Na-eme Nkwusa Iji Mee Ndị Na-eso Ụzọ
“Mgbe Prisila na Akwịla nụrụ ihe [Apọlọs] na-ekwu, ha kpọbatara ya n’etiti onwe ha ma kọwaara ya ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị.”—ỌRỤ 18:26.
1. (a) Ọ bụ ezie na ọ “na-anụ ọkụ na mmụọ,” gịnị kọrọ Apọlọs? (b) Gịnị dị Apọlọs mkpa iji nweta ihe ndị kọrọ ya n’ụzọ ime mmụọ?
PRISILA na Akwịla, di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ, kiriri Apọlọs ka ọ na-ekwu okwu n’ụlọ nzukọ dị n’obodo Efesọs. Site ná nkwuwa okwu ya na ike o nwere ikwu okwu n’ụzọ ga-eme ka e kweta, Apọlọs dọtara mmasị ndị na-ege ya ntị. Ọ “na-anụ ọkụ na mmụọ,” “na-ezi ihe ndị metụtara Jizọs n’ụzọ ziri ezi.” Otú ọ dị, ihe àmà na-egosi na Apọlọs ‘maara nanị banyere baptizim Jọn.’ Ihe nile Apọlọs kwusara banyere Kraịst ahụ bụ eziokwu. Ihe bụ́ nsogbu bụ na o nwechaghị ihe ọmụma zuru ezu. Ọ dị Apọlọs mkpa inwetakwu ihe ọmụma banyere òkè Jizọs Kraịst na-ekere ná mmezu nke nzube Jehova.—Ọrụ 18:24-26.
2. Ihe ịma aka dị aṅaa ka Prisila na Akwịla nakweere?
2 N’egbughị oge, Prisila na Akwịla wepụtara onwe ha inyere Apọlọs aka ịghọ onye pụrụ idebe “ihe nile” Kraịst nyere n’iwu. (Matiu 28:19, 20) Ihe ndekọ ahụ na-ekwu na ha kpọbatara Apọlọs “n’etiti onwe ha ma kọwaara ya ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị.” Otú ọ dị, e nwere ihe ụfọdụ banyere Apọlọs ndị pụrụ imewo ka ụfọdụ Ndị Kraịst laa azụ ịkụziri ya ihe. Ihe ndị dị aṅaa? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site ná mgbalị Prisila na Akwịla mere iso Apọlọs kwurịta ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ? Olee otú ntụleghachi nke akụkọ a mere eme pụrụ isi nyere anyị aka ilekwasị anya n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi?
Na-echebara Ndị Mmadụ Echiche
3. N’ihi gịnị ka nzụlite Apọlọs na-ejighị gbochie Prisila na Akwịla ịkụziri ya ihe?
3 N’ịbụ onye Juu site n’ọmụmụ, eleghị anya a zụlitere Apọlọs n’obodo Aleksandria. Aleksandria bụ n’oge ahụ isi obodo Ijipt na ebe e nwere ụlọ akwụkwọ dị elu, nke e ji ọ́bá akwụkwọ ukwu ya mara. E nwere ọtụtụ ndị Juu bi n’obodo ahụ, gụnyere ndị ọkà mmụta. N’ihi ya, e bipụtara nsụgharị Grik nke Akwụkwọ Nsọ Hibru a maara dị ka Septuagint n’ebe ahụ. Ka a sịkwa ihe mere Apọlọs ji ‘mara Akwụkwọ Nsọ nke ọma’! Prisila na Akwịla na-akpa ákwà ụlọikwuu. Nkà okwu Apọlọs ò mere ka ha laa azụ? Ee e. N’ihi ịhụnanya, ha chere echiche banyere ya, mkpa ya, na otú ha pụrụ isi nyere ya aka.
4. Ebee, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka Apọlọs si nweta enyemaka dị ya mkpa?
4 N’agbanyeghị otú Apọlọs si nwee nkwuwa okwu, ntụziaka dị ya mkpa. Enyemaka dị ya mkpa abụghị ihe a ga-achọta na mahadum ọ bụla ma a chọtara ya n’etiti ndị ya na ha nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Apọlọs na-aga irite uru n’isi ihe ndị ga-eme ka o nwekwuo nghọta ziri ezi banyere ndokwa Chineke mere maka nzọpụta. Prisila na Akwịla “kpọbatara ya n’etiti onwe ha ma kọwaara ya ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị.”
5. Gịnị ka ị pụrụ ikwu banyere ọnọdụ ime mmụọ nke Prisila na Akwịla?
5 Prisila na Akwịla siri ike n’ụzọ ime mmụọ ma kwụsie ike n’okwukwe. O yiri nnọọ ka hà dị ‘njikere mgbe nile ime ngọpụ n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ ha ihe mere ha ji nwee olileanya ahụ,’ ma onye ahụ ọ̀ bụ ọgaranya, ogbenye, ọkà mmụta, ma ọ bụ ohu. (1 Pita 3:15) Akwịla na nwunye ya ‘jiziri okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’ (2 Timoti 2:15) Ihe àmà na-egosi na ha bụ ndị na-amụchi Akwụkwọ Nsọ anya. Ntụziaka ndị dabeere ‘n’okwu Chineke nke dị ndụ ma na-akpa ike’ metụrụ Apọlọs n’ahụ́ nke ukwuu, na-eru ya n’obi.—Ndị Hibru 4:12.
6. Olee otú anyị si mara na Apọlọs nwere ekele maka enyemaka o nwetara?
6 Apọlọs nwere ekele maka ihe nlereanya nke ndị ziri ya ihe, ọbụna bịa nwekwuo nkà n’ime ndị na-eso ụzọ. O ji ihe ọmụma ya mee ihe n’ụzọ zuru ezu n’ọrụ nke ikwusa ozi ọma ahụ, karịsịa n’etiti ndị Juu. Apọlọs bara uru n’ụzọ pụrụ nnọọ iche n’ime ka ndị Juu kweta ihe banyere Kraịst. ‘N’ịbụ aka ochie n’iji Akwụkwọ Nsọ eme ihe,’ ọ nwapụtaara ha na ndị amụma oge ochie nile tụrụ anya ọbịbịa nke Kraịst ahụ. (Ọrụ 18:24, Kingdom Interlinear Translation) Ihe ndekọ ahụ na-agbakwụnye na Apọlọs gaziri Akea, bụ́ ebe “o nyeere ndị kweworo ekwe n’ihi obiọma n’erughịrị mmadụ nke Chineke aka n’ụzọ dị ukwuu; n’ihi na n’ụzọ dị ike, ọ nwapụtara nke ọma n’ihu ọha na ndị Juu mejọrọ ihe, ebe o sitere n’Akwụkwọ Nsọ gosipụta na Jizọs bụ Kraịst ahụ.”—Ọrụ 18:27, 28.
Mụta Ihe Site n’Ihe Nlereanya nke Ndị Ozizi Ndị Ọzọ
7. Olee otú Akwịla na Prisila si ghọọ ndị ozizi nwere nkà?
7 Olee otú Akwịla na Prisila si ghọọ ndị ozizi bụ́ aka ochie nke Okwu Chineke? E wezụga ịdị uchu ha n’inwe ọmụmụ ihe onwe onye na ịga nzukọ, mkpakọrịta chiri anya nke ha na Pọl onyeozi aghaghị inyeworo ha aka n’ụzọ dị ukwuu. Ruo ọnwa 18, Pọl biri n’ụlọ Prisila na Akwịla na Kọrint. Ha rụkọrọ ọrụ n’ịkpa na imezi ákwà ụlọikwuu. (Ọrụ 18:2, 3) Cheedị banyere mkparịta ụka miri emi dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ha na-aghaghị inwewo. Leekwa ka mkpakọrịta dị otú ahụ nke ha na Pọl na-aghaghị isiwo wulite ọnọdụ ime mmụọ ha! “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe,” ka Ilu 13:20 na-ekwu. Ezi mkpakọrịta nwere mmetụta dị mma n’àgwà ime mmụọ ha.—1 Ndị Kọrint 15:33.
8. Gịnị ka Prisila na Akwịla mụtara site n’ikiri Pọl n’ozi ya?
8 Mgbe Prisila na Akwịla kiriri Pọl ka ọ na-ekwusa banyere Alaeze ahụ, ha chọpụtara na ọ bụ ezigbo onye ozizi. Ihe ndekọ dị n’Ọrụ Ndịozi na-ekwu na Pọl “na-ekwu okwu n’ụlọ nzukọ [dị na Kọrint] kwa ụbọchị izu ike, na-emekwa ka ndị Juu na ndị Grik kweta.” Mgbe e mesịrị, mgbe Saịlas na Timoti sonyeere ya, Pọl “malitere ikwusasi okwu ahụ ike, na-agbara ndị Juu àmà iji nwapụta na Jizọs bụ Kraịst ahụ.” Prisila na Akwịla chọpụtara na mgbe ndị nọ n’ụlọ nzukọ ahụ gosiri mmasị dị nta, Pọl gara n’ebe ọ ga-achọta mmasị ka ukwuu, n’ụlọ dị n’akụkụ ụlọ nzukọ ahụ. N’ebe ahụ, Pọl nyeere Krispọs, bụ́ “onyeisi oche nke ụlọ nzukọ” aka ịghọ onye na-eso ụzọ. O yikarịrị nnọọ ka Prisila na Akwịla hà rịbara ama na ime ka nwoke ahụ ghọọ onye na-eso ụzọ nwere mmetụta dị ukwuu n’ókèala ahụ ma mịpụta mkpụrụ. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Krispọs . . . ghọrọ onye kwere ekwe n’Onyenwe anyị, otú a kwa ka ọ dị ezinụlọ ya dum. Ọtụtụ n’ime ndị Kọrint bụ́ ndị nụrụnụ malitere ikwere nakwa ịbụ ndị e mere baptizim.”—Ọrụ 18:4-8.
9. Olee otú Prisila na Akwịla si meghachi omume n’ihe nlereanya Pọl?
9 Ndị nkwusa Alaeze ndị ọzọ, dị ka Prisila na Akwịla, ṅomiri ihe nlereanya Pọl n’ozi ubi. Onyeozi ahụ gbara Ndị Kraịst ndị ọzọ ume, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi m, ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:1) N’ikwekọ n’ihe nlereanya Pọl, Prisila na Akwịla nyeere Apọlọs aka ịghọtakwu ozizi Ndị Kraịst nke ọma. Ya onwe ya nyekwaara ndị ọzọ aka. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Prisila na Akwịla nyere aka n’ime ndị na-eso ụzọ na Rom, Kọrint, nakwa n’Efesọs.—Ọrụ 18:1, 2, 18, 19; Ndị Rom 16:3-5.
10. Gịnị ka ị mụtaworo n’Ọrụ isi 18 bụ́ nke ga-enyere gị aka n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ?
10 Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ịtụle Ọrụ isi 18? Dị nnọọ ka ọ pụrụ ịbụwo na Akwịla na Prisila mụtara ihe n’aka Pọl, anyị pụrụ imeziwanye nkà anyị nwere n’ime ndị na-eso ụzọ site n’ịgbaso ihe nlereanya nke ezi ndị ozizi nke Okwu Chineke. Anyị pụrụ isoro ndị “mikpuru nnọọ onwe ha n’okwu ahụ” bụ́ ndị ‘na-agbara ndị ọzọ àmà n’ụzọ zuru ezu,’ na-akpakọrịta. (Ọrụ 18:5, Kingdom Interlinear Translation) Anyị pụrụ ikiri otú ha si eru n’obi ndị mmadụ site n’iji nkà izi ihe n’ụzọ na-eme ka e kweta eme ihe. Nkà ndị dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ime ndị na-eso ụzọ. Mgbe mmadụ so anyị na-amụ Bible, anyị pụrụ ịtụrụ ya aro ịkpọ ndị òtù ezinụlọ ya ma ọ bụ ndị agbata obi ya isonye n’ọmụmụ ihe ahụ. Ma ọ bụkwanụ anyị pụrụ ịgwa ya ka o mee ka anyị mara ndị ọzọ anyị pụrụ ịmụrụ Bible.—Ọrụ 18:6-8.
Mepụta Ohere Iji Mee Ndị Na-eso Ụzọ
11. Ebee ka a pụrụ ịchọta ndị ọhụrụ na-eso ụzọ?
11 Pọl na Ndị Kraịst ibe ya gbalịrị ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ site n’ikwusa ozi ọma ahụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’ọma ahịa, na mgbe ha na-eme njem—n’ezie, n’ebe ọ bụla. Dị ka onye ọrụ Alaeze na-anụ ọkụ n’obi nke na-achọ ime ndị na-eso ụzọ, ị̀ pụrụ ịmụba ozi ubi gị? Ị̀ pụrụ iji ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe iji chọpụta ndị kwesịrị ekwesị ma kwusaara ha ozi ọma? Olee ụzọ ụfọdụ ndị nkwusa ozi ọma ibe anyị siworo chọta ndị na-eso ụzọ? Ka anyị buru ụzọ leba anya n’iji telifon agba àmà.
12-14. Iji gosi abamuru ndị dị n’iji telifon agba àmà, kọọ ahụmahụ nke onwe gị ma ọ bụ otu nke dị na paragraf ndị a.
12 Ka ọ na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ na Brazil, otu Onye Kraịst, onye anyị ga-akpọ Maria, nyere otu nwa agbọghọ si n’otu ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ na-apụ otu traktị. N’iji isiokwu traktị ahụ mere okwu mmalite, Maria jụrụ, sị, “Ị̀ ga-achọ ịmatakwu banyere Bible?” Nwaada ahụ zaghachiri, sị: “Ọ ga-amasị m. Ma nsogbu bụ na abụ m onye nkụzi, ịkụzi ihe na-ewekọrọkwa oge m nile.” Maria kọwara na ha pụrụ ịtụle isiokwu ndị dabeere na Bible site na telifon. Nwaada ahụ nyere Maria nọmba telifon ya, kpọmkwem n’uhuruchi ahụ kwa, ọ maliteere ya ọmụmụ Bible site na telifon na-eji broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? eme ihe.a
13 Ka o ji telifon na-agba àmà, otu onye ozi oge nile nọ n’Etiopia kụjara mgbe ọ na-agwa otu nwoke okwu ma na-anụ mkpọtụ na-eme gburugburu ebe nwoke ahụ nọ. Nwoke ahụ gwara ya ka ọ kpọghachi mgbe e mesịrị. Mgbe o mere otú ahụ, nwoke ahụ rịọrọ ya mgbaghara ma kwuo na mgbe ahụ ọ kpọrọ na mbụ, ya na nwunye ya nọ na-enwe esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ. Nwanna nwanyị ahụ ji ihe a o kwuru mere ohere iji dọrọ uche ya gaa ná nduzi amamihe dị na ya nke Bible na-enye maka idozi nsogbu ezinụlọ. Ọ gwara ya na Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, bụ́ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara, enyeworo ọtụtụ ezinụlọ aka. Ụbọchị ole na ole ka o nyesịrị nwoke ahụ akwụkwọ ahụ, nwanna nwanyị ahụ kpọrọ ya ọzọ na telifon. Nwoke ahụ kwuru, sị: “Akwụkwọ a azọpụtawo alụmdi na nwunye m!” N’ezie, o sooro ezinụlọ ya nwee nzukọ iji gwa ha isi ihe ndị mara mma ọ mụtaworo n’akwụkwọ ahụ. A maliteere ya ọmụmụ Bible, n’oge na-adịghịkwa anya, nwoke ahụ malitere ịbịachi nzukọ Ndị Kraịst anya.
14 Otu onye nkwusa Alaeze nọ na Denmark bụ́ onye malitere ọmụmụ Bible site n’iji telifon agba àmà na-ekwu, sị: “Onye nlekọta ije ozi gbara m ume ikere òkè n’iji telifon agba àmà. Ná mmalite, alara m azụ, na-asị: ‘Nke ahụ adịghị amasị m.’ Otú ọ dị, otu ụbọchị, akatara m obi ma kpọọ onye nwe ụlọ mbụ m. Sonja zara, mgbe anyị kparịtasịkwara ụka, o kweere ịnata akwụkwọ e ji amụ Bible. N’otu uhuruchi, anyị tụlere isiokwu metụtara okike, ọ chọkwara ịgụ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation.b Ekwuru m na ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na anyị pụrụ ịhụ ihu na ihu ma tụlee isiokwu ahụ. O kweere. Sonja dị njikere maka ọmụmụ ihe mgbe m rutere, anyị anọwokwa na-amụ ihe kwa izu kemgbe ahụ.” Nwanna anyị nwanyị bụ́ Onye Kraịst na-ekwubi, sị: “Ruo ọtụtụ afọ, ekpewo m ekpere maka ọmụmụ Bible, ma atụghị m anya inweta otu site n’iji telifon agba àmà.”
15, 16. Ahụmahụ ndị dị aṅaa ka ị pụrụ ịkọ iji gosi uru dị n’ịdị nkọ ịchọpụta ụzọ dịgasị iche iche a pụrụ isi malite ọmụmụ Bible?
15 Ọtụtụ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ihi itinye n’ọrụ aro ndị a na-atụ ka a na-agbara ndị mmadụ àmà n’ebe ọ bụla ha nọ. Otu nwanyị Onye Kraịst na United States kwụsịrị ụgbọala ya n’akụkụ ụgbọ njem ọha na eze nke nọ n’ebe ndọba ụgbọala. Mgbe nwanyị nọ n’ụgbọala ahụ hụrụ ya, nwanna nwanyị ahụ malitere ịkọwara ya banyere ọrụ nkụzi Bible anyị. Nwanyị ahụ gere ntị, si n’ụgbọala ahụ gafeta n’ụgbọala nwanna nwanyị ahụ. O kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ nke ukwuu na ị kwụsịrị iso m kwurịta okwu. Ọ dịwo anya m na-enwetabeghị akwụkwọ unu e ji amụ Bible. E wezụga nke ahụ, achọrọ m ịmụ Bible ọzọ. Ị̀ ga-amụrụ m ihe?” N’ụzọ dị otú a, nwanna nwanyị ahụ mepụtara ohere dị mma iji kwusaa ozi ọma ahụ.
16 Otu nwanna nwanyị na United States nwere ahụmahụ na-esonụ mgbe o letara ebe a na-elekọta ndị ahụ́ na-esighị ike: Ọ gakwuuru otu onye na-elekọta ihe omume ụfọdụ n’ebe ahụ ma gwa ya na ya ga-achọ inye onwe ya n’afọ ofufo iji nye aka gboo mkpa ime mmụọ nke ndị bi n’ebe ahụ. Nwanna anyị nwanyị gbakwụnyere na ọ ga-amasị ya iduziri ndị nile ga-achọnụ ọmụmụ Bible kwa izu n’efu. Onye nlekọta ahụ nyere ya ohere ịga n’ọnụ ụlọ nke ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ. N’oge na-adịghị anya, ọ nọ na-eduziri mmadụ 26 bi n’ebe ahụ ọmụmụ Bible ugboro atọ n’izu, otu n’ime ha na-agachikwa nzukọ anyị anya.
17. Ụzọ njekwu dị aṅaa na-adịkarị irè n’ịmalite ọmụmụ Bible?
17 Nye ụfọdụ ndị nkwusa Alaeze, ịgwa ndị mmadụ ozugbo ka a mụwara ha Bible na-arụpụta ezigbo ihe. N’otu ụtụtụ otu ọgbakọ nke nwere ndị nkwusa 105 mere mgbalị pụrụ iche ịgwa onye nwe ụlọ ọ bụla ha zutere ka ha mụwara ya Bible. Ndị nkwusa 86 keere òkè n’ozi ubi, mgbe ha tinyesịkwara awa abụọ n’ọrụ nkwusa, ha chọpụtara na ha amalitewo ọ dịkarịa ala ọmụmụ Bible ọhụrụ 15.
Nọgide Na-achọ Ndị Kwesịrị Ekwesị
18, 19. Olee ntụziaka dị mkpa sitere n’aka Jizọs nke anyị kwesịrị iburu n’uche, ijikwa mezuo nke ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
18 Dị ka onye nkwusa Alaeze, ị pụrụ ịchọ ịnwale aro ndị a tụrụ n’isiokwu a. N’ezie, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya iburu n’uche omenala ógbè unu mgbe ị na-atụle ụzọ ndị e si agba àmà. Karịsịa, ka anyị buru n’uche ntụziaka Jizọs ka anyị na-achọpụta ndị kwesịrị ekwesị ma nyere ndị dị otú ahụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ.—Matiu 10:11; 28:19.
19 Iji mezuo nke ahụ, ka anyị “na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” Anyị pụrụ ime otú ahụ site n’iji nkà ime ka e kweta nke dabesiiri ike n’Akwụkwọ Nsọ eme ihe. Nke a ga-enyere anyị aka iru n’obi ndị na-ege ntị ma kpalie ha ime ihe. Ka anyị na-eji ekpere adabere na Jehova, anyị pụrụ ikere òkè n’inyere ụfọdụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Leekwa ka ọrụ a si bụrụ ihe na-akwụghachi ụgwọ! N’ihi ya, ka anyị ‘na-eme ike anyị nile iche onwe anyị n’ihu Chineke dị ka ndị a nwapụtara anwapụta,’ na-asọpụrụ Jehova mgbe nile dị ka ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi, bụ́ ndị na-eme nkwusa ná nzube nke ime ndị na-eso ụzọ.—2 Timoti 2:15.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
b Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
• N’ihi gịnị ka o ji dị Apọlọs mkpa ka a kọwaara ya ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị?
• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Prisila na Akwịla si mụta ihe n’aka Pọl onyeozi?
• Gịnị ka ị mụtaworo banyere ọrụ ime ndị na-eso ụzọ n’Ọrụ isi 18?
• Olee otú ị pụrụ isi mepụta ohere iji mee ndị na-eso ụzọ?
[Foto dị na peeji nke 18]
Prisila na Akwịla “kọwaara [Apọlọs] ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị”
[Foto dị na peeji nke 20]
Apọlọs bịara nwekwuo nkà n’ime ndị na-eso ụzọ
[Foto dị na peeji nke 21]
Pọl mere nkwusa n’ebe ọ bụla ọ gara
[Foto dị na peeji nke 23]
Mepụta ohere iji mee nkwusa