Ị̀ Na-echeta?
Ì jiriwo nlezianya chebara mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche echiche? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-ahụta ya ihe na-adọrọ mmasị icheta ihe na-esonụ:
◻ Olee otú ọtụtụ ndị lụrụ di na nwunye siworo gbasoo ihe nlereanya magburu onwe ya nke Akwila na Prisila hapụrụ?
Akwila na Prisila jere ozi n’ọtụtụ ọgbakọ dị iche iche. Dị ka ha, ọtụtụ ndị Kraịst nke oge a ewepụtawo onwe ha ịkwaga n’ebe mkpa ka ukwuu. Ha na-enwetakwa ọṅụ na afọ ojuju site n’ịhụ ka ọdịmma Alaeze na-eto na site n’inwe ike ịzụlite ọbụbụenyi ndị Kraịst dị oké ọnụ ahịa.—12/15, peji nke 24.
◻ Gịnị bụ echiche Bible banyere ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya?
Echiche Bible banyere ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya guzoziri eguzozi. N’otu aka, Bible na-ekwu na mmanya bụ onyinye si n’aka Chineke. (Abụ Ọma 104:1, 15) N’aka nke ọzọ, ọ na-akatọ imebiga ihe ókè. (Luk 21:34; 1 Timoti 3:8; Taịtọs 2:3; 1 Pita 4:3)—12/15, peji nke 27.
◻ Gịnị bụ akụkụ dị ịrịba ama nke akwụkwọ Bible bụ́ Hagaị?
Ọ bụ ezie na nanị amaokwu 38 mejupụtara akwụkwọ Hagaị, e jiri aha Chineke mee ihe ugboro 35. Amụma dị otú ahụ na-ada ka ihe na-adịghị ike mgbe e jiri utu aha ahụ bụ́ “Onyenwe anyị” dochie aha ahụ bụ́ Jehova.—1/1, peji nke 6.
◻ Gịnị ka a pụrụ ịmụta site ná mmehie Devid na Manase?
N’agbanyeghị na Jehova gbaghaara Devid na Manase, ndị ikom a—ha na ndị Israel—aghaghị ịnagide ihe ndị si n’omume mmehie ha pụta. (2 Samuel 12:11, 12; Jeremaịa 15:3-5) N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụ ezie na taa Jehova na-agbaghara ndị mmehie nwere nchegharị, a pụrụ inwe ihe ndị a na-apụghị izere ezere si n’omume ha pụta.—1/1, peji nke 27.
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka ‘ụkwụ nke ndị na-ekwusa ozi ọma’ nke Alaeze Chineke si “maa mma”? (Aịsaịa 52:7)
N’ụzọ nkịtị ọ bụ ụkwụ na-ebugharị mmadụ ka ọ na-aga ime nkwusa gwa ndị ọzọ. Ụkwụ dị otú ahụ na-anọchite anya onye ahụ n’ezie. Ya mere nye ọtụtụ ndị nụrụ ma zaghachi nke ọma n’ozi ọma Alaeze ahụ, ụkwụ ndị ozi dị otú ahụ bụ n’ezie ihe mara mma ile anya.—1/15, peji nke 13.
◻ Gịnị bụ ọrụ ahụ gbara mkpị abụọ ‘izisa ozi ọma ahụ’ na-agụnye? (1 Ndị Kọrint 9:16)
Nke mbụ, anyị aghaghị ịkpọsa ozi ọma banyere Alaeze ahụ. Akụkụ nke abụọ nke ọrụ a na-agụnye izi ndị zaghachiri n’ụzọ dị mma ná mkpọsa Alaeze ahụ ihe.—1/15, peji nke 23.
◻ Abamuru onwe onye ndị dị aṅaa ka ịbụ abụ Alaeze ná nzukọ ọgbakọ na-arụpụta?
Ịbụ abụ na-enye anyị ohere iji kwupụta mmetụta anyị nwere maka Onye Okike anyị. (Abụ Ọma 149:1, 3) Mgbe anyị tinyere obi anyị n’abụ ọgbakọ na-abụ, ọ pụrụ itinye anyị n’ọnọdụ uche na obi kwesịrị ekwesị maka usoro ihe omume na-esochi. Ọ pụrụ ịkpali anyị ikere òkè ka ukwuu n’ofufe Jehova.—2/1, peji 28.
◻ Ole mgbe ka ụbọchị ọnwụ dị mma karịa ụbọchị ọmụmụ? (Eklisiastis 7:1)
Ụbọchị ọnwụ pụrụ ịka ụbọchị ọmụmụ mmadụ mma ma ọ bụrụ na mmadụ ewulitewo ezi aha tupu mgbe ahụ n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye pụrụ ịkpọlite ndị kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Jọn 11:25)—2/15, peji nke 12.
◻ N’ihi gịnị ka akwụkwọ Eklisiastis ji kwesị inyere anyị aka n’onwe anyị?
Ọ pụrụ inyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ime ka ụzọ anyị si ele ndụ anya na ihe anyị na-elekwasị anya guzozie. (Eklisiastis 7:2; 2 Timoti 3:16, 17)—2/15, peji nke 16.
◻ Ndịàmà Jehova hà bụ ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi?
Ee e. Ọ bụ ezie na ha nwere nkweta okpukpe ndị siri ike, ha abụghị ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi n’echiche nke e jizi okwu ahụ eme ihe. Ha adịghị eme ngagharị iwe ma ọ bụ emeso ndị ha na ha na-enweghị nkwekọrịta ihe ike. Ha na-eṅomi Onye Ndú ha, bụ́ Jisọs Kraịst.—3/1, peji nke 6.
◻ Amaghị kpọmkwem oge Jisọs ga-abịa ịbọ ọ́bọ̀ Chineke na-enwe mmetụta dị aṅaa n’ahụ ndị Kraịst?
Nke a yiri ka ọ na-eme ka ndị Kraịst nọrọ na nche, na-enyekwa ha ohere kwa ụbọchị igosipụta na ha ji ebumnobi na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị na-ejere Jehova ozi.—3/1, peji nke 13.
◻ Gịnị ka anyị kwesịrị ịtụle tupu anyị agbaa nwanna pụrụ ịbụ onye gwuworo anyị wayo akwụkwọ?
Anyị kwesịrị ịtụle mmetụta ọ pụrụ inwe n’ahụ anyị, n’ahụ ndị ọzọ o metụtara, n’ahụ ọgbakọ, na n’ahụ ndị nọ n’èzí. (1 Ndị Kọrint 6:7)—3/15, peji nke 22.
◻ Olee otú a pụrụ isi nweta ezi obi ụtọ?
Ezi obi ụtọ bụ ọnọdụ nke obi, nke dabeere n’ezi okwukwe na ezi mmekọrịta n’ebe Jehova nọ. (Matiu 5:3)—3/15, peji nke 23.
◻ Gịnị ka onye Kraịst kwesịrị ime mgbe a kpọrọ ya maka ọrụ òtù nnọkọ ikpe?
Onye Kraịst ọ bụla chere ọrụ òtù nnọkọ ikpe ihu aghaghị ikpebi ụzọ ọ ga-agbaso, na-adabere ná nghọta ya nke Bible na akọ na uche nke ya. (Ndị Galetia 6:5)—4/1, peji nke 29.