Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/15 p. 31
  • Kpachara Anya Banyere Ndị Si n’Ezi Ofufe Dapụ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpachara Anya Banyere Ndị Si n’Ezi Ofufe Dapụ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-agbasi Mgba Ike”
  • Ihe Ịdọ Aka ná Ntị Ndị E Debere n’Ihu Anyị
  • Nọgidenụ Na-eguzogide
  • “Na-agbasi Mgba Ike n’Ihi Okwukwe”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Jọn na Jud
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Anyị Ga-agbasi Mbọ Ike Ka Anyị Nọgide n’Eziokwu
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Kpachara Anya Maka Ndị Ozizi Ụgha!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/15 p. 31

Kpachara Anya Banyere Ndị Si n’Ezi Ofufe Dapụ!

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Jud

NDỊ ohu Jehova aghaghị ‘ịkpọ ajọ ihe asị,’ ma “na-arapara ezi ihe n’ahụ.” (Ndị Rom 12:9) Onye ahụ so dee Bible, bụ́ Jud, nyeere ndị ọzọ aka ime nke a n’akwụkwọ ozi o zigara site na Palestine ma eleghị anya n’ihe dị ka 65 O.A.

Jud kpọrọ onwe ya “ohu nke Jisọs Kraịst, na nwanne Jemes.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a bụ Jemes ahụ a maara nke ọma na ọ bụ onye otu nne ji ya na Jisọs Kraịst. (Mak 6:3; Ọrụ 15:13-21; Ndị Galetia 1:19) Jud n’onwe ya bụkwa nwanne Jisọs. Otú ọ dị, ọ ghaghị ilewori ya anya dị ka ihe na-ezighị ezi ikwu okwu banyere njikọ anụ ahụ nke a ebe Kraịst bụ mmụọ nke e meworo ka ọ dị ebube n’eluigwe na mgbe ahụ. Akwụkwọ ozi Jud gara nnọọ kpọmkwem n’inye ndụmọdụ ndị pụrụ inyere anyị aka ‘ịrapara n’ezi ihe’ ma kpachara anya banyere ndị si n’ezi ofufe dapụ.

“Na-agbasi Mgba Ike”

Ọ bụ ezie na Jud zubere ide banyere nzọpụta nke ndị Kraịst nwekọrọ ọnụ, ọ hụrụ ya dị ka ihe dị mkpa ịgba ndị na-agụ akwụkwọ ozi ya ume ka ha “na-agbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ.” (Amaokwu 1-4) N’ihi gịnị? N’ihi na ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke egbebatawo n’ọgbakọ ahụ ma “na-agha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko.” N’ụzọ na-ezighị ezi, ha chere na ha pụrụ imebi iwu Chineke ma nọgide n’etiti ndị ya. Ka anyị gharakwa ikwenye n’ụdị echiche ọjọọ dị otú ahụ kama ka anyị na-agbaso ezi omume mgbe nile, na-enwe ekele na site n’ọbara Jisọs, Chineke ji obi ebere sachaa anyị pụọ ná mmehie.—1 Ndị Kọrint 6:9-11; 1 Jọn 1:7.

Ihe Ịdọ Aka ná Ntị Ndị E Debere n’Ihu Anyị

Ọ dị mkpa ịnọ na nche megide omume, àgwà, na mmadụ ndị ụfọdụ. (Amaokwu 5-16) N’ihi na ụfọdụ ndị Israel a zọpụtara site n’Ijipt enweghị okwukwe, e bibiri ha. Ndị mmụọ ozi ndị hapụrụ ebe obibi nke kwesịịrị ha abụrụwo ndị e debeworo “n’agbụ ebighị ebi n’okpuru ọchịchịrị [ime mmụọ] nye ikpe nke oké ụbọchị ahụ.” Oké omume rụrụ arụ wetaara Sọdọm na Gọmọra “ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, nke bụ ọkụ ebighị ebi.” Ya mere ka anyị nọgide mgbe nile na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ ma ghara ịhapụ “ụzọ ndụ.”—Abụ Ọma 16:11.

N’adịghị ka Maịkael onye isi ndị mmụọ ozi, onye na-agaghị eweta ikpe ọmụma megide Ekwensu site n’ịkatọ ya, ndị ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuluru “ndị nọ n’ebube,” nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ ndị ahụ nwere ebube ụfọdụ nke e nyere ha site n’aka Chineke na Kraịst dị ka ndị okenye e tere mmanụ. Ka anyị ghara ileda ikike nke Chineke nyere anya!

Ndị ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke gbasoro ihe nlereanya ọjọọ nke Ken, Belam, na Kora. Ha ghọrọ ihe iyi egwu ime mmụọ nke a pụrụ iji tụnyere nkume ndị zoro n’okpuru mmiri, ha dịkwa ka ifufe nke mmiri na-adịghị na ya nakwa osisi nwụrụ anwụ nke a bụpụrụ abụpụ, bụ́ nke na-adịghị amịpụta ihe ọ bụla bara uru. Ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ bụkwa ndị ntamu, ndị mkpesa, na “ndị na-aja ihu mmadụ n’ihi uru.”

Nọgidenụ Na-eguzogide

Jud mesịrị kwuo okwu ndụmọdụ banyere iguzogide mmetụta ndị jọrọ njọ. (Amaokwu 17-25) A ga-enwe ndị nkwutọ “n’oge ikpeazụ,” ma ezi ndị Kraịst aghaghị ịtachi obi n’ebe ha na okwu mkparị ha nile dị taa. Iji guzogide ụdị mmetụta ọjọọ ndị dị otú a, anyị kwesịrị iwulite onwe anyị ‘n’elu okwukwe dịkarịsịrị nsọ,’ jiri mmụọ nsọ na-ekpe ekpere, ma nọgide n’ịhụnanya Chineke, ebe anyị na-echere ka e gosipụta ebere Jisọs.

Ọ ghaghị ịbụworị na n’ọnọdụ ha dị ka ndị nkụzi ụgha, ndị ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke mere ka ụfọdụ ndị nwee obi abụọ. (Tụlee 2 Pita 2:1-3.) Gịnịkwa dị ndị obi abụọ mkpa? Ee, ọ bụ enyemaka ime mmụọ iji napụta ha “n’ọkụ,” bụ́ mbibi ebighị ebi! (Matiu 18:8, 9) Ma ọ dịghị ndị na-asọpụrụ Chineke mkpa ịtụ ọdịnihu dị otú ahụ egwu, n’ihi na Jehova ga-echebe ha ka ha ghara “ịsụ ngọngọ” wee banye n’ime mmehie na mbibi nke na-eche ndị si n’ezi ofufe dapụ ihu.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

Nkume Ndị Zoro Ezo: Jud dọrọ ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị banyere ‘nkume ndị e zoro n’okpuru mmiri n’oriri ịhụnanya ha.’ (Jud 12) N’ime ka à ga-asị na ha nwere ịhụnanya maka ndị ahụ kwere ekwe, ndị dị otú ahụ si n’ezi ofufe dapụ yiri nkume nọ n’okpuru mmiri ndị nwere ọnụ ọnụ ndị kapịrị akapị ndị pụrụ itiwasị ụgbọ mmiri ma ọ bụ mapụsịa ndị na-egwu mmiri ahụ ma gbuo ha. Oriri ịhụnanya pụrụ ịbụworị ememe nke ndị Kraịst bara ọgaranya na-akpọ ndị Kraịst ibe ha dara ogbenye na ya. Onye Nna Chọọchị ahụ bụ Chrysostom (347?-407 O.A.) kwuru, sị: “Ha nile na-ezukọta n’otu oriri, ndị ọgaranya na-ewepụta ihe, a na-akpọkwa ndị ogbenye na ndị ọ na-adịghị ihe ha nwere, ha nile rikọkwara oriri n’otu.” N’agbanyeghị ihe ọ bụla bụ ụdịdị nke oriri ịhụnanya oge mbụ ahụ, ịdọ aka ná ntị Jud nyeere ndị kwesịrị ntụkwasị obi aka ịkpachara anya banyere ‘nkume zoro ezo’ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ nke pụrụ ịkpata ọnwụ ime mmụọ. Ọ bụ ezie na e nyeghị ndị Kraịst iwu ime oriri ịhụnanya, na a dịghịkwa eme ya n’oge a, ndị Jehova na-enyerịtara ibe ha aka n’ụzọ ihe onwunwe n’oge mkpa, ha na-enwekwa nnọkọ obi ụtọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya