Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/1 p. 4-6
  • Mkpụrụ Obi Ọ̀ Na-adịgide Mgbe A Nwusịrị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpụrụ Obi Ọ̀ Na-adịgide Mgbe A Nwusịrị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Bụghị Ozizi Bible
  • Gịnị Na-eme Mgbe A Nwụsịrị?
  • Site n’Ozizi Ndị Ọgọ Mmụọ gaa n’Ozizi Chọọchị
  • Olileanya maka Ndị Nwụrụ Anwụ
  • Mkpụrụ Obi Dị Ka Bible Si Kwuo
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Ì Nwere Mkpụrụ Obi Na-adịghị Anwụ Anwụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ụzọ I Si Ele Mkpụrụ Obi Anya Na-emetụta Ndụ Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Gịnị Bụ Mkpụrụ Obi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/1 p. 4-6

Mkpụrụ Obi Ọ̀ Na-adịgide Mgbe A Nwusịrị?

“MKPỤRỤ OBI: Akụkụ mmadụ nke bụ mmụọ, nke a na-eche na ọ na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị, na ọ pụkwara inweta obi ụtọ ma ọ bụ ahụhụ n’ọnọdụ ọ ga-adị n’ọdịnihu.” (The Compact Edition of the Oxford English Dictionary) lhe ka ọtụtụ n’okpukpe nile nakweere nkọwa nke a n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ozuzu ya. Akwụkwọ New Catholic Encyclopedia na-asị: “Ozizi ahụ nke bụ na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ, na ọ ga-adịgidekwa ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị . . . bụ otu n’ime nkume isi nkuku ụlọ nke ọkà nchepụta echiche na ọkà mmụta okpukpe ndị Kristian.”

N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụrụ gị ihe ijuanya ịmara na nkwenkwe nke a nke bụ nkume isi nkuku ụlọ bụ nke e wetara site n’ọkà ihe ọmụma ndị ọgọ mmụọ. Ogologo oge tupu a mụọ Jisọs, e kweere na mkpụrụ obi bụ ihe a na-adịghị ahụ anya nke pụrụ ịnọrọ onwe ya ma e kewaa ya na anụ ahụ. Otú a, ọ pụrụ ịdịgide ndụ mgbe anụ ahụ nwụrụ, nọgide na-adị ndụ n’ụdị nke mmụọ.

Ndị Grik kọwara nkwenkwe nke a n’ụzọ ọkà ihe ọmụma. Socrates, bụ́ onyeọkà ihe ọmụma Grik ahụ a ma ama, abụwo onye e hotara na o kwuru, sị: “Mkpụrụ obi, . . . ọ bụrụ na ọ dịrị ọcha wee hapụ, ghara iji ihe ọ bụla metụtara anụ ahụ mgbe ọ na-aga, . . . na-apụ banye n’ihe ahụ nke yiri ya onwe ya, banye n’ihe a na-adịghị ahụ anya, ihe nke Chineke, ihe na-adịghị anwụ anwụ, na ihe nwere amamihe, mgbe o rutekwara n’ebe ahụ, ọ na-enwe obi ụtọ, bụrụ nke a tọhapụworo pụọ ná mmehie ihe na ndahie na egwu . . . na ntụpọ ndị ọzọ nile mmadụ na-enwe, . . . na-adịkwa ndụ n’eziokwu ruo mgbe ebighị ebi mgbe ya na ndị bụ chi na-anọ.”—Phaedo, 80, D, E; 81, A.

Ọ Bụghị Ozizi Bible

Ya mere, olee otú e si malite ikuzi nkwenkwe anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi n’ime Krisendọm na n’okpukpe ndị Juu?

Akwụkwọ bụ New Catholic Encyclopedia ekwuchaghị ihe otú ọ dị n’ezie mgbe ọ sịrị: “Echiche ahụ nke bụ na mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị bụ nke a na-adịghị achọpụta hoo haa n’ime Bible.” Ọ ga-ezi ezi karị ikwu na a dịghị achọta ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi ma ọlị n’ime Bible! Akwụkwọ ọkà ihe ọmụma ahụ kwetakwara, sị: “Echiche banyere mkpụrụ obi mmadụ n’onwe ya abụghị otu ihe ahụ n’ime A[gba] O[chie] dị ka ọ dị n’ọkà ihe ọmụma ndị Grik na nke oge a.”

N’ihe ahụ a na-akpọ Agba Ochie, okwu Hibru bụ ne’phesh, nke a na-asụgharịkarị ịbụ “mkpụrụ obi,” pụtara 754 ugbo. N’ihe ahụ a na-akpọ Agba Ohụrụ, okwu Grik bụ psy-khe’, nke a na-asụgharịkarịkwa ịbụ “mkpụrụ obi,” pụtara 102 ugbo. Mgbe anyị tụlere otú e si jiri okwu ndị a mee ihe n’ime Bible, anyị na-ahụ ihe dị ịtụnanya.

Na Jenesis 2:7 anyị na-agụ na Chineke kunyere ume ndụ n’oghere imi Adam, Adam “wee ghọọ mkpụrụ obi [Hibru, ne’phesh] dị ndụ.” Rịba ama: E nyeghị Adam mkpụrụ obi dị ndụ; ọ ghọrọ ya aghọ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Adam ahụ e kere ọhụrụ bu mkpụrụ obi! Ka a sịkwa ihe mere na akwụkwọ New Catholic Encyclopedia kwubiri, sị: “Mkpụrụ obi nke dị n’A[gba] O[chie] apụtaghị akụkụ ahụ mmadụ, kama ọ bụ mmadụ ahụ dum—mmadụ dị ka ihe dị ndụ.”

Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ na-akwado nke a. Dị ka ihe atụ, Levitikọs 7:20, zoro aka ná “[mkpụrụ obi, NW] nke na-eri anụ sitere n’ihe àjà nke àjà udo.” Levitikọs 23:30 kwuru, sị: “Ma [mkpụrụ obi, NW] ọ bụla nke na-eje ozi ọ bụla.” Ilu 25:25 na-asị: “Dị ka mmiri oyi si adịrị mkpụrụ obi na-ada mbà, otú a ka okwu ọma a nụrụ site n’ala dị anya dị.” Abụ Ọma 105:18 na-agwakwa anyị, sị: “Ha weere agbụ kesie ụkwụ ya abụọ ike; mkpụrụ obi ya bara n’ígwè.”

Ugbu a, ọ̀ bụ gịnị nwere ike iri anụ, ịrụ ọrụ, bụrụ ihe mmiri nyere ume ọhụrụ, bụrụkwa nke e tinyere n’ígwè? Ọ̀ bụ akụkụ ahụ dị iche, nke bụ mmụọ nke mmadụ, ka ọ bụ mmadụ n’onwe ya? Azịza ya doro nnọọ anya.

Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na ọ bụghị nanị mmadụ bụ mkpụrụ obi. Jenesis 1:20 [NW] na-agwa anyị na n’otu ogologo oge okike ihe, Chineke sịrị: “Ka mmiri nupụta ihe na-enupụta enupụta, bụ́ mkpụrụ obi dị ndụ.” Ee, ọbụna azụ dị iche iche bụcha mkpụrụ obi! N’ogologo oge okike ihe ọzọ, Chineke gosiri na “anụ ụlọ, na ihe na-akpụ akpụ, na anụ ọhịa dị iche iche” bụcha mkpụrụ obi!—Jenesis 1:24; tụlee Levitikọs 11:10, 46; 24:18; Ọnụ Ọgụgụ 31:28; Job 41:21; Ezikiel 47:9.

Ya mere, n’ime Bible, “mkpụrụ obi” adịghị ezo aka n’ebe mmụọ dị inyoghi inyoghi dị, nke na-ahapụ anụ ahụ mgbe mmadụ nwụsịrị. Ọ pụtara mmadụ, ma ọ bụ anụmanụ, ma ọ bụ ndụ nke mmadụ ma ọ bụ anụmanụ na-adị.

Gịnị Na-eme Mgbe A Nwụsịrị?

Ya mere, o doro anya na Bible ekwekọghị n’echiche ndị ọgọ mmụọ ahụ nke bụ na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Òle ndị ka i chere na ọ bụ ha kuziri eziokwu banyere nke a? Ọ̀ bụ ndị ọkà ihe ọmụma Grik bụ ndị ọgọ mmụọ ka ọ bụ ndị ahụ ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ? N’ezie, ọ bụ ndị Chineke, bụ́ ndị o nyere Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ.

Ma ajụjụ ahụ ka dịkwa, nke bụ, Gịnị na-eme mkpụrụ obi n’ezie mgbe mmadụ nwụsịrị? Ebe ọ bụ na mkpụrụ obi bụ onye ahụ, o doro anya na mkpụrụ obi na-anwụ mgbe onye ahụ nwụrụ.

N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, onye nwụrụ anwụ bụ mkpụrụ obi nwụrụ anwụ. Ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ na-akwado nke a. Ezikiel 18:4 na-asị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” Ná Ndị Ikpe 16:30, anyị na-agụ, sị: “Samson wee sị, Ka [mkpụrụ obi, NW] m soro ndị Filistia nwụọ.” Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ gosiri na mkpụrụ obi bụ ihe a pụrụ ibipụ ebipụ (Jenesis 17:14), nke a pụrụ iji mma agha gbuo (Joshua 10:37), nke a pụrụ ịtọgbu atọgbu (Job 7:15), nke mmiri rikpuru (Jonah 2:5). Mkpụrụ obi nke hapụworonụ, ma ọ bụ mkpụrụ obi nke nwụworonụ, bụ onye nwụrụ anwụ.—Levitikọs 19:28; 21:1, 11.

Mgbe ahụ, gịnị bụ ọnọdụ nke mkpụrụ obi ndị nwụworo anwụ. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọnwụ bụ ọnọdụ megidere ndụ. E jikọtara mmetụta nile anyị na-enwe n’anụ ahụ anyị. Ikike anyị nwere ịhụ ụzọ, ịnụ ihe, na iche echiche dabeere ná nrụzi ọrụ nke anya, ntị, na ụbụrụ isi anyị. E wezụga anya, anyị apụghị ịhụ ụzọ. E wezụga ntị anyị apụghị ịnụ ihe. E wezụga ụbụrụ, anyị apụghị ime ihe ọ bụla. Mgbe mmadụ nwụrụ, akụkụ ahụ ndị a nile na-akwụsị ịrụ ọrụ. Anyị na-akwụsị ịdị adị.

N’ikwekọ na nke a, Eklisiastis 9:5, 10 na-asị: “Ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla,... ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị na [Sheol, NW] [ili], ebe gị onwe gị na-ala.” N’otu aka ahụkwa, Abụ Ọma 146:3, 4 na-asị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. Mmụọ [ike ndụ] ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” Ya mere mgbe ndị mmadụ (mkpụrụ obi) nwụrụ, ha na-akwụsị ịdị adị kpam kpam.

Site n’Ozizi Ndị Ọgọ Mmụọ gaa n’Ozizi Chọọchị

Ụfọdụ ndị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ma ọ̀ bụ na Agba Ọhụrụ akuzighị anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?’ Ọ dịghị ma ọlị. Akwụkwọ New Catholic Encyclopedia kwetara, sị: “A[gba] Ọ[hụrụ] nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi nye nghọta nke a nke dị n’A[gba] O[chie] banyere ọnwụ.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, “Agba Ohụrụ” na-akuzi na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. Jisọs gosipụtara na ya ekweghị na mkpụrụ obi bụ ihe na-adịghị anwụ anwụ. Ọ jụrụ, sị: “Ò ziri ezi ezi n’iwu ime ezi ihe, ma ọ bụ ime ihe ọjọọ, n’ụbọchị izu ike? Ịzọpụta [mkpuru obi, NW] ma ọ bụ igbu egbu?” (Mark 3:4) N’otu aka ahụkwa, onye Kraịst ahụ bụ Pọl onyeozi kwadokwara echiche “Agba Ochie” ahụ site n’ihota okwu dị na Jenesis 2:7, sị: “Otu a ka e dewokwara ya n’akwụkwọ, sị, Mmadụ mbụ, bụ́ Adam, ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.”—1 Ndị Kọrint 15:45.

Ya mere, olee otú echiche nke Plato si ghọọ ozizi chọọchị? Akwụkwọ Encyclopaedia of Religion and Ethics, nke James Hastings dere, na-akọwa, sị: “Mgbe oziọma ndị Kraịst sitere n’ọnụ ụzọ amá nke ụlọ nzukọ okpukpe ndị Juu banye n’ọgbọ Alaeze Rom, e buuru echiche ahụ banyere mkpụrụ obi nke bụ nke ndị Hibru n’ụzọ bụ isi banye n’ọnọdụ nke echiche ndị Grik, na-arụpụtakwa ihe dị ukwuu n’usoro nke nnabata ihe.” Ndị nkuzi chọọchị gbalịrị ime ka ozi ha bụrụ “ihe ezi uche dị na ya nye ụwa nke na-eche echiche dị ka ndị Grik” site n’iji “ụdị okwu na echiche ndị e guzobeworo n’usoro akparamagwa ndị Grik” na-eme ihe. Ndị ọkà mmụta okpukpe ndị Juu malitekwara igosipụta “mmetụta siri ike nke ozizi Plato” n’ihe odide ha dị iche iche.—Encyclopædia Judaica.

E si otú a wezụga ozizi Bible banyere mkpụrụ obi, ma were ozizi nke o doro anya na ọ bụ nke ndị ọgọ mmụọ dochie anya ya. A pụghị ịkwado nke a ma ọlị site n’echiche ahụ nke bụ na ime otú ahụ mere ka Iso Ụzọ Kraịst bụrụ ihe ọha mmadụ nakweere nke ọma karị. Mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma n’Atens, bụ́ isi obodo nke omenala ndị Grik, Pọl onyeozi akuzighị ozizi Plato banyere mkpụrụ obi. Kama nke ahụ, ọ kuziri ozizi ndị Kraịst nke mbilite n’ọnwụ, ọ bụ ezie na o siiri ọtụtụ ndị Grik na-ege ya ntị ike ịnakwere ihe o kwuru.—Ọrụ 17:22-32.

N’eziokwu, Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị megide ngwakọta ọ bụla nke eziokwu dabeere na Bible na ikpere arụsị mgbe ọ sịrị: “Olee nnwekọ ìhè na ọchịchịrị na-enwekọ? Ọzọ, olee nnwekọ otu olu Kraịst na Belial na-enwekọ?” (2 Ndị Kọrint 6:14, 15) A pụghị inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na site n’ikwere ka otu ozizi ndị ọgọ mmụọ ghọọ otu n’ime isi ntọala nke echiche na ọkà mmụta okpukpe ya, Krisendọm emewo Chineke n’onwe ya ihe ihere!

Olileanya maka Ndị Nwụrụ Anwụ

Ndị mmadụ nweere onwe ha ikwere ihe ha chọrọ ikwere. Otú o sina dị, a pụghị ịgọpụ agọpụ na ozizi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi adabereghị n’akwụkwọ nsọ. Ya mere, ọ̀ pụtara na ụmụ mmadụ enweghị olileanya ọ bụla nke ịdị ndụ mgbe a nwụsịrị?

Mgbe Job jụsịrị ajụjụ ahụ bụ, “[Mmadụ] ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” ọ gara n’ihu inye azịza ya nke sitere n’ike mmụọ nsọ. Ọ sịrị: “Ị [Jehova] ga-akpọ okù, mụ onwe m ga-azakwa gị: agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.” (Job 14:14, 15) Ee, Bible na-enye olileanya mbilite n’ọnwụ nye ndị nile nọ ná ncheta nke Chineke. Ọ na-agụsi ya agụụ ike ịkpọghachite ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Job, bịa ná ndụ! Kraịst Jisọs kwadoro na olileanya nke a ziri ezi, na-asị: “Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu ya, ha ga-apụtakwa; ndị mere ezi ihe ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ; ma ndị mere ihe na-adịghị mma ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”—Jọn 5:28, 29.

Mgbe oge ruru maka mmezu amụma ahụ, Aịsaịa 25:8 na-ekwe nkwa na Chineke ‘ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.’ Nke a pụtara ụwa ebe “ọnwụ [na-agaghị] adịkwa ọzọ,” dị ka Mkpughe 21:4 si kwuo ya. Ọ̀ ga-amasị gị ibi n’ime ụwa nke a na-enweghị ememe ili ozu ma ọ bụ ụlọ ọrụ ndị na-elekọta olili ozu, ebe a na-enweghị nkume ndị na-adị n’isi ili ma ọ bụ ogige ili ozu dị iche iche, ebe a na-agaghị enwe anya mmiri nke iru újú kama nanị anya mmiri nke ọṅụ?

N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na a zụlitewo gị ikwere n’ozizi nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Ma, site n’ịmụ Bible, ị pụrụ iwulite okwukwe ná nkwa Bible ndị na-eme ka mmadụ pụọ n’ohu.a Ị pụkwara ịmụta ihe ị na-aghaghị ime ka ị wee keta nkwa nile nke Bible, nke ịlanarị, ọ bụghị dị ka mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ, kama nke ịnata “ndụ ebighị ebi” n’ime Paradaịs n’elu ala!—Jọn 17:3; Luk 23:43.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ime nke a, biko degara ndị bipụtara magazin nke a akwụkwọ ma Ọ bụ jee n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya