Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/00 p. 1
  • Ị̀ Na-atachi Obi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-atachi Obi?
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Ga-anọgide Na-eje Ije n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Chesie Echiche Ike Banyere Onye Ahụ nke Tachiri Obi
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Ntachi Obi—Dị Ndị Kraịst Oké Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Ka Ntachi Obi Rụzuo Ọrụ Ya”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 8/00 p. 1

Ị̀ Na-atachi Obi?

1 “Enweghị m ọṅụ nke ka ihe ndị a ukwuu, . . . [na] ụmụ nke aka m na-ejegharị n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Ntachi obi nke ụmụ ime mmụọ Jọn wetaara ya ọṅụ dị ukwuu. Lee otú ịhụ ka ọtụtụ nde ndị ga-aghọ ụmụ ya nọ “na-ejegharị n’eziokwu ahụ” na-aghaghị isi na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ!—Ilu 23:15, 16; 27:11.

2 Ọ bụ ezie na ndị Chineke n’ozuzu ha ji ịnụ ọkụ n’obi anọgide n’ọrụ ndị Kraịst, ụfọdụ ejiriwo nwayọọ nwayọọ kwụsịlata. Ọ bụ ezie na ndị a pụrụ ịdịworị na-arụsi ọrụ ike mgbe mbụ ha mụtara eziokwu ahụ, ka ọtụtụ afọ na-agafe, ha na-ekerezi nanị ntakịrị òkè ma ọ bụ nke na-echighị anya n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ.

3 N’ụzọ kwere nghọta, ụfọdụ pụrụ ịkwụsịlatawo n’ihi ihe mgbochi anụ ahụ na mmetụta nke ime agadi. Otú ọ dị, a ga-aja ha mma maka ntachi obi ha. Ha na-eme ihe ha nwere ike ime. Ma onye ọ bụla n’ime anyị rarawooro ndụ ya nye Chineke kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Èkwewo m ka uche m dịkwasị ná nchụso ihe onwe onye n’ụzọ dị ukwuu nke na ọdịmma Alaeze nwere nanị ọnọdụ dị nta ná ndụ m? Àghọwo m onye dịtụ “ṅara ṅara,” ka m ka “na-etinye mgbalị siri ike”?’ (Mkpu. 3:15, 16; Luk 13:24, NW) Ka anyị nile jiri ekpere chebara ihe anyị na-eme echiche ma meziwanye ihe dị ka o si dị mkpa, na-eburu n’uche na Jehova kwere nkwa na “otuto na nsọpụrụ na udo ga-adịrị onye ọ bụla nke na-arụ ezi ọrụ.”—Rom 2:10.

4 Ụzọ Isi Tachie Obi: Gịnị nyeere Jisọs aka ịtachi obi? Pọl kọwara, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’osisi ịta ahụhụ, NW] ya, na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke.” (Hib.12:1-3) Ọṅụ e debere n’ihu Jisọs karịrị nnọọ ọnwụnwa ndị ọ na-aghaghị iche ihu nwa oge. Iburu ọṅụ e debere anyị n’ihu n’uche pụkwara inyere anyị aka ịtachi obi. (Mkpu. 21:4, 7; 22:12) Ọ bụrụ na anyị elegara Jehova anya maka inye anyị ume site n’ọmụmụ ihe onwe onye, ịgachi nzukọ anya, na ịnọgidesi ike n’ekpere, anyị ga-enwe ike ịnọgidesi ike n’ọrụ o nyere anyị ịrụ.

5 Jehova na-aṅụrị ọṅụ ná ntachi obi nke ndị ya na-eguzosi ike n’ihe. Ya mere ka anyị mee ka ọṅụ ya bukwuo ibu site n’ịnọgide “na-ejegharị n’eziokwu ahụ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya