Na-ejegharịnụ Dị Ka Ndị Na-arụkọ Ọrụ n’Eziokwu Ahụ
Isi Ihe Ndị Sitere na Jọn nke Abụọ na nke Atọ
IHE ọmụma nke eziokwu ahụ bụ ihe e ji amata ndị na-efe Jehova. (Jọn 8:31, 32; 17:17) Ijegharị n’eziokwu nke Chineke bara uru maka nzọpụta. Ndị ohu Chineke aghaghịkwa iso rụkọọ ọrụ n’eziokwu ahụ.
Akwụkwọ ozi nke abụọ na nke atọ ndị Jọn onyeozi ji ike mmụọ nsọ dee na-ekwu banyere ‘ijegharị n’ime eziokwu.’ (2 Jọn 4; 3 Jọn 3, 4) Jọn nke atọ na-agbakwa ume inyerịta nkwado dị ka “ndị sooro eziokwu ahụ na-arụkọ ọrụ.” (3 Jọn 5-8) O yikarịrị ka e dere akwụkwọ ozi abụọ ndị a n’Efesọs ma ọ bụ na nso ebe ahụ n’ihe dị ka 98 O.A. Ma ihe ha na-ekwu pụrụ inyere ndị Jehova aka n’oge a.
Jọn nke Abụọ Na-emesi Eziokwu Ike
Jọn nke Abụọ bu ụzọ mesie okwu ike banyere eziokwu na ịhụnanya ma dọọ aka ná ntị banyere “onye ahụ na-emegide Kraịst.” (Amaokwu 1-7) Onye e degaara akwụkwọ ozi a bụ “nwanyị nwe mmadụ, bụ́ onye a họpụtaworo,” ma eleghị anya ọ bụ otu onye. Ma ọ bụrụ na e zigaara ya ọgbakọ, “ụmụ” ya bụ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụọ, bụ́ ndị Chineke ‘họpụtara maka ndụ eluigwe.’ (Ndị Rom 8:16, 17; Ndị Filipaị 3:12-14) Jọn ṅụrịrị ọṅụ n’ihi na ụfọdụ ndị “na-ejegharị n’ime eziokwu” wee si otú a na-eguzogide isi n’ezi ofufe dapụ. Ma, ọ dị ha mkpa ịnọ ná nche banyere “onye ahụ na-emegide Kraịst,” bụ́ onye na-agọnarị na Jisọs bịara n’anụ ahụ. Ndịàmà Jehova taa na-egekwa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ megide ịdapụ n’ezi ofufe.
Jọn gakwara n’ihu inye ndụmọdụ banyere ụzọ a ga-esi mesoo ndị dapụrụ n’ezi ofufe ma jiri ihe bụ ọchịchọ ya banyere ha nakwa ekele mechie. (Amaokwu 8-13) Site n’ọrụ ndị dị otú ahụ dị ka ime nkwusa, ya na ndị ọzọ amịpụtawo mkpụrụ nke mere ka a tọghata ndị ọzọ bụ́ ndị o zigaara akwụkwọ ozi ya. Ọ bụ nanị site ‘n’ilezi onwe ha anya’ n’ụzọ ime mmụọ ka ha ga-enwe ike ‘ịnata ụgwọ ọrụ zuru ezu,’ bụ́ nke o doro anya na ọ gụnyere “okpueze” eluigwe nke e debeere ndị ahụ e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi. (2 Timoti 4:7, 8) Ọ bụrụ na onye ọ bụla “nke na-adịghị anọgidekwa n’ime ozizi nke Kraịst anyị” abịakwute ha, ha ekwesịghị ‘ịkpọbata ya n’ụlọ, ma ọ bụ ikele ya ekele’ ka ha ghara isoro ya nwekọọ “ọrụ ya nile, nke bụ ajọ ọrụ.” Mgbe o gosipụtasịrị olileanya na ya ga-abịa soro ndị kwere ekwe ibe ya dị otú a kwurịta okwu ihu na ihu, Jọn ji ekele mechie.
Jọn nke Atọ Na-emesi Inyerịta Nkwado Ike
E degaara Gaịọs Jọn nke Atọ ma buru ụzọ gosi na a matara ihe ọ na-emere ndị kwere ekwe ibe ya. (Amaokwu 1-8) Gaịọs “na-ejegharị n’eziokwu” site n’ikwenye n’ozizi nile nke ndị Kraịst. Ọ ‘na-arụkwa ọrụ kwesịrị ntụkwasị obi’ n’ijere ụmụnna ndị bụ ọbịa ozi. Jọn dere, sị: “Anyị . . . ji ụgwọ ịkpọbata mmadụ dị otú a ka anyị wee bụrụkwa ndị sooro eziokwu ahụ na-arụkọ ọrụ.” Ndịàmà Jehova na-agbasapụ ile ọbịa anya nke ọma n’ụzọ yiri nke a nye ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị taa.
Mgbe o kwupụtasịrị ọdịiche dị n’omume ọjọọ nke Dịọtrefis na omume ọma nke Dimitriọs, Jọn mechiri akwụkwọ ozi ya. (Amaokwu 9-14) Dịọtrefis bụ́ onye na-achọrọ onwe ya otuto egosighị nsọpụrụ ọ bụla maka Jọn ọbụnakwa na ọ gbalịrị isi n’ọgbakọ chụpụ ndị ji omume ile ọbịa anya nke ọma na-anabata ụmụnna ahụ. Ma otú ọ dị, a kpọtụrụ uche n’otu onye a na-akpọ Dimitriọs dị ka ezi ihe nlereanya. Jọn nwere olileanya ịhụ Gaịọs n’oge na-adịghị anya ma jiri ekele na ọchịchọ obi ya nke bụ ka Gaịọs nwee udo mechie.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 30]
Ihe E Ji Akwụkwọ, Pen, na Ink Dee: Jọn nwere ọchịchọ nke ịbịa hụ “nwanyị nwe mmadụ, bụ́ onye a họpụtaworo” na “ụmụ” ya kama iji “akwụkwọ na ink” deere ha ọtụtụ ihe. Kama ịnọgide na-eji “ink na pen” na-edegara Gaịọs akwụkwọ, onyeozi ahụ nwere olileanya ịhụ ya n’oge na-adịghị anya. (2 Jọn 1, 12; 3 Jọn 1, 13, 14) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “pen” (kaʹla·mos) na-ezo aka na mkpịsị ma ọ bụ amì, a pụkwara ịsụgharị ya ịbụ “mkpịsị e ji ede ihe.” N’etiti ndị Grik na ndị Rom, pen e ji ụdị mkpịsị a mee na-akapị ọnụ, nweekwa mgbawa dị ka pen e ji ábụ́bà nnụnụ mee, bụ́ ndị e mesịrị nwee. Okwu Grik ahụ bụ meʹlan, bụ́ nke a sụgharịrị ịpụta “ink,” bụ ụdịdị na-egosi ihe nkịtị nke okwu ahụ na-akọwa ihe nke na-egosi ihe bụ oké, bụ́ meʹlas, nke pụtara ihe “dị oji.” Na ink ndị kasị mee ochie e nwere, ụdị ihe e ji emepụta ụcha nke dị n’ime ya bụ ihe na-eji oji nke sitere na carbon—bụ́ ụdịdị nke ntụ ojii e nwetara site n’isure mmanụ ma ọ bụ nkụ n’ọkụ, ma ọ bụ unyi nke kpụkọrọ akpụkọ nke sitere n’akwụkwọ ihe ọkụkụ ma ọ bụ ihe si n’anụmanụ. Dị ka o si adịkarị, a na-echekwa ink n’ógbè ndị a mịkpọrọ amịkpọ, bụ́ nke onye odeakwụkwọ na-etinye mmiri na ya ma jiri brush ma ọ bụ mkpịsị ya na-edesuru ya. Akwụkwọ e nwere n’oge ndị ahụ bụ ihe dị fere fere nke a na-eme ka ọ ghọọ akwụkwọ site n’iji eriri ndị e nwetara site n’osisi papyrus. Ndị Kraịst oge gboo ji akwụkwọ ndị dị otú ahụ mee ihe n’ide akwụkwọ ozi, akwụkwọ mpịakọta, na ihe odide codex dị iche iche.