ “uru” na-ezo aka n’ebe ụdị uru ma ọ bụ abamuru ọ bụla dị. (Ndị Filipaị 1:21; 3:4-8) N’eziokwu, nwoke nke ọdịdị mmadụ ya gosiri na ọ ga-emeso “ìgwè atụrụ” Chineke ihe n’ụzọ na-ezighị ezi erughị eru maka ibu ọrụ dị n’ọgbakọ. (Ezikiel 34:7-10; Ọrụ 20:33-35; Jud 16) A na-eme ka mkpa iji nlezianya mee ihe mgbe a na-edepụta aha ndị a ga-ahọpụta dịwanye ukwuu mgbe anyị chetara na o zugbo a họpụtasịrị mmadụ, a pụrụ inye ya ego ka o lekọta, na a pụkwara ịnwa ya izuru ụfọdụ n’ime ego ahụ.—Jọn 12:4-6.
11. N’ihi gịnị ka a na-ekwesịghị ịhọpụta “onye ọhụrụ” maka ibu ọrụ ọgbakọ?
11 Onye na-abụghị onye ọhụrụ; ka a nwalee ha. (1 Timoti 3:6, 10) Onye ka mere baptism ọhụrụ enwebeghị oge iji nwapụta na ọ ga-eji ikwesị ntụkwasị obi lekọta ọrụ ndị e nyere ya. Ọ pụrụ ịbụ na o nweghị ọmịiko n’ebe ndị nọ n’ihe isi ike nọ ma ọ bụkwanụ na o nweghị amamihe ahụ dị mkpa iji nyere ndị na-efe ofufe ibe ya aka, ọ pụrụ ọbụna ịdị na-eleda ndị ọzọ anya. Ya mere, tupu e kwuo ka a họpụta mmadụ dị ka ohu na-eje ozi, na karịsịa, dị ka okenye, e kwesịrị ‘ibu ụzọ nwalee’ mmadụ, o kwesịkwara inye ihe àmà nke ezi echiche na ịbụ onye a pụrụ ịdabere na ya. Ọ dịghị ogologo oge e kwuru na nnwale nke a ga-ewe, ndị mmadụ na-enwekwa ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche nke ito uto ime mmụọ. Ma ndị okenye ekwesịghị ịdị ngwa n’ikwu ka a họpụta onye ọhụrụ “ka a ghara ịfụli ya elu, o wee daba n’ọmụma ikpe Ekwensu.” Ka nwoke ahụ burugodị ụzọ gosipụta obi umeala yiri nke Kraịst.—Ndị Filipaị 2:5-8.
Ilekwasị Ndị Ohu Na-eje Ozi Anya
12. Ọ̀ bụ nanị ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ime mgbalị iru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ahụ e depụtara maka ha?
12 E depụtara iru eru ụfọdụ a chọrọ ndị ohu na-eje ozi n’aka. Ma, ọ bụrụkwa na ndị okenye erughị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ahụ, ha agaghị eru eru ije ozi. Dị ka nwoke bụ onye Kraịst, ì ruru eru n’akụkụ ndị a?
13. Gịnị ka ọ pụtara ịbụ onye omume ya kwesịrị ekwesị?
13 Onye kwesịrị nsọpụrụ. (1 Timoti 3:8) Nwoke nke na-eru eru ije ozi dị ka ohu na-eje ozi ekwesịghị iji ibu ọrụ e nyere ya gwurie egwu. O kwesịrị idebe onwe ya n’ụzọ dị ùgwù nke na-eme ka a na-asọpụrụ ya. Ọ bụ ezie na ime ihe ọchị site n’oge ruo n’oge dị mma, ọ gaghị eru eru ma ọ bụrụ na ọ na-eme ihe mgbe nile dị ka à ga-asị na ihe ọ na-eme adịghị mkpa.
14. (a) Gịnị ka ịbụ onye na-enweghị ire abụọ pụtara? (b) Gịnị ka inwe ezi akọ na uche chọrọ n’aka mmadụ?
14 Onye na-enweghị ire abụọ, na-enwe akọ na uche dị ọcha. (1 Timoti 3:8, 9) Ndị ohu na-eje ozi (na ndị okenye) aghaghị ịbụ ndị na-ekwu eziokwu, ọ bụghị ndị na-agba asịrị ma ọ bụ ndị aghụghọ. Ebe ha na-agaghị abụ ndị ire abụọ, ha ekwesịghị iji ụzọ ihu abụọ gwa otu onye otu ihe ma gwa onye ọzọ kpọmkwem ihe megidere nke ahụ. (Ilu 3:32; Jemes 3:17) Ndị ikom ndị a aghaghịkwa ịbụ ndị na-akwadosi eziokwu e kpughere ekpughe ike, “na-enwe ihe omimi nke okwukwe anyị n’ime akọ na uche dị ọcha.” N’ihu Chineke, akọ na uche onye dị otú ahụ aghaghị ịgba àmà na ọ bụ onye ziri ezi, na ọ dịghịkwa ihe nzuzo ma ọ bụ ihe na-emerụ emerụ ọ na-eme. (Ndị Rom 9:1; 2 Ndị Kọrint 1:12; 4:2; 7:1) Ọ dịghị onye na-eru eru ijere ìgwè atụrụ Chineke ozi ọ gwụlakwa ma onye ahụ o jigidesiri eziokwu ahụ na ụkpụrụ nile nke Chineke aka ike.
Ilekwasị Anya n’Iru Eru Ndị Okenye
15. Iru eru nke òle ndị ka a na-enyocha ugbu a, gịnịkwa ka iru eru ndị a metụtara karịsịa?
15 Iru eru ụfọdụ dịịrị kpọmkwem ndị okenye, ndị a metụtakarịkwara ọrụ ha dị ka ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ozizi. Dị ka nwoke bụ onye Kraịst, ì ruru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a?
16. (a) Gịnị ka a chọrọ iji bụrụ onye anya udo? (b) Olee ụzọ onye okenye pụrụ isi jide onwe ya nke ọma?
16 Onye anya udo; onye na-ejidesi onwe ya ike. (1 Timoti 3:2; Taịtọs 1:8) Onye bụ okenye kwesịrị ịbụ onye dị nwayọọ, ọ bụghị onye bụ ohu nke àgwà ọjọọ dị iche iche. Mgbe o chere ule ihu, Chineke ga-enyere ya aka ịnọgide n’ezi nguzo ma ọ bụrụ na o kpee ekpere dị ka onye ọbụ abụ ahụ kpere, sị: “Ahụhụ nile nke obi m sara mbara: mee ka m si ná mkpa m nile pụta.” (Abụ Ọma 25:17) Onye nlekọta kwesịkwara ikpe ekpere maka mmụọ Chineke, gosipụtakwa mkpụrụ ya nke gụnyere imeru ihe n’ókè. (Luk 11:13; Ndị Galetia 5:22, 23) Ịchịkwa echiche, okwu ọnụ, na omume na-enyere onye okenye aka izere imebiga ihe ókè mgbe ọ na-enye ọgbakọ nduzi ime mmụọ.
17. Gịnị ka ịbụ onye uche ya zuru okè gụnyere?
17 Onye uche ya zuru okè. (1 Timoti 3:2) Onye okenye aghaghị inwe ezi uche, amamihe, bụrụkwa onye na-eji akọ eme ihe. O kwesịrị ịbụ onye nwere ezi nzube na onye na-eche ezi echiche tupu o kwuo okwu ma ọ bụ mee ihe. Iche echiche ya nke na-egosi obi umeala, nke guzozikwara eguzozi, gbanyere mkpọrọgwụ n’amamihe Chineke nakwa n’ozizi na-enye ezi ndụ nke Okwu Jehova, bụ́ nke o kwesịrị ịdị na-amụsi ike.—Ndị Rom 12:3; Taịtọs 2:1.
18. Gịnị ka a chọrọ n’aka onye okenye iji bụrụ onye na-ahazi onwe ya nke ọma?
18 Onye na-ahazi onwe ya nke ọma. (1 Timoti 3:2, NW) Okwu Grik e jiri mee ihe n’ebe a bụ nke a sụgharịrị ịbụ “kwesịrị ekwesị” na 1 Timoti 2:9. Ya mere, onye okenye kwesịrị inwe usoro ịdị ndụ nke dị mma n’anya, kwesịkwa ekwesị. Dị ka ihe atụ, o kwesịrị ịbụ onye na-eme ihe n’oge. O yiri ka ndị Kraịst nke narị afọ mbụ emeghị ka ime ndekọ bụrụ oké ihe, ọ dịghịkwa mkpa na onye nlekọta taa aghaghị ịbụ onyeọkà ngụkọ ego ma ọ bụ onye maara otú e si eme ndekọ. Ndị ohu na-eje ozi pụrụ ime ihe ndị ọ dị mkpa ka e mee n’akụkụ ndị a. Ma okwu Grik ahụ a sụgharịrị ịbụ “onye na-ahazi onwe ya nke ọma” pụrụ izo aka n’ezi àgwà, o dokwara anya na mmadụ agaghị eru eru ịbụ okenye ma ọ bụrụ na ọ na-akpa àgwà na-adịghị mma ma ọ bụ n’ụzọ a na-ahazighị nke ọma.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:14; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:6-12; Taịtọs 1:10.
19. N’ihi na ọ bụ onye na-ele ndị ọbịa anya nke ọma, gịnị ka onye okenye na-eme?
19 Onye na-ele ndị ọbịa anya nke ọma. (1 Timoti 3:2; Taịtọs 1:8) Onye okenye ‘na-agbaso ọrụ ile ndị ọbịa anya nke ọma.’ (Ndị Rom 12:13; Ndị Hibru 13:2) Okwu Grik maka ‘ile ndị ọbịa anya nke ọma’ pụtara n’ụzọ nkịtị “onye ihe ndị ọbịa na-amasị.” Otú a, onye okenye nke na-ele ndị ọbịa anya nke ọma na-anabata ndị ọhụrụ ná nzukọ ndị Kraịst dị iche iche, na-egosi otu ụdị mmasị ahụ n’ebe ndị ogbenye nọ dị ka ọ na-egosi n’ebe ndị nwere ihe onwunwe nọ. Ọ na-egosi ile ndị ọbịa anya nke ọma n’ebe ndị na-ejegharị ejegharị maka ọdịmma nke Iso Uzọ Kraịst nọ, na-edupụkwa ha n’ije ha “dị ka o kwesịrị imere Chineke.” (3 Jọn 5-8) N’eziokwu, onye okenye na-egosi ile ndị ọbịa anya nke ọma karịsịa n’ebe ndị kwere ekwe ibe ya nọ dị ka mkpa ha si dị, dịkwa ka ọnọdụ ya nyere ya ohere ime.—Jemes 2:14-17.
20. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka onye okenye na-aghaghị iru eru izi ihe?
20 Onye nwere ike izi ịhe. (1 Timoti 3:2) Ike onye okenye nwere dị ka onye ozizi nke ihe ime mmụọ abụghị n’ihi ọgụgụ isi ma ọ bụ amamihe ụwa o nwere. (1 Ndị Kọrint 2:1-5, 13) Ọ na-abịa n’ihi na ọ “na-ejide okwu ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi nke dị ka ozizi [ya, NW] si dị, ka o wee [nwee ike] ịdụsi ọdụ ike n’ime ozizi nke na-enye ezi ndụ, na ịtụkwa ndị na-ekwugide ekwugide mmehie ha n’anya.” (Taịtọs 1:9; tụlee Ọrụ 20:18-21, 26, 27.) Ọ ghaghị inwe ike ‘iji ịdị nwayọọ na-adọ ndị doro onwe ha imegide ya aka ná ntị.’ (2 Timoti 2:23-26) Ọbụna ma a sị na onye okenye abụghị onyeọkà okwu ihu ọha kasị mma e nwere n’ọgbakọ, o kwesịrị ịbụ onye na-amụ Okwu Chineke nke ọma nke na o nwere nkà zuru ezu iji zie ndị kwere ekwe ihe, nyekwa ha ndụmọdụ, bụ́ ndị na-amụkwa Bible. (2 Ndị Kọrint 11:6) Ọ ghaghị ịbụ onye ruru eru ikenye ndị ọzọ “ozizi na-enye ezi ndụ,” bụ́ nke na-enyere ezinụlọ na ndị mmadụ dị iche iche aka ibi ndụ nsọpụrụ Chineke.—Taịtọs 2:1-10.
21. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na onye okenye abụghị onye na-eti mmadụ aka? (b) Gịnị ka ọ pụtara ịbụ onye nwere ezi uche? (c) Gịnị ka ịbụ onye na-adịghị alụ ọgụ pụtara?
21 Onye na-adịghị eti mmadụ aka, kama bụrụ onye nwere ezi uche, onye na-adịghị alụ ọgụ. (1 Timoti 3:3; Taịtọs 1:7) Ebe ọ bụ onye na-achọ udo, onye okenye adịghị eti ndị mmadụ ihe n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ na-etipụta ha ọnyá site n’ikwu okwu mkparị ma ọ bụ nke na-akpasu iwe. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 11:20.) (Okwu bu ya ụzọ nke bụ na ọ bụ “onye na-adịghị ese okwu n’ihi ịṅụbiga mmanya ókè” gosiri na ọ na-ezere ịṅụbiga mmanya ókè, bụ́ nke na-edujekarị n’esemokwu.) N’ịbụ ‘onye nwere ezi uche’ (ma ọ bụ “ikwenyere ndị ọzọ”), ọ bụghị o kwusịa o bie na onye ọ na-esi ike ime ihe ga-amasị ya, ọ naghị eme ka ụmụ obere okwu ghọọ oké ihe. (1 Ndị Kọrint 9:12; Ndị Filipaị 4:5; 1 Pita 2:18) Ebe onye okenye na-adịghị alụ ọgụ, ma ọ bụ na-ese okwu, ọ na-ezere esemokwu, ‘gharakwa ịdị na-ewe iwe ọsọ ọsọ.’—Taịtọs 3:2; Jemes 1: 19, 20.
22. Gịnị ka eziokwu ahụ pụtara nke bụ na onye okenye agaghị abụ onye isi ike?
22 Onye na-abụghị onye isi ike. (Taịtọs 1:7) N’ụzọ nkịtị, nke a pụtara “onye na-adịghị eme ihe na-atọ onwe ya ụtọ.” (Tụlee 2 Pita 2:10.) Onye okenye ekwesịghị ịbụ o kwusịa ọ gwụ, kama o kwesịrị iji obi dị umeala na-ele ikike ndị o nwere anya. N’ịghara iche na ya na-eme ihe nke ọma karịa onye ọ bụla ọzọ, ọ na-eji obi dị umeala soro ndị ọzọ na-ekerịta ibu ọrụ, ọ na-ejikwa ìgwè ndị ndụmọdụ kpọrọ ihe.—Ọnụ Ọgụgụ 11:26-29; Ilu 11:14; Ndị Rom 12:3, 16.
23. (a) Olee ụzọ ị ga-esi kọwaa “onye na-ahụ ezi ihe n’anya”? (b) Gịnị ka ịbụ onye ezi omume pụtara?
23 Onye na-ahụ ezi ihe n’anya; onye ezi omume. (Taịtọs 1:8) Iji wee ruo eru dị ka onye okenye, mmadụ aghaghị ịhụ ezi ihe n’anya, bụrụkwa onye ezi omume. Onye na-ahụ ezi ihe n’anya na-ahụ ihe Jehova weere dị ka ihe ziri ezi n’anya, na-arụ ọrụ obi ọma nke na-enyere ndị ọzọ aka, na-egosikwa obi ekele maka ịdị mma nke ndị ọzọ. (Luk 6:35; tụlee Ọrụ 9:36, 39; 1 Timoti 5: 9, 10.) Ịbụ onye ezi omume pụtara ime ihe kwekọrọ n’iwu na ụkpụrụ nile nke Chineke. Gụnyere ihe ndị ọzọ, onye dị otú ahụ adịghị ele mmadụ anya n’ihu, ọ na-edebekwa ihe ezi omume, ihe ndị dị ọcha, na ihe ndị ziri ezi n’uche ya mgbe nile. (Luk 1:6; Ndị Filipaị 4:8, 9; Jemes 2:1-9) Ebe ọ bụ na ịdị mma dị iche n’ịbụ onye ezi omume n’ihi na ọ na-agabiga ihe ikpe ziri ezi chọrọ mmadụ n’aka, onye hụrụ ezi ihe n’anya na-emere ndị ọzọ ihe karịrị otú a tụrụ anya n’aka ya.—Matiu 20:4, 13-15; Ndị Rom 5:7.
24. Gịnị ka ịbụ onye na-eguzosi ike n’ihe chọrọ n’aka mmadụ?
24 Onye na-eguzosi ike n’ihe. (Taịtọs 1:8, NW) Nwoke nke ruru eru ịbụ onye okenye na-anọgidesi ike ná nraranye a na-apụghị imebi emebi nye Chineke, rapagidesiekwa ike n’iwu Chineke, n’agbanyeghị otú e si tinye nguzo o guzosiri ike n’ezi ihe n’ule. Ọ na-eme ihe Jehova tụrụ anya n’aka ya, nke a gụnyekwara ije ozi dị ka onye mkpọsa alaeze nke kwesịrị ntụkwasị obi.—Matiu 24:14; Luk 1:74, 75; Ọrụ 5:29; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:10.
Iru Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀ Ndị ahụ
25. Olee ndị a chọrọ iru eru ndị a tụlesịrị ugbu a n’aka ha, oleekwa ụzo a pụrụ isi ruo ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ahụ?
25 Ihe ka ọtụtụ n’iru eru ndị a tụlesịrị ugbu a metụtara ihe ndị a tụrụ anya ha n’aka Onyeàmà Jehova ọ bụla, onye ọ bụla pụkwara inweta ha site n’ịmụ ihe, itinye mgbalị, inwe ezi mkpakọrịta, na ekpere. Ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ ime nke ọma n’iru eru ụfọdụ karịa ná ndị ọzọ. Ma, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ezi uche dị na ya, ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye aghaghị iru ihe nile a chọrọ ha n’aka maka ihe ùgwù ha dị iche iche.
26. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst bụ ndị ikom na-eji ewepụta onwe ha maka ibu ọrụ dị n’ọgbakọ?
26 Ndịàmà Jehova nile kwesịrị ịchọ ime ihe nile ha nwere ike ime n’ijere Chineke ozi. Mmụọ nke a na-akpali ndị Kraịst bụ ndị ikom ka ha wepụta onwe ha maka ibu ọrụ dị n’ọgbakọ. Ị̀ bụ nwoke nke raraworo onwe gị nye, meekwa baptism? Ya bụrụ otú ahụ, wepụta onwe gị, meekwa mgbalị nile ị pụrụ ime iji ruo eru ije ozi!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a “Leekwa Ụlọ Nche, September 15, 1983, peji 29, n’okpuru isiokwu nta bụ “Ịgba Alụkwaghịm nke Akwụkwọ Nsọ Kwadoro.”
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dịrị oké mkpa ugbu a ka ndị ikom meworo baptism nara ibu ọrụ ọgbakọ?
◻ Gịnị bụ iru eru ụfọdụ ndị ohu na-eje ozi na-aghaghị inwe?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ iru eru ndị okenye na-aghaghị inwe?
◻ N’ihi gịnị ka onye okenye na-aghaghị ịma otú ọ ga-achị ezinụlọ ya nke ọma?
◻ Gịnị na-akpali ndị ikom bụ ndị Kraịst iwepụta onwe ha maka ibu ọrụ dị n’ọgbakọ?
[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]
Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịchị ezinụlọ ha n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible