Mkpughe E Kpugheere Jọn
13 O* wee guzo otu ebe n’elu ájá oké osimiri.
Ahụkwara m otu anụ ọhịa+ nke si n’oké osimiri na-apụta.+ O nwere mpi iri na isi asaa, okpueze iri dịkwa na mpi ndị ahụ. Aha dị iche iche e ji na-ekwulu Chineke dịkwa n’isi ya. 2 Anụ ọhịa ahụ m hụrụ dịkwa ka agụ owuru, ma ụkwụ ya dị ka nke anụ ọhịa bea, ọnụ ya dịkwa ka ọnụ ọdụm. Dragọn ahụ+ nyekwara anụ ọhịa ahụ ike na ocheeze na ikike dị ukwuu.+
3 Ahụkwara m na e merụrụ anụ ọhịa ahụ ezigbo ahụ́ n’otu isi ya. Ma ahụ́ a e merụrụ ya lara+ n’agbanyeghị na ọ gaara egbu ya. Ụwa niile sokwaara ya, na-aja ya mma. 4 Ha fekwara dragọn ahụ n’ihi na o nyere anụ ọhịa ahụ ikike. Ha fekwara anụ ọhịa ahụ, na-asị: “Ònye dị ka anụ ọhịa a? Ònyekwa ga-alụsoli ya agha?” 5 E nyere anụ ọhịa ahụ ike itu ọnụ na ikwulu Chineke. E nyekwara ya ike ime ihe ọ bụla masịrị ya ruo ọnwa iri anọ na abụọ.+ 6 O wee meghee ọnụ ya, na-ekwulu+ Chineke, na-ekwutọ aha ya na ebe o bi, na-ekwutọkwa ndị bi n’eluigwe.+ 7 E nyere ya ike ịlụso ndị nsọ agha na imeri ha.+ E nyekwara ya ike ịchị ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile na mba niile. 8 Ndị niile bi n’ụwa ga-efekwa ya. Malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa, o nweghị onye n’ime ha e dere aha ya n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ+ nke Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu.+
9 Onye nwere ntị, ya nụ.+ 10 Ọ bụrụ na e nwere onye e kwesịrị ịtụ mkpọrọ, a ga-atụ ya mkpọrọ. A ga-ejikwa mma agha gbuo onye ji mma agha gbuo mmadụ.*+ N’ihi ya, ndị nsọ+ kwesịrị ịtachi obi,+ nweekwa okwukwe.+
11 M wee hụ anụ ọhịa ọzọ nke si n’ala na-apụta. O nwere mpi abụọ ndị dị ka nke obere ebule, ma ọ malitere ikwu okwu dị ka dragọn.+ 12 O ji ikike niile nke anụ ọhịa mbụ ahụ+ nwere na-achị n’ihu ya. Ọ na-emekwa ka ụwa na ndị bi n’ime ya na-efe anụ ọhịa mbụ ahụ, nke e merụrụ ezigbo ahụ́, ma ya agbakee.+ 13 Ọ na-emekwa ihe dị ịtụnanya n’ihu ụmụ mmadụ. Ọ na-emedị ka ọkụ si n’eluigwe daa n’ụwa.
14 N’ihi ihe ndị dị ịtụnanya e nyere ya ike ime n’ihu anụ ọhịa ahụ, ọ na-eduhie ndị bi n’ụwa. Ọ na-agwakwa ndị bi n’ụwa ka ha kpụọ ihe yiri anụ ọhịa ahụ+ e ji mma agha merụọ ahụ́, ma ya agbakee.+ 15 E nyekwara anụ ọhịa nke abụọ ahụ ike ime ka ihe ahụ yiri anụ ọhịa nke mbụ ahụ kuwe ume, ka ihe ahụ yiri anụ ọhịa ahụ nwee ike ịna-ekwu okwu, meekwa ka e gbuo ndị niile na-ekweghị efe yanwa.
16 Ọ na-amanyekwa mmadụ niile ka a kaa ha akara n’aka nri ha ma ọ bụ n’egedege ihu ha,+ ma ndị nta ma ndị ukwu, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye, ma ndị nweere onwe ha ma ndị ohu. 17 Ọ na-emekwa ka a ghara inwe onye ga-azụ ihe ma ọ bụ ree ihe ma e wezụga onye nwere akara ahụ, ya bụ, aha+ anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ nọmba nke aha ya.+ 18 Ka onye nwere ọgụgụ isi gbakọọ nọmba nke anụ ọhịa ahụ, n’ihi na ọ bụ nọmba mmadụ. Nọmba ya bụkwa narị isii na iri isii na isii (666).+ Ọ bụ naanị onye nwere amamihe ga-aghọta ihe a.