Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 5/1 p. 18-23
  • Ụzọ I Si Ele Mkpụrụ Obi Anya Na-emetụta Ndụ Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ I Si Ele Mkpụrụ Obi Anya Na-emetụta Ndụ Gị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • È Kenyere Ya Mkpụrụ Obi Na-adịghị Anwụ Anwụ?
  • Otú Bible Si Eji “Mkpụrụ Obi” Eme Ihe
  • Ọtụtụ Ndị Mmụta Na-ekwenye
  • Ọ Bụghị Bible kama Ọ Bụ Ọkà Ihe Ọmụma Ụwa
  • Mkpụrụ Obi Ọ̀ Na-adịgide Mgbe A Nwusịrị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Gịnị Bụ Mkpụrụ Obi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Mkpụrụ Obi Dị Ka Bible Si Kwuo
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Echiche Ụgha nke 1: Mkpụrụ Obi Anaghị Anwụ Anwụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 5/1 p. 18-23

Ụzọ I Si Ele Mkpụrụ Obi Anya Na-emetụta Ndụ Gị

“Mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.”—JENESIS 2:7.

1, 2. Gịnị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime okpukpe nile kwenyere banyere mmadụ na mkpụrụ obi?

IHE fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile na-ezi na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Akwụkwọ New Catholic Encyclopedia na-ekwu na mkpụrụ obi bụ ihe “Chineke kere ma bụrụ nke a na-etinye n’ime ahụ, mgbe a tụụrụ ime.” Ọ na-ekwukwa na ozizi nke na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ “bụ otu n’ime ozizi ndị bụ ịsị” nke chọọchị nile nke Krisendọm. N’otu aka ahụ, “echiche ndị Alakụba,” ka The New Encyclopoedia Britannica na-ekwu, “bụ na mkpụrụ obi na-amalite ịdị adị n’otu oge ahụ ahụ na-amalite ịdị; e mesịa, ọ na-enwe ndụ nke onwe ya, nke bụ na njikọ nke ya na ahụ bụ ọnọdụ na-adịru nanị nwa oge.”

2 Okpukpe ndị dị otú ahụ kwere na mkpụrụ obi na-ahapụ ahụ ozugbo mmadụ nwụrụ, wee nọgide na-adị ndụ ruo ebighị ebi, ebe njedebe ya abụrụ n’obi ụtọ nke eluigwe, ọnụnọ nwa oge na pọgatrị, ma ọ bụ ịta ahụhụ ebighị ebi na hell nke na-ere ọkụ. A na-ele ọnwụ anya dị ka ụzọ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi n’ime ụwa nke ndị bụ mmụọ. Dị ka otu onye na-ede akwụkwọ kwuru n’akwụkwọ bụ We Believe in Immortality sị: “Ana m ele Ọnwụ anya dị ka oké njem na nke dị ebube. Ana m ele Ọnwụ anya dị ka mbuli elu n’ọkwa nke sitere n’aka Chineke.”

3. Gịnị bụ nkwenkwe nke okpukpe dị iche iche nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ?

3 Ndị Hindu, Buddha, na ndị ọzọ kwenyere n’ịlọ ụwa. Nke a gụnyere nkwenkwe nke na mkpụrụ obi na-alọgharị ụwa mgbe a nwụsịrị, a mụọ ya ọzọ dị ka mmadụ ọzọ ma ọ bụ ihe ọzọ dị ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ mere ezi ihe n’oge mbụ, a sịrị na a ga-amụgharị mkpụrụ obi ya dị ka onye nwere ọkwá dị elu karị. Ma ọ bụrụ na ọ bụ ajọ mmadụ na mbụ, a ga-amụgharị ya dị ka onye dị ala karị ma ọ bụ ọbụna dị ka anụmanụ ma ọ bụ ahụhụ.

4, 5. Gịnị mere o ji dị mkpa ịmara eziokwu banyere mkpụrụ obi?

4 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ụmụ mmadụ enweghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ? Gịnị ma ọ bụrụ na ọnwụ abụghị “mbuli elu n’ọkwá nke sitere n’aka Chineke,” ghara ịbụ ụzọ na-eduba ozugbo gaa ná ndụ ebighị ebi dị ka mmụọ ma ọ bụ ná mmụgharị ọzọ, nye ndị nile nwụrụ anwụ? Mgbe ahụ nkwenkwe nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ ga-eduba mmadụ n’ụzọ na-ezighị ezi. Akwụkwọ bụ Offìcial Catholic Teachings na-asị na chọọchị na-emesi nkwenkwe mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ ike n’ihi na ekwenyeghị na ya “ga-eme ka ekpere ya nile, ememe ili ozu na ihe omume nile nke okpukpe ndị a na-eme maka ndị nwụrụ anwụ bụrụ ihe efu ma ọ bụ nke na-enweghị isi.” Ya mere, o metụtara ụzọ mmadụ si adị ndụ, efe ofufe, na ọdịnihu ebighị ebi ya.—Ilu 14:12; Matiu 15:9.

5 Ọ dị mkpa ịmata eziokwu banyere nkwenkwe nke a. Jisọs kwuru si: “Ndị na-akpọkwa isiala nye [Chineke] aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) A na-achọta eziokwu banyere mkpụrụ obi mmadụ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Akwụkwọ nsọ nke sitere n’ike mmụọ nsọ nwere mkpughe nke nzube nile nke Chineke, ya mere obi pụrụ isi anyị ike na ọ na-agwa anyị eziokwu. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13; 2 Timoti 3:16, 17) Jisọs gwara Chineke n’ekpere, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.”—Jọn 17:17.

È Kenyere Ya Mkpụrụ Obi Na-adịghị Anwụ Anwụ?

6. Gịnị ka ihe ndekọ Jenesis na-agwa anyị n’ụzọ doro anya banyere okike mmadụ?

6 Jenesis 2:7 na-agwa anyị, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, o wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” Ihe ndekọ ahụ ekwughị na Chineke tinyere n’ime mmadụ mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ. O kwuru na mgbe ike Chineke nyere ahụ Adam ume, ọ “wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” Ya mere mmadụ bụ mkpụrụ obi. O nweghị mkpụrụ obi.

7. Gịnị mere e ji tinye ụmụ mmadụ n’elu ụwa?

7 Chineke kere Adam ibi n’elu ụwa, ọ bụghị n’eluigwe. Ụwa agaghị abụ nani ebe a na-anọ ele ule iji hụ ma Adam ò rukwara eru maka eluigwe. Chineke mere elu ụwa “ka e wee biri n’ime ya,” Adam bụkwa mmadụ mbụ nke biri na ya. (Aịsaịa 45:18; 1 Ndị Kọrint 15:45) E mesịa, mgbe Chineke kere Iv dị ka nwunye Adam, nzube Chineke maka ha bụ na ha ga-amụjupụta ụwa meekwa ka ọ ghọọ paradaịs dị ka ebe obibi nke ụmụ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi.—Jenesis 1:26-31; Abụ Ọma 37:29.

8. (a) Na gịnị ka ịdị adị Adam dabeere? (b) Ọ bụrụ na Adam emehieghị, ebee ka ọ gaara anọgideworị na-adị ndụ?

8 Ọ dịghị ebe Bible kwuru na otu akụkụ nke Adam adịghị anwụ anwụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, a kpaara ịdị adị ya ókè, na-eme ka ọ dabere ná nrubeisi nye iwu Chineke. Ọ bụrụ na o mebie iwu ahụ, gịnị ga-eme? Ọ̀ ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ụwa nke ndị bụ mmụọ? Ọ dịghị ma ọlị. Kama nke ahụ, ọ “ghaghi ịnwụ anwu.” (Jenesis 2:17) Ọ ga-alaghachi azụ n’ebe o sitere: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” (Jenesis 2:7; 3:19) Adam adịghị adị ma ọlị tupu e kee ya, ọ gaghịkwa adị adị mgbe ọ nwụsịrị. Ya mere ọ ghaghị ịhọrọ n’etiti ihe abụọ nanị: (1) nrubeisi na ndụ ma ọ bụ (2) nnupụisi na ọnwụ. A sị na Adam emehieghị, ọ gaara adị ndụ n’elu ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ọ garaghị aga eluigwe ma ọlị.

9. Gịnị ka Bible na-akpọ ọnwụ n’ụzọ ziri ezi, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

9 Adam nupụrụ isi, ọ nwukwara. (Jenesis 5:5) Ọnwụ bụ ntaramahụhụ ya. Ọ bụghị ụzọ na-eduba na ‘njem dị ebube’ kama ụzọ nke na-eduba n’adịghị adị. Otú a, ọnwụ abụghị enyi kama ọ bụ ihe Bible kpọrọ ya, bụ́ “onyeiro.” (1 Ndị Kọrint 15:26) A sị na Adam nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke ga-aga n’eluigwe ma ọ bụrụ na o rubere isi, mgbe ahụ ọnwụ gaara abụ ihe ngọzi. Ma ọ dịghị otú ahụ. Ọ bụ ọbụbụ ọnụ. Sitekwa ná mmehie Adam, ọbụbụ ọnụ nke ọnwụ gbasara ruo mmadụ nile n’ihi na mmadụ nile bụ ụmụ ya.—Ndị Rom 5:12.

10. Nsogbu siri ike dị aṅaa na-ebilite n’ikwenye na Adam nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ?

10 Ọzọkwa, a sị na e kenyere Adam mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke a ga-ata ahụhụ ebighị ebi na hell dị ọkụ ma ọ bụrụ na o mehie, gịnị mere a dọghị ya aka ná ntị banyere nke a? Gịnị mere e ji gwa ya nanị na ọ ga-anwụ wee laghachi n’ájá? Lee ka ọ ga-esiworị bụrụ ihe mmegbu ịma Adam ikpe gaa n’ahụhụ ebighị ebi n’ihi nnupụisi, ebe a na-adọghị ya aka ná ntị banyere ya! Otú ọ dị, n’ebe Chineke nọ, ‘e nweghị ikpe na-ezighị ezi.’ (Deuterọnọmi 32:4) Ọ dịghị mkpa ịdọ Adam aka ná ntị banyere hell nke na-ere ọkụ maka mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke ndị ajọ mmadụ. Hell dị otú ahụ adịghị adị, e nweghịkwa mkpụrụ obi ndị na-adịghị anwụ anwụ. (Jeremaịa 19:5; 32:35) E nweghị ntaramahụhụ ebighị ebi ọ bụla n’ájá nke elu ala.

Otú Bible Si Eji “Mkpụrụ Obi” Eme Ihe

11. (a) N’ime Bible okwu Igbo bụ “mkpụrụ obi” sitere n’okwu Hibru na Grik ndị dị aṅaa? (b) Olee otú King James Version si ede okwu Hibru na Grik maka “mkpụrụ obi”?

11 N’akụkụ Akwụkwọ nsọ Hibru, okwu Igbo bụ “mkpụrụ obi” pụtara site n’okwu Hibru bụ ne’phesh, nke pụtara ihe karịrị 750 ugboro. Ihe ya na ya bụ otu ihe n’akụkụ Akwụkwọ nsọ Grik bụ psy.khe’, bụ́ nke pụtara ihe karịrị 100 ugboro. New World Translation of the Holy Scriptures sụgharịrị okwu ndị a mgbe nile dị ka “mkpụrụ obi.” Bible ndị ọzọ pụrụ iji okwu dị iche iche mee ihe. Ụzọ ụfọdụ King James Version si sụgharịa ne’phesh, bụ: agụụ, anụ ọhịa, ahụ, ume, ihe e kere eke, (ahụ) nwụrụ anwụ, ọchịchọ, obi, ndụ, mmadụ, uche, onye, onwe onye, mkpụrụ obi, ihe. Ọ sụgharịkwara psy.khe’ dị ka: obi, ndụ, uche, mkpụrụ obi.

12. Olee otú Bible si eji okwu Hibru na Grik ndị ahụ maka “mkpụrụ obi” eme ihe?

12 Bible kpọrọ ihe ndị e kere eke dị n’oké osimiri ne’phesh: “Mkpụrụ obi ọ bụla nke dị ná mmiri.” (Levitikọs 11:10, NW) A pụrụ iji okwu ahụ mee ihe banyere anụ ndị bi n’elu ala: “Ka ala wepụta mkpụrụ obi dị iche iche n’ụdị ha, anụ ụlọ na anụ ndị na-akpụ akpụ na anụ ọhịa.” (Jenesis 1:24, NW) Ọtụtụ narị ugbo ne’phesh, pụtara ndị mmadụ. “Mkpụrụ obi nile ndị sitere n’úkwù Jekọb wee dị iri mkpụrụ obi asaa.” (Ọpụpụ 1:5, NW) Ihe atụ nke ebe e ji psy.khe’ mee ihe n’ụzọ dị otú a bụ 1 Pita 3:20 (NW). Ọ na-ekwu banyere ụgbọ Noa, “nke e ji bufee mmadụ ole na ole, ya bụ, mkpụrụ obi asatọ, gabiga mmiri ahụ.”

13. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Bible si eji okwu ahụ bụ “mkpụrụ obi” eme ihe?

13 Bible na-eji okwu ahụ bụ “mkpụrụ obi” eme ihe n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ. Jenesis 9:5 na-asị: “Ọbara unu nke mkpụrụ obi unu ka m ga-ajụta.” (NW) N’ebe a e kwuru na mkpụrụ obi nwere ọbara. Ọpụpụ 12:16 na-asị: “Nanị ihe dị mkpụrụ obi ọ bụla mkpa iri, nanị nke ahụ ka a pụrụ imere unu.” (NW) N’ọnọdụ nke a a sịrị na mkpụrụ obi na-eri nri. Deuterọnọmi 24:7 na-ekwu banyere onye “na-atọrọ mkpụrụ obi nke ụmụnna ya.” (NW) O doro anya na ọ bụghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ ka a tọọrọ. Abụ Ọma 119:28 na-asị: “Mkpụrụ obi m ehibeghị ụra n’ihi iru újú.” (NW) Ya mere mkpụrụ obi pụrụ ọbụna ichu ụra. Bible gosikwara na mkpụrụ obi na-ere ure. Ọ na-anwụ anwụ. “A ghaghị ibipụ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.” (Levitikọs 11:20, NW) “Ọ gaghị abịaru mkpụrụ obi ọ bụla nwụrụ anwụ nso.” (Ọnụ Ọgụgụ 6:6, NW) “Ọ bụ mkpụrụ obi anyị ga-anwụ.” (Joshua 2:14, NW) “A ga-ebibi kpam kpam mkpụrụ obi ọ bụla nke na-aṅaghị Onye amụma ahụ ntị.” (Ọrụ 3:23, NW) “Mkpụrụ obi nile ọ bụla nke dị ndụ wee nwụọ.”—Mkpughe 16:3.

14. Gịnị ka Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na mkpụrụ obi bụ?

14 N’ụzọ doro anya, otú Bible si eji ne’phesh na psy.khe’ eme ihe na-egosi na mkpụrụ obi bụ onye ahụ ma ọ bụ, n’ọnọdụ nke ụmụ anụmanụ, ihe ahụ e kere eke. Ọ bụghị akụkụ ọ bụla nke na-adịghị anwụ anwụ nke mmadụ. N’ezie, e jiri ne’phesh mee ihe ọbụna banyere Chineke n’onwe ya: “Onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi ya na-akpọ asị.”—Abụ Ọma 11:5.

Ọtụtụ Ndị Mmụta Na-ekwenye

15. Olee otú akwụkwọ ndị mmụta dị iche iche si akọwa onwe ha banyere ozizi nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ?

15 Ọtụtụ ndị mmụta na-ekwenye na Bible adịghị ekwu banyere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwu. Akwụkwọ bụ The Concise Jewish Encyclopedia na-ekwu, sị: “Bible adịghị ekwu banyere ozizi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, nke a apụtaghịkwa ìhè n’akwụkwọ ọgụgụ ndị rabaị nke oge gboo.” The Jewish Encyclopedia na-ekwu sị: “Nkwenkwe nke na mkpụrụ obi na-adịgide adịgide mgbe ahụ nwụsịrị bụ ihe metụtara ịhụ amamihe nke ụwa n’anya ma ọ bụ nchepụta ọkà mmụta okpukpe kama ịbụ okwukwe nkịtị, n’ihi ya ọ dịghịkwa ebe e ziri ya nke ọma n’Akwụkwọ Nsọ.” The Interpreter’s Dictionary of the Bible na-ekwu, sị: “Nephesh . . . adịghị anọpụ iche n’ebe ahụ dị ma nọgide na-adị ndụ, kama ọ na-eso ya anwụ. . . . Ọ dịghị amaokwu Bible na-akwado okwu ahụ bụ na a na-ekewapụ ‘mkpụrụ obi’ pụọ n’ahụ n’oge mmadụ nwụrụ.”

16. Olee otú ụfọdụ ndị ọkà si akọwa ihe ha kwere banyere mkpụrụ obi?

16 Ọzọ, Expository Dictionary of Bible Words na-asị: “Ya mere, ‘mkpụrụ obi’ n’A[gba] O[chie], adịghị egosipụta akụkụ mmadụ nke a na-apụghị ibitụ aka nke na-adịgide mgbe mmadụ nwụsịrị. [Ne’phesh] pụtara n’ụzọ bụ ịsị ndụ dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu si ebi ya n’ụzọ pụrụ iche. . . . Ihe [psy.khe’] pụtara n’ụzọ bụ isi bụ nke ihe ya na ya bụ otu ihe n’A[gba] O[chie] na-eguzobe, kama ịbụ ihe ọ pụtara n’omenala ndị Grik.” Akwụkwọ bụ The Eerdmans Bible Dictionary na-ekwukwa na n’ime Bible, okwu ahụ bụ mkpụrụ obi “adịghị akọwa otu akụkụ nke mmadụ, kama mmadụ ahụ n’ozuzu ya. . . . N’echiche nke a, ndị mmadụ enweghị mkpụrụ obi—ha bụ mkpụrụ obi.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

17. Gịnị ka akwụkwọ abụọ nke ndị Katọlik kwetara banyere “mkpụrụ obi”?

17 Ọbụna akwụkwọ bụ New Catholic Encyclopedia kwetara, sị: “Okwu Bible ndị e ji mee ihe maka mkpụrụ obi na-apụtakarị mmadụ n’ozuzu ya.” O kwukwara, sị: “E nweghị ọdịiche [nkewa] ọ bụla n’etiti ahụ na mkpụrụ obi n’A[gba] O[chie]. . . . Okwu bụ [ne’phesh], ọ bụ ezie na a na-eji okwu anyị bụ mkpụrụ obi asụgharị ya, adịghị mgbe ọ pụtara mkpụrụ obi dị ka nke dịwagara iche pụọ n’ahụ ma ọ bụ onye ahụ n’onwe ya. . . . Okwu bụ [psy.khe’] bụ okwu A[gba] Ọ[hụrụ] ya na [ne’phesh] kwekọrọ. . . . Echiche nke mkpụrụ obi ịlanarị mgbe mmadụ nwụsịrị abụghị nke a pụrụ ịhụta ngwa ngwa n’ime Bible.” Georges Auzou, bụ́ onye Katọlik na France nke bụ Prọfesọ n’Ọkà Mmụta Akwụkwọ Nsọ, na-edekwa n’akwụkwọ ya bụ La Parole de Dieu (Okwu Chineke): “Echiche nke ‘mkpụrụ obi,’ nke pụtara kpam kpam ihe nke dị adị n’ụzọ mmụọ, nke a na-apụghị imetụ aka, dipụrụ iche site ‘n’ahụ,’ . . . adịghị ma ọlị n’ime Bible.”

18. (a) Olee otú otu ensaịklopidia si kwuo okwu banyere otú Bible si eji okwu ahụ bụ “mkpụrụ obi” eme ihe? (b) Ebee ka ndị ọkà mmụta okpukpe si nweta echiche nke na ọ dị ihe na-alanarị ọnwụ nke ahụ?

18 N’ihi ya, The Encyclopedia Americana na-ekwu, sị: “Echiche Agba Ochie banyere mmadụ bụ nke ịdị n’otu, ọ bụghị njikọ nke mkpụrụ obi na ahụ. Ọ bụ ezie na okwu Hibru bụ [ne’phesh] ka a na-asụgharị mgbe mgbe dị ka ‘mkpụrụ obi,’ ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi inye ya nkọwa Grik. . . . Ọ dịghị mgbe a ghọtara [ne’phesh] dị ka ihe ya na ahụ na-adịghị arụkọ ọrụ. N’ime Agba Ọhụrụ a na-asụgharịkarị okwu Grik bụ [psykhe’] dị ka ‘mkpụrụ obi’ ma ọzọkwa, e kwesịghị ịghọta ozugbo na ọ pụtara ihe okwu ahụ bụ nye ndị ọkà ihe ọmụma Grik. . . . Bible enyeghị nkọwa ọ bụla doro anya banyere otú mmadụ si alanarị mgbe a nwụsịrị.” O kwukwasịrị: “Ọ dịwo mkpa na ndị ọkà mmụta okpukpe ga-ele anya ná nrụrịta ụka nke ndị ọkà ihe ọmụma maka ụzọ dị mma isi kọwaa nlanarị nke onye ahụ mgbe ọ nwụsịrị.”

Ọ Bụghị Bible kama Ọ Bụ Ọkà Ihe Ọmụma Ụwa

19. Olee otú e si nwee njikọ n’etiti ọkà mmụta Grik na nkwenkwe mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ?

19 Ọ bụ eziokwu na ndị ọkà mmụta okpukpe nakweere echiche ndị ọkà ihe ọmụma nke ndị na-ekpere arụsị iji mepụta ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Akwụkwọ French bụ Dictionnaire Encyclopédique de la Bible (Ensaịklopidia Ọkọwa Okwu nke Bible) na-ekwu, sị: “Nchepụta nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi bụ ihe sitere n’echiche Grik.” The Jewish Encyclopedia na-ekwusi ike, sị: “Nkwenkwe n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi rutere ndị Juu site ná mmekọrịta ha na echiche ndị Grik na n’ụzọ bụ isi, site n’ọkà ihe ọmụma Plato, bụ́ onye bụ isi na-akwado ya,” bụ́ onye dịrị ndụ na narị afọ nke atọ tupu oge Kraịst. Plato kwetara, sị: “Mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ, ọ pụghịkwa ịla n’iyi, mkpụrụ obi anyị ga-adịkwa ndụ n’ezie n’ụwa ọzọ!”—The Dialogues of Plato.

20. Ole mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ọkà ihe ọmụma ndị na-ekpere arụsị si gbebata n’Iso Ụzọ Kraịst?

20 Olee mgbe ọkà ihe ọmụma nke a nke ikpere arụsị gbebatara n’Iso Ụzọ Kraịst? The New Encyclopaedia Britannica na-ekwu, sị: “Malite n’etiti nke narị afọ nke abụọ AD ndị Kraịst nwere ọzụzụ ụfọdụ n’ọkà ihe ọmụma Grik malitere iche na ọ dị mkpa ịkọwapụta okwukwe ha n’ụzọ ya dị iche iche, ma n’ihi iji mejuo ọchịchọ nke ihe ọmụma ha ma iji tọghata ndị na-ekpere arụsị gụrụ akwụkwọ. Ọkà ihe ọmụma nke dabaara ha nke ọma karịsịa bụ nke Plato.” Ya mere, dị ka Britannica ahụ na-ekwu, “ndị ọkà ihe ọmụma bụ ndị Kristian n’oge gboo nakweere echiche Grik nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi.” Ọbụna Pope John Paul nke Abụọ kwetara na ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi jikọrọ “nchepụta dị iche iche nke ụlọ akwụkwọ ụfọdụ nke ọkà ihe ọmụma Grik.” Ma ịnakwere echiche dị iche iche nke ọkà ihe ọmụma Grik pụtara na Krisendọm agbakụtawo eziokwu ahụ dị mfe azụ, bụ́ nke e kwupụtara na Jenesis 2:7, sị: “Mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.”

21. Ọ̀ bụ laa azụ ruo ogologo oge dị anya hà aṅaa ka nkwenkwe anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi malitere?

21 Otú ọ dị, nkuzi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi malitere eri ogologo oge tupu Plato. N’akwụkwọ bụ The Religion of Babylonia and Assyria, nke Morris Jastrow dere, anyị na-agụ, sị: “Nsogbu nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi . . . dọọrọ oké echiche nke ndị ọkà mmụta okpukpe Babilọn. . . . Ọnwụ bụ ụzọ e si agafe n’ụdị ọzọ nke ndụ.” Ọzọ, akwụkwọ bụ Egyptian Religion, nke Siegfried Morenz dere, na-asị: “Ndị Ijipt oge mbụ na-ele ndụ mgbe a nwụsịrị anya dị ka nanị ịnọgide na-adị ndụ n’elu ụwa.” The Jewish Encyclopedia hotara njikọ e nwere n’okpukpe oge ochie abụọ ndị a na Plato mgbe ọ na-ekwu na e dubara Plato n’echiche nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ “site n’ihe omimi nke Orpheus na Eleusis nke bụ ngwakọta na-eju anya nke echiche ndị Babilọn na Ijipt.”

22. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na a kụrụ mkpụrụ nke ozizi mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ n’ezie ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ?

22 Otú a, echiche nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ bụ ihe oge ochie. N’ezie, mkpọrọgwụ ya bụ laa azụ ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Mgbe a gwasịrị Adam na ọ ga-anwụ ma ọ bụrụ na o nupụrụ Chineke isi, a kọwaara nwunye Adam bụ Iv echiche dị iche. A gwara ya, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ.” N’ebe a ka a kụrụ mkpụrụ nke ozizi mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Kemgbe ahụ, omenala dị iche iche anakwerewokwa echiche ahụ nke ndị na-ekpere arụsị nke bụ na ‘ị gaghị anwụ n’ezie kama ị ga-anọgide na-adị ndụ.’ Nke a gụnyere Krisendọm, nke dubara ndị na-agbaso ya n’isi n’ezi ofufe dapụ n’ụzọ na-emegide uche na nzube nile Chineke.—Jenesis 3:1-5; Matiu 7:15-23; 13:36-43; Ọrụ 20:29, 30; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 7.

23. Ònye welitere ozizi mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

23 Ọ̀ bụ onye dubara ụmụ mmadụ n’ikwere okwu ụgha ahụ? Jisọs kọwapụtara ya mgbe ọ gwara ndị ndú okpukpe nke oge ya, sị: “Unu onwe unu sitere na nna unu, bụ́ Ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime. . . . Mgbe ọ bụla ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu ihe si n’ihe nke aka ya pụta: n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ya.” (Jọn 8:44) Ee, ọ bụ Setan welitere echiche nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ iji duru ndị mmadụ pụọ n’ezi ofufe ahụ. Ya mere a na-etinye ụzọ ndụ na olileanya maka ọdịnihu nke mmadụ n’okporo ụzọ na-ezighị ezi site n’ikwenye n’ozizi nile nke sitere n’ụgha mbụ ahụ e dekọrọ n’ime Bible, ọ bụ ezie na n’oge ahụ ihe ịrụ ụka adịghị ya na Iv ghọtara na agwọ ahụ na-ekwu nanị na ya agaghị anwụ ma ọlị n’anụ ahụ.

24. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka a pụrụ ịjụ n’ụzọ ziri ezi banyere ndụ ebighị ebi na anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?

24 Bible adịghị ezi na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Ya mere, gịnị mere o ji ekwu banyere olileanya nke ndụ ebighị ebi? Ọzọkwa, ọ̀ bụ na Bible, ná 1 Ndị Kọrint 15:53, adịghị ekwu, sị: “Ihe nke a na-anwụ anwụ aghaghị iyikwasị anwụghị anwụ”? (NW) Ọ̀ bụkwa na Jisọs agaghị n’eluigwe mgbe e sisịrị n’ọnwụ kpọlite ya, ọ̀ bụkwa na o zighị na ndị ọzọ pụkwara ịga eluigwe? A ga-atụle ajụjụ ndị a na ndị ọzọ n’isiokwu anyị na-esonụ.

Ajụjụ maka Ntụleghachi

◻ Gịnị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime okpukpe nile kwenyere banyere mkpụrụ obi?

◻ Olee otú Bible si gosi na e kenyeghị mmadụ mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ?

◻ Gịnị doro anya site n’otú Bible si eji okwu Hibru na Grik ndị ahụ maka “mkpụrụ obi” eme ihe?

◻ Gịnị ka ọtụtụ ndị mmụta na-ekwu banyere echiche Bible nke mkpụrụ obi?

◻ Ọ̀ bụ laa azụ ruo ogologo oge dị anya hà aṅaa n’akụkọ ihe mere eme ka ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi malitere?

[Foto dị na peeji nke 20]

Ha nile bụcha mkpụrụ obi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya