Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 11/1 p. 15
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-ejegharịnụ Dị Ka Ndị Na-arụkọ Ọrụ n’Eziokwu Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Tatiọs—Odeakwụkwọ Pọl Nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • “Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 11/1 p. 15

Ị̀ Maara?

Olee ụdị mkpịsị akwụkwọ na ụdị ink e ji ede ihe n’oge e dere Baịbụl?

▪ Mgbe Jọn onyeozi na-emechi akwụkwọ ozi ya nke atọ, bụ́ nke so n’akwụkwọ ndị dị na Baịbụl, o kwuru, sị: “M nwere ọtụtụ ihe m ga-edetara gị akwụkwọ banyere ha, ma achọghị m iji ink na mkpịsị akwụkwọ na-edetara gị ha.” Ọ bụrụ na a sụgharịa okwu Grik ndị Jọn dere n’amaokwu a kpọmkwem otú o si dee ha, a ga-asị na ihe o kwuru bụ na ya achọkwaghị iji ink ojii na okporo ahịhịa amị detara ha akwụkwọ ozi.—3 Jọn 13.

Mkpịsị akwụkwọ odeakwụkwọ ji ede ihe n’oge ahụ bụ okporo ahịhịa amị siri ike. A na-achabi otu isi ya ka ọ pịa ọnụ. Ọ bụrụ na odeakwụkwọ achọọ ịpị ọnụ okporo ahịhịa amị ahụ, ọ na-eji nkume na-akwọghị mụrụmụrụ pịa ya. Ọ na-abụ a pịchaa ya, ya apịa ọnụ ka bik e ji ede ihe n’oge a.

Ọtụtụ mgbe, ihe e ji arụ ink ahụ bụ unyì na esó. Ọ na-abụ a gwakọta esó ahụ na unyì ahụ, ha akpụkọta ọnụ. A na-ere ya ma ọ kpọọ akpọọ. Ma, tupu mmadụ ejiri ya dee ihe, onye ahụ ga-atanyetụ ya mmiri otú o kwesịrị. Ọ na-abụ e jiri ink a dee ihe n’akwụkwọ e ji papaịrọs mee ma ọ bụ nke e ji akpụkpọ anụ mee, akwụkwọ ahụ anaghị amịkọrọ ink a, kama ink a na-akpọ akpọ n’elu ya. Ọ bụ ya mere na ọ naghị esiri onye dehiere ihe ike iji ogbo dị mmiri mmiri hichapụ ihe ahụ o dehiere ma dezigharịa ya. Ọ ga-abụ na ogbo so n’ihe odeakwụkwọ ji arụ ọrụ. Ihe a e kwuru banyere ink e ji ede ihe n’oge ochie na-eme ka anyị ghọta ihe ndị so dee Baịbụl bu n’obi mgbe ha kwuru na Chineke nwere ike ihichapụ aha mmadụ n’akwụkwọ ncheta ya.—Ọpụpụ 32:32, 33; Mkpughe 3:5.

Olee ụdị ákwà ụlọikwuu Pọl onyeozi kpara?

▪ Ọrụ Ndịozi 18:3 kwuru na aka ọrụ Pọl onyeozi bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu. N’oge a na-ede Baịbụl, ndị na-akpa ákwà ụlọikwuu na-eji ajị kamel ma ọ bụ ajị ewu ekwe ibé ákwà dị iche iche. Ha kwechaa ha, ha na-adụkọta ibé ákwà ndị ahụ ka ha ghọọ ákwà ụlọikwuu ndị mmadụ na-eji eme njem. Ma n’oge Pọl, ọ bụ akpụkpọ anụ ka a na-ejikarị akpa ákwà ụlọikwuu. Ihe ọzọ e ji akpa ákwà ụlọikwuu bụ ákwà linin. A na-emepụta ákwà linin a na Tasọs, bụ́ obodo Pọl. O nwere ike ịbụ na ihe Pọl ji akpa ákwà ụlọikwuu bụ ajị kamel ma ọ bụ ajị ewu ma ọ bụkwanụ ákwà linin. O nwekwara ike ịbụ na o jicha ha niile kpaa ákwà ụlọikwuu. Ma mgbe Pọl na Akwịla rụkọrọ ọrụ, ọ ga-abụ na ihe ha na-akpa bụ ákwà e ji ekpuchi ogige ụlọ ka anwụ ghara ịchagbu ndị mmadụ.

Ọ ga-abụ na Pọl mụrụ aka ọrụ a mgbe ọ bụ nwata. Ihe ndị Ijipt dere n’akwụkwọ e ji papaịrọs mee gosiri na n’oge ndị Rom na-achị ụwa, ụmụaka na-amalite ịmụ ọrụ mgbe ha dị ihe dị ka afọ iri na atọ. Ọ bụrụ na Pọl dị afọ iri na atọ bido ịmụ ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu, mgbe ọ na-erule afọ iri na ise ma ọ bụ afọ iri na isii, ọrụ ahụ edoola ya anya. Otu akwụkwọ kwuru na “mgbe Pọl mụchara ọrụ, ọ ga-abụ na e nyere ya ngwá ọrụ nke ya.” Akwụkwọ ahụ kwukwara na ‘naanị ihe dị mmadụ mkpa iji rụọ ọrụ ahụ bụ mma na agịga. Ọ bụ ya mere ịkpa ákwà ụlọikwuu ji bụrụ ọrụ mmadụ nwere ike ịnọ ebe ọ bụla ọ gara na-arụ.’ Ọ bụkwa ya mere o ji dịrị Pọl mfe ịrụ ọrụ a iji kpaa afọ ya mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ.

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 15]

Mkpịsị akwụkwọ ndị Ijipt e ji okporo osisi amị mee. e mere ha n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Image Asset Management/age fotostock

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 15]

Ihe ndị e ji akpa ákwà n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga

[Ebe E Si Nweta Foto]

Erich Lessing/Art Resource, NY

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya