Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/99 p. 4
  • Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-eje Ozi Bara Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-eje Ozi Bara Uru
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ Ọrụ Bara Uru
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Olee Ọrụ Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Ịnọgide Na-enwe Nkwekọrịta n’Etiti Ndị Okenye na Ndị Ohu Na-eje Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndị Okenye—Zụọnụ Ndị Ọzọ Ibu Ibu Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 3/99 p. 4

Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-eje Ozi Bara Uru

1 “Ha egosipụtawo onwe ha ịbụ ndị ikom raara onwe ha nye n’ezie ndị e meworo ka okwukwe ha pụta ìhè n’ozi ịnụ ọkụ n’obi nke Alaeze na n’inyere ndị ọzọ aka ịnọsi ike n’okwukwe.” Nke ahụ bụ ihe Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị kwuru na peji nke 57, banyere ndị ohu na-eje ozi. N’ezie, ihe nlereanya ime mmụọ ndị ohu na-eje ozi anyị na-esetịpụ kwesịrị nṅomi. Isoro ha na ndị okenye na-arụkọ ọrụ na-eme ka “ahụ nile ahụ . . . baa ụba iwuli onwe ya elu dị ka ụlọ n’ime ịhụnanya.”—Efe. 4:16.

2 Ndị ohu na-eje ozi na-arụ ọrụ dị mkpa n’ọgbakọ. Cheedị echiche banyere ozi nile bara uru ha na-eje! Ha na-elekọta ihe ndekọ ego, akwụkwọ, magazin, ụtụ magazin, na ókèala; ha na-arụ ọrụ dị ka ndị atendantị; na-elekọta ígwè okwu; na-enyekwa aka ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha na-ekere òkè n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na ná Nzukọ Ije Ozi. Ụfọdụ n’ime ha pụrụ ọbụna ikwu okwu ihu ọha ma ọ bụ iduzi ụfọdụ n’ime nzukọ ọgbakọ. Dị ka akụkụ dị iche iche nke ahụ mmadụ, ndị ohu na-eje ozi na-eje ozi ndị dị anyị mkpa.—1 Kọr. 12:12-26.

3 Ịhụ ka ndị ohu na-eje ozi na-esoro ndị okenye na-arụkọ ọrụ ọnụ dị ka akụkụ nke òtù ndị na-eje ozi, na-akwanyerịtara ibe ha ùgwù, na-egosirịtakwa ibe ha nghọta, na-agba ndị ọzọ ume ime otú ahụ. (Kọl. 2:19) Site n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ ha site n’izu ruo n’izu na site n’igosi mmasị onwe onye n’ebe ndị ọzọ nọ, ha na-atụnye ụtụ n’ọgbakọ na-aga n’ihu n’ụzọ ime mmụọ.

4 Gịnị ka anyị pụrụ ime iji gosi ekele anyị maka ndị ohu na-eje ozi na-arụsi ọrụ ike? Ọ dị anyị mkpa ịmata ọrụ ndị e kenyere ha ma gosi ịdị njikere irube isi mgbe a chọrọ enyemaka anyị. Site n’okwu ma ọ bụ n’omume, anyị pụrụ ime ka ha mara na anyị nwere mmasị n’ọrụ ha. (Ilu 15:23) Ndị na-arụsi ọrụ ike maka ọdịmma anyị kwesịrị ka anyị kwanyere ha ùgwù site n’obi.—1 Tesa. 5:12, 13.

5 Okwu Chineke na-eme ka a mata ọrụ na iru eru nke ndị ohu na-eje ozi. (1 Tim. 3:8-10, 12, 13) Ozi dị nsọ, bara uru ha na-eje dị oké mkpa ka ọgbakọ wee na-arụ ọrụ. Ndị ikom dị otú ahụ kwesịrị ịnọgide na-enweta agbamume anyị, ka ha nile “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè.”—1 Kọr. 15:58.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya