Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 11/1 p. 28-31
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nye Jehova Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nye Jehova Ihe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otu Akụkụ Dị Mkpa nke Ezi Ofufe
  • Ihe Mere Anyị Ji Enye Ihe
  • Ngọzi Na-abịa Site n’Igosi Mmụọ Inye Ihe
  • Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Enye Onyinye n’Ọrụ Nkwusa Alaeze Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Sọpụrụ Jehova Site n’Akụ̀ Gị”—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Onye Na-enye “Ezi Onyinye Ọ Bụla”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Olee Ebe Ego Si Abịa?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 11/1 p. 28-31

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nye Jehova Ihe?

KA ANYANWỤ na-achakwasị ntakịrị obodo Zaịdọn bụ́ Zarefat, otu nwanyị di ya nwụrụ hulatara ịchịkọta nkụ. Ọ dị ya mkpa imenwu ọkụ ka o wee nwee ike isi ntakịrị nri—ma eleghị anya nri ikpeazụ ya na nwa ya nwoke na-eto eto ga-eri. Ọ gbawo mbọ ime ka ya na nwa ya nwoke dịrị ndụ gabiga ogologo ụkọ mmiri ozuzo na ụnwụ nri, ha nile abịawokwa ná njedebe a dị mwute. Agụụ na-agụgbu ha.

Otu nwoke bịara. Aha ya bụ Elaịja, ozugbokwa nwanyị ahụ di ya nwụrụ hụrụ na ọ bụ onye amụma Jehova. O yiri ka ọ nụwo banyere Chineke a. Jehova dị iche na Beal, bụ́ onye ofufe obi ọjọọ ya, nke rụrụ arụ jupụtara n’ala ya bụ́ Zaịdọn. Ya mere mgbe Elaịja rịọrọ ya ka o kunye ya mmiri, ọ dị ya ọkụ n’obi inye aka. Ikekwe o chere na ime otú ahụ ga-ewetara ya ihu ọma Jehova. (Matiu 10:41, 42) Ma mgbe ahụ Elaịja rịọkwuru ihe ọzọ—ntakịrị ihe oriri. Ọ kọwara na ya nwere nanị ihe oriri ga-ezu maka otu nri ikpeazụ. Ma, Elaịja nọgidere na-arịọ, na-emesi ya obi ike na Jehova ga-enye ya ihe oriri n’ụzọ ọrụ ebube ruo mgbe ụkọ mmiri ozuzo ahụ kwụsịrị. Gịnị ka o mere? Bible na-asị: “O wee jee mee dị ka okwu Elaịja si dị.” (1 Ndị Eze 17:10-15) Okwu ndị a dị mfe na-akọwa ọrụ okwukwe dị ukwuu—dị nnọọ ukwuu, n’ezie, nke na Jisọs Kraịst toro nwanyị ahụ di ya nwụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku afọ n’ihu!—Luk 4:25, 26.

Ọbụna otú ahụ, ọ pụrụ iyi ihe na-adịghị otú o kwesịrị na Jehova ga-achọ ihe dị ukwuu otú a site n’aka nwanyị nwere ntakịrị ihe. Nke a dị otú a karịsịa mgbe anyị tụlere ekpere otu nwoke a ma ama kpere n’otu oge. Nchịkọta Eze Devid chịkọtaara nwa ya nwoke bụ́ Solomọn onyinye maka owuwu nke ụlọ nsọ ahụ kpaliri oké mmesapụ aka. N’ọnụ ahịa nke oge a, onyinye a tụkọtara ruru ọtụtụ ijeri naira! Otú ọ dị, Devid kwuru n’ekpere gwa Jehova, sị: “Ònye ka mụ onwe m bụ, ole ndị ka ndị m bụkwa, na anyị nwere ike iwere afọ ofufo nye Gị onwe anyị otú a? n’ihi na n’ebe Ị nọ ka ihe nile si bịa, ọ bụkwa ihe si n’aka Gị bịa ka anyị nyere Gị.” (1 Ihe Emere 29:14) Dị ka Devid kwuru, ihe nile bụ nke Jehova. Ya mere mgbe ọ bụla anyị na-enye ihe iji kwalite ofufe dị ọcha, ihe anyị na-eme agwụla inye Jehova ihe bụrịị nke ya. (Abụ Ọma 50:10) Ya mere, ajụjụ na-ebilite, Gịnị mere Jehova ga-ejidịrị chọọ ka anyị nye ihe?

Otu Akụkụ Dị Mkpa nke Ezi Ofufe

Azịza kasị mfe bụ na malite n’oge ochie Jehova emewo ka inye ihe bụrụ otu akụkụ dị mkpa nke ofufe dị ọcha. Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ebel jiri ụfọdụ n’ime anụ ụlọ ya dị oké ọnụ ahịa chụọrọ Jehova àjà. Ndị nna ochie bụ́ Noa, Abraham, Aịsak, Jekọb, na Job nyere onyinye yiri ya.—Jenesis 4:4; 8:20; 12:7; 26:25; 31:54; Job 1:5.

Iwu Mosis tụziri, ọbụnakwa chịkwaa inye Jehova onyinye. Dị ka ihe atụ, e nyere ndị Israel nile iwu inye otu akụkụ n’ụzọ iri, ma ọ bụ inye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe si n’ala ha na mmụba nke anụ ụlọ ha dị ka onyinye. (Ọnụ Ọgụgụ 18:25-28) A chịkwaghị onyinye ndị ọzọ n’ụzọ siri ike otú a. Dị ka ihe atụ, a chọrọ n’aka onye Israel ọ bụla inye Jehova mkpụrụ mbụ nke anụ ụlọ na ihe ubi ya. (Ọpụpụ 22:29, 30; 23:19) Ma, Iwu ahụ hapụụrụ ya onye ọ bụla ikpebi ókè ọ ga-enye ná mkpụrụ mbụ ya, ma ọ bụrụhaala na o nyere ihe kasị mma. Iwu ahụ kwukwara okwu inye ekele na onyinye nkwa, ndị bụ kpam kpam n’afọ ofufo. (Levitikọs 7:15, 16) Jehova gbara ndị ya ume inye ihe dị ka o siworo gọzie ha. (Deuterọnọmi 16:17) Dị ka ọ dịrịị n’ihe banyere iwu ụlọikwuu ahụ nakwa mgbe e mesịrị ụlọ nsọ ahụ, onye ọ bụla nyere ihe obi ya kwaliri ya inye. (Ọpụpụ 35:21; 1 Ihe Emere 29:9) N’ezie onyinye afọ ofufo ndị dị otú ahụ tọrọ Jehova ụtọ karịsịa!

N’okpuru “iwu Kraịst,” inye ihe nile gaje ịbụ site n’afọ ofufo. (Ndị Galetia 6:2; 2 Ndị Kọrint 9:7) Nke ahụ apụtaghị na ụmụazụ Kraịst kwụsịrị inye ihe ma ọ bụ na ha nyere ihe dị ala karị. N’ụzọ dị nnọọ iche! Ka Jisọs na ndị ozi ya nọ na-eme nkwusa n’Israel, otu ìgwè ndị inyom sooro ha ma jiri ihe ndị ha nwere jeere ha ozi. (Luk 8:1-3) N’otu aka ahụ Pọl onyeozi natara onyinye ndị kwadoro ọrụ ozi ala ọzọ ya, n’aka nke ya kwa ọ gbara ụfọdụ ọgbakọ ume inye ego maka ndị ọzọ nọ ná mkpa. (2 Ndị Kọrint 8:14; Ndị Filipaị 1:3-5) Òtù na-achị isi nọ na Jerusalem kenyere ndị ikom ji ihe akpọrọ ihe ọrụ ịhụ na e kesaara ndị nọ ná mkpa ihe ndị a tụkọtara. (Ọrụ 6:2-4) N’ụzọ doro anya, ndị Kraịst oge mbụ hụrụ ya dị ka ihe ùgwù ịkwado ofufe dị ọcha n’ụzọ ndị dị otú ahụ.

N’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ ịdị na-eche ihe mere nnọọ Jehova ji eme inye ihe akụkụ nke ofufe ya. Tụlee ihe anọ kpatara ya.

Ihe Mere Anyị Ji Enye Ihe

Nke mbụ, Jehova na-eme inye ihe akụkụ nke ezi ofufe n’ihi na ime otú ahụ dịịrị anyị mma. Ọ na-emesi ekele anyị nwere maka ịdị mma Chineke ike. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwatakịrị azụta ma ọ bụ nye onye mụrụ ya onyinye, n’ihi gịnị ka onye ahụ mụrụ ya ji eji obi ụtọ amụmụ ọnụ ọchị? Onyinye ahụ ọ̀ na-egbo oké mkpa nke onye ahụ mụrụ ya na-apụghị igboworị ma e wezụga ya? Ee e, ma eleghị anya. Kama nke ahụ, onye ahụ mụrụ ya na-enwe obi ụtọ ịhụ ka nwa ahụ na-azụlite mmụọ inwe ekele na inye ihe. N’ihi ihe ndị yiri ya Jehova na-agba anyị ume inye ihe ma na-enwe obi ụtọ mgbe anyị mere otú ahụ. Nke a bụ otú anyị si egosi ya na anyị nwere ekele n’ezie maka obiọma na mmesapụ aka ya nile a na-akparaghị ókè nye anyị. Ọ bụ onye na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè,” ya mere ọ dịghị mgbe anyị na-agaghị enwe ihe mere anyị ga-eji na-ekele ya. (Jemes 1:17) Karịsịa, Jehova nyere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, na-ekwe ka ọ nwụọ ka anyị wee nwee ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Jọn 3:16) Ànyị pụrụ ikelezu ya ekelezu?

Nke abụọ, ọ bụrụ na anyị azụlite àgwà inye ihe, anyị si otú a amụta iṅomi Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, n’akụkụ kasị mkpa. Jehova na-enye ihe oge nile, na-emesapụ aka mgbe nile. Dị ka Bible na-ekwu, ọ na-enye anyị “ndụ, na ume, na ihe nile.” (Ọrụ 17:25) Anyị pụrụ ikele ya n’ụzọ ziri ezi maka ume ọ bụla anyị kuuru, nri ọ bụla anyị riri, oge obi ụtọ ọ bụla na nke na-enye afọ ojuju ná ndụ. (Ọrụ 14:17) Jisọs, dị ka Nna ya, gosiri mmụọ inye ihe. O nyefere onwe ya kpam kpam. Ị̀ maara na mgbe Jisọs rụrụ ọrụ ebube, o mere otú ahụ n’ụzọ furu ya ihe? Ihe gafere otu ugboro Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na mgbe ọ gwọrọ ndị ọrịa, ike ‘si n’ahụ ya pụọ.’ (Luk 6:19; 8:45, 46) Jisọs na-emesapụ nnọọ aka ọbụna nke na ọ wụpụrụ mkpụrụ obi ya, ndụ ya, nye ọnwụ.—Aịsaịa 53:12.

Ya mere mgbe anyị nyere ihe, ma ọ bụ oge anyị, ume anyị, ma ọ bụ ihe onwunwe anyị, anyị na-eṅomi Jehova ma na-eme ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11; Ndị Efesọs 5:1) Anyị na-agbasokwa ihe ilereanya zuru okè maka akparamàgwà mmadụ nke Jisọs Kraịst hapụụrụ anyị.—1 Pita 2:21.

Nke atọ, inye ihe na-egbo mkpa ndị bụ ezie na ndị dị mkpa. N’eziokwu, Jehova pụrụ igbo mkpa dị iche iche nke ọdịmma Alaeze n’ụzọ dị mfe n’achọghị enyemaka anyị, dị nnọọ ka ọ pụrụ ime ndokwa ka nkume tie mkpu kama iji anyị kwusaa okwu ahụ. (Luk 19:40) Ma ọ họrọwo iji ihe ùgwù ndị a kwanyere anyị ùgwù. Ya mere mgbe anyị nyere ihe anyị nwere iji kwalite ọdịmma Alaeze, anyị na-enwe oké afọ ojuju nke ịmara na anyị na-ekere òkè dị mkpa n’ọrụ kasị mkpa nke na-aga n’ihu n’ụwa a.—Matiu 24:14.

Ọ dịghị mkpa ikwuwe na a chọrọ ego iji kwadoo ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova. N’afọ ije ozi 1995, Society mefuru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde $60 nanị n’ilekọta ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị ozi ala ọzọ, na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ọrụ ozi ubi ha. Otú ọ dị, nke ahụ bụ mmefu dịtụ ntakịrị ma e jiri ya tụnyere owuwu na ịrụ ọrụ nke alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na ebe ndị a na-ebi akwụkwọ gburugburu ụwa. Ma, ihe a nile kwere omume site n’onyinye afọ ofufo!

Ndị Jehova n’ozuzu ha adịghị ewere ya na ọ bụrụ na ha abaghị ọgaranya n’onwe ha, ha pụrụ nnọọ ịhapụ ndị ọzọ ka ha buru ibu ahụ. Omume dị otú ahụ pụrụ iduje n’anyị ịbụ ndị akụkụ a dị mkpa nke ofufe anyị funahụrụ. Dị ka Pọl onyeozi si kwuo, ndị Kraịst nọ na Masedọnia bụ “ogbenye ọnụ ntụ.” Ma, ha rịọrọ maka ihe ùgwù nke inye ihe. Ihe ha nyekwara, ka Pọl gbara akaebe ya, ‘karịrị ike ha’!—2 Ndị Kọrint 8:1-4.

Nke anọ, Jehova emewo inye ihe akụkụ nke ezi ofufe n’ihi na inye ihe ga-enyere anyị aka inwe obi ụtọ. Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Otú ahụ ka Jehova si mee anyị. Ọ bụkwa ihe ọzọ mere anyị pụrụ iji chee na n’agbanyeghị otú ihe anyị nyere ya bururu n’ibu, anyị apụghị ime ihe haruru ka ekele anyị nwere n’ime obi anyị maka ya. Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, Jehova adịghị atụ anya ihe n’aka anyị karịa ka anyị pụrụ inye. Anyị pụrụ inwe obi ike na ọ na-enwe obi ụtọ mgbe anyị ji ọṅụ nye ihe anyị pụrụ inye!—2 Ndị Kọrint 8:12; 9:7.

Ngọzi Na-abịa Site n’Igosi Mmụọ Inye Ihe

Ịlaghachi n’ihe atụ anyị mbụ, cheedị ma a sị na nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ chere na onye ọzọ pụrụ igbo mkpa Elaịja maka nri. Lee ngọzi gaara efunahụworị ya mgbe ahụ!

Obi abụọ ọ bụla adịghị ya na Jehova na-agọzi ndị na-egosi mmụọ inye ihe. (Ilu 11:25) Ọ dịghị mkpa na nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ ga-ata ahụhụ n’ihi inye ihe o chere na ọ bụ nri ikpeazụ ya. Jehova ji otu ọrụ ebube kwụghachi ya ụgwọ. Dị ka Elaịja kwererịị ná nkwa, okpokoro ntụ ọka na ite mmanụ ya agwụghị ruo mgbe ụkọ mmiri ozuzo ahụ kwụsịrị. Ma o nwetara ọbụna nkwụghachi ụgwọ ka ukwuu. Mgbe nwa ya nwoke dara ọrịa ma nwụọ, Elaịja, bụ́ onye nke ezi Chineke ahụ, kpọghachiteere ya ya. Lee otú nke ahụ na-aghaghị isiworị wulie ya elu n’ụzọ ime mmụọ!—1 Ndị Eze 17:16-24.

Taa anyị adịghị atụ anya ka e jiri ọrụ ebube gọzie anyị. (1 Ndị Kọrint 13:8) Ma Jehova na-emesi anyị obi ike na ya ga-akwagide ndị ji mkpụrụ obi dum na-ejere ya ozi. (Matiu 6:33) Ya mere anyị pụrụ iyi nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ n’akụkụ ahụ, na-enye ihe ná mmesapụ aka, na-enwe obi ike na Jehova ga-elekọta anyị. N’otu aka ahụ, anyị pụrụ inweta oké nkwụghachi ụgwọ ime mmụọ. Ọ bụrụ na inye ihe anyị bụ akụkụ nke ihe a na-eme mgbe dum, kama ịbụ ihe a na-eme ná ndapụta, ná mkpali, ọ ga-enyere anyị aka ime ka anya anyị dịrị otu ebe ma dịkwasị n’ọdịmma nile nke Alaeze, dị ka Jisọs tụrụ aro ya. (Luk 11:34; tụlee 1 Ndị Kọrint 16:1, 2.) Ọ ga-enyekwara anyị aka inwe mmetụta ịnọ Jehova na Jisọs nso karị dị ka ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ. (1 Ndị Kọrint 3:9) Ọ ga-atụkwasịkwa ihe na mmụọ mmesapụ aka, nke inye ihe nke e jirila mara ndị na-efe Jehova ofufe n’ụwa nile.

[Igbe dị na peeji nke 31]

ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ SI AHỌRỌ INYE IHE

ỤTỤ A NA-ATỤNYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta ma ọ bụ mawapụta ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ bụ́: “Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ nke Society​—⁠Matiu 24:14.” Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke dị na Brooklyn, New York, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ dị n’ógbè ha.

A pụkwara iziga onyinye ego afọ ofufo gaa kpọmkwem na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-​2483, ma ọ bụ gaa n’ala­ka ụlọ ọrụ Society nke na-elekọta mba unu. A pụkwara ịtụnye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọ onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.

ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI

A pụrụ inye Watch Tower Society ego ka ha jidere mmadụ ná ntụkwasị obi ruo mgbe onye ahụ nwụrụ, n’ọnọdụ nke bụ na a ga-enyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko kpọtụrụ Treasurer’s Office n’adres e dere n’elu.

INYE IHE E MERE ATỤMATỤ YA

Tinyere inye onyinye ego na onyinye ego ndị a pụrụ ịnaraghachi, e nwere ụzọ ndị ọzọ nke inye ihe iji baara ozi Alaeze zuru ụwa ọnụ uru. Ndị a gụnyere:

Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú ahụ.

Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ nke a ga-akwụnye Watch Tower Society mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ahụ na-agbaso. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú a.

Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ ná ndokwa nke bụ na onye nyere ha ga-anọgide na-enweta ego a na-akwụ maka ha.

Ala Ma Ọ Bụ Ụlọ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala ma ọ bụ ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mmadụ kwesịrị ime ka Society mara tupu o denyere Society ala ma ọ bụ ụlọ ọ bụla.

Ike Ekpe na Ihe Ntụkwasị Obi: A pụrụ idenye Watch Tower Society ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e deziri nke ọma n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego ndị e mere ka ha baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego ụtụ isi ọ ga-akwụ. E kwesịrị izijere Society otu n’ime akwụkwọ ike ekpe ma ọ bụ nke ndokwa atụmatụ ego ma ọ bụ ihe onwunwe dị otú ahụ.

Ndị nwere mmasị na nke ọ bụla n’ime ndokwa inye ihe e mere atụmatụ ha ndị a kwesịrị ịkpọtụrụ Ngalaba Inye Ihe E Mere Atụmatụ Ya n’adres e depụtara n’okpuru ma ọ bụ n’ọfịs Society na-elekọta mba gị. Ngalaba Inye Ihe E Mere Atụmatụ Ya kwesịrị inweta otu n’ime ihe odide metụtara nke ọ bụla n’ime ndokwa ndị a.

Society akwadebewo otu broshuọ Bekee a kpọrọ Planned Giving. Ndị nọ na United States na-eme atụmatụ inye Society onyinye pụrụ iche ugbu a ma ọ bụ ịhapụ ekpe mgbe ha nwụrụ pụrụ ịhụ ihe ọmụma a dị ka nke na-enye aka. Nke ahụ bụ eziokwu karịsịa ma ọ bụrụ na ha chọrọ imezu ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ nke ezinụlọ ma ọ bụ ebumnobi nke atụmatụ ala na ụlọ ka ha na-eji nsepụ ego ụtụ isi ebelata mmefu ego nke onyinye ma ọ bụ ekpe dị otú ahụ. A pụrụ inweta broshuọ ahụ ma a rịọ maka ya, ma ọ bụ site n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ site na telifon.

PLANNED GIVING DESK

Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania

100 Watchtower Drive, Patterson, New York 12563-9204

Telephone: (914) 878-7000

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya