ISI NKE ATỌ
Mkpịsị Ugodi Abụọ Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide
1, 2. (a) Ruo ogologo oge hà aṅaa ka e mere ka alụmdi na nwunye dịruo? (b) Olee ụzọ nke a si ekwe omume?
MGBE Chineke jikọtara nwoke na nwanyị mbụ n’alụmdi na nwunye, e nweghị ihe na-egosi na njikọ ahụ ga-abụ nanị ruo nwa oge. Adam na Iv ga-anọkọ ọnụ ná ndụ ha nile. (Jenesis 2:24) Ụkpụrụ Chineke maka alụmdi na nwunye dị nsọpụrụ bụ njikọta nke otu nwoke na otu nwanyị. Nanị ajọ mmekọahụ rụrụ arụ n’akụkụ nke otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ahụ na-enye nkwado Akwụkwọ Nsọ maka ịgba alụkwaghịm nke pụrụ inye ohere maka nlụgharị.—Matiu 5:32.
2 Ọ̀ ga-ekwe omume ka mmadụ abụọ bikọọ ọnụ n’obi ụtọ ruo ogologo oge a na-akaghị aka? Ee, Bible na-emekwa ka a mata isi ihe, ma ọ bụ mkpịsị ugodi, abụọ dị mkpa nke na-enye aka ime ka nke a kwe omume. Ọ bụrụ na ma di ma nwunye ejiri ndị a mee ihe, ha ga-akpọghe ụzọ nke na-eduga n’obi ụtọ na ọtụtụ ngọzi. Gịnị bụ mkpịsị ugodi ndị a?
MKPỊSỊ UGODI NKE MBỤ
Inwerịta ịhụnanya na nkwanye ùgwù na-eduga n’ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye
3. Ụdị ịhụnanya atọ dị aṅaa ka ndị ibe n’alụmdi na nwunye kwesịrị ịzụlite?
3 Mkpịsị ugodi nke mbụ bụ ịhụnanya. Ọ dị mma ịmara na e nwere ụdị ịhụnanya dị iche iche a kọwara na Bible. Otu bụ ịhụnanya onwe onye, nke na-ekpo ọkụ maka onye ọzọ, ụdị ịhụnanya nke na-adị n’etiti ezi ndị enyi. (Jọn 11:3) Ọzọ bụ ịhụnanya nke na-eto n’etiti ndị òtù ezinụlọ. (Ndị Rom 12:10) Nke atọ bụ ịhụnanya nwoke na nwanyị nke mmadụ pụrụ inwe maka onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya. (Ilu 5:15-20) Otú ọ dị, di na nwunye kwesịrị ịzụlite ndị a nile. Ma e nwere ụdị ịhụnanya nke anọ, nke ka ndị ọzọ mkpa.
4. Gịnị bụ ụdị ịhụnanya nke anọ?
4 N’asụsụ mbụ e ji dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu e ji mee ihe maka ụdị ịhụnanya nke anọ a bụ a·gaʹpe. E jiri okwu ahụ mee ihe na 1 Jọn 4:8, ebe a na-agwa anyị, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” N’ezie, “anyị . . . na-ahụ n’anya, n’ihi na [Chineke] buru ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:19) Onye Kraịst na-azụlite ụdị ịhụnanya a nke mbụ maka Jehova Chineke, e mesịakwa maka ụmụ mmadụ ibe ya. (Mak 12:29-31) E jikwa okwu ahụ bụ a·gaʹpe mee ihe ná Ndị Efesọs 5:2, nke na-asị: “Na-ejegharịkwanụ n’ịhụnanya, dị ka Kraịst anyị hụkwara unu n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi anyị.” Jisọs kwuru na ụdị ịhụnanya a ka a ga-eji mara ezi ụmụazụ ya: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya [a·gaʹpe] n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Rịbakwa ama ojiji e jiri a·gaʹpe mee ihe ná 1 Ndị Kọrint 13:13: “Ka okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a, na-anọgide; ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya [a·gaʹpe].”
5, 6. (a) N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji karịa okwukwe na olileanya? (b) Olee ihe ụfọdụ mere ịhụnanya ga-eji nye aka ime ka alụmdi na nwunye dịgide adịgide?
5 Gịnị na-eme ka ịhụnanya a·gaʹpe nke a karịa okwukwe na olileanya? Ụkpụrụ na-achị ya—ezi ụkpụrụ—a na-ahụ n’Okwu Chineke. (Abụ Ọma 119:105) Ọ bụ nchegbu achọghị ọdịmma onwe onye nanị maka imere ndị ọzọ ihe ziri ezi na ihe dị mma n’ụzọ Chineke si ele ihe anya, ma ò kwesịrị onye na-anata ya ma ọ bụ na o kwesịghị ya. Ụdị ịhụnanya ahụ na-eme ka ndị nọ n’alụmdi na nwunye gbasoo ndụmọdụ Bible bụ́: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.” (Ndị Kọlọsi 3:13) Ndị di na nwunye na-ahụ n’anya nwere ma na-azụlite ‘ịhụnanya [a·gaʹpe] dị ike maka ibe ha, n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.’ (1 Pita 4:8) Rịba ama na ịhụnanya na-ekpuchi njehie. Ọ dịghị ehichapụ ha, ebe ọ na-adịghị mmadụ na-ezughị okè nke pụrụ inwere onwe ya pụọ ná ndahie.—Abụ Ọma 130:3, 4; Jemes 3:2.
6 Mgbe di na nwunye zụlitere ụdị ịhụnanya a maka Chineke na maka ibe ha, alụmdi na nwunye ha ga-adịte anya ma bụrụ ihe obi ụtọ, n’ihi na “ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:8) Ịhụnanya bụ “ihe nkekọ nke izu okè.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Ọ bụrụ na ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, olee ụzọ gị na onye ibe gị ga-esi zụlite ụdị ịhụnanya a? Gụkọọ Okwu Chineke ọnụ, ma kwurịta okwu banyere ya. Mụọ ihe nlereanya Jisọs nke ịhụnanya ma gbalịa iṅomi ya, iche echiche na ime ka ya. Ọzọkwa, na-aga nzukọ ndị Kraịst, ebe a na-akụzi Okwu Chineke. Na-ekpekwa ekpere maka enyemaka Chineke iji zụlite ụdị ịhụnanya a e buliri elu, nke bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke.—Ilu 3:5, 6; Jọn 17:3; Ndị Galetia 5:22; Ndị Hibru 10:24, 25.
MKPỊSỊ UGODI NKE ABỤỌ
7. Gịnị bụ nkwanye ùgwù, oleekwa ndị kwesịrị igosi nkwanye ùgwù n’alụmdi na nwunye?
7 Ọ bụrụ na di na nwunye hụrụ onwe ha n’anya n’ezie, mgbe ahụ ha ga-akwanyekwara ibe ha ùgwù, nkwanye ùgwù bụkwa mkpịsị ugodi nke abụọ na-eduga n’alụmdi na nwunye obi ụtọ. A na-akọwa nkwanye ùgwù dị ka “ichebara ndị ọzọ echiche, ịsọpụrụ ha.” Okwu Chineke na-adụ ndị Kraịst nile ọdụ, gụnyere ndị di na ndị nwunye, sị: “N’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Pita onyeozi dere, sị: “Ndị bụ di, otú ahụ, soonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị.” (1 Pita 3:7) A dụrụ nwunye ọdụ ka “ọ na-atụ egwu di ya.” (Ndị Efesọs 5:33) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịsọpụrụ mmadụ, ị na-enwe obi ọma n’ebe onye ahụ nọ, na-enwe nkwanye ùgwù maka ịdị ùgwù onye ahụ na echiche ndị o kwupụtara, na-adịkwa njikere imezu ihe ọ bụla dị mma ọ rịọrọ gị ka i mee.
8-10. Olee ụzọ ụfọdụ nkwanye ùgwù ga-esi nye aka ime ka njikọ alụmdi na nwunye kwụrụ chịm ma bụrụ nke obi ụtọ?
8 Ndị nwere ọchịchọ ịnụ ụtọ alụmdi na nwunye nke obi ụtọ na-akwanyere ndị ibe ha ùgwù site ‘n’ịghara ile ihe nke aka ha anya, kama na-ele ihe nke ibe ha anya.’ (Ndị Filipaị 2:4) Ha adịghị eche maka ihe dị mma nye nanị ha onwe ha—nke ga-abụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Kama, ha na-echekwa maka ihe kasị mma nye ibe ha. N’ezie, ha na-ekwe ka nke ahụ bute ụzọ.
9 Nkwanye ùgwù ga-enyere ndị di na nwunye aka ịnakwere ọdịiche nke echiche. Ọ bụghị ihe ezi uche ịtụ anya na mmadụ abụọ ga-enwe echiche yiri ibe ha n’ihe nile. Ihe pụrụ ịdị mkpa nye di nwere ike ọ gaghị adị mkpa nke otú ahụ nye nwunye, ihe na-amasịkwa nwunye nwere ike ọ gaghị abụ ihe na-amasị di. Ma nke ọ bụla n’ime ha kwesịrị ịkwanyere echiche na nhọrọ onye nke ọzọ ùgwù, ọ bụrụhaala na ihe ndị ahụ agabigaghị iwu na ụkpụrụ Jehova. (1 Pita 2:16; tụlee Faịlimọn 14.) Ọzọkwa, onye nke ọ bụla kwesịrị inwe nkwanye ùgwù maka ịdị ùgwù nke onye nke ọzọ site n’emeghị onye ahụ ihe e ji ekwu okwu mweda n’ala ma ọ bụ ihe ọchị, ma ọ bụ n’ihu ọha ma ọ bụ na nzuzo.
10 Ee, ịhụnanya maka Chineke na maka ibe ha tinyere nkwanyerịta ùgwù bụ mkpịsị ugodi abụọ dị oké mkpa na-eduga n’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma. Olee ụzọ a pụrụ isi tinye ha n’ọrụ n’ụfọdụ akụkụ ndị ka mkpa ná ndụ alụmdi na nwunye?
ỤDỊ ỊBỤISI NKE KRAỊST
11. N’echiche Akwụkwọ Nsọ, ònye bụ isi n’alụmdi na nwunye?
11 Bible na-agwa anyị na e kenyere nwoke àgwà ndị ga-eme ya onye isi ezinụlọ nke nwere ihe ịga nke ọma. Ya mere, nwoke ga-aza ajụjụ n’ihu Jehova maka ọdịmma ime mmụọ na nke anụ ahụ nke nwunye ya na ụmụ ya. Ọ gaje ime mkpebi ndị ziri ezi na-egosipụta uche Jehova, bụrụkwa ezi ihe nlereanya nke àgwà nsọpụrụ Chineke. “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, dị ka n’okpuru Onyenwe anyị. N’ihi na di bụ isi nke nwunye, dị ka Kraịst anyị bụkwa isi nke nzukọ Ya.” (Ndị Efesọs 5:22, 23) Otú ọ dị, Bible na-ekwu na di nwekwara isi, Onye nwere ike n’ebe ọ nọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ana m achọ ka unu mata na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Di nke maara ihe na-amụta ụzọ e si egosipụta ịbụisi site n’iṅomi isi nke ya, bụ́ Kraịst Jisọs.
12. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụrụ ma n’ihe banyere ịnọ n’okpuru ma n’igosipụta ịbụisi?
12 Jisọs kwa nwere isi, bụ́ Jehova, ọ na-edokwa onwe ya n’okpuru Ya n’ụzọ ziri ezi. Jisọs kwuru, sị: “Etughị m ihe Mụ onwe m na-achọ, kama ihe Onye zitere m na-achọ.” (Jọn 5:30) Lee aha ihe nlereanya magburu onwe ya ọ bụ! Jisọs bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Ọ ghọrọ Mesaịa ahụ. Ọ ga-abụ Isi nke nzukọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ nakwa Eze a họpụtara nke Alaeze Chineke, karịa ndị mmụọ ozi nile. (Ndị Filipaị 2:9-11; Ndị Hibru 1:4) N’agbanyeghị ọkwá dị otú ahụ dị elu na olileanya ndị dị otú ahụ e buliri elu, nwoke ahụ bụ́ Jisọs abụghị onye aka ike, na-adịghị ekwe ekwe, ma ọ bụ na-achọ ihe gabigara ókè. Ọ bụghị onye ọchịchị nchịgbu, na-echetara ndị na-eso ụzọ ya mgbe mgbe na ha aghaghị irubere ya isi. Jisọs na-ahụ n’anya ma nweekwa ọmịiko, karịsịa n’ebe ndị a na-emegbu emegbu nọ. Ọ sịrị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:28-30) Ọ bụ ihe obi ụtọ isoro ya nọrọ.
13, 14. Olee ụzọ di nke na-ahụ n’anya ga-esi gosipụta ịbụisi ya, n’iṅomi Jisọs?
13 Di nke na-achọ ndụ ezinụlọ obi ụtọ ga-eme nke ọma ịtụle àgwà ọma ndị e ji mara Jisọs. Ezi di abụghị onye aka ike na okwusịa obie, na-eji ịbụisi ya eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma dị ka mkpara iji manye nwunye ya ime ihe. Kama nke ahụ, ọ na-ahụ ya n’anya ma na-asọpụrụ ya. Ọ bụrụ na Jisọs bụ “Onye wedatara Onwe ya ala n’obi,” di nwere ọbụna karị ihe mere ọ ga-eji mee otú ahụ n’ihi na, n’adịghị ka Jisọs, ọ na-ejehie. Mgbe o jehiere, ọ na-achọ nghọta nke nwunye ya. Ya mere, di nke dị umeala n’obi na-ekweta njehie ya, ọ bụ ezie na okwu ndị ahụ bụ́, “Ndo; i kwuru eziokwu,” pụrụ isi ike ikwu. Ọ ga-akara nwunye mfe nke ukwuu ịkwanyere ịbụisi nke di dị obi umeala ùgwù karịa nke dị mpako na isi ike. N’otu aka ahụ, nwunye nke na-akwanye ùgwù na-arịọkwa mgbaghara mgbe ọ dahiere.
14 Chineke kenyere nwanyị àgwà ọma ndị ọ pụrụ iji tụnye ụtụ n’alụmdi na nwunye obi ụtọ. Di nke maara ihe ga-amata nke a ma ghara igbochi ya. Ọtụtụ ndị inyom na-enwekarị ọmịiko na mmetụta ka ukwuu, bụ́ àgwà ndị dị mkpa n’ilekọta ezinụlọ na ịzụlite mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Dị ka ọ na-adịkarị, nwanyị nwere nkà pụrụ iche n’ime ka ụlọ bụrụ ebe dị ụtọ obibi. ‘Nwanyị ahụ nke na-ejide onwe ya nke ọma’ nke a kọwara n’Ilu isi nke 31 nwere ọtụtụ àgwà ndị dị ebube na nkà ndị magburu onwe ha, ezinụlọ ya ritekwara uru n’ụzọ zuru ezu na ha. N’ihi gịnị? N’ihi na obi di ya ‘atụkwasịwo ya obi.’—Ilu 31:10, 11.
15. Olee ụzọ di ga-esi gosipụta ụdị ịhụnanya na nkwanye ùgwù yiri nke Kraịst maka nwunye ya?
15 N’ọdịbendị ụfọdụ, a na-eji ikike onye bụ di kpọrọ ihe gabiga ókè, nke na ọbụna na a na-ewere ịjụ ya ajụjụ dị ka mkparị. Ọ pụrụ imeso nwunye ya dị nnọọ ka ohu. Iji ịbụisi eme ihe n’ụzọ dị njọ otú a na-akpata mmekọrịta na-adịghị mma ọ bụghị nanị n’etiti ya na nwunye ya kamakwa ya na Chineke. (Tụlee 1 Jọn 4:20, 21.) N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị bụ di na-ahapụ idu ndú, na-ekwere ka nwunye ha na-achị ezinụlọ ahụ. Di nke na-edo onwe ya n’okpuru Kraịst otú kwesịrịnụ adịghị erigbu nwunye ya ma ọ bụ napụ ya ùgwù ya. Kama, ọ na-eṅomi ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà nke Jisọs, na-emekwa dị ka Pọl dụrụ n’ọdụ: “Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ Ya n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi ya.” (Ndị Efesọs 5:25) Kraịst Jisọs hụrụ ụmụazụ ya n’anya nke ukwuu nke na ọ nwụrụ n’ihi ha. Ezi di ga-agbalị iṅomi àgwà ahụ nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị, na-achọ ọdịmma nke nwunye ya, kama ịdị na-achọkarị ihe n’aka ya. Mgbe di na-edo onwe ya n’okpuru Kraịst ma na-egosipụta ụdị ịhụnanya na nkwanye ùgwù nke Kraịst, a ga-akwali nwunye ya ido onwe ya n’okpuru ya.—Ndị Efesọs 5:28, 29, 33.
NWUNYE ỊNỌ N’OKPURU
16. Àgwà ndị dị aṅaa ka nwunye kwesịrị igosipụta ná mmekọrịta nke ya na di ya?
16 Nwa oge mgbe e kesịrị Adam, “Jehova, bụ́ Chineke, wee sị, Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọọ nanị ya; M ga-emere ya onye inyeaka kwesịrị ya.” (Jenesis 2:18) Chineke kere Iv dị ka ‘onye kwesịrị ya,’ ọ bụghị dị ka onye na-asọ mpi. Alụmdi na nwunye agajeghị ịdị ka ụgbọ mmiri nke nwere ndị ọkwọ ụgbọ abụọ na-asọrịta mpi. Di gaje ịbụ isi n’ịhụnanya, nwunye gajekwa igosipụta ịhụnanya, nkwanye ùgwù, na ido onwe onye n’okpuru site n’ọchịchọ obi.
17, 18. Olee ụzọ ụfọdụ onye bụ nwunye pụrụ isi bụụrụ di ya ezi onye inyeaka?
17 Otú ọ dị, ezi nwunye na-eme karịa nanị ịnọ n’okpuru. Ọ na-agbalị ịbụ ezigbo onye inyeaka, na-akwado di ya ná mkpebi ndị ọ na-eme. N’ezie, nke ahụ na-akara ya mfe mgbe o kwenyere ná mkpebi ya. Ma ọbụna mgbe ọ na-ekwenyeghị, nkwado ya pụtara ìhè pụrụ inye aka ime ka mkpebi ya nwekwuo ihe ịga nke ọma.
18 Nwunye pụrụ inyere di ya aka n’ụzọ ndị ọzọ ịbụ ezi onye isi. Ọ pụrụ igosi obi ekele maka mgbalị ya n’idu ndú, kama ịdị na-akatọ ya ma ọ bụ na-eme ya ka o chee na ọ pụghị ime ihe ga-eju ya afọ. Site n’imeso di ya n’ụzọ dị mma, o kwesịrị icheta na “mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo, . . . dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke,” ọ bụghị nanị n’anya di ya. (1 Pita 3:3, 4; Ndị Kọlọsi 3:12) Gịnị ma ọ bụrụ na di ahụ abụghị onye kwere ekwe? Ma ọ bụ ma ọ bụghị, Akwụkwọ Nsọ na-agba ndị nwunye ume “ịbụ ndị na-ahụ di ha n’anya, ndị na-ahụ ụmụ ha n’anya, ndị uche ha zuru okè, ndị dị ọcha, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ, ezi mmadụ, ndị na-edo onwe ha n’okpuru di nke aka ha, ka e wee ghara ikwulu okwu Chineke.” (Taịtọs 2:4, 5) Ọ bụrụ na okwu metụtara akọ na uche ebilite, o yikarịrị ka di na-ekweghị ekwe ọ̀ ga-akwanyere ọnọdụ nwunye ya ùgwù ma ọ bụrụ na o “were nwayọọ na egwu” kwupụta ya. Ụfọdụ ndị bụ di na-ekweghị ekwe abụrụwo ndị ‘e ritere n’uru site n’ibi obi nwunye ha n’ebe a na-ekwughị okwu; mgbe ha na-ele ibi obi ha dị ọcha, ya na egwu.’—1 Pita 3:1, 2, 15; 1 Ndị Kọrint 7:13-16.
19. Gịnị ma ọ bụrụ na di asị nwunye ya ka o mebie iwu Chineke?
19 Gịnị ma ọ bụrụ na di asị nwunye ya ka o mee ihe Chineke machibidoro iwu? Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ọ ghaghị icheta na Chineke bụ Onye Ọchịchị ya kasị elu. Ọ na-ewere dị ka ihe nlereanya ihe ndị ozi mere mgbe ndị ọchịchị gwara ha ka ha mebie iwu Chineke. Ọrụ 5:29 na-akọ, sị: “Pita na ndị ozi zara, sị, Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”
NKWURỊTA OKWU DỊ MMA
20. Gịnị bụ akụkụ dị mkpa ebe ịhụnanya na nkwanye ùgwù dị mkpa?
20 Ịhụnanya na nkwanye ùgwù dị mkpa n’akụkụ ọzọ nke alụmdi na nwunye—nkwurịta okwu. Di nke na-ahụ n’anya ga-esoro nwunye ya kparịta ụka banyere ihe omume ya, nsogbu ya, echiche ya n’okwu dị iche iche. Nke a dị nwunye ya mkpa. Di nke na-ewepụta oge isoro nwunye ya kwurịta okwu ma na-ege ntị n’ezie n’ihe ọ na-ekwu na-egosipụta ịhụnanya na nkwanye ùgwù ya nye ya. (Jemes 1:19) Ụfọdụ ndị bụ nwunye na-ekpesa na di ha na-eji ntakịrị oge eso ha akparịta ụka. Nke ahụ dị mwute. N’eziokwu, n’oge ndị a jupụtara n’ihe omume, di pụrụ ịrụ ọrụ ruo ogologo oge n’anọghị n’ụlọ, ọnọdụ akụ̀ na ụba pụkwara iduba n’ụfọdụ ndị nwunye ịbụkwa ndị na-arụ ọrụ. Ma ọ dị di na nwunye mkpa iwepụta oge maka ibe ha. Ma ọ bụghị ya, ha pụrụ ịghọ ndị nọpụrụ iche n’ebe ibe ha nọ. Ọ pụrụ iduga ná nsogbu ndị siri ike ma ọ bụrụ na ha enwee mmetụta nke ịbụ ndị a rụgidere ịchọ mkpakọrịta ọmịiko n’èzí ndokwa alụmdi na nwunye ahụ.
21. Olee ụzọ okwu ziri ezi ga-esi nye aka ime ka alụmdi na nwunye nọgide na-abụ nke obi ụtọ?
21 Ụzọ ndị di na nwunye si ekwurịta okwu dị mkpa. “Okwu ọnụ ụtọ nile . . . na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ n’ọrịa.” (Ilu 16:24) Ma onye ị na-alụ ọ̀ bụ onye kwere ekwe ma ọ bụ na ọ bụghị, ndụmọdụ Bible a dị irè: “Ka okwu unu dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ,” ya bụ, ihe na-atọ ụtọ. (Ndị Kọlọsi 4:6) Mgbe mmadụ nweworo ụbọchị siri ike, okwu ole na ole nke obi ọma, nke ọmịiko sitere n’ọnụ di ma ọ bụ nwunye mmadụ pụrụ ime ọtụtụ ihe dị mma. “Mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ.” (Ilu 25:11) Ụda olu na nhọrọ okwu dị oké mkpa. Dị ka ihe atụ, n’ụzọ mkpasu iwe, nke inye iwu, mmadụ pụrụ ịgwa onye nke ọzọ: “Mechie ụzọ ahụ!” Ma lee ka okwu ndị bụ “Biko, mechitụ ụzọ ahụ,” bụ́ ndị e kwuru n’olu dị ala, nke nwere nghọta, si bụrụ nke “e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.”
22. Àgwà ndị dị aṅaa dị ndị di na nwunye mkpa iji nọgide na-enwe ezi nkwurịta okwu?
22 Ezi nkwurịta okwu na-aga nke ọma mgbe e nwere okwu ndị e ji nwayọọ ekwu, ile anya na mmegharị ahụ dị ọgọ, obi ọma, nghọta, na ịdị nro. Site n’ịrụsi ọrụ ike iji nọgide na-enwe ezi nkwurịta okwu, ma di ma nwunye ga-enwere onwe ha ikwupụta mkpa ha, ha pụkwara ịbụrịtara onwe ha isi iyi nke nkasi obi na enyemaka n’oge ndakpọ olileanya ma ọ bụ nrụgide. “Na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi,” ka Okwu Chineke na-agba ume. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) A ga-enwe oge mgbe di dara mbà n’obi na oge mgbe nwunye dịkwa otú ahụ. Ha pụrụ ‘ikwu okwu ngụgụ,’ na-ewuli ibe ha elu.—Ndị Rom 15:2.
23, 24. Olee ụzọ ịhụnanya na nkwanye ùgwù ga-esi nye aka mgbe a na-enweghị nkwekọrịta? Nye otu ihe atụ.
23 Ndị bụ di na nwunye na-egosipụta ịhụnanya na nkwanye ùgwù agaghị ele nghọtahie ọ bụla anya dị ka ihe ịma aka. Ha ga-arụsi ọrụ ike ịghara inwe “obi ilu” n’ebe ibe ha nọ. (Ndị Kọlọsi 3:19) Ha abụọ kwesịrị icheta na “ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.” (Ilu 15:1) Kpachara anya ka ị ghara ileda ma ọ bụ katọọ di ma ọ bụ nwunye nke na-ekwupụta mmetụta obi ya. Kama, lee okwu ndị dị otú ahụ anya dị ka ohere nke ịmata ihe onye nke ọzọ bu n’uche. N’ijikọta aka ọnụ, gbalịa idozi nsogbu ma bịaruo ná mkpebi e kwekọrịtara.
24 Cheta oge ahụ Sera tụụrụ di ya, bụ́ Abraham, aro ngwọta nke otu nsogbu ma o kwekọghị ná mmetụta di ya. Ma, Chineke gwara Abraham, sị: “Gee ntị n’olu ya.” (Jenesis 21:9-12) Abraham mere otú ahụ, a gọzikwara ya. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na nwunye atụọ aro dị iche n’ihe di ya bu n’uche, nwoke ahụ kwesịrị ma ọ dịghị ihe ọzọ ige ntị. N’otu oge ahụ, nwunye ekwesịghị ịbụ nanị onye a na-anụ olu ya ná mkparịta ụka ahụ kama o kwesịrị ige ntị ihe di ya nwere ikwu. (Ilu 25:24) Di ma ọ bụ nwunye ịdị na-esi ọnwụ ka a gbasoo ụzọ nke ya mgbe nile adịghị egosi ịhụnanya na nkwanye ùgwù.
25. Olee ụzọ ezi nkwurịta okwu ga-esi tinyekwuo obi ụtọ n’akụkụ ndị chiri anya nke ndụ alụmdi na nwunye?
25 Ezi nkwurịta okwu dịkwa mkpa ná mmekọrịta mmekọahụ nke di na nwunye. Ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na enweghị njide onwe onye pụrụ imebi n’ụzọ dị oké njọ mmekọrịta nke a kasị chie anya n’alụmdi na nwunye. Nkwurịta okwu ghere oghe, tinyere ndidi, dị mkpa. Mgbe onye nke ọ bụla n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-achọ ọdịmma onye nke ọzọ, mmekọahụ adịghị abụkebe nsogbu. Na nke a dị ka n’ihe ndị ọzọ, “ka onye ọ bụla ghara ịchọ ọdịmma nke aka ya, kama ọdịmma nke mmadụ ibe ya.”—1 Ndị Kọrint 7:3-5; 10:24.
26. Ọ bụ ezie na alụmdi na nwunye ọ bụla ga-enwe ahụmahụ ndị dị njọ na ndị dị mma, olee ụzọ ige Okwu Chineke ntị ga-esi nyere ndị di na nwunye aka inweta obi ụtọ?
26 Lee ndụmọdụ ọma nke Okwu Chineke na-enye! N’eziokwu, alụmdi na nwunye ọ bụla ga-enwe ahụmahụ ndị dị njọ na ndị dị mma. Ma mgbe ndị di na nwunye na-ekwenyere echiche Jehova, dị ka e kpughere na Bible, ma dabere mmekọrịta ha n’ịhụnanya ụkpụrụ na-achị na nkwanye ùgwù, ha pụrụ inwe obi ike na alụmdi na nwunye ha ga-adịgide adịgide, nweekwa obi ụtọ. Ha ga-esi otú a sọpụrụ ọ bụghị nanị onwe ha kamakwa Onye Mmalite nke alụmdi na nwunye, Jehova Chineke.