Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 12/1 p. 28-31
  • “Olee Ebe Ego Si Abịa?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Olee Ebe Ego Si Abịa?”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Nlereanya nke Israel Oge Ochie Setịpụrụ
  • Mkpa E Nwere Taa
  • Olee Ebe Ego ahụ Na-aga?
  • Jehova Ga-akwụghachi Gị Ụgwọ
  • Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Enye Onyinye n’Ọrụ Nkwusa Alaeze Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Sọpụrụ Jehova Site n’Akụ̀ Gị”—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Onye Na-enye “Ezi Onyinye Ọ Bụla”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nye Jehova Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 12/1 p. 28-31

“Olee Ebe Ego Si Abịa?”

IHE nkiri vidio Watch Tower Society bụ́ “Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name” na-amasị ndị na-ekiri ya. Ha na-ahụ ndị ikom na ndị inyom sitere n’agbụrụ na ọnọdụ dị iche iche, ndị jiri ejiji dị mma, ka ha na-amụmụ ọnụ ọchị ma na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ịdị n’otu. Ọ bụghị nanị na ọtụtụ puku ndị ọrụ obi ụtọ ahụ na-adọrọ mmasị ha kama otú a kwa ka nnukwu ihe owuwu ndị ahụ dị n’isi ụlọ ọrụ Society dị na Brooklyn na n’ugbo ha dị na Wallkill, New York, na-adọrọ mmasị ha. Ihe nkiri vidio ahụ na-egosi na a pụrụ ịhụ nkà na ụzụ kasị ọhụrụ n’ime ihe owuwu ndị a—ìgwè ọrụ na-aga oké ọsọ ọsọ nke na-ebi ma na-ejikọta akwụkwọ, na-emepụta ọtụtụ nde mbipụta kwa ọnwa, ụdị ígwè kọmputa dị iche iche, na ọtụtụ ngalaba ụlọ ọrụ na-akwado ha.

Nke a na-egosi oké mmefu akụ̀ na ụba. Ya mere ụfọdụ na-ajụ, sị, “Olee ebe ego si abịa?”

Ọ na-amasịkwa ndị na-abịa ileta isi ụlọ ọrụ Society n’otu aka ahụ. Ha na-amatị olu ha iji kirie ebe obibi ọhụrụ ahụ dị 30 okpukpu n’elu, otu n’ime ọtụtụ ụlọ ndị e ji eme ihe maka ebe obibi nke ihe karịrị 3,000 ndị ozi afọ ofufo na-arụ ọrụ n’ebe ahụ. Ije nleta na Ebe Agụmakwụkwọ nke Watchtower ahụ e wuru ọhụrụ nke dị ihe dị ka 110 kilomita n’ebe ugwu nke Brooklyn na-amasịkwa ọtụtụ ndị nke ukwuu. Ọ bụ ezie na a ka na-ewu ya, ihe dị ka 1,200 ndị ọrụ bi na ya. A ga-azụ klas abụọ nke ndị ozi ala ọzọ n’ebe ahụ kwa afọ ma zipụ ha ofesi n’ebe ndị e kenyere ha ọrụ. Ọ bụkwa n’ebe a ka e si elekọta ihe karịrị 10,000 ọgbakọ Ndịàmà Jehova na United States. N’ụwa nile ọtụtụ alaka ewusawanyewokwa ihe owuwu ha n’oge ndị na-adịbeghị anya ma ọ bụ na-eme otú ahụ. Iji rụzuo ihe a nile na-ewe ego dị ukwuu. Ndị mmadụ na-ajụ, sị, “Olee ebe ego si abịa?”

Azịza ya bụ na ọ na-abịa site n’aka ndị mmadụ nkịtị dị ka onye ọ bụla n’ime anyị. Ha bụ ndị, n’ụwa nile, na-achọ ime ihe nile ha pụrụ ime iji mee ka ọrụ ndị Kraịst dị mkpa nke ime nkwusa na izi ihe na-aga n’ihu. Ụdị mmụọ dị otú ahụ nke ịchọ ime ihe nwere nke ọ na-agbaso.

Ihe Nlereanya nke Israel Oge Ochie Setịpụrụ

Ihe karịrị 3,500 afọ gara aga, mkpa maka ụtụ mmesapụ aka bilitere. Jehova enyelarị Mosis ntụziaka ka e wuo ebe obibi, ma ọ bụ “ụlọ ikwuu nzute” a ga-eji mee ihe n’ofufe Ya. Ụkpụrụ ahụ Chineke nyere chọrọ ka e jiri ụdị ihe dị iche iche dị oké ọnụ ahịa mee ihe. Jehova nyere iwu, sị: “Sinụ n’etiti unu werere Jehova àjà mbuli: onye ọ bụla nke obi ya nwere afọ ofufo, ya weta ya, bụ́ àjà mbuli nke Jehova.” (Ọpụpụ 35:4-9) Olee otú ndị ahụ si meghachi omume? Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị na “ha [bịara], onye ọ bụla nke obi ya kwaliri ya, na onye ọ bụla nke mmụọ ya mere ka o nwee afọ ofufo, ha wee weta àjà mbuli Jehova, iji jee ozi ụlọ ikwuu nzute ahụ, na iji fee ofufe ya nile, na iji mee uwe nsọ ahụ.” “Onyinye afọ ofufo” nke a ji nwayọọ nwayọọ buo oké ibu nke na ọ dị “ọtụtụ ihe karị nke ga-ezuru ofufe nke dịịrị ozi ahụ nke Jehova nyere iwu ka e jee.” (Ọpụpụ 35:21-29; 36:3-5) Lee aha mmụọ achọghị ọdịmma onwe onye, nke mmesapụ aka nke ndị ahụ gosipụtara!

Ihe na-erughị 500 afọ n’ihu, a kpọkwara òkù ọzọ ka ụmụ Israel tụọ ụtụ afọ ofufo. Ọ fọrọ nke nta ka e mezuo ọchịchọ Eze Devid iwuru Jehova ụlọ na-adịgide adịgide site n’aka nwa ya nwoke bụ́ Solomọn. Devid n’onwe ya chịkọtara ma tụnye akụkụ ka ukwuu n’ihe ga-adị mkpa. Ndị ọzọ sonyere mgbe Devid kpọrọ òkù iwetara ‘Jehova onyinye.’ Gịnị si na ya pụta? “Ndị Israel wee ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na ha weere afọ ofufo nye onwe ha, n’ihi na n’obi zuru okè ka ha weere afọ ofufo nye Jehova onwe ha: ọzọkwa, Devid, bụ́ eze, ṅụrịrị ọṅụ ukwuu.” (1 Ihe Emere 22:14; 29:3-9) Nanị ọlaọcha na ọlaedo ruru ihe dị ka $50 ijeri n’ọnụ ahịa ha taa!—2 Ihe Emere 5:1.

Anyị na-arịba ama site n’ihe atụ ndị a na ọ dịghị onye amanyere inye ihe. Ọ bụ “afọ ofufo” kpam kpam, bụrụkwa nke e nyere “n’obi zuru okè.” Jehova agaghị enweworị obi ụtọ n’ihe ọ bụla dị ala karịa nke ahụ. N’otu aka ahụ, mgbe e nwere ohere maka ịtụ ego iji nyere ndị Kraịst nọ ná mkpa aka, Pọl onyeozi dere na ọ gaghị abụ “dị ka ihe nrigbu.” O kwukwasịrị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.”—2 Ndị Kọrint 9:5, 7.

Mkpa E Nwere Taa

È nwere mkpa maka ụtụ taa? N’ezie e nwere, a ga-enwekwa ọbụna karị ka oge na-aga. N’ihi gịnị?

E nyewo ndị Kraịst ntụziaka ndị a kapịrị ọnụ maka oge ọgwụgwụ a. Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.

Ọ na-ewe oge na akụ̀ na ụba buru ibu iji rụzuo oké ọrụ izi ihe na ime nkwusa nke a ka anyị nọgidere na-akpụdewe oge ikpeazụ nke “ọgwụgwụ oge a” nso karị. N’ihi gịnị? N’ihi ihe nile iburu ozi Alaeze Chineke gaa “ebe ụwa sọtụrụ” gụnyere. (Ọrụ 1:8) Ihe ka ukwuu ná ndị mmadụ amaghị Akwụkwọ Nsọ nke ọma dị ka ndị Juu narị afọ mbụ maara. N’ezie, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị bi n’ụwa amadịghị Bible, ha adịghịkwa ewere ya dị ka Okwu Chineke. A ghaghị ịzụ ma zipụ ndị nkwusa n’ala ndị dị anya. (Ndị Rom 10:13-15) Cheekwa echiche banyere ọnụ ọgụgụ asụsụ nke a gụnyere! Ọ dị ndị e meere nkwusa mkpa inwe Bible na mbipụta ndị dabeere na Bible ndị ha ga-agụ ma mụọ n’asụsụ ha. Ọ chọrọ nhazi buru ibu iji jiri nwayọọ nwayọọ rute mmadụ nile ma jiri nke nta nke nta mee ka ha ruo ntozu okè ime mmụọ ka ha wee nwee ike ọbụna inyere ndị ọzọ aka.—2 Timoti 2:2.

Jisọs kwuru na a ghaghị ibu ụzọ “[kwusaa] ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Ya mere ugbu a bụ oge itinye ihe nile anyị pụrụ itinye iji rụzuo ọrụ ahụ dị mkpa. Ọ dịghị ihe ka mma a pụrụ iji ego anyị mee tupu ihe onwunwe nkịtị akwụsị ịba uru ọ bụla.—Ezikiel 7:19; Luk 16:9.

Olee Ebe Ego ahụ Na-aga?

Watch Tower Society na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ihe karịrị 230 asụsụ, tinyere na Braille maka ndị kpuru ìsì na ihe nkiri vidio n’asụsụ mmegharị ahụ maka ndị ntị chiri. Nke a chọrọ ìgwè ndị nsụgharị na ndị ngụgharị n’asụsụ ọ bụla. Nanị iche echiche ịrụ ọrụ a nile, karịsịa maka magazin Ụlọ Nche nke a na-ebipụta kwa ọnwa na 121 asụsụ, na-ebipụtakọkwa 101 n’ime ha ọnụ n’otu mgbe ahụ, na-atụ n’anya. Ma ọ dị mkpa ka ndị mmadụ n’ụwa nile wee nwee ike inwe ma gụọ otu ihe ọmụma ahụ. Kwa afọ a na-enwe ịrị elu n’ọnụ ahịa akwụkwọ na ngwongwo ndị ọzọ e ji emepụta ozi Alaeze ahụ n’ụdị e biri ebi ma ọ bụ n’ụdị ihe ndị a gụnyere na tepu a na-ege ege ma ọ bụ vidio. A ghaghị ịkwụ ụgwọ mmefu dị otú ahụ site n’iji onyinye ndị sitere n’aka ụmụnna mee ihe.

A na-arụ ọrụ ime nkwusa na izi ihe ahụ n’ókèala ebe ihe karịrị 75,000 ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile na-ejezu. Iji mee ka ha dị n’otu ma gbaa ha ume, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị a zụrụ azụ na-eleta ọgbakọ nke ọ bụla ihe dị ka ugboro abụọ kwa afọ. Mgbakọ dị iche iche na-arụkwa ọrụ dị mkpa n’inye ntụziaka. A ghaghị ịgbazite ihe owuwu ndị buru ibu maka mgbakọ ndị ahụ na-ewusi okwukwe ike nke ukwuu. A na-ejikwa ụtụ ndị ị na-atụ eme ihe maka nzube ndị a.

Ọ bụ ezie na a na-enwekarị mgbakọ nanị ugboro atọ n’afọ, ọgbakọ dị n’ógbè dị iche iche na-agbakọta maka nzukọ ise kwa izu. (Tụlee Ọpụpụ 34:23, 24.) Nnubata nke ndị ọhụrụ na-azaghachi n’ozi ọma ahụ apụtawo ntụkwasị nke ọtụtụ puku ọgbakọ ọhụrụ kwa afọ. Site n’enyemaka nke ọtụtụ nde dollar ndị a na-agbazinye site n’aka Society, a na-ewu ọtụtụ narị Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ kwa afọ, a na-edozigharịkwa ma na-ewusawanye ọtụtụ ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na nke a bụ ego na-aga gburugburu nke a na-eji eme ihe ọtụtụ ugboro, ndị na-achọ ya nọgidere na-arị elu.

Otu akụkụ ebe e nweworo uto na-enweghị atụ bụ ná mba ndị dị n’Ọwụwa Anyanwụ Europe bụ́ ndị nọ n’okpuru ebe ahụ bụbu Soviet Union. Lee ka o si bụrụ ihe na-enye ọṅụ bụ akụkọ na-aga n’ihu n’ihu na ọrụ ahụ emepewo n’ebe ndị a! Ugbu a a na-ezije ndị ozi ala ọzọ n’ọtụtụ n’ime mba ndị a. E guzobewo alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ dị iche iche n’ala ụfọdụ, na-amụba ọnụ ọgụgụ ndị ozi afọ ofufo mejupụtara ezinụlọ Betel n’ụwa nile ruo n’ihe karịrị 15,000. N’ezie, a ghaghị ịzụta ma ọ bụ wuo ihe owuwu dị iche iche nke alaka maka inye ha ụlọ. Ụtụ ndị ị na-atụ na-enye aka igbo mkpa ahụ.

Ọrụ a nile abụghị nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-ahụbeghị. Ha na-eme ihe nile ha pụrụ ime ịkpaghasị mgbalị nile nke ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi ma ọ bụ kpatara ha nsogbu. (Mkpughe 12:17) Nke a pụtara agha iwu na-ebuwanye ibu n’ụlọikpe dị iche iche iji chebe ikike ndị Chineke nwere ime nkwusa na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu ezi omume ya nile. Tụkwasị, mbibi nile nke agha n’ime usoro ihe Setan, tinyere ọdachi ndị na-emere onwe ha, pụtara na ihe enyemaka maka ụmụnna anyị nwoke na nwanyị na ndị sonyeere ha o metụtara na-adịkarị mkpa. Ụtụ ndị ị na-atụ na-enye aka ịhụ na e nyere aka a dị mkpa.

Jehova Ga-akwụghachi Gị Ụgwọ

Iji oge na akụ̀ na ụba anyị na-eme ihe n’afọ ofufo iji kwalite ọrụ Onyenwe anyị na-eweta ngọzi ndị ka ukwuu. N’ihi gịnị? N’ihi na Chineke, onye nwe ihe nile n’ezie, ga-akwụghachi anyị ụgwọ. Ilu 11:25 na-ekwu, sị: “Mkpụrụ obi nke na-agọzi agọzi ka a ga-eme ka ọ maa abụba: ọzọ, onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo afọ, a ga-emekwa ka ya onwe ya ṅụjuo afọ.” Obi na-atọ Jehova ụtọ n’ezie mgbe anyị mere òkè nke anyị iji mee ka ofufe ya gaa n’ihu. (Ndị Hibru 13:15, 16) O kwere ndị Israel oge ochie ga-atụ ụtụ ahụ a chọrọ n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ nkwa, sị: “Nwaanụ m na nke a, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ma M gaghị emeghere unu window nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.” (Malakaị 3:10) Ọganihu ime mmụọ nke ndị Jehova na-enwe taa bụ ihe àmà na Chineke na-emezu nkwa ya.

Oké ọrụ a nke ịkpọsara ndị nile ụbọchị nzọpụta na inyere ndị nwere obi eziokwu aka ịbata n’ụzọ nke ndụ agaghị aga n’ihu ruo mgbe ebighị ebi. (Matiu 7:14; 2 Ndị Kọrint 6:2) Ma a ghaghị ịchịkọta ndị nile so ‘n’atụrụ ọzọ’ nke Onyenwe anyị. (Jọn 10:16) Lee ka o si dị mkpa imeri ihe ịma aka ahụ taa! Leekwa ka onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi nwee obi ụtọ, n’ileghachi anya azụ site n’ime ụwa ọhụrụ ahụ nke ezi omume, ikwu, sị, ‘Ekeere m òkè zuru ezu n’ọrụ nchịkọta ikpeazụ ahụ’!—2 Pita 3:13.

[Igbe dị na peeji nke 30, 31]

ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ SI ENYE ONYINYE N’ỌRỤ NKWUSA ALAEZE AHỤ

ỤTỤ A NA-ATỤNYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ: Ọtụtụ ndị na-ewepụta ma ọ bụ mawapụta ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ bụ́: “Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ nke Society—Matiu 24:14.” Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke dị na Brooklyn, New York, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ kasị dị n’ógbè unu.

ONYINYE: A pụrụ iziga onyinye ego afọ ofufo gaa kpọmkwem n’ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-2483, ma ọ bụ gaa n’alaka ụlọ ọrụ Society nke na-elekọta mba unu. A pụkwara ịtụnye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọ onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.

ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI: A pụrụ inye Watch Tower Society ego ka ha jidere mmadụ ná ntụkwasị obi ruo mgbe onye ahụ nwụrụ, n’ọnọdụ nke bụ na a ga-enyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa.

ỊNSHỌRANSỊ: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú ahụ.

IHE NDEKỌ EGO ỤLỌ AKỤ̀: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ nke a ga-akwụnye Watch Tower Society mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ahụ na-agbaso. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú a.

IHE NDỊ NỌCHIRI ANYA EGO: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ ná ndokwa nke bụ na onye nyere ha ga-anọgide na-enweta ego a na-akwụ maka ha.

ALA NA ỤLỌ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala ma ọ bụ ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mmadụ kwesịrị ime ka Society mara tupu o denyere Society ụlọ ma ọ bụ ala ọ bụla.

IKE EKPE NA IHE NTỤKWASỊ OBI: A pụrụ idenye Watch Tower Society ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e deziri nke ọma n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego ndị e mere ka ha baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego ụtụ isi ọ ga-akwụ. E kwesịrị izijere Society otu n’ime akwụkwọ ike ekpe ma ọ bụ nke ndokwa atụmatụ ego ma ọ bụ ihe onwunwe dị otú ahụ.

INYE IHE E MERE ATỤMATỤ YA: Society akwadebewo otu broshuọ Bekee a kpọrọ “Planned Giving” (Inye Ihe E Mere Atụmatụ Ya). Ndị nọ na United States na-eme atụmatụ inye Society onyinye pụrụ iche ugbu a ma ọ bụ ịhapụ ha ekpe mgbe ha nwụrụ pụrụ ịhụ ihe ọmụma a dị ka nke na-enye aka. Nke ahụ bụ eziokwu karịsịa ma ọ bụrụ na ha chọrọ imezu ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ nke ezinụlọ ma ọ bụ ebumnobi nke atụmatụ maka ihe nile ha nwere ka ha na-eji nsepụ ego ụtụ isi ebelata mmefu ego nke onyinye ma ọ bụ ekpe dị otú ahụ.

Maka inwetakwu ihe ọmụma banyere nke ọ bụla n’ihe ndị e kwuru maka ha n’elu, dega akwụkwọ na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-2483, ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ Society na-elekọta mba i bi na ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya