Ị̀ Ga-anọgide Na-eje Ije n’Eziokwu?
“ENWEGHỊ m ọṅụ nke ka ihe ndị a ukwuu, bụ́ ịnụ ka ụmụ nke aka m na-ejegharị n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Otú a ka onyeozi ahụ bụ Jọn kwuru n’akụkụ ngwụsị nke ogologo ndụ ya. Ịnọgide na-enwe ntachi obi nke ‘ụmụ ya,’ bụ́ ndị ọ kpọbataworo “n’eziokwu,” wetaara ya ọṅụ dị ukwuu. Jehova na-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe ndị na-efe ya ofufe nọgidere n’eziokwu ahụ. Lee otú ọ na-aghaghị isi nwee obi ụtọ taa ịhụ nzukọ buru ibu nke jupụtara ná ndị mmadụ, na-enwe ọṅụ ọgụgụ ruru ọtụtụ nde, bụ́ ndị na-agbaso ụzọ amamihe ahụ!—Ilu 27:11.
Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ndị Chineke n’ozuzu ha rapagidesiri ike n’eziokwu ahụ, ụfọdụ ndị Kraịst n’otu n’otu na-ebelatatụ mgbalị ha ma ọ bụ ọbụna na-ahapụ ezi ofufe. Ọ bụghị ihe a na-atụghị anya ya ebe ọ bụ na otu ihe ahụ mekwara na narị afọ mbụ. (2 Timoti 4:10; Ndị Hibru 2:1) Otú o sina dị, eziokwu ahụ bụ na ụfọdụ na-ebelatatụ mgbalị ha na-emesi ya ike bụ́ mkpa ọ dị ka mmadụ nile nọrọ na nche banyere ọnọdụ ime mmụọ nke onwe ha. Pọl gbara ndị Kraịst nile ume, sị: “Na-anwapụtanụ onwe unu.” (2 Ndị Kọrint 13:5) Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịjụ onwe ya ajụjụ ahụ bụ: ‘Olee otú m pụrụ isi jide n’aka na m ga-anọgide na-eje ije n’eziokwu?’
Ụfọdụ ndị ebelatawo mgbalị ha ma ọ bụ ọbụna kwụsị ije ije n’eziokwu n’ihi na ha nwere nkụda aka—ma eleghị anya site ná nsogbu ahụ ike ma ọ bụ ndịrịta iche nke ụdịdị mmadụ. Ndị ọzọ ebelatatụwo mgbalị ha n’ihi na a dọpụrụ uche ha. Ha chọrọ inweta ọṅụ n’ụfọdụ n’ime mkpụrụ nke usoro ihe nke a ebe ọ ka nọgidere na-adị. Olee otú anyị pụrụ isi zere ibelatatụ mgbalị anyị? Iji nye azịza, ka anyị tụlee ihe nlereanya nke Jisọs setịpụụrụ anyị.
Gbasoo Ihe Nlereanya Jisọs
Ọtụtụ ọnọdụ ndị siri ike chere Jisọs ihu. Ọ dịrị mkpa na ọ ga-eme ihe iji chịkwaa ndọrọ ndọrọ onye ka ibe ya n’etiti ndị na-eso ụzọ ya, ma nweekwa ntachi obi n’ịkpọasị na ikwa emo nke ndị iro ya. Ọ dịkwara mkpa na ọ ga-eguzogide ọnwụnwa nke ụwa nke a. N’ezie, e nyere ya akụ na ọnọdụ nke ịbụ onye a ma ama n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-ahụtụbeghị. (Matiu 4:8-11; Jọn 6:14, 15) Ma, Jisọs nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ. Gịnị nyeere ya aka ime nke a?
Pọl onyeozi na-agwa anyị mgbe o dere, sị: “Ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, na-elegide Jisọs anya, bụ́ onyendú na onye mmezu nke okwukwe anyị, onye n’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya na-atachi obi [n’osisi ịta ahụhụ, NW] ya, na-elelị ihere anya, o wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke.” (Ndị Hibru 12:1, 2) N’ọnọdụ nke Jisọs, ịnọgide na-eburu n’uche “ọṅụ e debere n’ihu ya,” bụ́ nkwughachi ụgwọ dị elu nke na-echere ya, nyeere ya aka ịnọgide na-eje ije n’eziokwu. ‘Ọṅụ nke a e debere n’ihu ya’ karịrị nke ukwuu ihe ndị na-adịru nwa oge ndị ọ na-aghaghị iche ihu bụ́ ihe ndị na-akpata ịda mbà na ndọpụ uche.
Ịnọgide na-eburu nkwụghachi ụgwọ ahụ n’uche pụrụ inyere anyị aka inwe ntachi obi, dịkwa ka o nyeere Jisọs aka. (Mkpughe 22:12) Iji maa atụ, chee echiche banyere onye na-eme njem n’ụzọ ugwu nke siri ike ịga. Ọ na-abụ onye ike gwụrụ ma bụrụ onye a kụdara aka. Ọ na-etinye mgbalị iji zọpụ nzọụkwụ ọ bụla, okporo ụzọ ahụ na-eyikwa nke na-enweghị njedebe. E mesịa ọ na-erute n’elu ugwu nta wee hụ obodo ahụ ọ na-aga site n’ebe dịtụ anya. Na mberede ọnọdụ ahụ na-eyi nke dịtụ mfe karị. Ịhụ ebe ọ na-eje nke ọma na-enyere ya aka ichefu ike ọgwụgwụ ya. N’otu aka ahụ, onye Kraịst ga-ahụ ya dị ka ihe dị mfe karị ịnọgide na-eje ije n’eziokwu ma ọ bụrụ na ọ nọgide jiri uche ya na-ahụ ebe ọ na-aga nke ọma.
Ṅomie Pọl Onyeozi
Onye ọzọ nwere ntachi obi n’ihe dị ukwuu ndị gaara eme ya ka o nwee nkụda aka bụ Pọl onyeozi. Ọ dịrị mkpa na ọ ga-eme ihe iji chịkwaa nkewa dị iche iche na ndọrọ ndọrọ onye ka ibe ya n’etiti ụmụnna, ma nagide oké nsogbu ahụ ike, mmegide, ihe isi ike n’ụzọ elu ahụ, na nsogbu dị iche iche na ọbụna mmegide n’ime ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 1:10; 2 Ndị Kọrint 10: 7-12; 11:21-29; 12:7-10) N’ihi gịnị ka Pọl na-ejighị nwee nkụda aka ruo n’ókè nke ịkwụsị? Ọ na-akọwa, sị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime onye ahụ nke na-eme m ka m dị ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Ọ nwaghị iburu ibu arọ ya nanị ya. Kama nke ahụ, Pọl legaara Jehova anya iji nagide ya.—Abụ Ọma 55:22.
Ike ahụ nke si n’aka Chineke na-abịa bụ́ nke Pọl kpọkuru iji nyere ya aka inwe ntachi obi ka dịkwa taa. Bible na-asị: “[Jehova] bụ onye na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba. Ọbụna ụmụ okoro na-ada mbà, ike na-agwụkwa ha, ọbụna ụmụ okorobịa na-asụ ngọngọ daa: ma ndị na-ele anya Jehova [ga-enwetaghachi, NW] ike ha; ha ga-efego elu na nkù dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.” (Aịsaịa 40:29-31) Ọ bụrụ na anyị elegara Jehova anya inye anyị ike site n’ọmụmụ ihe onwe onye, ije nzukọ, iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ndị Kraịst, na karịsịa—ekpere, anyị ga-enwe ike ịtachi obi n’ọnwụnwa na ihe ndị na-eweta nkụda aka bụ́ ndị ga-ebilite site n’oge ruo n’oge.—Abụ Ọma 1:1-3; Ndị Rom 10:10; 1 Ndị Tesalọnaika 5:16, 17; Ndị Hibru 10:23-25.
Ọtụtụ Nde Mmadụ Na-ejikere Ibi Ndụ n’ime Paradaịs
Setan bụ chi usoro ihe nke a, bụ́ ebe ndị Kraịst bụ ndị ọbịa n’ezie, ndị bịara abịa. (2 Ndị Kọrint 4:4) N’ihi nke a, ọ gaghị eju anyị anya ma ọ bụrụ na anyị echee ihe ndị na-eweta nkụda aka ma ọ bụ ndọpụ uche ihu mgbe ụfọdụ. Pọl dere n’akwụkwọ Ndị Hibru, sị: “Anyị enweghị obodo n’ebe a nke na-adịgide, kama anyị na-achọ obodo ahụ nke gaje ịbịa.” (Ndị Hibru 13: 14) Icheta na olileanya anyị abụghị n’ụwa ochie nke a kama na nke ahụ gaje ịbịa ga-enyekwara anyị aka ịghara ibelata mgbalị anyị.
N’ụzọ ụfọdụ, ndị Kraịst dị ka ndị na-ahapụ obodo nke aka ha iji chọta ebe ọzọ ha ga-ebi ndụ ka mma. N’ụzọ metụtara mmadụ nile, nke a bụ ihe siri ike ime. Ọ gụnyere ịkwakọta ihe ma ọ bụ ikesasị na irekpọsị ihe onwunwe ya nile ma hapụ ebe obibi nke maraworo ya ahụ, nakwa ndị enyi na ndị ikwu na ibe. Ọ gụnyekwara ịga n’ala nke mmadụ na-amaghị, ibi n’etiti ndị ọ pụrụ ịbụ na ha agaghị anabata ya, na ịmụ asụsụ ọhụrụ na ụzọ ndụ nke na-amaraghị ya ahụ. Ma, ọtụtụ ndị na-eme nke a nanị n’ihi olileanya nke ịnọ n’ọnọdụ ka mma n’ụzọ ihe onwunwe n’ụwa nke a.
Ndị ahụ na-ahapụ usoro ihe ochie nke a dị ka a pụrụ isi kwuo ya ma ghọọ akụkụ nke ndị Chineke na-eche ihe ịma aka yiri nke a ihu. Ha na-ahazigharị onwe ha n’ụzọ akparamagwa iji dị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ dị ọcha nke Okwu Chineke, ha na-amụtakwa ‘asụsụ dị ọcha’ nke eziokwu. (Zefanaịa 3:9; 1 Ndị Kọrint 6: 9-11) Ha na-arụsikwa ọrụ ike iji jeere Eze Ukwu nke Alaeze Chineke ozi, bụ́ Jisọs Kraịst. Ọzọkwa, n’ọtụtụ ọnọdụ, ndị ikwu na ibe na ndị enyi ha na mbụ na-ekewapụ ha, nke bụ na ha na-esi otú a na-agwa ha ka e mesịa.
Ma ndị Kraịst nwere uru ka ukwuu ha ga-erite karịa ndị na-ahapụ ala nke aka ha n’ihi akụ na ụba. Otu ihe bụ na ha na-abata n’ógbè nke ndị na-ahụ n’anya ma na-elekọta ha. (Luk 18:29, 30) Nke ka mkpa, ha na-abịaru inwe mmekọrịta chiri anya n’etiti ha na Jehova, bụ́ Chineke nke eluigwe na ala. Ha na-enweta udo nke obi na obi ike banyere ọdịnihu ka ha na-elepụ anya maka mmezu nke nkwa dị ebube ndị Chineke kwere. (Ndị Filipaị 4:8, 9) Ndị nwere ezi nghọta nke eziokwu ndị a agaghị ekwe ka ihe ndị na-adọpụ uche ma ọ bụ ndị na-eme ka mmadụ nwee nkụda aka belata mgbalị ha n’ụzọ a na-apụghị imezi emezi. A gaghị eche ha ihu pụọ n’ụzọ ahụ dị warara nke na-eduba ná ndụ.—Matiu 7:13, 14; 1 Jọn 2:15-17.
Lekọta Ahụ Ike Ime Mmụọ Gị
Ọ bụrụ na anyị na-elekọta ahụ ike anụ ahụ anyị anya mgbe nile, ọ ga-adịrị anyị mfe karị iguzogide ọrịa. Ọ bụrụkwa na anyị adaa ọrịa, anyị na-enwetaghachi ahụ ike anyị ngwa ngwa karị. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na anyị na-elekọta ahụ ike ime mmụọ anyị, nọgide na-ahụ nke ọma ngọzi ndị ahụ anyị na-enwe ugbu a na ndị ka na-echere anyị n’ọdịnihu, ọ bụrụkwa na anyị amụta ịdabere n’ike Jehova kama ịdabere na nke anyị, anyị ga-anọ n’ọnọdụ ka mma ịnagide nsogbu ndị na-ebilite. Anyị apụghị izere ihe ndị na-adọpụ uche ma ọ bụ ọnọdụ ndị na-eweta ịda mbà kpam kpam. Ma ọ bụrụ na anyị elekọtawo ahụ ike ime mmụọ anyị nke ọma tupu oge eruo, ihe ndị dị otú ahụ agaghị emeri anyị.
Cheta, Jehova na-aṅụrị ọṅụ mgbe ndị na-efe ya ofufe na-atachi obi. Ya mere ka anyị wetara obi ya ọṅụ site n’ịnọgide na-eje ije n’eziokwu.