Ị̀ Na-eṅomi Chineke Anyị Na-adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu?
ELEGHỊ mmadụ anya n’ihu—olee ebe a pụrụ ịchọta ya? Ọ dị Onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu ma ọlị, na-enweghị mbunobi, imelara mmadụ ihe, na ịkpa ókè. Ọ bụ Jehova Chineke, Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ. Otú ọ dị, banyere ụmụ mmadụ, onye England na-ede ihe na narị afọ nke 19 bụ́ Charles Lamb dere n’eziokwu, sị: “Abụ m, hoo haa, onye jupụtara na mbunobi—nke nwere ihe ndị e nwere mmasị na ya na ihe ndị a kpọrọ asị̀.”
Mgbe a bịara n’eleghị mmadụ anya n’ihu, mmekọrịta mmadụ na ibe ya enweghị ya ma ọlị. Ọtụtụ narị afọ gara aga Eze Solomọn maara ihe nke Israel chọpụtara na “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Ịkpọasị agbụrụ, mburịta agha mba na mba, na esemokwu ezinụlọ anọgidewo na-amụba. Ya mere, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na, n’onwe ha, ụmụ mmadụ pụrụ ịzụlite ọha mmadụ na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu?
A chọrọ mgbalị e ji nlezianya mee iji chịkwaa omume anyị ma wepụ n’onwe anyị mbunobi ọ bụla gbamiworo mkpọrọgwụ. (Ndị Efesọs 4:22-24) N’amataghị ya anyị pụrụ inwe omume ndị a ọnọdụ agụmakwụkwọ na ọha mmadụ anyị kpụziri nakwa nke gbanyere mkpọrọgwụ ná nzụlite ezinụlọ, agbụrụ, na mba anyị. Ọchịchọ ndị a yiri ihe dị mfe na-abamikarị abami ma na-akwalite omume ndị na-eduje n’ile mmadụ anya n’ihu. Ọkàikpe sitere Scotland na editọ bụ́ Lord Francis Jeffrey ọbụna kwetara, sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla mmadụ na-agaghị amata ruo ogologo oge ka ókè na ikike nke mbunobi ya.”
Lenaa bụ otu onye kwetara na mgbalị e ji nlezianya mee dị mkpa iji lusoo ọchịchọ ile mmadụ anya n’ihu ọgụ. Iji bịanyụọ mmetụta nke mbunobi n’ime onwe mmadụ, ka ọ na-asị, “na-ewe ọrụ dị ukwuu n’ihi na nzụlite bụ mmetụta siri oké ike.” Lena na-ekwetakwa na ihe ncheta mgbe mgbe dị mkpa.
Ihe Ndekọ Jehova nke Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu
Jehova bụ ihe nlereanya zuru okè nke eleghị mmadụ anya n’ihu. Malite na peji ndị mbụ nke Bible, anyị na-agụ otú o si gosipụta eleghị mmadụ anya n’ihu ya ná mmeso ya n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ihe nlereanya na ihe ncheta ndị a magburu onwe ha.
Jehova gosiri eleghị mmadụ anya n’ihu n’ịgbanwe ihe nke na Pita onyeozi bụ́ onye Juu kpọsara ozi ọma ahụ nye Kọniliọs na ndị Jentaịl ndị ọzọ na 36 O.A. N’oge ahụ Pita kwuru, sị: “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.
Ná mmeso ya nile n’ebe ezinụlọ mmadụ nọ, Jehova egosipụtawo eleghị mmadụ anya n’ihu ya mgbe nile. Kraịst Jisọs kwuru banyere Nna ya, sị: “Ọ na-eme ka anyanwụ Ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, Ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:45) N’ịgakwu n’ihu na-eto Jehova dị ka Chineke na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, Pita gbara akaebe, sị: “Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịa ruo nchegharị.”—2 Pita 3:9.
N’ụbọchị Noa, mgbe “ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, . . . na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile,” Jehova nyere iwu ka e bibie ụwa ahụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Jenesis 6:5-7, 11, 12) Otú ọ dị, mgbe Chineke nyere iwu nakwa n’ebe ndị ya na ha bikọrọ ndụ na-ahụzu ihe na-emenụ, Noa wuru ụgbọ. Ka ya na ụmụ ya na-ewu ụgbọ ahụ, Noa bụkwa “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) N’agbanyeghị ịmara ọchịchọ obi ọjọọ nke ọgbọ ahụ, Jehova zijeere ha ozi doro anya n’ụzọ eleghị mmadụ anya n’ihu. Ọ kpaliri uche na obi ha site n’ime ka Noa wuo ihe ma mee nkwusa. Ha nwere ohere nile ịzaghachi, ma kama nke ahụ ha “amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile.”—Matiu 24:39.
Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke eleghị mmadụ anya n’ihu nke Jehova! Na mgbe ikpeazụ ndị a dị oké egwu, ọ na-akwali ndị ohu Chineke ịkpọsa ozi ọma nke Alaeze ahụ site n’otu eleghị mmadụ anya n’ihu ahụ. Ọzọkwa, ha adịghị ala azụ ikwupụta ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Jehova. N’ebe ọha mmadụ na-ahụzu ha, ha na-ezi ozi Jehova n’eleghị mmadụ anya n’ihu ka onye ọ bụla nụrụ.—Aịsaịa 61:1, 2.
Nkwa ndị Jehova kwere ndị nna ochie bụ́ Abraham, Aịsak, na Jekọb mere ka ọ pụta ìhè na ọ bụ Chineke na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu. Site n’eriri ezinụlọ ha kpọmkwem ka Onye ahụ a họpụtara ga-esi bịa bụ́ onye ‘mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha’ site na ya. (Jenesis 22:18; 26:4; 28:14) Kraịst Jisọs nwapụtara ịbụ Onye ahụ a họpụtara. Site n’ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs, Jehova nyere ụzọ nzọpụta maka ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Ee, abamuru nile nke àjà mgbapụta Kraịst dị adị n’eleghị mmadụ anya n’ihu.
N’ụbọchị Mosis, eleghị mmadụ anya n’ihu nke Jehova pụtara ìhè n’ụzọ kasị akpali mmasị n’ihe metụtara ụmụ ndị inyom Zelọfehad. Ndị inyom ise a chere ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme ihu banyere ihe nketa nke nna ha n’Ala Nkwa ahụ. Nke a dị otú ahụ n’ihi na ọ bụ omenala n’Israel ibufe ihe nketa ala site n’ụmụ ndị ikom nke nwoke. Otú ọ dị, Zelọfehad nwụrụ n’ahapụghị nwa nwoke ga-anata ihe nketa. Ya mere ụmụ ndị inyom ise nke Zelọfehad wetara arịrịọ ha maka mmeso eleghị mmadụ anya n’ihu n’ihu Mosis, na-asị: “N’ihi gịnị ka a ga-agụpụ aha nna anyị n’etiti agbụrụ ya, n’ihi na o nweghị nwa nwoke? Nye anyị ihe onwunwe n’etiti ụmụnne nna anyị ndị ikom.” Jehova gere ntị n’arịrịọ ha ma nye Mosis ntụziaka, sị: “Mgbe nwoke ga-anwụ, ma o nweghị nwa nwoke, unu ga-emekwa ka ihe nketa ya gabiga ruo nwa ya nwanyị aka.”—Ọnụ Ọgụgụ 27:1-11.
Lee ụkpụrụ ịhụnanya na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu ọ bụ! Iji jide n’aka na e meghị ka ihe nketa ebo gafere n’ebo ọzọ mgbe ụmụ ndị inyom ahụ lụrụ di, a chọrọ ha n’aka ịlụ nanị “agbụrụ nke ebo nke ndị bụ nna ha.”—Ọnụ Ọgụgụ 36:5-12.
A na-ahụ nghọta ọzọ nke eleghị mmadụ anya n’ihu nke Jehova n’ụbọchị onye ikpe na onye amụma bụ́ Samuel. Jehova nyere ya ọrụ ka o tee eze ọhụrụ sitere n’ebo Juda n’ime ezinụlọ Jesi onye Betlehem mmanụ. Ma Jesi nwere ụmụ ndị ikom asatọ. Ònye ka a ga-ete mmanụ dị ka eze? Ọdịdị elu ahụ nke Elaịab masịrị Samuel. Otú ọ dị, ọdịdị elu ahụ adịghị emegharị Jehova anya. Ọ gwara Samuel, sị: “Elegidela ihu ya anya, elegidekwala ogologo nke ịdị elu ya; . . . n’ihi na Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.” A họọrọ Devid, ọdụdụ nwa n’ime ụmụ nwoke Jesi.—1 Samuel 16:1, 6-13.
Ịmụta Ihe Site n’Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu nke Jehova
Ndị okenye bụ́ ndị Kraịst ga-eme nke ọma iṅomi Jehova site n’ile anya n’àgwà ime mmụọ nke onye kwere ekwe ibe ha. Ọ dị mfe iji ụkpụrụ nke anyị na-ekpe mmadụ ikpe, na-ekwe ka mmetụta nke onwe anyị na-ekpuchi echiche anyị. Dị ka otu onye okenye si tinye ya, “M na-agbalị imeso ndị ọzọ n’ụzọ na-atọ Jehova ụtọ, ọ bụghị dabere n’echiche m buru ụzọ nwee.” Lee ka o si baa uru ka ndị ohu Jehova nile jiri Okwu ya mee ihe dị ka ụkpụrụ ha!
Ihe nlereanya Bible ndị dị n’elu na-enyere anyị aka ịlụso mmetụta nke mbunobi agbụrụ ma ọ bụ mba na-adịghị apụ apụ ọgụ. Site n’iṅomi eleghị mmadụ anya n’ihu nke Jehova, anyị na-echebe ọgbakọ ndị Kraịst pụọ na mbunobi, ịkpa ókè, na imelara mmadụ ihe.
Pita onyeozi mụtara na “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu.” (Ọrụ 10:34) Imelara mmadụ ihe bụ onye iro nke eleghị mmadụ anya n’ihu, ọ na-emebikwa ụkpụrụ nke ịhụnanya na ịdị n’otu. Jisọs dọọrọ mmasị ndị ogbenye, ndị na-adịghị ike, na ndị e wedara n’ala, o mekwara ka ibu ha dị mfe. (Matiu 11:28-30) O guzopụrụ nnọọ iche n’ebe ndị ndú okpukpe ndị Juu nọ bụ́ ndị na-eme dị ka ndị nwe ndị ahụ, na-ebokwasị ha ibu dị arọ nke ụkpụrụ nduzi. (Luk 11:45, 46) Ime nke a na imelara ndị bara ọgaranya na ndị a ma ama ihe n’ezie ekwekọghị n’ozizi Kraịst.—Jemes 2:1-4, 9.
Taa, ndị okenye bụ́ ndị Kraịst na-edo onwe ha n’okpuru ịbụisi Kraịst ma na-egosi eleghị mmadụ anya n’ihu nye ndị Jehova nile raara onwe ha nye. Ka ha ‘na-azụ ìgwè atụrụ nta Chineke nke dị n’etiti ha,’ ha na-ezere imelara mmadụ ihe n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba, ndịrịta iche n’ọdịdị mmadụ, ma ọ bụ njikọ ezinụlọ. (1 Pita 5:2) Site n’iṅomi Chineke nke na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu na ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ya megide omume nke imelara mmadụ ihe, ndị okenye bụ́ ndị Kraịst na-akwalite mmụọ nke eleghị mmadụ anya n’ihu n’ọgbakọ.
Ọgbakọ ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova bụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. Ọ bụ ihe àmà a na-ahụ anya na ọha mmadụ na-enweghị mbunobi, na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu pụrụ ịdị adị n’okpuru nduzi Jisọs Kraịst. Ndịàmà ‘eyikwasịwo mmadụ ọhụrụ ha, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’ (Ndị Efesọs 4:24) Ee, ha na-amụta ihe site n’ihe nlereanya zuru okè nke Chineke na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, bụ́ Jehova, nweekwa olileanya nke ndụ agwụghị agwụ n’ụwa ọhụrụ ahụ ebe a na-agaghị ele mmadụ anya n’ihu.—2 Pita 3:13.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Aha ndochi anya.
[Foto dị na peeji nke 26]
Pita onyeozi mụtara na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu