Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 10/15 p. 20-24
  • Nna na Okenye—Ịrụzu Ọrụ Abụọ Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nna na Okenye—Ịrụzu Ọrụ Abụọ Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nna na Okenye
  • “Na-enwe Ụmụ Kwere Ekwe”
  • Onye Lụrụ “Nwunye Na-ekweghị Ekwe”
  • ‘Na-achị Ezinụlọ Ya nke Ọma’
  • Nlekọta A Haziri nke Ọma
  • Ezigbo Ndị Nna Ndị Bụkwa Ezigbo Ndị Okenye
  • Ndị Okenye Anyị Kwesịrị Ịbụ Ndị Anyị Hụrụ n’Anya
  • Di na Okenye—Ịhazi Ibu Ọrụ Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ì Ruru Eru Ije Ozi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke Site N’ọchịchọ Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ndị Nlekọta A Họpụtara Ka Ha Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 10/15 p. 20-24

Nna na Okenye—Ịrụzu Ọrụ Abụọ Ahụ

“Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla amataghị otú ọ ga-achị ezinụlọ nke aka ya, ọ̀ ga-esi aṅaa lee nzukọ Chineke anya nke ọma?”—1 TIMOTI 3:5.

1, 2. (a) Na narị afọ mbụ, olee otú ndị nlekọta na-ejighị nwanyị na ndị nlekọta ji nwanyị bụ́ ndị na-enweghị ụmụ si nwee ike ijere ụmụnna ha ozi? (b) Olee otú Akwịla na Prisila si bụrụ ihe atụ nye ọtụtụ di na nwunye taa?

NDỊ nlekọta nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ pụrụ ịbụ ndị ikom na-ejighị nwanyị, ma ọ bụ ndị ikom ji nwanyị n’enweghị ụmụ ma ọ bụ ndị ikom ji nwanyị, nweekwa ụmụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụfọdụ n’ime ndị Kraịst ahụ nwere ike ịgbaso okwu ndụmọdụ Pọl onyeozi nke e nyere n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrint, isi nke 7, ma nọgide n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Jisọs ekwuwo, sị: “Ndị ọnozi dịkwa, ndị mere onwe ha ọnozi n’ihi alaeze eluigwe.” (Matiu 19:12) Ndị ikom dị otú ahụ na-ejighị nwanyị, dị ka Pọl na ma eleghị anya ụfọdụ ndị ya na ha mekọrọ njem, ga-enwere onwe ha ime njem iji nyere ụmụnna ha aka.

2 Bible ekwughị ma Banabas, Mak, Saịlas, Luk, Timoti, na Taịtọs hà bụ ndị ikom na-ejighị nwanyị. Ọ bụrụ na ha lụrụ, ihe àmà na-egosi na ha nweere onwe ha otú zuru ezu site n’ibu ọrụ ezinụlọ iji nwee ike mee njem nke ukwuu n’ọrụ dị iche iche. (Ọrụ 13:2; 15:39-41; 2 Ndị Kọrint 8:16, 17; 2 Timoti 4:9-11; Titus 1:5) Nwunye ha pụrụ isonyeworo ha, dị ka Pita na “ndị ozi fọdụrụ,” bụ́ ndị o yiri ka ha na-akpọrọ nwunye ha mgbe ha na-aga site n’otu ebe gaa n’ọzọ. (1 Ndị Kọrint 9:5) Akwịla na Prisila bụ ihe atụ nke di na nwunye dị njikere ime nkwagharị, soro Pọl si Kọrint gaa Efesọs, mesịakwa gaa Rom, ma laghachi Efesọs. Bible ekwughị ma ha nwere ụmụ ọ bụla. Ozi ha sitere n’obi maka ụmụnna ha nwetaara ha ekele nke “nzukọ Kraịst nile nke ndị mba ọzọkwa.” (Ndị Rom 16:3-5; Ọrụ 18:2, 18; 2 Timoti 4:19) Taa, ihe ịrụ ụka adịghị ya na e nwere ọtụtụ di na nwunye ndị, dị ka Akwịla na Prisila, pụrụ ijere ọgbakọ ndị ọzọ ozi, ma eleghị anya site n’ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu.

Nna na Okenye

3. Gịnị na-enye echiche na ọtụtụ ndị okenye narị afọ mbụ bụ ndị ikom lụrụ nwunye ma nwee ezinụlọ?

3 Ọ ga-eyi ka na narị afọ mbụ O.A., ihe ka ná ndị okenye bụ́ ndị Kraịst bụ ndị ikom ji nwanyị ma nwee ụmụ. Mgbe Pọl setịpụrụ iru eru ndị a chọrọ n’aka nwoke “na-agbaso ọnọdụ onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya,” o kwuru na onye Kraịst dị otú ahụ kwesịrị ịbụ “onye na-achị ezinụlọ nke aka ya nke ọma, na-enwekwa ụmụ ya n’okpuru ya n’ikwesị nsọpụrụ nile.”—1 Timoti 3:1, 4.

4. Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị okenye ji nwanyị ma nwee ụmụ?

4 Dị ka anyị hụworo, ọ bụghị iwu na onye nlekọta ga-enwe ụmụ, ma ọ bụ ọbụna lụọ nwanyị. Ma ọ bụrụ na ọ lụrụ, iji ruo eru dị ka okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, onye Kraịst aghaghị igosipụta ịbụisi kwesịrị ekwesị na nke ịhụnanya n’ebe nwunye ya nọ ma gosi na ya nwere ike idebe ụmụ ya n’okpuru otú kwesịrịnụ. (1 Ndị Kọrint 11:3; 1 Timoti 3:12, 13) Adịghị ike ọ bụla siri ike n’ilekọta ezinụlọ ya ga-eme ka nwanna nwoke ghara iru eru maka ihe ùgwù ndị pụrụ iche n’ọgbakọ. N’ihi gịnị? Pọl na-akọwa, sị: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla amataghị otú ọ ga-achị ezinụlọ nke aka ya, ọ̀ ga-esi aṅaa lee nzukọ Chineke anya nke ọma”? (1 Timoti 3:5) Ọ bụrụ na ndị bụ akụkụ ahụ ya ekweghị anọ n’okpuru nlekọta ya, olee otú ndị ọzọ ga-esi meghachi omume?

“Na-enwe Ụmụ Kwere Ekwe”

5, 6. (a) Ihe dị aṅaa a chọrọ banyere ụmụ ka Pọl gwara Taịtọs? (b) Gịnị ka a na-atụ anya ya n’aka ndị okenye nwere ụmụ?

5 Mgbe ọ na-agwa Taịtọs ka ọ họpụta ndị nlekọta n’ọgbakọ ndị dị na Krit, Pọl setịpụrụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla bụ onye a na-apụghị ibo ebubo, di nke otu nwunye, na-enwe ụmụ kwere ekwe, bụ́ ndị a na-eboghị ebubo na ha na-adị ndụ ịla n’iyi, ndị na-abụghịkwa ndị na-ekweghị ịdị n’okpuru iwu. N’ihi na onye ahụ nke na-elekọta nzukọ Kraịst anya aghaghị ịbụ onye a na-apụghị ibo ebubo, dị ka onye na-achị ezinụlọ Chineke.” Gịnị ka ihe ahụ a chọrọ bụ́ ịdị “na-enwe ụmụ kwere ekwe” pụtara n’ezie?—Taịtọs 1:6, 7.

6 Okwu ahụ bụ́ “ụmụ kwere ekwe” na-ezo aka n’ebe ndị ntorobịa rarawooro ndụ ha nye Jehova, e meekwa ha baptism, ma ọ bụ ndị na-eto eto na-enwe ọganihu iru nraranye na baptism nọ. Ndị òtù ọgbakọ na-atụ anya ka ụmụ ndị okenye n’ozuzu ha na-akpa nnọọ àgwà ọma ma na-erube isi. O kwesịrị ido anya na onye okenye na-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji wulite okwukwe n’ime ụmụ ya. Eze Solomọn dere, sị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” (Ilu 22:6) Ma gịnị ma ọ bụrụ na onye ntorobịa nwetara ọzụzụ dị otú ahụ ajụ ijere Jehova ozi ma ọ bụ ọbụna mee mmehie dị oké njọ?

7. (a) N’ihi gịnị ka o ji doo anya na Ilu 22:6 adịghị ekwu ụkpụrụ na-adịghị agbanwe agbanwe? (b) Ọ bụrụ na nwa onye okenye ahọrọghị ijere Jehova ozi, n’ihi gịnị ka onye okenye ahụ na-agaghị eji tụfuo ihe ùgwù ya dị iche iche ozugbo?

7 O doro anya na ilu ahụ e hotara n’elu adịghị ekwu ụkpụrụ na-enweghị mgbanwe. Ọ dịghị akagbu ụkpụrụ nnwere onwe ime nhọrọ. (Deuterọnọmi 30:15, 16, 19) Mgbe nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwanyị ruru ogo ibu ibu ọrụ, ọ ghaghị ime mkpebi onwe ya n’ihe banyere nraranye na baptism. Ọ bụrụ na onye okenye enyewo enyemaka, nduzi, na ọzụzụ ime mmụọ doro anya ma onye ntorobịa ahụ ahọrọghị ijere Jehova ozi, a dịghị ekwubi ozugbo na nna ahụ erughị eru ije ozi dị ka onye nlekọta. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na onye okenye nwere ọtụtụ obere ụmụaka bi n’ụlọ, ndị, otu gasịa nke ọzọ esochie, na-ada ọrịa ime mmụọ ma na-abanye ná nsogbu, a pụrụ ịkwụsị iwere ya dị ka “onye na-achị ezinụlọ nke aka ya nke ọma.” (1 Timoti 3:4) Isi ihe dị na ya bụ, o kwesịrị ịpụta ìhè na onye nlekọta na-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji ‘nwee ụmụ kwere ekwe a na-adịghị ebo ebubo na ha na-adị ndụ ịla n’iyi, ndị na-ekwekwa ịdị n’okpuru iwu.’a

Onye Lụrụ “Nwunye Na-ekweghị Ekwe”

8. Olee otú okenye kwesịrị isi kpaa àgwà n’ebe nwunye ya na-ekweghị ekwe nọ?

8 Banyere ndị ikom lụrụ ndị na-ekweghị ekwe, Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na nwanna ọ bụla nwere nwunye na-ekweghị ekwe, ọ bụrụkwa na ọ dị nwanyị ahụ ezi mma ka ya na ya biri, ka di ya ghara ịhapụ ya. N’ihi na . . . e dowokwa nwunye na-ekweghị ekwe nsọ n’ime nwanna anyị nwoke: n’ihi na, ma ọ dịghị otú a, ụmụ unu ga-abụ ụmụ na-adịghị ọcha; ma otú ọ dị, ha dị nsọ. N’ihi na . . . ì si aṅaa mara, di, ma ị̀ ga-azọpụta nwunye gị”? (1 Ndị Kọrint 7:12-14, 16) Okwu ahụ bụ́ “na-ekweghị ekwe” n’ebe a adịghị ezo aka n’ebe nwunye na-enweghị nkwenkwe okpukpe ọ bụla nọ kama n’ebe onye na-araraghị onwe ya nye Jehova nọ. Ọ pụrụ ịbụwo onye Juu, ma ọ bụ onye kwere na chi ndị ọgọ mmụọ. Taa, onye okenye pụrụ inwe nwunye na-ekpe okpukpe dị iche, onye kwere na a pụghị ịmata ma Chineke ọ̀ dị, ma ọ bụ ọbụna onye na-ekweghị na Chineke. Ọ bụrụ na o kwere iso ya nọrọ, o kwesịghị ịhapụ ya nanị n’ihi nkwenkwe ndị dị iche. Ọ ka kwesịrị ‘iso ya bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ya nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị,’ na-enwe olileanya nke ịzọpụta ya.—1 Pita 3:7; Ndị Kọlọsi 3:19.

9. N’ala ebe iwu na-enye ma di ma nwunye ikike ikpughe ụmụ ha nye nkwenkwe okpukpe ha gasị, olee otú okenye kwesịrị isi mee ihe, oleekwa ụzọ nke a ga-esi metụta ihe ùgwù ya?

9 Ọ bụrụ na onye nlekọta nwere ụmụ, ọ ga-egosipụta ịbụisi nke di na nna n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ịzụlite ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) N’ọtụtụ ala iwu na-enye ma di ma nwunye ikike inye ụmụ ha nkụzi okpukpe. N’ọnọdụ nke a nwunye pụrụ ịchọ iji ikike ya mee ihe n’ikpughepụ ụmụ ahụ nye nkwenkwe na ihe omume okpukpe ya, ndị pụrụ ịgụnye ịkpọrọ ha aga chọọchị ya.b Otú ọ dị, ụmụ ahụ kwesịrị ịgbaso akọ na uche ha e ji Bible zụọ n’ihe banyere ekereghị òkè n’ememe okpukpe ụgha. Dị ka onye isi ezinụlọ, nna ga-eji ikike nke ya mee ihe n’ịmụrụ ụmụ ya ihe na ịkpọrọ ha gaa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe o kwere omume. Mgbe ha ruru afọ ndụ mgbe ha pụrụ imere onwe ha mkpebi, ha ga-ekpebiri onwe ha ụzọ ha ga-eso. (Joshua 24:15) Ọ bụrụ na ndị okenye ibe ya na ndị òtù ọgbakọ pụrụ ịhụ na ọ na-eme ihe nile iwu nyere ya ohere ime iji zie ụmụ ya ihe nke ọma n’ụzọ nke eziokwu ahụ, a gaghị asị na o rughị eru ịbụ onye nlekọta.

‘Na-achị Ezinụlọ Ya nke Ọma’

10. Ọ bụrụ na nwoke nwere ezinụlọ bụ okenye, gịnị bụ ibu ọrụ ya bụ isi?

10 Ọbụna nye onye okenye bụ nna na nke nwunye ya bụ onye Kraịst ibe ya, ọ bụtụghị ọrụ dị mfe ike oge na nlekọta ya otú kwesịrị ekwesị n’etiti nwunye ya, ụmụ ya, na ibu ọrụ ọgbakọ. Akwụkwọ Nsọ kwuru n’ụzọ doro anya na nna bụ́ onye Kraịst nwere ibu ọrụ nke ilekọta nwunye na ụmụ ya. Pọl dere, sị: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) N’otu akwụkwọ ozi ahụ, Pọl kwuru na ọ bụ nanị ndị ikom ji nwanyị bụ́ ndị nwapụtawororịị onwe ha ịbụ ezigbo ndị di na nna ka e kwesịrị iwepụta maka ije ozi dị ka ndị nlekọta.—1 Timoti 3:1-5.

11. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka okenye kwesịrị isi “cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha”? (b) Olee otú nke a pụrụ isi nyere okenye aka imezu ibu ọrụ ndị o nwere n’ọgbakọ?

11 Onye okenye kwesịrị ‘iche’ maka ndị nke ya ọ bụghị nanị n’ụzọ ihe onwunwe kamakwa n’ụzọ ime mmụọ na mmetụta uche. Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Dozie ije ozi gị n’èzí, jikerekwara ya onwe gị n’ọhịa; e mesịa wuokwa ụlọ gị.” (Ilu 24:27) Ya mere ka ọ na-eche maka mkpa ihe onwunwe, mmetụta uche, na ntụrụndụ nke nwunye na ụmụ ya, onye nlekọta kwesịkwara iwulite ha n’ụzọ ime mmụọ. Nke a na-ewe oge—oge ọ na-agaghị enwe ike itinye n’okwu ọgbakọ. Ma ọ bụ oge pụrụ ịrụpụta ihe dị ukwuu n’obi ụtọ na ọnọdụ ime mmụọ ezinụlọ. Mgbe oge na-aga, ọ bụrụ na ezinụlọ ya siri ike n’ime mmụọ, ọ pụrụ ịdị okenye ahụ mkpa itinye oge ka nta n’ilekọta nsogbu ezinụlọ. Nke a ga-eme ka o nwekwuo ohere ilekọta okwu ọgbakọ. Ihe nlereanya ya dị ka ezigbo di na ezigbo nna ga-abara ọgbakọ uru n’ụzọ ime mmụọ.—1 Pita 5:1-3.

12. N’okwu ezinụlọ dị aṅaa ka ndị nna bụ́ ndị okenye kwesịrị isetịpụ ezi ihe nlereanya?

12 Ịchị ezinụlọ nke ọma gụnyere ịhazi oge iji duzie ọmụmụ ihe ezinụlọ. Ọ dị mkpa karịsịa na ndị okenye na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a, n’ihi na ezinụlọ ndị siri ike na-emejupụta ọgbakọ ndị siri ike. Oge onye nlekọta ekwesịghị ịdị na-ejupụta mgbe nile n’ihe ùgwù ndị ọzọ nke ije ozi nke na o nweghị oge iji soro nwunye na ụmụ ya mụọ ihe. Ọ bụrụ na ọnọdụ adịwo otú a, o kwesịrị inyochagharị usoro ihe omume ya. Ọ pụrụ ịdị ya mkpa ịhazigharị ma ọ bụ igbubilata oge ọ na-etinye n’okwu ndị ọzọ, ọbụna na-ajụ ihe ùgwù ụfọdụ mgbe ụfọdụ.

Nlekọta A Haziri nke Ọma

13, 14. Olee ndụmọdụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nyeworo ndị okenye bụ́ ndị ikom nwere ezinụlọ?

13 Ndụmọdụ ịhazi ibu ọrụ ezinụlọ na ọgbakọ adịghị ọhụrụ. Ruo ọtụtụ afọ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” anọwo na-enye ndị okenye ndụmọdụ n’okwu a. (Matiu 24:45) Ihe karịrị afọ 37 gara aga, Ụlọ Nche (Bekee) nke September 15, 1959, peji nke 553 na 554 nyere okwu ndụmọdụ, sị: “N’ezie, ọ́ bụghị okwu nke ịhazi ihe ndị a nile na-achọ oge anyị? Ná nhazi a ka e were ilebara ọdịmma ezinụlọ nke aka gị anya n’ihe dị mkpa otú o kwesịrị. O doro anya na Jehova Chineke agaghị atụ anya ka mmadụ tinye oge ya nile n’ọrụ ọgbakọ, inyere ụmụnna ya na ndị agbata obi ya aka inweta nzọpụta, ma leghara nzọpụta nke ndị ezinụlọ nke aka ya anya. Nwunye mmadụ na ụmụ ya bụ ibu ọrụ bụ isi.”

14 Ụlọ Nche nke June 1, 1987, peji nke 28, dụrụ ọdụ, sị: “Ịdị na-eje ozi ubi dị ka ezinụlọ ga-eme ka unu dịrịta nso, otú ọ dị, mkpa ụmụaka ndị pụrụ iche chọrọ oge gị na ike gị. N’ihi ya, ọ chọrọ nhazi iji mata oge ha aṅaa ị ga-etinye n’ọrụ ọgbakọ, ka ị na-elekọtakwa mkpa nke ‘ndị nke aka gị’ n’ụzọ ime mmụọ, mmetụta na n’ụzọ anụ ahụ. [Onye Kraịst aghaghị] ibu ụzọ ‘mụta ịsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị ezinụlọ nke aka [ya].’ (1 Timoti 5:4, 8).”

15. N’ihi gịnị ka amamihe na nghọta ji dị okenye nwere nwunye na ụmụ mkpa?

15 Otu ilu Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Amamihe ka e ji ewu ụlọ; ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.” (Ilu 24:3) Ee, ka onye nlekọta wee mezuo ibu ọrụ ọchịchị Chineke ya ma n’otu oge ahụ wulite ezinụlọ ya, amamihe na nghọta dị ya nnọọ mkpa n’ezie. N’ikwekọ n’Akwụkwọ Nsọ, o nwere ihe karịrị otu akụkụ nke nlekọta. Ọ gụnyere ibu ọrụ ya n’ezinụlọ ya na n’ọgbakọ ya. Nghọta dị ya mkpa iji nwee nhazi n’etiti ndị a. (Ndị Filipaị 1:9, 10) Amamihe dị ya mkpa iji setịpụ ihe n’usoro ịdị mkpa. (Ilu 2:10, 11) N’agbanyeghị ókè o chere na ọ dịịrị ya ilekọta ihe ùgwù ya nile n’ọgbakọ, o kwesịrị ịmata na dị ka di na nna, ibu ọrụ mbụ Chineke nyere ya bụ nlekọta na nzọpụta nke ezinụlọ ya.

Ezigbo Ndị Nna Ndị Bụkwa Ezigbo Ndị Okenye

16. Uru dị aṅaa ka okenye nwere ma ọ bụrụ na ọ bụkwa nna?

16 Okenye nke nwere ụmụ na-akpazi àgwà pụrụ ịbụ nnọọ onye bara uru. Ọ bụrụ na ọ mụtawo ilekọta ezinụlọ ya nke ọma, ọ nọ n’ọnọdụ inyere ezinụlọ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka. Ọ na-aghọta nsogbu ha nke ọma karị, nweekwa ike inye ndụmọdụ na-egosi amamihe nke ya. Ọ bụ ihe obi ụtọ na ọtụtụ puku ndị okenye gburugburu ụwa na-arụ ọrụ ọma dị ka ndị bụ di, nna, na ndị nlekọta.

17. (a) Gịnị ka nwoke bụ ma nna ma okenye na-ekwesịghị ichezọ mgbe ọ bụla? (b) Olee otú ndị ọzọ n’ọgbakọ kwesịrị isi gosi ọmịiko?

17 Ka nwoke nwere ezinụlọ wee bụrụ okenye, ọ ghaghị ịbụ onye Kraịst tozuru okè nke, ka ọ na-elekọta nwunye na ụmụ ya, pụrụ ịhazi ihe ndị ọ na-eme iji nwee ike iwepụtara ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ oge na nlekọta. O kwesịghị ichezọ mgbe ọ bụla na ọrụ ọzụzụ atụrụ ya na-amalite n’ụlọ. Ịmara na ndị okenye nwere nwunye na ụmụ nwere ibu ọrụ ma nke ezinụlọ ha ma nke ọgbakọ ha, ndị òtù ọgbakọ ga-agbalị ịghara ịchọ oge ha gabiga ókè. Dị ka ihe atụ, okenye nwere ụmụ na-aghaghị ije akwụkwọ n’ụtụtụ echi ya nwere ike ọ pụghị mgbe nile ịnọrọkwu ruo oge ụfọdụ mgbe nzukọ uhuruchi gasịrị. Ndị ọzọ n’ọgbakọ kwesịrị ịghọta nke a ma gosi mmetụta ụmụnna.—Ndị Filipaị 4:5.

Ndị Okenye Anyị Kwesịrị Ịbụ Ndị Anyị Hụrụ n’Anya

18, 19. (a) Gịnị ka ntụle anyị tụlere 1 Ndị Kọrint isi nke 7 meworo ka anyị nwee ike ịghọta? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi were ndị ikom bụ́ ndị Kraịst dị otú ahụ?

18 Ntụle anyị tụlere isi nke 7 nke akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ndị Kọrint emewo ka anyị nwee ike ịhụ na, n’ịgbaso okwu ndụmọdụ Pọl, e nwere ọtụtụ ndị ikom na-alụghị nwanyị ji nnwere onwe ha na-eje ozi maka ọdịmma Alaeze. E nwekwara ọtụtụ puku ụmụnna ji nwanyị bụ́ ndị na-enweghị ụmụ ndị, ka ha na-elekọta nwunye ha otú kwesịrị, na-eje ozi dị ka ezi ndị nlekọta na distrikti, sekit, ọgbakọ, na n’alaka dị iche iche nke Watch Tower, na-enwe nkwenye kwesịrị ịja mma nke ndị nwunye ha. N’ikpeazụ, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọgbakọ 80,000 nke ndị Jehova, e nwere ọtụtụ ndị nna ndị, ọ bụghị nanị na ha na-enye ndị nwunye na ụmụ ha nlekọta ịhụnanya kamakwa ha na-ewepụta oge ijere ụmụnna ha ozi dị ka ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya.—Ọrụ 20:28.

19 Pọl onyeozi dere, sị: “Ka a gụọ ndị okenye ná ndị kwesịrị nsọpụrụ okpukpu abụọ, bụ́ ndị na-achị isi nke ọma, ma nke kachasịnụ ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime okwu Chineke na ozizi.” (1 Timoti 5:17) Ee, ndị okenye na-achị nke ọma n’ụlọ ha na n’ọgbakọ kwesịrị ịhụnanya na nkwanye ùgwù anyị. Anyị kwesịrị n’ezie ịdị ‘na-asọpụrụ ndị dị otú a.’—Ndị Filipaị 2:29.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Ụlọ Nche, August 1, 1978, peji nke 30-31.

b Lee Ụlọ Nche, November 1, 1962, peji nke 350-351.

Ná Ntụleghachi

◻ Olee otú anyị si mara na ọtụtụ ndị okenye na narị afọ mbụ O.A. bụ ndị ikom nwere ezinụlọ?

◻ Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị okenye ji nwanyị ma nwee ụmụ, n’ihi gịnịkwa?

◻ Gịnị ka inwe “ụmụ kwere ekwe” pụtara, ma gịnị ma ọ bụrụ na nwa onye okenye ahọrọghị ijere Jehova ozi?

◻ N’akụkụ dịgasị aṅaa ka okenye kwesịrị ‘ichere ndị nke aka ya’?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ezinụlọ ndị siri ike na-emejupụta ọgbakọ ndị siri ike

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya