Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Enye Onyinye n’Ọrụ Nkwusa Alaeze Ahụ
◻ ỤTỤ A NA-ATỤNYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ: Ọtụtụ ndị na-ewepụta ma ọ bụ mawapụta ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ bụ́ “Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ nke Society—Matiu 24:14.” Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke dị na Brooklyn, New York, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ nke kasị dịrị ha nso.
◻ ONYINYE: A pụrụ iziga onyinye ego afọ ofufo gaa kpọmkwem n’ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-2483, ma ọ bụ gaa n’alaka ụlọ ọrụ Society nke na-elekọta mba unu. A pụkwara ịtụnye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọ onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.
◻ ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI: A pụrụ inye Watch Tower Society ego ka ha jidere mmadụ ná ntụkwasị obi ruo mgbe onye ahụ nwụrụ, n’ọnọdụ nke bụ na a ga-enyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa.
◻ ỊNSHỌRANSỊ: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú ahụ.
◻ IHE NDEKỌ EGO ỤLỌ AKỤ: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ nke a ga-akwụnye mgbe onye debere ya nwụrụ n’aka Watch Tower Society n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ dị ná mba ahụ na-agbaso. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú a.
◻ IHE NDỊ NỌCHIRI ANYA EGO: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ ná ndokwa nke bụ na onye nyere ha ga-anọgide na-enweta ego a na-akwụ maka ha.
◻ ALA NA ỤLỌ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala ma ọ bụ ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mmadụ kwesịrị ime ka Society mara tupu o denyere Society ụlọ ma ọ bụ ala ọ bụla.
◻ IKE EKPE NA IHE NTỤKWASỊ OBI: A pụrụ idenye Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e deziri nke ọma n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego ndị e mere ka ha baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego ụtụ isi ọ ga-akwụ. E kwesịrị izijere Society otu n’ime akwụkwọ ike ekpe ma ọ bụ nke ndokwa atụmatụ ego ma ọ bụ ihe onwunwe dị otú ahụ.
Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere okwu ndị a, dega akwụkwọ na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-2483, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ Society dị ná mba i bi na ya.