Ị̀ Na-eme Mgbalị Iji Ruo Eru?
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eme mgbalị iji ruo eru ịbụ onye nlekọta, agụụ ọrụ ọma na-agụ ya.”—1 TIMOTI 3:1, NW.
1. Mmezu nke ebumnuche dị anaa dị mkpa karị n’etiti Ndịàmà Jehova?
NDỊÀMÀ JEHOVA nwere ebumnuche kwesịrị ekwesị ndị a na-eduzi, na-emezukwa n’ụzọ nke Chineke. Nke a abụghị ihe ijuanya, ebe ọ bụ na Chineke ha nwekwara ezi ebumnuche, ọ na-emezukwa nzube ya mgbe nile. (Aịsaịa 55:8-11) Ndị ohu Jehova ekwesịghị ịdị ka ndị ahụ na-enweghị ezi ebumnuche, na-adịkwa nnọọ ndụ n’emeghị oké ihe ọ bụla nke ga-abara onye ọ bụla ọzọ uru ma e wezụga onwe ha. Ịhe kasị Ndịàmà Chineke mkpa bụ imezu ezi ebumnuche ahụ nke ịkpọsa ozi Alaeze ahụ na iso ndị ọzọ kerịta ihe ọmụma ahụ na-enye ndụ nke dị n’Okwu Chineke.—Abụ Ọma 119:105; Mak 13:10; Jọn 17:3.
2. Ebumnuche dị aṅaa nke dịịrị ndị ikom bụ ndị Kraịst ka Pọl kpọtụrụ uche na 1 Timoti 3:1?
2 Ná nzukọ Jehova, e nwekwara ezi ebumnuche ndị ọzọ. Pọl onyeozi zoro aka n’ebe otu n’ime ndị a dị mgbe o dere, sị: “Okwu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eme mgbalị iji ruo eru ịbụ onye nlekọta, agụụ ọrụ ọma na-agụ ya.” Mmadụ dị otú ahụ na-achọ imezu ihe nke ga-abara ndị ọzọ uru. O nwere agụụ maka “ọru ọma,” ọ bụghị ndụ nke ntụsara ahụ na nke inweta otuto. Nsụgharị ọzọ na-asị: “Ọ bụ nnọọ eziokwu ikwu na mmadụ nke tụkwasịrị obi ya n’idu ndú nwere ọchịchọ e kwesịrị ịja mma.”—1 Timoti 3:1, Phillips.
Ihe Ize Ndụ nye Ndị Okenye
3, 4. N’ihi gịnị ka nwoke nke na-eme mgbalị iji ruo eru ịbụ onye nlekọta kwesịrị iji chee obi ya nche?
3 N’ụzọ dị aṅaa ka mmadụ nke tụkwasịrị obi ya n’ịbụ onye nlekọta ndị Kraịst si nwee “ọchịchọ e kwesịrị ịja mma”? Ee, ọchịchọ bụ agụụ siri ike imezu otu ihe e bu n’uche. N’eziokwu, e nwere ọchịchọ ndị dị mma, nweekwa ndị e kwesịrị ilefuru anya. Ma, ọ bụrụ na mmadụ ejiri obi umeala mee mgbalị iru eru ịbụ onye nlekọta n’ihi na ọ chọrọ ijere ndị ọzọ ozi, ọ na-eje ozi ya site n’ezi nzube, ọ pụkwara ịrụpụtara ya ngọzi ime mmụọ. Ma ọ dị mkpa ka o chee obi ya nche.—Ilu 4:23.
4 Ụfọdụ ndị nwere oké ọchịchọ na-achọ inweta otuto. Ndị ọzọ na-achọ ịchị ndị mmadụ ibe ha. Inwe oké ọchịchọ maka ịbụ onye a ma ama na ike yiri mkpọrọgwụ rere ure nke pụrụ ime ka ọbụna osisi nke yiri ka ọ̀ dị ndụ daruo ala. Onye Kraịst pụkwara ịdaba n’ọchịchọ dị otú ahụ nke na-enweghị ezi ihe kpaliri ya. (Ilu 16:18) Jọn onyeozi kwuru, sị, “Edegaara m nzukọ unu ihe n’akwụkwọ: ma Diọtrefis, onye ọ na-atọ ụtọ ịbụ onyeisi n’etiti ha [“onye na-achọ ịbụ isi n’ihe nile,” Phillips], anaraghị anyị nke ọma. N’ihi nke a, ọ bụrụ na abịa m, m ga-eme ka e cheta ọrụ ya nile nke ọ na-arụ, n’iwere ajọ okwu na-ekwugide anyị ihe nzuzu: afọ ejughịkwa ya n’ihe ahụ, ma ya onwe ya adịghị anara ụmụnna anyị nke ọma, ọ na-egbochikwa ndị na-ezube ịnara ha, ọ na-achụpụkwa ha ná nzukọ Kraịst.” (3 Jọn 9, 10) Ọchịchọ nke Diọtrefis abụghị nke ndị Kraịst. Ime mpako na iji oké ọchịchọ na-achụso inweta ike n’ahụ ndị ọzọ enweghị ọnọdụ ọ bụla n’etiti ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs.—Ilu 21:4.
5. Àgwà di aṅaa ka ndị nlekọta kwesịrị iji na-elekọta ọrụ ha dị iche iche?
5 Onye Kraịst bụ onye nlekọta nke ji nzube ziri ezi na-elekọta ọrụ ya agaghị achụso ọchịchọ onwe onye. Ọ ga-ele ọrụ ọma nke a nke ịbụ onye nlekọta ndị Kraịst anya dị ka ihe ùgwù Chineke nyere ya, ọ ga-azụkwa ìgwè atụrụ Chineke, “ọ bụghị n’ihi na mkpa na-akpa [ya], kama site n’ọchịchọ obi, dị ka Chineke chọrọ; ọ bụghịkwa n’ihi uru na-eweta ihere, kama n’ihi na [ọ] dị ọkụ n’obi; ọ bụghịkwa dị ka à ga-asị na [ọ] na-eme ndị bụ ihe nketa dị ka [ọ̀] bụ [onyenwe] ha, kama na-eme onwe [ya] ihe atụ ìgwè atụrụ . . . ahụ ga-eṅomi.” (1 Pita 5:2, 3) Ee, ndị nlekọta kwesịrị ịnọ na nche megide iwulite mpako na ịchọ iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.
6. N’ihi gini ka onye okenye na-ekwesịghị iji mee dị ka à ga-asị na ọ bụ ya nwe ndị Chineke?
6 Onye okenye ekwesịghị ime dị ka à ga-asị na ọ bụ ya nwe ndị Kraịst ndị ọzọ, n’ihi na ọ bụ onye ọrụ ibe ha, ọ bụghị ‘onyenwe okwukwe ha.’ (2 Ndị Kọrint 1:24) Mgbe ụfọdụ n’ime ndị ozi ahụ chọrọ ọnọdụ nke ịbụ ndị a ma ama, Jisọs sịrị: “Unu amatawo na ndị bụ isi nke mba nile ọzọ na-eme ha dị ka ndị nwe ha: ndị ukwu ha na-achịkwa ha. Ọ bụghị otú a ka ọ ga-adị n’etiti unu: kama onye ọ bụla nke na-achọ ka e mee ya onye ukwu n’etiti unu, ọ ga-abụ onye na-ejere unu ozi; ọzọ, onye ọ bụla nke na-achọ ka ọ bụrụ onyeisi n’etiti unu, ọ ga-abụ ohu unu: dị ka Nwa nke mmadụ na-abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:20-28) Onye okenye abụghị Onye Ọzụzụ Atụrụ Bụ Isi kama ọ bụ nanị onye ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru. Ọ bụrụ na o mee dị ka à ga-asị na ọ bụ ya nwe ìgwè atụrụ ahụ, ọ na-egosipụta mmụọ nke mpako. Mmerụahụ ga-esi na ya pụta karịsịa ma ọ bụrụ na ọ rara ndị ọzọ gaa n’inyekwuru ya aka n’imezu ọchịchọ mpako ya. Otu ilu kwuru, sị: “Ihe arụ n’anya Jehova ka onye ọ bụla bụ nke obi ya dị elu: site n’aka ruo n’aka, a gaghị agụ ya n’onye na-emeghị ihe ọjọọ.”—Ilu 16:5.
7, 8. (a) N’ihi gini ka o ji di mkpa ka ndị Kraist bụ okenye nwee obi umeala? (b) Nye ihe atụ nke onye okenye dị umeala n’obi.
7 Ya mere, ndị okenye bụ ndị Kraịst aghaghị ‘ido onwe ha n’okpuru aka dị ike nke Chineke.’ Mpako na-anọchi n’ụzọ nke mmadụ ịba uru ime mmụọ, n’ihi na ọ bụ nanị ndị dị umeala n’obi nọ n’ọnọdụ obi na uche kwesịrị ekwesị ime uche Chineke. “Chineke na-edo onwe ya imegide ndị mpako, ma ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.” (1 Pita 5:5, 6) Ee, Jehova na-agọzi ndị nwere uche dị ala. Ọ bụ n’etiti ndị a ka a na-esi ahọpụta ndị ikom ruru eru ije ozi dị ka ndị okenye ndị Kraịst.
8 Akụkọ ihe mere eme nke oge a nke Ndịàmà Jehova jupụtara n’akụkọ banyere ije ozi obi umeala nke ndị na-atụ egwu Chineke. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere W. J. Thorn, bụ́ onye nwere omume dị nwayọọ, onye bụbu onye pilgrim, ma ọ bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụrụkwa onye rụworo ọrụ na Betel ruo ogologo oge. Banyere ya, otu onye Kraịst sịrị: “Apụghị m nnọọ ichefu otu okwu Nwanna Thorn kwuru nke nyewooro m aka ruo taa. Ọ sịrị, nke a bụkwa kpọmkwem ihe o kwuru, ‘Mgbe ọ bụla m malitere ichebiga echiche ókè banyere onwe m, ana m akpọrọ onwe m gaa n’otu akụkụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, wee sị: “Leenụ gị, nwa ahụhụ nta. Gịnị ka i nwere ị ga-eji na-anya isi?’”” Lee nnọọ àgwà mara mma nke a bụụrụ ndị okenye na ndị ọzọ igosipụta! Cheta na “ọ̀kpụ́kpụ́ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ, na nsọpụrụ, na ndụ.”—Ilu 22:4.
Ọchịchọ ahụ Chineke Nyere maka Ije Ozi
9. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọchịchọ nke ije ozi bụ onyinye sitere n’aka Chineke?
9 Ọchịchọ nke ije ozi dị ka onye nlekọta bụ onyinye si n’aka Chineke? Ee, n’ihi na ọ bụ mmụọ Jehova na-enye mkpali, obi ike, na ike iji jeere ya ozi dị nsọ. Dị ka ihe atụ, gịnị mere mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs ndị a na-esogbu kpere ekpere ka ha nwee nkwuwa okwu iji kwusaa ozi ọma? “E wee mee ka ebe ha nọ ná nzukọ mee mkpatụ; ha nile wee jupụta ná mmụọ nsọ, wee were nkwuwa okwu na-ekwu okwu Chineke.” (Ọrụ 4:27-31) Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ rụpụtara ihe dị otú ahụ, ọ pụkwara ịkpali mmadụ ime mgbalị iru eru.
10. (a) Gịnị bụ otu ihe ọ pụrụ ịbụ ya mere na nwoke onye Kraịst adịghị eme mgbalị iji ruo eru? (b) Ọ bụrụ na Chineke ekwere ka ihe ùgwù ije ozi rute anyị aka, gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka?
10 N’ihi gịnị ka onye Kraịst tozuworo okè pụrụ iji ghara ịdị na-eme mgbalị iji ruo eruo? Ọ pụrụ ịbụ onye mmụọ nsọ na-achị ma na-enwe mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru. (1 Ndị Kọrint 2:14, 15) N’eziokwu, anyị kwesịrị ile onwe anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, na-amara ikpa ókè nile anyị nwere. (Maịka 6:8) Kama iji mpako na-eche na anyị bụ ndị kasị ruo eru maka otu ibu ọrụ, ọ dị mma icheta na “n’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị.” (Ilu 11:2) Kama anyị kwesịkwara icheta na ọ bụrụ na Chineke ekwere ka ihe ùgwù ije ozi ụfọdụ rute anyị aka, ọ ga-enye anyị ike dị mkpa iji rụzuo ya. Dị ka Pọl kwuru: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime onye ahụ nke na-eme m ka m dị ike.”—Ndị Filipaị 4:13.
11. Gịnị ka onye Kraịst nke na-adịghị eme mgbalị iji ruo eru n’ihi na o chere na ya enweghị amamihe zuru ezu iji nye ndụmọdụ pụrụ ime?
11 Ọ pụrụ ịbụ na onye Kraịst adịghị eme mgbalị iji ruo eru n’ihi na o chere na ya enweghị amamihe zuru ezu iji nye ndụmọdụ. Ma eleghị anya ọ pụrụ inwetakwu amamihe site n’ịmụ Okwu Chineke nke ọma karị, o kwesịkwara ikpe ekpere maka amamihe. Jemes dere, sị: “Ma ọ bụrụ na amamihe fọdụụrụ onye ọ bụla n’ime unu inwe, ya rịọ n’aka Chineke, onye na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo, n’ataghịkwa ụta; a ga-ewerekwa ya nye ya. Ma ya rịọ n’okwukwe, ghara inwe obi abụọ: n’ihi na onye nwere obi abụọ yiri ebili mmiri nke oké osimiri mgbe ifufe na-efegharị ya, na-atụlikwa ya elu. N’ihi na, ka mmadụ ahụ ghara iche na ọ ga-anata ihe ọ bụla n’aka [Jehova, NW]; ọ bụ nwoke nwere uche abụọ, onye na-adịghị eguzo n’otu ebe n’ụzọ ya nile.” (Jemes 1:5-8) N’ịza ekpere ya, Chineke nyere Solomọn “obi maara ihe na nke na-aghọta ihe,” bụ́ nke mere ka o nwee ike ịmata ihe dị mma na ihe dị njọ mgbe ọ na-ekpe ikpe. (1 Ndị Eze 3:9-14) Ọnọdụ nke Solomọn pụrụ iche, ma site n’ịmụsi ihe ike na enyemaka Chineke, ndị ikom e nyere ibu ọrụ nke ọgbakọ ga-enwe ike inye ndị ọzọ ndụmọdụ n’ezi omume. “Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.”—Ilu 2:6.
12. Ọ bụrụ na, n’ihi nchegbu, mmadụ adịghị eme mgbalị iji ruo eru, gịnị pụrụ inyere ya aka?
12 Inwetụ nchegbu pụrụ ijila mmadụ azụ ime mgbalị iji ruo eru. Ọ pụrụ iche na ya agaghị enwe ike ibu ibu arọ ahụ nke ịbụ okenye. Ọbụna Pọl kwetara, sị: “Ihe ahụ dị nke na-anyịgbu m kwa ụbọchị, bụ́ nchegbu m na-echegbu onwe m banyere nzukọ Kraịst nile.” (2 Ndị Kọrint 11:28) Ma onyeozi ahụ maara ihe ọ ga-eme mgbe o nwere nchegbu, n’ihi na o dere, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ee, ekpere na ịtụkwasị Chineke obi pụrụ inye aka ibelata nchegbu.
13. Olee ụzọ mmadụ pụrụ isi kpee ekpere ma ọ bụrụ na ahụ eruchaghị ya ala banyere ime mgbalị iji ruo eru?
13 Ọ bụrụ na nchegbu anọgide, nwoke nke ahụ na-adịghị erucha ala ime mgbalị iji ruo eru pụrụ ikpe ekpere dị ka Devid kpere, sị: “Gwupụta ala obi m, Chineke, wee mara obi m: Na-anwa m, wee mara iche uche m nile: hụkwa ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu dị n’ime m, durukwa m n’ụzọ ebighị ebi.” (Abụ Ọma 139:23, 24) N’agbanyeghị ihe ọ bụ ya ‘na-eche anyị uche’ ma ọ bụ na-akpatara anyị “nchegbu,” Chineke pụrụ inyere anyị aka ịnagide ha ka anyị nwee ike inwe ọganihu ime mmụọ. (Lee The New International Version.) E dere ya nke ọma n’abụ ọma ọzọ: “Ọ bụrụ na asịwo m, e wezụgawo ụkwụ m n’ọnọdụ ya; ebere gị na-akwagide m, Jehova. Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi gị nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.”—Abụ Ọma 94:18, 19.
Jiri Obi Ụtọ Na-eje Ozi n’Ụzọ Jehova Chọrọ
14. N’ihi gịnị ka nwoke nke na-adịghị eme mgbalị iji ruo eru kwesịrị iji kpee ekpere maka mmụọ nsọ Chineke?
14 Ọ bụrụ na, n’ihi nchegbu, mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru, ma ọ hụ enweghị mkpali, nwoke bụ onye Kraịst aghara ime mgbalị iji ruo eru, ọ ga-ekwesị nnọọ ekwesị ikpe ekpere maka mmụọ Chineke. Jisọs sịrị: “Ya mere, ọ bụrụ na unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu jọrọ njọ, ma unu na-amata inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu nke eluigwe ga-esi aṅaa ghara iwere karị mmụọ nsọ nke ukwuu nye ndị na-ariọ ya?” (Luk 11:13) Ebe udo na imeru ihe n’ókè so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, mmụọ nke a pụrụ inyere anyị aka ịnagide nchegbu ma ọ bụ mmetụta nke ịbụ ndị na-erughị eru.—Ndị Galetia 5:22,23.
15. Ekpere ndị dị aṅaa pụrụ inyere ndị ahụ aka, bụ́ ndị na-enweghị ihe mkpali iwepụta onwe ha maka ihe ùgwù ije ozi dị iche iche?
15 Gịnị banyere enweghị mkpali? Dị ka ndị Kraịst meworo baptism, ọ dị mkpa ka anyị kpee ekpere ka Chineke mee ka anyị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. Devid rịọrọ, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ gị nile; . . . mee m ka m zọọ ije n’eziokwu gị, gị zikwa m ihe.” (Abụ Ọma 25:4, 5) Ekpere ndị dị otú a ga-enyere anyị aka izere ụzọ ọjọọ, anyị pụkwara ikpe ekpere n’ụzọ dị otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị adịghị enwe mkpali ime mgbalị iji ruo eru. Anyị pụrụ ịrịọ Jehova ka o mee ka anyị chọọ ịnakwere ihe ùgwù ije ozi dị iche iche. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka mmụọ Chineke, kwenyekwara nduzi ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị ga-ewepụta onwe anyị ma ọ bụrụ na e nye anyị ihe ùgwù ije ozi. E kwuwerị, ọ dịghị ụzọ ọ bụla ndị ohu Chineke ga-esi chọọ iguzogide mmụọ ya.—Ndị Efesọs 4:30.
16. Àgwà di aṅaa na-enye ihe mkpali siri ike maka ime mgbalị iji ruo eru maka ibu ọrụ dị n’ọgbakọ?
16 Ọ bụrụ na anyị enwee “uche nke Kraịst,” anyị ga-enweta ọṅụ n’ime uche Chineke. (1 Ndị Kọrint 2:16) Jisọs nwere otu ụdị àgwà onye ọbụ abụ ahụ nwere, onye sịrị: “Ime ihe dị gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke; iwu gị dịkwa n’ime obi m.” (Abụ Ọma 40:8) Kraịst sịrị: “Lee, abịawo m ime ihe ị na-achọ,” nke ahụ garukwara n’ịnwụ anwụ n’elu osisi ịta ahụhụ. (Ndị Hibru 10:9, 10) Ọchịchọ nke ime ihe nile mmadụ pụrụ ime n’ijere Jehova ozi na-enye ihe mkpali siri ike ime mgbalị iji ruo eru maka ibu ọrụ dị n’ọgbakọ.
Lepụ Anya n’Ọdịnihu
17. (a) N’ihi gịnị ka ndị ikom ndị na-adịghị eje ozi ụgbụ a n’ụzọ zuru ezu dị ka ha na-emebu na-ekwesịghị iji nwee nkụda aka? (b) Gịnị bụ ihe ùgwù kachasị ihe ùgwù nile elu?
17 N’ihi nsogbu ahụ ike ma ọ bụ ihe ndị ọzọ, ụfọdụ ndị jibu ọrụ dị mkpa n’ọgbakọ enwekwaghị ihe ùgwù ndị ahụ ugbu a. Ndị a ekwesịghị ịkụda aka. Anyị maara na ọtụtụ ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi ndị na-enwekwaghị ike ije ozi n’ụzọ zuru ezu dị ka ha jere n’oge gara aga ka nọ dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. (Abụ Ọma 25:21) N’eziokwu, ndị bụworo okenye ogologo oge, bụ́ ndị nwere obi umeala pụrụ ịnọgide jiri ahụmahụ ha na-enye aka site n’ịnọgide n’òtù ndị okenye. Ọ bụ ezie na ịbụ agadi ma ọ bụ ọnọdụ ahụ esighị ike pụrụ ime ka ha ghara imechakwa ihe otú ha na-emebu, ọ dịghị mkpa na ha ga-arịda n’ọkwá. Ka ọ dịgodị ugbu a, ka Onyeàmà Jehova ọ bụla jiri ya dị ka ihe oké ọnụ ahịa, bụ́ ihe ùgwù ahụ kachasị mma nke ‘ikwu okwu banyere ebube nke ọbụbụeze Chineke’ dị ka ndị na-akwado aha nsọ ya.—Abụ Ọma 145:10-13.
18. (a) Ọ bụrụ na e wepụwo okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, gịnị pụrụ ịdị mkpa? (b) Àgwà ọma dị aṅaa ka otu okenye e wepụrụ ewepụ gosipụtara?
18 Ọ bụrụ na ị bụbu okenye ọgbakọ ma ọ bụ ohu na-eje ozi ma ị bụkwaghị ya ugbu a, jide n’aka na Chineke ka nwere mmasị n’ebe ị nọ, ma eleghị anya o nwekwara ike inye gị ihe ùgwù ndị ị na-atụghị anya ha n’ọdịnihu. (1 Pita 5:6, 7) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka i mee mgbanwe ụfọdụ, dịrị njikere ịnakwere amaghị eme gị ma rụọ ọrụ na ya site n’enyemaka Chineke. Ụfọdụ ndị e wepụworo n’ịbụ ndị okenye amalitewo ịkpa àgwà na-abụghị nke ndị Kraịst, ole na ole akwụsịwokwa ịrụ ọrụ wee dapụ n’eziokwu ahụ. Ma, lee nnọọ ka o si bụrụ ihe amamihe ịdị ka ndị ahụ gosipụtaworo mmụọ dị mma! Dị ka ihe atụ, mgbe e wepụrụ otu okenye ọgbakọ nke jeworo ozi ruo ọtụtụ afọ na Central America, ọ sịrị: “Ọ na-ewute m nke ukwuu na ihe ùgwù nke m jiworo kpọrọ ihe nke ukwuu ruo ogologo oge funarịrị m. Ma m gaje ịrụsi ọrụ ike n’ụzọ ọ bụla ụmụnna chọrọ iji m mee ihe, rụọkwa ọrụ iji nwetaghachi ihe ùgwù ije ozi m.” Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, nwanna nwoke a nwetaghachiri ihe ùgwù nke ije ozi dị ka okenye ọgbakọ.
19. Ndụmọdụ dị anaa nke kwesịrị ekwesị ka a na-enye nwanna nwoke nke e wepụworo dị ka okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi?
19 Ya mere, ọ bụrụ na e wepụrụ gị dị ka okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, jigide mmụọ nke ịdị umeala n’obi. Zere àgwà nke na-egosi obi ilu nke ga-eme ka ị ghara iru eru inweta ihe ùgwù ndị ọzọ n’ọdịnihu. Àgwà nsọpụrụ Chineke na-eweta nsọpụrụ. Kama ịbụ onye a kụdara aka, tụgharịa uche n’ụzọ Jehova si na-agọzi ije ozi gị ma ọ bụ ezinụlọ gị. Wulite ezinụlọ gị n’ụzọ ime mmụọ, jee leta ndị na-arịa ọrịa, gbaakwa ndị dara mbà ume. Karịsịa ihe nile, jiri ihe ùgwù nke ito Chineke na ikwusa ozi ọma ahụ dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova kpọrọ ihe.—Abụ Ọma 145:1, 2; Aịsaịa 43: 10-12.
20. Olee otú òtù ndị okenye pụrụ isi nyere onye bụbu onye nlekọta ma ọ bụ ohu na-eje ozi aka?
20 Òtù ndị okenye kwesịrị ịghọta na iwepụ mmadụ pụrụ ịkpatara onye bụbu onye nlekọta ma ọ bụ ohu na-eje ozi nchekasị, ọbụna ma a sị na o ji aka ya hapụ ihe ùgwù ahụ. Ọ bụrụ na a chụghị ya achụ n’ọgbakọ, ma ndị okenye ahụta na ọ dara mbà n’obi, ha kwesịrị iji ịhụnanya nyere ya aka n’ụzọ ime mmụọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ha kwesịrị inyere ya aka ịghọta na ọ bụ onye dị mkpa n’ọgbakọ ahụ. Ọbụna ma a sị na ọ dịwo mkpa inye ya ndụmọdụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị ewecha ogologo oge tupu nwoke nke nwere obi umeala nke nwekwara obi ekele enweta ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ n’ọgbakọ.
21. Olee ndị cheere ihe ùgwù ije ozi dị iche iche, aro dịkwa aṅaa ka a na-atụrụ ndị ahụ na-echere ha taa?
21 Ọ bụrụ na ị na-eme mgbalị iji ruo eru, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i chere ruo ogologo oge ụfọdụ iji nwetakwuo ihe ùgwù ije ozi. Abụla onye na-enweghị ndidi. Mosis cheere ruo 40 afọ tupu Chineke ejiri ya mee ihe mgbe ọ na-anapụta ndị Israel n’agbụ ndị Ijipt. (Ọrụ 7:23-36) Tupu a họpụta ya dị ka onye ga-anọchi anya Mosis, Joshua nọrọ ogologo oge dị ka onye na-ejere ya ozi, (Ọpụpụ 33:11; Ọnụ Ọgụgụ 27:15-23) Devid cheere ruo ogologo oge ụfọdụ tupu e mee ka ọ nọkwasị n’ocheeze lsrael. (2 Samuel 2:7; 5:3) Ihe àmà gosiri na Pita na Jọn Mak gabigachara oge nnụcha dị iche iche. (Matiu 26:69-75; Jọn 21:15-19; Ọrụ 13:13; 15:36-41; Ndị Kọlọsi 4:10) Ya mere, ọ bụrụ na i nweghị ọrụ n’ọgbakọ ugbu a, ọ pụrụ ịbụ na Jehova na-eme ka a kpụzie gị site n’ikwe ka i nwetakwuo ahụmahụ. Otu o sina dị, na-achọ enyemaka Chineke mgbe ị nọ na-eme mgbalị iji ruo eru, ọ pụkwara ịgọzi gị site n’inyekwu gị ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ. Ka ọ dịgodị ugbu a, rụsie ọrụ ike iji ruo eru maka ibu ọrụ ndị dị n’ọgbakọ, gosipụtakwa mmụọ ahụ Devid nwere, bụ́ onye sịrị: “Otuto Jehova ka ọnụ m ga-ekwu; ka anụ ahụ nile gọziekwa aha nsọ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Abụ Ọma 145:21.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ Megide ihe ize ndụ dịgasị aṅaa ka ndị Kraịst bụ okenye kwesịrị ịnọ na nche?
◻ Gịnị pụrụ inyere ha aka, bụ́ ndị ahụ na-adịghị eme mgbalị iji ruo eru n’ihi nchegbu ma ọ bụ echiche nke ịbụ ndị na-erughị eru?
◻ Gịnị pụrụ ịkpali mmadụ iwepụta onwe ya maka ibu ọrụ ndị dị n’ọgbakọ?
◻ Àgwà dị aṅaa ka ndị bụbu ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi kwesịrị iji na-elepụ anya n’ọdịnihu?
[Foto dị na peeji nke 19]
W. J. Thorn setịpụrụ ezi ihe nlereanya dị ka onye okenye nwere obi umeala
[Foto dị na peeji nke 21]
Dị ka Jisọs. ị̀ dị njikere ime ihe nile ị pụrụ ime n’ijere Jehova ozi?