Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ie p. 19-20
  • Mkpụrụ Obi Dị Ka Bible Si Kwuo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpụrụ Obi Dị Ka Bible Si Kwuo
  • Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Mkpụrụ Obi” Dị Ka Ihe E Kere Eke Dị Ndụ
  • “Mkpụrụ Obi” Dị Ka Ndụ nke Ihe E Kere Eke
  • Ì Nwere Mkpụrụ Obi Na-adịghị Anwụ Anwụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Gịnị Bụ Mkpụrụ Obi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Mkpụrụ Obi Ọ̀ Na-adịgide Mgbe A Nwusịrị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
ie p. 19-20

Mkpụrụ Obi Dị Ka Bible Si Kwuo

“Mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.”—JENESIS 2:7.

1. Gịnị ka ọ dị anyị mkpa ịtụle iji chọpụta ihe Bible na-akụzi banyere mkpụrụ obi?

DỊ KA anyị hụworo, nkwenkwe banyere mkpụrụ obi dị ọtụtụ, dịkwa iche iche. Ọbụna n’etiti ndị na-azọrọ na nkwenkwe ha dabeere na Bible, e nwere echiche dị iche iche banyere ihe mkpụrụ obi bụ na ihe na-eme ya mgbe anyị nwụrụ. Ma gịnị n’ezie ka Bible na-akụzi banyere mkpụrụ obi? Iji chọpụta, ọ dị anyị mkpa ịtụle ihe okwu Hibru na Grik ndị ahụ a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi” na Bible pụtara.

“Mkpụrụ Obi” Dị Ka Ihe E Kere Eke Dị Ndụ

2, 3. (a) Olee okwu a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi” n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, gịnịkwa ka okwu a pụtara n’ụzọ bụ́ isi? (b) Olee otú Jenesis 2:7 si kwadoo na okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụrụ ịpụta mmadụ n’ozuzu ya?

2 Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi” bụ neʹphesh, ọ pụtakwara ugboro 754 n’Akwụkwọ Nsọ Hibru (nke a na-akpọkarị Agba Ochie). Gịnị ka neʹphesh pụtara? Dị ka The Dictionary of Bible and Religion si kwuo, ọ “na-ezokarị aka n’onye ahụ dị ndụ, onye ahụ n’ozuzu ya.”

3 Dị ka ihe atụ, Jenesis 2:7 na-ekwu, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” Rịba ama na Adam enweghị mkpụrụ obi; ọ bụ mkpụrụ obi—dị nnọọ ka onye ghọrọ dọkịta bụ dọkịta. Mgbe ahụ, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụrụ ịkọwa mmadụ n’ozuzu ya.

4, 5. (a) Nye ihe atụ ndị na-egosi na okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” na-ezo aka ná mmadụ n’ozuzu ya. (b) Olee otú The Dictionary of Bible and Religion si akwado nghọta ahụ bụ́ na mmadụ bụ mkpụrụ obi?

4 A kwadoro nghọta a n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dum, ebe anyị na-ahụ nkebi okwu ndị dị ka “mgbe [mkpụrụ obi, NW] ga-emehie” (Levitikọs 5:1), “[mkpụrụ obi NW] ọ bụla nke na-eje ozi ọ bụla” (Levitikọs 23:30), “mgbe a ga-ahụ onye ọ bụla ka ọ na-ezu [mkpụrụ obi, NW] n’ohi” (Deuterọnọmi 24:7), “mkpụrụ obi ya enweghị ntachi obi” (Ndị Ikpe 16:16), “ruo ole mgbe [ka] unu ga-eme ka mkpụrụ obi m ruo újú?” (Job 19:2), na “mkpụrụ obi m atụpụwo dị ka mmiri site n’iru újú.”—Abụ Ọma 119:28.

5 Ọ dịghị ihe na-egosi n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na mkpụrụ obi bụ ihe dị inyoghị inyoghị nke na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị. “Anyị iji asụsụ anyị kwuo na ‘mkpụrụ obi’ onye anyị hụrụ n’anya apụwo iso Onyenwe Anyị nọrọ ma ọ bụ ikwu banyere ‘mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ’ ga-abụ nnọọ ihe a na-apụghị ịghọta n’omenala nke AO [Agba Ochie],” ka The Dictionary of Bible and Religion na-ekwu.

6, 7. Okwu dị aṅaa ka a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi” n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, gịnịkwa ka okwu a pụtara n’ụzọ bụ isi?

6 Okwu a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi” ihe karịrị otu narị ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (nke a na-akpọkarị Agba Ọhụrụ) bụ psy·kheʹ. Dị ka neʹphesh, okwu a na-ezokarị aka na mmadụ n’ozuzu ya. Dị ka ihe atụ, tụlee okwu ndị na-esonụ: “Mkpụrụ obi m na-alọ mmiri.” (Jọn 12:27) “[Mkpụrụ obi, NW] nile wee tụọ egwu n’otu n’otu.” (Ọrụ 2:43) “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya.” (Ndị Rom 13:1) “Na-agụgụnụ [mkpụrụ obi, NW] dara mba n’obi.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) “Nke e were mmiri zọpụta mmadụ ole na ole, ya bụ [mkpụrụ obi, NW] asatọ, n’ime ya.”—1 Pita 3:20.

7 Psy·kheʹ, dị ka neʹphesh, na-ezo aka n’ụzọ doro anya na mmadụ n’ozuzu ya. Dị ka ọkà mmụta bụ́ Nigel Turner si kwuo, okwu a “na-apụta ihe e ji mara mmadụ, onwe, ahụ nke e kunyere rûaḥ [mmụọ] Chineke n’ime ya. . . . Ihe a na-emesi ike bụ onwe ahụ n’ozuzu ya.”

8. Ụmụ anụmanụ hà bụ mkpụrụ obi? Kọwaa.

8 Na Bible e ji okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” eme ihe ọ bụghị nanị n’ebe ụmụ mmadụ nọ kamakwa n’ebe ụmụ anụmanụ dị. Dị ka ihe atụ, n’ịkọwa okike nke ihe ndị e kere eke dị n’oké osimiri, Jenesis 1:20 na-ekwu na Chineke nyere iwu, sị: “Ka mmiri nupụta ihe na-enupụta enupụta, bụ́ anụ [bụ́, NW] mkpụrụ obi dị ndụ.” N’ụbọchị okike na-esonụ, Chineke kwukwara, sị: “Ka ala wepụta anụ dị iche iche [bụ́, NW] mkpụrụ obi dị ndụ, anụ ụlọ, na ihe na-akpụ akpụ, na anụ ọhịa dị iche iche nke ụwa.” (Jenesis 1:24; tụlee Ọnụ Ọgụgụ 31:28.) N’ihi ya, “mkpụrụ obi” pụrụ izo aka n’ihe e kere eke dị ndụ, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ.

“Mkpụrụ Obi” Dị Ka Ndụ nke Ihe E Kere Eke

9. (a) Nkọwa sara mbara dị aṅaa ka a pụrụ inye okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi”? (b) Nke a ọ̀ na-emegide echiche ahụ bụ́ na mkpụrụ obi bụ mmadụ ahụ n’onwe ya?

9 Mgbe ụfọdụ, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” na-ezo aka ná ndụ nke mmadụ ma ọ bụ anụmanụ na-adị. Nke a adịghị agbanwe nkọwa Bible banyere mkpụrụ obi dị ka mmadụ ma ọ bụ anụmanụ. Iji maa atụ: Anyị na-ekwu na mmadụ dị ndụ, nke pụtara na ọ bụ onye dị ndụ. Anyị pụkwara ikwu na o nwere ndụ. N’otu ụzọ ahụ, onye dị ndụ bụ mkpụrụ obi. Ma, ka ọ na-adị ndụ, a pụrụ ikwu banyere “mkpụrụ obi” dị ka ihe o nwere.

10. Nye ihe atụ ndị na-egosi na okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụrụ izo aka ná ndụ nke mmadụ ma ọ bụ anụmanụ na-adị.

10 Dị ka ihe atụ, Chineke gwara Mosis, sị: “Ndị ikom ahụ nile ndị na-achọ [mkpụrụ obi, NW] gị anwụrụwo.” (Ọpụpụ 4:19) N’ụzọ doro anya ndị iro Mosis nọ na-achọ iwere ndụ ya. A na-ahụ ebe e ji “mkpụrụ obi” mee ihe n’ụzọ yiri nke a n’okwu ndị na-esonụ. “Anyị wee tụọ egwu nke ukwuu banyere [mkpụrụ obi, NW] anyị.” (Joshua 9:24) “[Ha] gbalaga n’ihi [mkpụrụ obi, NW] ha.” (2 Ndị Eze 7:7) “Onye ezi omume maara [mkpụrụ obi, NW] anụ ụlọ ya.” (Ilu 12:10) “Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi, ka O werekwa [mkpụrụ obi, NW] Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) “Ọ bịaruru ọnwụ nso, na-ekwere ịtụfu [mkpụrụ obi, NW] ya.” (Ndị Filipaị 2:30) Ná nke ọ bụla, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụtara “ndụ.”a

11. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere otú Bible si eji okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” eme ihe?

11 Ya mere okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” dị ka e ji ya mee ihe na Bible na-ezo aka ná mmadụ ma ọ bụ anụmanụ ma ọ bụ ndụ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ na-adị. Nkọwa Bible nke mkpụrụ obi dị mfe, na-ekwekọ ekwekọ, ọ bụghịkwa ihe e ji nkà ihe ọmụma na nkwenkwe ụgha ụmụ mmadụ na-agbagwoju anya bogbuo. Ma gịnị na-eme mkpụrụ obi n’ọnwụ? Iji zaa ajụjụ ahụ, anyị aghaghị ibu ụzọ ghọta ihe mere anyị ji na-anwụ anwụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Matiu 10:28 (NW) na-ejikwa okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” eme ihe ịpụta “ndụ.”

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ha bụcha mkpụrụ obi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya