Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 7/15 p. 30
  • Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ihe Kasị Dịrị Ize Ndụ”
  • Ịpụ n’Anya n’Enweghị Onye Hụtara Ya?
  • Ọgwụgwụ Ya Dị Nso
  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Na-ejegharịnụ Dị Ka Ndị Jehova Ziworo Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 7/15 p. 30

Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ

“Ihe Kasị Dịrị Ize Ndụ”

Akwụkwọ ndị ọrịa butere ajọ ọrịa site ná mmịnye ọbara na-agba emewo ka ọtụtụ ụlọ ndebe ọbara dị iche iche malite inwe ọ̀tụ̀tụ̀ nchegbu ọhụrụ. N’etiti afọ 1989 a korọ na e tinyewo ihe karịrị 300 akwụkwọ ikpe megide ụlọ ndebe ọbara dị iche iche na United States. Gilbert Clark, bú nnukwute onyeisi nke òtù American Association of Blood Banks, kwetara na “ọha mmadụ chọrọ ọbara nke na-enweghị ihe ize ndụ ma ọlị,” ma o kwetakwara na nke ahụ bụ ihe a na-apụghị ijide n’aka.

N’otu aka ahụ, akwụkwọ akụkọ Parade Magazine kọro na onye ọkachamara n’ihe banyere ọbara, bụ́ Dr. Charles Huggins kwetara na ọbara “bụ ihe a na-aghaghị ile anya dị ka ihe nwere ihe ize ndụ n’ụzọ a na-apụghị izere ezere.” Ọ kọwara ọbara dị ka “ihe kasị dịrị ize ndụ anyị na-eji eme ihe n’usoro ọgwụgwọ ọrịa.” Kemgbe mmalite afọ 1989 ụdị ọrịa na-efe efe ụlọ ndebe ọbara dị iche iche na-eme nnyocha banyere ha amụbawo ruo ise (HTLV-I, nke e ịikọtara ya na ọrịa ọbara bụ T-cell leukemia nke na-eme ndị okenye, ọrịa mmekọahụ bụ syphilis, ịba ọchananya bu hepatitis B, AIDS na hepatitis C). Otú ọ dị, dị ka otu onye ọnụ na-eru n’okwu n’òtù American Red Cross bụ́ S. Gerald Sandler si kwuo, “o yiri ka ọ bụ nanị oge ka ọ ga-ewe tupu anyị achọpụta ụdị prịa ọzọ a na-adịghị ahụkebe, nke a na-ekesa site ná mmịnye ọbara.” N’agbanyeghị mmetụta na-egbu egbu dị otú ahụ ọ pụrụ inwe, a na-atụ anya na ihe dị ka nde ndị North America anọ ga-anata mmịnye ọbara n’ime afọ 1990. Dị ka onye na-ede ihe n’akwụkwọ akụkọ, bụ́ W. Gifford-Jones si kwuo, ihe bụ nsogbu bụ na “e wezụgakwa Ndịàmà Jehova, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọrịa adịghị enwe mkparịta ụka banyere ma à ga-amịnye ọbara ma ọ bụ na a gaghị amịnye.”

Ruo ọtụtụ iri afọ Ndịàmà Jehova ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi ‘hapụ ọbara’ n’ụdị ọ bula dị ka Okwu Chineke nyere n’iwu n’Ọrụ Ndị Ozi 15:28,29; 21:25. Nchebe nke a nyeworo ha site n’ọrịa ndị dị egwu, ndị a na-enweta site ná mminye ọbara, na-eme nnọọ ihe atụ otú nrubeisi ha nye iwu nile nke Jehova Chineke si bụrụ ihe ziri ezi.

Ịpụ n’Anya n’Enweghị Onye Hụtara Ya?

Joachim Cardinal Meisner, bụ́ onye kpaliri oké esemokwu mgbe a họpụtara ya na February gara aga dị ka onye bishọp ukwu ọhụrụ nke Cologne, Germany, kwuru n’oge na-adịghị anya gara aga na ihe kasị atụ ya egwu bụ na otu ụbọchị, chọọchị pụrụ “ịpụ n’anya—ma eleghị anya bụrụkwa nke ọha mmadụ na-agaghị ahụta.” Dị ka akwụkwp akụkọ Germany ahụ bụ Rheinische Post si kọọ, Meisner sịrị: “Mkpụrụ obi m na-ada mbà n’ihi na ọha mmadụ amalitewo ile chọọchị anya dị ka ihe na-adịkwaghị mkpa.” O kwuru na otu ihe ọ pụrụ ịbụ ya kpatara ya bụ na “anyị na-ekwu okwu nke ukwuu banyere elu ala ma anyị adịghị ekwu okwu otú o kwesịrị banyere eluigwe, anyi na-ekwubiga okwu ókè banyere ihe dị ugbu a ma ghara ikwu okwu otú o kwesịrị banyere mgbe ebighị ebi.”

Site n’ijikọ onwe ha n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke azụmahịa ndị dị n’ụwa kama ịtụkwasị obi n’ike sitere n’eluigwe maka idozi nsogbu nile nke ụwa, okpukpe nile nke Krisendọm egosiwo n’ezie na nzọrọ ha na-azọrọ na ha na-anọchite anya ọdịmma nke Chineke bụ ụgha. Nke a ga-arụpụtara ha ihe dị oké njọ. Dị ka Bible si kwuo, okpukpe ụgha nile ga-apụ n’anya n’oge na-adịghị anya —ihe omume nke “ndị eze ụwa” na-aghaghị ịhụta, tinyekwara “ndị ahịa nke ụwa,” bụ́ ndị ga-akwa ákwá n’ihi ihe omume nke a. Ya mere, ọ di mkpa ka ndị hụrụ ezi omume n’anya ṅaa ntị n’okwu ahụ bụ: “Sinụ n’ime [okpukpe ụgha] pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.”—Mkpughe 18:4, 9, 11.

Ọgwụgwụ Ya Dị Nso

“Igbu ọchụ nke ndị ọchịchị” bụ otú ụfọdụ akwukwọ akụkọ si akọwa igbu ọchụ nke gọọmenti dị iche iche ma ọ bụ òtù ndị ha na-akwado na-egbu. N’eziokwu, otu onye na-ekwuchitere òtù Amnesty International, bụ́ Gerry O’Connel, kwuru na n’afọ 1988, “e nwere mmụba nke mmebi nke ihe ndị ruuru mmadụ, bụ́ nke gaworo n’ihu n’afọ 1989.” Ọ gara n’ihu ikwu, si: “Igbu mmadụ n’ụzọ megidere iwu ndị a nakweere n’ebe nile eruwo ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu a na-ahụtụbeghị mbụ.”

Dị ka akụkọ kwa afọ nke òtù Amnesty si kwuo, ọnụ ọgụgụ ndị e nwere na-anwụ ibubo n’ahụ: N’ime afọ 1988, ọchịchị gbachiri nkịtị hụ ka e gburu ọnụ ọgụgụ mmadụ dị n’agbata 50,000 na 100,000 na 29 mba di iche iche. ụfọdụ n’ime ndị a bụ ụmụntakịrị, ndị agadi, na ndị inyom, ndị nanị mpụ ha mere bụ na ha so n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchichi ma ọ bụ na ha sitere n’agbụrụ ndị na-ebughị ibu n’ọnụ ọgụgụ, ma ọ bụkwanụ na ha bi n’ógbè ebe òtù ndị na-emegiderịta onwe ha na-azọ azọ. Ndị na-egbu ọchụ ndị ahu gụnyere òtù ndị na-egbu mmadu, ndị na-achọ mgbanwe ọchịchị n’ike, ndị na-ebugharị ọgwụ ọjọọ na òtù ndị ọzọ ndị na-eji ime ihe ike na-eme ndọrọ ndọro ọchịchị nke ha. Akwụkwọ akụkọ bụ La Repubblica kwuru, sị, “Ọtụtụ mgbe, Ọchịchị na-ezo onwe ya n’azụ ìgwè ndị na-eme ihe ike iji gbusịsịa ndị na-emegide ha ma ọ bụ ndị àgwà ha gbagọrọ agbagọ.”

Ya mere, ọ bụghị na nkịtị ka Okwu Jehova nke sitere n’ike mmụọ nsọ ji jiri “anụ ọhịa” mee ihe atụ nke ọchịchị mmadụ. (Mkpughe 13:2) Otú ọ dị, omume aka ike dị otú ahụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpaliri agaghị adịru mgbe ebighị ebi. Dị ka Abụ Ọma 92:7 kwuru: “Mgbe ndị na-emebi iwu na-ama akwụkwọ dị ka ihe ọkụkụ, mgbe ndị nile nke na-arụ ajọ ihe na-awakwa okoko osisi; ọ bụ ka e wee kpochapụ ha ruo mgbe nile ebighị ebi.” Alaeze eluigwe nke Chineke nke dị n’aka Kraist Jisọs, bụ́ “Onyeisi Udo” ahụ, ga-eme nke a.—Aịsaịa 9:6; Daniel 2:44.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya