Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 10/1 p. 20-23
  • Apọlọs—Onye Ọkà Okwu Na-ekwusa Eziokwu Ndị Kraịst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Apọlọs—Onye Ọkà Okwu Na-ekwusa Eziokwu Ndị Kraịst
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọ Dịkwa Ike n’Ihe Nile E Deworo n’Akwụkwọ Nsọ”
  • Onye Na-anụ Ọkụ n’Obi ma Dịrị Umeala n’Obi
  • Na Kọrint
  • Àgwà Chineke Ndị Na-eme Ka Uto Ime Mmụọ Dị Ngwa
  • Na-eme Nkwusa Iji Mee Ndị Na-eso Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • ‘Okwu Jehova Na-agbasa ma Na-akpa Ike’ n’Agbanyeghị Mmegide
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Rite Ezigbo Uru N’ịgụ Baịbụl
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Na-eme Udo Kama Ịna-akpata Ịma Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 10/1 p. 20-23

Apọlọs—Onye Ọkà Okwu Na-ekwusa Eziokwu Ndị Kraịst

MA HA abụwo ndị òtù nke ọgbakọ ndị Kraịst ruo ọtụtụ afọ ma ọ bụ ruo nanị afọ ole na ole, ndị nkwusa Alaeze nile kwesịrị inwe mmasị n’inwe ọganihu dị ka ndị nkwusa ozi ọma ahụ. Nke ahụ pụtara ịmụba ihe ọmụma anyị nke Okwu Chineke na ikike anyị ịkụziri ya ndị ọzọ. Nye ụfọdụ ndị, ọ pụrụ ịpụta iche ihe ịma aka ihu, imeri ihe isi ike, ma ọ bụ iwepụta onwe ha maka ọrụ ka ukwuu.

Bible nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị ikom na ndị inyom raara onwe ha nye n’oge ochie bụ́ ndị, n’ụzọ dị iche iche, nwere ihe ịga nke ọma n’inwe ọganihu ime mmụọ dị ukwuu ma nweta nkwụghachi ụgwọ maka mgbalị ha. Otu n’ime ha bụ Apọlọs. Mgbe Akwụkwọ Nsọ mere ka anyị mata ya, ọ bụ onye nwere nghọta na-ezughị okè nke ozizi ndị Kraịst; otú ọ dị, nanị afọ ole na ole n’ihu, ọ na-eje ozi dị ka onye nnọchiteanya na-ejegharị ejegharị nke ọgbakọ nke narị afọ mbụ. Gịnị mere ka o nwee ike inwe ọganihu dị otú ahụ? O nwere àgwà ndị anyị nile ga-eme nke ọma iṅomi.

“Ọ Dịkwa Ike n’Ihe Nile E Deworo n’Akwụkwọ Nsọ”

N’ihe dị ka n’afọ 52 O.A., dị ka Luk so dee Bible kwuru, “otu onye Juu, aha ya bụ Apọlọs, onye Aleksandria n’ọmụmụ, nke bụ onye ọkà okwu, bịaruru Efesọs; ọ dịkwa ike n’ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ. E jiri okwu ọnụ zie nwoke a ụzọ Onyenwe anyị; ebe ọ dị ọkụ ná mmụọ ya, o wee na-ekwu na-ezikwa nke ọma ihe nile banyere Jisọs, ọ bụ ezie na ọ maara nanị baptism nke Jọn: onye ahụ wee malite ikwuwa okwu n’ụlọ nzukọ.”—Ọrụ 18:24-26.

Aleksandria, Ijipt, bụ obodo nke abụọ kasị ukwuu n’ụwa ma e wezụga Rom, ọ bụkwa otu n’ime ebe isi ọdịbendị kasị mkpa n’oge ahụ maka ndị Juu nakwa maka ndị Gris. Ikekwe, Apọlọs nwetara ihe ọmụma ya dị mma banyere Akwụkwọ Nsọ Hibru na ọkà okwu n’ihi agụmakwụkwọ n’ógbè ndị Juu dị ukwuu nke obodo ahụ. Ebe Apọlọs nọ mụta banyere Jisọs siri ike karị ịghọta. “Dị ka ihe àmà na-egosi ọ bụ onye njem—ikekwe onye ahịa na-ejegharị ejegharị,” ka ọkà mmụta bụ́ F. F. Bruce na-atụ aro ya, “ọ pụkwara izuteworị ndị nkwusa bụ́ ndị Kraịst n’ime otu n’ime ebe ndị ọ gara.” Ka o sina dị, ọ bụ ezie na o kwuru okwu ma kụzie ihe n’izi ezi banyere Jisọs, o yiri ka a gbaworo ya àmà tupu Pentikọst nke 33 O.A., ebe ọ bụ na “ọ maara nanị baptism nke Jọn.”

Dị ka obu ụzọ Jisọs, Jọn Baptist agbawo àmà dị ike nye mba Israel dum, o mekwara ọtụtụ baptism dị ka ihe ngosipụta nke nchegharị. (Mak 1:5; Luk 3:15, 16) Dị ka ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, n’etiti ndị Juu nke Alaeze Ukwu Rom, ihe ọmụma ọtụtụ ndị mmadụ nwere banyere Jisọs jedebere n’ihe e kwusaworo n’ikpere mmiri nke Jọdan. “Iso Ụzọ Kraịst ha nọ n’otu ọnọdụ ahụ ọ nọọrọ ná mmalite nke ozi Onyenwe anyị,” ka W. J. Conybeare na J. S. Howson na-ekwu. “Ha amaghị ihe nile ọnwụ Kraịst pụtara; ikekwe ha amaghịdị eziokwu banyere mbilite n’ọnwụ Ya.” O yiri ka Apọlọs amaghịkwa banyere mwụpụ nke mmụọ nsọ na Pentikọs 33 O.A. Ka o sina dị, o nwetawo ụfọdụ ihe ọmụma ziri ezi banyere Jisọs, o jichighịkwara ya onwe ya. N’ezie, o ji anyaike chọọ ohere ikwu ihe ọ maara. Otú ọ dị, ịnụ ọkụ n’obi na ikpo ọkụ ya aka-abụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.

Onye Na-anụ Ọkụ n’Obi ma Dịrị Umeala n’Obi

Ndekọ Luk na-aga n’ihu, sị: “Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha kutara ya n’ebe ha nọ, wee kọọrọ ya ụzọ Chineke nke ọma karị.” (Ọrụ 18:26) Akwila na Prisila aghaghị ịghọtaworị na okwukwe Apọlọs yiri nke ha nke ukwuu, ma n’ụzọ amamihe dị na ya ha anwaghị idozi nghọta ya na-ezughị ezu n’ihu ọha. Ikekwe anyị pụrụ iche n’echiche na ha na Apọlọs nwere ọtụtụ nkwurịta okwu, ná nzube nke inyere ya aka. Olee otú Apọlọs, nwoke “dịkwa ike . . . n’akwụkwọ nsọ,” si meghachi omume? (Ọrụ 18:24) Dị ka ihe pụrụ ikwe omume, Apọlọs anọwo na-ekwusa ozi ya na-ezughị ezu n’ihu ọha ruo oge ụfọdụ tupu ya ezute Akwila na Prisila. Onye mpako pụrụ n’ụzọ dị mfe ịjụworị ịnakwere mgbazi olu ọ bụla, ma Apọlọs dị umeala n’obi ma nwee ekele n’ihi inwe ike inwezu ihe ọmụma ya.

Otu àgwà emeghị oké ngosi nke Apọlọs ahụ pụtakwara ìhè na njikere ọ dị ịnakwere akwụkwọ ozi nhọpụta sitere n’aka ụmụnna ndị Efesọs nye ọgbakọ dị na Kọrint. Ihe ndekọ ahụ na-aga n’ihu, sị: “Mgbe o zubere ịgabiga n’ofe ka ọ baa n’Akaịa, ụmụnna n’ime Kraịst  . . wee degara ndị na-eso ụzọ Jisọs akwụkwọ ịnara ya nke ọma.” (Ọrụ 18:27; 19:1) Apọlọs asịghị ka a nabata ya ná ntoru nke onwe ya kama o ji imeru ihe n’ókè gbasoo ndokwa nke ọgbakọ ndị Kraịst.

Na Kọrint

Ihe ndị mbụ ozi Apọlọs rụpụtara na Kọrint magburu onwe ha. Akwụkwọ bụ́ Ọrụ Ndị Ozi na-akọ, sị: “Mgbe o ruru, o nyeere ha aka nke ukwuu, bụ́ ndị kwererị site n’amara: n’ihi na o ji ike kwukpaa ndị Juu ọnụ nke ukwuu, n’ihu ọha mmadụ, ebe ọ na-egosi na Jisọs bụ Kraịst ha site n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ.”—Ọrụ 18:27, 28.

Apọlọs tinyere onwe ya n’ije ozi ọgbakọ, na-agba ụmụnna ume site ná nkwadebe na ịnụ ọkụ n’obi ya. Gịnị bụ isi ihe kpatara ihe ịga nke ọma ya? N’ezie Apọlọs nwere ikike ebumpụta ụwa, o nwekwara obi ike n’ijigide nrụrịta ụka ọha nke ya na ndị Juu. Ma nke ka mkpa, o jiri Akwụkwọ Nsọ tụgharịa uche.

Ọ bụ ezie na Apọlọs nwere mmetụta siri ike n’etiti ndị Kọrint, n’ụzọ dị mwute nkwusa ya rụpụtara mmetụta ndị na-ezighị ezi ndị a na-atụghị anya ha. N’ụzọ dị aṅaa? Ma Pọl ma Apọlọs emewo ihe ọma dị ukwuu n’ịkụ na ịkwọsa mkpụrụ nke eziokwu Alaeze ahụ mmiri na Kọrint. Pọl emewo nkwusa n’ebe ahụ n’ihe dị ka na 50 O.A., ihe dị ka afọ abụọ tupu Apọlọs abịarute. Ka ọ na-erule oge Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ ozi ya nke mbụ, n’ihe dị ka na 55 O.A., nkewa dị iche iche ebilitewo. Ụfọdụ na-ele Apọlọs anya dị ka onye ndú ha, ebe ndị ọzọ họọrọ Pọl ma ọ bụ Pita ma ọ bụ rapara nanị n’ebe Kraịst nọ. (1 Ndị Kọrint 1:10-12) Ụfọdụ nọ na-asị: ‘Mụ onwe m bụ nke Apọlọs.’ N’ihi gịnị?

Ozi nke Pọl na Apọlọs kwusara bụ otu ihe, ma ha nwere ọdịdị mmadụ dịrịtara iche. Site ná nkweta ya onwe ya, Pọl bụ “onye na-amụtaghị akwụkwọ n’ụzọ ikwu okwu”; Apọlọs, n’aka nke ọzọ, bụ “onye ọkà okwu.” (2 Ndị Kọrint 10:10; 11:6) O nwere ikike ndị mere ka o nwee ike inweta ndị gere ya ntị n’etiti ụfọdụ n’ime ógbè ndị Juu dị na Kọrint. O nwere ihe ịga nke ọma ‘n’ịgwasi ndị Juu ike na ha jehiere ejehie,’ ebe Pọl, oge na-adịghị anya tupu mgbe ahụ, ahapụwo ụlọ nzukọ ahụ.—Ọrụ 18:1, 4-6.

Nke a ọ̀ pụrụ ịbụ ihe mere ndị ụfọdụ ji nwee ọchịchọ ịgbaso Apọlọs? Ọtụtụ ndị na-enye nkọwa na-ekwu na mkpali dị n’ime maka nkwurịta okwu nkà ihe ọmụma n’etiti ndị Gris pụrụ idujewo ụfọdụ ịhọrọ ụzọ ikwu okwu na-akpali akpali nke Apọlọs. Giuseppe Ricciotti na-atụ aro na “asụsụ [Apọlọs] dị ụtọ ná ntị na okwu ihe atụ ya a chọrọ mma nke ukwuu enwetaworo ya mmasị nke ọtụtụ ndị chọrọ ya karịa Pọl, bụ́ onye na-ekwu okwu n’emeghị oké ngosi na n’ụzọ a na-achọghị mma.” N’ezie, ọ bụrụ na ndị ụfọdụ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị ekwerewo ka ụdị nhọrọ onwe onye ahụ weta nkewa n’etiti ụmụnna, ọ dị mfe ịghọta ihe mere Pọl ji katọsie ike mbuli elu nke “amamihe nke ndị maara ihe.”—1 Ndị Kọrint 1:17-25.

Otú ọ dị, nkatọ dị otú ahụ apụtaghị esemokwu ọ bụla n’etiti Pọl na Apọlọs. Ọ bụ ezie na ụfọdụ echewo na ndị nkwusa abụọ a bụ ndị na-emegiderịta onwe ha n’ụzọ dị ilu iji nweta ịhụnanya nke ndị Kọrint, Akwụkwọ Nsọ ekwughị ụdị ihe ahụ. Kama ịnwa iguzobe onwe ya dị ka onye ndú nke otu òtù, Apọlọs ahapụwo Kọrint, alọghachiwo Efesọs, ma soro Pọl nọrọ mgbe o deere ọgbakọ ahụ kewara ekewa akwụkwọ ozi mbụ.

E nweghị adịghị n’otu ma ọ bụ ịma aka dị n’etiti ha; kama nke ahụ, ihe àmà na-egosi na ha abụọ na-ejikọ aka ọnụ n’idozi nsogbu dị na Kọrint, na-atụkwasịrịta onwe ha obi. Ikekwe Pọl nwere obi abụọ banyere ụfọdụ ndị nọ na Kọrint ma n’ezie ọ bụghị banyere Apọlọs. Ọrụ ndị ikom abụọ ahụ kwekọrọ nnọọ ekwekọ; ozizi ha na-akwadorịta onwe ha. N’ihota okwu Pọl n’onwe ya: “Mụ onwe m kụrụ osisi, Apọlọs kwọsara ya mmiri,” n’ihi na ha abụọ bụcha “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.”—1 Ndị Kọrint 3:6, 9, 21-23.

Dị ka Pọl, ndị Kọrint na-akwanyere Apọlọs ùgwù nke ukwuu, na-achọ ka ọ bịa leta ha ọzọ. Ma mgbe Pọl kpọrọ Apọlọs òkù ka ọ lọghachi na Kọrint, onye Aleksandria ahụ jụrụ ajụ. Pọl na-asị: “Ma okwu banyere Apọlọs nwanna anyị, arịọrọ m ya ọtụtụ arịrịọ ka [ọ] . . . bịakwute unu: ma ihe ọ chọrọ abụghị ka ọ bịa ugbu a ma ọlị; ma ọ ga-abịa mgbe ọ bụla o nwere [ohere].” (1 Ndị Kọrint 16:12) Ọ pụrụ ịbụ na Apọlọs lara azụ ịlọghachi n’ihi egwu nke ịkpasu nkewa ọzọ, ma ọ bụ nanị n’ihi na o ji ọrụ n’aka n’ebe ọzọ.

Oge ikpeazụ a kpọrọ aha Apọlọs n’Akwụkwọ Nsọ, ọ na-aga Krit na ikekwe gafere ya. Ọzọ Pọl na-egosi nchebara echiche pụrụ iche maka enyi ya na onye ọrụ ibe ya, na-agwa Taịtọs ka o nye Apọlọs na onye njem ibe ya, bụ́ Zinas, ihe nile pụrụ ịdị ha mkpa maka njem ha. (Taịtọs 3:13) N’oge a, mgbe ihe dị ka afọ iri nke ọzụzụ ndị Kraịst gasịrị, Apọlọs enwewo ọganihu zuru ezu iji na-eje ozi dị ka onye nnọchiteanya na-ejegharị ejegharị nke ọgbakọ.

Àgwà Chineke Ndị Na-eme Ka Uto Ime Mmụọ Dị Ngwa

Onye nkwusa ahụ bụ́ onye Aleksandria setịpụrụ ezi ihe ilereanya maka ndị nkwusa nke oge a nke ozi ọma ahụ nakwa, n’ezie, ndị nile chọrọ inwe ọganihu ime mmụọ. Ọ pụrụ ịbụ na anyị abụghị ọkà okwu dị ka ọ bụ, ma anyị pụrụ n’ezie ịgba mbọ iṅomi ihe ọmụma na ikike ya n’iji Akwụkwọ Nsọ eme ihe, si otú a na-enyere ndị ji ezi obi na-achọ eziokwu aka. Site n’ihe ilereanya ya nke ọrụ ịnụ ọkụ n’obi, Apọlọs “nyeere ha aka nke ukwuu, bụ́ ndị kwererị.” (Ọrụ 18:27) Apọlọs dị umeala n’obi, na-eji onwe ya achụ àjà, ma dị njikere ijere ndị ọzọ ozi. Ọ ghọtara nke ọma na e nweghị ohere maka ịma aka ma ọ bụ oké ọchịchọ n’ọgbakọ ndị Kraịst, n’ihi na anyị nile bụ ndị “ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.”—1 Ndị Kọrint 3:4-9; Luk 17:10.

Dị ka Apọlọs, anyị pụrụ inwe ọganihu ime mmụọ. Ànyị dị njikere imeziwanye ma ọ bụ ịgbasawanye ozi anyị dị nsọ, na-etinye onwe anyị n’ọnọdụ nke ịbụ ndị Jehova na nzukọ ya ji eme ihe n’ụzọ zuru ezu karị? Ya bụrụ otú ahụ anyị ga-abụ ndị mmụta na-anụ ọkụ n’obi na ndị nkwusa nke eziokwu ndị Kraịst.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya