Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 4/1 p. 14-19
  • Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—Gịnị Ka Bible Na-ekwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpụrụ Obi Dị Ka Bible Si Kwuo
  • Ndị Nwụrụ Anwụ Adịghị Ama Ihe Ọ Bụla
  • Gịnị Banyere Mmụọ Ahụ?
  • “Ọ Ga-esi n’Ọnwụ Bilie”
  • Atụmanya Pụrụ Iche!
  • Ndụ Anwụghị Anwụ
  • Mkpụrụ Obi Dị Ka Bible Si Kwuo
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Gịnị Na-eme Mkpụrụ Obi n’Ọnwụ?
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Ì Nwere Mkpụrụ Obi Na-adịghị Anwụ Anwụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 4/1 p. 14-19

Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—Gịnị Ka Bible Na-ekwu?

“Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.”—JENESIS 3:19.

1, 2. (a) Olee echiche dịgasị iche ndị e nwere banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị? (b) Gịnị ka ọ dị anyị mkpa ịtụle iji chọpụta ihe Bible na-akụzi banyere mkpụrụ obi?

“OZIZI nke ahụhụ ebighị ebi ekwekọghị n’ịhụnanya Chineke maka ihe ndị e kere eke. . . . Ikwere na ntaramahụhụ ebighị ebi nke mkpụrụ obi n’ihi ihie ụzọ ndị e mere n’afọ ole na ole, n’enyeghị ya ohere maka mgbazi, bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya,” ka onye ọkà ihe ọmụma Hindu bụ́ Nikhilananda kwuru.

2 Dị ka Nikhilananda, ahụ adịghị eru ọtụtụ ndị ala taa n’ebe nkụzi mmekpa ahụ ebighị ebi dị. N’otu aka ahụ, ọ na-esiri ndị ọzọ ike ịghọta ụdị echiche ndị dị ka irute Nirvana na isoro okike dị n’otu. Ọbụna n’etiti ndị na-azọrọ na nkwenkwe ha dabeere na Bible, e nwere echiche dịgasị iche banyere ihe mkpụrụ obi bụ na ihe na-eme ya mgbe anyị nwụrụ. Ma gịnị n’ezie ka Bible na-akụzi banyere mkpụrụ obi? Iji chọpụta, ọ dị anyị mkpa ịtụle ihe okwu Hibru na Grik ndị ahụ a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi” n’ime Bible pụtara.

Mkpụrụ Obi Dị Ka Bible Si Kwuo

3. (a) Olee okwu a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi” n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, gịnịkwa ka ọ pụtara n’ụzọ bụ́ isi? (b) Olee otú Jenesis 2:7 si kwado na okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụrụ ịpụta mmadụ n’ozuzu ya?

3 Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi” bụ neʹphesh, ọ pụtakwara 754 ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Gịnị ka neʹphesh pụtara? Dị ka The Dictionary of Bible and Religion si kwuo, ọ “na-ezokarị aka n’onye ahụ dị ndụ, onye ahụ n’ozuzu ya.” E gosipụtara nke a site ná nkọwa Bible banyere mkpụrụ obi na Jenesis 2:7: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” Rịba ama na mmadụ mbụ ahụ ‘ghọrọ’ mkpụrụ obi. Ya bụ́ na, Adam enweghị mkpụrụ obi; ọ bụ mkpụrụ obi—dị nnọọ ka onye ghọrọ dọkịta bụ dọkịta. Mgbe ahụ, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” n’ebe a na-akọwa mmadụ n’ozuzu ya.

4. Okwu dị aṅaa ka a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi” n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, gịnịkwa ka okwu a pụtara n’ụzọ bụ́ isi?

4 Okwu a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi” (psy·kheʹ) pụtara ihe karịrị otu narị ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Dị ka neʹphesh, okwu a na-ezokarị aka na mmadụ n’ozuzu ya. Dị ka ihe atụ, tụlee okwu ndị na-esonụ: “Mkpụrụ obi m na-alọ mmiri.” (Jọn 12:27) “[Mkpụrụ obi, NW] nile wee tụọ egwu n’otu n’otu.” (Ọrụ 2:43) “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya.” (Ndị Rom 13:1) “Na-agụgụnụ [mkpụrụ obi, NW] dara mbà n’obi.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) “Nke e weere mmiri zọpụta mmadụ ole na ole, ya bụ [mkpụrụ obi, NW] asatọ n’ime ya.” (1 Pita 3:20) N’ụzọ doro anya, psy·kheʹ, dị ka neʹphesh, na-ezo aka na mmadụ n’ozuzu ya. Dị ka ọkà mmụta bụ́ Nigel Turner si kwuo, okwu a “na-apụta ihe e ji mara mmadụ, onye ahụ, ahụ nke e kunyere rûaḥ [mmụọ] Chineke n’ime ya. . . . Ihe a na-emesi ike bụ onye ahụ n’ozuzu ya.”

5. Ụmụ anụmanụ hà bụ mkpụrụ obi? Kọwaa.

5 N’ụzọ na-akpali mmasị, na Bible e ji okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” eme ihe ọ bụghị nanị n’ebe ụmụ mmadụ nọ kamakwa n’ebe ụmụ anụmanụ dị. Dị ka ihe atụ, n’ịkọwa okike nke ihe ndị e kere eke dị n’oké osimiri, Jenesis 1:20 na-ekwu na Chineke nyere iwu, sị: “Ka mmiri nupụta ihe na-enupụta enupụta, [bụ́ mkpụrụ obi dị ndụ, NW].” N’ụbọchị okike na-esonụ, Chineke kwukwara, sị: “Ka ala wepụta anụ dị iche iche [bụ́, NW] mkpụrụ obi dị ndụ, anụ ụlọ, na ihe na-akpụ akpụ, na anụ ọhịa dị iche iche nke ụwa.”—Jenesis 1:24; tụlee Ọnụ Ọgụgụ 31:28.

6. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere otú Bible si eji okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” eme ihe?

6 Ya mere, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” dị ka e ji ya mee ihe na Bible na-ezo aka ná mmadụ ma ọ bụ anụmanụ ma ọ bụ ndụ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ na-adị. (Lee igbe dị n’elu.) Nkọwa Bible nke mkpụrụ obi dị mfe, na-ekwekọ ekwekọ, ọ bụghịkwa ihe e ji nkà ihe ọmụma na nkwenkwe ụgha ụmụ mmadụ na-agbagwoju anya bogbuo. Ebe ọ dị otú ahụ, ajụjụ dị ngwa a na-aghaghị ịjụ bụ, Dị ka Bible si kwuo, gịnị na-eme mkpụrụ obi n’ọnwụ?

Ndị Nwụrụ Anwụ Adịghị Ama Ihe Ọ Bụla

7, 8. (a) Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekpughe banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? (b) Nye ihe atụ ndị sitere na Bible bụ́ ndị na-egosi na mkpụrụ obi pụrụ ịnwụ anwụ.

7 E mere ka ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ doo anya n’Eklisiastis 9:5, 10, ebe anyị na-agụ, sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla . . . Nchụso, atụmatụ, ihe ọmụma ma ọ bụ ọgụgụ isi adịghị n’ime ili.” (Moffatt) N’ihi ya, ọnwụ bụ ọnọdụ nke adịghị adị. Ọbụ abụ ahụ dere na mgbe mmadụ nwụrụ, ‘ọ na-alaghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.’ (Abụ Ọma 146:4) Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ha adịghị emeli ihe ọ bụla.

8 Mgbe ọ na-ama Adam ikpe, Chineke kwuru, sị: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” (Jenesis 3:19) Tupu Chineke akpụọ ya site n’ájá ala ma nye ya ndụ, Adam adịghị adị. Mgbe ọ nwụrụ, ọ laghachiri n’ọnọdụ ahụ. Ntaramahụhụ e nyere ya bụ ọnwụ—ọ bụghị ịgafe n’ógbè ọzọ. Gịnịzi mere mkpụrụ obi ya? Ebe ọ bụ na n’ime Bible okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” na-ezokarị aka nanị ná mmadụ, mgbe anyị na-ekwu na Adam nwụrụ, anyị na-ekwu na mkpụrụ obi ahụ aha ya bụ Adam nwụrụ. Nke a pụrụ iyi ihe ọhụrụ nye onye kwere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Otú ọ dị, Bible na-ekwu, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) Levitikọs 21:1 na-ekwu banyere “[mkpụrụ obi, NW] nwụrụ anwụ” (“ozu,” The Jerusalem Bible). A gwakwara ndị Naziraịt ka ha ghara ịbịaru “[mkpụrụ obi, NW] nwụrụ anwụ” (“ozu,” Lamsa) nso.—Ọnụ Ọgụgụ 6:6.

9. Gịnị ka Bible bu n’uche mgbe ọ na-asị na “mkpụrụ obi [Rechel] na-apụ”?

9 Otú ọ dị, gịnị banyere okwu ahụ dị na Jenesis 35:18 banyere ọnwụ dị mwute nke Rechel, nke mere mgbe ọ na-amụ nwa nke abụọ ya? N’ebe ahụ anyị na-agụ: “Mgbe mkpụrụ obi ya na-apụ (n’ihi na ọ nwụrụ), na ọ kpọrọ aha ya Benoni: ma nna ya kpọrọ ya Benjamin.” Akụkụ akwụkwọ nsọ a ọ̀ na-apụta na Rechel nwere ihe dị ndụ nọ n’ime ya nke pụrụnụ mgbe ọ nwụrụ? Ọ dịghị ma ọlị. Cheta, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụkwara izo aka ná ndụ mmadụ nwere. Ya mere n’ọnọdụ a, “mkpụrụ obi” Rechel pụtara nanị “ndụ” ya. Ọ bụ ya mere Bible ndị ọzọ ji sụgharịa nkebi okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi ya na-apụ apụ” dị ka “ndụ ya na-agwụ” (Knox), “o kuru ume ikpeazụ ya” (JB), na “ndụ ya si n’ebe ọ nọ pụọ” (Bible in Basic English). Ọ dịghị ihe na-egosi na akụkụ dị omimi nke Rechel dịgidere ndụ mgbe ọ nwụsịrị.

10. N’ụzọ dị aṅaa ka mkpụrụ obi nke nwa nwoke nwanyị ahụ di ya nwụrụ a kpọlitere n’ọnwụ si “bịaghachi n’ime ya”?

10 O yiri mbilite n’ọnwụ nke nwa nwoke nke nwanyị di ya nwụrụ, nke e dekọrọ ná 1 Ndị Eze isi nke 17. N’amaokwu nke 22, anyị na-agụ na Elaịja kpere ekpere n’isi nwatakịrị nwoke ahụ, “Jehova wee gee ntị olu Elaịja; mkpụrụ obi nwata ahụ wee bịaghachi n’ime ya, o wee dị ndụ.” Ọzọkwa, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụtara “ndụ.” N’ihi ya, New American Standard Bible na-agụ: “Ndụ nke nwata ahụ laghachiteere ya o wee teta.” Ee, ọ bụ ndụ, ọ bụghị ụdị ihe dị inyoghi inyoghi, laghachiteere nwata ahụ. Nke a kwekọrọ n’ihe Elaịja gwara nne nwata ahụ: “Lee, nwa gị [mmadụ ahụ n’ozuzu ya] na-adị ndụ.”—1 Ndị Eze 17:23.

Gịnị Banyere Mmụọ Ahụ?

11. N’ihi gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mmụọ” ji ghara ịdị na-ezo aka n’akụkụ mmadụ e kewapụrụ iche nke na-adịgide mgbe a nwụsịrị?

11 Bible na-ekwu na mgbe mmadụ nwụrụ, “mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta.” (Abụ Ọma 146:4) Nke a ọ̀ na-apụta na mmụọ e kewapụrụ n’ahụ na-apụ n’ụzọ nkịtị wee na-adị ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị? Ọ pụghị ịbụ otú ahụ, n’ihi na ọbụ abụ ahụ kwukwasịrị: “N’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi,” (“iche echiche ya nile akwụsị,” The New English Bible). Gịnịzi bụ mmụọ ahụ, oleekwa otú o si esi n’ime mmadụ “apụ” mgbe ọ nwụrụ?

12. Gịnị ka okwu Hibru na Grik ndị a sụgharịrị ịbụ “mmụọ” n’ime Bible na-enye echiche ya?

12 Na Bible okwu ndị a sụgharịrị ịbụ “mmụọ” (Hibru, ruʹach; Grik, pneuʹma) pụtara n’ụzọ bụ́ isi “ume.” N’ihi ya, kama ịsị “mmụọ ya na-apụ apụ,” nsụgharị nke R. A. Knox na-eji nkebi okwu bụ́ “ume na-ahapụ ahụ ya” eme ihe. (Abụ Ọma 145:4) Ma okwu ahụ bụ́ “mmụọ” na-enye echiche karịrị nnọọ iku ume. Dị ka ihe atụ, n’ịkọwa mbibi e bibiri ndụ ụmụ mmadụ na anụmanụ n’oge Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ, Jenesis 7:22 na-ekwu, sị: “Ihe ọ bụla nke ume nke mmụọ [Hibru, ruʹach] nke ndụ dị n’oghere imi ya abụọ, n’ime ihe nile ọ bụla nke dị n’ala ọkpọ nkụ, ọ nwụrụ anwụ.” Ya mere, “mmụọ” pụrụ izo aka n’ike ndụ nke na-arụ ọrụ n’ihe nile e kere eke dị ndụ, ma ụmụ mmadụ ma ụmụ anụmanụ, nke a na-ejikwa iku ume na-eme ka ọ dịgide.

13. Olee otú mmụọ si alaghachikwuru Chineke mgbe mmadụ nwụrụ?

13 Gịnịzi ka ọ pụtara mgbe Eklisiastis 12:7 na-ekwu na mgbe mmadụ nwụrụ, ‘mmụọ na-alaghachikwuru Chineke Onye nyere ya’? Nke a ọ̀ pụtara na mmụọ ahụ na-eme njem n’ụzọ nkịtị gabiga mbara igwe gaa n’ihu Chineke? A dịghị enye echiche dị otú ahụ. Ebe mmụọ ahụ bụ ike ndụ, ọ ‘na-alaghachikwuru Chineke’ n’echiche nke na olileanya ọ bụla nke onye ahụ nwere ịdị ndụ n’ọdịnihu dabeere ugbu a kpam kpam n’aka Chineke. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ iweghachi mmụọ ahụ, ma ọ bụ ike ndụ, na-eme ka mmadụ dịghachi ndụ. (Abụ Ọma 104:30) Ma Chineke ọ̀ na-ezube ime otú ahụ?

“Ọ Ga-esi n’Ọnwụ Bilie”

14. Gịnị ka Jisọs kwuru, meekwa, iji wetara ụmụnne nwanyị Lazarọs nkasị obi na ahụ efe mgbe nwanne ha nwoke nwụnahụsịrị ha?

14 N’obodo nta bụ́ Betani, ihe dị ka kilomita atọ n’ebe ọwụwa anyanwụ Jerusalem, Meri na Mata na-eru újú n’ihi nnwụchu ọnwụ nke nwanne ha nwoke, bụ́ Lazarọs. Jisọs so ha ruo újú n’ihi na ọ hụrụ Lazarọs na ụmụnne ya nwanyị n’anya. Olee otú Jisọs pụrụ isi kasie ụmụnne nwanyị Lazarọs obi? Ọ bụghị site n’ịkọrọ ha akụkọ ụfọdụ gbagọrọ agbagọ, kama site n’ịgwa ha eziokwu. Nanị ihe Jisọs kwuru bụ: “Nwanne gị nwoke ga-esi n’ọnwụ bilie.” Mgbe ahụ Jisọs gara n’ili ahụ, ọ kpọlitekwara Lazarọs n’ọnwụ—na-ewetaghachiri nwoke nwụrụ anwụ kemgbe ụbọchị anọ ndụ!—Jọn 11:18-23, 38-44.

15. Gịnị bụ mmeghachi omume Mata n’ihe Jisọs kwuru, meekwa?

15 Ihe Jisọs kwuru na Lazarọs “ga-esi n’ọnwụ bilie” ò juru Mata anya? Ihe àmà na-egosi na o jughị ya anya n’ihi na ọ zaghachiri, sị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” O nweworị okwukwe ná nkwa nke mbilite n’ọnwụ. Mgbe ahụ Jisọs gwara ya, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” (Jọn 11:23-25) Ọrụ ebube nke ịkpọghachite Lazarọs ná ndụ wusiri okwukwe Mata ike, meekwa ka ndị ọzọ nwee okwukwe. (Jọn 11:45) Ma gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” pụtara kpọmkwem?

16. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” pụtara?

16 A sụgharịrị okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” site n’okwu Grik bụ́ a·naʹsta·sis, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “iguzo ọtọ ọzọ.” Ndị Hibru na-asụgharị okwu Grik asụgharịwo a·naʹsta·sis na-eji okwu pụtara “ntụte nke onye nwụrụ anwụ” (Hibru, techi·yathʹ ham·me·thimʹ) eme ihe.a Ya mere, mbilite n’ọnwụ gụnyere ịkpọlite onye ahụ site n’ọnọdụ adịghị ndụ nke ọnwụ—iweghachi na ịtụteghachi usoro ndụ nke onye ahụ.

17. (a) N’ihi gịnị ka ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ na-agaghị eji bụụrụ Jehova Chineke na Jisọs Kraịst nsogbu? (b) Nkwa dị aṅaa ka Jisọs kwere banyere ndị nọ n’ili ncheta?

17 N’ịbụ onye amamihe ya na-enweghị nsọtụ na onye ikike ncheta ya zuru okè, Jehova Chineke pụrụ ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ n’ụzọ dị mfe. Icheta ụzọ ndụ nke ndị nwụrụ anwụ—ụdị onye ha bụ, akụkọ ha, na ụmụ irighiri ihe e ji mara ha—abụghịrị ya nsogbu. (Job 12:13; tụlee Aịsaịa 40:26.) Ọzọkwa, dị ka ahụmahụ Lazarọs na-egosi, Jisọs Kraịst dị njikere ma nweekwa ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Tụlee Luk 7:11-17; 8:40-56) N’ezie, Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili [ncheta, NW] ga-anụ olu ya [Jisọs], ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) Ee, Jisọs Kraịst kwere nkwa na a ga-akpọlite ndị nile nọ ná ncheta Jehova n’ọnwụ. N’ụzọ doro anya, dị ka Bible si kwuo, mkpụrụ obi na-anwụ anwụ, ihe ngwọta nke ọnwụ bụkwa mbilite n’ọnwụ. Ma ọtụtụ ijeri mmadụ adịwo ndụ ma nwụọ. Olee ndị n’ime ha nọ ná ncheta Chineke, na-echere mbilite n’ọnwụ?

18. Olee ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ?

18 A ga-akpọlite ndị gbasoworo ụzọ ezi omume dị ka ndị ohu Jehova n’ọnwụ. Ma, ọtụtụ nde ndị ọzọ anwụwo n’egosighị ma hà ga-ekwekọ n’ụkpụrụ ezi omume nke Chineke. Ha amaghị ihe ndị Jehova chọrọ ma ọ bụ ha enweghị oge zuru ezu ime mgbanwe ndị dị mkpa. Ndị ọzọ a kwa nọ ná ncheta Chineke, n’ihi ya kwa a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, n’ihi na Bible na-ekwe nkwa, sị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”—Ọrụ 24:15.

19. (a) Ọhụụ dị aṅaa ka Jọn onyeozi natara banyere mbilite n’ọnwụ? (b) Olee ihe ndị a ‘tụbara n’ime ọdọ ọkụ ahụ,’ gịnịkwa ka okwu ahụ pụtara?

19 Jọn onyeozi hụrụ ọhụụ na-akpali akpali nke ndị a kpọlitere n’ọnwụ na-eguzo n’ihu ocheeze Chineke. N’ịkọwa ya, o dere, sị: “Oké osimiri wee nyeghachi ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ya: ọnwụ na Hedis nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha: e wee kpee ha ikpe n’otu n’otu dị ka ọrụ nile ha si dị. E wee tụba ọnwụ na Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke abụọ ahụ, bụ́ ọdọ ọkụ ahụ.” (Mkpughe 20:12-14) Cheedị echiche ihe nke ahụ pụtara! A ga-esi na Hedis ma ọ bụ Sheol, ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ, tọhapụ ndị nile nwụrụ anwụ bụ́ ndị nọ ná ncheta Chineke. (Abụ Ọma 16:10; Ọrụ 2:31) Mgbe ahụ a ga-atụba “ọnwụ na Hedis” n’ime ihe a kpọrọ “ọdọ ọkụ ahụ,” nke na-anọchi anya mbibi zuru ezu. Ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-akwụsị ịdị adị.

Atụmanya Pụrụ Iche!

20. À ga-akpọlite ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ ugbu a n’ọnwụ gaa n’ụdị gburugburu ebe obibi ndị dị aṅaa?

20 Mgbe a kpọlitere ọtụtụ nde mmadụ ná mbilite n’ọnwụ, a gaghị akpọghachi ha ná ndụ n’ụwa tọgbọ chakoo. (Aịsaịa 45:18) Ha ga-eteta n’ime gburugburu ebe obibi a chọkwuru mma, ha ga-achọpụtakwa na a kwadebeworo ha ebe obibi, ákwà, na ụba nke ihe oriri. (Abụ Ọma 67:6; 72:16; Aịsaịa 65:21, 22) Olee ndị ga-akwadebe ihe ndị a dum? N’ụzọ doro anya, a ga-enwe ndị bi n’ụwa ọhụrụ ahụ tupu mbilite n’ọnwụ elu ala amalite. Ma olee ndị ka ha bụ?

21, 22. Atụmanya pụrụ iche dị aṅaa na-echere ndị bi na “mgbe ikpeazụ”?

21 Mmezu nke amụma Bible na-egosi na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe a.b (2 Timoti 3:1) N’oge na-adịghị nnọọ anya ugbu a, Jehova Chineke gaje itinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ ma hichapụ ihe ọjọọ n’ụwa. (Abụ Ọma 37:10, 11; Ilu 2:21, 22) N’oge ahụ, gịnị ga-eme ndị na-ejere Chineke ozi n’ikwesi ntụkwasị obi?

22 Jehova agaghị ebibikọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume. (Abụ Ọma 145:20) O metụbeghị ihe dị otú ahụ, ọ gaghịkwa eme ya mgbe ọ ga-ekpochapụ ihe ọjọọ nile n’ụwa. (Tụlee Jenesis 18:22, 23, 26.) N’ezie, akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-ekwu banyere “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta,” na-esi “n’oké mkpagbu ahụ pụta.” (Mkpughe 7:9-14) Ee, oké ìgwè mmadụ ga-alanarị oké mkpagbu ahụ nke ga-eweta ụwa ọjọọ dị ugbu a ná njedebe, ha ga-abanyekwa n’ụwa ọhụrụ nke Chineke. N’ebe ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi pụrụ irite uru zuru ezu site ná ndokwa magburu onwe ya nke Chineke ime ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ha pụọ n’ohu nke mmehie na ọnwụ. (Mkpughe 22:1, 2) Otú a, “oké ìgwè mmadụ” ahụ agaghị anwụkwa anwụ ma ọlị. Lee atụmanya pụrụ iche nke a bụ!

Ndụ Anwụghị Anwụ

23, 24. Gịnị ka ị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịdị ndụ anwụghị anwụ n’ime Paradaịs n’elu ala?

23 Ànyị pụrụ inwe obi ike n’olileanya a dị ịtụnanya? Kpọmkwem! Jisọs Kraịst n’onwe ya gosiri na a ga-enwe oge mgbe ndị mmadụ ga-adị ndụ n’anwụghị anwụ ma ọlị. Ntakịrị oge tupu ọ kpọlite enyi ya bụ́ Lazarọs n’ọnwụ, Jisọs gwara Mata, sị: “Onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na Mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi.”—Jọn 11:26.

24 Ị̀ chọrọ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala? Ọ̀ na-agụ gị agụụ ịhụ ndị ị hụrụ n’anya ọzọ? “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi,” ka Jọn onyeozi na-ekwu. (1 Jọn 2:17) Ugbu a bụ oge ịmụta ihe uche Chineke bụ ma kpebie ịdị ndụ kwekọrọ na ya. Mgbe ahụ gị onwe gị, tinyere ọtụtụ nde ndị ọzọ nọworị na-eme uche Chineke, pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ezie na okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e gosipụtara olileanya nke mbilite n’ọnwụ n’ụzọ doro anya na Job 14:13, Daniel 12:13, na Hosea 13:14.

b Lee Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peji nke 98-107.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị ka okwu ndị ahụ dị n’asụsụ mbụ a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi” pụtara n’ụzọ bụ́ isi?

◻ Gịnị na-eme mkpụrụ obi n’ọnwụ?

◻ Dị ka Bible si kwuo, gịnị bụ ihe ngwọta nke ọnwụ?

◻ Atụmanya pụrụ iche dị aṅaa na-echere ndị kwesịrị ntụkwasị obi taa?

[Igbe dị na peeji nke 15]

“Mkpụrụ Obi” Dị Ka Ndụ nke Ihe E Kere Eke

Mgbe ụfọdụ, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” na-ezo aka ná ndụ nke mmadụ ma ọ bụ anụmanụ na-adị. Nke a adịghị agbanwe nkọwa Bible banyere mkpụrụ obi dị ka mmadụ ma ọ bụ anụmanụ. Iji maa atụ: Anyị na-ekwu na mmadụ dị ndụ, nke pụtara na ọ bụ onye dị ndụ. Anyị pụkwara ikwu na o nwere ndụ. N’otu aka ahụ, onye dị ndụ bụ mkpụrụ obi. Ma, ka ọ na-adị ndụ, a pụrụ ikwu banyere “mkpụrụ obi” dị ka ihe o nwere.

Dị ka ihe atụ, Chineke gwara Mosis, sị: “Ndị ikom ahụ nile ndị na-achọ [mkpụrụ obi, NW] gị anwụrụwo.” N’ụzọ doro anya, ndị iro Mosis nọ na-achọ iwere ndụ ya. (Ọpụpụ 4:19; tụlee Joshua 9:24; Ilu 12:10.) Jisọs ji okwu ahụ mee ihe n’ụzọ yiri nke ahụ mgbe o kwuru, sị: ‘Nwa nke mmadụ bịara ka O were [mkpụrụ obi, NW] Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28; tụlee 10:28.) Ná nke ọ bụla, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụtara “ndụ nke ihe e kere eke.”

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ha bụcha mkpụrụ obi

[Ebe E Si Nweta Foto]

Hummingbird: U.S. Fish and Wildlife Service, Washington, D.C./Dean Biggins

[Foto dị na peeji nke 17]

Jisọs gosipụtara na ihe ngwọta nke ọnwụ bụ mbilite n’ọnwụ

[Foto dị na peeji nke 18]

“Onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na Mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi.”—Jọn 11:26

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya