Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • od isi 6 p. 53-58
  • Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ Ọrụ Bara Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ Ọrụ Bara Uru
  • Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE A CHỌRỌ N’AKA NDỊ GA-ABỤ OHU NA-EJE OZI
  • ỌRỤ HA NA-ARỤ N’ỌGBAKỌ
  • Olee Ọrụ Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Ịnọgide Na-enwe Nkwekọrịta n’Etiti Ndị Okenye na Ndị Ohu Na-eje Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-eje Ozi Bara Uru
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Ndị Okenye—Zụọnụ Ndị Ọzọ Ibu Ibu Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
od isi 6 p. 53-58

ISI NKE 6

Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ Ọrụ Bara Uru

PỌL onyeozi degaara ọgbakọ nọ na Filipaị akwụkwọ ozi, sị: “Pọl na Timoti, ndị ohu Kraịst Jizọs, na-edetara unu ndị nsọ niile ha na Kraịst Jizọs dị n’otu bụ́ ndị nọ na Filipaị akwụkwọ, tinyere ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi.” (Fil. 1:1) Ị̀ hụrụ n’ebe a na Pọl kelere ndị ohu na-eje ozi? O doro anya na ụmụnna ndị a nyeere ndị okenye ezigbo aka n’ọgbakọ n’oge ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ndị ohu na-eje ozi na-arụ ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ iji nyere ndị okenye aka. Ọrụ ndị a ha na-arụ na-emekwa ka ihe na-aga aga n’ọgbakọ.

2 Ị̀ ma ndị ohu na-eje ozi nọ n’ọgbakọ unu? Ị̀ ma ọrụ ndị ha na-arụ nke na-abara ma gị ma ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ unu uru? Obi na-atọ Jehova ụtọ maka ọrụ ndị ha na-arụ n’ọgbakọ. Pọl kwuru, sị: “Ndị na-eje ozi nke ọma na-emere onwe ha aha ọma, ha nwekwara nkwuwa okwu dị ukwuu n’okwukwe e nwere n’ime Kraịst Jizọs.”​—1 Tim. 3:13.

IHE A CHỌRỌ N’AKA NDỊ GA-ABỤ OHU NA-EJE OZI

3 Ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịbụ ndị na-akpa àgwà e ji mara Ndị Kraịst. Ha kwesịkwara ịbụ ndị a ga-atụkwasị obi na ndị ji ọrụ ha kpọrọ ihe. Ihe gosiri na ọ bụ ihe ha kwesịrị ịna-eme bụ ihe Pọl gwara Timoti gbasara ndị ruru eru ịbụ ohu na-eje ozi. O kwuru, sị: “Ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịbụ ndị na-eji ihe akpọrọ ihe, ọ bụghị ndị ire abụọ, ọ bụghị ndị na-aṅụ oké mmanya, ọ bụghị ndị na-eji anyaukwu achọ inweta uru aghụghọ, onye ji akọ na uche dị ọcha jidesie ihe nzuzo dị nsọ banyere okwukwe ahụ ike. Ka e bukwa ụzọ nwalee ndị a ka a mata ma hà ruru eru, ka ha jeekwa ozi dị ka ndị ozi, ebe ha bụ ndị a na-adịghị ebo ebubo. Ka ndị ohu na-eje ozi bụrụ di nke otu nwunye, ndị na-elekọta ụmụ ha na ezinụlọ ha nke ọma.” (1 Tim. 3:​8-10, 12) Ọ bụrụ na ndị okenye agbakwasị ụkwụ n’ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru tụlee ma nwanna ò ruru eru ịbụ ohu na-eje ozi, ọ ga-eme ka ndị mmadụ ghara ikwu okwu ọjọọ banyere ndị a na-ahọpụta ka ha bụrụ ndị ohu na-eje ozi.

4 Ndị ohu na-eje ozi na-aga ozi ọma n’ọnwa ọ bụla, ma hà ka bụ ụmụ okorobịa ma hà akatala ahụ́. Ha ji ozi ọma kpọrọ ihe dị ka Jizọs. Ha na-esi otú ahụ egosi na ha chọrọ ka a zọpụta ụmụ mmadụ dị ka Jehova chọrọ.​—Aịza. 9:7.

5 Ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịna-eji ejiji dị mma, na-akpakwa àgwà ọma. Ha kwesịkwara ịna-ekwu okwu ọma mgbe niile. Ha nwere uche zuru okè. Ọ bụ ya mere ụmụnna ndị ọzọ ji na-akwanyere ha ùgwù. Ihe ọzọkwa bụ na ha anaghị eji adịm ná mma ha na Jehova egwu egwu. Ha ji ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ kpọrọ ihe.​—Taị. 2:​2, 6-8.

6 Tupu a họpụta ha, e bu ụzọ ‘nwalee ha ka a mata ma hà ruru eru.’ A chọpụtara na ha ji ọrụ e nyere ha kpọrọ ihe. A chọpụtakwara na ha na-ebute ihe ndị gbasara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ha nakwa na ha na-agba mbọ ka ha ruo eruo ịrụ ọrụ ọ bụla e nwere ike inye ha ná nzukọ Jehova. Ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-amụtakwa ihe bara uru n’aka ha.​—1 Tim. 3:10.

ỌRỤ HA NA-ARỤ N’ỌGBAKỌ

7 Ndị ohu na-eje ozi na-arụrụ ụmụnna ha ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ. Ọrụ ndị a ha na-arụ na-eme ka ndị okenye jirikwuo oge ha nwere na-akụzi ihe n’ọgbakọ ma na-elekọta atụrụ Chineke. Ndị okenye chọọ ikenye ha ọrụ ha ga na-arụ n’ọgbakọ, ha na-eleba anya n’ihe onye ọ bụla n’ime ha ga-emeli nakwa ọrụ ndị e nwere n’ọgbakọ.

Ndị ohu na-eje ozi na-arụ ọrụ dị iche iche bara uru n’ọgbakọ, ya emee ka ndị okenye jirikwuo oge ha na-akụzi ihe n’ọgbakọ ma na-elekọta atụrụ Chineke

8 E nwere ike ịgwa otu ohu na-eje ozi ka ọ na-ahụ maka akwụkwọ ka ụmụnna nwee ike ịna-enweta akwụkwọ ha ga-agụ na nke ha ga-eji na-aga ozi ọma. E nwekwara ike ịgwa ohu na-eje ozi ọzọ ka ọ na-ahụ maka ihe ndekọ ego ọgbakọ ma ọ bụ maka ókèala ọgbakọ. Ụfọdụ na-ahụ maka maịkrofon na ígwè okwu. Ndị ọzọ bụ ndị atendantị. E nwekwara ndị nke na-enyere ndị okenye aka n’ihe ndị ọzọ. Ịrụzi Ụlọ Nzukọ Alaeze na idebe ya ọcha abụghị obere ọrụ. N’ihi ya, a na-akpọkarị ndị ohu na-eje ozi ka ha nye aka n’ọrụ ndị a.

9 N’ọgbakọ ụfọdụ, a na-ekenye ndị ohu na-eje ozi ọrụ ndị ahụ otu otu. Ma a bịa n’ọgbakọ ndị ọzọ, otu ohu na-eje ozi nwere ike ịna-arụ ọrụ dị iche iche. Mgbe ụfọdụkwa, e nwere ike ikenye ndị ohu na-eje ozi abụọ otu ọrụ. Ọ bụrụ na ndị ohu na-eje ozi ebughị ibu, ndị okenye nwere ike ịgwa ụmụnna nwoke ndị ọzọ na-eme nke ọma ka ha rụwa ọrụ ndị a. Ka ha na-arụ ọrụ ndị ahụ, ọ ga na-edokwu ha anya. Ha mechaa bụrụ ndị ohu na-eje ozi, ịrụ ọrụ ndị ahụ ga-adịrị ha ezigbo mfe. Ọ bụrụ na e nweghị ụmụnna nwoke ruru eru, e nwere ike ịgwa otu nwanna nwaanyị na-eme nke ọma n’ọgbakọ ka ọ na-arụ ụfọdụ ọrụ ndị ahụ, n’agbanyeghị na a gaghị ahọpụta ya ka ọ bụrụ ohu na-eje ozi. A sị na mmadụ na-eme nke ọma n’ọgbakọ, ọ pụtara na onye ahụ na-akpa àgwà ọma, na-efekwa Chineke nke ọma nke na ndị ọzọ kwesịrị ịna-eme ka ya. Onye dị otú ahụ na-abịachi ọmụmụ ihe anya, na-agachi ozi ọma anya, na-eji ihe ndị dị mma atụrụ ndụ ma na-eji ejiji dị mma. Ezinụlọ ya ga na-emekwa nke ọma. Ọ ga-abụ onye e ji ama atụ n’ihe ndị a niile.

10 N’ọgbakọ e nwere naanị ndị okenye ole na ole, e nwere ike ịgwa ndị ohu na-eje ozi ruru eru ka ha na ndị chọrọ ime baptizim tụlee ajụjụ ndị gbasara ihe Baịbụl na-akụzi. Ajụjụ ndị a dị n’Isiokwu Ndị Ọzọ, “Nkebi nke Mbụ: Ihe Ndị Kraịst Kweere.” Ọ bụ okenye kwesịrị iduzi “Nkebi nke Abụọ: Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ” n’ihi na ihe dị na ya bụ ihe mmadụ na-anaghị achọ ịkọrọ ndị ọzọ banyere onwe ya.

11 Ndị okenye nwere ike ha nọtụ, ha enye otu ohu na-eje ozi ọrụ ọzọ, were nke ọ na-arụbu nye ohu na-eje ozi ọzọ. Ma, ọ na-akacha mma ma a hapụ ha ka ha nọtee aka n’ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ, n’ihi na ọ ga-eme ka ha bụrụ aka ochie na ya.

12 E nwere ike inye ndị ohu na-eje ozi a ma na ha na-enwe ọganihu ọrụ ụfọdụ ndị okenye kwesịrị ịrụ. (1 Tim. 4:15) Ọ bụrụ na ndị okenye ebughị ibu, e nwere ike ịgwa ohu na-eje ozi ka ọ na-enyere onye nlekọta ìgwè aka ma ọ bụkwanụ ka ọ bụrụ ohu na-ahụ maka ìgwè. Ma, ọ bụ ndị okenye ga-ekpebi ihe ohu na-ahụ maka ìgwè ga na-eme. E nwere ike inye ndị ohu na-eje ozi ihe omume ụfọdụ n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, nakwa iduzi Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ ma ọ dị mkpa. E nwekwara ike ikenye ha okwu ihu ọha, nyekwa ha ọrụ ndị ọzọ mgbe ọ bụla ọ dị mkpa nakwa ma ọ bụrụ na ha ruru eru ịrụ ha. (1 Pita 4:10) Ndị ohu na-eje ozi kwesịrị iji obi ha niile na-enyere ndị okenye aka.

13 Ọ bụ eziokwu na ihe ha na-arụ dị iche n’ihe ndị okenye na-arụ, ha niile bụcha ozi dị nsọ a na-ejere Chineke. Ha niile dịcha mkpa n’ihi na ha na-eme ka ihe na-aga aga n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ndị ohu na-eje ozi ana-arụ ọrụ ha nke ọma, mechaakwa ruo eruo ịzụ atụrụ Chineke na ịkụzi ihe nke ọma, e nwere ike ịtụ aro ka a họpụta ha ịbụ ndị okenye.

14 Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke na-eto eto ma ọ bụ na ị ka mere baptizim ọhụrụ, ị̀ na-agba mbọ ka i ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi? (1 Tim. 3:1) Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ kwa afọ, a chọrọ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ga na-arụ ọrụ n’ọgbakọ. I nwere ike ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ inyere ndị ọzọ aka. Otu ihe ga-enyere gị aka bụ ichebara ihe Jizọs mere echiche. (Mat. 20:28; Jọn 4:​6, 7; 13:​4, 5) Ọ bụrụ na ị na-emere ndị ọzọ ihe, obi ana-atọ gị ụtọ, ị ga-achọkwu ịna-emere ha ihe. (Ọrụ 20:35) N’ihi ya, jiri obi gị niile na-enyere ndị ọzọ aka, na-enye aka eme ka Ụlọ Nzukọ Alaeze na-adị mma n’anya, na-ewepụtakwa onwe gị eme ihe omume n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ mgbe onye e kenyere ya na-abịaghị. Ihe ọzọ ga-eme ka i ruo eruo bụ inwe àgwà ndị e ji mara onye nwere mmụọ nsọ Chineke. Ihe ga-enyere gị aka inwe àgwà ndị a bụ iwepụta oge na-amụ Baịbụl n’onwe gị. (Ọma 1:​1, 2; Gal. 5:​22, 23) Ihe ọzọ e ji ama nwanna nwoke chọrọ ịbụ ohu na-eje ozi bụ na ọ ga na-eji ọrụ e nyere ya n’ọgbakọ kpọrọ ihe.​—1 Kọr. 4:2.

15 Chineke na-eji mmụọ nsọ ya ahọpụta ndị ohu na-eje ozi ka ha na-ejere ọgbakọ ozi. Ụmụnna niile nọ n’ọgbakọ ga-egosi na obi dị ha ụtọ maka otú ndị ohu na-eje ozi si arụsi ọrụ ike ma ọ bụrụ na ha ana-eme ihe ndị ohu na-eje ozi gwara ha. Ha ga-esi otú ahụ gosi na obi dị ha ụtọ maka otú Jehova si hazie ka ihe na-aga n’usoro ná nzukọ ya.​—Gal. 6:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya