Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Nkwenye Gị ná Mbilite n’Ọnwụ Siruru n’Ike?
“Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.”—JỌN 11:25.
1, 2. N’ihi gịnị ka obi ike n’olileanya nke mbilite n’ọnwụ ji dị onye na-efe Jehova mkpa?
RUO ókè hà aṅaa ka olileanya gị ná mbilite n’ọnwụ siruru n’ike? Ọ̀ na-ewusi gị ike megide egwu nke ịnwụ anwụ ma na-akasi gị obi mgbe ndị ị hụrụ n’anya nwụnahụrụ gị? (Matiu 10:28; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:13) Ị̀ dị ka ọtụtụ ndị ohu Chineke nke oge ochie, bụ́ ndị diri otiti ihe, ịkwa emo, mmekpọ ọnụ, na agbụ ụlọ mkpọrọ, na-abụ ndị nkwenye ná mbilite n’ọnwụ wusiri ike?—Ndị Hibru 11:35-38.
2 Ee, onye na-efe Jehova n’obi eziokwu ekwesịghị inwe obi abụọ ma ọlị na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ, obi ike ya kwesịkwara imetụta ụzọ o si ebi ndụ ya. Ọ bụ ihe dị ịtụnanya ịtụgharị uche n’eziokwu ahụ bụ́ na n’oge Chineke, osimiri, ọnwụ, na Hedis ga-enyeghachi ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha, ndị a e mekwara ka ha si n’ọnwụ bilie ga-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs.—Mkpughe 20:13; 21:4, 5.
Obi Abụọ Banyere Ndụ n’Ọdịnihu
3, 4. Nkwenkwe dị aṅaa ka ọtụtụ ka nwere banyere ndụ mgbe a nwụsịrị?
3 Eri ogologo oge Krisendọm akụziworị na a na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị. Otu isiokwu dị na magazin bụ́ U.S. Catholic kwuru, sị: “N’ime ọgbọ nile, ndị Kraịst anwawo ịnakwere ndakpọ olileanya na nhụjuanya nke ndụ a site n’ilepụ anya maka ndụ ọzọ, nke udo na afọ ojuju, nke nwere nzube na obi ụtọ.” Ọ bụ ezie na n’ọtụtụ ala Krisendọm, ndị mmadụ adịghị eji okpukpe akpọrọ ihe ma na-enwetụ echiche na-ezighị ezi banyere okpukpe, ọtụtụ ka na-eche na a ghaghị inwe ihe ga-adị mgbe a nwụsịrị. Ma e nwere ọtụtụ ihe ha na-ejighị n’aka.
4 Otu isiokwu na magazin bụ́ Time kwuru, sị: “Ndị mmadụ ka kwere ná [ndụ mgbe a nwụsịrị]: ọ bụ nanị na echiche ha banyere ihe ọ bụ kpọmkwem aghọwanyewo ihe na-edoghị anya, ha adịghị anụkebekwa nnọọ banyere ya n’ọnụ ndị pastọ ha.” N’ihi gịnị ka ndị ozi okpukpe ji ghara ịdị na-ekwukebe banyere ndụ mgbe a nwụsịrị dị ka ha na-emebu? Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Jeffrey Burton Russell na-ekwu, sị: “M na-eche na [ndị ụkọchukwu] chọrọ izere isiokwu ahụ n’ihi na ọ na-adị ha ka ha ga-emeriri ihe mgbochi nke obi abụọ zuru ebe nile.”
5. Olee otú ọtụtụ taa si ele ozizi ọkụ ala mmụọ anya?
5 N’ọtụtụ chọọchị, ndụ mgbe a nwụsịrị na-agụnye otu eluigwe na otu hel na-ere ọkụ. Ọ bụrụkwa na ndị ụkọchukwu na-ala azụ ikwu banyere eluigwe, ha na-ala azụ ọbụna karị ikwu banyere hel. Otu isiokwu akwụkwọ akụkọ kwuru, sị: “N’ụbọchị ndị a ọbụna chọọchị ndị kwere na ntaramahụhụ ebighị ebi n’ime hel nkịtị . . . na-eme ka echiche ahụ gharakwa ịbụ oké ihe.” N’ezie, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta okpukpe nke oge a ekwekwaghị na hel dị ka ebe mmekpa ahụ nkịtị, bụ́ otú e si kụzie ya na Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya. Kama nke ahụ, ha na-ahọrọ ụdị ozizi hel ka “dị nro.” Dị ka ọtụtụ ndị na-agbaso echiche ọgbara ọhụrụ si kwuo, a dịghị emekpa ndị mmehie nọ na hel ahụ n’ụzọ nkịtị, kama ha na-ata ahụhụ n’ihi ‘nkewapụ ime mmụọ ha site n’ebe Chineke nọ.’
6. Olee otú ụfọdụ si achọpụta na okwukwe ha ezughị ezu mgbe ọdachi chere ha ihu?
6 Ime ka ozizi chọọchị dị nro iji ghara imejọ mmetụta ndị nke oge a pụrụ inyere ụfọdụ aka izere nkatọ ọha mmadụ, ma ọ na-eme ka ọtụtụ nde ndị ji obi eziokwu eje chọọchị na-eche ihe ha ga-ekwere. N’ihi ya, mgbe ọnwụ chere ha ihu, ndị a na-achọpụtakarị na okwukwe ha ezughị ezu. Àgwà ha yiri nke nwanyị ọtụtụ ndị ezinụlọ ya nwụnahụrụ n’ihe mberede dị mwute. Mgbe a jụrụ ya ma okwukwe okpukpe ya o wetaworo ya nkasi obi, ọ zaghachiri n’obi abụọ sị, “Echere m otú ahụ.” Ma ọ bụrụgodị na ọ zaghachiri n’obi ike na okwukwe okpukpe ya enyeworo ya aka, abamuru dị aṅaa na-adịte aka ka ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na ihe ndị o kweere enweghị ezi ihe ndabere? Nke a bụ ihe dị mkpa ịtụle n’ihi na, n’eziokwu, ihe ihe ka n’ọtụtụ chọọchị na-akụzi banyere ndụ n’ọdịnihu dị nnọọ iche n’ihe Bible na-akụzi.
Echiche Krisendọm Banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị
7. (a) Nkwenkwe dị aṅaa ka ihe ka n’ọtụtụ chọọchị nwekọrọ ọnụ? (b) Olee otú otu onye ọkà mmụta okpukpe si kọwaa ozizi nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ?
7 N’agbanyeghị ndịrịta iche ha, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ òtù okpukpe nile nke Krisendọm na-ekweta na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-adịgide ndụ mgbe ahụ nwụsịrị. Ihe ka ọtụtụ kweere na mgbe mmadụ nwụrụ, mkpụrụ obi ya pụrụ ịga eluigwe. Ụfọdụ na-atụ ụjọ na mkpụrụ obi ha pụrụ ịga na hel na-ere ọkụ ma ọ bụ na pọgatrị. Ma echiche nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ bụ ihe na-ekpebi otú ha si ele ndụ n’ọdịnihu anya. Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Oscar Cullmann kwuru banyere nke a, n’otu edemede e bipụtara n’akwụkwọ bụ́ Immortality and Resurrection. O dere, sị: “Ọ bụrụ na anyị ajụọ onye Kraịst nkịtị taa . . . ihe ọ ghọtara ịbụ nkụzi Agba Ọhụrụ banyere ọnọdụ mmadụ mgbe ọ nwụsịrị, e wezụga ole na ole anyị kwesịrị inweta azịza bụ́: ‘Anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi.’” Otú ọ dị, Cullmann gbakwụnyere, sị: “Echiche a a nakweere n’ebe nile bụ otu n’ime nghọtahie kasị ukwuu nke Iso Ụzọ Kraịst.” Cullmann kwuru na mgbe mbụ o kwuru nke a, ọ kpatara oké iwe. Ma, o kwuru eziokwu.
8. Olileanya dị aṅaa ka Jehova chere nwoke na nwanyị mbụ ahụ n’ihu?
8 Jehova Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ịga eluigwe mgbe ha nwụsịrị. Ọ bụghị nzube ya na mbụ na ha kwesịrị ịnwụ anwụ ma ọlị. E kere Adam na Iv ịbụ ndị zuru okè ma nye ha ohere nke ịmụjupụta ụmụ ezi omume n’ụwa. (Jenesis 1:28; Deuterọnọmi 32:4) A gwara nne na nna anyị mbụ na ha ga-anwụ nanị ma ha nupụrụ Chineke isi. (Jenesis 2:17) A sị na ha nọgidere na-erubere Nna ha nke eluigwe isi, ha gaara anọgide na-adị ndụ n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi.
9. (a) Gịnị bụ eziokwu banyere mkpụrụ obi mmadụ? (b) Gịnị na-eme mkpụrụ obi mgbe ọ nwụrụ?
9 Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, Adam na Iv erubereghị Chineke isi. (Jenesis 3:6, 7) Pọl onyeozi kọwara ọdachi ndị si na ya pụta, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Kama ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala, Adam na Iv nwụrụ. Gịnị meziri? Hà nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke a pụrụ iwega na hel na-ere ọkụ ugbu a n’ihi mmehie ha? N’ụzọ megidere nke a, Bible na-ekwu na na mbụ, mgbe e kere ya, Adam “wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7) E nyeghị mmadụ mkpụrụ obi; ọ ghọrọ mkpụrụ obi, onye dị ndụ. (1 Ndị Kọrint 15:45) Leenụ, ọ bụghị nanị na Adam bụ “mkpụrụ obi dị ndụ” kama, dị ka e gosiri n’asụsụ Hibru bụ́ nke e ji dee Jenesis, anụmanụ ndị dị ala karị bụkwa “mkpụrụ obi dị ndụ”! (Jenesis 1:24) Mgbe Adam na Iv nwụrụ, ha ghọrọ mkpụrụ obi nwụrụ anwụ. Ihe Jehova gwaworo Adam mesịrị nnọọ mee ha: “N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.”—Jenesis 3:19.
10, 11. Gịnị ka New Catholic Encyclopedia na-ekweta banyere ozizi Bible banyere mkpụrụ obi, oleekwa otú nke a dị ma e jiri ya tụnyere ihe Bible na-ekwu?
10 N’ụzọ bụ́ isi, New Catholic Encyclopedia kwenyere na nke a. N’isiokwu ya bụ́ “Mkpụrụ Obi (n’ime Bible),” ọ na-ekwu, sị: “E nweghị ịkpa ókè [ikewa ụzọ abụọ] nke ahụ na mkpụrụ obi n’ime AO [“Agba Ochie,” ma ọ bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru].” Ọ na-agbakwụnye na n’ime Bible, okwu bụ́ “mkpụrụ obi” “adịghị mgbe ọ pụtara mkpụrụ obi ịbụ nke dị iche n’ahụ ma ọ bụ mmadụ ahụ.” N’ezie, mkpụrụ obi “na-apụtakarị ihe ahụ e kere eke n’onwe ya, ma ọ̀ bụ anụmanụ ma ọ̀ bụ ụmụ mmadụ.” Ezoghị ọnụ dị otú ahụ na-enye ume ọhụrụ, ma mmadụ pụrụ ịdị na-ajụ ihe mere na e mebeghị ka ndị na-aga chọọchị n’ozuzu ha mata eziokwu ndị a.
11 Lee nchegbu na egwu ndị na-aga chọọchị na-agaraghị enwe ma ọ bụrụ na ha maara eziokwu Bible ahụ dị mfe: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ,” ọ bụghị ịta ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ! (Ezikiel 18:4) Ọ bụ ezie na nke a dị nnọọ iche n’ihe Krisendọm na-akụzi, o kwekọrọ kpam kpam n’ihe nwoke amamihe ahụ bụ́ Solomọn kwuru n’ike mmụọ nsọ sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ [ná ndụ a]; n’ihi na e chezọwo ncheta ha. Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya; n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW, ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ], ebe gị onwe gị na-ala.”—Eklisiastis 9:5, 10.
12. N’ebee ka Krisendọm si nweta ozizi ya banyere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ?
12 N’ihi gịnị ka Krisendọm ji akụzi ihe dị nnọọ iche n’ihe Bible na-ekwu? New Catholic Encyclopedia, n’isiokwu ya bụ́ “Mkpụrụ Obi, Mmadụ, Anwụghị Anwụ Nke,” na-ekwu na Ndị Nna Chọọchị nke oge mbụ nwetara nkwado maka nkwenkwe ná mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, ọ bụghị na Bible, kama ná “ndị na-ede uri na ndị ọkà ihe ọmụma na ọdịnala nile nke echiche ndị Gris . . . E mesịa, ndị ọkà mmụta ahụ họọrọ iji Plato ma ọ bụ ụkpụrụ ndị sitere n’aka Aristotle mee ihe.” Ọ na-ekwu na e mesịrị tinye “mmetụta nke echiche ozizi Plato na ozizi Plato e mere ka ọ dị ọhụrụ”—gụnyere nkwenkwe ná mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ—“n’ime nkà mmụta okpukpe ndị Kraịst bụ́ isi.”
13, 14. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ile anya ka ndị ọkà ihe ọmụma, na-ekpere arụsị nke Gris zie anyị ihe?
13 Ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst hà kwesịrị ịgakwuworị ndị ọkà ihe ọmụma Gris bụ́ ndị ọgọ mmụọ iji mụta banyere ihe gbara ọkpụrụkpụ dị ka olileanya nke ndụ mgbe a nwụsịrị? Ọ dịghị ma ọlị. Mgbe Pọl degaara ndị Kraịst bi na Kọrint, Gris, akwụkwọ, ọ sịrị: “Amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ. N’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onye na-ejide ndị maara ihe n’aghụghọ ha: ọzọkwa, Onyenwe anyị maara ihe ndị maara ihe na-atụle n’obi ha, na ha bụ ihe efu.” (1 Ndị Kọrint 3:19, 20) Ndị Gris oge ochie bụ ndị na-ekpere arụsị. Oleezi otú ha ga-esi bụrụ isi iyi nke eziokwu? Pọl jụrụ ndị Kọrint, sị: “Olee nkwekọ ụlọ nsọ nke Chineke na arụsị na-ekwekọ? n’ihi na anyị onwe anyị bụ ụlọ nsọ nke Chineke dị ndụ; dị ka Chineke kwuru, sị, M ga-ebi n’ime ha, na-ejegharịkwa n’ime ha; M ga-abụkwa Chineke nke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”—2 Ndị Kọrint 6:16.
14 E sitere ná mba Israel nye mkpughe nke eziokwu ndị dị nsọ na mbụ. (Ndị Rom 3:1, 2) Mgbe 33 O.A. gasịrị, e nyere ya site n’ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ nke narị afọ mbụ. N’ikwu banyere ndị Kraịst narị afọ mbụ, Pọl kwuru, sị: “Ọ bụ anyị onwe anyị ka Chineke kpugheere [ihe ndị e doziiri ndị hụrụ ya n’anya] site n’aka Mmụọ Nsọ.” (1 Ndị Kọrint 2:10; leekwa Mkpughe 1:1, 2.) Ozizi Krisendọm nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi sitere na nkà ihe ọmụma ndị Gris. E kpugheghị ya site ná mkpughe ndị Chineke nyere Israel ma ọ bụ site n’ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ nke narị afọ mbụ.
Ezi Olileanya Maka Ndị Nwụrụ Anwụ
15. Dị ka Jisọs si kwuo, gịnị bụ́ ezi olileanya maka ndị nwụrụ anwụ?
15 Ọ bụrụ na e nweghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, gịnị bụ ezi olileanya maka ndị nwụrụ anwụ? N’ezie, ọ bụ mbilite n’ọnwụ, bụ́ ozizi Bible bụ́ isi na nkwa Chineke dị ebube n’ezie. Jisọs nyere olileanya nke mbilite n’ọnwụ mgbe ọ gwara enyi ya bụ́ Mata, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” (Jọn 11:25) Ikwere na Jisọs pụtara ikwere ná mbilite n’ọnwụ, ọ bụghị ná mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ.
16. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ikwere ná mbilite n’ọnwụ?
16 Jisọs ebuworị ụzọ kwuo banyere mbilite n’ọnwụ mgbe ọ gwara ndị Juu ụfọdụ, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) Ihe Jisọs na-akọwa n’ebe a dị nnọọ iche n’ebe mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-adịgide ndụ mgbe ahụ nwụsịrị ma na-aga n’eluigwe kpọmkwem dị. Ọ bụ ‘mpụta’ na-abịa n’ihu nke ndị mmadụ nọworo n’ili, ọtụtụ ha ruo ọtụtụ narị afọ ma ọ bụ ọbụna ruo ọtụtụ puku afọ. Ọ bụ mkpụrụ obi nwụrụ anwụ ịbịaghachi ná ndụ. Ọ̀ bụ ihe na-apụghị ikwe mee? Ọ bụghị nye Chineke “Onye na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha dị ndụ, Onye na-akpọkwa ihe na-adịghị, dị ka [a ga-asị] na ha dị.” (Ndị Rom 4:17) Ndị na-enwe obi abụọ pụrụ ịkwa echiche nke ndị mmadụ ịbịaghachi ná ndụ emo, ma o kwekọrọ kpọmkwem n’eziokwu bụ́ na “Chineke bụ ịhụnanya” nakwa na ọ bụ “Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.”—1 Jọn 4:16; Ndị Hibru 11:6.
17. Gịnị ka Chineke ga-arụzu site ná mbilite n’ọnwụ?
17 E kwuwerị, olee otú Chineke pụrụ isi kwụghachi ndị gosiri onwe ha ịbụ ndị “kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ” ụgwọ ọrụ ma ọ bụrụ na o weghachighị ha ná ndụ? (Mkpughe 2:10) Mbilite n’ọnwụ na-emekwa ka o kwe mee Chineke imezu ihe Jọn onyeozi dere banyere ya, sị: “Ihe e ji mee ka Ọkpara Chineke pụta ìhè bụ nke a, ka O wee laa ọrụ nile nke ekwensu n’iyi.” (1 Jọn 3:8) Laa azụ n’ogige Iden, Setan ghọrọ onye gburu agbụrụ mmadụ nile mgbe o dubara nne na nna mbụ anyị ná mmehie na ọnwụ. (Jenesis 3:1-6; Jọn 8:44) Jisọs malitere ịla ọrụ Setan n’iyi mgbe o nyere ndụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta ruru eru, na-emeghere ihe a kpọrọ mmadụ ụzọ ịbụ ndị a tọhapụrụ site n’ịbụ ohu nke mmehie e ketara eketa nke sitere ná nnupụisi Adam maara ụma nupụ. (Ndị Rom 5:18) Ime ka ndị ahụ na-anwụ n’ihi mmehie a nke Adam si n’ọnwụ bilie ga-abụ ịlakwu ọrụ Ekwensu n’iyi.
Anụ Ahụ na Mkpụrụ Obi
18. Olee otú ụfọdụ ndị ọkà ihe ọmụma Gris si meghachi omume n’okwu Pọl na e mewo ka Jisọs si n’ọnwụ bilie, n’ihi gịnịkwa?
18 Mgbe Pọl onyeozi nọ n’Atens, o kwusaara ìgwè mmadụ nke gụnyere ụfọdụ ndị ọkà ihe ọmụma Gris ozi ọma ahụ. Ha gere ntị n’okwu ya banyere otu ezi Chineke ahụ na òkù ọ na-akpọ maka nchegharị. Ma gịnị ọzọ mere? Pọl kwubiri okwu ya na-asị: “[Chineke edebewo] otu ụbọchị, nke Ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya site n’aka otu Nwoke Ọ kara aka; O nyekwara mmadụ nile ihe ha ga-eji kwere nke a, ebe O mere ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” Okwu ahụ kpatara ọgba aghara. “Mgbe ha nụrụ okwu banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ụfọdụ weere ya mee ihe ọchị.” (Ọrụ 17:22-32) Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Oscar Cullmann kwuru, sị: “Nye ndị Gris kweere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ọ pụrụ isiworo ha ike ịnakwere ime nkwusa ndị Kraịst banyere mbilite n’ọnwụ karịa ka o siiri ndị ọzọ. . . . Ọ dịghị ụzọ ọ bụla a pụrụ isi mee ka nkụzi nke ndị ọkà ihe ọmụma ukwu bụ́ Socrates na Plato na nke Agba Ọhụrụ dabakọọ [kwekọọ].”
19. Olee otú ndị ọkà mmụta okpukpe Krisendọm si nwaa ime ka nkụzi nke mbilite n’ọnwụ na ozizi nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ kwekọọ?
19 Ya dịrịgodị otú ahụ, mgbe oké ndapụ n’ezi ofufe gasịrị n’oge ndị ozi nwụsịrị, ndị ọkà ihe ọmụma okpukpe gbalịrị ijikọta nkụzi ndị Kraịst banyere mbilite n’ọnwụ na nkweta Plato ná mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Ka oge na-aga, ụfọdụ kwetara ná nkọwa ọhụrụ: N’ọnwụ, a na-ekewapụ (“tọhapụ,” dị ka ụfọdụ na-esi ekwu ya) mkpụrụ obi n’ebe ahụ dị. Mgbe ahụ, dị ka Outlines of the Doctrine of the Resurrection, nke R. J. Cooke dere, si kwuo, n’Ụbọchị Ikpe “a ga-ejikọtaghachi ahụ nke ọ bụla na mkpụrụ obi nke ya, mkpụrụ obi nke ọ bụlakwa na ahụ nke ya.” Njikọtaghachi nke ahụ na mkpụrụ obi ya na-adịghị anwụ anwụ n’ọdịnihu ka a sịrị na ọ bụ mbilite n’ọnwụ.
20, 21. Olee ndị nọgideworo na-akụzi eziokwu banyere mbilite n’ọnwụ, oleekwa otú nke a siworo baara ha uru?
20 Nchepụta echiche a ka bụ ozizi e ji eme ihe na chọọchị ndị bụ́ isi. Ọ bụ ezie na echiche dị otú ahụ pụrụ iyi ihe ezi uche dị na ya nye onye ọkà mmụta okpukpe, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-aga chọọchị amaghị ya. Ha kwere nanị na ha ga-aga kpọmkwem n’eluigwe mgbe ha nwụrụ. N’ihi nke a, ná mbipụta commonweal, nke May 5, 1995, onye edemede bụ́ John Garvey boro ebubo, sị: “Nkwenkwe nke ihe ka n’ọtụtụ ndị Kraịst [n’ihe banyere ndụ mgbe a nwụsịrị] na-eyi ka ọ dị nnọọ nso n’ozizi Plato e mere ka ọ dị ọhụrụ karịa ka ọ dị n’ihe ọ bụla bụ́ nke ndị Kraịst n’ezie, o nweghịkwa ndabere na Bible.” N’ezie, site n’iji Plato gbanwere Bible, ndị ụkọchukwu Krisendọm wepụrụ olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ dabeere na Bible n’ebe ìgwè atụrụ ha nọ.
21 N’aka nke ọzọ, Ndịàmà Jehova na-ajụ nkà ihe ọmụma ndị na-ekpere arụsị ma na-araparasi ike n’ozizi Bible nke mbilite n’ọnwụ. Ha na-ahụ ozizi dị otú ahụ ịbụ nke na-ewuli elu, na-eju afọ, ma na-akasi obi. N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-ahụ otú ozizi Bible nke mbilite n’ọnwụ si bụrụ nke nwere ezi ihe ndabere na nke ezi uche dị na ya, nye ma ndị ahụ nwere olileanya ịdị ndụ n’elu ala ma ndị ahụ na-atụ anya mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe. Dị ka nkwadebe maka ịtụle isiokwu ndị a, anyị na-atụ aro ka i jiri nlezianya gụọ isi nke 15 nke akwụkwọ ozi mbụ nke e degaara ndị Kọrint.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zụlite obi ike ná mbilite n’ọnwụ?
◻ Atụmanya dị aṅaa ka Jehova chere Adam na Iv n’ihu?
◻ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ịchọ eziokwu ná nkà ihe ọmụma ndị Gris?
◻ N’ihi gịnị ka mbilite n’ọnwụ ji bụrụ olileanya ezi uche dị na ya?
[Foto dị na peeji nke 10]
Mgbe ha mehiere, nne na nna mbụ anyị tụfuru olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala
[Foto dị na peeji nke 12]
Ndị ọkà mmụta chọọchị ghọrọ ndị nkwenkwe Plato n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi metụtara
[Ebe E Si Nweta Foto]
Musei Capitolini, Roma