Olileanya Ka Mma Maka Mkpụrụ Obi
NDỊ agha Rom atụghị anya nke a. Ka ha wabara n’ebe siri ike dị n’elu ugwu nke Masada, ebe e wusiri ike ikpeazụ nke ndị agha nnupụisi ndị Juu, ha kere nkwụcha maka oké ibu agha nke ndị iro ha, maka iti mkpu nke ndị dike, maka iti mkpu nke ndị inyom na ụmụntakịrị. Kama nke ahụ ha hụrụ nanị ire ọkụ na-agba kịtịkịtị. Ka ha na-enyocha ebe ahụ e wusiri ike na-ere ọkụ, ndị Rom hụtara eziokwu ahụ na-atụ egwu: ndị iro ha—ihe dị ka 960 mmadụ—anwụọlarị! N’usoro n’usoro, ndị dike nke ndị Juu egbuwo ezinụlọ nke onwe ha, gbuzie ibe ha. Nwoke ikpeazụ egbuwo onwe ya.a Gịnị dujere ha n’igbu mmadụ n’ìgwè a na igbu onwe onye dị oké njọ?
Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme biri ndụ n’oge ahụ bụ́ Josephus si kwuo, otu isi ihe dị mkpa bụ nkwenkwe ná mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Eleazar Ben Jair, onye ndú nke ndị Zealot na Masada, ebuola ụzọ nwaa ịrụgide ndị ikom ya na igbu onwe onye ga-abụ ihe dị nsọpụrụ karịa ọnwụ ma ọ bụ ịgba ohu n’aka ndị Rom. N’ịhụ ka ha na-ala azụ ime nke ahụ, ọ malitere okwu na-emetụ n’ahụ banyere mkpụrụ obi. Ọ gwara ha na ahụ bụ nanị ihe mgbochi, ụlọ mkpọrọ nye mkpụrụ obi. “Ma mgbe a tọhapụrụ ya site n’ihe ahụ dị arọ nke na-anyịda ya n’ụwa ma gbaa ya gburugburu,” ka ọ gara n’ihu na-ekwu, “mkpụrụ obi na-alaghachi n’ọnọdụ ya, mgbe ahụ ọ na-ekere òkè n’eziokwu n’ike a gọziri agọzi na ume a na-akparaghị ókè, na-anọgide dị ka ihe anya mmadụ na-apụghị ịhụ dị ka Chineke n’Onwe Ya.”
Gịnị bụ mmeghachi omume ha? Josephus na-akọ na mgbe Eleazar kwusịrị okwu otú a n’ụzọ sara mbara, “ndị nile na-ege ya ntị napụrụ ya okwu n’ọnụ, n’ijupụtakwa n’ịnụ ọkụ n’obi a na-apụghị ịchịkwa achịkwa ha mere ngwa ngwa ịga mee ihe ahụ.” Josephus na-agbakwụnye, sị: “Dị ka a ga-asị na ha bụ ndị mmụọ ọjọọ ji, ha gbapụrụ ọsọ, onye ọ bụla na-achọsi ike ibu onye nke ọzọ ụzọ mesịa, . . . ọchịchọ siri oké ike ejichiela ha igbu nwunye ha, ụmụ ha, na ha onwe ha.”
Ihe atụ a dị njọ na-egosi nnọọ otú ozizi nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ pụrụ isi nnọọ gbanwee echiche kwesịrị ekwesị mmadụ nwere banyere ọnwụ n’ụzọ dị omimi. A na-akụziri ndị kwere ekwe ịhụ ọnwụ, ọ bụghị dị ka onye iro kasị njọ nke mmadụ, kama dị ka nanị ụzọ mgbapụ nke na-atọhapụ mkpụrụ obi iji nụrụ ụtọ ịdị adị ka elu. Ma n’ihi gịnị ka ndị Juu ahụ bụ́ ndị Zealot ji kwere n’ụzọ a? Ọtụtụ ga-ewere ya na ihe odide ha dị nsọ, bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru, na-akụzi na mmadụ nwere mmụọ maara ihe na-aganụ n’ime onwe ya, mkpụrụ obi nke na-apụ iji dịgide ndụ mgbe a nwụsịrị. Ọ̀ bụ otú ahụ n’ezie?
Mkpụrụ Obi n’Akwụkwọ Nsọ Hibru
N’otu okwu, ee e. Kpọmkwem n’akwụkwọ mbụ nke Bible, bụ́ Jenesis, a gwara anyị na mkpụrụ obi abụghị ihe i nwere, ọ bụ ihe ị bụ. Anyị na-agụ banyere okike nke Adam, mmadụ mbụ, sị: “Mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Okwu Hibru e ji mee ihe ebe a maka mkpụrụ obi, bụ́ neʹphesh, pụtara ihe karịrị 700 ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọ dịghị otu mgbe ọ na-enye echiche nke akụkụ mmadụ nke bụ mmụọ, nke dị iche, nke a na-adịghị ahụ anya. N’ụzọ megidere nke ahụ, mkpụrụ obi bụ ihe a pụrụ imetụ aka, ihe gbara ọkpụrụkpụ, ihe a na-ahụ anya.
Sapeta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-esonụ e zoro aka na ha na Bible nke gị, ebe ọ bụ na okwu Hibru ahụ bụ́ neʹphesh dịcha na nke ọ bụla n’ime ha. Ha na-egosi n’ụzọ doro anya na mkpụrụ obi pụrụ iche ihe ize ndụ ihu, ọbụnakwa bụrụ nke a tọọrọ (Deuterọnọmi 24:7; Ndị Ikpe 9:17; 1 Samuel 19:11); imetụ ihe aka (Job 6:7); bụrụ nke e ji ígwè kpọchibido (Abụ Ọma 105:18); chọọ iri ihe, bụrụ nke e wedara ala site n’obubu ọnụ, ma tụbọọ n’ihi agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ; rịakwa ọrịa na-ata ahụ ma ọ bụ ọbụna ehighị ụra nke ọma n’ihi mwute. (Deuterọnọmi 12:20; Abụ Ọma 35:13; 69:10; 106:15; 107:9; 119:28) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, n’ihi na mkpụrụ obi gị bụ gị, gị onwe gị, mkpụrụ obi gị pụrụ inwe ahụmahụ ihe ọ bụla nke ị pụrụ inwe ahụmahụ ya.b
Nke ahụ ọ̀ pụtaziri na mkpụrụ obi pụrụ ịnwụ n’ezie? Ee. N’abụtụghị ihe na-adịghị anwụ anwụ, a na-ekwu banyere mkpụrụ obi mmadụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dị ka nke ‘e bipụrụ,’ ma ọ bụ gbuo, n’ihi ime ihe ọjọọ, ịbụ nke e tipụrụ ndụ ya, gbuo ya egbuo, bibie, ma dọkaa. (Ọpụpụ 31:14; Deuterọnọmi 19:6; 22:26; Abụ Ọma 7:2) “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ,” ka Ezikiel 18:4 na-ekwu. N’ụzọ doro anya, ọnwụ bụ ọgwụgwụ nke mkpụrụ obi mmadụ nile, ebe ọ bụ na anyị nile na-eme mmehie. (Abụ Ọma 51:5) A gwara mmadụ mbụ, bụ́ Adam, na ntaramahụhụ maka mmehie bụ ọnwụ—ọ bụghị ịgafere n’ógbè ndị bụ mmụọ na anwụghị anwụ. (Jenesis 2:17) Mgbe o mehiekwara, e kwupụtara ikpe ọmụma, sị: “N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” (Jenesis 3:19) Mgbe Adam na Iv nwụrụ, ha ghọrọ nnọọ ihe Bible na-ezo aka na ya ọtụtụ mgbe dị ka “mkpụrụ obi nwụrụ anwụ.”—Ọnụ Ọgụgụ 5:2; 6:6, NW.
Ka a sịkwa ihe mere The Encyclopedia Americana ji na-ekwu banyere mkpụrụ obi n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, sị: “Echiche dị n’Agba Ochie banyere mmadụ bụ nke ịdị n’otu, ọ bụghị njikọ nke mkpụrụ obi na anụ ahụ.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ọ dịghị mgbe a ghọtara Nefesh . . . dị ka ihe ya na anụ ahụ na-adịghị arụkọ ọrụ.”
Ya mere, gịnị ka ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi kwere na ọnwụ bụ? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ha kwere na ọnwụ bụ ihe megidere ndụ. Abụ Ọma 146:4 na-ekwu ihe na-eme mgbe mmụọ, ma ọ bụ ike ndụ, pụrụ n’ime mmadụ, sị: “Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”c N’otu aka ahụ, Eze Solomọn dere na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.”—Eklisiastis 9:5.
Mgbe ahụ, n’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị Juu nke narị afọ mbụ, dị ka ndị Zealot ahụ nọ na Masada, ji kwenyesie nnọọ ike n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?
Mmetụta Gris
Ndị Juu nwetara echiche a, ọ bụghị site na Bible, kama site n’aka ndị Gris. N’agbata narị afọ nke asaa na nke ise T.O.A., echiche ahụ yiri ka o si n’òtù okpukpe ihe omimi ndị Gris gaa na nkà ihe ọmụma Gris. Echiche nke ndụ ma ọnwụ gasịa ebe mkpụrụ obi ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ na-egbu mgbu anọọla na-adọrọ oké mmasị eri ogologo oge, echiche ahụ gbanyekwara mkpọrọgwụ ma gbasaa. Ndị ọkà ihe ọmụma rụrụ ụka n’akwụsịghị akwụsị banyere ọdịdị nke mkpụrụ obi kpọmkwem. Homer zọọrọ na mkpụrụ obi na-efepụ mgbe mmadụ nwụrụ, na-eme ụzụ a pụrụ ịnụ dị ka ube aṅụ, ube nnụnụ, ma ọ bụ ụda ihe na-akụkọta ọnụ. Epicurus kwuru na mkpụrụ obi n’ezie nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ, n’ihi ya kwa bụrụ anụ ahụ dị oké nta.d
Ma eleghị anya onye kasị kwadoo mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ bụ ọkà ihe ọmụma Grik bụ́ Plato, nke narị afọ nke anọ T.O.A. Nkọwa ọ kọwara ọnwụ onye nkụzi ya, bụ́ Socrates, na-ekpughe nkweta ndị dị nnọọ ka nke ndị Zealot nke Masada ọtụtụ narị afọ n’ihu. Dị ka ọkà mmụta bụ́ Oscar Cullmann si tinye ya, “Plato na-egosi anyị otú Socrates si gaa n’ọnwụ ya n’udo na ntụsara ahụ zuru ezu. Ọnwụ Socrates bụ ọnwụ mara mma. Ọ dịghị ihe a hụrụ ebe a banyere egwu ọnwụ. Socrates apụghị ịtụ ọnwụ egwu, ebe ọ bụ n’ezie na ọ na-atọhapụ anyị site n’anụ ahụ. . . . Ọnwụ bụ oké enyi nke mkpụrụ obi. Ọ bụ ihe ọ na-ezi; ya mekwara, n’ikwekọ n’ozizi ya n’ụzọ magburu onwe ya, ọ nwụrụ.”
Ihe àmà na-egosi na ọ bụ n’oge Maccabees, na narị afọ nke abụọ tupu Kraịst, ka ndị Juu malitere ịmụta ozizi a n’aka ndị Gris. Na narị afọ mbụ O.A., Josephus na-agwa anyị na ndị Farisii na ndị Essene—òtù okpukpe ndị siri ike nke ndị Juu—nakweere ozizi a. Abụ uri ụfọdụ nke ma eleghị anya a rọrọ n’oge ahụ na-egosipụta otu ụdị nkwenkwe ahụ.
Otú ọ dị, gịnị banyere Jisọs Kraịst? Ya na ndị na-eso ụzọ ya hà kụzikwara echiche a sitere n’okpukpe ndị Gris?
Otú Ndị Kraịst Mbụ Si Lee Mkpụrụ Obi Anya
Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ eleghị mkpụrụ obi anya dị ka ndị Gris si lee ya. Dị ka ihe atụ, tụlee ọnwụ nke enyi Jisọs bụ́ Lazarọs. Ọ bụrụ na Lazarọs nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke fepụrụnụ, nwere onwe ya ma na-enwe obi ụtọ, n’oge ọnwụ ya, ọ̀ bụ na a gaghị ede ihe ndekọ dị na Jọn isi nke 11 n’ụzọ dị nnọọ iche? N’ezie Jisọs gaara agwa ndị na-eso ụzọ ya ma ọ bụrụ na Lazarọs dị ndụ, bụrụkwa onye ahụ dị mma ma mara ihe na-emenụ n’eluigwe; n’ụzọ megidere ya, o kwughachiri ihe Akwụkwọ Nsọ Hibru kwuru wee gwa ha na Lazarọs na-ehi ụra, n’amaghị ihe ọ bụla. (Amaokwu nke 11) N’ezie Jisọs gaara aṅụrị ọṅụ ma ọ bụrụ na enyi ya nọ na-anụ ụtọ ịdị adị ọhụrụ dị ebube; kama nke ahụ, anyị na-ahụ ya ka ọ na-ebe ákwá n’ihu ọha banyere ọnwụ a. (Amaokwu nke 35) N’ezie, ọ bụrụ na mkpụrụ obi Lazarọs anọrọlarị n’eluigwe, na-enwe afọ ojuju n’anwụghị anwụ nke obi ụtọ, ọ dịghị mgbe Jisọs gaara enwe nnọọ obi ọjọọ nke ịkpọlata ya ibikwu afọ ole na ole na “mkpọrọ” nke anụ ahụ na-ezughị okè n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ na-arịa ọrịa ma na-anwụ anwụ.
Lazarọs ọ̀ lọghachiri site n’ọnwụ na-akọ akụkọ mara mma nke ụbọchị anọ magburu onwe ya ọ nọrọ dị ka mmụọ a tọhapụrụ atọhapụ, nke na-enweghị anụ ahụ? Ee e, o meghị ya. Ndị kwere ná mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ ga-azaghachi na nke a bụ n’ihi na ahụmahụ nwoke ahụ riri ya ọnụ. Ma arụmụka a adịghị eme ka e kweta; e kwuwerị, Lazarọs ọ́ pụghịkwarị ịgwa ndị ọ hụrụ n’anya otú ahụ ma ọ dịkarịa ala—na ya enweela ahụmahụ nke riri ya ọnụ nke ukwuu? Kama nke ahụ, Lazarọs ekwughị ihe ọ bụla banyere ahụmahụ ọ bụla o nweworo mgbe ọ nwụrụ anwụ. Cheedị banyere ya—ịgbachi nkịtị n’otu isiokwu nke ụmụ mmadụ na-achọsi ike ịmara karịa nke ọ bụla ọzọ: ihe ọnwụ dị ka ya! A pụrụ ịkọwa ịgbachi nkịtị ahụ nanị n’otu ụzọ. Ọ dịghị ihe e nwere ikwu. Ndị nwụrụ anwụ nọ n’ụra, n’amaghị ihe ọ bụla.
Ya mere, Bible ọ̀ na-egosi ọnwụ dị ka enyi mkpụrụ obi, nanị ụzọ ngafere n’agbata ọnọdụ nile nke ịdị adị? Ee e! Nye ezi ndị Kraịst dị ka Pọl onyeozi, ọnwụ abụghị enyi; ọ bụ “onye iro ikpeazụ.” (1 Ndị Kọrint 15:26) Ndị Kraịst na-ahụ ọnwụ, ọ bụghị dị ka ihe si n’okike, kama dị ka ihe jọgburu onwe ya megidere okike, n’ihi na ọ bụ ihe sitere kpọmkwem ná mmehie na nnupụisi megide Chineke. (Ndị Rom 5:12; 6:23) Ọ dịghị mgbe ọ bụ akụkụ nke nzube mbụ nke Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ.
Otú ọ dị, ezi ndị Kraịst anọghị n’enweghị olileanya mgbe a bịara n’ihe banyere ọnwụ nke mkpụrụ obi. Mbilite n’ọnwụ nke Lazarọs bụ otu n’ime ọtụtụ ihe ndekọ Bible ndị na-egosi anyị n’ụzọ pụtara ìhè olileanya bụ eziokwu, nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ maka mkpụrụ obi nwụrụ anwụ—mbilite n’ọnwụ. Bible na-akụziri anyị banyere ụdị mbilite n’ọnwụ abụọ dịrịtara iche. Nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ́ ndị nọ n’ụra n’ili, ma ha bụ ndị ezi omume ma ha bụ ndị ajọ omume, e nwere olileanya nke mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ agwụghị agwụ na Paradaịs n’elu ala ebe a. (Luk 23:43; Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Nye ìgwè dị nta bụ́ ndị Jisọs zoro aka na ha dị ka “ìgwè atụrụ nta,” e nwere mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ dị ka ndị bụ mmụọ n’eluigwe. Ndị a, bụ́ ndị gụnyere ndị ozi Kraịst, ga-esoro Kraịst Jisọs chịa ihe a kpọrọ mmadụ ma weghachi ha n’izu okè.—Luk 12:32; 1 Ndị Kọrint 15:53, 54; Mkpughe 20:6.
Gịnịzi mere anyị ji na-ahụ ka chọọchị nile nke Krisendọm na-akụzi, ọ bụghị mbilite n’ọnwụ, kama anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ? Tụlee azịza nke ọkà mmụta okpukpe bụ́ Werner Jaeger nyere na magazin bụ́ The Harvard Theological Review laa azụ na 1959: “Eziokwu kasị mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke ozizi ndị Kraịst bụ na nna nke nkà mmụta okpukpe ndị Kraịst, bụ́ Origen, bụ ọkà ihe ọmụma nwere echiche Plato n’ụlọ akwụkwọ Alexandria. Ọ gbakwụnyere n’ozizi ndị Kraịst ozizi nile nke mkpụrụ obi, bụ́ nke ọ natara Plato.” Ya mere chọọchị mere kpọmkwem ihe ndị Juu meworo ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ! Ha hapụrụ ozizi Bible ma họrọ nkà ihe ọmụma ndị Gris.
Mmalite Ozizi ahụ n’Ezie
Ugbu a ụfọdụ pụrụ ịjụ ajụjụ, iji kwadoo ozizi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, sị, N’ihi gịnị ka ọtụtụ okpukpe nke ụwa ji akụzi ụdị ozizi ahụ n’otu ụdị ma ọ bụ ọzọ? Akwụkwọ Nsọ na-enye otu ihe bụ eziokwu kpatara ozizi a ji jupụta nnọọ n’ime okpukpe dị iche iche nke ụwa a.
Bible na-agwa anyị na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ” ma mee ka a mata Setan kpọmkwem dị ka “onyeisi ụwa nke a.” (1 Jọn 5:19; Jọn 12:31) N’ụzọ pụtara ìhè, okpukpe ụwa apụbeghị ná mmetụta Setan. N’ụzọ megidere nke ahụ, ha atụnyela ụtụ nke ukwuu ná nsogbu na esemokwu dị n’ụwa nke taa. N’ihe banyekwara mkpụrụ obi, ha yiri ka ha na-egosipụta uche Setan n’ụzọ doro nnọọ anya. N’ụzọ dị aṅaa?
Cheta ụgha mbụ a ghara. Chineke agwala Adam na Iv na ha ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha emehie megide ya. Ma Setan mesiri Iv obi ike, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ.” (Jenesis 3:4) N’ezie, Adam na Iv nwụrụ; ha laghachiri n’ájá dị ka Chineke kwuworo. Setan, bụ́ ‘nna ụgha,’ enweghị mgbe ọ hapụrụ ụgha mbụ ya. (Jọn 8:44) N’ọtụtụ okpukpe a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị dapụworo n’ozizi Bible ma ọ bụ leghara ya anya kpam kpam, a ka na-agbasakwa otu ụdị echiche ahụ: ‘Ọ dịghị ọnwụ ị na-aghaghị ịnwụ. Anụ ahụ gị pụrụ ịla n’iyi, ma mkpụrụ obi gị ga-adịgide ndụ, ruo mgbe ebighị ebi—dị ka Chineke!’ Ọ dị mma ịmara na Setan agwawokwa Iv na ọ ga-adị “ka Chineke”!—Jenesis 3:5.
Lee ka o si ka nnọọ mma inwe olileanya nke dabeere, ọ bụghị n’ụgha ma ọ bụ nkà ihe ọmụma mmadụ, kama n’eziokwu. Lee ka o si ka nnọọ mma inwe obi ike na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla n’ili kama inwe nchegbu banyere ebe mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nọ! Ọ dịghị mkpa ka ụra a nke ndị nwụrụ anwụ tụọ anyị egwu ma ọ bụ mee ka anyị daa mbà n’obi. N’otu ụzọ, anyị pụrụ ile ndị nwụrụ anwụ anya dị ka ndị nọ n’ebe izu ike dị nchebe. N’ihi gịnị ka o ji dị nchebe? N’ihi na Bible na-emesi anyị obi ike na ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị Jehova hụrụ n’anya na-adị ndụ n’echiche pụrụ iche. (Luk 20:38) Ha dị ndụ n’ikike ncheta ya. Nke ahụ bụ echiche na-akasi obi nke ukwuu n’ihi na ikike ncheta ya enweghị nsọtụ. O nwere oké mmasị iweta ọtụtụ nde a na-apụghị ịgụta ọnụ nke ụmụ mmadụ a hụrụ n’anya ná ndụ ma nye ha ohere ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala.—Tụlee Job 14:14, 15.
Ụbọchị dị ebube nke mbilite n’ọnwụ ga-abịa, ebe a ga-emezurịrị nkwa nile nke Jehova. (Aịsaịa 55:10, 11) Cheedị nnọọ echiche banyere amụma a imezu: “Ma ndị gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, ozu ha ga-ebilite ọzọ. Ndị na-ehi ụra n’ime ala ga-eteta ma tie mkpu ọṅụ; n’ihi na igirigi gị bụ igirigi nke ìhè na-egbuke egbuke, ala ga-amụghachikwa ndị nwụrụ eri ogologo oge.” (Aịsaịa 26:19, The New English Bible) Ya mere ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị na-ehi ụra n’ili nọ ná nchebe dị ka nwa nọ n’ime akpa nwa nne ya. A “ga-amụ” ha n’oge na-adịghị anya, weghachi ha ná ndụ na paradaịs elu ala!
Olee olileanya pụrụ ịka nke ahụ mma?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A kọrọ na ndị inyom abụọ na ụmụntakịrị ise lanarịrị n’ebe ha zoro. Ndị inyom ahụ mesịrị kọọrọ ndị Rom jidere ha ihe nile merenụ.
b Otú ọ dị, dị ka ọ na-adị ọtụtụ okwu nke a na-eji eme ihe n’ụzọ sara mbara, okwu ahụ bụ́ neʹphesh nwekwara ihe ndị ọzọ ọ pụtara. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ izo aka na mmadụ ime, karịsịa n’izo aka ná mmetụta ndị dị omimi. (1 Samuel 18:1) Ọ pụkwara izo aka ná ndụ mmadụ na-ebi dị ka mkpụrụ obi.—1 Ndị Eze 17:21-23.
c Okwu Hibru maka “mmụọ,” bụ́ ruʹach, pụtara “ume” ma ọ bụ “ifufe.” N’ihe metụtara ndị mmadụ, ọ dịghị ezo aka ná mmụọ maara ihe na-aganụ, kama nke ahụ, dị ka The New International Dictionary of New Testament Theology si tinye ya, ‘n’ike ndụ nke onye ahụ.’
d Ọ bụghị onye ikpeazụ chelagara echiche n’akụkụ a dịwagara iche. N’akụkụ mmalite nke narị afọ a, otu ọkà mmụta sayensị n’ezie zọọrọ na ya atụọla mkpụrụ obi nke ụfọdụ ndị mmadụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ site n’iwepụ ịdị arọ ha ozugbo ahụ ha nwụsịrị site n’ịdị arọ ha kpọmkwem tupu ọnwụ.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị Juu bụ́ ndị Zealot na Masada kwere na ọnwụ ga-atọhapụ mkpụrụ obi ha