Ịhụnanya Ụmụnna Dị Irè
Isi Ihe Ndị Sitere na Faịlimọn
JISỌS KRAỊST nyere ndị na-eso ụzọ ya “iwu ọhụrụ” ahụ ka ha hụrịta ibe ha n’anya dị ka ya onwe ya hụworo ha n’anya. (Jọn 13:34, 35) N’ihi ịhụnanya ahụ, ha ga-adị njikere ọbụna ịnwụ ọnwụ n’ihi ibe ha. Ee, ịhụnanya ụmụnna siruru ike, dịruokwa irè otú ahụ.
Pọl onyeozi ji n’aka na ịhụnaya ụmụnna ga-akpali Faịlimọn, bụ́ onye Kraịst nke nọ n’ọgbakọ dị na Kọlọsi, bụ́ obodo nke dị n’Asia Minor. Ịhụnanya akpaliworị Faịlimọn imeghe ụlọ ya ka ndị Kraịst jiri ya na-eme ihe maka nzukọ ha dị iche iche. Ohu Faịlimọn, bụ́ Onesimọs agbapụwo, ma eleghị anya na-ezuru ego ụfọdụ iji kwụọ ụgwọ ụgbọ o ji jee Rom, bụ́ ebe o mesịrị zute Pọl, ghọọkwa onye Kraịst.
Mgbe a tụrụ ya mkpọrọ na Rom n’ihe dị ka afọ 60-61 O.A., Pọl dere akwụkwọ ozi nke e zijeere Faịlimọn kpọmkwem. Ọ rịọrọ Faịlimọn ka o nara Onesimọs ahụ nke na-alaghachinụ ná mmụọ nke ịhụnanya ụmụnna. Gụọ akwụkwọ ozi nke a, ị ga-ahụkwa na ọ bụ ezi ihe nlereanya nke inwe mmetụta na akọ—bụ́ nke ndị Jehova pụrụ ime nke ọma iṅomi.
Ịja Mma Maka Ịhụnanya na Okwukwe
N’ịgwa Faịlimọn na ndị ọzọ okwu, Pọl bu ụzọ jaa ha mma. (Amaokwu 1-7) Onyeozi ahụ nọgidere na-anụ banyere ịhụnanya Faịlimọn nwere maka Kraịst na ndị nsọ nile, banyekwara okwukwe ya. Nke a kpaliri Pọl ikele Jehova, o wetakwaara ya ọṅụ na nkasi obi dị ukwuu. Ànyị na-aja ndị kwere ekwe ibe anyị mma n’onwe anyị, bụ ndị bụ ezi ihe nlereanya n’ịhụnaya na okwukwe? Anyị kwesịrị ime otú ahụ.
Inye agbamume n’ihe ndabere nke ịhụnaya bụ ihe a na-achọsi ike mgbe nile n’imeso ndị Kraịst ibe anyị ihe, dị ka okwu Pọl gosiri. (Amaokwu 8-14) Mgbe o jisịrị ụzọ akọ malite, onyeozi ahụ kwuru na ọ bụ ezie na ya pụrụ inye Faịlimọn iwu ‘ime ihe kwesịrị ekwesị,’ kama nke ahụ, ọ họọrọ ịgba ya ume. Ime gịnị? Ee, ịnaraghachi ohu ahụ bụ Onesimọs n’ụzọ obi ebere! Ọ gaara amasịworị Pọl ime ka Onesimọs nọgide na-ejere ya ozi ndị baara ya uru, kama ọ gaghị eme nke ahụ n’ebughị ụzọ nata Faịlimọn ikike.
Ihe omume ndị yiri ndị na-adịghị mma na-arụpụtakarị ihe bara uru, dị ka Pọl gara n’ihu ime ka ọ pụta ìhè. (Amaokwu 15-21) N’eziokwu, a rụpụtawo ihe ọma mgbe Onesimọs gbapụrụ. N’ihi gịnị? N’ihi na Faịlimọn nwere ike ịnaraghachi ya ugbu a dị ka nwanna onye Kraịst nke ji afọ ofufo na-arụ ọrụ, onye na-emekwa ihe n’eziokwu, ọ bụghị dị ka ohu nke a na-amanye amanye ime ihe, nke ọ pụkwara ịbụ na ọ dịghị eme ihe n’eziokwu. Pọl gwara Faịlimọn ka ọ nabataghachi Onesimọs ọbụna dị ka ọ pụrụ ịnabata Pọl. Ọ bụrụ na ọ dịwo ụzọ ọ bụla Onesimọs si mehie megide Faịlimọn, onyeozi ahụ ga-akwụghachi ya. Iji mee ka Faịlimọn dịkwuo njikere ime ihe a rịọrọ ya ka o mee, Pọl chetaara ya na ya onwe ya ji onyeozi ahụ ụgwọ maka ịghọ onye Kraịst. Ya mere, Pọl ji n’aka na Faịlimọn ga-eme ọbụna karịa ihe ọ na-arịọ ya ka o mee. Lee nnọọ arịrịọ ịhụnanya na akọ nke a bụ! N’ezie, nke a bụ ụzọ anyị kwesịrị isi mesoo ndị Kraịst ibe anyị ihe.
Pọl mechiri akwụkwọ ozi ya site n’ikwu banyere olileanya, ekele, na echiche ọma ọ na-echere ha. (Amaokwu 22-25) O nwere olileanya na site n’ekpere nke ndị ọzọ na-ekpe n’ihi ya, a ga-atọhapụ ya n’oge na-adịghị anya site n’ụlọ mkpọrọ. (Dị ka akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara Timoti na-egosi, a zara ekpere ndị ahụ.) N’imechi akwụkwọ ozi ya, Pọl zijere ozi ekele, kwupụtakwa ọchịchọ ya ka amara nke Jisọs Kraịst dịkwasị mmụọ nke Faịlimọn na ndị ya na ha na-efekọ Jehova, na-egosi.
Igbe/Foto dị na peeji nke 23]
Ihe Karịrị Ohu: N’ihe banyere nlọghachi nke ohu Faịlimọn ahụ gbapụburu agbapụ, bụ́ Onesimọs, Pọl sịrị: “Eleghị anya ọ bụ n’ihi nke a ka e kewapụrụ ya n’ebe ị nọ nwa oge nta, ka i wee nwee ya ebighị ebi; ọ dịghịkwa ka ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, ọ dị ka nwanna a hụrụ n’anya, nke kachasịnụ n’ebe m nọ, ma nke karịrị nke ahụ nke ukwuu n’ebe ị nọ, n’ime anụ ahụ na n’ime Onyenwe anyị.” (Faịlimọn 15, 16) N’ime Alaeze Ukwu nke Rom, ọchịchị onyeeze na-eme ka e nwee ndị bụ ohu, Pọl nakwerekwara ike nke “ndị na-achị isi” dị otú ahụ. (Ndị Rom 13:1-7) Ọ kwadoghị onye bụ ohu ịnụpu isi kama o nyeere ndị dị otú ahụ aka inwetaghachi nnwere onwe ime mmụọ dị ka ndi Kraịst. N’ụzọ kwekọrọ n’okwu ndụmọdụ nke ya onwe ya nyere ndị ohu ka ha doo onwe ha n’okpuru ndị nwe ha, Pọl zighachiiri Faịlimọn Onesimọs. (Ndị Kọlọsi 3:22-24; Taịtọs 2:9, 10) Ugbu a, Onesimọs bụ ihe karịrị ohu onye ụwa. Ọ bụ onye kwere ekwe ibe ya nke a hụrụ n’anya, onye ga-edo onwe ya n’okpuru Faịlimọn n’ụzọ a kpaara ókè dị ka ohu nke dị mma karị, onye ụkpụrụ nile nke Chineke na-achịkwa, onye na-egosipụtakwa ịhụnaya ụmụnna.