Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bt isi 19 p. 148-155
  • “Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Aka Ọrụ Ha Bụ Ịkpa Ákwà Ụlọikwuu” (Ọrụ 18:1-4)
  • “Ọtụtụ n’Ime Ndị Kọrịnt . . . Kwekwaara” (Ọrụ 18:5-8)
  • “E Nwere Ọtụtụ Ndị n’Obodo A Ga-ekwere na M” (Ọrụ 18:9-17)
  • “Ma Ọ Bụrụ Uche Jehova” (Ọrụ 18:18-22)
  • Akwila na Prisila Di na Nwunye Bụ Ezi Ihe Nlereanya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Okwu Jehova Na-Enwe Mmeri!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • “Ọbara Onye Ọ Bụla A Na-azọpụtaghị Adịghị M n’Isi”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
bt isi 19 p. 148-155

ISI NKE 19

“Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”

Pọl rụrụ ọrụ o ji na-egboro onwe ya mkpa ya, ma, o lekwasịrị anya n’ozi ya

O Si n’Ọrụ Ndịozi 18:1-22

1-3. Gịnị mere Pọl onyeozi ji gaa Kọrịnt, oleekwa ihe ndị nwere ike ịna-echegbu ya?

NÁ NGWỤCHA afọ 50 O.N.K., Pọl onyeozi nọ na Kọrịnt. Kọrịnt bụ obodo bara ọgaranya e ji azụmahịa mara. Ọtụtụ ndị Grik, ndị Rom, na ndị Juu bi na ya.a Pọl abịaghị ebe a ịzụ ahịa ma ọ bụ ịchọ ọrụ. Ọ bịara ime ihe dị mkpa karịa ihe ndị ahụ, ya bụ, ịgba àmà banyere Alaeze Chineke. Ma, Pọl chọrọ ebe ọ ga-ebi, ọ chọghịkwa ịbụrụ ndị ọzọ ibu arọ. Ọ chọghị ime ka onye ọ bụla chee na ya na-ekwusa okwu Chineke ka ndị mmadụ na-enye ya ego. Gịnịzi ka ọ ga-eme?

2 Pọl nwere aka ọrụ. Ọ na-akpa ákwà ụlọikwuu. Ọrụ a adịghị mfe, ma Pọl dị njikere ịrụ ya iji na-egboro onwe ya mkpa ya. Ma, ọrụ a ọ̀ ga-aga aga n’obodo a na-ekwo ekwo? Ọ̀ ga-enweta ebe dị mma ọ ga-ebi? N’agbanyeghị ihe ndị a na-echegbu Pọl, o chefughị ọrụ bụ́ isi o nwere ịrụ, ya bụ, ikwusa ozi ọma.

3 Pọl mechara nọtụ na Kọrịnt, ozi o jere n’obodo a rụpụtakwara ọtụtụ ihe ọma. Olee ihe anyị ga-amụta n’ọrụ Pọl rụrụ na Kọrịnt nke ga-enyere anyị aka ịgba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke n’ókèala anyị?

KỌRỊNT BỤ OBODO NWERE ỌDỤ ỤGBỌ MMIRI ABỤỌ

Obodo Kọrịnt oge ochie dị n’ala dị warara nke jikọrọ ebe ndịda Gris na mpaghara Gris nke ọzọ. Ebe na-asachaghị mbara n’ala ahụ erughị kilomita isii n’obosara. N’ihi ya, Kọrịnt nwere ọdụ ụgbọ mmiri abụọ. Ọdụ ụgbọ mmiri nke a na-akpọ Lekeọm dị n’ebe ọdịda anyanwụ Kọrịnt. Ụgbọ mmiri ndị si Ịtali, Sisili, na Spen na-abata na ya ma na-apụ. Ọdụ ụgbọ mmiri nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ya bụ, na Senkrea, bụ maka ụgbọ mmiri ndị na-esi ná mpaghara Oké Osimiri Ejiyan, Eshia Maịnọ, Siria, na Ijipt na-abata ma na-apụ.

Ebe ọ bụ na a na-enwekarị oké ifufe n’ebe ndịda Gris, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri anaghị achọ ịkwọrọ ụgbọ gafere ebe ahụ ka ụgbọ ha ghara ikpu. Kama, ọ na-akara ha mma ịkwụsị ụgbọ mmiri ha n’otu n’ime ọdụ ụgbọ mmiri abụọ ahụ dị na Kọrịnt. Ha na-esizi n’okporo ụzọ buga ibu ha n’ọdụ ụgbọ mmiri nke ọzọ ma buba ha n’ụgbọ mmiri ọzọ. Ọ bụrụ na ụgbọ mmiri adịghị arọ, e nwedịrị ike isi n’ihe pụrụ iche a rụrụ n’ala ahụ dị warara dọkpụrụ ya gafee n’ọdụ ụgbọ mmiri nke ọzọ. Ebe ọ bụ na Kọrịnt dị n’etiti, ọtụtụ ndị ahịa na-abata na ya. Ha na-esi n’okporo ụzọ, na-esikwa n’oké osimiri abịa azụ ma na-ere ahịa. Ha na-ebubatakwa ego n’obodo ahụ. Ma, ebe ọ bụ na omume ha rụrụ arụ, ha mekwara ka Kọrịnt bụrụ obodo rụrụ arụ.

N’oge Pọl onyeozi, Kọrịnt bụ isi obodo Akeya, bụrụkwa ebe ndị Rom si na-achị ógbè Akeya niile. E nwere okpukpe dị iche iche na Kọrịnt. Dị ka ihe atụ, e nwere ụlọ a rụrụ maka ife Eze Ukwu Rom, nweekwa ọtụtụ ụlọ arụsị a rụrụ maka ife chi ndị Grik na chi ndị Ijipt, nweekwa ụlọ nzukọ ndị Juu.​—Ọrụ 18:4.

N’afọ abụọ ọ bụla, a na-enwe asọmpi n’ebe a na-akpọ Istmia nke dị nso na Kọrịnt. Naanị egwuregwu na-ewu ewu karịa ya bụ Egwuregwu Olimpik. Ọ ga-abụ na Pọl onyeozi nọ na Kọrịnt mgbe e nwere asọmpi ahụ n’afọ 51 O.N.K. Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl ji kwuo na “ọ bụghị ihe iju anya na oge mbụ Pọl ji ndị na-eme egwuregwu mee ihe atụ bụ n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kọrịnt.”​—1 Kọr. 9:24-27.

“Aka Ọrụ Ha Bụ Ịkpa Ákwà Ụlọikwuu” (Ọrụ 18:1-4)

4, 5. (a) Olee ebe Pọl bi mgbe ọ nọ na Kọrịnt, oleekwa ọrụ ọ rụrụ? (b) Olee otú Pọl si mụta ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu?

4 Mgbe Pọl rutere Kọrịnt, nọtụ ntakịrị, ọ hụrụ onye Juu aha ya bụ Akwịla, na nwunye ya bụ́ Prisila ma ọ bụ Priska. Ha na-ele ọbịa nke ọma. Di na nwunye a gara biri na Kọrịnt n’ihi na Eze Ukwu bụ́ Klọdiọs “gwara ndị Juu niile ka ha pụọ na Rom.” (Ọrụ 18:1, 2) Akwịla na Prisila kpọbatara Pọl n’ụlọ ha, kwetakwa ka ha na ya rụkọọ ọrụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ebe ya na ha nwere otu ụdị aka ọrụ, ọ gara biri n’ụlọ ha. Ya na ha na-arụkọkwa ọrụ, n’ihi na aka ọrụ ha bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu.” (Ọrụ 18:3) Ọ bụ n’ụlọ di na nwunye a dị obiọma ka Pọl bi mgbe ọ na-eje ozi na Kọrịnt. O nwere ike ịbụ n’oge ahụ Pọl bi n’ụlọ Akwịla na Prisila ka o dere ụfọdụ akwụkwọ ozi ndị mechara soro n’akwụkwọ ndị dị na Baịbụl.b

5 Olee otú Pọl, onye ‘Gameliel kụziiri ihe,’ sizi bụrụ onye na-akpa ákwà ụlọikwuu? (Ọrụ 22:3) N’oge ochie, ndị Juu echeghị na ịkụziri ụmụ ha aka ọrụ bụ iwetu ezinụlọ ha ala, n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na ụmụ ha gụkwara ezigbo akwụkwọ. O nwere ike ịbụ na Pọl mụrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu mgbe ọ ka na-eto eto ebe ọ bụ onye Tasọs nke dị na Silishia. Ihe e ji mara obodo Tasọs bụ ákwà a na-akpọ silishiọm. A na-eji ákwà a akpa ákwà ụlọikwuu. Gịnị na gịnị so n’ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu? O nwere ike ịbụ ịkpa ákwà e ji arụ ụlọikwuu ma ọ bụ ịcha nke a kparala akpa nakwa ịdụkọta ha ọnụ. Nke ọ bụla ọ bụ, ọrụ a adịghị mfe n’ihi na ákwà ya na-esi ike.

6, 7. (a) Olee otú Pọl si were ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu, oleekwa ihe gosiri na Akwịla na Prisila wekwaara ya otú ahụ? (b) Olee otú Ndị Kraịst nke oge a si eme ka Pọl, Akwịla, na Prisila?

6 Pọl ewereghị ịkpa ákwà ụlọikwuu ka ọrụ kacha mkpa ọ ga na-arụ. Ọ rụrụ ọrụ a naanị iji na-enyere onwe ya aka n’ozi ya, ka o nwee ike ikwusa ozi ọma ‘n’anaghị ụmụnna ya ihe ọ bụla.’ (2 Kọr. 11:7) Oleekwanụ otú Akwịla na Prisila si lee aka ọrụ ha anya? Ebe ha bụ Ndị Kraịst, o doro anya na ha lere ya anya otú ahụ Pọl si lee ya. N’eziokwu, mgbe Pọl hapụrụ Kọrịnt n’afọ 52 O.N.K., Akwịla na Prisila hapụrụ aka ọrụ ha ma soro ya gaa Efesọs. N’ebe ahụ, e ji ụlọ ha mere ebe ọgbakọ na-anọ amụ ihe. (1 Kọr. 16:19) Ha mechara laghachi Rom, mechaakwa lọta Efesọs. Di na nwunye a na-anụ ọkụ n’obi ji ihe ndị gbasara Alaeze Chineke kpọrọ ihe, jirikwa obi ha niile jeere ndị ọzọ ozi. Ọ bụ ya mere “ọgbakọ niile dị ná mba dị iche iche” ji na-ekele ha.​—Rom 16:3-5; 2 Tim. 4:19.

7 Ndị Kraịst nke oge anyị a na-eme ka Pọl, Akwịla, na Prisila. Ụmụnna ndị na-anụ ọkụ n’obi taa na-arụsi ọrụ ike ‘ka ha ghara ịbụrụ onye ọ bụla ibu arọ.’ (1 Tesa. 2:9) E kwesịrị ịja ọtụtụ ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile mma n’ihi na ha na-arụ ọrụ ụbọchị ụfọdụ n’izu ma ọ bụ ọrụ na-eme ná ndapụta iji na-enyere onwe ha aka ịrụ ọrụ kacha mkpa ha na-arụ, ya bụ, ikwusa ozi ọma. Ọtụtụ ndị ohu Jehova na-emesapụ aka ka Akwịla na Prisila. Ha na-anabata ndị nlekọta sekit n’ụlọ ha. Ndị si otú a ‘ele ọbịa’ ma na ọbịa ha na-ele na-agba ha ume, na-emekwa ka okwukwe ha sie ike.​—Rom 12:13.

AKWỤKWỌ OZI NDỊ NA-AGBA UME PỌL SI N’IKE MMỤỌ NSỌ DEE

N’ime otu afọ na ọnwa isii Pọl onyeozi nọrọ na Kọrịnt, ya bụ, malite n’ihe dị ka afọ 50 O.N.K. ruo n’afọ 52 O.N.K., o dere akwụkwọ ozi abụọ, ma ọ dịkarịa ala, ndị mechara soro n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Akwụkwọ ozi ndị ahụ bụ Ndị Tesalonaịka nke Mbụ na nke Abụọ. O dere akwụkwọ ozi o degaara ndị Galeshia n’otu oge ahụ ma ọ bụ mgbe obere oge gafetụrụ.

Ndị Tesalonaịka nke Mbụ bụ akwụkwọ ozi mbụ Pọl si n’ike mmụọ nsọ dee. Pọl gara Tesalonaịka n’ihe dị ka afọ 50 O.N.K. na njem nke abụọ ọ gara ikwusa ozi ọma. Obere oge e nwechara ọgbakọ n’ebe ahụ, a malitere ịkpagbu ụmụnna nọ n’ọgbakọ ahụ. Mkpagbu a mere ka Pọl na Saịlas hapụ obodo ahụ. (Ọrụ 17:1-10, 13) Ebe ọ bụ na ihe banyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ na-emetụ Pọl n’obi, ọ gbalịrị ugboro abụọ ịgaghachi obodo ahụ, ma “Setan nọchiiri [ya] ụzọ.” N’ihi ya, Pọl zigara Timoti ka ọ gaa kasie ụmụnna ahụ obi ma gbaa ha ume. Ọ ga-abụ na Timoti laghachikwuuru Pọl na Kọrịnt ná ngwụcha afọ 50 O.N.K. ma kọọrọ ya akụkọ ọma banyere ọgbakọ Tesalonaịka. Mgbe e mechara, Pọl degaara ha akwụkwọ ozi a.​—1 Tesa. 2:17–3:7.

Ọ ga-abụ na Pọl dere Ndị Tesalonaịka nke Abụọ ozugbo o dechara nke mbụ. O nwere ike ịbụ na o dere ya n’afọ 51 O.N.K. N’akwụkwọ ozi abụọ ahụ, Timoti na Silvenọs (onye a kpọrọ Saịlas n’Ọrụ Ndịozi) so Pọl zigara ụmụnna ndị Tesalonaịka ozi ekele, ma o nweghị ihe e dere na Baịbụl gosiri na ha atọ bịakọtara ọnụ ọzọ mgbe Pọl hapụchara Kọrịnt. (Ọrụ 18:5, 18; 1 Tesa. 1:1; 2 Tesa. 1:1) Ma, olee ihe mere Pọl ji dee akwụkwọ ozi nke abụọ a? Ọ ga-abụ na a kọọrọ ya ihe ndị ọzọ banyere ọgbakọ ahụ. O nwere ike ịbụ onye ahụ o si n’aka ya zigara ha akwụkwọ ozi nke mbụ kọọrọ ya ihe ndị ahụ. Ihe a kọọrọ Pọl mere ka ọ jaa ụmụnna ahụ mma n’ihi ịhụnanya ha nwere na otú ha si atachi obi, meekwa ka ọ gbazie ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ, bụ́ ndị nọ na-ekwu na ọnụnọ Onyenwe anyị eruola eruo.​—2 Tesa. 1:3-12; 2:1, 2.

Akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Galeshia gosiri na o letara ha ọ dịkarịa ala ugboro abụọ tupu ya edegara ha akwụkwọ ozi. N’agbata afọ 47 O.N.K. na afọ 48 O.N.K., Pọl na Banabas gara Antiọk nke dị na Pisidia, Aịkoniọm, Listra, na Dabe. Obodo ndị a dị n’ógbè Galeshia bụ́ ebe ndị Rom na-achị. N’afọ 49 O.N.K., Pọl na Saịlas laghachiri ebe ahụ. (Ọrụ 13:1–14:23; 16:1-6) Ihe mere Pọl ji dee akwụkwọ ozi a bụ na ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu, bụ́ ndị bịara ebe ahụ ozugbo Pọl lawara, nọ na-akụzi na e kwesịrị ibi Ndị Kraịst úgwù, nakwa na ha kwesịrị ịna-edebe Iwu Mosis. O doro anya na Pọl degaara ndị Galeshia akwụkwọ ozi a ozugbo ọ nụrụ gbasara nkụzi ụgha a. O nwere ike ịbụ na ọ nọ na Kọrịnt dee ya. Ma, o nwekwara ike ịbụ na ọ nọ n’Efesọs dee ya mgbe ọ kwụsịtụrụ ebe ahụ n’oge ọ na-alaghachi Antiọk nke Siria ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ nọ n’Antiọk dee ya.​—Ọrụ 18:18-23.

“Ọtụtụ n’Ime Ndị Kọrịnt . . . Kwekwaara” (Ọrụ 18:5-8)

8, 9. Olee ihe Pọl mere mgbe ndị Juu megidewere ya n’ihi ozi ọma ọ nọ na-ekwusasi ike, oleezi ebe ọ gara na-ezi ozi ọma?

8 Ihe Pọl mere mgbe Saịlas na Timoti si na Masedonia wetara ya onyinye ndị e nyere ya gosiri na ihe mere o ji na-arụ ọrụ ego bụ ka o jiri ya na-enyere onwe ya aka n’ozi ya. (2 Kọr. 11:9) Ozugbo ahụ, Pọl “malitere iji oge ya niile na-ekwusa okwu Chineke.” Otú e si kwuo ya na Baịbụl ọzọ bụ: “Pọl tinyere oge ya nile ikwu okwu Chineke.” [Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society] (Ọrụ 18:5) Ma, ndị Juu megidewere Pọl n’ihi ozi ọma ọ nọ na-ekwusasiri ha ike. Ebe ọ bụ na ndị Juu ahụ na-emegide Pọl achọghị ịnụ ozi ọma banyere Kraịst nke na-azọpụta ndị mmadụ, ọ gwara ha na ọbara ha adịghị ya n’isi. O fechara uwe ya ma sị ha: “Ka ọbara unu dị unu n’isi. Aka m dị ọcha. Si ugbu a gawa, m ga-ejekwuru ndị mba ọzọ.”​—Ọrụ 18:6; Ezik. 3:18, 19.

9 Oleezi ebe Pọl ga-aga zie ozi ọma? Otu nwoke aha ya bụ Tishiọs Jọstọs, onye ụlọ ya dị n’akụkụ ụlọ nzukọ ndị Juu, gwara Pọl ka ọ bịa n’ụlọ ya. Ọ ga-abụ na nwoke a bụ onye mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu. N’ihi ya, Pọl kwụsịrị ikwusa ozi ọma n’ụlọ nzukọ ndị Juu nọrọzie n’ụlọ Jọstọs na-ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 18:7) Pọl bi n’ụlọ Akwịla na Prisila mgbe ọ nọ na Kọrịnt, ma, ọ bụ n’ụlọ Jọstọs ka ọ na-anọkarị ekwusa ozi ọma.

10. Olee ihe gosiri na Pọl ekpebighị na ọ bụzi naanị ndị mba ọzọ ka ọ ga na-ezi ozi ọma?

10 Mgbe Pọl kwuru na ya na-agakwuruzi ndị mba ọzọ ọ̀ pụtara na ọ kwụsịchara izi ndị Juu niile na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu ozi ọma, ma ndị nke chọrọ ige ntị? Mbanụ! Dị ka ihe atụ, “Krispọs, onyeisi oche nke ụlọ nzukọ, na ezinụlọ ya niile, kweere n’Onyenwe anyị.” Ọ ga-abụ na e nwere ndị na-anọ n’ụlọ nzukọ ndị Juu ahụ sooro Krispọs n’ihi na Baịbụl sịrị: “Ọtụtụ n’ime ndị Kọrịnt, ndị nụrụ okwu Chineke, kwekwaara, e mee ha baptizim.” (Ọrụ 18:8) Ụlọ Tishiọs Jọstọs ghọziri ebe ọgbakọ ọhụrụ ahụ dị na Kọrịnt na-anọ amụ ihe. Ọ bụrụ na Luk dere ihe ndị ọ kọrọ n’Ọrụ Ndịozi n’usoro ha si mee, otú ọ na-emekarị, ọ pụtara na ndị Juu ahụ ma ọ bụ ndị mba ọzọ ahụ na-ekpe okpukpe ndị Juu chegharịrị mgbe Pọl fechasịrịla uwe ya. Ihe a merenụ gosiri na Pọl na-agbanwe otú o si ezi ozi ọma mgbe o kwesịrị ime otú ahụ.

11. Olee otú Ndịàmà Jehova si eme ka Pọl mgbe ha na-ezi ndị chọọchị ozi ọma?

11 N’ọtụtụ mba taa, e nwere ọtụtụ chọọchị ndị dịwarala kemgbe, ha jikwa ndị òtù ha aka ọjọọ. Chọọchị ndị a ezipụla ndị òtù ha n’ebe dị iche iche n’ụwa, ndị a ha zipụrụ akpọbatakwala ọtụtụ ndị na chọọchị ha. Ma, ihe na-aka ndị a sịrị na ha bụ Ndị Kraịst mkpa bụ omenala chọọchị ha, ọ bụghị ime ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ọ bụ otu ihe ahụ mere ndị Juu bi na Kọrịnt n’oge ndịozi. Ma anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-eme ka Pọl. Anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi aga ezi ndị dị otú ahụ ozi ọma, na-enyere ha aka ịghọtakwu ihe ha na-agụ n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụgodị na hanwa ma ọ bụ ndị isi chọọchị ha emegidewe anyị, anyị anaghị ada mbà. N’ime ndị ‘na-anụ ọkụ n’obi ijere Chineke ozi, ma ha amaghị Chineke nke ọma,’ e nwere ike inwe ọtụtụ ndị dị umeala n’obi e kwesịrị ịchọ ma chọta.​—Rom 10:2.

“E Nwere Ọtụtụ Ndị n’Obodo A Ga-ekwere na M” (Ọrụ 18:9-17)

12. Olee otú ọhụụ Pọl hụrụ si gbaa ya ume?

12 Ọ bụrụ na ịnọ na Kọrịnt na-ekwusa ozi ọma emewela Pọl obi abụọ, ọ ga-abụrịrị na ọ kwụsịrị inwe obi abụọ ahụ mgbe Onyenwe anyị Jizọs pụtara n’ihu ya n’ọhụụ ma gwa ya, sị: “Ụjọ atụla gị, kama na-ekwusa ozi ọma, adala mbà, n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị n’obodo a ga-ekwere na m.” (Ọrụ 18:9, 10) N’eziokwu, ọhụụ ahụ gbara ya ume. Onyenwe anyị ji aka ya mee ka obi sie Pọl ike na ọ ga-echebe ya nakwa na o nwere ọtụtụ ndị e kwesịrị izi ozi ọma n’obodo ahụ. Olee ihe Pọl mere mgbe ọ hụchara ọhụụ ahụ? Baịbụl kwuru, sị: Ọ “nọrọ ebe ahụ otu afọ na ọnwa isii, na-akụziri ndị mmadụ okwu Chineke.”​—Ọrụ 18:11.

13. Olee ihe ọ ga-abụ na Pọl chetara mgbe ọ na-abịarute ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe, ma olee ihe mere ọ ga-eji tụọ anya na ọkọ agaghị akọ ya?

13 Mgbe Pọl nọrọla ihe dị ka otu afọ na Kọrịnt, Onyenwe anyị mere ka o dokwuo ya anya na ọ kwụ ya n’azụ. N’oge ahụ, “ndị Juu ji otu obi bịa imesi Pọl ike. Ha kpụụrụ ya gaa ebe a na-anọ ekpe ikpe,” nke a na-akpọ beʹma n’asụsụ Grik. (Ọrụ 18:12) Ụfọdụ ndị kwuru na beʹma bụ ebe a kpụliri elu, nke e ji nkume mabụl na-acha ọcha nakwa anụnụ anụnụ rụọ, jirikwa ọtụtụ ihe a tụrụ atụ́ chọọ ya mma. Ha sịrị na o nwere ike ịbụ na ọ dị nso n’etiti ahịa dị na Kọrịnt. Mbara ala dị n’ihu ya na-aba ìgwè mmadụ buru ibu. Ihe ndị mgbe ochie chọpụtara gosiri na o nwere ike ịbụ na ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe dị ezigbo nso n’ụlọ nzukọ ndị Juu, dịrịkwa nso n’ụlọ Jọstọs. Ka Pọl na-abịarute n’ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe, ọ ga-abụ na o chetara otú e si jiri nkume tụgbuo Stivin, Onye Kraịst mbụ e gburu n’ihi okwukwe ya. Pọl, onye a na-akpọ Sọl mgbe ahụ, kwadoro “ogbugbu e gburu Stivin.” (Ọrụ 8:1) Ụdị ihe ahụ ọ̀ ga-eme Pọl ugbu a? Mba, n’ihi na e kwela ya nkwa, sị: ‘O nweghị onye ga-emerụ gị ahụ́.’​—Ọrụ 18:10.

Ebe Galio na-akagbu ebubo e boro Pọl n’ihu ndị boro ya ebubo iwe ji. Ndị agha Rom na-agbalị ime ka ìgwè mmadụ ahụ iwe ji ghara ịkpa aghara.

“O wee chụpụ ha ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe.”​—Ọrụ 18:16

14, 15. (a) Olee ebubo ndị Juu boro Pọl, oleekwa ihe mere Galio ji kagbuo ebubo ahụ? (b) Gịnị ka e mere Sọstenis, gịnịkwa ka ọ ga-abụ na o mechara mee?

14 Gịnị mere mgbe Pọl rutere n’ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe? Ọkàikpe nọ ebe ahụ bụ gọvanọ na-achị Akeya. Aha ya bụ Galio. Ọ bụ ya tọrọ onye ọkachamara Rom aha ya bụ Seneka. Ndị Juu boro Pọl ebubo, sị: “Nwoke a na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-efe Chineke otú iwu na-ekwughị ka e si na-efe ya.” (Ọrụ 18:13) Ihe ndị Juu na-ekwu bụ na Pọl na-ada iwu n’ihi na ọ na-eme ka ndị Juu ghọọ Ndị Kraịst. Ma, Galio ghọtara na e nweghị “ihe ọjọọ” Pọl mere, e nweghịkwa “arụ ọ kpara.” (Ọrụ 18:14) Galio achọghị itinye aka n’esemokwu ndị Juu. Tupudị Pọl azara ọnụ ya, ọ kagburu ebubo ahụ e boro Pọl. Ezigbo iwe were ndị ahụ boro Pọl ebubo. Ha wesara Sọstenis iwe. Ọ ga-abụ na Sọstenis nọchiri Krispọs, bụrụzie onyeisi oche ụlọ nzukọ. Ha jidere ya “ma malite iti ya ihe n’ihu ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe.”​—Ọrụ 18:17.

15 Gịnị mere Galio ji hapụ ìgwè mmadụ ahụ ka ha tie Sọstenis ihe? O nwere ike ịbụ na Galio chere na Sọstenis bụ onyeisi ndị ahụ chọrọ imesi Pọl ike, na ọ na-aghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ. Ma Sọstenis ọ̀ bụ onyeisi ha ma ọ bụ na ọ bụghị, ihe ahụ merenụ rụpụtara ihe dị mma. N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ọgbakọ dị na Kọrịnt mgbe ọtụtụ afọ gachara, ọ kpọrọ otu nwanna a na-akpọ Sọstenis aha. (1 Kọr. 1:1, 2) Ọ̀ bụ ya bụ Sọstenis ahụ e tiri ihe na Kọrịnt? Ọ bụrụ na ọ bụ ya, ọ ga-abụ na ihe ahụ e tiri ya meziri ka ọ ghọọ Onye Kraịst.

16. Olee otú ihe Onyenwe anyị kwuru, nke bụ́ ‘na-ekwusa ozi ọma, adala mbà. Anọnyeere m gị,’ si gbasa ozi anyị?

16 Ọ̀ kwa i chetara na ọ bụ mgbe ndị Juu jụchara ozi ọma Pọl nọ na-ezi ha ka Onyenwe anyị Jizọs mesiri ya obi ike, sị: “Ụjọ atụla gị, kama na-ekwusa ozi ọma, adala mbà. . . . Anọnyeere m gị”? (Ọrụ 18:9, 10) Anyị kwesịrị iburu okwu ndị ahụ n’obi, karịchaa, mgbe ndị mmadụ jụrụ ozi ọma anyị chọrọ izi ha. Echefukwala na Jehova na-enyocha obi, ọ na-adọtakwa ndị nwere ezi obi n’ebe ọ nọ. (1 Sam. 16:7; Jọn 6:44) Ihe a kwesịrị ịgba anyị ume ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. Kwa afọ, a na-eme ọtụtụ narị puku mmadụ baptizim. Ihe ọ pụtara bụ na a na-eme ọtụtụ narị mmadụ baptizim kwa ụbọchị. Jizọs kwere ndị niile na-erube isi n’iwu o nyere ka e “mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ” ya nkwa, sị: “M nọnyekwaara unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.”​—Mat. 28:19, 20.

“Ma Ọ Bụrụ Uche Jehova” (Ọrụ 18:18-22)

17, 18. Olee ihe ọ ga-abụ na Pọl chetara mgbe ọ nọ n’ụgbọ mmiri na-aga Efesọs?

17 Anyị amaghị ma ọ̀ bụ ihe ahụ Galio mere mgbe e boro Pọl ebubo mere ka a kwụsị inye ọgbakọ ọhụrụ ahụ dị na Kọrịnt nsogbu. Ma, Pọl nọkwuru “ọtụtụ ụbọchị” tupu ya asị ụmụnna ya nọ na Kọrịnt ka e mesịa. Ná mmalite afọ 52 O.N.K., o kpebiri na ya ga-abanye ụgbọ mmiri dị na Senkrea gaa Siria. Senkrea dị ihe dị ka kilomita iri na otu ma e si Kọrịnt gawa ebe ọwụwa anyanwụ. Ma tupu Pọl ahapụ Senkrea, ọ “kpụdara ntutu isi ya . . . n’ihi na o nwere nkwa o kwere Chineke.”c (Ọrụ 18:18) Ọ kpọziiri Akwịla na Prisila, ha abanye ụgbọ mmiri gafee Oké Osimiri Ejiyan gaa Efesọs nke dị n’Eshia Maịnọ.

18 Mgbe Pọl banyere ụgbọ mmiri na Senkrea, ọ ga-abụ na o chetara ihe ndị mere na Kọrịnt. E nwere ọtụtụ ihe ọma ọ ga-echeta ga-eme ya ezigbo obi ụtọ. Ozi o jere ebe ahụ otu afọ na ọnwa isii arụpụtala ihe ọma. E nweela ọgbakọ na Kọrịnt. Ọ bụ n’ụlọ Jọstọs ka ha na-anọ amụ ihe. Jọstọs, Krispọs na ezinụlọ ya, na ọtụtụ ndị ọzọ so ná ndị ghọrọ Ndị Kraịst na Kọrịnt. Pọl hụrụ ndị ahụ chegharịrị ọhụrụ n’anya, n’ihi na ọ bụ ya nyeere ha aka ịghọ Ndị Kraịst. Ọ ga-emecha degara ha akwụkwọ ozi ma kwuo na ha bụ akwụkwọ ozi e dere n’obi ya iji jaa ya mma. Anyịnwa na-ahụkwa ndị anyị nyeere aka ịbata n’ọgbakọ n’anya. N’eziokwu, obi na-atọgbu anyị atọgbu ma anyị hụ ụmụnna ndị a bụ́ ‘akwụkwọ ozi e dere iji jaa anyị mma.’​—2 Kọr. 3:1-3.

19, 20. Gịnị ka Pọl mere ozugbo o rutere Efesọs, oleekwa ihe anyị na-amụta n’aka ya gbasara ime ihe anyị kpebiri ime n’ozi Chineke?

19 Ozugbo Pọl rutere n’Efesọs, ọ malitere ọrụ kacha mkpa ọ na-arụ. Ọ ‘banyere n’ụlọ nzukọ na-akụziri ndị Juu ihe, na-enyere ha aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ.’ (Ọrụ 18:19) Pọl anọteghị aka n’Efesọs n’oge ahụ. A gwara ya ka ọ nọtụkwuo, ma “o kweghị.” Mgbe ọ na-agwa ndị Efesọs ka e mesịa, o kwuru, sị: “M ga-abịa ịhụ unu ọzọ ma ọ bụrụ uche Jehova.” (Ọrụ 18:20, 21) O doro anya na Pọl ghọtara na e nwere ọtụtụ ndị a ka ga-ezi ozi ọma n’Efesọs. O bu n’obi ịlọghachi Efesọs, ma ọ hapụrụ ihe niile n’aka Jehova. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịmụta ihe n’ihe a Pọl mere? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe anyị kpebiri ime n’ozi Chineke, anyị kwesịrị ịmalite ya amalite. Ma, anyị kwesịrị ikwe ka Jehova na-eduzi anyị mgbe niile, na-agbalịkwa ime ihe bụ́ uche ya.​—Jems 4:15.

20 Pọl hapụrụ Akwịla na Prisila n’Efesọs ma banye n’ụgbọ mmiri rute Sizaria. Ọ ga-abụ na ọ “gakwara” Jeruselem kelee ọgbakọ dị n’ebe ahụ. (Ọrụ 18:22) Pọl sizi ebe ahụ gaa ebe ọ na-ebi n’Antiọk nke Siria. Ọ gachaala njem nke abụọ ọ gara ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ, njem ahụ gakwara nke ọma. Gịnị ga-eme ya na njem nke ikpeazụ ọ ga-aga?

NKWA PỌL KWERE

Ọrụ Ndịozi 18:18 kwuru na mgbe Pọl nọ na Senkrea, “ọ kpụdara ntutu isi ya . . . n’ihi na o nwere nkwa o kwere.” Olee nkwa o kwere?

Mmadụ ikwe Chineke nkwa pụtara onye ahụ iji obi ya niile gwa Chineke na e nwere ihe ya ga-eme, ma ọ bụ na ya ga-enye ya onyinye, ma ọ bụkwanụ jeere ya ozi n’ụzọ pụrụ iche. Ụfọdụ ndị chere na ihe mere Pọl ji kpụda ntutu isi ya bụ ka o mezuo nkwa o kwere ịbụ onye Naziraịt. Ma, anyị kwesịrị icheta na Akwụkwọ Nsọ kwuru na onye Naziraịt ga-akpụ ntutu isi ya “n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute” mgbe o jechaara Jehova ozi pụrụ iche. Ọ ga-abụ naanị na Jeruselem ka onye Naziraịt ga-anọ kpụọ isi ya. Ebe ọ bụ na Pọl nọ na Senkrea mgbe ahụ, ọ pụtara na ọ bụghị onye Naziraịt.​—Ọnụ Ọgụ. 6:5, 18.

Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ekwughị mgbe Pọl kwere Chineke nkwa ahụ. O nwedịrị ike ịbụ na o kwere nkwa ahụ mgbe ọ na-aghọbeghị Onye Kraịst. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ekwukwanụghị ma è nwere otu ihe ọ rịọrọ Jehova ka o meere ya. Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na ihe mere Pọl ji kpụda ntutu isi ya nwere ike ịbụ ka o “kelee Chineke maka otú o si chebe ya ya ejee ozi ya nke ọma na Kọrịnt.”

a Gụọ igbe bụ́ “Kọrịnt Bụ Obodo Nwere Ọdụ Ụgbọ Mmiri Abụọ.”

b Gụọ igbe bụ́ “Akwụkwọ Ozi Ndị Na-agba Ume Pọl Si n’Ike Mmụọ Nsọ Dee.”

c Gụọ igbe bụ́ “Nkwa Pọl Kwere.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya