Ṅomie Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu nke Jehova
1 Jehova na-eche banyere ụmụ mmadụ. Ọ na-anabata onye ọ bụla na-eme uche ya n’eleghị ya anya n’ihu. (Ọrụ 10:34, 35) Mgbe Jisọs kwusaara ndị mmadụ ozi ọma, o leghịkwa ha anya n’ihu. (Luk 20:21) Ọ dị anyị mkpa iṅomi ihe nlereanya ha, dị ka Pọl mere, bụ́ onye dere, sị: “Otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onyenwe ọha mmadụ, bụrụkwa Onye nwere akụ̀ hie nne inye ndị nile na-akpọku Ya.”—Rom 10:12.
2 Izisara ndị nile anyị na-ezutẹ ozi ọma Alaeze Chineke na-ewetara Chineke otuto. Anyị aghaghị ịnọgide na-eso ndị ọzọ na-ekerịta ozi a magburu onwe ya, n’agbanyeghị agbụrụ ha, ọkwá ha n’obodo, agụmakwụkwọ, ma ọ bụ ókè ha nweruru ego. (Rom 10:11-13) Nke a pụtara ikwusara ndị ga-ege ntị ozi ọma—ụmụ nwoke, ụmụ nwanyị, ụmụaka, na ndị agadi. Ọ dị anyị mkpa ịga n’ụlọ ọ bụla iji nye onye nwe ụlọ nke ọ bụla ohere ịnụ eziokwu ahụ.
3 Nwee Mmasị n’Ebe Mmadụ Nile Nọ: Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ịkpọtụrụ onye ọ bụla anyị pụrụ ịkpọtụrụ. N’iburu nke a n’uche, ndị nkwusa ụfọdụ enwewo ihe ịga nke ọma n’ịgbara ndị nọ n’ọfịs dọkịta, n’ụlọ ọgwụ, n’ebe a na-elekọta ndị agadi, n’ọfịs ndị na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ, na n’ebe mkpụzigharị uche, àmà. Ọzọkwa, ndị nkwusa agbaworo ndị na-elekọta ebe nchekwa ozu, ndị nlekọta na ndị ndụmọdụ n’ụlọ akwụkwọ, na ndị ọkàikpe, àmà. Mgbe a na-ejekwuru ndị ọchịchị, e kwesịrị ka e kelee ha ekele maka ihe ndị bara uru ha na-arụ n’obodo. Nwee omume nkwanye ùgwù, họtakwa isiokwu ndị kwesịrị ekwesị na-ekwu kpọmkwem banyere ụdị ọrụ ha na-arụ na nsogbu ndị a na-enwe na ha.
4 N’otu ọnọdụ, otu nwanna nwanyị jisiri ike gwa otu ọkàikpe okwu n’ọfịs ọkàikpe ahụ. Mgbe ha nwesịrị mkparịta ụka kporo ọkụ, ọkàikpe ahụ kwuru, sị: “Ị̀ maara ihe na-amasị m n’ebe Ndịàmà Jehova nọ? Ha nwere ụkpụrụ ndị gbakwasịrị ụkwụ n’ezi ihe ọmụma bụ́ ndị ha na-adịghị ahapụ ahapụ.” A gbaara onye a a ma ama àmà dị mma.
5 Anyị apụghị ịma ihe dị ndị mmadụ n’obi. Otú ọ dị, site n’iso onye ọ bụla anyị zutere na-ekwurịta okwu, anyị na-egosipụta okwukwe anyị nwere n’ikike Chineke nwere iduzi ọrụ anyị. Ọzọkwa, nke a na-enye ndị mmadụ ohere ịnụ na ime ihe banyere ozi ahụ na-enye olileanya. (1 Tim. 2:3, 4) Ka anyị jiri oge anyị mee ihe n’ụzọ amamihe ma gbalịa iṅomi eleghị mmadụ anya n’ihu nke Jehova site n’iji ozi ọma ahụ gakwuru mmadụ nile anyị pụrụ irute.—Rom 2:11; Efe. 5:1, 2.