Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 12/15 p. 22-24
  • Akwila na Prisila Di na Nwunye Bụ Ezi Ihe Nlereanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwila na Prisila Di na Nwunye Bụ Ezi Ihe Nlereanya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Na-akpa Ákwà Ụlọikwuu
  • Ihe Atụ Dị Iche Iche nke Ile Ọbịa
  • Ha “Tọgbọrọ Olu nke Aka Ha” n’Ihi Pọl
  • Di na Nwunye Chiri Anya
  • Na-eme Nkwusa Iji Mee Ndị Na-eso Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • “Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Ndị Kraịst Dị Ibe Ha Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ị̀ Na-echeta?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 12/15 p. 22-24

Akwila na Prisila Di na Nwunye Bụ Ezi Ihe Nlereanya

“KELEENỤ Priska na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ n’ime Kraịst Jisọs, mmadụ ndị tọgbọrọ olu nke aka ha n’ihi ndụ m; ndị ọ bụghị nanị mụ onwe m na-ekele, kama nzukọ Kraịst nile nke ndị mba ọzọkwa.”—Ndị Rom 16:3, 4.

Okwu ndị a Pọl onyeozi gwara ọgbakọ ndị Kraịst dị na Rom na-egosi okè nkwanye ùgwù na nsọpụrụ ịhụnanya o nwere maka di na nwunye a. Ọ hụrụ na ya elegharaghị ha anya mgbe ọ na-edegara ọgbakọ ha akwụkwọ ozi. Ma olee ndị bụ mmadụ abụọ a ha na Pọl “na-arụkọ ọrụ,” n’ihi gịnịkwa ka ya na ọgbakọ dị iche iche ji hụ ha n’anya nke ukwuu?—2 Timoti 4:19.

Akwila bụ onye Juu nke diaspora (ndị Juu gbasasịrị agbasasị) nakwa onye obodo Pọntọs, ógbè dị n’ebe ugwu nke Asia Minor. Ya na nwunye ya bụ́ Prisila (Priska) biri na Rom. E nweworị ìgwè ndị Juu butụrụ ibu n’obodo ukwu ahụ ma ọ dịghị ihe ọzọ kemgbe Pompey weghasịịrị Jerusalem na 63 T.O.A., mgbe e duuru ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị mkpọrọ gaa Rom dị ka ndị ohu. N’ezie, ihe odide ndị Rom na-ekpughe ịdị adị nke ụlọ nzukọ iri na abụọ ma ọ bụ karị n’obodo ukwu oge ochie ahụ. Ọtụtụ ndị Juu si Rom nọ na Jerusalem na Pentikọst 33 O.A., mgbe ha nụrụ ozi ọma ahụ. Ikekwe ọ bụ site n’ọnụ ha ka ozi ndị Kraịst si ruo isi obodo nke Alaeze Ukwu Rom nke mbụ ya.—Ọrụ 2:10.

Otú ọ dị, a chụpụlarị ndị Juu na Rom n’afọ 49 ma ọ bụ ná mmalite 50 O.A. site n’iwu nke Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu Klọdiọs. N’ihi ya, ọ bụ n’obodo ukwu Gris bụ́ Kọrint ka Pọl onyeozi zutere Akwila na Prisila. Mgbe Pọl bịarutere Kọrint, Akwila na Prisila jiri obiọma lee ya ọbịa ma nye ya ọrụ, n’ihi na ha na-arụ otú ụdị ọrụ—ịkpa ákwà ụlọikwuu.—Ọrụ 18:2, 3.

Ndị Na-akpa Ákwà Ụlọikwuu

Nke a abụghị ọrụ dị mfe. Ịkpa ákwà ụlọikwuu gụnyere ibe na ịdụkọta iberibe ihe ma ọ bụ akpụkpọ anụ siri ike, na-adịghị mụrụ mụrụ. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Fernando Bea si kwuo, ọ bụ “ọrụ chọrọ nkà na nlezianya” n’aka ndị na-akpa ákwà ụlọikwuu bụ́ ndị ji “ákwà na-adịghị mụrụ mụrụ, ndị gbasiri ike, ndị e ji ama ụlọikwuu mgbe a na-eme njem, na-enye ndo pụọ n’anwụ na mmiri ozuzo, ma ọ bụ maka ịkwasa ibu n’ụgbọ mmiri wee na-arụ ọrụ.”

Nke a na-akpalite otu ajụjụ. Ọ̀ bụ na Pọl ekwughị na ‘a zụpụtara ya n’ụkwụ Gameliel,’ si otú a na-emeghere ya ụzọ ịchụso ọrụ dị ùgwù n’afọ ndị gaje ịbịa? (Ọrụ 22:3) Ọ bụ ezie na nke a bụ eziokwu, ndị Juu narị afọ mbụ weere ya dị ka ihe dị ùgwù ịkụziri nwatakịrị aka ọrụ a sịgodị na ọ gaje inweta agụmakwụkwọ ka elu. Ya mere o yiri ka ma Akwila ma Pọl ha mụtara nkà ha nke ịkpa ákwà ụlọikwuu mgbe ha dị ntakịrị. Ahụmahụ ahụ ghọrọ ihe bara ezigbo uru ka oge na-aga. Ma dị ka ndị Kraịst, ha ewereghị ọrụ ego dị otú ahụ dị ka ihe bụ isi. Pọl kọwara na ọrụ ya na Akwila na Prisila rụrụ na Kọrint bụ nanị ụzọ isi kwadoo ọrụ ya bụ isi, ikwusa ozi ọma ahụ ‘n’ebogbughị onye ọ bụla.’—2 Ndị Tesalọnaịka 3:8; 1 Ndị Kọrint 9:18; 2 Ndị Kọrint 11:7.

Dị ka ihe àmà gosiri, Akwila na Prisila nwere obi ụtọ ime ihe nile ha pụrụ ime iji mee ka ozi ala ọzọ nke Pọl dịkwuo mfe. Ònye ma ugboro ole ndị enyi atọ ahụ kwụsịtụrụ ọrụ ha iji gbaara ndị ahịa ha ma ọ bụ ndị na-agafe agafe àmà! Ọ bụkwa eziokwu na ọrụ ha nke ịkpa ákwà ụlọikwuu bụ ọrụ dị ala ma na-agwụ ike, obi dị ha ụtọ ịrụ ya, na-arụ ọrụ ọbụna “abalị na ehihie” iji kwalite ọdịmma nile nke Chineke—dị nnọọ ka ọtụtụ ndị Kraịst nke oge a si eji ọrụ nwa oge ma ọ bụ ndị nwere oge ha ji apụta akwado onwe ha iji tinye ihe ka ukwuu n’oge fọdụrụnụ n’inyere ndị mmadụ aka ịnụ ozi ọma ahụ.—1 Ndị Tesalọnaịka 2:9; Matiu 24:14; 1 Timoti 6:6.

Ihe Atụ Dị Iche Iche nke Ile Ọbịa

Pọl yiri ka o ji ụlọ Akwila mere isi ọnọdụ maka ọrụ ozi ala ọzọ ya n’ime ọnwa 18 ọ nọrọ na Kọrint. (Ọrụ 18:3, 11) Mgbe ahụ, ọ pụrụ ịbụ na Akwila na Prisila nwere obi ụtọ inwekwa Saịlas (Silvanọs) na Timoti dị ka ndị ọbịa mgbe ha si Masedọnia bịa. (Ọrụ 18:5) Akwụkwọ ozi abụọ Pọl degaara ndị Tesalọnaịka, bụ́ nke mesịrị ghọọ akụkụ nke akwụkwọ Bible, pụrụ ịbụ nke e dere mgbe onyeozi ahụ bi na nke Akwila na Prisila.

Ọ dị mfe iche na n’oge a, ụlọ Prisila na Akwila bụ n’ezie ebe bụ isi maka ọrụ ọchịchị Chineke. Ikekwe ọtụtụ ndị enyi a hụrụ n’anya na-abịachi anya ebe ahụ—Stefanas na ezinụlọ ya, ndị Kraịst mbụ n’ógbè Akaịa, ndị Pọl mere baptism n’onwe ya; Taịtọs Justọs, bụ́ onye kwere ka Pọl nọrọ n’ụlọ ya na-ekwu okwu ihu ọha; na Krispọs, onye isi ụlọ nzukọ, onye nakweere eziokwu ahụ ya na ezinụlọ ya nile. (Ọrụ 18:7, 8; 1 Ndị Kọrint 1:16) E nwekwara Fọtụnetọs na Akaịkọs; Gaịọs, onye ọ pụrụ ịbụ na a nọrọ n’ụlọ ya nwee nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ; Erastọs, onye na-achị ihe obodo; Tatiọs, odeakwụkwọ nke Pọl gwara ihe o dere n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom; na Fibi, nwanna nwanyị kwesịrị ntụkwasị nọ n’ọgbakọ Kenkrii dị nso, bụ́ onye ọ pụrụ ịbụ na ọ bụ ya buuru akwụkwọ ozi ahụ si Kọrint gaa Rom.—Ndị Rom 16:1, 22, 23; 1 Ndị Kọrint 16:17.

Ndị ohu Jehova nke oge a bụ́ ndị nweworo ohere nke ile onye ozi na-ejegharị ejegharị ọbịa maara otú ọ pụrụ isi bụrụ ihe na-agba ume na ihe kwesịrị ncheta. Ahụmahụ ndị na-ewuli elu a kọrọ n’oge ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ ezi isi iyi nke ume ọhụrụ ime mmụọ nye mmadụ nile. (Ndị Rom 1:11, 12) Dịkwa ka Akwila na Prisila mere, ndị nyere ụlọ ha maka nzukọ, ikekwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, nwere ọṅụ na afọ ojuju nke inwe ike ịtụnye ụtụ n’ụzọ dị otú a n’ịkwalite ezi ofufe.

Ọbụbụenyi ha na Pọl chiri anya nke ukwuu nke na Akwila na Prisila sooro ya mgbe ọ hapụrụ Kọrint n’oge opupu ihe ubi nke 52 O.A., soro ya jeruorị Efesọs. (Ọrụ 18:18-21) Ha nọdụrụ n’obodo ukwu ahụ ma tọọ ntọala maka nleta ọzọ nke onyeozi ahụ. Ọ bụ n’ebe a ka ndị nkụzi ozi ọma a nwere onyinye kpọbatara onye ọkà okwu ahụ bụ́ Apọlọs “n’ebe ha nọ” ma nwee ọṅụ nke inyere ya aka ịghọta “ụzọ Chineke nke ọma karị.” (Ọrụ 18:24-26) Mgbe Pọl letaghachiri Efesọs n’oge njem ozi ala ọzọ ya nke atọ, n’ihe dị ka n’oge oyi nke 52/53 O.A., ubi nke di na nwunye a dị ike kọworo achaalarị maka iwe ihe ubi. Ruo ihe dị ka afọ atọ, Pọl mere nkwusa ma zie ihe n’ebe ahụ banyere “Ụzọ” ahụ, ka ọgbakọ Efesọs nọ na-enwe nzukọ n’ụlọ Akwila.—Ọrụ 19:1-20, 26; 20:31; 1 Ndị Kọrint 16:8, 19.

Ka e mesịrị, mgbe ha laghachiri Rom, ndị enyi abụọ a nke Pọl nọgidere ‘na-agbaso ọrụ ile ọbịa anya nke ọma,’ na-ewepụta ụlọ ha maka nzukọ ndị Kraịst.—Ndị Rom 12:13; 16:3-5.

Ha “Tọgbọrọ Olu nke Aka Ha” n’Ihi Pọl

Ikekwe Pọl bikwara na nke Akwila na Prisila mgbe ọ nọ n’Efesọs. Ya na ha ò bi n’oge ọgba aghara ahụ nke ndị ụ́zụ́ ọlaọcha? Dị ka ihe ndekọ dị n’Ọrụ 19:23-31 si kwuo, mgbe ndị ọkà na-akpụ ụlọ nsọ nta biliri megide nkwusa nke ozi ọma ahụ, ụmụnna ahụ aghaghị igbochi Pọl pụọ n’itinye onwe ya n’ihe ize ndụ site n’ịbakwuru ìgwè ahụ na-agba aghara. Ụfọdụ ndị na-akọwa Bible echepụtawo na ọ pụrụ ịbụ nnọọ n’ụdị ọnọdụ ahụ dị ize ndụ ka Pọl nwere ‘obi abụọ ma ọ ga-adịkwa ndụ,’ ka Akwila na Prisila mekwara ihe n’ụzọ ụfọdụ, ‘na-atọgbọ olu nke aka ha’ n’ihi ya.—2 Ndị Kọrint 1:8; Ndị Rom 16:3, 4.

Mgbe “ụ̀zụ̀ ahụ tụbiri,” Pọl ji amamihe hapụ obodo ukwu ahụ. (Ọrụ 20:1) Obi abụọ adịghị ya na Akwila na Prisila chekwara mmegide na ime akaje ihu. Ihe ndị dị otú ahụ hà mere ka ha nwee nkụda obi? N’ụzọ megidere ya, Akwila na Prisila ji obi ike nọgide ná mgbalị ndị Kraịst ha.

Di na Nwunye Chiri Anya

Mgbe ọchịchị Klọdiọs gwụsịrị, Akwila na Prisila laghachiri Rom. (Ndị Rom 16:3-15) Otú ọ dị, mgbe ikpeazụ a kpọrọ aha ha n’ime Bible, anyị chọtara ha ọzọ n’Efesọs. (2 Timoti 4:19) Ọzọkwa, dị ka ọ dị n’izo aka ndị ọzọ nile dị n’Akwụkwọ Nsọ, a kpọkọtara aha di na nwunye a ọnụ. Lee di na nwunye chiri anya ma dị n’otu ha bụ! Pọl apụghị icheta nwanna nwoke ahụ a hụrụ n’anya, bụ́ Akwila, n’echetaghị nkwado ikwesị ntụkwasị obi nke nwunye ya. Leekwa ihe nlereanya ọma ọ bụụrụ ndị di na nwunye bụ́ ndị Kraịst taa, n’ihi na enyemaka kwụ chịm nke di ma ọ bụ nwunye na-eguzosi ike n’ihe na-enye mmadụ ohere ime ihe dị ukwuu n’ime “ọrụ Onyenwe anyị,” mgbe ụfọdụkwa, ọbụna karịa ka ọ pụrụ ikweworị omume mgbe mmadụ na-alụghị di ma ọ bụ nwunye.—1 Ndị Kọrint 15:58.

Akwila na Prisila jere ozi n’ọtụtụ ọgbakọ dị iche iche. Dị ka ha, ọtụtụ ndị Kraịst nke oge a na-anụ ọkụ n’obi ewepụtawo onwe ha ịkwaga n’ebe mkpa ka ukwuu. Ha na-enwetakwa ọṅụ na afọ ojuju na-abịa site n’ịhụ ka ọdịmma Alaeze na-eto na site n’inwe ike ịzụlite ọbụbụenyi ndị Kraịst na-ekpo ọkụ, ndị dịkwa oké ọnụ ahịa.

Site n’ihe nlereanya ọma ha nke ịhụnanya ndị Kraịst, Akwila na Prisila nwetara ekele Pọl na nke ndị ọzọ. Ma ọbụna nke ka mkpa, ha zụlitere aha ọma n’ebe Jehova n’onwe ya nọ. Akwụkwọ Nsọ na-emesi anyị obi ike, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị, ebe unu jeere ndị nsọ ozi, na-ejekwara ha ozi.”—Ndị Hibru 6:10.

Ọ pụrụ ịbụ na anyị enweghị ohere nke ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ụzọ ndị yiri ihe Akwila na Prisila mere, ma anyị pụrụ iṅomi ihe nlereanya ha magburu onwe ya. Oké afọ ojuju ga-abụ nke anyị ka anyị na-etinye ume na ndụ anyị n’ozi dị nsọ, n’echezọghị mgbe ọ bụla ‘ime ihe dị mma na ime ka anyị na ndị ọzọ nwekọọ ihe anyị: n’ihi na àjà dị otú a na-atọ Chineke ezi ụtọ.’—Ndị Hibru 13:15, 16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya