Gịnị Na-eme Mkpụrụ Obi n’Ọnwụ?
“Ozizi na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ nakwa na ọ ga-anọgide na-adị adị mgbe mmadụ nwụsịrị na mgbe ahụ ya rekasịchara bụ otu n’ime isi ihe ndị dị mkpa nke nkà ihe ọmụma na nkà mmụta okpukpe ndị Kraịst.”—“NEW CATHOLIC ENCYCLOPEDIA.”
1. Gịnị ka New Catholic Encyclopedia na-ekweta banyere mkpụrụ obi ịdịgide mgbe a nwụsịrị?
OTÚ ọ dị, otu akwụkwọ ntụaka a na-ekweta na “echiche nke mkpụrụ obi ịdịgide ndụ mgbe a nwụsịrị bụ nke a na-adịghị achọta ozugbo na Bible.” Mgbe ahụ, gịnị ka Bible na-akụzi n’ezie banyere ihe na-eme mkpụrụ obi n’ọnwụ?
Ndị Nwụrụ Anwụ Adịghị Ama Ihe Ọ Bụla
2, 3. Gịnị bụ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dịkwa aṅaa na-ekpughe nke a?
2 E mere ka ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ doo anya n’Eklisiastis 9:5, 10, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla . . . Nchụso, atụmatụ, ihe ọmụma ma ọ bụ ọgụgụ isi adịghị n’ime ili.” (Moffatt) N’ihi ya, ọnwụ bụ ọnọdụ nke adịghị adị. Ọbụ abụ ahụ dere na mgbe mmadụ nwụrụ, ‘ọ na-alaghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alaa n’iyi.’—Abụ Ọma 146:4.
3 Ya mere ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ha adịghị emeli ihe ọ bụla. Mgbe ọ na-ama Adam ikpe, Chineke kwuru, sị: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta.” (Jenesis 3:19) Tupu Chineke akpụọ ya site n’ájá ala ma nye ya ndụ, Adam adịghị adị. Mgbe ọ nwụrụ, Adam laghachiri n’ọnọdụ ahụ. Ntaramahụhụ e nyere ya bụ ọnwụ—ọ bụghị ịgafe n’ógbè ọzọ.
Mkpụrụ Obi Pụrụ Ịnwụ Anwụ
4, 5. Nye ihe atụ ndị sitere na Bible bụ́ ndị na-egosi na mkpụrụ obi pụrụ ịnwụ anwụ.
4 Mgbe Adam nwụrụ, gịnị mere mkpụrụ obi ya? Cheta na n’ime Bible okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” na-ezokarị aka nanị ná mmadụ. Ya mere mgbe anyị na-ekwu na Adam nwụrụ, anyị na-ekwu na mkpụrụ obi ahụ aha ya bụ Adam nwụrụ. Nke a pụrụ iyi ihe ọhụrụ nye onye kwere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Otú ọ dị, Bible na-ekwu, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) Levitikọs 21:1 na-ekwu banyere “[mkpụrụ obi, NW] nwụrụ anwụ” (“ozu,” Jerusalem Bible). A gwakwara ndị Naziraịt ka ha ghara ịbịaru “[mkpụrụ obi, NW] nwụrụ anwụ” (“ozu,” Lamsa) nso.—Ọnụ Ọgụgụ 6:6.
5 A na-ahụ izo aka yiri nke ahụ ná mkpụrụ obi ná 1 Ndị Eze 19:4. Elaịja bụ́ onye tara nnukwu ahụhụ ‘rịọrọ Chineke [mkpụrụ obi, NW] ya ka ọ nwụọ.’ N’otu aka ahụ, Jona ‘rịọrọ Chineke [mkpụrụ obi, NW] ya ka ọ nwụọ, sị, Ọ ka m mma ịnwụ ọnwụ karịa ịdị ndụ.’ (Jona 4:8) Jisọs jikwa nkebi okwu ahụ bụ́ “igbu mkpụrụ obi,” (NW), mee ihe, nke The Bible in Basic English sụgharịrị ịbụ “igbu egbu.” (Mak 3:4) Ya mere ọnwụ nke mkpụrụ obi pụtara nanị ọnwụ nke mmadụ ahụ.
‘Ịpụ’ na ‘Ịbịaghachi’
6. Gịnị ka Bible bu n’uche mgbe ọ na-asị na mkpụrụ obi Rechel “na-apụ”?
6 Ma gịnị banyere ọnwụ dị mwute nke Rechel, nke mere mgbe ọ na-amụ nwa nke abụọ ya? Na Jenesis 35:18, anyị na-agụ: “Mgbe mkpụrụ obi ya na-apụ (n’ihi na ọ nwụrụ), na ọ kpọrọ aha ya Benoni: ma nna ya kpọrọ ya Benjamin.” Akụkụ akwụkwọ nsọ a ọ̀ na-apụta na Rechel nwere ihe dị ndụ nọ n’ime ya nke pụrụnụ mgbe ọ nwụrụ? Ọ dịghị ma ọlị. Cheta, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụkwara izo aka ná ndụ mmadụ nwere. Ya mere n’ọnọdụ a “mkpụrụ obi” Rechel pụtara nanị “ndụ” ya. Ọ bụ ya mere Bible ndị ọzọ ji sụgharịa nkebi okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi ya na-apụ” dị ka “ndụ ya na-agwụ” (Knox), “o kuru ume ikpeazụ ya” (Jerusalem Bible), na “ndụ ya si n’ebe ọ nọ pụọ” (Bible in Basic English). Ọ dịghị ihe na-egosi na akụkụ dị omimi nke Rechel dịgidere ndụ mgbe ọ nwụsịrị.
7. N’ụzọ dị aṅaa ka mkpụrụ obi nwa nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ a kpọlitere n’ọnwụ si “bịaghachi n’ime ya”?
7 O yiri mbilite n’ọnwụ nke nwa nwoke nke nwanyị di ya nwụrụ, nke e dekọrọ ná 1 Ndị Eze isi 17. N’amaokwu nke 22, anyị na-agụ na Elaịja kpere ekpere n’isi nwatakịrị nwoke ahụ, “Jehova wee gee ntị olu Elaịja; mkpụrụ obi nwata ahụ wee bịaghachi n’ime ya, o wee dị ndụ.” Ọzọkwa, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụtara “ndụ.” N’ihi ya, New American Standard Bible na-agụ: “Ndụ nke nwata ahụ laghachiteere ya o wee teta.” Ee, ọ bụ ndụ, ọ bụghị ụdị ihe dị inyoghi inyoghi, laghachiteere nwata ahụ. Nke a kwekọrọ n’ihe Elaịja gwara nne nwata ahụ: “Lee, nwa gị [mmadụ ahụ n’ozuzu ya] na-adị ndụ.”—1 Ndị Eze 17:23.
Nsogbu nke “Ọnọdụ Dị n’Agbata”
8. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst kwere na ọ ga-eme n’oge mbilite n’ọnwụ?
8 Ọtụtụ ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst na-ekwere na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ n’ọdịnihu mgbe ahụ na mkpụrụ obi ndị na-adịghị anwụ anwụ ga-ejikọta ọnụ. Mgbe ahụ, a ga-enye ndị a kpọlitere n’ọnwụ akara aka ha—ma ọ bụghị ụgwọ ọrụ maka ndị biri ndụ dị mma ọ bụrụ ntaramahụhụ maka ndị ajọ omume.
9. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ọnọdụ dị n’agbata” pụtara, gịnịkwa ka ụfọdụ na-ekwu na-eme mkpụrụ obi n’oge a?
9 Nchepụta a yiri ihe dị mfe. Ma ndị na-araparasi ike ná nkwenkwe anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na-enwe nsogbu ịkọwa ihe na-eme mkpụrụ obi n’agbata oge ọnwụ na oge mbilite n’ọnwụ. N’ezie, ‘ọnọdụ a dị n’agbata,’ dị ka a na-akpọkarị ya, akpalitewo ịkọ nkọ ruo ọtụtụ narị afọ. Ụfọdụ na-ekwu na n’oge a mkpụrụ obi na-aga na pọgatrị, bụ́ ebe a pụrụ ịsachapụ ya mmehie ndị a pụrụ ịgbaghara agbaghara ka o wee kwesị ekwesị maka ibi n’eluigwe.a
10. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị ikwere na mkpụrụ obi na-anọtụ na pọgatrị mgbe a nwụsịrị, oleekwa otú ahụmahụ Lazarọs si gosipụta nke a?
10 Otú ọ dị, dị ka anyị hụworo, mkpụrụ obi bụ nanị mmadụ ahụ. Mgbe onye ahụ nwụrụ mkpụrụ obi ya na-anwụ. N’ihi ya, a dịghị ama ihe ọ bụla mgbe a nwụsịrị. N’ezie, mgbe Lazarọs nwụrụ, Jisọs Kraịst ekwughị na ọ nọ na pọgatrị, Limbo, ma ọ bụ ‘n’ọnọdụ ọzọ dị n’agbata.’ Kama nke ahụ, nanị ihe Jisọs kwuru bụ: “Ụra atụrụwo Lazarọs.” (Jọn 11:11, New English Bible) N’ụzọ doro anya, Jisọs, bụ́ onye maara eziokwu banyere ihe na-eme mkpụrụ obi n’ọnwụ, kweere na Lazarọs amaghị ihe ọ bụla, ọ dịghị adị.
Gịnị Bụ Mmụọ Ahụ?
11. N’ihi gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mmụọ” ji ghara ịdị na-ezo aka n’akụkụ mmadụ e kewapụrụ iche nke na-adịgide mgbe a nwụrụ?
11 Bible na-ekwu na mgbe mmadụ nwụrụ, “mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta.” (Abụ Ọma 146:4) Nke a ọ̀ na-apụta na mmụọ e kewapụrụ n’ahụ na-apụ n’ụzọ nkịtị wee na-adị ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị? Ọ pụghị ịbụ otú ahụ, n’ihi na ọbụ abụ ahụ kwukwasịrị: “N’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi,” (“iche echiche ya nile akwụsị,” NEB). Gịnịzi bụ mmụọ ahụ, oleekwa otú o si esi n’ime mmadụ ‘apụ’ mgbe ọ nwụrụ?
12. Gịnị ka okwu Hibru na Grik ndị a sụgharịrị ịbụ “mmụọ” na Bible na-enye echiche ya?
12 Na Bible okwu ndị a sụgharịrị ịbụ “mmụọ” (Hibru, ruʹach; Grik, pneuʹma) pụtara n’ụzọ bụ́ isi “ume.” N’ihi ya, kama “mmụọ ya na-apụ apụ,” nsụgharị nke R. A. Knox na-eji nkebi okwu bụ́ “ume na-ahapụ ahụ ya” eme ihe. (Abụ Ọma 145:4, Knox) Ma okwu ahụ bụ́ “mmụọ” na-enye echiche karịrị nnọọ iku ume. Dị ka ihe atụ, n’ịkọwa mbibi ndụ ụmụ mmadụ na anụmanụ n’oge Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ, Jenesis 7:22 na-ekwu, sị: “Ihe ọ bụla nke ume nke mmụọ [ma ọ bụ, mmụọ; Hibru, ruʹach] nke ndụ dị n’oghere imi ya abụọ, n’ime ihe nile ọ bụla nke dị n’ala ọkpọ nkụ, ọ nwụrụ anwụ.” Ya mere “mmụọ” pụrụ izo aka n’ike ndụ nke na-arụ ọrụ n’ihe nile e kere eke dị ndụ, ma ụmụ mmadụ ma ụmụ anụmanụ, nke a na-ejikwa iku ume na-eme ka ọ dịgide.
13. N’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ isi jiri ụzarị ike eletrik tụnyere mmụọ?
13 Iji maa atụ: Ụzarị ike eletrik na-enye otu ngwá ọrụ ike. Ọ bụrụ na ụzarị ike ahụ akwụsị, ngwá ọrụ ahụ akwụsị ịrụ ọrụ. Ụzarị ike ahụ adịghị abịa adịịrị onwe ya. N’otu aka ahụ, mgbe mmadụ nwụrụ, mmụọ ya na-akwụsị ime ka mkpụrụ ndụ ahụ ya na-adị ndụ. Ọ dịghị ahapụ ahụ ya wee gaa n’ógbè ọzọ.—Abụ Ọma 104:29.
14, 15. Olee otú mmụọ si alaghachikwuru Chineke n’ọnwụ?
14 N’ihi gịnịzi ka Eklisiastis 12:7 ji na-ekwu na mgbe mmadụ nwụrụ, ‘mmụọ na-alaghachikwuru Chineke Onye nyere ya’? Nke a ọ̀ pụtara na mmụọ ahụ na-eme njem n’ụzọ nkịtị gabiga mbara igwe gaa n’ihu Chineke? A dịghị enye echiche ihe ọ bụla dị otú ahụ. Cheta, mmụọ ahụ bụ ike ndụ. Ozugbo ike ndụ ahụ pụrụ, ọ bụ nanị Chineke nwere ikike iweghachi ya. Ya mere mmụọ ahụ ‘na-alaghachikwuru Chineke’ n’echiche nke na olileanya ọ bụla nke onye ahụ ịdị ndụ n’ọdịnihu dabeere ugbu a kpam kpam n’ebe Chineke nọ.
15 Ọ bụ nanị Chineke pụrụ iweghachi mmụọ ahụ, ma ọ bụ ike ndụ, na-eme ka mmadụ dịghachi ndụ. (Abụ Ọma 104:30) Ma Chineke ọ̀ na-ezube ime otú ahụ?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka New Catholic Encyclopedia si kwuo, “ndị Nna [Chọọchị] n’ozuzu ha pụtara ìhè ná nkwado ha na-akwado ịdị adị nke pọgatrị.” Otú ọ dị, akwụkwọ ntụaka a na-ekwetakwa na “ozizi Katọlik banyere pọgatrị dabeere n’ọdịnala, ọ bụghị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Igbe dị na peeji nke 23]
Ncheta nke Ụwa Mbụ
Ọ BỤRỤ na ọ dịghị ihe na-adịgide ndụ mgbe ahụ nwụsịrị, mgbe ahụ gịnị banyere ncheta nke ụwa mbụ nke ụfọdụ na-azọrọ na ha na-enwe?
Ọkà mmụta Hindu bụ́ Nikhilananda na-ekwu na ‘a pụghị iji ikike ịche echiche anwapụta ahụmahụ ndị e nwere mgbe a nwụsịrị.’ N’okwu bụ́ “Ihe Nlereanya Dị Iche Iche nke Nkwere n’Ebighị Ebi n’Ime Okpukpe,” ọkà mmụta okpukpe bụ́ Hans Küng na-akọwapụta, sị: “Ọ dịghị otu n’ime akụkọ ndị ahụ—nke na-esitekarị n’ọnụ ụmụaka ma ọ bụ ná mba ndị kwere n’ịlọ ụwa—banyere ncheta ụwa mbụ nke a pụrụ ikwu na ọ bụ eziokwu.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná [ndị nchọpụta na-arụsị ọrụ ike ma na-eji sayensị eme ihe ná nchọpụta a] na-ekweta na ahụmahụ ndị ha na-akọwapụta abụghị ntọala maka ezi ihe àmà na-edo anya nke ịbịaghachi ná ndụ n’ụwa.”
Gịnị ma ọ bụrụ na ị na-eche na o nwere ihe ndị ị na-echeta banyere ụwa mbụ gị? Mmetụta ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ n’ihi ihe dị iche iche. A na-edebe akụkụ dị ukwuu n’ihe ọmụma ndị anyị na-enweta n’otu akụkụ zoro ezo nke ime ime uche anyị n’ihi na ọ dịghị kpọmkwem ihe anyị ga-eji ha mee ozugbo. Mgbe e chetara ihe ndị e chezọrọ echezọ, ụfọdụ ndị na-akọwa nke a dị ka ihe àmà nke ụwa mbụ. Ka o sina dị, nke bụ eziokwu bụ na anyị enweghị ahụmahụ nke na-akwado ndụ ọzọ ma e wezụga nke anyị dị ugbu a. Ihe ka ukwuu ná ndị bi n’ụwa adịghị echeta maka ịdịbu ndụ ma ọlị; ha adịghịkwa eche na ha nwere ike ibiworị n’ụwa mbụ.