Onye Na-enye “Ezi Onyinye Ọ Bụla”
“N’otu oge, ụkọchukwu chọọchị Reformed kpọrọ m. Ọ chọrọ ịmata ụzọ m si na-ahụ maka chọọchị m. M gwara ya: . . . ‘Anyị adịghị akwụ ụgwọ ọnwa ọ bụla; ọ dịghị ihe ga-eme ka ndị mmadụ see okwu. Ọ dịghị mgbe anyị na-anakọta ụtụ.’ ‘Olee ụzọ i si enweta ego?’ ka ọ jụrụ. M zara, ‘Lee, Dr.——, m gwa gị ihe bụ eziokwu kasị mfe, ọ ga-esiri gị ike ikwere ya. Mgbe ndị mmadụ nwere mmasị n’ụzọ a, ha adịghị ahụ efere ụtụ a dọbara ha n’ihu. Kama ha na-ahụ na e nwere mmefu ndị e mere. Ha na-agwa onwe ha, “Ụlọ nzukọ a na-efu ego. . . . Olee otú m pụrụ isi tinyetụ ego n’ọrụ a?”’ O lere m anya dị ka a ga-asị na ọ na-eche sị, ‘Ì chere na m bụ mumu?’ M sịrị, ‘Lee, Dr.——, m na-agwa gị ihe bụ nnọọ eziokwu. . . . Mgbe mmadụ natara ngọzi, nweekwa ihe, ọ na-achọ iji ya meere Onyenwe anyị ihe. Ma o nweghị, gịnị mere e kwesịrị iji rụgide ya?’”
—Charles T. Russell, onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society, “Ụlọ Nche” (Bekee), July 15, 1915.
ANYỊ na-enye ihe n’ihi na Jehova Chineke bụ onye mbụ nyere ihe. Inye ihe ya ji ike ihe—ihe mbụ o kere, “Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya”—malite n’ọtụtụ afọ a na-amaghị ama gara aga. (Jọn 3:16) Site n’ịhụnanya, o nyere ndị ọzọ onyinye nke ndụ.
Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, bụ onyinye kasịnụ Jehova nyere anyị. Ma Ọkpara Chineke abụghị n’onwe ya ngwụsị nke onyinye Chineke. ‘Amara Chineke nke karịrị nke ukwuu’ bụ ihe Pọl onyeozi kpọrọ ‘onyinye Jehova nke a na-apụghị ịkọ akụkọ ya.’ (2 Ndị Kọrint 9:14, 15) Ihe àmà na-egosi na onyinye nke a gụnyere ngụkọta nke ịdị mma na ebere ịhụnanya nile nke Chineke na-eme ka o rutere ndị ya site na Jisọs. Amara dị otú ahụ dị ebube nke ukwuu nke na ọ karịrị ike mmadụ ịkọwa ma ọ bụ ikwu banyere ya. Ma, a ka nwekwara akụkụ ndị ọzọ nke inye ihe Chineke.
Ogologo oge gara aga, otu eze ji amamihe na obi umeala nakwere na ihe ọma ọ bụla ndị o nyere dị ka onyinye bụ nke Jehova n’ezie. Ọ sịrị: “N’ihi na ihe nile dị n’eluigwe na n’ụwa bụ nke Gị; Jehova, Gị nwe alaeze. . . . Ma ònye ka mụ onwe m bụ, òle ndị ka ndị m bụkwa, na anyị nwere ike iwere afọ ofufo nye Gị onwe anyị otú a? n’ihi na n’ebe Ị nọ ka ihe nile si bịa, ọ bụkwa ihe si n’aka Gị bịa ka anyị nyere Gị.”—1 Ihe Emere 29:11-14.
Ihe Nlereanya Chineke
Jemes, onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst, matara na Jehova Chineke bụ isi iyi nke ihe ọ bụla dị nnọọ mma n’akụkụ nile. Nanị onyinye zuru okè na-esite n’aka ya. Jemes dere, sị: “Ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye si n’elu bịa, ebe o si n’aka Nna nke ìhè rịdata, Onye ọghụgha ọ bụla na-apụghị ịdị n’ebe Ọ nọ, ma ọ bụ onyinyo nke nchigharị na-eweta.”—Jemes 1:17.
Ọbụna n’ihe banyere inye onyinye, Jemes hụrụ otu Chineke si dị iche n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Ụmụ mmadụ pụrụ inye onyinye ọma ma ha adịghị eme otú ahụ mgbe nile. Onyinye ndị a pụrụ isite n’ebumnobi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ma ọ bụ ha pụrụ iji ha rata mmadụ ime ihe dị njọ. N’ebe Jehova nọ e nweghị ọghụgha ọ bụla; ọ dịghị agbanwe agbanwe. N’ihi ya, ọdịdị nke onyinye ya adịghị agbanwe agbanwe. Ha na-adị ọcha mgbe nile. Ha na-akwalite ọdịmma na obi ụtọ ụmụ mmadụ mgbe nile. Ha na-abụ ihe obi ọma na nke enyemaka mgbe nile, ọ dịghị mgbe ọ na-eweta mbibi.
Ebumnobi Maka Inye Onyinye
N’ụbọchị Jemes, ndị ndú okpukpe na-ewu ewu nyere onyinye nanị ka ndị mmadụ wee hụ ha. Ha nyere ihe site n’ebumnobi dị njọ. N’ihi ịchọsi otuto ụmụ mmadụ ike, ha weturu ụkpụrụ ezi omume ha ala. Otú ọ dị, ndị Kraịst gaje ịdị iche. Jisọs dụrụ ha ọdụ, sị: “Mgbe ọ bụla ị na-arụ ọrụ ebere, afụla opì n’ihu gị, ọbụna dị ka ndị ihu abụọ na-eme n’ụlọ nzukọ unu na n’ụzọ unu, ka ha wee nara otuto n’aka mmadụ. N’ezie asị m unu, Ha na-enwezu ụgwọ ọrụ ha. Ma mgbe ị na-arụ ọrụ ebere, ka aka ekpe gị ghara ịma ihe aka nri gị na-eme: ka ọrụ ebere gị wee dị na nzuzo: Nna gị Nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-enyeghachikwa gị.”—Matiu 6:2-4.
Ihe mere onye Kraịst ji enye ihe bụ iji nyere ndị ọzọ aka imeju otu mkpa ma ọ bụ ime ha obi ụtọ ma ọ bụ ịkwalite ezi ofufe. Ọ bụghị maka inye onwe onye otuto. E kwuwerị, anya Jehova pụrụ ileba n’akụkụ mikarịsịrị emi nke obi anyị. Ọ pụrụ ịhụ ebumnobi dịkarịsịrị n’ime nke kpaliri ọrụ ebere anyị na-arụ.
Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ịgbaso ihe nlereanya Jehova na Ọkpara ya n’inye onyinye. Ha na-enye ihe ha nwere. Ha nwere ozi ọma Alaeze ahụ, ha na-enyekwa nke a maka ngọzi nke ndị ọzọ. Ha maara na Ilu 3:9 na-asị: “Sọpụrụ Jehova site n’akụ̀ gị, sitekwa ná mkpụrụ mbụ nke ihe omume gị.” N’ihi na alaka ụlọ ọrụ ọ bụla, ọgbakọ, na onye ọ bụla na-achọsi ike itinye ihe n’ọdịmma nke mmadụ nile, a na-eme ka òtù dum ahụ nke ndị bụ ụmụnna sie ike n’ime mmụọ ma na-aba ọgaranya. Ọganihu ihe onwunwe adịghị eduje n’ọganihu ime mmụọ, ma ọganihu ime mmụọ na-eweta ọganihu ihe onwunwe zuru ezu maka mkpa ndị e nwere n’ọrụ Jehova.
Ụzọ Isi Kere Òkè
E nwere ọtụtụ ụzọ onye ọ bụla pụrụ isi tinye ihe n’onwe ya iji kwadoo ozi ọma ahụ. Otu ụzọ bụ n’ihe banyere Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị nile nọ n’ọgbakọ na-eji Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe. Ọ bụ mmadụ wetara ego iji wuo ya ma ọ bụ ịnata ya n’ego, itinye ya ọkụ, itinye ya fan, na ilekọta ya. Ebe ọ bụ na ọ dị mkpa ka onye ọ bụla kwadoo ọgbakọ, e debere igbe onyinye dị iche iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, a na-ejikwa onyinye afọ ofufe ndị a natara akwụ ụgwọ mmefu nile nke ọgbakọ. Site n’ihe mafọdụrụ, a pụrụ inye alaka ụlọ ọrụ Watch Tower e nwere ná mba ahụ onyinye, dị ka mkpebi ọgbakọ si dị.
A pụrụ izijere alaka Society kpọmkwem onyinye maka ịzụ na ịkwado ndị ozi ala ọzọ na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’akụkụ ụwa ebe ozi ọma ahụ na-erutebeghị ìgwè mmadụ nile. Mmefu ndị ọzọ n’ịgbasa ozi ọma bụ banyere ọrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Pọl onyeozi, onye setịpụrụ ihe nlereanya n’ọrụ njegharị na narị afọ nke mbụ, jara ọgbakọ dị na Filipaị mma: “Unu zigara otu mgbe zigakwa mgbe ọzọ igbo m mkpa.” (Ndị Filipaị 4:14-16) E wezụga ihe a na-emefu n’akụkụ ndị a nke ozi oge nile, nke alaka ọ bụla nwere, e nwere nlekọta nke ebe obibi Betel ọ bụla na ndị bi ma na-arụ ọrụ n’ebe ahụ. Odide na obibi nke akwụkwọ dị iche iche nwere ozi mara mma nke ozi ọma ahụ bụ n’ezie ihe ùgwù dị iche iche Chineke nyere, ma nkesa nke akwụkwọ ndị ahụ dịkwa mkpa, na-efukwa ihe dị ukwuu. E nwekwara ihe a na-emefu maka mgbakọ ndị nta na ndị ukwu, e wezụga okwu ikpe dị iche iche e nweworo iji ‘gọpụrụ ozi ọma ma mee ka o guzosie ike.’—Ndị Filipaị 1:7.
Oge onye nke ọ bụla na-ejere Jehova ozi tinyere n’ikwusa ozi ọma ahụ bụ n’afọ ofufo, otú ahụ ka ọ dịkwa ya inye ihe a na-ahụ anya. Ịdị na-esetịpụ ego kwa mgbe kwa mgbe iji kwadoo mgbasawanye nke ezi ofufe bụ nke Pọl tụrụ aro ya: “Ma okwu banyere ụtụ a na-atụrụ ndị nsọ, . . . kwa ụbọchị mbụ n’izu ụbọchị asaa ka unu nile n’otu n’otu debe ihe n’ụlọ na-akpado ya, otu ihe na-agara onye ọ bụla nke ọma.”—1 Ndị Kọrint 16:1, 2.
Mgbe mmadụ nyere onyinye, ọ dịghị ama mgbe nile ụzọ e si jiri ya mee ihe kpọmkwem, ma ọ na-ahụ ihe sitere na ya ná mgbasawanye nke nkwusa Alaeze. Akụkọ ndị dị na 1993 Yearbook of Jehovah’s Witnesses na-egosi na a na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ugbu a n’ihe karịrị 200 ala na agwaetiti nke oké osimiri site n’ọnụ ihe karịrị 4,500,000 ndị Kraịst na-eje ozi. Akụkọ ndị a na-enye obi ụtọ. Ya mere, onyinye ọ bụla, n’agbanyeghị otú ọ hà, na-enye aka n’ịgbasa ozi ọma gburugburu ụwa.
E ji ihe mmadụ nile na-enye na-akwado ọrụ a. Ụfọdụ nwere ike inye ihe ka ukwuu, bụ́ nke na-enye aka n’ebe ọ dị ukwuu n’ọrụ nkwusa ahụ. Ndị ọzọ na-enye ihe dị nta. Ma ndị na-enye onyinye ka ntakịrị ekwesịghị ime ihere ma ọ bụ chee na òkè ha na-ekere adịghị aba uru ọ bụla. Jehova n’ezie adịghị eche otú ahụ. Jisọs mere ka nke a doo anya mgbe o gosiri ókè hà aṅaa Jehova nwere mmasị maka mkpụrụ ego nwanyị ahụ di ya nwụrụ. “O wee hụ otu nwanyị, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ka ọ na-atụba n’ebe ahụ ego nta abụọ. O wee sị, N’ezie asị m unu, Nwanyị a, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ọ tụbara karịa ha nile: n’ihi na ndị a nile sitere n’inwebiga akụ̀ ókè ha tụba n’onyinye: ma nwanyị ahụ sitere n’ụkọ ya tụba ihe nile o nwere nke o ji biri.”—Luk 21:2-4.
Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ọnọdụ ego anyị, anyị pụrụ inye ihe n’ụzọ ndị na-eme Jehova obi ụtọ. Ọbụ abụ ahụ chịkọtara ụzọ anyị pụrụ isi nye Eze na Onyeikpe anyị otuto nke ọma. Ọ na-asị: “Nyenụ Jehova nsọpụrụ aha Ya: butenụ onyinye ịnata ihu ọma, bata n’ogige Ya nile.” (Abụ Ọma 96:8) Ya mere, ka anyị ṅomie ihe nlereanya ịhụnanya nke Nna anyị bi n’eluigwe site n’iji ihu ọchị na-enye onyinye n’ihi na o bu ụzọ nye anyị ihe.
[Igbe dị na peeji nke 30]
ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ SI ENYE ONYINYE N’ỌRỤ NKWUSA ALAEZE AHỤ
◻ ỤTỤ A NA-ATỤNYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ: Ọtụtụ ndị na-ewepụta ma ọ bụ mawapụta ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ bụ́: “Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ nke Society—Matiu 24:14.” Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke dị na Brooklyn, New York, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ nke kasị dịrị ha nso.
◻ ONYINYE: A pụrụ iziga onyinye ego afọ ofufo gaa kpọmkwem n’ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201, ma ọ bụ gaa n’alaka ụlọ ọrụ Society dị ná mba ọ bụla. A pụkwara ịtụnye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọ onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.
◻ ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI: A pụrụ inye Watch Tower Society ego ka ha jidere mmadụ ná ntụkwasị obi ruo mgbe onye ahụ nwụrụ, n’ọnọdụ nke bụ na a ga-enyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa.
◻ ỊNSHỌRANSỊ: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú ahụ.
◻ IHE NDEKỌ EGO ỤLỌ AKỤ: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aha ma ọ bụ nke a ga-akwụnye mgbe onye debere ya nwụrụ n’aka Watch Tower Society n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ dị ná mba ahụ na-agbaso. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú a.
◻ IHE NDỊ NỌCHIRI ANYA EGO: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ ná ndokwa nke bụ na onye nyere ha ga-anọgide na-enweta ego a na-akwụ maka ha.
◻ ALA NA ỤLỌ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala ma ọ bụ ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mmadụ kwesịrị ime ka Society mara tupu o denyere Society ụlọ ma ọ bụ ala ọ bụla.
◻ IKE EKPE NA IHE NTỤKWASỊ OBI: A pụrụ idenyere Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e deziri nke ọma n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego ndị e mere ka ha baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego ụtụ isi ọ ga-akwụ. E kwesịrị izijere Society otu n’ime akwụkwọ ike ekpe ma ọ bụ nke ndokwa atụmatụ ego ma ọ bụ ihe onwunwe dị otú ahụ.
Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere okwu ndị a, dega akwụkwọ na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ Society dị ná mba i bi na ya.
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Ụzọ e si eji onyinye gị eme ihe:
1. Ndị ọrụ Betel
2. Owuwu nke alaka ụlọ ọrụ
3. Enyemaka n’oge ọdachi
4. Ụlọ Nzukọ Alaeze
5. Ndị ozi ala ọzọ