Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 7/15 p. 3-5
  • Ì Nwere Mkpụrụ Obi Na-adịghị Anwụ Anwụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Nwere Mkpụrụ Obi Na-adịghị Anwụ Anwụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Mmadụ ahụ Wee Ghọọ Mkpụrụ Obi Dị Ndụ”
  • ‘Mkpụrụ Obi nke Na-emehie Ga-anwụ’
  • Ihe Mmadụ Bụ
  • Mkpụrụ Obi Dị Ka Bible Si Kwuo
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Mkpụrụ Obi Ọ̀ Na-adịgide Mgbe A Nwusịrị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Mkpụrụ Obi
    Teta!—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 7/15 p. 3-5

Ì Nwere Mkpụrụ Obi Na-adịghị Anwụ Anwụ?

Ànyị bụ nanị anụ ahụ́ na ọbara? Ka ọ̀ dị ihe ọzọ dị anyị n’ime ma e wezụga ihe ndị e ji kee anyị? Ànyị bụ ndị ọbịa n’ụwa? Ka ọ̀ dị ihe a na-adịghị ahụ anya dị n’ime anyị nke na-adịgide ndụ mgbe anyị nwụsịrị?

Ọ BỤ ezie na okpukpe ndị dị n’ụwa na-ezi ọtụtụ ozizi dịgasị iche dị mgbagwoju anya banyere ndụ a na-adị mgbe a nwụsịrị, ihe ka ọtụtụ n’ime ha kweere n’otu ozizi, nke bụ́: Ọ dị ihe dị n’ime mmadụ nke na-adịghị anwụ anwụ, ọ na-adịgidekwa ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị. Ọtụtụ ndị kweere na “ihe” ahụ bụ mkpụrụ obi. Olee ihe gịnwa kweere? Ànyị bụ ọkara anụ ahụ́ ọkara mkpụrụ obi? Gịnị ka mkpụrụ obi bụ? Ụmụ mmadụ, hà nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ? Ọ dị nnọọ mkpa anyị ịmara ihe anyị bụ n’ezie!

“Mmadụ ahụ Wee Ghọọ Mkpụrụ Obi Dị Ndụ”

“Mkpụrụ obi” ọ̀ bụ ihe dị adị n’ime mmadụ nke na-apụ n’ahụ́ mgbe mmadụ nwụrụ ma nọgide na-adị ndụ? Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Holman Illustrated Bible Dictionary kwuru na “ọtụtụ mgbe, mkpụrụ obi na-apụta mmadụ n’onwe ya.” Dị ka ihe atụ, Jenesis 2:7 kwuru, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” Mmadụ mbụ, bụ́ Adam, bụ mkpụrụ obi.

Amaokwu Bible ndị ọzọ kwadoro okwu ahụ bụ́ na “mkpụrụ obi” nwere ike ịpụta mmadụ n’onwe ya. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu na mkpụrụ obi na-arụ ọrụ. (Levitikọs 23:30) E kwuru banyere mkpụrụ obi dị ka nke na-enweghị ntachi obi, nke na-eru uju, nke na-atụpụ dị ka mmiri, nke na-atụ egwu, na nke na-ada mbà. (Ndị Ikpe 16:16; Job 19:2; Abụ Ọma 119:28; Ọrụ 2:43; 1 Ndị Tesalonaịka 5:14) N’ikwu banyere mkpụrụ obi dị ka mmadụ, Ndị Rom 13:1 kwuru, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ikike ndị ka elu.” Na 1 Pita 3:20, anyị na-agụ, sị: ‘N’ụbọchị Noa, mmadụ ole na ole, ya bụ, mkpụrụ obi asatọ, gabigara na mmiri ahụ n’enweghị mmerụ ahụ́.’ Ọ dịghị ihe dị n’amaokwu ndị a nke na-egosi na mkpụrụ obi bụ ihe a na-adịghị ahụ anya nke na-adịgide ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị.

Gịnị banyere ụmụ anụmanụ na osisi? Hà bụ mkpụrụ obi? Tụlee ihe Bible kọwara banyere otú e si kee ụmụ anụmanụ. Chineke nyere iwu, sị: “Ka mmiri nupụta ihe na-enupụta enupụta, bụ́ anụ nwere mkpụrụ obi dị ndụ.” N’ụbọchị ọzọ Chineke ji kee ihe, ọ sịrị: “Ka ala wepụta anụ dị iche iche nwere mkpụrụ obi dị ndụ, anụ ụlọ, na ihe na-akpụ akpụ, na anụ ọhịa dị iche iche nke ụwa.” (Jenesis 1:20, 24) N’ihi ya, ihe nile e kere eke dị ndụ—mmadụ ma ọ bụ anụmanụ—bụcha mkpụrụ obi. N’Akwụkwọ Nsọ, e kwughị na osisi bụ mkpụrụ obi.

E nwekwara ụzọ ọzọ e si jiri okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” mee ihe. Na Job 33:22, anyị na-agụ, sị: “Mkpụrụ obi ya wee na-abịaru n’olulu, ndụ ya na-abịarukwa nso ndị na-eme ka a nwụọ.” N’ebe a, okwu ndị bụ́ “mkpụrụ obi” na “ndụ” pụtara otu ihe, otu ana-akọwa ihe ibe ya pụtara. N’ihi ya, “mkpụrụ obi” nwere ike ịpụta ndụ mmadụ dị dị ka mkpụrụ obi, ma ọ bụ mmadụ dị ndụ. Ọ bụ ya mere Akwụkwọ Nsọ ji kpọọ ndị iro Mozis na-achọ ịnapụ ya ndụ ya “ndị ikom . . . na-achọ ndụ [ma ọ bụ “mkpụrụ obi,” NW]” ya. (Ọpụpụ 4:19) N’ihe banyere Jizọs Kraịst, Bible kwuru, sị: “Nwa nke mmadụ bịara . . . ka o nye mkpụrụ obi [ndụ] ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”—Matiu 20:28.

Ihe Bible kọwara dị ka “mkpụrụ obi” dị mfe nghọta, ọ naghịkwa emegide onwe ya. Okwu ahụ nwere ike ịpụta mmadụ ma ọ bụ anụmanụ ma ọ bụkwanụ ndụ ihe ahụ e kere eke dị dị ka mkpụrụ obi dị ndụ. Dị ka anyị ga-ahụ, nghọta a kwekọrọ n’ihe Bible na-ekwu na-eme mkpụrụ obi mgbe ọ nwụrụ.

‘Mkpụrụ Obi nke Na-emehie Ga-anwụ’

Bible kwuru, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) Mgbe Ịlaịja onye amụma nọ ná nsogbu, ọ ‘rịọrọ Chineke ndụ [ma ọ bụ “mkpụrụ obi,” NW] ya ka ọ nwụọ.’ (1 Ndị Eze 19:4) N’otu aka ahụkwa, Jems 5:20 kwuru na “onye chigharịrị onye mmehie pụọ ná njehie nke ụzọ ya ga-azọpụta mkpụrụ obi ya n’ọnwụ.” Ee, mgbe mmadụ nwụrụ, ọ bụ mkpụrụ obi nwụrụ; mkpụrụ obi abụghị ihe na-adịghị anwụ anwụ. Ebe ọ bụ na mmadụ bụ mkpụrụ obi, ikwu na mmadụ nwụrụ pụtara na mkpụrụ obi ya nwụrụ.

Gịnị banyere amaokwu Bible ndị kwuru banyere mkpụrụ obi ịpụ apụ na ịbata abata? Banyere ihe mere Rechel mgbe ọ mụrụ nwa nwoke, Bible kwuru, sị: “Mgbe mkpụrụ obi ya na-apụ (n’ihi na ọ nwụrụ), na ọ kpọrọ aha ya Ben-oni: ma nna ya kpọrọ ya Benjamin.” (Jenesis 35:18) Mgbe 1 Ndị Eze 17:22 na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ nke nwa nwoke nke otu nwanyị di ya nwụrụ, o kwuru, sị: “Jehova wee gee olu Ịlaịja [n’ekpere]; mkpụrụ obi nwata ahụ wee bịaghachi n’ime ya, o wee dị ndụ.” Amaokwu ndị a hà na-egosi na mkpụrụ obi bụ ihe a na-adịghị ahụ anya nke yiri onyinyo nke nwere ike isi n’ahụ́ mmadụ pụọ ma ọ bụ bata mmadụ n’ahụ́?

Ọ dị mma, cheta na otu ihe okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụtara bụ “ndụ.” N’ihi ya, mkpụrụ obi Rechel na-apụ n’ihi na ndụ ya na-apụ. N’ezie, Bible ụfọdụ sụgharịrị ahịrịokwu a bụ́ “mkpụrụ obi ya na-apụ” dị ka “ndụ ya na-agwụ” (Knox) na “ọ na-ekubi ume” (Jerusalem Bible). N’otu aka ahụ, n’ihe banyere nwa nwoke nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ọ bụ ndụ lọghachiri n’ime nwata nwoke ahụ.—1 Ndị Eze 17:23.

Ihe Mmadụ Bụ

Bible gosiri nnọọ ihe mmadụ bụ. Mmadụ enweghị mkpụrụ obi; ọ bụ mkpụrụ obi n’onwe ya. N’ihi ihe mmadụ bụ—ọdịdị ya—nanị ihe ga-eme ka onye nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ bụ mbilite n’ọnwụ. Bible kwere nkwa, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta, ndị mere ezi ihe gaa ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ, ndị mere ajọ omume gaa ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Jọn 5:28, 29) Ọ bụ nkwa ahụ e ji n’aka nke mbilite n’ọnwụ—ọ bụghị ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi—bụ ihe mere e ji nwee ezigbo olileanya maka ndị nwụrụ anwụ.

Ọ dị nnọọ mkpa inweta ezi ihe ọmụma nke ihe mbilite n’ọnwụ pụtara na ihe ọ pụtaara ụmụ mmadụ! Ọ dịkwa mkpa inweta ihe ọmụma Chineke na nke Jizọs Kraịst, n’ihi na Jizọs kwuru n’ekpere o kpere, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịmụ Bible ka i wee mụbaa ihe ọmụma i nwere banyere Chineke, Ọkpara ya, nakwa nkwa ndị Chineke kwere. Anyị na-agba gị ume ka ị kpọtụrụ Ndịàmà ma ọ bụ detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ ozi.

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Ha nile bụcha mkpụrụ obi

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ewu: CNPC—Centro Nacional de Pesquisa de Caprinos (Sobral, CE, Brasil)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya