Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 9/15 p. 3-6
  • Ị̀ ‘Na-agbalị Ka I Ruo Eruo’?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ ‘Na-agbalị Ka I Ruo Eruo’?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ KA MMADỤ ‘ỊGBALỊ KA O RUO ERUO’ PỤTARA?
  • JỤ ECHICHE NA-EZIGHỊ EZI NA OMUME NA-ADỊGHỊ MMA
  • GỊNỊ KA I KWESỊRỊ IME MA Ọ BỤRỤ NA Ọ DỊ GỊ KA Ì CHEELA OGOLOGO OGE?
  • Ndị Nlekọta A Họpụtara Ka Ha Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ị̀ Na-eme Mgbalị Iji Ruo Eru?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Na-azụnụ Ndị Ọzọ Ka Ha Ruo Eruo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ụmụnna Nwoke, Ùnu Na-agbalịsi Ike Ka Unu Ruo Eruo Ịbụ Ndị Okenye?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 9/15 p. 3-6
Ebe ndị okenye abụọ na-agwa nwanna nwoke okwu mgbe naanị ha na ya nọ

Ị̀ ‘Na-agbalị Ka I Ruo Eruo’?

E NWERE otu nwanna aha ya bụ Fernando.a Mgbe ndị okenye abụọ gwara ya na ha chọrọ ịhụ ya, ọ chịịrị obi n’aka. Ugboro ole na ole onye nlekọta sekit bịara leta ọgbakọ ha, ndị okenye gwara ya ihe ndị ọ ga-eme ka o nwee ike iru eru ka e nyekwuo ya ihe ùgwù n’ọgbakọ. Ka oge na-aga, Fernando malitere iche ma à ga-emecha họpụta ya ka ọ bụrụ okenye. Ma, ọ dịbeghị anya onye nlekọta sekit bịara ọzọ leta ọgbakọ ha. Gịnị ka ndị okenye ga-agwa Fernando na nke ugbu a?

Fernando nọ na-ege ntị ka otu n’ime ndị okenye ahụ na-agwa ya okwu. Ọ gwara ya ihe e kwuru na 1 Timoti 3:1, kwuokwa na ndị okenye natara akwụkwọ ozi gosiri na a họpụtala ya ka ọ bụrụ okenye. O juru Fernando anya, ya ajụọ ya, sị, “Ị̀ sị gịnị?” Okenye ahụ kwuru ihe ahụ ọzọ, Fernando achịtụ ọchị. Mgbe e mechara maa ọkwa n’ọgbakọ na a họpụtala ya ka ọ bụrụ okenye, obi tọrọ mmadụ niile ụtọ.

Ọ̀ bụ ihe ọjọọ ma mmadụ chọọ ka e nyekwuo ya ihe ùgwù n’ọgbakọ? Mba. Timoti nke Mbụ isi atọ amaokwu mbụ kwuru na “ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta, agụụ ezi ọrụ na-agụ ya.” Ọtụtụ ụmụnna nwoke na-eme ihe a Baịbụl kwuru. Ha na-agbalị na-eme nke ọma n’ọgbakọ ka e nwee ike inyekwu ha ihe ùgwù n’ọgbakọ. Ọ bụ ya mere e ji nwee ọtụtụ puku ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ná nzukọ Chineke. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ, a chọkwuru ụmụnna nwoke na-agba mbọ ka ha ruo eruo ịbụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Olee otú ụmụnna nwoke kwesịrị isi na-agbalị ka ha ruo eruo? Ò kwesịrị ịna-echu ha ụra, otú ahụ o churu Fernando?

GỊNỊ KA MMADỤ ‘ỊGBALỊ KA O RUO ERUO’ PỤTARA?

Na Baịbụl, okwu Grik e si na ya sụgharịta mmadụ ‘ịgbalị ka o ruo eruo’ pụtara ịchọsi ihe ike, mmadụ ịmatị aka ka o were ihe. Ihe nwere ike ịbata mmadụ n’obi bụ onye na-amatị aka ka ọ ghọrọ mkpụrụ osisi chara acha. Ma, ọ bụrụ na mmadụ “na-agbalị ka o ruo eru,” ọ pụtaghị na onye ahụ ji anyaukwu na-azọ ka ọ bụrụ “onye nlekọta.” Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na mkpa ndị ji obi ha niile chọọ ịbụ ndị okenye kwesịrị ịbụ ka ha rụọ “ezi ọrụ,” ọ bụghị ka ha nweta ọkwá.

Na 1 Timoti 3:2-7 nakwa na Taịtọs 1:5-9, e kwuru ọtụtụ ihe mmadụ kwesịrị ime ka o ruo eruo ịrụ ezi ọrụ a. E nwere otu nwanna aha ya bụ Raymond. Ọ bụ okenye kemgbe ọtụtụ afọ. O kwuru gbasara ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru ụmụnna na-agbalị ka ha ruo eruo ịrụ ezi ọrụ kwesịrị ime. Ọ sịrị: “Ihe m chere kacha mkpa bụ àgwà anyị. Ikwu okwu na ịkụzi ihe dị mkpa. Ma, ha adịghị mkpa karịa mmadụ ịbụ onye a na-apụghị ikwujọ ekwujọ, onye na-emeru ihe n’ókè, onye uche ya zuru okè, onye na-eme ihe n’usoro, onye na-ele ọbịa, na onye nwere ezi uche.”

Onyeàmà Jehova: 1. Mgbe ọ nọ n’ozi ọma; 2. Ebe ọ na-enye mmadụ akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze; 3. Ebe ọ na-aza Ụlọ Nzukọ Alaeze; 4. Ebe ọ na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe

‘Gbalịa ka i ruo eruo.’ Otú ị ga-esi eme ya bụ iso na-eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ

Nwanna nwoke nke na-agbalị ka o ruo eruo anaghị etinye aka n’ihe ọ bụla bụ́ aghụghọ ma ọ bụ omume rụrụ arụ. Ọ na-esi otú ahụ egosi na ọ naghị eme ihe ọ bụla ga-eme ka e kwujọwa ya. Ọ bụ onye na-emeru ihe n’ókè, onye uche ya zuru okè, onye na-eme ihe n’usoro, na onye nwere ezi uche. N’ihi ya, obi na-esi ụmụnna ike na ọ ga-agwa ha ihe ha kwesịrị ime nakwa na ọ ga-enyere ha aka ma ha nwee nsogbu. Ọ na-ele ndị mmadụ ọbịa. Ọ bụ ya mere o ji agba ma ndị na-eto eto ma ndị batara ọhụrụ n’ọgbakọ ume. Ọ na-akasi ma ndị na-arịa ọrịa ma ndị agadi obi, na-enyekwara ha aka, n’ihi na ọ hụrụ ezi ihe n’anya. Ọ na-eme ihe a niile ka ha baara ndị ọzọ uru, ọ bụghị ka a hụ ya ma họpụta ya.b

Obi na-adị ndị okenye ụtọ ịdụ mmadụ ọdụ ma gbaa ya ume. Ma, ọ bụ onye ahụ na-agbalị ka o ruo eruo ga-ahụ na ya mere ihe ndị ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru mmadụ ga-eme tupu a họpụta ya. E nwere otu nwanna nwoke aha ya bụ Henry. Ọ bụ okenye kemgbe ọtụtụ afọ. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị na-agbalị ka i ruo eruo ịbụ okenye, gbasie mbọ ike ka a ghọta na i ruru eru ka a họpụta gị.” O kwuru ihe ahụ e kwuru n’Ekliziastis 9:10 ma sị: “‘Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum mee ha.’ Jiri obi gị niile mee ihe ọ bụla ndị okenye gwara gị. Jiri obi ụtọ na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere gị n’ọgbakọ, ọ bụrụgodị na ọ bụ ịza Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ka oge na-aga, ndị okenye ga-eme ihe gosiri na ha na-ahụ ihe ị na-eme na mbọ ị na-agba.” Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ okenye, na-arụsi ọrụ ike ma kwesị ntụkwasị obi n’ihe niile a na-eme n’ozi Jehova. Àgwà gị kwesịrị igosi na ị dị umeala n’obi, ọ bụghị na i nwere oké ọchịchọ.—Mat. 23:8-12.

JỤ ECHICHE NA-EZIGHỊ EZI NA OMUME NA-ADỊGHỊ MMA

O nwere ike ịdị ụfọdụ ndị chọrọ ka e nye ha ihe ùgwù n’ọgbakọ ka ọ̀ bụ ha kwuo na ha chọrọ ụdị ihe ahụ, ma ọ bụkwanụ ha achọwa otú ha ga-esi mee ka ndị okenye tụọ aro ka a họpụta ha. E nwere ndị obi na-anaghị adị mma ma ndị okenye dụọ ha ọdụ. Ha kwesịrị ịjụ onwe ha, sị, ‘Ihe mere m ji chọọ ịbụ okenye ọ̀ bụ maka uru m ga-erite, ka ọ̀ bụ maka na m chọrọ iji obi umeala na-elekọta atụrụ Jehova?’

Ndị chọrọ ịbụ ndị okenye ekwesịghị ichefu ihe ọzọ Baịbụl kwuru na ndị okenye kwesịrị ime, ya bụ, na ha ‘ga-aghọrọ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.’ (1 Pita 5:1-3) Onye ọ bụla bụụrụ ọgbakọ ihe nlereanya anaghị aghọ aghụghọ. Ọ na-enwe ndidi ma à họpụtara ya ugbu a ma ọ bụ na a họpụtaghị ya. Mmadụ ịbụ okenye anaghị eme ka onye ahụ ghara ịna-emejọ ihe. (Ọnụ Ọgụ. 12:3; Ọma 106:32, 33) Ihe ọzọ bụ na nwanna nwoke nwere ike ịna-eche na ‘ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla ya mere,’ ma ya abụrụ na e nwere ihe nwere ike ime ka ụfọdụ ndị na-ele ya anya ọjọọ. (1 Kọr. 4:4) N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị okenye ejiri Baịbụl dụọ gị ọdụ, wetuo obi gee ha ntị, gbalịakwa mee ihe ha kwuru.

GỊNỊ KA I KWESỊRỊ IME MA Ọ BỤRỤ NA Ọ DỊ GỊ KA Ì CHEELA OGOLOGO OGE?

Ọ na-adị ụfọdụ ụmụnna ka hà cheere ogologo oge tupu a họpụta ha. Ọ bụrụ na ọ dịla anya ‘ị na-agbalị ka i ruo eruo ịbụ onye nlekọta,’ ọ̀ na-echu gị ụra mgbe ụfọdụ? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta na Baịbụl kwuru, sị: “Ihe a na-atụ anya ya nke e yigharịrị oge ya na-eme ka obi daa ọrịa, ma ihe a na-achọsi ike bụ osisi nke ndụ mgbe ọ bịara.”—Ilu 13:12.

Obi nwere ike ịjọ mmadụ njọ ma ọ bụrụ na o yiri ka ihe ọ na-atụ anya inweta erughị ya aka. E nwere mgbe ọ dị Ebreham otú ahụ. Jehova kwere ya nkwa na ọ ga-amụta nwa nwoke. Ma, mgbe ọtụtụ afọ gara, ya na Sera nwunye ya amụtabeghị nwa. (Jen. 12:1-3, 7) Ọ bụ ya mere na mgbe ọ kawara nká, o kwuru, sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, gịnị ka ị ga-enye m, ebe ọ bụ na amụtaghị m nwa . . . Ọ dịghị mkpụrụ i nyere m.” Jehova mere ka ọ ghọta na ya ga-emezu nkwa ahụ ya kwere. Ma, ihe ruru afọ iri na anọ gara tupu Jehova emee ihe ahụ o kwuru.—Jen. 15:2-4; 16:16; 21:5.

N’oge ahụ Ebreham nọ na-eche, ò ji obi ọjọọ na-ejere Jehova ozi? Mba. Obi siri ya ike na Chineke ga-emezu nkwa ya. Ọ nọ na-atụ anya na ihe ga-emecha dị mma. Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe Ebreham nwesịrị ndidi, ọ natara nkwa a.” (Hib. 6:15) Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile mechara gọzie Ebreham karịa otú ọ tụrụ anya ya. Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’ihe a a kọrọ banyere Ebreham?

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ okenye ma a họpụtabeghị gị n’agbanyeghị na ọtụtụ afọ agaala, akwụsịla ịtụkwasị Jehova obi. Ekwela ka o mee ka i jiri obi ọjọọ na-ejere Jehova ozi. E nwere otu nwanna nwoke aha ya bụ Warren. O nyerela ọtụtụ ụmụnna nwoke aka ka ha mekwuo nke ọma n’ọgbakọ. O kwuru, sị: “E kwesịghị ịhọpụta nwanna ọkụ ọkụ. Tupu a họpụta ya, o kwesịrị ido anya na o ruru eru. Ka oge na-aga, otú o si akpa àgwà na otú o si arụ ọrụ e nyere ya ga-eme ka e jiri nwayọọ nwayọọ mata ihe ndị ọ ga-emeli na otú o si ele ihe anya. Ụfọdụ ndị chere na naanị ihe ga-egosi na ha na-eme nke ọma bụ ma ọ bụrụ na e nyere ha ihe ùgwù ma ọ bụ họpụta ha ka ha bụrụ nke a ma ọ bụ nke ọzọ. Ụdị echiche a adịghị mma. O nwere ike ime ka ihe gbasara ihe ùgwù na-echu mmadụ ụra. Ọ bụrụ na i ji obi gị niile na-ejere Jehova ozi n’ebe ọ bụla ị nọ nakwa n’ihe ọ bụla ị na-eme, ị na-eme nke ọma.”

Otu nwanna nwoke cheere ruo ihe karịrị afọ iri tupu a họpụta ya ka ọ bụrụ okenye. O ji ihe a kọwara n’Ezikiel isi mbụ mee ka a mata ihe ọ mụtara. O kwuru, sị: “Jehova na-anya ụgbọ ịnyịnya ya, ya bụ, nzukọ ya, ka ọ na-agba otú ọ chọrọ. Ọ bụ oge Jehova ka mkpa, ọ bụghị nke anyị. A bịa n’ihe gbasara ịbụ okenye, ihe ka m mkpa abụghị onwe m, ya bụ, ihe m chọrọ ma ọ bụ ihe m chọrọ ịbụ. Ihe m chọrọ nwere ike ọ gaghị abụ ihe Jehova ma na ọ dị m mkpa.”

Ọ bụrụ na ị na-atụ anya na otu ụbọchị, ị ga-arụ ezi ọrụ ndị okenye na-arụ, gbaa mbọ ka i ruo eruo. Otú ị ga-esi eme ya bụ ime ihe ndị ga-eme ka obi dị ndị nọ n’ọgbakọ ụtọ. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka à na-egbu oge, nwee ndidi, echegbula onwe gị. N’isiokwu a, anyị kwuru gbasara nwanna nwoke aha ya bụ Raymond. O kwuru, sị: “Oké ọchịchọ na-eme ka obi ghara ịdị mmadụ mma. Ozi Jehova na-eme obi ụtọ. Ma, ọ bụrụ na mmadụ na-echegbukarị onwe ya, ọ gaghị eji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi.” Gbalịa na-akpakwu àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, nke ka nke, gbalịa na-enwe ndidi. Gbalịa na-amụ Baịbụl n’ihi na ọ ga-eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. Na-agakwu ozi ọma, na-amụkwara ndị nwere mmasị Baịbụl. Hụ na ezinụlọ gị ji ofufe Jehova kpọrọ ihe nakwa na unu na-enwe ofufe ezinụlọ. Ka obi dị gị ụtọ mgbe ọ bụla gị na ụmụnna gị nọ. Ka ị na-agba mbọ ka i ruo eruo, ị ga-eji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi ugbu a.

Jehova chọrọ ka anyị na-agba mbọ ka anyị ruo eruo inweta ihe ùgwù n’ọgbakọ. O so n’ihe ọma o meere anyị. Ya na nzukọ ya achọghị ka obi na-ajọ ndị na-agba mbọ ka ha ruo eruo njọ ma ọ bụkwanụ ka ha ghara inwe obi ụtọ n’ozi ha na-eje. Chineke na-akwado ndị niile bu ezigbo ihe n’obi na-ejere ya ozi, ọ na-agọzikwa ha. Dịkwa ka ngọzi ya ndị ọzọ, ‘ọ dịghị atụkwasị ihe mgbu na ya.’—Ilu 10:22.

Ebe ụmụnna na-ekele onye e mere okenye ọhụrụ

Ọ bụrụgodị na ọ dịtụla anya ị gbawara mbọ ka i ruo eruo, e nwere ihe ndị ị ka nwere ike ịna-eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. Ka ị na-agba mbọ ịna-akpa àgwà ọma, na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ ma na-enyere ezinụlọ gị aka, Jehova agaghị echefu ihe ndị i mere n’ozi ya. Ka ijere Jehova ozi na-atọ gị ụtọ mgbe niile n’agbanyeghị ihe a sị gị rụọ.

a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b Ihe e kwuru n’isiokwu a gbasakwara ndị na-agbalị ka ha ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi. Na 1 Timoti 3:8-10, 12, 13, e kwuru ihe ha ga-eme tupu a họpụta ha.

Uru Ezigbo Ndụmọdụ Na-aba

Ọ bụrụ na nwanna nwoke “na-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta” ma ọ bụkwanụ ka e nye ya ihe ùgwù ndị ọzọ n’ọgbakọ Jehova, obi ga-adị ya ụtọ ma a jaa ya mma. (1 Tim. 3:1) Ọ bụrụ na ndị okenye ejiri obiọma nye ya ndụmọdụ doro anya ma gbazie ya, ihe ha gwara ya nwere ike ime ka ‘obi ya ṅụrịa.’ Onye e si otú ahụ nyere aka na-aghọtakarị na e bu ihe ọma n’obi gwa ya ihe ga-abara ya uru. Ọ ga-eji obi ya niile nabata ihe ọ bụla a gwara ya, meekwa ya.—Ilu 27:9.

Ma mgbe ụfọdụ, àgwà mmadụ nwere ike ime ka o siere ndị ọzọ ike iji Baịbụl dụọ ya ọdụ. Otu nwanna aha ya bụ Philip kwuru na ruo afọ ole na ole, otú ya si akpa àgwà mere ka ndị nọ n’ọgbakọ chee na ya achọghị ka e nyekwuo ya ihe ùgwù. Mgbe ọ gbanwere, ọ gbalịrị ịmụtakwu ihe ma gwa ndị okenye ka ha tụọrọ ya aro. O kwuru, sị, “Ha nyere m ezigbo ndụmọdụ baara m uru.” Philip mere ihe ha gwara ya. Ọ bụ okenye ugbu a.—Ilu 18:15.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya