Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w23 Disemba p. 14-17
  • Na-ele Mmanya Na-aba n’Anya Anya Otú Chineke Si Ele Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-ele Mmanya Na-aba n’Anya Anya Otú Chineke Si Ele Ya
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE BAỊBỤL KWURU
  • CHEE IHE MERE I JI AṄỤ MMANYA NA OTÚ MMANYA Ị NA-AṄỤ HÀ
  • Olee Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ile Mmanya Na-aba n’Anya anya Otú Kwesịrị Ekwesị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Eme Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ịkụziri Nwa Gị Ihe O Kwesịrị Ịma Banyere Mmanya Na-aba n’Anya
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
w23 Disemba p. 14-17
Ebe ụmụnna atọ na-eri nri n’ebe a na-ere nri. Otu n’ime ha na-aṅụ mmanya na-anaghị aba n’anya, ndị nke ọzọ ana-aṅụ nke na-aba n’anya. Onye na-ere ihe n’ebe ahụ na-ajụ ha mmanya ọ ga-ewetara ha, nwanna ahụ na-aṅụ mmanya na-anaghị aba n’anya asị ka a ghara iwetara ya ọzọ, otu onye n’ime ndị nke ahụ na-aṅụ nke na-aba n’anya ekwuo ka e wetara ya ọzọ.

Na-ele Mmanya Na-aba n’Anya Anya Otú Chineke Si Ele Ya

O DORO anya na i ji onyinye ndị Jehova nyere anyị kpọrọ ihe, ma otú o si kwe ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe ndị anyị ga-eji ihe ndị o nyere anyị eme. Baịbụl kwuru na mmanya bụ onyinye Chineke nyere anyị. Ọ sịrị: “Nri na-eme ka mmadụ na-achị ọchị, mmanya na-emekwa ka ndụ na-atọ mmadụ ụtọ.” (Ekli. 10:19; Ọma 104:15) Ma, o nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ịṅụ mmanya na-aba n’anya aghọọrọla ụfọdụ ndị nsogbu. Ihe ọzọkwa bụ na olu ndị mmadụ abụghị otu gburugburu ụwa n’ihe gbasara ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Oleezi ihe ga-enyere Onye Kraịst aka ime mkpebi dị mma gbasara ịṅụ mmanya?

Anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme, anyị kwesịrị ikpebi ya ka ọ daba n’ihe Chineke chọrọ, ọ bụghị n’ihe ndị nọ anyị gburugburu chere. Ọ bụ ihe a ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ.

O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ọtụtụ ndị n’ụwa taa na-aṅụ mmanya mgbe niile, na-aṅụfekwa ya ókè. Ụfọdụ ndị nwere ike ịṅụ mmanya n’ihi na ọ na-eme ka obi ruo ha ala. Ndị ọzọ na-aṅụ ya ka ha chefuo nsogbu ha. N’ebe ụfọdụkwa, a na-eji mmadụ ịṅụ oké mmanya amata na ọ bụ nwoke ma ọ bụ dimkpa.

Ma, e nwere ihe Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya gwara anyị bụ́ Ndị Kraịst gbasara ịṅụ mmanya. Dị ka ihe atụ, ọ gwara anyị ihe ọjọọ ịṅụ oké mmanya na-akpata. Ọ ga-abụ na anyị agụọla ihe e kwuru n’Ilu 23:29-35 ebe kọwara otú onye ṅụrụ oké mmanya si eme na nsogbu ụfọdụ ọ na-akpatara ya.a Otu okenye bi na Yurop aha ya bụ Daniel kwuru otú ndụ ya dị tupu ya aghọọ ezigbo Onye Kraịst. Ọ sịrị: “Ịṅụ oké mmanya mere ka m mee mkpebi ndị na-adịghị mma, ndị kpataara m ezigbo nsogbu. Obi anaghịkwa adị m mma mgbe ọ bụla m chetara ya.”

Olee otú Ndị Kraịst ga-esi mee mkpebi dị mma n’ihe gbasara ịṅụ mmanya ma zere nsogbu ịṅụ oké mmanya na-akpata? Ihe bụ́ isi ga-enyere anyị aka bụ ikwe ka otú Jehova si eche echiche na-eduzi echiche anyị na omume anyị.

Ka anyị lee ihe Baịbụl kwuru gbasara mmanya na-aba n’anya nakwa ihe mere ụfọdụ ndị ji aṅụ mmanya.

IHE BAỊBỤL KWURU

Okwu Chineke ekwughị na ịṅụ obere mmanya na-aba n’anya dị njọ. Baịbụl kwudịrị na ịṅụ mmanya nwere ike ime mmadụ obi ụtọ. Ọ sịrị: “Jiri obi ụtọ rie nri gị, jirikwa obi ụtọ ṅụọ mmanya gị.” (Ekli. 9:7) E nwere oge ndị Jizọs ṅụrụ mmanya. Ndị ọzọ ji obi ha niile fee Chineke ṅụkwara mmanya.​—Mat. 26:27-29; Luk 7:34; 1 Tim. 5:23.

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị na ịṅụ mmanya na-aba n’anya bụ ihe ọjọọ, mana o kwuru na ịṅụ oké mmanya adịghị mma. Ọ sịrị: “Unu aṅụbigakwala mmanya ókè.” (Efe. 5:18) O kwudịrị na “ndị aṅụrụma . . . agaghị eketa Alaeze Chineke.” (1 Kọr. 6:10) N’eziokwu, Jehova kpọrọ ịṅụ oké mmanya na aṅụrụma asị. Kama ịna-eme ka ndị nọ gburugburu anyị, anyị kwesịrị ịna-eme mkpebi dabara n’ihe Chineke chọrọ.

Ụfọdụ ndị chere na ha nwere ike ịṅụ nnukwu mmanya mana ọ gaghị egbu ha egbu. Ma, ime otú ahụ na-akpata ezigbo nsogbu. Baịbụl kwuru na ‘ịṅụ oké mmanya’ nwere ike ime ka mmadụ mee ihe ọjọọ ma mehie Jehova. (Taị. 2:3; Ilu 20:1) Jizọs dọdịrị aka ná ntị na “ịṅụ oké mmanya” nwere ike ime ka mmadụ ghara ịbanye n’ụwa ọhụrụ Chineke. (Luk 21:34-36) Oleezi ihe ga-enyere Onye Kraịst aka izere nsogbu ndị ịṅụ oké mmanya na-akpata?

CHEE IHE MERE I JI AṄỤ MMANYA NA OTÚ MMANYA Ị NA-AṄỤ HÀ

Ọ dịghị mma mmadụ iji otú ndị bi n’ebe o toro si aṅụ mmanya ekpebi otú ọ ga-aṅụru mmanya. Ndị Kraịst na-ekpebi ihe ga-adị Jehova mma n’ihe gbasara nri na mmanya. Baịbụl chetaara anyị, sị: “Ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe ma ùnu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe niile otú ga-eme ka e too Chineke.” (1 Kọr. 10:31) Ka anyị leba anya n’ajụjụ ụfọdụ na ihe Baịbụl kwuru gbasara ha:

M̀ na-aṅụ mmanya ka a ghara ịchị m ọchị? Ọpụpụ 23:2 sịrị: “Esorola ìgwè mmadụ.” Jehova dọrọ ndị Izrel aka ná ntị ebe a ka ha ghara ịkpa àgwà ka ndị na-anaghị eme ihe dị ya mma. Ihe a ọ gwara ha na-abakwara Ndị Kraịst uru taa. Ọ bụrụ na anyị ejiri otú ndị mmadụ si were ịṅụ mmanya na-ekpebi otú anyị si aṅụ mmanya, o nwere ike ime ka anyị ghara iji iwu Jehova kpọrọ ihe, meekwa ka anyị na ya ghara ịdị ná mma.​—Rom 12:2.

M̀ na-aṅụ mmanya iji gosi na m bụ dimkpa? N’obodo ụfọdụ, ọtụtụ ndị na-aṅụ mmanya mgbe niile, na-aṅụfekwa ya ókè. A na-echekwa na e nweghị ihe o mere. (1 Pita 4:3) Ma, lee ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 16:13. Ebe ahụ sịrị: “Mụrụnụ anya. Meenụ ka okwukwe unu sie ike. Nweenụ obi ike, siekwanụ ezigbo ike.” Ịṅụ mmanya ọ̀ ga-enyeliri mmadụ aka isi ezigbo ike? Azịza ya bụ mba. Mmanya na-aba n’anya nwere ike ime ka mmadụ ghara ịna-eche echiche nke ọma, meekwa ka onye ahụ mee mkpebi ndị na-adịghị mma. N’ihi ya, ịṅụ oké mmanya anaghị egosi na mmadụ bụ dimkpa, kama ọ na-egosi na mmadụ dị iberiibe. Aịzaya 28:7 kwuru na onye kpafuru n’ihi mmanya na-adagharị, ọ naghịkwa ama ihe ọ na-eme eme.

Ezigbo ike anyị ga-eji eme ihe dị mma na-esi n’aka Jehova. Ọ ga-eme ka anyị mụrụ anya ma mee ka okwukwe anyị sie ike. (Ọma 18:32) Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịkpachara anya zere nsogbu ma na-eme mkpebi na-agaghị emebi adịm ná mma anyị na Jehova. Jizọs gosiri na o nwere ụdị ike ahụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọtụtụ ndị kwanyekwaara ya ùgwù na ọ bụ dimkpa nakwa na o kpebisiri ike ime ihe dị mma.

M̀ na-aṅụ mmanya ka m chefuo nsogbu m? Mmụọ nsọ mere ka otu ọbụ abụ dee, sị: “Mgbe m nọ na-echegbu onwe m, ị kasiri m obi ma mee ka ahụ́ ruo m ala.” (Ọma 94:19) Ọ bụrụ na nsogbu abịara gị, gakwuru Jehova ka o nyere gị aka, ọ bụghị mmanya. Ụzọ dị mma anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ekpekwu ekpere ka Jehova nyere anyị aka. Ọtụtụ ndị achọpụtakwala na ịga ka enyi ha ma nke a na-akọ n’ọgbakọ nyere ha aka bara uru. N’eziokwu, mmadụ ịṅụ mmanya ka o nwee ike ichefu nsogbu ya nwere ike ime ka onye ahụ ghara ikpebisi ike ime ihe dị mma. (Hos. 4:11) Nwanna Daniel anyị kwuburu okwu ya sịrị: “M nọ na-echegbu onwe m, obi m ana-amakwa m ikpe. M ṅụrụ mmanya ka m chefuo nsogbu m, mana nsogbu m kakwuru njọ, ya emee ka mụ na ọtụtụ ndị enyi m see, meekwa ka m na-eche na mụ abaghị uru.” Oleezi ihe mechara nyere Nwanna Daniel aka? Ọ sịrị: “M chọpụtara na m kwesịrị ịnọ Jehova nso, ọ bụghị mmanya. O nyeziiri m aka idi nsogbu m ma merie ha.” Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova nọ anyị nso mgbe niile inyere anyị aka, ọ bụrụgodị na nsogbu bịaara anyị yiri ihe a na-enweghị ihe ọ bụla anyị ga-emeli gbasara ya.​—Fil. 4:6, 7; 1 Pita 5:7.

Ebe otu nwanna nwaanyị nọ ọdụ n’ụlọ ya na-eche echiche ka ọ na-ele mmanya dị ya nso anya.

Ọ bụrụ na ị na-aṅụ mmanya mgbe ụfọdụ, ọ ga-adị mma ka i chee gbasara ajụjụ ndị a ka ị mara ma è nwere ihe ị ga-agbanwe n’otú i si aṅụ mmanya: ‘È nweela onye ezinụlọ m ma ọ bụ enyi m gwara m okwu gbasara otú m si aṅụ mmanya?’ Ọ bụrụ na e nweela, o nwere ike ịbụ na ị maghị na ị mụtawala àgwà na-adịghị mma ma ọ bụ na i nwewela nsogbu. ‘M̀ na-aṅụ mmanya karịa otú m na-aṅụbu?’ Ihe a nwere ike ime onye na-abụghị onye aṅụrụma, mana ya abụrụ na ịṅụ mmanya eriwela ya ahụ́. ‘Ọ̀ na-esiri m ike ịnọ ụbọchị ole na ole ma ọ bụ karịa n’aṅụghị mmanya?’ Ọ bụrụ na ị zara ee, o nwere ike ịbụ na ịṅụ mmanya eriela gị ahụ́. O nwekwara ike ịdị mkpa ka ndị ọkachamara nyere gị aka ka ị kwụsị ya.

Ebe ọ bụ na ịṅụ mmanya nwere ike ịkpata ọtụtụ nsogbu, ụfọdụ Ndị Kraịst ekpebiela na ha agaghị aṅụ mmanya ọ bụla na-aba n’anya. Ụfọdụ ndị nwere ike ikpebi na ha agaghị aṅụ mmanya na-aba n’anya n’ihi na ọ naghị atọ ha ụtọ. Onye gị na ya dị ná mma kpebie na ya agaghịzi aṅụ mmanya na-aba n’anya, i nwere ike igosi ya obiọma ma ị kwanyere ya ùgwù, gharakwa ịkatọ ihe ahụ o kpebiri.

O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ọ dị mma ka i kpebie otú ị ga-aṅụru mmanya. I nwere ike ikpebi ugboro ole ị ga na-aṅụ mmanya, dị ka otu ugboro n’izu ma ọ bụ ịṅụ obere mmanya ma i riwe nri. E nwere ndị nke kpebiri ụdị mmanya na-aba n’anya ha ga-aṅụ, dị ka ịṅụ obere waịn ma ọ bụ biya, mana ha ekpebie na ha agaghị aṅụ mmanya ọkụ, ọ bụrụgodị nke a gwakọtara ya na ihe ọzọ a na-aṅụ aṅụ. Mmadụ kpebie ihe ọ ga-eme gbasara ịṅụ mmanya, ọ ga-eme ka ọ dịrị ya mfe ime ya. Ihere ekwesịghịkwanụ ime Onye Kraịst tozuru etozu ma o mee ụdị mkpebi a ma nọsie ike na ya.

Anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme gbasara mmanya na-aba n’anya, anyị kwesịrị ichebara ndị ọzọ echiche. Ndị Rom 14:21 sịrị: “Ọ ka mma ka ị ghara ịta anụ ma ọ bụ ịṅụ mmanya ma ọ bụ ime ihe ọ bụla ga-eme ka nwanna gị zọhie ụkwụ.” Olee otú i nwere ike isi eme ihe a? Na-egosi ụmụnna gị na ị hụrụ ha n’anya. Ọ bụrụ na ị chọpụta na ịṅụ mmanya ga-akpasu mmadụ iwe, i nwere ike ikpebi ịghara ịṅụ mmanya n’oge ahụ. Ị ga-esi otú ahụ egosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ gị n’obi, na ị na-akwanyere ha ùgwù, nakwa na ị na-achọ ihe ga-abara ha uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị gị uru.​—1 Kọr. 10:24.

Ihe ọzọ bụ na ndị ọchịchị nwere ike iti iwu gbasara ịṅụ mmanya na-aba n’anya. N’eziokwu, Onye Kraịst kwesịrị irubere iwu ndị ahụ isi. Iwu ndị ahụ nwere ike ikwu afọ ole mmadụ ga-eru tupu ya aṅụwa mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ha ekwuo na mmadụ ekwesịghị ịṅụ mmanya na-aba n’anya tupu ya anyawa ụgbọala ma ọ bụ tupu ya ejiri ngwá ọrụ ụfọdụ na-arụ ọrụ.​—Rom 13:1-5.

Jehova kwanyeere anyị ùgwù kwe ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eji ọtụtụ onyinye o nyere anyị eme. Ikpebi ihe anyị ga-eri na ihe anyị ga-aṅụ sokwa na ha. Ka ihe anyị na-ekpebi gosi na anyị ji onyinye a Chineke nyere anyị kpọrọ ihe, ka anyị jirikwa ya na-eme ihe ga-adị Nna anyị nke eluigwe mma.

a Otu òtù na-ahụ maka igbochi ọrịa n’Amerịka kwuru na ụfọdụ nsogbu ịṅụ oké mmanya na-akpata bụ igbu ọchụ, mmadụ igbu onwe ya, idina mmadụ n’ike, mmadụ ịkụ di ya ma ọ bụ nwunye ya isi aba okpu, mmadụ inwe mmekọahụ rụrụ arụ nke nwere ike ịkpatara ya nsogbu, nakwa ime ịpụ nwaanyị.

Ihe Ndị Ọzọ Kpebiri

Ndị Kraịst niile agaghị eme otu mkpebi. Ụfọdụ ndị nwere ike kpebie na ha ga na-aṅụ obere mmanya na-aba n’anya n’oge dabara adaba. Ndị ọzọ ekpebiekwala na ha agaghị aṅụ mmanya ọ bụla na-aba n’anya. Dị ka anyị kwurula, ụfọdụ ndị na-ekpebi ụdị mmanya ha ga-aṅụ na otú ha ga-aṅụru ya. E nweghị onye ji anyị ụgwọ ịkọwara anyị ihe mere o ji kpebie ihe o kpebiri. Ma, anyị ekwesịghị isi ọnwụ ka ndị ọzọ kpebie ihe anyịnwa kpebiri. Anyị ekwesịghịkwa ịkatọ ndị ihe ha kpebiri dị iche na nke anyị ma ọ bụrụhaala na e nweghị ihe Baịbụl kwuru ha mebiri. (Rom 14:1-6) Ka anyị buru n’obi na ihe na-abụ mkpa ezigbo Ndị Kraịst bụ ime ka udo dịrị, ha na ụmụnna ha adịrịkwa n’otu.​—Rom 14:19.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya