Ì Nwere Echiche Chineke Banyere Ihe Ọṅụṅụ Ndị Na-aba n’Anya?
IHE dị ka afọ 20 gara aga, ndị ọkà n’ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala gwupụtara ụlọ ochie e ji brik ụrọ wuo na nso nso obodo Urmia, Iran. Ha hụrụ otu ite na-akụwa akụwa n’ime ya nke, dị ka ndị ọkà mmụta sayensị si kwuo, dị ọtụtụ puku afọ, dịrị laa azụ n’oge e guzobere ógbè ndị mbụ nke ụmụ mmadụ. Na nso nso a, e ji nkà na ụzụ kasị ọhụrụ nyochaa ite ahụ. O juru ndị ọkà mmụta sayensị anya ịhụ n’ime ya mmiri ọgwụ na-enye ihe àmà kasị ochie nke ime mmanya.
Bible na-anwapụtakwa n’ụzọ doro anya na malite n’oge ochie a ṅụwo mmanya, biya, na ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ na-aba n’anya. (Jenesis 27:25; Eklisiastis 9:7; Nehum 1:10) Dị ka ọ dị banyere ihe oriri ndị ọzọ, Jehova na-enye anyị dị ka mmadụ n’otu n’otu nhọrọ—ịṅụ ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya ma ọ bụ ịghara ịṅụ. Ọtụtụ mgbe Jisọs ṅụrụ mmanya mgbe ọ na-eri ihe. Jọn Onye Na-eme Baptism zeere mmanya na-aba n’anya.—Matiu 11:18, 19.
Bible machibidoro ịṅụbiga mmanya ókè. Mmanya ogbugbu bụ mmehie megide Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) N’ikwekọ na nke a, Ndịàmà Jehova adịghị ekwe ka ndị ọ bụla ghọrọ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè na-enweghị nchegharị nọgide n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ndị nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị họọrọ ịṅụ ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya aghaghị ime otú ahụ n’imeru ihe n’ókè.—Taịtọs 2:2, 3.
Echiche Asọpụrụghị Chineke
Ọtụtụ ndị taa enweghị echiche Chineke banyere ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya. Ọ dị mfe ịhụ na Setan na-akwalite iji ihe a e mepụtara site n’oge ochie eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, n’àgwàetiti ụfọdụ nke Ndịda Pacific, ọ bụ omenala ndị ikom izukọta maka ịṅụ ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ihe ọṅụṅụ sụrụ ụfụfụ ndị e mere n’ụlọ. Nnọkọ ndị a pụrụ ịdịru ọtụtụ hour, a na-enwekwa ha ọtụtụ ugboro—ọtụtụ ndị ikom na-eme nke ahụ kwa ụbọchị. Ụfọdụ na-ewere ya nanị dị ka otu akụkụ nke ọdịbendị. Mgbe ụfọdụ a na-aṅụ biya na mmanya ọkụ kama ịṅụ—ma ọ bụ tinyere—ihe ọṅụṅụ ndị e mere n’ụlọ. Ọ na-arụpụtakarị mmanya ogbugbu.
N’otu ala Pacific ọzọ, ndị ikom ịṅụru mmanya n’ókè fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-adịghị anụ ná ntị. Dị ka ọ na-adịkarị, mgbe ha na-aṅụ mmanya ha na-aṅụ ka o gbuwe ha. Dị ka a na-ahụkarị, n’ụbọchị a na-eri ụgwọ ọnwa ìgwè ndị ikom ga-ezukọta ma zụta ọtụtụ katọn biya, nke nke ọ bụla na-enwe karama 24. Ha na-akwụsị ịṅụ mmanya nanị mgbe biya ahụ gwụsịrị. N’ihi ya, mmanya ogbugbu n’ọha bụ ihe a na-ahụkarị.
A na-ejikarị ihe ọṅụṅụ ndị na-asụ ụfụfụ, dị ka mmanya nkwụ na mmanya ndị ọzọ e siri n’ógbè, eme ihe ná mba Africa dị iche iche. Ọdịnala dị n’ógbè ụfọdụ bụ na a ghaghị inye ndị ọbịa mmanya na-aba n’anya mgbe a na-ele ha ọbịa. Onye nwe ụlọ nke nwere omume ile ọbịa na-ewepụtakarị ihe karịrị ihe onye ọbịa ya ga-aṅụchali. N’otu ógbè omenala bụ ịchịsa karama biya 12 n’ihu onye ọbịa nke ọ bụla.
Ọtụtụ ụlọ ọrụ Japan na-ahazi njem bọs maka ndị ọrụ ha. A na-ebukwa ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya eje, a na-anabatakwa mmanya ogbugbu. Ụfọdụ n’ime mkpapụ ndị a nke ụlọ ọrụ na-ewe ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ. Dị ka magazin bụ́ Asiaweek si kwuo, na Japan, “malite ná ndị na-akọ osikapa ruo na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bara ọgaranya, ihe e jikarị ama nwoke anọwo na-abụ ókè mmanya ọ pụrụ ịṅụ.” A na-ahụkwa omume ndị yiri ya ná mba Esia ndị ọzọ. Asiaweek na-ekwu na “ná nkezi nke otu onye ndị South Korea na-aṅụzi mmanya ọkụ karịa ndị na-aṅụ mmanya n’ebe ọ bụla ọzọ n’ụwa.”
Ịṅụ oké mmanya aghọọla omume zuru ebe nile n’ogige kọleji ndị dị na United States. Dị ka magazin bụ́ The Journal of the American Medical Association si kwuo, “ihe ka ukwuu ná ndị na-aṅụ oké mmanya adịghị ele onwe ha anya dị ka ndị nwere nsogbu ịṅụ mmanya.”a Nke a ekwesịghị ịbụ ihe ijuanya n’ihi na n’ọtụtụ mba ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-akwalite ịṅụ mmanya dị ka ihe omume na-akpali akpali, na-ewu ewu, na nke ịwa anya. Ọtụtụ mgbe mkpọsa a na-ede ndị na-eto eto kpọmkwem.
Na Britain, ịṅụ biya amụbawo okpukpu abụọ n’ime oge dị afọ 20, ịṅụ mmanya ndị siri ike amụbawokwa okpukpu atọ. Ndị na-aṅụ mmanya na-amalite na nwata karị, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị inyom na-aṅụkwa mmanya. A na-ahụkwa omume ndị yiri ha ná mba ndị dị n’Ọwụwa Anyanwụ Europe nakwa Latin America. A na-egosipụta nke a site n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịrị elu ha nhata nke aṅụrụma na ọnwụ okporo ụzọ ndị e jikọtara ha na mmanya na-aba n’anya. N’ụzọ doro anya, e nwere ịrị elu pụtara ìhè n’iji mmanya na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi n’ụwa nile.
Olee Ókè Gafere Ókè?
Echiche Bible banyere ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya guzoziri eguzozi. N’otu aka, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na mmanya bụ onyinye si n’aka Jehova Chineke “nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa.” (Abụ Ọma 104:1, 15) N’aka nke ọzọ, n’ịkatọ imebiga ihe ókè Bible na-eji okwu bụ́ “ịṅụbiga mmanya ókè,” “mmanya ogbugbu nile,” “aṅụbiga mmanya ókè,” na “ịbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya ókè” eme ihe. (Luk 21:34; 1 Pita 4:3; 1 Timoti 3:8; Taịtọs 2:3) Ma olee ókè bụ́ “ịṅụbiga mmanya ókè”? Olee otú onye Kraịst pụrụ isi kpebie ihe bụ echiche Chineke banyere ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya?
O sighị ike ịmata mmanya ogbugbu. A kọwara ihe ndị na-esi na ya apụta n’ime Bible n’okwu ndị a: “Ònye nwere ahụhụ? ònye nwere iru újú? ònye nwere iseokwu? Ònye nwere ntamu? ònye nwere ogbugbu mma n’efu? Ònye nwere anya na-acha ọbara ọbara? Ọ bụ ndị na-anọ na mmanya vine ogologo mgbe; ndị na-aba n’ụlọ ịchọpụta mmanya a gwara agwa. . . . Anya gị abụọ ga-ahụ ndị inyom na-abụghị nwunye gị, obi gị ga-ekwukwa okwu ịgbakụta Chineke azụ.”—Ilu 23:29-33.
Ịṅụfe mmanya na-aba n’anya ókè pụrụ ịkpata mgbagwoju anya, ịmụ anya arọ nrọ, amaghị ihe na-emenụ, na nsogbu ndị ọzọ nke uche na ahụ. N’okpuru mmetụta nke mmanya na-aba n’anya, mmadụ nwere ike ọ gaghị achịkwali akparamàgwà ya, na-akpatara onwe ya ma ọ bụ ndị ọzọ mmerụ ahụ. A maara na ndị na-aṅụbiga mmanya ókè na-etinye aka n’omume dị oké njọ, nke na-akpasu iwe, ma ọ bụ nke rụrụ arụ.
Ịṅụ mmanya ruo n’ókè nke mmanya ogbugbu, ya na ihe ndị e hotara n’elu na-esi na ya apụta, bụ n’ezie ịṅụfe mmanya ókè. Otú ọ dị, mmadụ pụrụ igosi emerughị ihe n’ókè n’egosipụtaghị ihe àmà nile a na-ahụkarị nke mmanya ogbugbu. Ya mere, ajụjụ bụ ma mmadụ ọ̀ ṅụfeela mmanya ókè na-abụkarị nke a pụrụ ịgbagha. Olee ọdịiche dị n’imeru ihe n’ókè na imebiga ihe ókè?
Chebe Izuzu Gị
Bible ekwughị ókè a ga-aṅụru site n’inye ọ̀tụ̀tụ̀ pasent mmanya ga-adị n’ọbara ma ọ bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ọzọ. Ikike ịnagide mmanya na-aba n’anya na-adị iche site n’otu onye gaa n’onye ọzọ. Ma, ụkpụrụ Bible na-emetụta ndị Kraịst nile, nweekwa ike inyere anyị aka ịzụlite echiche Chineke banyere ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya.
Jisọs kwuru na iwu mbụ bụ ‘iwere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya.’ (Matiu 22:37, 38) Mmanya na-aba n’anya na-enwe mmetụta kpọmkwem n’uche, ịṅụbigakwa mmanya ókè ga-egbochi nrubeisi gị n’iwu a kachasị iwu nile. Ọ pụrụ igbochi inwe ezi uche, ikike idozi nsogbu, inwe njide onwe onye, na ịrụ ọrụ ndị ọzọ dị mkpa nke uche n’ụzọ siri ike. Akwụkwọ Nsọ na-adụ anyị ọdụ, sị: “Chebe nzube ihe na izuzu; ha ga-abụkwara mkpụrụ obi gị ndụ, bụkwaara olu gị amara.”—Ilu 3:21, 22.
Pọl onyeozi na-arịọ ndị Kraịst, sị: “Chee ahụ unu n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ, nke bụ ikpe ekpere unu dị ka uche si dị.” (Ndị Rom 12:1) Onye Kraịst ọ̀ ga-adị “Chineke ezi ụtọ” ma ọ bụrụ na ọ na-aṅụ mmanya na-aba n’anya ruo n’ókè nke ịtụfu “uche” ya? Dị ka ọ na-adịkarị, onye na-aṅụbiga mmanya ókè na-eji nwayọọ nwayọọ azụlite ikike ịnagide mmanya na-aba n’anya. Ọ pụrụ iche na ịṅụbiga mmanya ókè ya—nye ya—erughị n’ókè nke mmanya ogbugbu. Ma, ọ pụrụ nnọọ ịdị na-azụlite ndabere na-adịghị mma n’ebe mmanya na-aba n’anya dị. Onye dị otú ahụ ọ̀ pụrụ iche ahụ ya dị ka “àjà dị ndụ, dị nsọ”?
Ókè ọ bụla nke mmanya na-aba n’anya nke na-emetụta “nzube ihe na izuzu” gị dị ka onye Kraịst bụ mmanya na-aba n’anya gafere ókè nye gị.
Gịnị Na-akpụzi Echiche Gị Banyere Mmanya Na-aba n’Anya?
Onye Kraịst kwesịrị ịtụle ma omume ya n’ebe ịṅụ mmanya dị ọ̀ bụ nke omume ma ọ bụ ọdịnala ndị dị n’oge a na-emetụta. Mgbe a bịara n’ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya, n’ezie ị gaghị achọ ime ka nhọrọ gị dabere n’omume ọdịbendị ma ọ bụ mkpọsa nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi. N’ịtụle omume gị, jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ̀ bụ nke ihe a na-anakwere n’ógbè na-emetụta? Ka ịṅụ mmanya m ọ̀ bụ nke ụkpụrụ Bible na-achịkwa?’
Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova adịghị emegide ọdịbendị, ha na-aghọta na Jehova kpọrọ ọtụtụ omume ndị a na-anakwere ebe nile taa asị. Ógbè ụfọdụ na-anabata nsikwopụ afọ ime, mmịnye ọbara, ndina ụdị onwe, ma ọ bụ ịlụ karịa otu nwanyị. Otú ọ dị, ndị Kraịst na-eme ihe kwekọrọ n’echiche Chineke banyere ihe ndị a. Ee, echiche Chineke ga-akpali onye Kraịst ịkpọ omume ndị dị otú ahụ asị n’agbanyeghị ma a na-anakwere ha n’ọdịbendị ma ọ bụ na a dịghị anakwere ha.—Abụ Ọma 97:10.
Bible na-ekwu banyere “ihe ndị mba ọzọ na-ezube,” bụ́ nke na-agụnye “ịṅụbiga mmanya ókè nile.” Okwu bụ́ “ịṅụbiga mmanya ókè nile” na-enye echiche nke nnọkọ ndị a haziri nnọọ ná nzube nke ịṅụ ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke mmanya na-aba n’anya. O yiri ka n’oge Bible ụfọdụ ndị dị mpako n’ihi ikike ha chere na ha nwere ịnagide mmanya ha ṅụrụ nwara ịṅụkarị ndị ọzọ, ma ọ bụ ha nwara ile onye pụrụ ịṅụkarị. Pita onyeozi na-ezo aka n’ụdị àgwà a dị ka “njubiga ókè ahụ nke ndụ ịla n’iyi” bụ nke ndị Kraịst chegharịworo na-adịkwaghị ekere òkè na ya.—1 Pita 4:3, 4.
Ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya nye onye Kraịst inwe echiche bụ na ọ bụrụhaala na mmanya egbughị ya, na ebe, mgbe, ma ọ bụ ókè ọ ṅụrụ adịghị ihe o mere? Anyị pụrụ ịjụ, sị, Nke ahụ ọ̀ bụ echiche Chineke? Bible na-asị: “Ma unu na-eri ihe, ma unu na-aṅụ ihe, ma unu na-eme ihe ọ bụla, na-emenụ ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.” (1 Ndị Kọrint 10:31) Mmanya nwere ike ọ gaghị egbucha mmadụ nile so n’ìgwè ndị ikom zukọtara maka ịṅụ ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke mmanya na-aba n’anya n’ihu ọha, ma àgwà ha ọ̀ ga-ewetara Jehova otuto? Bible na-adụ ọdụ, sị: “Unu ekwela ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.”—Ndị Rom 12:2.
Zere Ime Ka Ndị Ọzọ Sụọ Ngọngọ
N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ọtụtụ mgbe ọdịbendị ahụ ndị na-anakwere imebiga ihe ókè na-agbarụ ihu mgbe onye na-aṅụbiga mmanya ókè na-azọrọ ịbụ onye Chineke. N’otu ntakịrị ógbè dị na Ndịda Pacific, otu onye na-ahụ ihe na-emenụ kwuru, sị: “Enwere m mmasị n’ebe unu nọ. Unu na-ekwusa eziokwu ahụ. Ma nsogbu anyị na-ahụ bụ na ndị ikom unu na-aṅụfe mmanya ókè.” Dị ka a kọrọ, mmanya egbughị ndị ahụ, ma eziokwu ahụ edochaghị ọtụtụ ndị nọ n’ógbè ahụ anya. Ndị na-ahụ ihe na-emenụ pụrụ ikwubi n’ụzọ dị mfe na dị ka ihe ka ukwuu ná ndị ikom ndị ọzọ ndị na-esonye ná nnọkọ ịṅụ mmanya, na Ndịàmà na-aṅụbigakwa mmanya ókè. Onye ozi bụ́ onye Kraịst nke na-esonye ná nnọkọ ịṅụ mmanya ndị na-adịte anya ọ̀ pụrụ ịnọgide na-enwe aha ọma ma jiri nkwuwa okwu jezuo ozi ihu ọha ya?—Ọrụ 28:31.
Otu akụkọ sitere otu mba Europe na-egosi na mgbe ụfọdụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ụfọdụ na-abịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-esi nnọọ mmanya mmanya. Nke a enyewo akọ na uche ndị ọzọ nsogbu. Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ọ dị mma ka ị ghara iri anụ, ma ọ bụ ịṅụ mmanya vine, ma ọ bụ ime ihe ọ bụla nke nwanna gị ga-asụ ngọngọ n’ime ya.” (Ndị Rom 14:21) Echiche Chineke banyere ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya ga-akpali onye Kraịst tozuru okè inwe mmetụta banyere akọ na uche ndị ọzọ, a sịgodị na ọ pụtara izere mmanya na-aba n’anya n’ọnọdụ ụfọdụ.
Ndị Kraịst Dị Iche n’Ụzọ Doro Anya
N’ụzọ dị mwute, ụwa a emewo ihe dị ukwuu iji kpasuo Jehova iwe site n’iji ihe ọma ndị o nyeworo ihe a kpọrọ mmadụ, gụnyere ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya, eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Onye Kraịst ọ bụla raara onwe ya nye kwesịrị ịgbalị izere echiche zuru ebe nile ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. N’ụzọ dị otú a ndị mmadụ ga-enwe ike “hụ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu, n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya.”—Malakaị 3:18.
Mgbe a bịara n’ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya, ‘ihe ahụ dị iche’ n’etiti Ndịàmà Jehova na ụwa kwesịrị ido anya. Ịṅụ ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya abụghị isi ihe ná ndụ ezi ndị Kraịst. Ha adịghị anwale ikike ha nke ịnagide mmanya na-aba n’anya, na-akpụdewe mmanya ogbugbu n’ụzọ dị ize ndụ; nke ha ji ekwekwanụ ka ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya metụta ma ọ bụ n’ụzọ ọ bụla gbochie ojiji ha ji mkpụrụ obi ha dum na uche zuru okè na-ejere Chineke ozi.
Dị ka otu ìgwè, Ndịàmà Jehova nwere echiche Chineke banyere ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya. Olee banyere gị? Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịdabere ná ngọzi Jehova ka anyị na-agbaso ntụziaka Bible bụ́ “jụ asọpụrụghị Chineke na agụụ ihe ọjọọ dị n’ụwa, wee dị ndụ uche zuru okè na nke ezi omume na nke ịsọpụrụ Chineke n’oge dị ugbu a.”—Taịtọs 2:12.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a “A kọwara ịṅụ oké mmanya dị ka ịṅụ mmanya ise ma ọ bụ karị ná nsochi nye ndị ikom na mmanya anọ ma ọ bụ karị ná nsochi nye ndị inyom.”—The Journal of the American Medical Association.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 28]
Ṅaa Ndị Ị Hụrụ n’Anya Ntị
Onye na-aṅụbiga mmanya ókè na-abụkarị onye ikpeazụ ga-achọpụta na o nwere nsogbu. Ndị ikwu, ndị enyi, na ndị okenye ndị Kraịst ekwesịghị igbu oge n’inyere ndị a hụrụ n’anya aka bụ́ ndị na-adịghị emeru ihe n’ókè. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ndị a hụrụ n’anya ekwupụta ahụ erughị ala ha banyere àgwà ịṅụ mmanya na-aba n’anya gị, o yiri ka ha nwere ezi ihe kpatara ya. Chebara ihe ha na-ekwu echiche.—Ilu 19:20; 27:6.